Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 1
Ihe mbụ a kọrọ na Baịbụl bụ otú Jehova si kee eluigwe na ụwa. Akụkọ a mere ka anyị mata ọmarịcha ihe ndị Jehova kere ma n’eluigwe ma n’ụwa. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta ihe dị iche iche dị ịtụnanya Chineke kere. Nyekwara ya aka ka ọ ghọta na Chineke kere mmadụ ka ọ ka anụmanụ. O kere mmadụ ka o nwee ike ikwu okwu, iche echiche, imepụta ihe, ịbụ abụ, na ikpe ekpere. Mee ka ọ ghọta ụdị ike na amamihe Jehova nwere, nakwa otú o si hụ ihe niile o kere n’anya, ma onye ọ bụla n’ime anyị.