-
Jizọs Kụziri Banyere Alaeze ChinekeBaịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
-
-
Nkebi nke 17
Jizọs Kụziri Banyere Alaeze Chineke
Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ihe, ma o lekwasịrị anya n’otu isiokwu, ya bụ, Alaeze Chineke
GỊNỊ mere Jizọs ji bịa n’ụwa? Ya onwe ya kwuru, sị: ‘Aghaghị m izisa ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.’ (Luk 4:43) Ka anyị tụlee ihe anọ Jizọs kụziri banyere Alaeze Chineke, nke bụ́ isiokwu ozi ọma o kwusara.
1. Jizọs ga-abụ Eze. Jizọs kwuru hoo haa na ya bụ Mesaya e buru amụma na ọ ga-abịa. (Jọn 4:25, 26) O gosikwara na ya bụ Eze ahụ Daniel onye amụma hụrụ n’ọhụụ. Jizọs gwara ndịozi ya na otu ụbọchị, ya ga-anọrọ ‘n’ocheeze dị ebube,’ na hanwa ga-anọrọkwa n’ocheeze. (Matiu 19:28) Ọ kpọrọ ndị ahụ ga-eso ya chịa “ìgwè atụrụ nta,” kwuokwa na ya nwere “atụrụ ọzọ,” ndị na-esoghị ná ndị ahụ.—Luk 12:32; Jọn 10:16.
2. Alaeze Chineke ga-eme ka e nwee ezigbo ikpe ziri ezi. Jizọs gosiri na Alaeze Chineke ga-ewepụ ikpe na-ezighị ezi kachanụ site n’ime ka e doo aha Jehova Chineke nsọ ma wepụ nkọcha niile Setan kọchara aha ahụ kemgbe e nupụrụ isi n’Iden. (Matiu 6:9, 10) Kwa ụbọchị, Jizọs kụziiri ndị mmadụ ihe n’akpaghị ókè, ma nwoke ma nwaanyị, ma ọgaranya ma ogbenye, si otú ahụ gosi na ya anaghị ele mmadụ anya n’ihu. N’agbanyeghị na ndị bụ́ isi ọ bịara ịkụziri ihe bụ ndị Izrel, o nyekwaara ndị Sameria aka, ha na ndị Jentaịl, ya bụ, ndị na-abụghị ndị Juu. O meghị ka ndị ndú okpukpe nke oge ya; ọ kpaghị ókè ọ bụla ma ọ bụ lee mmadụ anya n’ihu.
3. Alaeze Chineke agaghị abụ nke ụwa a. Jizọs biri n’ụwa n’oge e nwere oké ọgba aghara n’ihe banyere ọchịchị. Ọ bụ ndị mba ọzọ na-achị ndị obodo ya. Ma, mgbe ndị mmadụ chọrọ ime ka o tinye aka n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, o si ebe ahụ pụọ. (Jọn 6:14, 15) Ọ gwara otu onye ọchịchị, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu abụghị nke ụwa.” (Jọn 15:19) O kweghị ha jiri ngwá agha lụọ ọgụ iji chebe ya.—Matiu 26:51, 52.
4. Ọchịchị Kraịst ga-abụ ọchịchị ịhụnanya. Jizọs kwuru na ya ga-eme ka ndị mmadụ nweta onwe ha, mee ka ibu dịrị ha mfe. (Matiu 11:28-30) O mere ihe ahụ o kwuru. O nyere ezigbo ndụmọdụ bara uru banyere ịkwụsị nchegbu, ime ka mmadụ na ibe ya dị ná mma, izere ịhụ akụnụba n’anya, na inweta obi ụtọ. (Matiu, isi ise ruo isi asaa) Ọ dịịrị ụdị mmadụ niile mfe ịbịakwute ya n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Ọbụna ndị a na-emegbu emegbu bịakwutere ya, mara na ọ ga-eji obiọma na nkwanye ùgwù meso ha omume. N’ezie, Jizọs ga-abụ ezigbo Onye Ọchịchị!
E nwere ụzọ ọzọ dị ezigbo mkpa Jizọs si kụzie banyere Alaeze Chineke. Ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube. N’ihi gịnị? Ka anyị chọpụta.
—O si n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn.
◼ Olee otú Jizọs si kụzie na ya bụ Eze bụ́ Mesaya?
◼ Olee ụzọ dị iche iche Jizọs si gosi na ya ga-ekpe ikpe ziri ezi n’ọchịchị ya?
◼ Olee otú Jizọs si mee ka o doo anya na Alaeze ya agaghị abụ nke ụwa a?
◼ Olee otú Jizọs si gosi na ọchịchị ya ga-abụ ọchịchị ịhụnanya?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 20]
“Ọ nọ na-aga site . . . n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.”—Luk 8:1
[Chaatị dị na peeji nke 20]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
● Matiu
● Mak
● Luk
● Jọn
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti
2 Timoti
Taịtọs
Faịlimọn
Ndị Hibru
Jems
1 Pita
2 Pita
1 Jọn
2 Jọn
3 Jọn
Jud
Mkpughe
-
-
Jizọs Rụrụ Ọrụ EbubeBaịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
-
-
Nkebi nke 18
Jizọs Rụrụ Ọrụ Ebube
Jizọs ji ọrụ ebube ndị ọ rụrụ gosi ihe ọ ga-eji ike ya mee mgbe ọ ga-abụ Eze
CHINEKE nyere Jizọs ike ime ihe ndị mmadụ ọzọ na-enweghị ike ime. Jizọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube. Ọ rụrụ ọtụtụ n’ime ha n’ihu ìgwè mmadụ dị iche iche. Ọrụ ebube ndị ahụ gosiri na ike Jizọs karịrị nke ndị iro ya nakwa na ọ ga-akwụsịli nsogbu ndị ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-enwebeghị ike ịkwụsị. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.
O nyere ndị mmadụ nri na mmanya. Ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ bụ ime ka mmiri ghọọ mmanya dị mma. Ugboro abụọ ka o ji naanị ogbe achịcha ole na ole na azụ̀ ole na ole zụọ ìgwè mmadụ ruru ọtụtụ puku. Ha niile rijuru afọ ma rifọ nri ahụ.
Ọ gwọrọ ọrịa. Jizọs gwọrọ “ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla ndị mmadụ nwere.” (Matiu 4:23) Jizọs gwọrọ ndị kpuru ìsì, ndị ntị chiri, ndị ekpenta, ndị akwụkwụ, ndị ngwọrọ nakwa ndị nwere nkwarụ. Ọ dịghị ụdị ọrịa ọ bụla na-ekweghị ya ngwọta.
O mere ka oké ifufe dajụọ. Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kwọọrọ ụgbọ na-agafe n’Oké Osimiri Galili, oké ifufe malitere ife. Ụjọ jidere ndị na-eso ụzọ ya. Naanị ihe Jizọs mere bụ ile ifufe ahụ anya ma kwuo, sị: “Shịị! Daa jụụ!” Ebe niile wee daa jụụ. (Mak 4:37-39) N’oge ọzọ, o jere ije n’elu mmiri mgbe ajọ ifufe na-efe.—Matiu 14:24-33.
Ọ chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ. Ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị iro Chineke. Ha ka ndị mmadụ ike. Ọtụtụ ndị enwebeghị ike ime ka ndị mmụọ ọjọọ hapụ ha aka. Ma, ọtụtụ mgbe, Jizọs chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ, mee ka ha hapụ ndị ha ji. Ọ tụghị ndị mmụọ ọjọọ ụjọ, kama ọ bụ ha tụrụ ya ụjọ n’ihi na ha ma na e nyere ya ikike.
Ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ. Baịbụl kpọrọ ọnwụ “onye iro ikpeazụ.” O kwesịrị ekwesị n’ihi na ọnwụ bụ onye iro mmadụ ọ bụla na-enweghị ike imeri. (1 Kọrịnt 15:26) Ma Jizọs kpọlitere ndị nwụrụ anwụ. Ọ kpọliteere otu nwaanyị di ya nwụrụ nwa ya nwoke, kpọlitekwara nne na nna na-eru uju nwa ha nwaanyị. Nke kacha pụọ iche bụ mgbe Jizọs kpọlitere ezigbo enyi ya bụ Lazarọs n’ọnwụ n’ihu ìgwè mmadụ nọ na-eru uju ọnwụ ya, ọ bụ ezie na ọ fọrọ nke nta ka o ruo abalị anọ Lazarọs nwụrụ! Ọbụna ndị kacha bụrụ ndị iro Jizọs kwetara na ọ rụrụ ọrụ ebube ahụ.—Jọn 11:38-48; 12:9-11.
Gịnị mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube ahụ niile ebe ọ bụ na ndị ahụ niile o nyeere aka mechara nwụọ? Ọrụ ebube Jizọs bara ezigbo uru. O gosiri na amụma ndị na-enye obi ụtọ e buru banyere ọchịchị Eze Mesaya ga-emezucha. Anyị ekwesịghị inwe obi abụọ ma Eze Chineke họpụtara ọ̀ ga-enwe ike iwepụ ụkọ nri, ọrịa, ajọ ifufe, ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụ ọnwụ. O gosila na Chineke nyere ya ike ime ihe ndị a niile.
—O si n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn.
◼ Olee otú Jizọs si gosi na ọ ga-ewepụli ụkọ nri, ọrịa, ajọ ifufe, ndị mmụọ ọjọọ, na ọnwụ?
◼ Gịnị ka ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ na-egosi banyere ọchịchị ọ ga-achị ụwa n’ọdịnihu?
Chaatị dị na peeji nke 21]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu ●
Mak ●
Luk ●
Jọn ●
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti
2 Timoti
Taịtọs
Faịlimọn
Ndị Hibru
Jems
1 Pita
2 Pita
1 Jọn
2 Jọn
3 Jọn
Jud
Mkpughe
-
-
Jizọs Buru Amụma Ga-emetụta Ụwa DumBaịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
-
-
Nkebi nke 19
Jizọs Buru Amụma Ga-emetụta Ụwa Dum
Jizọs kwuru ihe ndị ga-egosi na ọ malitela ọchịchị n’eluigwe nakwa na ọgwụgwụ ụwa ọjọọ a eruola
MGBE Jizọs na ndịozi ya anọ nọ n’Ugwu Oliv na-ele Jeruselem na ụlọ nsọ ya, ha jụrụ ya ajụjụ banyere ihe ndị ọ gwaburu ha. Ọ dịbeghị anya Jizọs kwuru na a ga-ebibi ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Tupu mgbe ahụ, ọ gwara ha banyere ‘ọgwụgwụ nke usoro ihe a.’ (Matiu 13:40, 49) Ndịozi ya jụziri ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?’—Matiu 24:3.
Mgbe Jizọs na-aza ajụjụ ahụ, ọ gwara ha ihe ga-eme tupu e bibie Jeruselem. Ma ihe ahụ o kwuru abụghị naanị banyere mbibi Jeruselem. Amụma ahụ ga-emecha mezuo n’ụwa niile. Jizọs buru amụma banyere ọtụtụ ihe ga-eme n’ụwa, ya bụ, ihe ndị ga-aghọ ihe ịrịba ama ga-eme ka ndị nọ n’ụwa mata na Jizọs anọrọla n’ocheeze n’eluigwe. Ihe ọ pụtara bụ na ihe ịrịba ama ahụ ga-egosi na Jehova Chineke emeela Jizọs Eze na-achị n’Alaeze Mesaya ahụ e kwere ná nkwa kemgbe. Ihe ịrịba ama ahụ ga-apụta na oge eruwela ka Alaeze ahụ wepụ ihe ọjọọ niile ma mee ka ndị mmadụ nweta ezi udo. Ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma ga-egosi na okpukpe na ọchịchị ndị dị ugbu a, nakwa ndị mmadụ ọjọọ, eruola n’oge ikpeazụ ha—nakwa na ụwa ọhụrụ dị nso.
Mgbe Jizọs na-akọwa ihe ga-eme n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Eze n’eluigwe, o kwuru na a ga-enwe agha mba dị iche iche, ụkọ nri, oké ala ọma jijiji, na ọrịa ndị ga-eru ọtụtụ ebe. Mmebi iwu ga-aba ụba. Ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. Ihe a niile ga-eme tupu e nwee “oké mkpagbu” nke a na-enwetụbeghị ụdị ya.—Matiu 24:21.
Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-esi amata mgbe oké mkpagbu ahụ ga-adị nso? Jizọs gwara ha, sị: ‘Sinụ n’osisi fig mụta ihe.’ (Matiu 24:32) Ozugbo osisi fig malitere ipupụta akwụkwọ, onye hụrụ ya ga-amata na oge okpomọkụ adịla nso. N’otu aka ahụ, mgbe ihe ahụ niile Jizọs buru n’amụma malitere ime n’otu oge, ọ ga-egosi na ọgwụgwụ adịla nso. Ọ dịghị onye ọzọ ga-ama kpọmkwem ụbọchị na mgbe oké mkpagbu ahụ ga-amalite, ma ọ́ bụghị Nna anyị nke eluigwe. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụrụnụ anya, n’ihi na unu amaghị mgbe oge ahụ a kara aka bụ.”—Mak 13:33.
—O si na Matiu isi nke 24 na nke 25; Mak isi nke 13; Luk isi nke 21.
◼ Olee ihe ndịozi Jizọs chọrọ ka ọ kọwakwuoro ha?
◼ Gịnị ka ihe ịrịba ama ndị ahụ Jizọs kwuru banyere ha pụtara, oleekwa ụfọdụ n’ime ha?
◼ Olee ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya?
[Foto dị na peeji nke 22]
IHE NDỊ NA-EGOSI NA KRAỊST ANỌRỌLA N’OCHEEZE
Jizọs buru amụma na e nwere ihe ndị ọ ga-abụ ha mewe, a mara na oge Chineke ga-ebibi ụwa a rụrụ arụ eruwela. Malite n’Agha Ụwa nke Mbụ, ụmụ mmadụ na-ahụ ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma. N’ụwa niile, mgbanwe ndị a na-enwe n’okpukpe, n’ọchịchị, nakwa ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-egosi na a ga-ebibirịrị ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ọ bụrụ na ha chọrọ ịlanahụ, na ha ‘ga-amụrịrị anya’ ma kwadosie ọchịchị Chineke ike.a—Luk 21:36; Matiu 24:3-14.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụkwu amụma ndị ọzọ Jizọs buru, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, peeji nke 86-95. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
[Chaatị dị na peeji nke 22]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
● Matiu
● Mak
● Luk
Jọn
-