Nkebi nke 12
Amamihe Chineke nke Na-eduga ná Ndụ
N’akwụkwọ Ilu, a chịkọtara ndụmọdụ ndị e nyere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ ndị ga na-eduzi anyị n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị. Ọ bụ Sọlọmọn dere ọtụtụ n’ime ha
JEHOVA ọ̀ bụ Onye Ọchịchị maara ihe? Otu ụzọ kacha mma a ga-esi zaa ajụjụ a bụ ịtụle ndụmọdụ ọ na-enye. Ndụmọdụ ya ọ̀ bara uru? Ime ihe o kwuru ọ̀ na-eme ka ndụ anyị ka mma ma bakwuo uru? Eze Sọlọmọn maara ihe dere ọtụtụ narị ilu ndị fọrọ obere ka ha kwuo okwu banyere ihe niile anyị na-eme ná ndụ. Lee ihe atụ ụfọdụ.
Tụkwasị Chineke obi. Ịtụkwasị Chineke obi bụ ihe kacha mkpa ga-eme ka anyị na ya dịrị ná mma. Sọlọmọn dere, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.” (Ilu 3:5, 6) Ịtụkwasị Chineke obi, kwe ka ọ na-eduzi anyị na irubere ya isi ga-eme ka ndụ anyị bakwuo uru. Ime otú ahụ na-eme ka obi Jehova Chineke ṅụrịa, meekwa ka o nwee ike ịza onye iro ya bụ́ Setan okwu.—Ilu 27:11.
Jiri amamihe na-emeso ndị ọzọ ihe. Ndụmọdụ Chineke nyere ndị bụ́ di, ndị nwunye, na ụmụ dị mkpa taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Chineke gwara ndị bụ́ di, sị: ‘Ṅụrịa ọṅụ n’ihi nwunye ị lụrụ n’okorobịa.’ Ọ pụtara na di ekwesịghị ịhapụ nwunye ya na-achụ nwaanyị ọzọ. (Ilu 5:18-20) N’akwụkwọ Ilu, a kọwaara ndị bụ́ nwunye ihe e ji ama ezigbo nwunye, bụ́ onye di ya na ụmụ ya na-eto n’ihi ihe ndị ọ na-eme. (Ilu isi iri atọ na otu) A gwakwara ụmụ ka ha na-erubere ndị mụrụ ha isi. (Ilu 6:20) Akwụkwọ Ilu gosikwara na inwe ndị enyi dị mkpa, n’ihi na mmadụ ịkpa iche ga-eme ka ọ na-achọ naanị ọdịmma onwe ya. (Ilu 18:1) Anyị kwesịrị ilezi anya họrọ ndị anyị na ha ga na-akpa, n’ihi na ndị enyi anyị nwere ike ime ka anyị mee ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.—Ilu 13:20; 17:17.
Na-elekọta Onwe Gị Anya. Akwụkwọ Ilu nyere ndụmọdụ ndị bara uru ga-enyere mmadụ aka izere ịṅụbiga mmanya ókè na ihe ndị na-emebi mmadụ obi ma na-eme ihe ndị ga-eme anyị obiọma, nakwa ka anyị na-arụsi ọrụ ike. (Ilu 6:6; 14:30; 20:1) Ọ dọrọ aka ná ntị na ime ihe mmadụ kwuru nke dị iche n’ihe Chineke kwuru na-akpata nsogbu. (Ilu 14:12) Ọ gbara anyị ume ka anyị chebe obi anyị maka ihe ndị nwere ike imerụ ya, gwakwa anyị na “ọ bụ [n’obi] ka isi iyi nke ndụ si apụta.”—Ilu 4:23.
Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile achọpụtala na ime ihe ndị a akwụkwọ Ilu kwuru na-eme ka ndụ mmadụ ka mma. N’ihi ya, ha ahụla na ịnabata ọchịchị Jehova bara ezigbo uru.
—O si n’akwụkwọ Ilu.
◼ Olee ihe anyị ga-amụta ma anyị mụọ akwụkwọ Ilu?
◼ Olee ndụmọdụ Ilu nyere banyere ịtụkwasị Chineke obi na mmadụ iji amamihe na-emeso onwe ya na ndị ọzọ ihe?
Igbe dị na peeji nke 15]
EKLIZIASTIS
Olee ebe a ga-esi nweta obi ụtọ na ọṅụ ná ndụ? Sọlọmọn ruru eru ịchọpụta azịza ya. O ji ọtụtụ akụ̀, amamihe na ikike o nwere chọpụta ma hà ga-eme ka o nwee ezigbo obi ụtọ. O ji akụnụba ya na-ekpori ndụ, lụọ ọtụtụ ụmụ nwaanyị bụ́ asampete, nweekwa ụdị ntụrụndụ kacha mma. O wuru ọtụtụ ihe, gụọkwa akwụkwọ ndị ọkà mmụta dere. Olee ihe ọ chọpụtara? Ọ chọpụtara na “ihe niile bụ ihe efu,” ma mechaa kwuo otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ, sị: “Ihe bụ́ nkwubi okwu bụ: Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa ihe o nyere n’iwu. N’ihi na ọ bụ ya bụ ọrụ dum dịịrị mmadụ.”—Ekliziastis 12:8, 13.
Chaatị dị na peeji nke 15]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Ilu ●
Ekliziastis ●
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak