ISI NKE 54
Jehova Nweere Jona Ndidi
Ndị Asiria bi na Ninive na-eme ihe ọjọọ. Jehova gwara Jona onye amụma ka ọ gaa Ninive gwa ha ka ha kwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Ma, Jona hapụrụ ebe a sịrị ya gaa, gawa ebe ọzọ. Ọ banyere ụgbọ mmiri gawa Tashish.
Ka ụgbọ ahụ nọ na-aga, oké ifufe malitere ife, ụjọ ejide ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ. Ha bidoro kpewere chi ha, na-ajụ ya, sị: ‘Gịnị mere ihe a ji eme anyị?’ N’ikpeazụ, Jona gwara ha, sị: ‘Ọ bụ mụnwa kpatara ihe a na-emenụ. Jehova dunyere m ozi, mụ ahapụ ya na-agba ọsọ. Tụbanụ m n’ime oké osimiri a ka oké ifufe a kwụsị.’ Ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ achọghị ịtụba ya na mmiri ahụ, mana Jona nọgidere na-agwa ha ka ha tụba ya. Mgbe ha tụbara ya n’oké osimiri ahụ, oké ifufe ahụ kwụsịrị.
Jona chere na ya na-aga ịnwụ. Ka ọ nọ na-adakpu n’ala ala mmiri ahụ, o kpere ekpere. Jehova zitere otu nnukwu azụ̀ bịara loo Jona. Ma Jona anwụghị. Ọ nọ n’afọ azụ̀ ahụ kpee ekpere gwa Jehova, sị: ‘M na-ekwe gị nkwa na m ga na-erubere gị isi mgbe niile.’ Jehova chebere Jona n’afọ azụ̀ ahụ ruo ụbọchị atọ. Jehova meziri ka azụ̀ ahụ gbọpụta ya n’elu ala.
Ebe ọ bụ na Jehova echebela Jona, ọ̀ pụtara na ọ gaghịzi aga ozi o dunyere ya? Mba. Jehova gwara Jona ọzọ ka ọ gaa Ninive. Na nke ugbu a, Jona rubeere ya isi. Ọ gara Ninive gwa ndị ọjọọ ahụ, sị: ‘Ọ fọrọ ụbọchị iri anọ ka e bibie Ninive.’ Ma, ihe ọ na-atụghị anya ya mere. Ndị Ninive gere ntị ma kwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Eze ndị Ninive gwara ndị obodo ya, sị: ‘Rịọnụ Chineke arịrịọ, onye ọ bụla kwụsịkwa ihe ọjọọ ọ na-eme. O nwere ike hapụzie ibibi anyị.’ Mgbe Jehova hụrụ na ndị Ninive echegharịala, o bibighị ha.
Iwe were Jona na e bibighịzi ndị Ninive. Chebaragodị ihe a echiche: Jehova nweere Jona ndidi, meekwara ya ebere, mana Jona emereghị ndị Ninive ebere. Kama, ọ pụrụ n’obodo ahụ gaa nọrọ ọdụ n’okpuru otu osisi ogiri ụgba na-ewe iwe. Osisi ahụ mechara kpọnwụọ, ezigbo iwe ejide Jona. Jehova gwara Jona, sị: ‘I meteere osisi a ebere karịa ndị Ninive. Emeere m ha ebere, ọ bụ ya mere na ebibighị m ha.’ Olee ihe Jehova ji ihe a na-akụzi? Ọ na-akụzi na ndị Ninive dị mkpa karịa osisi.
“Jehova . . . na-enwere unu ndidi n’ihi na o nweghị onye ọ chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.”—2 Pita 3:9