Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 1 p. 8
  • Chineke Kere Eluigwe na Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Kere Eluigwe na Ụwa
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Amalite Ike Ihe
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ụmụ Anụmanụ
    Teta!—2015
  • Ogige nke Mara Mma
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Onye Kere Ihe Nile
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 1 p. 8
Ogige Iden

ISI NKE 1

Chineke Kere Eluigwe na Ụwa

Ọ bụ Jehova Chineke kere anyị. Ọ bụ ya kere ihe niile, ma ihe ndị anyị na-ahụ anya ma ihe ndị anyị na-anaghị ahụ anya. Tupu ya ekee ihe ndị anyị na-ahụ anya, o kere ọtụtụ ndị mmụọ ozi. Ị̀ ma otú ndị mmụọ ozi dị? Jehova kere ha ka ha dị ka ya. Anyị enweghị ike ịhụ ha anya, otú ahụ anyị na-enweghị ike ịhụ Chineke anya. Mmụọ ozi mbụ Jehova kere nyeere ya aka ike ihe. O nyeere Jehova aka kee kpakpando, planet, nakwa ihe ndị ọzọ niile. Otu n’ime planet ndị a bụ ụwa anyị a mara mma.

Jehova bịaziri kee ihe ndị ọzọ n’ụwa ka ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nwee ike ibi na ya. O mere ka ìhè anyanwụ na-achabata n’ụwa. O kekwara ugwu na osimiri dị iche iche.

Olee ihe ndị ọzọ Jehova kere? Jehova kwuru, sị: ‘M ga-eke ahịhịa, obere osisi, nakwa nnukwu osisi.’ Ọtụtụ mkpụrụ osisi, na akwụkwọ nri dị iche iche, nakwa okooko osisi dị iche iche malitere ipulite. Jehova bịara kee ụmụ anụmanụ, ma ndị na-efe efe, ma ndị na-egwu mmiri, ma ndị na-arị arị ma ndị na-akpụ akpụ. O kekwara ụmụ anụmanụ ndị obere, dị ka ewi, keekwa ndị nnukwu, dị ka enyí. Olee anụmanụ kacha amasị gị?

Jehova gwaziri mmụọ ozi mbụ ahụ o kere, sị: “Ka anyị kee mmadụ.” Ụmụ mmadụ ga-adị iche n’anụmanụ. Ụmụ mmadụ nwere ike imepụta ihe. Ha nwere ike ikwu okwu, ịchị ọchị, na ikpe ekpere. Ha ga na-elekọta ụwa na ụmụ anụmanụ. Ị̀ ma nwoke mbụ Chineke kere? Anyị ga-amata onye ọ bụ n’isi nke 2.

“Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.” ​—Jenesis 1:1

Ajụjụ: Ònye bụ Jehova Chineke? Olee ihe ndị o kere?

Jenesis 1:1-26; Ilu 8:30, 31; Jeremaya 10:12; Ndị Kọlọsi 1:15-17

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya