Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 25 p. 64-p. 65 para. 6
  • Ọmịiko Jizọs Nwere Emee Ka Ọ Gwọọ Otu Onye Ekpenta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọmịiko Jizọs Nwere Emee Ka Ọ Gwọọ Otu Onye Ekpenta
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Imere Onye Ekpenta Ebere
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • “Ịmara Ịhụnanya nke Kraịst Ahụ”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ị̀ Na-echeta Ịsị I Meela?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ọ Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 25 p. 64-p. 65 para. 6
Ebe Jizọs jidere onye ekpenta dara n’ala n’ụkwụ ya aka

ISI NKE 25

Ọmịiko Jizọs Nwere Emee Ka Ọ Gwọọ Otu Onye Ekpenta

MATIU 8:1-4 MAK 1:40-45 LUK 5:12-16

  • JIZỌS AGWỌỌ OTU ONYE EKPENTA

Ka Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya anọ na-ekwusa ozi ọma “n’ụlọ nzukọ n’ime Galili dum,” akụkọ banyere ihe ndị ọ na-eme gbasara ebe niile. (Mak 1:39) Akụkọ banyere ọrụ ya ruru n’otu obodo ebe e nwere otu nwoke na-arịa ekpenta. Luk onye ọgwọ ọrịa kọwara nwoke ahụ dị ka onye “ekpenta zuru ahụ́.” (Luk 5:12) Ọrịa a kawa njọ, ọ na-eji nwayọọ nwayọọ kwarụọ akụkụ ahụ́ ụfọdụ nke onye ọ na-arịa.

N’ihi ya, ọnọdụ onye ekpenta a nọ na ya jọgburu onwe ya. O bipụkwara iche. Ihe ọzọkwa bụ na nwoke a ga na-eti “Adịghị m ọcha, adịghị m ọcha!” ma ndị mmadụ chọwa ịbịa ya nso iji mee ka ha ghara ịbịaru ya nso ma bute ọrịa a. (Levitikọs 13:45, 46) Ma, gịnị ka nwoke a ga-eme ugbu a? Ọ bịakwutere Jizọs ma daa n’ala n’ihu ya na-arịọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”—Matiu 8:2.

Nwoke ahụ gosiri na ya nwere ezigbo okwukwe n’ebe Jizọs nọ. Ọrịa a emeekwala ka o yie onye e kwesịrị imere ebere. Olee ihe Jizọs ga-eme? Ọ bụrụ na ị nọ ebe ahụ, gịnị ka ị gaara eme? Jizọs nwere ọmịiko n’ahụ́ nwoke ahụ. Ọ matịrị aka ya metụ nwoke ahụ aka ma sị ya: “Achọrọ m. Dị ọcha.” (Matiu 8:3) O juru ụfọdụ ndị anya na ekpenta nwoke ahụ lara ozugbo.

Ị̀ ga-achọ inwe eze nwere ọmịiko, onye nwekwara ike ịrụ ọrụ ndị dị ebube ka Jizọs? Otú Jizọs si mesoo onye ekpenta ahụ ihe na-emesi anyị obi ike na mgbe ọ ga-achịwa ụwa niile, amụma Baịbụl a ga-emezu: “Ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere, ọ ga-azọpụtakwa mkpụrụ obi ndị ogbenye.” (Abụ Ọma 72:13) N’eziokwu, n’oge ahụ, Jizọs ga-eme ihe na-agụsi ya agụụ ike ime, ya bụ, inyere ndị niile na-ahụsi anya aka.

Ì chetara na tupu Jizọs agwọọ onye ekpenta a, ọ bụ akụkọ gbasara ozi ya bụ ihe na-ekwo ebe niile? Ugbu a, ndị mmadụ ga-anụkwa gbasara ọrụ ebube a ọ rụrụ. Ma, Jizọs achọghị ka ndị mmadụ nwee okwukwe na ya naanị n’ihi ihe ha nụrụ n’ọnụ ndị ọzọ. Ọ ma gbasara amụma ahụ e buru na “ọ gaghịkwa eme ka a nụ olu ya n’okporo ámá.” Ihe amụma a pụtara bụ na Jizọs agaghị achọ ihe ga-eme ka ndị mmadụ towe ya. (Aịzaya 42:1, 2) N’ihi ya, Jizọs nyere onye ekpenta ahụ ọ gwọrọ iwu, sị: “Hụ na ọ dịghị onye ị kọọrọ, kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị, nyekwa onyinye Mozis kwuru ka a na-enye.”—Matiu 8:4.

Mana, ị manụ na ọ ga-esi ike onye e meere ụdị ihe a emechie ọnụ. Ụdị obi ụtọ nwoke ahụ nwere na a gwọọla ya mere ka ọ pụọ kọsaa ya ebe niile. Nke a mere ka ndị mmadụ chọkwuo ịma ihe merenụ. O ruziri na nke na o siiri Jizọs ike ịba n’ime obodo ka ndị mmadụ ghara ịma na ọ batara. Ọ bụ ya mere o ji gaa nọtụ obere oge n’ebe ndị mmadụ na-ebighị. N’agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị sí ebe dị iche iche gara ka ọ kụziere ha ihe, gwọọkwa ndị na-arịa ọrịa.

  • Olee ihe ekpenta nwere ike ime mmadụ, gịnịkwa ka a chọrọ ka onye ekpenta na-eme?

  • Olee otú onye ekpenta si rịọ Jizọs ka ọ gwọọ ya, gịnịkwa ka ihe Jizọs zara ya na-eme ka anyị mata?

  • Olee ihe nwoke ahụ Jizọs gwọrọ mere, oleekwa ihe ihe ahụ o mere mere ka ndị mmadụ mee?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya