Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 1
  • Chineke Amalite Ike Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Amalite Ike Ihe
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Kere Eluigwe na Ụwa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Usoro Mbara Igwe Anyị Pụrụ Iche Otú O Si Malite
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Onye Kere Ihe Nile
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Site n’Okike Ihe Ruo n’Iju Mmiri
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 1
Otú ụwa dị mgbe a na-ekebeghị ihe ọ bụla, naanị ihe dị na ya bụ nnukwu oké osimiri, nkume na ugwu ndị na-agbọpụ ọkụ

AKỤKỌ NKE 1

Chineke Amalite Ike Ihe

EZI ihe niile anyị nwere sitere n’aka Chineke. O kere anyanwụ inye anyị ìhè n’ehihie, keekwa ọnwa na kpakpando inye anyị ìhè n’abalị. Chineke kekwara ụwa ka anyị biri n’ime ya.

Ma, anyanwụ, ọnwa, kpakpando, na ụwa abụghị ihe mbụ Chineke kere. Ị̀ ma ihe mbụ o kere? Chineke bu ụzọ kee ndị dị ka ya. Anyị apụghị ịhụ ha anya, dị nnọọ ka anyị na-apụghị ịhụ Chineke. N’ime Bible, a kpọrọ ha ndị mmụọ ozi. Chineke kere ndị mmụọ ozi iso ya biri n’eluigwe.

Mmụọ ozi mbụ Chineke kere pụrụ iche. Ọ bụ Ọkpara Chineke, o sokwa Nna ya rụọ ọrụ. O nyeere Chineke aka ike ihe niile ọzọ. O nyeere Chineke aka ike anyanwụ, ọnwa, kpakpando, nakwa ụwa anyị.

Olee otú ụwa dị mgbe ahụ? Na mbụ, mmadụ enweghị ike ibi n’ụwa. Ọ dịghị ihe ọ bụla dị na ya ma ọ́ bụghị otu oké osimiri zuru ebe niile. Ma Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ biri n’ụwa. N’ihi ya, ọ malitere idoziri anyị ya. Gịnị ka o mere?

Nke mbụ, elu ala chọrọ ìhè. N’ihi ya, Chineke kere anyanwụ inye ìhè n’ụwa. O kere ya otú ga-eme ka e nwee ehihie na abalị. E mesịa, Chineke mere ka ala nkịtị nupụta n’elu mmiri nke oké osimiri ahụ.

Na mbụ, ọ dịghị ihe dị n’elu ala. O yiri foto nke ị na-ahụ n’ebe a. Okooko osisi ma ọ bụ nnukwu osisi ọ bụla ma ọ bụ anụmanụ adịghị. Ọbụnadị azụ̀ adịghị n’ime osimiri. Chineke ka nwere ọrụ dị ukwuu ọ ga-arụ iji mee ka ụwa dịrị mmadụ na anụmanụ ezi mma ibi na ya.

Jeremaịa 10:12; Ndị Kọlọsi 1:15-17; Jenesis 1:1-10.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya