Jona Amụta Banyere Ebere Jehova
JEHOVA nwere ọrụ maka onye amụma ya bụ́ Jona. Oge ahụ bụ narị afọ nke itoolu T.O.A., Jeroboam nke Abụọ na-achịkwa n’Israel. Jona bụ onye Gat-hefa, bụ́ obodo dị n’ókèala nke ebo Zebulun. (Joshua 19:10, 13; 2 Ndị Eze 14:25) Chineke na-ezipụ Jona gaa n’isi obodo Asiria bụ́ Nineve, ihe karịrị 800 kilomita n’ebe ugwu nke ọwụwa anyanwụ nke obodo a mụrụ ya. Ọ gaje ịdọ ndị Nineve aka ná ntị na mbibi sitere n’aka Chineke na-eche ha ihu.
Jona pụrụ icheworị, sị: ‘M̀ bịa jewe obodo ahụ na mba ahụ? Ha araraghịdị onwe ha nye Chineke. Ndị Asiria ahụ akpịrị ọbara na-akpọ nkụ adịghị mgbe ha na Jehova banyere n’ọgbụgba ndụ dị ka ndị Israel mere. Leenụ, ndị bi ná mba ọjọọ ahụ pụrụ iwere ịdọ aka ná ntị m dị ka ihe iyi egwu wee merie Israel! Ọ bụghị m! Agaghị m eje. M ga-agbaga Jọpa ma jiri ụgbọ mmiri gawa n’akụkụ chere ya ihu—ruo Tashish, ruo n’akụkụ nke ọzọ nke Oké Osimiri ahụ. Ọ bụ ihe m ga-eme!’—Jona 1:1-3.
Ihe Ize Ndụ n’Osimiri!
N’oge na-adịghị anya Jona nọ na Jọpa n’ụsọ osimiri Mediterranean. Ọ tụọ ụtụ ya ma banye n’ụgbọ mmiri na-aga Tashish, bụ́ nke a na-ejikọtakarị ya na Spain, nke dị ihe karịrị 3,500 kilomita n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke Nineve. Ozugbo ha banyere n’osimiri, onye amụma ahụ ike gwụrụ banyere n’ala ala ụgbọ wee daa n’ụra. N’oge na-adịghị anya, Jehova tụbara oké ifufe n’oké osimiri ahụ, onye ụgbọ ọ bụla ụjọ ji na-etikukwa chi ya maka enyemaka. Ụgbọ ahụ na-adagharị nke ukwuu nke na a tụbara ihe ndị ụgbọ ahụ bu n’ime mmiri iji mee ka ụgbọ mmiri ahụ dị mfe. Ma, ọ ka yiri ka ụgbọ ahụ ọ ga-ekpurịrị, Jona wee nụ ka onye isi nke ndị ọkà ụgbọ ahụ ụjọ ji na-eti, sị: “Gịnị na-eme gị, gị onye oké ụra? bilie, kpọkuo Chineke gị, eleghị anya Chineke ga-echeta anyị, anyị wee ghara ịla n’iyi.” Jona ebilie wee rịgoo n’elu ụgbọ mmiri ahụ.—Jona 1:4-6.
“Bịanụ, ka anyị fee nzà,” ka ndị ụgbọ mmiri ahụ sịrị, “ka anyị wee mara n’ihi onye ihe ọjọọ a ruworo anyị ahụ.” Nzà ahụ ama Jona. Cheedị banyere obi erughị ala ya ka ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ na-asị: “Biko, gosi anyị n’ihi onye ihe ọjọọ a ruworo anyị ahụ; olee ozi ị na-eje? ọ bụkwa olee ebe i si bịa? olee ala gị? olee ndị i siri n’ime ha pụta?” Jona kwuru na ya bụ onye Hibru nke na-efe “Jehova, bụ́ Chineke nke eluigwe” nakwa na ya nwere egwu nsọpụrụ maka “Onye mere oké osimiri na ala akọrọ.” Oké ifufe ahụ abịakwasịwo ha n’ihi na o si n’ihu Jehova na-agbapụ kama iji nrubeisi were ozi Chineke gaa Nineve.—Jona 1:7-10.
Ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ jụrụ, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme gị, ka oké osimiri wee dajụọ ghara ịmakwasị anyị?” Ka oké osimiri ahụ nọ na-amalikwu elu karị, Jona kwuru, sị: “Bulienụ m, tụba m n’oké osimiri; oké osimiri ewee dajụọ ghara ịmakwasị unu: n’ihi na mụ onwe m amawo na ọ bụ n’ihi m ka oké ifufe dị ukwuu a na-efekwasị unu.” N’adịghị njikere ịtụba ohu Jehova n’ime oké osimiri na ọnwụ e ji n’aka, ndị ikom ahụ gbalịrị ịnyara ya gaa n’ala akọrọ. Ebe ha na-emelighị ya, ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ sịrị: “Biko, Jehova, biko, ekwela ka anyị laa n’iyi n’ihi ndụ nwoke a, etinyekwasịkwala n’isi anyị ọbara na-emeghị ihe ọjọọ: n’ihi na Gị onwe gị, bụ́ Jehova, emewo dị ka o si tọọ Gị.”—Jona 1:11-14.
N’ime Oké Osimiri!
Ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ wee si n’ụgbọ ahụ tụpụ Jona. Ka ọ na-emibanye n’oké osimiri ahụ na-amali elu, ọgbụgbọ ya amalite ịkwụsị. Mgbe ha hụrụ nke a, “ndị ikom ahụ wee tụọ egwu Jehova nke ukwuu, ha wee chụọrọ Jehova àjà, kweekwa nkwa.”—Jona 1:15, 16.
Ka mmiri ahụ na-ekpuchi Jona, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ nọ na-ekpe ekpere. Mgbe ahụ ọ hụrụ onwe ya ka ọ na-amịcha agbada n’oghere dị nro ka ọ na-agbada n’oghere buru ibu karị. N’ụzọ na-eju anya, ọ ka pụrụ iku ume! N’ikochapụ ahịhịa mmiri n’isi ya, Jona nwetara onwe ya n’ebe pụrụ iche n’ezie. Nke a bụ n’ihi na ‘Jehova gụpụtara otu azụ ukwu ilo Jona; Jona wee nọ n’afọ azụ ahụ ụbọchị atọ ehihie na abalị.’—Jona 1:17.
Ekpere Siri Ike nke Jona
N’afọ oké azụ ahụ, Jona nwere oge maka ikpe ekpere. Ụfọdụ n’ime ihe ndị o kwuru yiri ndị dị n’ụfọdụ abụ ọma. Jona mesịrị dekọọ ekpere ya ndị na-ekwupụta ma obi nkoropụ ma nchegharị. Dị ka ihe atụ, nye ya o yiri ka afọ azụ ga-aghọ Sheol, ili ya. Ya mere o kpere ekpere, sị: “Esiri m n’ahụhụ m kpọkuo Jehova, O wee za m; n’afọ [Sheol, NW] ka m siri tikuo Ya, Ị nụrụ olu m.” (Jona 2:1, 2) Abụ Nrịgo abụọ—ndị o yiri ka ndị Israel na-arịgo Jerusalem maka ememe kwa afọ ha na-abụ—na-egosipụta echiche yiri ndị ahụ.—Abụ Ọma 120:1; 130:1, 2.
N’icheghachi echiche ná nrịda ya baa n’oké osimiri ahụ, Jona kpere ekpere, sị: “Ị [Jehova] tụbara m n’ime mmiri dị omimi, n’etiti [n’obi] oké osimiri nile, osimiri dịkwa m gburugburu; ebili mmiri Gị nile na mmali mmiri Gị nile gabigara n’isi m.”—Jona 2:3; tụlee Abụ Ọma 42:7; 69:2.
Jona na-atụ ụjọ na nnupụisi ya ga-eme ka ya ghara inwekwa ihu ọma Chineke nakwa na ọ gaghị ahụkwa ụlọ ukwu Chineke anya ọzọ. O kpere ekpere, sị: “Mụ onwe m wee sị, Achụpụwo m n’ihu anya Gị abụọ; otú ọ dị, m ga-elegidekwa gị anya ọzọ n’ebe ụlọ ukwu Gị dị nsọ dị.” (Jona 2:4; tụlee Abụ Ọma 31:22.) Ọnọdụ Jona yiri ka ọ dị oké njọ nke na o kwuru, sị: “Mmiri gbara m gburugburu, ruo mkpụrụ obi [na-etinye ndụ ya n’ihe ndụ]; ogbu mmiri dị m gburugburu; achara mmiri kụkụrụ m n’isi.” (Jona 2:5; tụlee Abụ Ọma 69:1.) Cheedị echiche banyere ọnọdụ ọjọọ nke Jona, n’ihi na ọ na-ekwukwasị: “Ruo ala ugwu nile ka m rịdara [n’ime azụ ahụ]; ala, ihe ntụchi ya nile [ndị yiri nke ili] kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi: ma I mewo ka ndụ m si n’olulu rịgopụta [n’ụbọchị nke atọ], Jehova, bụ́ Chineke m.”—Jona 2:6; tụlee Abụ Ọma 30:3.
Ọ bụ ezie na ọ nọ n’ime afọ azụ ahụ, Jona echeghị, sị: ‘Enweela m oké ịda mbà n’obi nke na enweghị m ike ikpe ekpere.’ Kama nke ahụ, o kpere ekpere, sị: “Mgbe mkpụrụ obi m na-enweghị ike n’ime m [n’ọnụ ọnwụ], Jehova ka m chetara [n’okwukwe, dị ka Onye nwere ike na ebere na-enweghị atụ]: ekpere m wee bakwute Gị, baa n’ụlọ ukwu Gị dị nsọ.” (Jona 2:7) Site n’ụlọ ukwu nke eluigwe, Chineke nụrụ olu Jona wee zọpụta ya.
Ná mmechi Jona kpere ekpere, sị: “Ndị na-arịba ihe efu dị iche iche nke na-abụghị ihe ama [site n’ịtụkwasị obi n’ihe oyiyi nke chi ụgha nile na-adịghị ndụ], ebere ha ka ha na-ahapụ [n’ịhapụ Onye ahụ nke na-egosipụta àgwà a]. Ma mụ onwe m ga-eji olu ekele chụọrọ Gị [Jehova Chineke] àjà; ihe nke m kweworo ná nkwa [n’oge ahụmahụ a ma ọ bụ n’oge ndị ọzọ] ka m ga-akwụghachi. Nzọpụta dịịrị Jehova.” (Jona 2:8, 9; tụlee Abụ Ọma 31:6; 50:14.) N’ịmara na nanị Chineke pụrụ ịnapụta ya n’ọnwụ, onye amụma ahụ nwere nchegharị (dị ka Eze Devid na Solomọn bu ya ụzọ) kwuru na nzọpụta dịịrị Jehova.—Abụ Ọma 3:8; Ilu 21:31.
Jona Erube Isi
Mgbe o chesịrị echiche nke ukwuu, kpesịakwa ekpere siri ike, ọ dị Jona ka a na-enupụ ya site n’oghere ahụ o si bata. N’ikpeazụ, a tụpụrụ ya n’ala akọrọ. (Jona 2:10) N’inwe ekele maka nnapụta, Jona rubere isi n’okwu Chineke, bụ́: “Bilie, jeruo Nineve, bụ́ obodo ukwu ahụ, kpọsaara ya mkpọsa ahụ nke Mụ onwe m na-agwa gị.” (Jona 3:1, 2) Jona gawara n’isi obodo Asiria. Mgbe ọ matara ụbọchị ọ bụ, ọ ghọtara na ya nọrọ ụbọchị atọ n’afọ azụ ahụ. Onye amụma ahụ gafeere Osimiri Yufretis n’ebe ọ gbagọrọ nke ukwuu n’akụkụ ọdịda anyanwụ, gaa n’akụkụ ọwụwa anyanwụ gabiga ebe ugwu Mesopotamia, bịaruo Osimiri Taịgris, wee rute obodo ukwu ahụ n’ikpeazụ.—Jona 3:3.
Jona abanye Nineve, bụ́ obodo ukwu. O jere ije ruo otu ụbọchị, wee kpọsazie, sị: “Ọ fọdụrụ [iri ụbọchị anọ], e wee kwatuo Nineve.” È mewo ka Jona mara asụsụ ndị Asiria n’ụzọ ọrụ ebube? A gwaghị anyị. Ma a sịgodị na ọ na-asụ asụsụ Hibru onye ọzọ ana-atụgharịkwa ya, mkpọsa ya rụpụtara ihe. Ndị Nineve malitere inwe okwukwe na Chineke. Ha kpọsara obubu ọnụ ma yiri ákwà mkpe, malite n’onye ukwu ruo n’onye nta n’ime ha. Mgbe okwu ahụ rutere eze Nineve ntị, o biliri n’ocheeze ya, yipụ uwe eze ya, jiri ákwà mkpe kpuchie ya, ma nọkwasị ná ntụ.—Jona 3:4-6.
Lee ka o si ju Jona anya! Eze Asiria zipụrụ ndị mkpọsa ozi ka ha kwusaa, sị: “Ka mmadụ na anụmanụ, ma ìgwè ehi ma ìgwè ewu na atụrụ, ghara idetu ihe ọ bụla n’ọnụ: ka ha ghara ịzụ onwe ha, gharakwa ịṅụ mmiri: ma ka ha kpuchie onwe ha n’ákwà mkpe, ma mmadụ ma anụmanụ, ka ha kpọkusiekwa Chineke ike: ka ha chigharịakwa, onye ọ bụla ya pụọ n’ụzọ ọjọọ ya, na n’ihe ike nke dị n’ọbụ aka ha. Ònye maara? eleghị anya Chineke ga-echigharị, chegharịa uche, si n’iwe Ya dị ọkụ chigharịa, ka anyị wee ghara ịla n’iyi.”—Jona 3:7-9.
Ndị Nineve rubere isi n’iwu eze ha. Mgbe Chineke hụrụ na ha echigharịwo site n’ụzọ ọjọọ ha, o wee chegharịa uche banyere ihe ọjọọ ahụ nke o kwuru na ọ ga-eme ha, ya mere o meghị ya. (Jona 3:10) N’ihi nchegharị, ịdị umeala n’obi, na okwukwe ha, Jehova kpebiri ịghara iwetara ha ikpe ọmụma ahụ o zubere.
Onye Amụma nke Obi Na-adịghị Mma
Iri ụbọchị anọ gafere ma ọ dịghị ihe mere Nineve. (Jona 3:4) N’ịchọpụta na a gaghị ebibi ndị Nineve, obi adịghị Jona mma ma ọlị, o wekwara iwe dị ọkụ wee kpee ekpere, sị: “Biko, Jehova, Ǹke a [ọ́ bụghị] okwu m, mgbe m na-anọ n’ala m? N’ihi nke a ka m buru ụzọ gbalaga na Tashish: n’ihi na amaara m na Gị onwe gị bụ Chineke nke bụ onye amara, onye obi ebere, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Nke na-abakwa ụba n’ebere, Nke na-echegharịkwa uche banyere ihe ọjọọ ahụ Ị ga-eweta. Ma ugbu a, Jehova, biko, wepụ ndụ m n’ahụ m; n’ihi na ọ ka m mma ịnwụ ọnwụ karịa ịdị ndụ.” Chineke ji ajụjụ a zaghachi: “Ị̀ na-eme nke ọma n’iwe iwe dị ọkụ?”—Jona 4:1-4.
Mgbe ahụ, Jona mere mkpapụ pụọ n’obodo ahụ. N’ịga n’ebe ọwụwa anyanwụ, o wuru ụlọ ntu ka o wee nọdụ n’okpuru ndo ya ruo mgbe ọ hụrụ ihe ga-eme obodo ahụ. N’aka nke ya, Jehova jiri ọmịiko “gụpụta otu ogiri ụgba, mee ka o tolite n’elu Jona, ka o wee bụrụ ndo n’elu isi ya, ịnapụta ya n’ọnọdụ ọjọọ ya.” Lee ka Jona si ṅụrịa ọṅụ n’ihi osisi ogiri ụgba ahụ! Ma Chineke mere ka otu ikpuru ribie osisi ahụ na chi ọbụbọ, o wee malite ịkpọnwụ. N’oge na-adịghị anya ọ kpọnwụrụ kpam kpam. Chineke ezipụkwa ifufe na-akpọ ihe nkụ site n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ugbu a anwụ na-acha onye amụma ahụ n’isi, nke na ọ na-atụbọ atụbọ. Ọ nọgidere na-arịọ ka ya nwụọ. Ee, Jona kwuru ugboro ugboro, sị: “Ọ ka m mma ịnwụ ọnwụ karịa ịdị ndụ.”—Jona 4:5-8.
Jehova kwuru okwu ugbu a. Ọ jụrụ Jona, sị: “Ị̀ na-eme nke ọma n’iwe iwe dị ọkụ banyere ogiri ụgba ahụ?” Jona zara, sị: “Ana m eme nke ọma n’iwe iwe dị ọkụ ruo ọnwụ.” N’ụzọ bụ isi, Jehova gwara onye amụma ahụ ugbu a, sị: “Gị onwe gị meere ogiri ụgba nke a ebere, bụ́ ihe nke ị na-adọgbughị onwe gị n’ọrụ n’ihi ya, nke ị na-emeghịkwa ka ọ dị ukwuu; nke tolitere n’otu abalị, laakwa n’iyi n’otu abalị.” Chineke gara n’ihu kwuo, sị: ‘Mụ onwe m kwa, M̀ gaghị emere Nineve ebere, bụ́ obodo ukwu ahụ; nke ihe karịrị 120,000 mmadụ nọ n’ime ya, bụ́ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha na aka ekpe ha; na ọtụtụ anụmanụ?’ (Jona 4:9-11) Azịza ya ziri ezi doro anya.
Jona nwere nchegharị ma dịrị ndụ dee akwụkwọ Bible ahụ bu aha ya. Olee otú o si mara na ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ tụrụ egwu Jehova, chụọrọ Ya àjà, ma kwe nkwa dị iche iche? Site n’ike mmụọ nsọ Chineke ma ọ bụ ikekwe n’ụlọ nsọ ahụ site n’ọnụ otu n’ime ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ ma ọ bụ ndị o bu.—Jona 1:16; 2:4.
“Ihe Ịrịba Ama nke Jona”
Mgbe ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii jụrụ Jisọs Kraịst maka ihe ịrịba ama, o kwuru, sị: “Ajọ ọgbọ nke na-akwakwa iko na-achọ ihe ịrịba ama; a gaghị enyekwa ya ihe ịrịba ama ma ọ bụghị ihe ịrịba ama nke Jona onye amụma.” Jisọs kwukwasịrị: “N’ihi na dị ka Jona nọrọ ụbọchị atọ ehihie na abalị n’afọ oké anụ mmiri; otú a Nwa nke mmadụ ga-anọ n’obi nke ala ụbọchị atọ ehihie na abalị.” (Matiu 12:38-40) Ụbọchị ndị Juu na-amalite mgbe anyanwụ dara. Kraịst nwụrụ n’ehihie Friday, Nisan 14, 33 O.A. E tinyere ahụ ya n’ime ili tupu anwụ adaa n’ụbọchị ahụ. Nisan 15 malitere n’uhuruchi ahụ ma dịgide ruo mgbe anyanwụ dara na Saturday, ụbọchị nke asaa na nke ikpeazụ n’ime izu ahụ. N’oge ahụ Nisan 16 malitere ma dịgide ruo mgbe anyanwụ dara n’ụbọchị anyị na-akpọ Sunday. N’ihi ya, Jisọs nwụrụ ma nọrọ n’ili ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo oge ụfọdụ na Nisan 14, nọrọ n’ime ili ogologo ụbọchị nile nke Nisan 15, ma nọ hour abalị nile nke Nisan 16 n’ime ili. Mgbe ụmụ nwanyị ụfọdụ bịara n’ili ahụ n’ụtụtụ Sunday, e meelarị ka o si n’ọnwụ bilie.—Matiu 27:57-61; 28:1-7.
Jisọs nọrọ n’ime ili ruo akụkụ ụfọdụ nke ụbọchị atọ. Ndị iro ya si otú a nweta “ihe ịrịba ama nke Jona,” ma Kraịst kwuru, sị: “Ndị ikom Nineve ga-eso ọgbọ a bilie n’ikpe ahụ, ha ga-amakwa ya ikpe: n’ihi na ha chegharịrị ná nkwusa nke Jona; ma lee, Onye ka Jona nọ n’ebe a.” (Matiu 12:41) Lee ka o si bụrụ eziokwu! Ndị Juu ahụ nwere Jisọs Kraịst n’etiti ha—onye amụma karịrị nnọọ Jona. Ọ bụ ezie na Jona bụ ihe ịrịba ama zuru ezu nye ndị Nineve, Jisọs jiri ikike na ihe àmà ka nnọọ ukwuu nke na-akwado ihe o kwuru wee mee nkwusa karịa ka onye amụma ahụ mere. Ma, ndị Juu n’ozuzu ha ekwetaghị.—Jọn 4:48.
Dị ka otu mba ndị Juu ejighị ịdị umeala n’obi nakwere Onye Amụma ahụ ka Jona ukwuu, ha egosighịkwa okwukwe n’ebe Ọ nọ. Ma gịnị banyere ndị nna nna ha? Ha onwe ha kwa enweghị okwukwe na mmụọ ịdị umeala n’obi. N’ezie, o doro anya na Jehova zipụrụ Jona gaa Nineve iji gosi ọdịiche dị n’etiti ndị Nineve nwere nchegharị na ndị Israel na-ekwesị olu ike, bụ́ ndị na-enweghị okwukwe na ịdị umeala n’obi ma ọlị.—Tụlee Deuterọnọmi 9:6, 13.
Gịnị banyere Jona n’onwe ya? Ọ mụtara otú ebere Chineke dịruru ukwuu. Ọzọkwa, mmeghachi omume Jehova nye ntamu Jona banyere ebere e gosiri ndị Nineve nwere nchegharị kwesịrị igbochi anyị ime mkpesa mgbe Nna anyị nke eluigwe gosiri ndị mmadụ ebere n’oge anyị. N’ezie, ka anyị ṅụrịa ọṅụ na ọtụtụ puku mmadụ na-eji okwukwe na ịdị umeala n’obi na-echigharịkwuru Jehova kwa afọ.