Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bm nkebi 13 p. 16
  • Ndị Eze Ọma na Ndị Eze Ọjọọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Eze Ọma na Ndị Eze Ọjọọ
  • Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Jona Amụta Banyere Ebere Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ọ Mụtara Ime Ebere
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
bm nkebi 13 p. 16

Nkebi nke 13

Ndị Eze Ọma na Ndị Eze Ọjọọ

E kewara Izrel. Ka ọtụtụ afọ na-aga, ọtụtụ ndị eze chịrị ndị Izrel. Ọtụtụ n’ime ha ekwesịghị ntụkwasị obi. Ndị Babịlọn bibiri Jeruselem

DỊ nnọọ ka Jehova buru n’amụma, e kewara Izrel mgbe Sọlọmọn si n’ezi ofufe dapụ. Nwa ya nke nọchiri ya, bụ́ Rehoboam, dị aka ike. N’ihi ya, ebo iri nke Izrel nupụụrụ ya isi ma hiwe alaeze ebe ugwu nke Izrel. Ebo abụọ kwadoro ọchịchị agbụrụ Devid dị na Jeruselem, nke ghọrọ alaeze ebe ndịda nke dị na Juda.

Alaeze abụọ ahụ nwere ọtụtụ nsogbu, n’ihi ndị eze ha bụ́ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ndị na-enupụkwa isi. Nsogbu Izrel kadị nke Juda njọ, n’ihi na ndị eze ya kwadoro ife arụsị site ná mmalite. Ndị amụma dị ka Ịlaịja na Ịlaịsha rụrụ ọrụ ebube, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Izrel nọ na-eme, ha metụ ihe ọma, ha alaghachi n’ihe ọjọọ. N’ikpeazụ, Chineke kwere ka ndị Asiria bibie alaeze ebe ugwu.

Juda nọrọ ihe ji nke nta gafee otu narị afọ mgbe e bibichara Izrel, ma Chineke nyekwara ya ntaramahụhụ. Ọ bụ naanị ndị eze Juda ole na ole rubere isi n’aka ná ntị ndị amụma Chineke dọrọ ha ma gbalịa ime ka mba ahụ laghachikwuru Jehova. Dị ka ihe atụ, Eze Josaya malitere ikpochapụ okpukpe ụgha na Juda ma rụzie ụlọ nsọ Jehova. Mgbe a chọtara akwụkwọ mpịakọta mbụ nke Iwu Chineke si n’aka Mozis nye ndị Izrel, o metụrụ Josaya n’obi nke ukwuu, ya agbalịsikwuo ike ime ka a maliteghachi ezi ofufe.

Ma ọ dị mwute na onye nọchiri Eze Josaya amụtaghị àgwà ọma eze ahụ kpara. N’ihi ya, Jehova kwere ka obodo Babịlọn merie Juda, bibie Jeruselem na ụlọ nsọ ya. A dọọrọ ndị a na-egbughị egbu n’agha laa Babịlọn. Chineke buru amụma na ha ga-ebi na Babịlọn afọ iri asaa. Juda tọgbọrọ n’efu n’oge ahụ niile, ruo mgbe a hapụrụ ha ka ha laghachi n’ala ha, dị ka Chineke kwere ná nkwa.

Ma, a gaghị enwe ndị eze ọzọ si n’agbụrụ Devid ruo mgbe Onye Nnapụta ahụ e kwere ná nkwa ga-amalite ịchị, ya bụ, Mesaya ahụ e buru n’amụma. Ọtụtụ n’ime ndị eze ndị chịrị na Jeruselem n’ocheeze Devid gosiri na ụmụ mmadụ na-ezughị okè erughị eru ịchị. Ọ bụ naanị Mesaya ruru eru n’eziokwu. Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa eze ikpeazụ si n’agbụrụ Devid, sị: ‘Kpupụ okpueze ahụ. Ọ gaghị abụ nke onye ọ bụla ruo mgbe onye o ruuru bịara, m ga-ewerekwa ya nye ya.’—Ezikiel 21:26, 27.

—O si ná 1 Ndị Eze na 2 Ndị Eze; 2 Ihe E Mere isi 10 ruo 36; Jeremaya 25:8-11.

◼ Gịnị mere e ji kewaa Izrel, oleekwa ihe mere alaeze abụọ ahụ?

◼ Olee ihe mere ọchịchị agbụrụ Devid, n’ihi gịnịkwa?

◼ Gịnị ka akụkọ Jona na-akụziri anyị banyere Jehova? (Gụọ igbe.)

Igbe dị na peeji nke 16]

JONA

N’oge e kewara alaeze Izrel, Chineke gwara Jona ka ọ gaa zie ndị bi n’obodo Nineve ozi ịdọ aka ná ntị. Obodo ahụ dị ezigbo anya ma na-eme ihe ike. Kama ịga Nineve, Jona banyere n’ụgbọ mmiri nke na-aga ebe ọzọ. Ọ bụ ya mere Chineke ji rụọ otu ọrụ ebube—o mere ka otu azụ̀ ukwu loo Jona. Jona nọ n’afọ azụ̀ ahụ kpekuo Jehova ekpere. Chineke mere ka azụ̀ ahụ gaa gbọpụta ya n’ala akọrọ. Jona gaziri rụọ ọrụ ahụ Chineke nyere ya.

Mgbe Chineke ji ihe ahụ merenụ kụzichaara Jona irube isi, nsogbu nke abụọ malitere: Jona gara zie ndị Nineve ozi Chineke ziri ha, ma ezigbo iwe were ya mgbe Chineke meere ha ebere na ọmịiko ma kpebie na ya agaghị enye ha ntaramahụhụ n’ihi na ha chegharịrị. Gụọ akwụkwọ Jona nke na-atọ ụtọ ka ị hụ otú Chineke si jiri ọrụ ebube nke abụọ kụziere Jona na o kwesịrị inwekwu ọmịiko.

[Chaatị dị na peeji nke 16]

Jenesis

Ọpụpụ

Levitikọs

Ọnụ Ọgụgụ

Diuterọnọmi

Jọshụa

Ndị Ikpe

Rut

1 Samuel

2 Samuel

● 1 Ndị Eze

● 2 Ndị Eze

1 Ihe E Mere

● 2 Ihe E Mere

Ezra

Nehemaya

Esta

Job

Abụ Ọma

Ilu

Ekliziastis

Abụ Sọlọmọn

Aịzaya

Jeremaya

Abụ Ákwá

Ezikiel

Daniel

Hosia

Joel

Emọs

Obedaya

● Jona

Maịka

Nehọm

Habakọk

Zefanaya

Hagaị

Zekaraya

Malakaị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya