Isi 92
A Gwọrọ Ndị Ekpenta Iri na Njem Ikpeazụ Jisọs Jere Na Jerusalem
JISỌS mere ka mgbalị ndị nnọkọ ikpe Sanhedrin na-eme igbu ya kụọ afọ n’ala site n’ịhapụ Jerusalem wee jee obodo Efraim, ma eleghị anya ọ dị nanị maịlụ 15 n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Jerusalem. N’ebe ahụ ka ya na ndị na-eso ụzọ ya nọgidere, ebe aka ndị iro ya na-agaghị erukwa ya.
Otú ọ dị, oge Ememe Ngabiga nke afọ 33 O.A. na-abịaru nso, n’oge na-adịghị anya Jisọs malitekwara njem ọzọ. Ọ gabigara Sameria wee banye na Galili. Nke a bụ njem ikpeazụ ọ na-eme n’akụkụ ebe a tupu ọnwụ ya. Mgbe ọ nọ na Galili, eleghị anya ya na ndị na-eso ụzọ ya sonyeere ndị ọzọ na-aga Jerusalem maka Ememe Ngabiga ahụ. Ha si n’ụzọ ahụ nke gabigara ógbè Perea, nke dị n’ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan.
Ná mmalite njem ahụ, mgbe Jisọs na-abanye otu obodo nta dị na Sameria ma ọ bụ na Galili, ndị ikom iri nwere ọrịa ekpenta zutere ya. Ajọ ọrịa nke a na-eji nwayọọ nwayọọ na-erichapụ anụ ahụ mmadụ—mkpịsị aka ya, mkpịsị ụkwụ ya, ntị ya, imi ya, na egbugbere ọnụ ya. Iji mee ka ọrịa nke a ghara ifere ndị ọzọ, Iwu Chineke kwuru banyere onye ekpenta, sị: “Ọ ga-ekpuchikwa egbugbere ọnụ ya nke elu, na-akpọ, sị, Onye rụrụ arụ, onye rụrụ arụ. Ụbọchị nile nke ihe otiti ahụ dị n’ahụ ya ka ọ ga-arụ arụ; . . . n’azụ ọmụma ụlọ ikwuu ka ebe obibi ya ga-abụ.”
Ndị ekpenta iri ahụ mezuru mmachibido nke Iwu ahụ e nyere ndị ekpenta wee nọrọ n’ebe dị anya site n’ebe Jisọs nọ. Ma, ha ji olu dị elu tie mkpu, sị: “Jisọs, Nna anyị, meere anyị ebere.”
Mgbe ọ hụrụ ha n’ebe dị anya, Jisọs nyere iwu, sị: “Gaanụ, were onwe unu gosi ndị nchụàjà.” Jisọs kwuru nke a n’ihi na Iwu Chineke nyere ikike ka ndị nchụàjà kwupụta na a gwọwo ndị ekpenta bụ́ ndị ọrịa ha laworo. N’ụzọ dị otú a, ndị ahụ na-anata ikike isoro ndị ahụ dị mma bikọọ ọzọ.
Ndị ekpenta iri ahụ nwere obi ike n’ike ọrụ ebube Jisọs nwere. N’ihi ya ha pụrụ ngwa ngwa ije hụ ndị nchụàjà, ọ bụ ezie na a gwọbeghị ha. Mgbe ha nọ n’ụzọ, a kwụghachiri okwukwe ha nwere na Jisọs ụgwọ ọrụ. Ha malitere ịhụ, na-enwekwa mmetụta na ahụ adịghachila ha mma!
Iteghete n’ime ndị ekpenta ahụ e meworo ka ahụ dị ha ọcha nọgidere na-aga, ma onye ekpenta nke ọzọ, bụ́ onye Sameria, bịaghachiri ịchọ Jisọs. N’ihi gịnị? N’ihi na o nwere obi ekele nke ukwuu maka ihe e mewooro ya. O ji olu dị ike too Chineke, mgbe ọ chọtakwara Jisọs, ọ dara n’ụkwụ ya, na-ekele ya.
Ná nzaghachi Jisọs na-asị: “É meghị ka ahụ ndị ikom iri ahụ dị ọcha? ma olee ebe iteghete fọdụrụ nọ? Á hụghị ndị laghachiri inye Chineke otuto, ma ọ bụghị onye ala ọzọ a?”
O wee gwa nwoke onye Sameria ahụ, sị: “Bilie, gaa nke gị: okwukwe gị azọpụtawo gị.”
Mgbe anyị na-agụ ihe banyere ọgwụgwọ Jisọs gwọrọ ndị ekpenta iri ahụ, anyị kwesịrị iburu n’obi ihe mmụta dị n’ajụjụ ahụ bụ: “Olee ebe iteghete fọdụrụ nọ?” Enweghị ekele nke mmadụ iteghete ahụ gosipụtara bụ ịda mbà dị oké njọ. Dị ka onye Sameria ahụ, ànyị ga-egosi onwe anyị dị ka ndị nwere ekele n’ihi ihe nile anyị na-anata n’aka Chineke, gụnyere nkwa ahụ e ji n’aka nke ndụ ebighị ebi n’ime usoro ihe ọhụrụ Chineke n’ezi omume? Jọn 11:54, 55; Luk 17:11-19; Levitikọs 13:16, 17, 45, 46; Mkpughe 21:3, 4.
▪ Olee ụzọ Jisọs si mee ka mgbalị ndị e mere igbu ya kụọ afọ n’ala?
▪ Olee ebe ọzọ Jisọs jere, oleekwa ebe o bu n’uche ijeru?
▪ N’ihi gịnị ka ndị ekpenta ahụ ji guzoro n’ebe dị anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka Jisọs ji gwa ha ka ha jee hụ ndị nchụàjà?
▪ Ihe mmụta dị aṅaa ka anyị kwesịrị inweta site n’ihe a merenụ?