ISI NKE 18
Ị̀ Na-echeta Ịsị I Meela?
Ì RIRI nri taa?— Ị̀ ma onye siri ya?— Ikekwe, ọ bụ nne gị ma ọ bụ onye ọzọ siri ya, ma gịnị mere anyị kwesịrị iji kelee Chineke maka ya?— N’ihi na ọ bụ Chineke na-eme ka ala na-emepụta nri. Otú ọ dị, anyị kwesịkwara ikele onye siri nri ahụ ma ọ bụ onye bunyere anyị ya.
Mgbe ụfọdụ, anyị na-echefu ịsị i meela mgbe ndị ọzọ meere anyị ihe ọma, ọ̀ bụ na anyị adịghị echefu? Mgbe Onye Ozizi Ukwu ahụ nọ n’ụwa, e nwere ụfọdụ ndị ekpenta ndị chefuru ịsị i meela.
Ị̀ ma ihe bụ́ ekpenta?— Ekpenta bụ ọrịa nke pụrụ ọbụna ime ka anụ ahụ́ mmadụ na-adapụ adapụ. N’oge Jizọs biri n’ụwa, ndị ekpenta na-ebi ebe dịpụrụ adịpụ site n’ebe ndị ọzọ bi. Ọ bụrụkwa na onye ekpenta ahụ ka mmadụ na-abịa, ọ ga na-eti mkpu iji dọọ onye ahụ aka ná ntị ka ọ ghara ịbịa ya nso. A na-eme nke a ka ndị ọzọ wee ghara ịbịaru ha nso nke ukwuu ma eleghịkwa anya bute ọrịa onye ekpenta ahụ.
Jizọs nwere obiọma dị ukwuu n’ebe ndị ekpenta nọ. Otu ụbọchị mgbe ọ na-aga Jeruselem, Jizọs aghaghị isi n’otu obodo nta gafee. Mgbe ọ bịaruru obodo ahụ nso, ndị ekpenta iri pụtara ịbịa hụ ya. Ha anụwo na Jizọs nwere ike sitere n’aka Chineke iji gwọọ ụdị ọrịa nile.
Ndị ekpenta ahụ abịarughị Jizọs nso. Ha guzo n’ebe dị anya. Ma, ha kwenyere na Jizọs pụrụ ịgwọta ekpenta ha. Ya mere, mgbe ndị ekpenta ahụ hụrụ Onye Ozizi Ukwu ahụ, ha tiri mkpu, sị ya: ‘Jizọs, Onye Ozizi, nyere anyị aka!’
Ị̀ na-emetara ndị na-arịa ọrịa ebere?— Jizọs metaara ha ebere. Ọ ma ihe mwute ọ bụ ịbụ onye ekpenta. Ya mere, ọ zara ha wee sị: “Gaanụ gosi ndị nchụàjà onwe unu.”—Luk 17:11-14.
Gịnị ka Jizọs na-agwa ndị ekpenta a ka ha mee?
Gịnị mere Jizọs ji sị ha mee nke a? Ọ bụ n’ihi iwu Jehova nyere ndị Ya banyere ndị ekpenta. Iwu a kwuru na onye nchụàjà nke Chineke ga-enyocha ahụ́ onye ekpenta. Onye nchụàjà ga-agwa onye ekpenta ahụ mgbe ọrịa ya lachara. Mgbe ahụ́ dịchara ya mma, ọ pụrụ isoroghachi ndị ahụ́ dị mma biri.—Levitikọs 13:16, 17.
Ma, ọrịa ndị ekpenta a ka ji ha. Hà gakwuurunụ onye nchụàjà dị ka Jizọs gwara ha mee?— Ee, ha gara, n’egbughị oge. Ọ ghaghị ịbụ na ndị ikom a kwenyere na Jizọs ga-agwọ ọrịa ha. Gịnị mere?
Mgbe ha nọ na-aga ije hụ onye nchụàjà, ọrịa ha lara. Ahụ́ dịrị ha mma. A gwọrọ ha! Ha nwetara ụgwọ ọrụ n’ihi nkwenye ha kwenyere n’ike Jizọs nwere. Lee ọṅụ ha nwere! Ma, gịnịzi ka ha gaara eme iji gosi ekele ha nwere? Gịnị ka ị gaara eme ma ọ bụrụ gị?—
Gịnị ka onye ekpenta a chetara ime?
Otu n’ime ndị ikom ahụ a gwọrọ bịakwuteghachiri Jizọs. Ọ malitere inye Jehova otuto, na-ekwu okwu ọma dị iche iche banyere Chineke. Nke ahụ bụ ihe kwesịrị ekwesị ime n’ihi na ike e ji gwọọ ya si n’aka Chineke. Nwoke ahụ gbukwara ikpere n’ala n’ụkwụ Onye Ozizi Ukwu ahụ kelee ya. O nwere ekele dị ukwuu maka ihe Jizọs mere.
Ma, olee banyere ndị ikom itoolu ndị nke ọzọ? Jizọs jụrụ ya, sị: ‘Ọ bụ ndị ekpenta iri ka a gwọrọ, ọ́ bụghị ya? Olee mmadụ itoolu ndị nke ọzọ? Ọ̀ bụ nanị otu laghachitere ịbịa nye Chineke otuto?’
Ee, ọ bụ eziokwu. Ọ bụ nanị otu n’ime mmadụ iri ahụ nyere Chineke otuto, laghachitekwa ịbịa kelee Jizọs. Onye a bụkwa onye Sameria, onye si mba ọzọ. Mmadụ itoolu ndị nke ọzọ enyeghị Chineke ekele, ha ekeleghịkwa Jizọs.—Luk 17:15-19.
Olee onye nke ị dị ka ya n’ime ndị ikom ahụ? Anyị chọrọ ịdị ka onye Sameria ahụ, ọ́ bụghị ya?— Ya mere, mgbe mmadụ meere anyị ihe ọma, gịnị ka anyị kwesịrị icheta ime?— Anyị kwesịrị ikele ya. Ndị mmadụ na-echefukarị ịsị i meela. Ma, ọ dị mma ịdị na-asị i meela. Mgbe anyị mere otú ahụ, ọ na-amasị Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs.
Olee otú ị pụrụ isi ṅomie onye ekpenta ahụ nke bịakwuteghachiri Jizọs?
Ọ bụrụ na i chee echiche banyere ya, ị ga-echeta na ndị mmadụ emeworo gị ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, ọ̀ dịtụwo mgbe ị rịara ọrịa?— Ọ pụrụ ịbụ na ị rịarubeghị ọrịa ka ndị ekpenta iri ahụ, ma ọ pụrụ ịbụ na i nwetụla nnukwute azụ̀zụ̀ ma ọ bụ nsogbu afọ. Ọ̀ dị ndị lekọtara gị?— Ọ pụrụ ịbụ na ha nyere gị ọgwụ, mekwaara gị ihe ndị ọzọ. Ì nwere obi ụtọ na ha nyeere gị aka ịgbake?—
Onye Sameria ahụ kelere Jizọs maka ime ka ahụ́ dị ya mma, nke a nyekwara Jizọs obi ụtọ. Ì chere na nne gị ma ọ bụ nna gị ga-enwe obi ụtọ ma i kelee ha mgbe ha meere gị ihe?— Ee, ha ga-enwe.
Gịnị mere o ji dị mkpa icheta ịsị i meela?
Ụfọdụ ndị na-emere gị ihe kwa ụbọchị ma ọ bụ kwa izu. Ọ pụrụ ịbụ na ọ bụ ọrụ ha ime ihe ndị a. Ha pụrụ ọbụna inwe obi ụtọ ịdị na-eme ha. Ma, ị pụrụ ichefu ikele ha. Onye nkụzi gị pụrụ ịrụsi ọrụ ike inyere gị aka ịmụta ihe. Ọ bụ ọrụ ya. Ma, ọ ga-enwe obi ụtọ ma i kelee ya maka inyere gị aka ịmụta ihe.
Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-emere gị ụmụ obere ihe. Ọ̀ dịtụwo onye jideere gị ibo ụzọ ka ị gafere? Ma ọ bụ, ọ̀ dịtụwo onye bufeere gị nri mgbe unu nọ na tebụl na-eri nri? Ọ dị mma ịsị i meela maka ọbụna ụmụ obere ihe ndị a.
Ọ bụrụ na anyị na-echeta ikele ndị mmadụ nọ n’ụwa, mgbe ahụ o yikarịrị ka anyị ga-echeta ịsị Nna anyị nọ n’eluigwe i meela. Leekwa nnọọ ọtụtụ ihe anyị ga-ekele Jehova ekele maka ha! O nyere anyị ndụ na ihe ọma nile nke na-eme ka ndụ na-atọ ụtọ. Ya mere, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-enye Chineke otuto site n’ikwu okwu ọma dị iche iche banyere ya kwa ụbọchị.
Banyere ikele ekele, gụọ Abụ Ọma 92:1; Ndị Efesọs 5:20; Ndị Kọlọsi 3:17; nakwa 1 Ndị Tesalonaịka 5:18.