Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 7/1 p. 30-31
  • Nleta E Nyeghachiri Ụgwọ Ọrụ n’Ụba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nleta E Nyeghachiri Ụgwọ Ọrụ n’Ụba
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akụkọ Na-akpali Mmasị
  • Ajụjụ Ndị Na-agbagwoju Anya, Azịza Ndị Na-eju Afọ
  • Ihe Mmụta Dịịrị Anyị
  • Mgbe Mmesapụ Aka Bara Uba
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Sọlọmọn Bụ Eze Maara Ihe
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • O Ji Amamihe Kpọrọ Ihe
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Too Jehova Maka Amamihe Ya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 7/1 p. 30-31

Ha Mere Uche Jehova

Nleta E Nyeghachiri Ụgwọ Ọrụ n’Ụba

NJEM ahụ o mere site na Sheba gaa Jerusalem aghaghị ịbụworị nke na-agwụ ike nye eze nwanyị ahụ. Ibi ndụ ndị oké ozu maara ya ahụ. Ugbu a o ji kamel na-eme njem dị kilomita 2,400, bụ́ nke o jere ihe ka ukwuu n’ime ya n’ọzara dị ọkụ. Dị ka otu atụmatụ si dị, njem ahụ ga-ewewo ya ihe dị ka ụbọchị 75, nke ahụ bụkwa nanị n’ọgịga!a

N’ihi gịnị ka eze nwanyị a bara ọgaranya ji hapụ ebe obibi ya dị ntụsara ahụ dị na Sheba ma mee njem dị otú ahụ siri ike?

Akụkọ Na-akpali Mmasị

Eze nwanyị Sheba bịara Jerusalem mgbe ‘ọ nụsịrị akụkọ Solomọn banyere aha Jehova.’ (1 Ndị Eze 10:1) E detughị kpọmkwem ihe eze nwanyị ahụ nụrụ. Otú ọ dị, anyị maara na Jehova ji amamihe, akụ̀ na ụba, na ùgwù pụrụ iche gọzie Solomọn. (2 Ihe E Mere 1:11, 12) Olee otú eze nwanyị ahụ si mara banyere nke a? Ebe ọ bụ na Sheba bụ ógbè azụmahịa, ọ pụrụ ịbụ na ọ nụrụ banyere iwu ewu Solomọn site n’ọnụ ndị ahịa bịara ala ya. Ụfọdụ n’ime ndị a pụrụ ịgatụwo Ofia, bụ́ ala nke Solomọn soworo nnọọ zụrịta ahịa.—1 Ndị Eze 9:26-28.

Otú ọ bụla o si dị, eze nwanyị ahụ rutere Jerusalem “ya na usuu dị ọtụtụ nke ukwuu, kamel na-ebu ụda dị iche iche, na ọlaedo bara ụba nke ukwuu, na nkume dị oké ọnụ ahịa.” (1 Ndị Eze 10:2a) Ụfọdụ na-asị na “usuu dị ọtụtụ nke ukwuu” ahụ gụnyere ndị ndú ji ngwá ọgụ. Nke a ga-ekwe nghọta, ebe ọ bụ na eze nwanyị ahụ bụ onye ukwu dị ike nke bukwa ihe ndị bara uru ruru ọtụtụ iri nde dollar, na-eme njem.b

Otú ọ dị, rịba ama na eze nwanyị ahụ nụrụ banyere iwu ewu Solomọn “banyere aha Jehova.” Ya mere nke a abụghị njem achụmnta ego nkịtị. Dị ka ihe àmà na-egosi, ihe bụ́ isi mere eze nwanyị ahụ ji bịa bụ iji nụrụ amamihe Solomọn—ma eleghị anya ọbụna ịmụta ihe banyere Chineke ya, bụ́ Jehova. Ebe o yiri ka o sitere n’usoro ọmụmụ Shem ma ọ bụ Ham, bụ́ ndị fere Jehova, ọ pụrụ ịchọsiwo ike ịmata banyere okpukpe nke ndị nna nna ya ha.

Ajụjụ Ndị Na-agbagwoju Anya, Azịza Ndị Na-eju Afọ

Mgbe o zutere Solomọn, eze nwanyị ahụ malitere iji “ajụjụ ndị na-agbagwoju anya” nwaa ya. (1 Ndị Eze 10:1, NW) A pụrụ ịsụgharị okwu Hibru e ji mee ihe n’ebe a ịbụ “gwam gwam gwam.” Ma nke a apụtaghị na eze nwanyị ahụ na Solomọn malitere igwu egwu ndị na-abaghị uru. Ọ dị mma ịmara na e ji otu okwu Hibru ahụ mee ihe n’Abụ Ọma 49:4 iji kọwaa ajụjụ ndị siri ike banyere mmehie, ọnwụ, na mgbapụta. Mgbe ahụ, ma eleghị anya, eze nwanyị Sheba na Solomọn nọ na-akparịta isiokwu ndị miri emi bụ́ nke nwalere otú Solomọn nweruru amamihe. Bible na-ekwu na ọ ‘gwara ya okwu nile nke dị ya n’obi.’ Solomọn n’aka nke ya, “wee gosi ya okwu ya nile: ọ dịghị okwu ọ bụla e zonahụrụ eze nke ọ na-egosighị ya.”—1 Ndị Eze 10:2b, 3.

Amamihe Solomọn na ọganihu nke alaeze ya masịrị nnọọ eze nwanyị Sheba nke na “mmụọ adịghịkwa n’ime ya ọzọ.” (1 Ndị Eze 10:4, 5) Ụfọdụ na-ewere amaokwu a ịpụta na eze nwanyị ahụ “ekughịzi ume.” Ọbụna otu ọkà mmụta nyere echiche na ọ tụbọrọ! Otú ọ bụla o si dị, ihe eze nwanyị ahụ hụrụ ma nụ juru ya anya. Ọ sịrị na ndị ohu Solomọn bụ ndị ihe na-agara nke ọma n’ihi inwe ike ịnụ amamihe nke eze a, ọ gọzikwara Jehova maka idokwasị Solomọn n’ocheeze. O nyeziri eze ahụ onyinye ndị dị oké ọnụ, ọlaedo nanị ruru ihe dị ka $40,000,000 n’ọnụ ego nke oge a. Solomọn nyekwara eze nwanyị ahụ onyinye, na-enye ya “ihe nile na-atọ ya ụtọ, ihe ọ bụla ọ rịọrọ.”c—1 Ndị Eze 10:6-13.

Ihe Mmụta Dịịrị Anyị

Jisọs ji eze nwanyị Sheba mee ihe dị ka ihe mmụta gbara ọkpụrụkpụ dịịrị ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii. “A ga-eme ka eze nwanyị nke Ndịda soro ọgbọ a bilie n’ikpe ahụ, ọ ga-amakwa ya ikpe,” ka ọ gwara ha, “n’ihi na o siri n’ebe ụwa sọtụrụ bịa ịnụ amamihe Solomọn; ma lee, Onye ka Solomọn nọ n’ebe a.” (Matiu 12:42) Ee, eze nwanyị Sheba gosipụtara ekele dị ukwuu maka amamihe Chineke nyere. Ọ bụrụ na o mere njem dị kilomita 2,400 iji gee Solomọn ntị, n’ezie ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii kwesịrị igewo Jisọs ntị nke ọma, bụ́ onye nọ kpọmkwem n’ihu ha.

Anyị onwe anyị taa pụrụ igosipụta ekele miri emi maka Solomọn Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst. N’ụzọ dị aṅaa? Otu ụzọ bụ site n’ịgbaso ntụzi ya bụ́ ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.’ (Matiu 28:19) Ụzọ ọzọ bụ iji nlezianya tụlee ihe nlereanya na echiche uche Jisọs ma ṅomizie ha.—Ndị Filipaị 2:5; Ndị Hibru 12:2, 3.

N’eziokwu, ịgbaso ihe nlereanya nke Solomọn Ka Ukwuu ga-achọ mgbalị n’aka anyị. Ma, a ga-enyeghachi anyị ụgwọ ọrụ n’ụba. N’ezie, Jehova na-ekwe ndị ya nkwa na ọ bụrụ na ha egosipụta mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà, ọ ‘ga-emeghere ha windo nile nke eluigwe, wụsara ha ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ na-agaghị ezu ịnagide ya.’—Malakaị 3:10.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na Sheba dị na ndịda ọdịda anyanwụ Arebia, nke bụ́ Republic of Yemen taa.

b Dị ka onye Gris oge ochie bụ́ ọkà mmụta n’ihe banyere ọdịdị ụwa bụ́ Strabo si kwuo, ndị Sheba bara ọgaranya nke ukwuu. Ọ sịrị na ha ji ọlaedo buru ibu rụọ oche ha, arịa ha dị iche iche, na ọbụna mgbidi, ibo, na elu ụlọ ha.

c Ụfọdụ na-ewere nkebi ahịrịokwu a ịpụta na eze nwanyị ahụ so Solomọn nwee mmekọahụ. Akụkọ mgbe ochie kwuru ọbụna na ha mụtara otu nwa nwoke. Otú ọ dị, e nweghị ihe akaebe dịnụ iji kwadoo nke ọ bụla n’ime ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya