ISI NKE 44
Ụlọ Nsọ A Rụụrụ Jehova
Mgbe Solomọn ghọchara eze Izrel, Jehova jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ka ị ga-achọ ka m nye gị?’ Solomọn sịrị ya: ‘Abụ m nwata, o nweghịkwa ihe m ma. Biko, nye m amamihe ka m nwee ike ịna-elekọta ndị gị.’ Jehova sịrị ya: ‘Ebe ọ bụ na ị rịọrọ amamihe, m ga-eme ka ị bụrụ onye kacha mara ihe n’ụwa. M ga-emekwa ka ị bụrụ ọgaranya. Ọ bụrụ na i rubere m isi, ị ga-adị ogologo ndụ.’
Solomọn malitere ịrụrụ Chineke ụlọ nsọ. O ji ọlaedo, ọlaọcha, osisi, na nkume ndị kacha mma rụọ ya. Ọtụtụ puku ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ma otú e si arụ ụlọ so rụọ ya. Mgbe afọ asaa gafere, a rụchara ụlọ nsọ ahụ, e nyefeekwa ya Jehova. Ụlọ nsọ ahụ nwere ebe ịchụàjà, e dowekwara àjà a ga-achụrụ Jehova n’elu ya. Solomọn gburu ikpere n’ala n’ihu ebe ịchụàjà ahụ kpee ekpere, sị: ‘Jehova, ụlọ nsọ a ebughị ibu, ọ maghịkwa mma ịbụ nke gị, ma biko, nabata ofufe anyị na-efe gị, nụrụkwa ekpere anyị.’ Gịnị ka Jehova mere iji gosi na ọ nabatara ụlọ nsọ ahụ nakwa na ọ nụrụ ekpere Solomọn? Ozugbo Solomọn kpechara ekpere ahụ, Jehova zitere ọkụ, ya erechapụ àjà ahụ e dowere n’ebe ịchụàjà. N’eziokwu, Jehova nabatara ụlọ nsọ ahụ. Mgbe ndị Izrel hụrụ ihe a merenụ, ha ṅụrịrị ọṅụ.
A ma Eze Solomọn ama ka onye ma ihe n’Izrel nakwa n’obodo ndị dị anya. Ndị mmadụ na-abịa akọsara Solomọn nsogbu ha ka o nyere ha aka. Eze nwaanyị Shiba bịadịrị jụọ Solomọn ajụjụ ndị siri ike ka ọ mara ma ọ̀ ga-azata ha. Mgbe ọ nụrụ ihe Solomọn zara, ọ sịrị: ‘Ekwetaghị m ihe ndị mmadụ kọọrọ m banyere gị. Ma ugbu a, ahụla m na ị ma ihe karịa otú ha kwuru. Jehova Chineke gị agọziela gị.’ Ihe nọ na-agaziri ndị Izrel, obi ana-atọkwa ha ụtọ. Ma n’oge na-adịghị anya, ihe ga-agbanwe.
“Ma, onye ka Solomọn nọ ebe a.”—Matiu 12:42