Ṅomie Okwukwe Ha
Ọ Mụtara Ime Ebere
JONA ga-enwe oge buru ibu ọ ga-eji chee echiche. Ọ na-abịa ime njem karịrị narị kilomita asatọ, bụ́ njem ga-ewe ya otu ọnwa ma ọ bụ karị. Ọ ga-ebugodị ụzọ họrọ ma ọ̀ ga-esi ụzọ ka nso ka ọ̀ ga-esi nke ka anya na-adịchaghị ize ndụ, jirizie nwayọọ nwayọọ gawa njem ahụ, gafee ọtụtụ ndagwurugwu na ọtụtụ ugwu. Ọ ga-aga nnukwu Ọzara Siria akụkụ akụkụ, rufee osimiri ndị dị ka nnukwu osimiri Yufretis, hiekwa na nke ndị mba ọzọ n’obodo ndị dị na Siria, Mesopotemia, na Asiria. Ka ọ na-aga, ọ nọ na-eche banyere obodo Ninive ahụ tụrụ ya oké ụjọ, ma, ọ na-eru ya nso n’ike n’ike.
Ọ dị otu ihe doro Jona anya: O nweghị ike ịtụgharị gbaghachiwe azụ. O meela ya mbụ. Mgbe mbụ Jehova gwara Jona ka ọ gaa zie nnukwu obodo a e wusiri ike dị n’Asiria ozi na a ga-ebibi ya, o mere ngwa ngwa banye n’ụgbọ mmiri gawa ebe ọzọ. Jehova ziteziri oké ebili mmiri, n’oge na-adịghịkwa anya, Jona hụrụ na nnupụisi ya na-aga igbu mmadụ niile nọ n’ụgbọ ahụ. Ya agwa ndị ụgbọ mmiri ahụ ka ha tụba ya n’oké osimiri n’ihi na ọ chọghị ka ha nwụọ. Ebe ọ bụ na ha amaghị ihe ọzọ ha ga-eme, ha tụbara ya, Jona chekwara na ọnwụ ya abịala. Ma, Jehova zigara otu nnukwu azụ̀ ka o loo Jona. Mgbe ụbọchị atọ gafere, azụ̀ ahụ gbọpụtara ya n’ikpere mmiri n’enweghị ihe mere ya, egwu eju ya ahụ́, ya adịkwuo njikere ime ihe a gwara ya.a—Jona, isi nke 1 na nke 2.
Mgbe Jehova nyere Jona iwu ka ọ gaa Ninive nke ugboro abụọ, onye amụma ahụ rubere isi, tinye isi n’ebe ọwụwa anyanwụ ma gawa ogologo njem ahụ. (Jona 3:1-3) Ma, ò kwela ka ịdọ aka ná ntị Jehova gbanwee àgwà ya kpamkpam? Dị ka ihe atụ, Jehova emeerela ya ebere, mee ka mmiri ghara iri ya, hapụ ịta ya ahụhụ maka inupụ isi, nyekwa ya ohere ọzọ ka ọ gaa ozi a o dunyere ya. Ka ihe a niile mechara, Jona ọ̀ mụtala imere ndị ọzọ ebere? Ịmụta ime ebere na-esikarịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè ike. Ka anyị hụ ihe anyị ga-amụta n’aka Jona ka ọ na-agbalị ịmụta ime ebere.
Mgbe O Ziri Ha Ozi Amamikpe, Ihe Ha Mere Tụrụ Ya n’Anya
Jona eleghị Ninive anya otú Jehova si lee ya anya. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ninive bụ obodo dị nnọọ ukwuu n’anya Chineke.” (Jona 3:3) N’akwụkwọ Jona, Jehova kwuru “Ninive bụ́ obodo ukwu” ugboro atọ. (Jona 1:2; 3:2; 4:11) Olee ihe mere obodo a ji buru obodo ukwu, ma ọ bụ obodo dị mkpa, n’anya Jehova?
Ninive bụ obodo ochie n’ihi na o so n’obodo ndị mbụ Nimrọd wuru mgbe Iju Mmiri gachara. Ọ bụ nnukwu obodo mepere emepe nke ọ ga-abụ na o nwere obodo ndị ọzọ n’ime ya, nke mere ọ ga-eji wee mmadụ abalị atọ isi n’otu nsọtụ ya ruo na nsọtụ ya nke ọzọ. (Jenesis 10:11; Jona 3:3) O doro anya na Ninive buru ibu, nwee ọtụtụ ụlọ nsọ ndị mara mma, mgbidi ndị dị elu, na nnukwu ụlọ ndị ọzọ. Ma, ọ bụghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a mere ka obodo ahụ bụrụ obodo dị mkpa n’anya Jehova Chineke. Ihe dị Chineke mkpa bụ ndị bi n’obodo ahụ. Ndị bi na Ninive dị nnọọ ọtụtụ ma e jiri ha tụnyere ndị bi n’obodo ndị ọzọ dị n’oge ahụ. N’agbanyeghị ihe ọjọọ niile ha na-eme, Jehova na-echebara ha echiche. O ji ndụ mmadụ kpọrọ ihe, marakwa na onye ọ bụla nwere ike ichegharị ma mụta ime ihe ziri ezi.
Mgbe Jona mesịrị banye na Ninive, o nwere ike ịbụ na ihe karịrị otu narị puku mmadụ na puku iri abụọ bi na ya medịrị ka ụjọ tụkwuo ya.b Ọ gara ije otu ụbọchị, na-abami n’ime obodo ahụ ndị mmadụ juru, ikekwe, na-achọ ebe dị mma n’etiti obodo ahụ ọ ga-anọ malite izi ozi o ji bịa. Olee otú ọ ga-esi zie ha ozi ahụ? Ọ̀ maara asụsụ ndị Asiria? Ka Jehova ọ̀ rụụrụ ya ọrụ ebube ya amụta asụsụ ahụ? Anyị amaghị. O nwere ike ịbụ na Jona ziri ozi ya n’asụsụ ya bụ́ Hibru, onye nsụgharị agwazie ya ndị Ninive n’asụsụ ha. Nke ọ bụla ọ bụ, ozi ya doro anya, o yikwaghị ka ọ̀ ga-amasị ndị obodo ahụ. Ọ sịrị ha: “Naanị ụbọchị iri anọ fọrọ ka a kwatuo Ninive.” (Jona 3:4) O kwuru ya n’atụghị egwu, kwuokwa ya ugboro ugboro. Ihe a o mere gosiri na o nwere nnọọ obi ike na okwukwe, bụ́ àgwà ndị dị Ndị Kraịst mkpa taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ.
Ndị Ninive nụrụ ozi Jona. O doro anya na o jikeere ejikere ebe o chere na ndị ahụ ga-emegide ya. Kama imegide ya, ihe dị ịtụnanya mere. Ndị ahụ gere ya ntị! Ozi ya gbasara ngwa ngwa. N’oge na-adịghị anya, ndị niile nọ n’obodo ahụ nọ na-ekwu banyere amụma mbibi Jona nọ na-ebu. Akwụkwọ Jona gwara anyị, sị: “Ndị Ninive wee malite inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ, ha wee kpọsaa ibu ọnụ nakwa ka e yiri ákwà iru uju, malite n’onye kasị ukwuu n’ime ha ọbụna ruo n’onye kasị nta n’ime ha.” (Jona 3:5) Mmadụ niile malitere ichegharị, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye, ndị ahụ́ siri ike na ndị ahụ́ na-esighị ike, ma ụmụntakịrị ma ndị agadi. N’oge na-adịghị anya, akụkọ ruru eze ha ntị na mmadụ niile echegharịwala.
Eze ahụ malitekwara ịtụ egwu Chineke. O biliri n’ocheeze ya, yipụ uwe eze ya, yiri nkịrịka ákwà ndị obodo ya yi, ọbụna “nọdụ ala ná ntụ.” Ya na “ndị ukwu” ya nyere iwu ka ọnụ ahụ ndị mmadụ malitere ibu n’onwe ha ghọzie iwu eze. O nyere iwu ka mmadụ niile, ọbụna anụ ụlọ, yiri ákwà iru uju.c O wedara onwe ya ala ma kweta na ndị ya bụ ndị mmehie na ndị na-eme ihe ike. O kwukwara na ya nwere olileanya na iwe Chineke ga-ajụrụ mgbe ọ hụrụ na ha echegharịala, bụ́ nke mere o ji kwuo, sị: “Chineke . . . ga-alaghachi azụ ma gbanwee obi ya wee mee ka iwe ya dị ọkụ dajụọ, anyị ewee ghara ịla n’iyi.”—Jona 3:6-9.
Ụfọdụ ndị na-akatọ Baịbụl ekwetaghị na ndị Ninive ga-agbanweli obi ha ọsọ ọsọ otú ahụ. Ma, ndị ọkà mmụta Baịbụl kwuru na otú ahụ ha si chegharịa dabara na nkwenkwe na-enweghị isi obodo ndị dị otú ahụ nwere n’oge ochie nakwa n’otú ha si agbanwe obi ha ngwa ngwa. Jizọs Kraịst n’onwe ya kwukwara banyere nchegharị ndị Ninive. (Matiu 12:41) Ọ ma ihe ọ na-ekwu, n’ihi na ọ dị ndụ n’eluigwe mgbe ahụ, hụ ka ihe ahụ niile na-eme. (Jọn 8:57, 58) Ma, olee ihe Jehova mere mgbe ọ hụrụ na ndị Ninive echegharịala?
Ọdịiche Dị n’Ebere Chineke na Ịkpọ Ekwe Nkụ Mmadụ
Jona mechara dee, sị: “Ezi Chineke wee hụ ọrụ ha, na ha ahapụwo ụzọ ọjọọ ha; ezi Chineke wee gbanwee obi ya banyere ọdachi o kwuru na ya ga-ewetara ha; o wetaghịzi ya.”—Jona 3:10.
Nke a ọ̀ pụtara na Jehova chọpụtara na ikpe ya kpere ndị Ninive ezighị ezi? Ee e. Baịbụl kwuru banyere Jehova, sị: “Ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ, n’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi. Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ.” (Diuterọnọmi 32:4) Naanị ihe merenụ bụ na iwe Jehova wesoro ndị Ninive dajụrụ. Ọ hụrụ na ndị ahụ echegharịala ma chọpụta na ahụhụ ahụ ọ chọburu ịta ha ekwesịghịzi ekwesị. Ihe Chineke ga-eme ugbu a bụ imere ha ebere.
Jehova adịghị aka ike, ọ bụghịkwa Chineke obi ọjọọ nke na-enweghị obi ebere ndị ndú okpukpe na-asịkarị na ọ bụ. Kama nke ahụ, ọ na-echebara ndị mmadụ echiche, o nwere ike ịgbanwe ihe ọ chọrọ ime mgbe ọ dị mkpa ka o mee otú ahụ, ọ dịkwa obi ebere. Mgbe o kpebiri ịta ndị ajọ omume ahụhụ, ọ na-ebu ụzọ edunye ndị na-anọchite anya ya n’ụwa ka ha dọọ ha aka ná ntị, n’ihi na ọ na-agụ ya agụụ ka ndị ajọ omume mee ihe ahụ ndị Ninive mere, ya bụ, ka ha chegharịa ma gbanwee àgwà ha. (Ezikiel 33:11) Jehova gwara onye amụma ya bụ́ Jeremaya, sị: “Mgbe ọ bụla m kwuru okwu banyere mba ọ bụla, kwuokwa okwu banyere alaeze ọ bụla, na m ga-efopụ ya, kwatuokwa ya ma bibie ya, mba ahụ wee hapụ ihe ọjọọ ya nke m kwuru na ọ dịghị mma, m ga-agbanwe obi m n’ọdachi ahụ m bu n’obi ime ka ọ dakwasị ya.”—Jeremaya 18:7, 8.
Nke ahụ ọ̀ pụtara na amụma Jona bụ amụma ụgha? Ee e; amụma ya mezuru ihe mere e ji buo ya, ya bụ, iji dọọ ndị mmadụ aka ná ntị. Ihe mere e ji nye ịdọ aka ná ntị ahụ bụ àgwà ọjọọ ndị Ninive na-akpa, bụ́ nke ha mesịrị kwụsị. Ọ bụrụ na ndị Ninive emechaa laghachi n’àgwà ọjọọ ha, ikpe Chineke ga-abịakwasị ha. Ọ bụkwa kpọmkwem ihe mechara mee.—Zefanaya 2:13-15.
Olee ihe Jona mere mgbe mbibi ahụ na-abịaghị mgbe ọ tụrụ anya ya? Anyị na-agụ, sị: “Ma nke ahụ wutere Jona nke ukwuu, iwe ya wee dị ọkụ.” (Jona 4:1) Jona kpedịrị ekpere yiri ka ò ji ya na-abara Onye Pụrụ Ime Ihe Niile mba! Jona kwuru na ọ gaara akara ya mma ịnọrọ n’obodo ya, n’ala ya. Ọ sịrị na ya mabu na Jehova agaghị ebibi Ninive nakwa na ọ bụ ya mere ya ji gbagawa Tashish. Ọ rịọziri Jehova ka o mee ka ya nwụọ, na ịnwụ anwụ kaara ya mma.—Jona 4:2, 3.
Olee ihe bụ́ nsogbu Jona? Anyị agaghị amatali ihe niile ọ nọ na-eche, ma anyị maara na Jona agwala mmadụ niile nọ na Ninive na a ga-ebibi obodo ahụ. Ha kwekwaara ihe o kwuru. Ma ugbu a, ọ dịghị mbibi na-abịanụ. Ọ̀ ga-abụ na ọ̀ nọ na-eche na a ga-akwawa ya emo ma ọ bụ kpọọ ya onye amụma ụgha? N’agbanyeghị ihe ọ nọ na-eche, nchegharị ahụ ndị ahụ chegharịrị na ebere Jehova meere ha emeghị ya obi ụtọ. Kama nke ahụ, o yiri ka obi ọ̀ nọ na-ajọkwu ya njọ, ya ana-emekwuru onwe ya ebere ma na-eche na e mechuola ya ihu. Ma, o doro anya na Chineke Jona, bụ́ onye na-eme ebere, ka hụrụ na nwoke a obi ọjọọ na-eme nwere àgwà ọma ụfọdụ. Kama Jehova ịta Jona ahụhụ maka asọpụrụghị ya, naanị ihe o mere bụ ịjụ ya otu ajụjụ ga-eme ka o chee echiche, nke bụ́: “Iwe dị ọkụ ị na-ewe ò ziri ezi?” (Jona 4:4) Jona ọ̀ zadịrị ajụjụ ahụ? Baịbụl agwaghị anyị.
Otú Jehova Si Kụziere Jona Ihe
Onye amụma ahụ obi na-adịghị mma hapụrụ Ninive, ma ọ lawaghị n’obodo ya, kama, ọ gawara n’ebe ọwụwa anyanwụ bụ́ ebe e nwere ugwu ụfọdụ ndị e nwere ike ịnọ n’elu ha hụ ebe ahụ Ninive dị. O wuuru onwe ya ụlọ ndò ma nọrọ na ya na-ele ihe ga-eme Ninive. Ikekwe, obi ya ka bụ na a ga-ebibi Ninive. Olee otú Jehova ga-esi kụziere nwoke a kpọrọ ekwe nkụ ime ebere?
N’abalị, Jehova mere ka osisi ogiri ụgba pulite n’ebe ahụ. Mgbe Jona tetara, ọ hụrụ osisi ahụ akwụkwọ ya sara mbara, nke kpuchiri ya nke ọma karịa obere ụlọ ndò ahụ o wuru. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ. “Jona wee malite ịṅụrị ọṅụ nke ukwuu” n’ihi osisi ahụ, ikekwe, chee na Chineke ji ya gọzie ya ma gosi na obi dị Ya mma n’ebe ọ nọ. Ma, ihe Jehova chọrọ imere Jona abụghị naanị ikpuchi ya ihe ka anwụ gharazie ịcha ya na inyere ya aka ka ọ kwụsị iwe iberibe ahụ ọ na-ewe. Ọ chọrọ iru n’obi Jona. N’ihi ya, Chineke mere ka ọtị tagbuo osisi ahụ. O meziri ka “ifufe dị ọkụ nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ fee” ruo mgbe Jona ‘malitere ịtụbọ’ n’ihi okpomọkụ. Obi maliteghachiri ịjọ Jona njọ, ọ rịọkwara Chineke ka ya nwụọ.—Jona 4:6-8.
Jehova jụrụ Jona ọzọ ma iwe ọ na-ewe ò ziri ezi. Ná nke ugbu a, ihe ọ na-ajụ ya bụ ma iwe ọ na-ewe banyere osisi ogiri ụgba ahụ ò ziri ezi. Kama Jona ga-echegharị, o ji iwe gbachitewere onwe ya, sị: “Iwe dị ọkụ m na-ewe nke na m chọrọ ịnwụ ziri ezi.” Oge eruola mgbe Jehova ga-eme ka ọ ghọta ihe ọ chọrọ ịkụziri ya.—Jona 4:9.
Chineke gwara Jona okwu ruru ya n’obi, sị onye amụma ahụ na o meteere osisi nkịtị toro n’abalị ebere, bụ́ osisi Jona na-akụghị, nke ọ na-amakwanụghị otú o si too. Chineke gwaziri ya, sị: “Ọ̀ bụ na mụ onwe m ekwesịghị imere Ninive bụ́ obodo ukwu ebere, bụ́ ebe e nwere ihe karịrị otu narị puku mmadụ na puku iri abụọ, bụ́ ndị na-amaghị ma ọlị ihe dị iche n’aka nri ha na aka ekpe ha, n’agụnyeghị ọtụtụ anụ ụlọ?”—Jona 4:10, 11.d
Ị̀ hụrụ ihe dị mkpa Jehova ji osisi a kụzie? Ọ dịbeghị ihe Jona mere iji lekọta osisi ahụ. Ma, ọ bụ Jehova nyere ndị Ninive ahụ ndụ ma na-enye ha ihe ndị ga-eme ka ha dịgide ndụ dịkwa ka ọ na-emere ihe niile dị ndụ n’ụwa. Olee otú Jona ga-esi jiri otu osisi kpọrọ ihe karịa ndụ otu narị puku mmadụ na puku iri abụọ, n’agụnyeghị anụ ụlọ ha niile? Ọ́ bụghị n’ihi na Jona chewere naanị banyere ọdịmma nke ya? A sị ka e kwuwe, naanị ihe mere o ji meere osisi ahụ ebere bụ na ọ baara ya uru. Ihe mere o ji na-ewe iwe na a hapụrụ ndị Ninive ọ́ bụghịkwa maka na ọ chọrọ ọdịmma onwe ya naanị, ya bụ, ịchọ ịgbara ihu ya na igosi na ihe ya kwuru bụ eziokwu?
Ọ kụziri nnọọ ihe dị mkpa! Ajụjụ bụ, Jona ọ̀ mụtara ihe ahụ a kụziiri ya? Akwụkwọ ahụ bu aha ya mechiri n’azaghị ajụjụ ahụ Jehova jụrụ. Ụfọdụ ndị na-akatọ Baịbụl nwere ike ikwu na Jona emechaghị zaa ajụjụ ahụ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Jona zara ya. Azịza ya bụ akwụkwọ ahụ n’onwe ya. E nwere ihe akaebe na-egosi na ọ bụ Jona dere akwụkwọ ahụ bu aha ya. Jirigodị anya nke uche gị hụ onye amụma ahụ mgbe ọ larurula n’obodo ya n’udo, ka ọ na-ede akwụkwọ ahụ. Ọ ga-abụ na o mekwuola agadi, marakwuo ihe, dịkwuo umeala n’obi, jiri mwute na-efufe isi ya ka ọ na-ede ihe ndị o mejọrọ, nnupụisi ya, na otú o si jụwaa isi imere ndị Ninive ebere. O doro anya na Jona mụtara ihe na ndụmọdụ Jehova ji amamihe nye ya. Ọ mụtara ime ebere. Ànyị ga-amụta ya?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Gụọ isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha—Ọ Mụtara Ihe n’Ihe O Mejọrọ,” nke dị n’Ụlọ Nche nke January 1, 2009.
b E kwuru na n’oge Jona, ọ ga-abụ na agbata puku mmadụ iri abụọ na puku mmadụ iri atọ bi na Sameria, bụ́ isi obodo Izrel, nke pụtara na ha erughị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi na Ninive. N’oge Ninive na-ewu ewu, o nwere ike ịbụ na ọ bụ ya bụ obodo kacha buo ibu n’ụwa.
c Ihe a e kwuru n’ebe a nwere ike iyi ihe na-emeghị eme, ma o nweela mgbe ụdị ihe ahụ mere tupu ya emee na Ninive. Onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus kwuru na mgbe ndị Peshia na-eruru otu ọchịagha ha a ma ama nwụrụ anwụ uju, ha mere ka anụ ụlọ ha soro ha ruo uju ahụ.
d Chineke ịsị na ndị ahụ amaghị ihe dị iche n’aka nri ha na aka ekpe ha na-egosi na ha yiri ụmụaka ma a bịa n’iwu Chineke.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 16]
Ọ na-agụ Chineke agụụ ka ndị mmehie chegharịa ma gbanwee àgwà ha, otú ahụ ndị Ninive mere
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 17]
Chineke ji osisi ogiri ụgba kụziere Jona ime ebere