Nkebi nke 21
A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ!
Jizọs pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya izi ha ihe na ịgba ha ume
MGBE Jizọs nwụrụ, abalị atọ agaa, ụfọdụ ụmụ nwaanyị bụ́ ndị na-eso ụzọ ya chọpụtara na e bupụla nkume e ji dochie ọnụ ili ahụ. E nweghịkwa ihe dị n’ime ili ahụ!
Ndị mmụọ ozi abụọ pụtara. Otu kwuru, sị: “Unu na-achọ Jizọs onye Nazaret. A kpọlitewo ya.” (Mak 16:6) N’egbughị oge, ụmụ nwaanyị ndị ahụ ji ọsọ gaa ịkọrọ ndịozi ihe merenụ. Ka ha na-aga, ha zutere Jizọs. Jizọs sịrị ha: “Unu atụla egwu! Gaanụ kọọrọ ụmụnna m, ka ha gaa Galili; n’ebe ahụ ka ha ga-ahụ m.”—Matiu 28:10.
Mgbe e mechara n’ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs si Jeruselem na-aga Emeọs. Otu onye ha na-amaghị sooro ha ma jụọ ha ihe ha na-akparịta. N’eziokwu, ọ bụ Jizọs bụ́ onye a kpọlitere n’ọnwụ. Ọ pụtara n’ihu ha n’ụdị ha na-amaghị ozugbo na ọ bụ ya. Ha gbarụrụ ihu kwuo na ha na-akparịta banyere Jizọs. Onye ahụ ha na-amaghị malitere ịkọrọ ha ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ banyere Mesaya ahụ. N’eziokwu, Jizọs mezuru ihe niile e buru n’amụma banyere Mesaya ahụ.a Mgbe ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs matara na onye ahụ bụ Jizọs, onye a kpọlitere n’ọnwụ, ya aghọọ mmụọ, ha ahụghị ya ọzọ.
Mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs laghachiri Jeruselem ozugbo. N’ebe ahụ, ha hụrụ na ndịozi ahụ gbakọtara n’ime ụlọ a kpọchiri akpọchi. Ka mmadụ abụọ ahụ na-akọ ihe merenụ, Jizọs pụtara n’ihu ha. O juru ndị na-eso ụzọ Jizọs anya. Jizọs jụrụ ha, sị: ‘Gịnị mere unu ji na-enwe obi abụọ? Otú a ka e dere ya na Kraịst ga-ata ahụhụ ma si n’etiti ndị nwụrụ anwụ bilie n’ụbọchị nke atọ.’—Luk 24:38, 46.
Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya n’oge dị iche iche ruo ụbọchị iri anọ. E nwere otu oge ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị mmadụ ise! O nwere ike ịbụ n’oge ahụ ka o nyere ha ọrụ ahụ dị mkpa bụ́: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu. Ma, lee! m nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.”—Matiu 28:19, 20.
Ná nnọkọ ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi nwere, o kwere ha nkwa, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) E buliziri Jizọs elu, ígwé ojii emee ka ha ghara ịhụ ka ọ na-ala eluigwe.
—O si na Matiu isi nke 28; Mak isi nke 16; Luk isi nke 24; Jọn isi nke 20 na nke 21; 1 Ndị Kọrịnt 15:5, 6.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma amụma ndị e buru banyere Mesaya ahụ bụ́ ndị mezuru n’ahụ́ Jizọs, gụọ peeji nke 17-19 n’akwụkwọ a nakwa peeji nke 199-201 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
◼ Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si mata na Chineke akpọlitela Jizọs n’ọnwụ?
◼ Olee ihe Jizọs kọọrọ mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya n’ụzọ Emeọs?
◼ Olee ntụziaka Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya tupu ya alaa eluigwe?
Igbe dị na peeji nke 24]
MMỤỌ NSỌ
Mmụọ nsọ Chineke bụ ike kachanụ e nwere n’eluigwe na ala. Jehova Chineke ji mmụọ nsọ ya, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, kee eluigwe na ụwa, jirikwa ya duzie ndị dere Baịbụl. Ọ bụ mmụọ nsọ ka e ji rụọ ọrụ ebube niile anyị gụrụla banyere ha, tinyere ọrụ ebube ahụ kachanụ, ya bụ, ịkpọlite Jizọs Kraịst n’ọnwụ, ya aghọọ mmụọ dị ike.—Jenesis 1:2; 2 Samuel 23:2; Ọrụ Ndịozi 10:38; 1 Pita 3:18.
[Chaatị dị na peeji nke 24]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọm
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
● Matiu
● Mak
● Luk
● Jọn
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti