Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bm nkebi 23 p. 26
  • Ozi Ọma Gbasara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Ọma Gbasara
  • Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kpọsaa Alaeze Jehova N’atụghị Egwu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Ịgbachitere Ozi Ọma n’Ihu Ndị Ọchịchị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • “Geenụ M Ntị Ka M Gwa Unu Ihe Merenụ”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
bm nkebi 23 p. 26

Nkebi nke 23

Ozi Ọma Gbasara

Pọl ji ụkwụ na ụgbọ mmiri gaa kwusaa ozi ọma

MGBE Pọl ghọrọ Onye Kraịst, o ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, nke mere ka a kpagbuwezie yanwa na-akpagbubu Ndị Kraịst. Onyeozi ahụ ike na-anaghị agwụ agwụ gara ọtụtụ ebe kwusaa ozi ọma. Ọ gara ebe ndị dị anya kwusaa banyere Alaeze ahụ nke Chineke ga-eji mezuo nzube mbụ ya banyere ụmụ mmadụ.

Na Listra, mgbe Pọl na-eme njem ikwusa ozi ọma mbụ ya, ọ gwọrọ otu nwoke dara ngwọrọ kemgbe a mụrụ ya. Ìgwè mmadụ nọ ebe ahụ malitere iti mkpu na Pọl na Banabas ya na ya so bụ chi. O siri ike tupu mmadụ abụọ ahụ egbochie ndị ahụ ịchụrụ ha àjà. Ma, ndị iro Pọl mere ka ìgwè mmadụ ahụ mechaa tụwa Pọl nkume ruo mgbe ha chere na ọ nwụọla. Ma Pọl anwụghị. O mechara laghachi n’obodo ahụ a tụrụ ya nkume ka ọ gbaa ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ ume.

Ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst malitere ikwusi ike na ndị kwere ekwe na-abụghị ndị Juu ga-emerịrị ihe ụfọdụ Iwu Mozis kwuru. Pọl wegaara ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem okwu ahụ. Mgbe mmụọ nsọ duzichara ndị ikom ahụ, ha atụlechaa Akwụkwọ Nsọ nke ọma, ha degaara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ma gwa ha ka ha zere ikpere arụsị, ọbara, anụ a nyagburu anyagbu na ịkwa iko. Iwu ndị ahụ bụ ‘ihe ndị dị mkpa,’ ma ọ bụghị idebe iwu Mozis ga-eme ka mmadụ debe ha.—Ọrụ Ndịozi 15:28, 29.

Na njem ikwusa ozi ọma nke abụọ Pọl mere, ọ gara Beria nke dị ugbu a n’obodo Gris. Ndị Juu bi ebe ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi nabata ozi ọma, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị iji mara ma ihe ọ kụziiri ha ọ̀ bụ eziokwu. A kpagbuwere ya ọzọ, ya esi ebe ahụ pụọ, gawazie Atens. Pọl nọ n’ihu ndị Atens gụrụ oké akwụkwọ gosi otú e si eji akọ na nghọta ekwu okwu ga-eru mmadụ n’obi.

Mgbe Pọl mechara njem ikwusa ozi ọma ya nke atọ, ọ gara Jeruselem. Mgbe ọ gara n’ụlọ nsọ dị n’ebe ahụ, ụfọdụ ndị Juu mere ka e nwee ọgba aghara, ha achọọkwa igbu ya. Ndị agha Rom bịara napụta Pọl ma gbawa ya ajụjụ ọnụ. Ebe ọ bụ nwa amaala Rom, o mechara zara ọnụ ya n’ihu onye ọchịchị Rom bụ́ Filiks. Ndị Juu enweghị ike ikwu ihe ọ bụla gosiri na ebubo ndị ahụ ha boro Pọl bụ eziokwu. Ebe Pọl na-achọghị ka onye ọchịchị Rom ọzọ bụ́ Festọs nyefee ya n’aka ndị Juu, ọ sịrị: “Ana m akpọku Siza!” Festọs gwara ya, sị: “Ọ bụ Siza ka ị ga-agakwuru.”—Ọrụ Ndịozi 25:11, 12.

E jizi ụgbọ mmiri buga Pọl Ịtali ka e kpee ya ikpe. Ebe ọ bụ na ụgbọ mmiri ha kpuru na njem ahụ, ọ nọrọ n’agwaetiti Mọlta ruo mgbe oge oyi gafere. Mgbe o mechara ruo Rom, ọ nọrọ afọ abụọ n’ụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya. Pọl bụ onyeozi na-anụ ọkụ n’obi. N’agbanyeghị na ndị agha na-eche ya nche, ọ nọgidere na-ekwusara ndị niile bịara ileta ya ozi ọma Alaeze Chineke.

—O si n’Ọrụ Ndịozi 11:22–28:31.

◼ Na Listra, gịnị mere mgbe Pọl gwọrọ otu nwoke dara ngwọrọ?

◼ Olee otú e si dozie nsogbu metụtara idebe Iwu Mozis?

◼ Gịnị mere Pọl ji gaa Rom, oleekwa ihe o mere n’ebe ahụ?

[Chaatị dị na peeji nke 26]

Jenesis

Ọpụpụ

Levitikọs

Ọnụ Ọgụgụ

Diuterọnọmi

Jọshụa

Ndị Ikpe

Rut

1 Samuel

2 Samuel

1 Ndị Eze

2 Ndị Eze

1 Ihe E Mere

2 Ihe E Mere

Ezra

Nehemaya

Esta

Job

Abụ Ọma

Ilu

Ekliziastis

Abụ Sọlọmọn

Aịzaya

Jeremaya

Abụ Ákwá

Ezikiel

Daniel

Hosia

Joel

Emọs

Obedaya

Jona

Maịka

Nehọm

Habakọk

Zefanaya

Hagaị

Zekaraya

Malakaị

Matiu

Mak

Luk

Jọn

● Ọrụ Ndịozi

Ndị Rom

1 Ndị Kọrịnt

2 Ndị Kọrịnt

Ndị Galeshia

Ndị Efesọs

Ndị Filipaị

Ndị Kọlọsi

1 Ndị Tesalonaịka

2 Ndị Tesalonaịka

1 Timoti

2 Timoti

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya