N’aka ekpe: Ebe otu nwanna nwaanyị onye kọpọtua na-ezi ozi ọma na Koria, n’afọ 1931; n’aka nri: Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ ji asụsụ ndị ogbi na-ezi onye ogbi ozi ọma na Koria taa
NKEBI NKE 2
Izisa Ozi Ọma Alaeze Chineke—Izisa Ozi Ọma n’Ụwa Niile
WERE ya na i tetara ụra n’otu isi ụtụtụ, ma ị gaghị aga ọrụ n’ụbọchị ahụ. Ị chọrọ ịga ozi ọma, ma ike gwụrụ gị. Gị echewe na ọ ga-akara gị mma izurutụ ike n’ụtụtụ ahụ. Ma, gị emechaa kpee ekpere, kpebie na ị ga-aga ozi ọma. Gị ejikere buru akpa gị gawa. N’ụbọchị ahụ, ọ bụ gị na otu nwanna nwaanyị merela agadi na-arụ. Nwanna nwaanyị a efeela Jehova ọtụtụ afọ. O diela ọtụtụ ihe ná ndụ, ọ dịkwa obiọma. Ka ị na-echeta àgwà ya ndị a, gị ana-enwekwu ume. Ka gị na ya nọ na-ezi ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, gị echeta na ozi unu na-ezi ndị mmadụ ka ụmụnna gị ndị nọ n’ebe dị iche iche na-ezikwa. Ọ bụkwa akwụkwọ unu na-enye ndị mmadụ, ka ha na-enye. Otú e si azụ unu izisa ozi ọma ka e sikwa azụ ha. Ka unu na-achọ imechi ozi ọma n’ụbọchị ahụ, ya adị gị ka unu emechila emechi ma ọ bụdị chi ejila eji. Mgbe ị laruru ụlọ, obi ana-atọ gị ụtọ, gị ana-ekele Jehova na i mechara gaa ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
Ihe kachanụ Chineke ji Alaeze ya eme n’oge anyị a bụ ịkwado ozi ọma ndị ya na-ekwusa. Jizọs kwuru na a ga-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile n’oge ikpeazụ a. (Mat. 24:14) Olee otú e si na-ekwusa ozi ọma a taa? E nwere ihe atọ anyị ga-eleba anya na ha ná nkebi a. Ihe atọ ndị a ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ. Nke mbụ bụ gbasara ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Nke abụọ bụ otú ha si ekwusa ya. Nke atọ abụrụ ihe ndị dị ezigbo mkpa ha ji ekwusa ya. Ihe ndị a ha ji ekwusa ya enyerela ọtụtụ nde mmadụ aka n’ụwa niile ịma na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị.