Nkebi nke 15
E Gosiri Onye Amụma A Dọọrọ n’Agha Ihe Ndị Ga-eme n’Ọdịnihu
Daniel buru amụma banyere Alaeze Chineke na ọbịbịa Mesaya. A kwaturu ọchịchị Babịlọn
DANIEL bụ onye na-eto eto nke okwukwe ya siri ezigbo ike. A dọọrọ ya n’agha laa Babịlọn tupu e bibie Jeruselem. E nwere ụfọdụ ndị Juu ndị ọzọ ndị Babịlọn dọkwaara n’agha mgbe ha meriri alaeze Juda. Ndị Babịlọn kwere ka ha nwere onwe ha ime ihe ụfọdụ. N’ime ọtụtụ afọ Daniel biri na Babịlọn, Chineke gọziri ya nke ukwuu. Ọ napụtara ya n’olulu ọdụm, meekwa ka ọ hụ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu dị anya. Amụma ndị kacha mkpa Daniel buru metụtara Mesaya na ọchịchị ya.
A gwara Daniel mgbe Mesaya ga-abịa. A gwara Daniel mgbe ndị Chineke kwesịrị ịtụ anya ọbịbịa “Mesaya bụ́ Onye Ndú,” ya bụ, mgbe izu iri isii na itoolu gachara malite mgbe e nyere iwu ka e wughachi mgbidi Jeruselem ka ọ dị otú ọ dịbu. Ụbọchị nke ọ bụla dị n’ime izu iri isii na itoolu ndị a na-anọchi anya otu afọ. Abalị asaa na-adị n’ime otu izu. Ọ bụrụ na ụbọchị nke ọ bụla n’ime izu bụ otu afọ, otu izu ga-abụ afọ asaa. E nyere iwu ahụ n’afọ 455 T.O.A., ya bụ, mgbe ọtụtụ afọ gachara kemgbe Daniel nwụrụ. Ọ bụ n’afọ ahụ ka “izu” iri isii na itoolu ahụ malitere, ma kwụsị n’afọ 29 O.A. Ọ dị narị afọ anọ na iri asatọ na atọ n’ogologo. N’isiokwu ọzọ, anyị ga-ahụ ihe mere n’afọ ahụ. Daniel bukwara amụma na a “ga-ebipụ” ma ọ bụ gbuo Mesaya ahụ iji kpuchie mmehie.—Daniel 9:24-26.
Mesaya ahụ ga-abụ Eze n’eluigwe. E mere ka Daniel hụ eluigwe n’ọhụụ pụrụ iche e gosiri ya. Ọ hụrụ Mesaya ahụ, onye a kpọrọ “onye yiri nwa nke mmadụ” ka ọ gara nso n’ocheeze Jehova. Jehova nyere ya “ọchịchị na ùgwù na alaeze.” Alaeze ahụ ga-adịru mgbe ebighị ebi. A gwakwara Daniel ihe ọzọ na-enye obi ụtọ banyere Alaeze Mesaya ahụ, ya bụ na e nwere ndị ọzọ ga-eso Eze ahụ chịa. A kpọrọ ha “ndị nsọ nke Onye Kasị Elu.”—Daniel 7:13, 14, 27.
Alaeze ahụ ga-ebibi ọchịchị ndị dị n’ụwa a. Chineke nyere Daniel ike ịkọwara Nebukadneza, bụ́ eze Babịlọn, nrọ ọ rọrọ nke gbagwojuru ya anya. Eze ahụ hụrụ nnukwu ihe oyiyi nke e ji ọlaedo kpụọ isi ya. E jikwa ọlaọcha kpụọ obi ya na ogwe aka ya, jirikwa ọla kọpa kpụọ afọ ya na apata ụkwụ ya, e jikwa ígwè kpụọ ogwe ụkwụ ya, jirikwa ígwè na ụrọ kpụọ ala ala ụkwụ ya. Otu nkume nke e si n’ugwu wapụta bịara kụọ ihe oyiyi ahụ n’ala ala ụkwụ ya nke na-esighị ike wee gwepịa ya. Daniel kọwara na akụkụ ahụ́ dị iche iche nke ihe oyiyi ahụ na-anọchi anya mba dị iche iche ndị ga-achị ụwa. Nke mbụ bụ Babịlọn, bụ́ isi ọlaedo ahụ. Daniel buru amụma na e nwere ihe Alaeze Chineke ga-eme mgbe mba ndị ikpeazụ ga na-achị n’ụwa ọjọọ a. Ọ ga-ebibi ọchịchị niile dị n’ụwa a. Mgbe ahụ, ọ ga-achịzi ruo mgbe ebighị ebi.—Daniel, isi nke 2.
Daniel kara ezigbo nkà, jiri anya ya hụ mgbe a kwaturu ọchịchị Babịlọn. Dị ka ndị amụma kwuru, Eze Saịrọs meriri obodo ahụ. Mgbe obere oge gachara, a hapụrụ ndị Juu e ji eji na Babịlọn—kpọmkwem n’oge e buru n’amụma, ya bụ, mgbe obodo ha tọgbọchara n’efu ruo afọ iri asaa. Ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ya bụ, ndị gọvanọ, ndị nchụàjà na ndị amụma, duziri ndị Juu ka ha wughachi Jeruselem na ụlọ nsọ Jehova. Ma, gịnị ga-eme mgbe narị afọ anọ na iri asatọ na atọ ahụ gasịrị?
—O si n’akwụkwọ Daniel.
◼ Gịnị ka a gwara Daniel banyere Mesaya na Alaeze Chineke?
◼ Gịnị ka Alaeze Chineke ga-eme ọchịchị ndị dị n’ụwa a?
[Chaatị dị na peeji nke 18]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
● Ezra
● Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
● Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak
Luk
Jọn
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti
2 Timoti
Taịtọs
Faịlimọn
Ndị Hibru
Jems
1 Pita
2 Pita
1 Jọn
2 Jọn
3 Jọn
Jud
Mkpughe