Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 3 p. 21-25
  • Onye Kere Ihe Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Kere Ihe Nile
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Amalite Ike Ihe
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Chineke Kere Eluigwe na Ụwa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Onye Ozizi Ukwu
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ogige nke Mara Mma
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 3 p. 21-25

ISI NKE 3

Onye Kere Ihe Nile

[Foto dị na peeji nke 21]

Ònye kere ihe nile dị ndụ?

AMA m otu ihe dị ịtụnanya. Ị̀ chọrọ ka m gwa gị ihe ọ bụ?— Lee anya n’aka gị. Rọgọọ mkpịsị aka gị. Ugbu a, tụtụlite ihe. Aka gị pụrụ ime ọtụtụ ihe, ọ pụkwara ime ha nke ọma. Ị̀ ma onye mere aka anyị?—

Ee, ọ bụ otu Onye ahụ mere ọnụ anyị, imi anyị, na anya anyị. Ọ bụ Chineke, bụ́ Nna nke Onye Ozizi Ukwu ahụ. Ọ̀ bụ na anyị enweghị obi ụtọ na Chineke nyere anyị anya?— Anyị pụrụ iji ha hụ ọtụtụ ihe. Anyị pụrụ ịhụ okooko osisi. Anyị pụrụ ịhụ ahịhịa ndụ nakwa mbara igwe na-acha anụnụ anụnụ. Anyị pụrụ ọbụna ịhụ ụmụ obere nnụnụ agụụ ji dị ka ndị a ị na-ahụ n’ihe osise a. N’ezie, ọ bụ ihe magburu onwe ya na anyị pụrụ ịhụ ụdị ihe ndị a, ọ́ bụghị ya?—

Ma, ònye kere ihe ndị a? Ọ̀ bụ mmadụ kere ha? Ee e. Mmadụ pụrụ iwu ụlọ. Ma ọ dịghị mmadụ pụrụ ike ahịhịa na-eto eto. Mmadụ apụghị ike nwa nnụnụ, okooko osisi, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ dị ndụ. Ị̀ ma otú ahụ?—

Ọ bụ Chineke kere ihe ndị a nile. Chineke kere eluigwe na ụwa. Ọ bụkwa ya kere ndị mmadụ. Ọ bụ ya kere nwoke mbụ na nwanyị mbụ. Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ, kwuru nke a.—Matiu 19:4-6.

Olee otú Jizọs si mara na ọ bụ Chineke kere nwoke na nwanyị? Jizọs ọ̀ hụrụ mgbe Chineke na-eke ha?— Ee, ọ hụrụ ya. Jizọs na Chineke nọ mgbe Chineke kere nwoke na nwanyị. Jizọs bụ onye mbụ Chineke kere. Jizọs bụ mmụọ ozi n’oge ahụ, ya na Nna ya bikwa n’eluigwe.

Bible na-agwa anyị na Chineke sịrị: “Ka anyị kpụọ mmadụ.” (Jenesis 1:26) Ị̀ ma onye Chineke na-agwa okwu?— Ọ bụ Ọkpara ya ka ọ na-agwa okwu. Ọ na-agwa onye mesịrị bịa n’ụwa wee ghọọ Jizọs okwu.

Nke ahụ ọ́ bụghị ihe na-enye obi ụtọ? Cheedị nnọọ echiche! Mgbe anyị na-ege Jizọs ntị, ọ bụ onye ahụ ya na Chineke nọ mgbe Chineke kere ụwa na ihe ndị ọzọ nile na-ezi anyị ihe. Jizọs mụtara ihe dị ukwuu site n’isoro Nna ya rụọ ọrụ n’eluigwe. Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji bụrụ Onye Ozizi Ukwu ahụ!

Ì chere na Chineke enweghị obi ụtọ na ọ bụ nanị ya nọ tupu ya ekee Ọkpara ya?— Ee e, o nwere. Ma, ọ bụrụ na o nwere obi ụtọ, gịnị mere o ji kee ihe ndị ọzọ dị ndụ?— O mere nke a n’ihi na ọ bụ Chineke ịhụnanya. Ọ chọrọ ka ndị ọzọ dịrị ndụ ma nụ ụtọ ndụ. Anyị kwesịrị ịdị na-ekele Chineke na o nyere anyị ndụ.

Ihe nile Chineke kere na-egosi ịhụnanya ya. Chineke kere anyanwụ. Anyanwụ na-enye anyị ìhè ma na-eme ka ahụ́ na-ekpo anyị ọkụ. A sị na anyanwụ adịghị, ebe nile gaara ajụ oyi, ọ dịghịkwa ihe dị ndụ gaara adị n’ụwa. Í nweghị obi ụtọ na Chineke kere anyanwụ?—

Chineke na-emekwa ka mmiri zoo. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ị gaghị enwe mmasị na mmiri na-ezo n’ihi na ị gaghị enwe ike ịpụ n’èzí gaa gwurie egwu ma mmiri zoo. Ma, mmiri ozuzo na-enye aka eme ka okooko osisi na-eto. Ya mere, mgbe anyị hụrụ okooko osisi ndị mara mma, ònye ka anyị ga-ekele maka ha?— Ọ bụ Chineke. Ònyekwa ka anyị kwesịrị ikele mgbe anyị riri mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ndị na-atọ ụtọ?— Anyị kwesịrị ikele Chineke n’ihi na ọ bụ anyanwụ na mmiri ozuzo o kere na-eme ka ihe na-eto.

Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị, sị, ‘Ọ̀ bụkwa Chineke kere mmadụ na anụmanụ?’ Gịnị ka ị ga-aza?— O ziri ezi ịza, sị: “Ee, ọ bụ Chineke kere mmadụ na anụmanụ.” Ma, ọ bụrụkwanụ na mmadụ ekweghị na ọ bụ Chineke kere ndị mmadụ n’ezie? Ọ́ sịkwanụ na mmadụ si n’anụmanụ pụta? Bible ekwughị otú ahụ. O kwuru na ọ bụ Chineke kere ihe nile dị ndụ.—Jenesis 1:26-31.

[Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]

Ebe ọ bụ na ọ dị onye wuru ụlọ, ònye kere okooko osisi, osisi, na ụmụ anụmanụ?

Ma, mmadụ pụrụ ịgwa gị na ya ekweghị na Chineke. Mgbe ahụ, gịnị ka ị ga-ekwu?— Gịnị ma ị tụọrọ ya aka n’otu ụlọ? Jụọ onye ahụ, sị: “Ònye wuru ụlọ ahụ?” Onye ọ bụla ma na ọ ghaghị inwe onye wuru ya. N’ezie, ụlọ ahụ ewughị onwe ya!—Ndị Hibru 3:4.

Kpọrọzie onye ahụ gaa n’ubi ma gosi ya otu okooko osisi. Jụọ ya: “Ònye kere okooko osisi a?” Ọ bụghị mmadụ kere ya. Dịkwa ka ụlọ na-ewughị onwe ya, otú a ka okooko osisi a na-ekeghị onwe ya. Ọ dị onye kere ya. Ọ bụ Chineke kere ya.

Gwa onye ahụ ka ọ kwụsịtụ ma gee ntị n’abụ nnụnụ. Mgbe ahụ, jụọ ya, sị: “Ònye kere ụmụ nnụnụ ma kụziere ha ka ha na-abụ abụ?” Ọ bụ Chineke. Ọ bụ Chineke kere eluigwe na ụwa nakwa ihe nile dị ndụ! Ọ bụ ya bụ Onye na-enye ndụ.

Ma, mmadụ pụrụ ịsị na ya na-ekweta nanị ihe ya pụrụ ịhụ anya. Ọ pụrụ ịsị: ‘Ọ bụrụ na mụ apụghị ịhụ ya anya, agaghị m ekweta.’ Ya mere, ụfọdụ na-asị na ha ekweghị na Chineke n’ihi na ha apụghị ịhụ ya anya.

Ọ bụ eziokwu na anyị apụghị ịhụ Chineke anya. Bible na-ekwu, sị: ‘Ọ dịghị mmadụ pụrụ ịhụ Chineke anya.’ Ọ dịghị nwoke, nwanyị, ma ọ bụ nwatakịrị nọ n’ụwa nke pụrụ ịhụ Chineke anya. N’ihi ya, ọ dịghị onye kwesịrị ịgbalị ise onyinyo ma ọ bụ ime ihe oyiyi nke Chineke. Chineke gwara anyị ọbụna ka anyị ghara ime ihe oyiyi ya. N’ihi ya, ọ gaghị adị Chineke mma n’obi ma ọ bụrụ na anyị enwee ụdị ihe ndị ahụ n’ụlọ anyị.—Ọpụpụ 20:4, 5; 33:20; Jọn 1:18.

Ma, ọ bụrụ na ị pụghị ịhụ Chineke anya, olee otú i si mara na Chineke dị adị n’ezie? Cheedị echiche. Ị̀ pụrụ ịhụ ikuku anya?— Ee e. Ọ dịghị onye pụrụ ịhụ ikuku anya. Ma, ị pụrụ ịhụ ihe ikuku na-eme. Ị pụrụ ịhụ ka mkpá akwụkwọ na-emegharị ahụ́ mgbe ikuku kusara alaka osisi. N’ihi ya, i kwetara na ikuku dị.

[Foto dị na peeji nke 25]

Olee otú i si mara na ikuku dị?

Ị pụkwara ịhụ ihe ndị Chineke kere. Mgbe ị hụrụ okooko osisi ma ọ bụ nnụnụ dị ndụ, ọ bụ ihe Chineke kere ka ị na-ahụ. N’ihi ya, i kwetara na Chineke dị adị n’ezie.

Mmadụ pụrụ ịjụ gị, sị, ‘Ònye kere anyanwụ na ụwa?’ Bible na-ekwu, sị: “Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) Ee, Chineke kere ihe ndị a nile dị ịtụnanya! Olee ihe i chere banyere nke ahụ?—

Ọ́ bụghị ihe magburu onwe ya na anyị dị ndụ? Anyị pụrụ ịnụ abụ dị ụtọ nke ụmụ nnụnụ. Anyị pụrụ ịhụ okooko osisi na ihe ndị ọzọ Chineke kere. Anyị pụkwara iri ihe oriri ndị Chineke nyeworo anyị.

Anyị kwesịrị ịdị na-ekele Chineke maka ihe ndị a nile. Nke kasị nke, anyị kwesịrị ịdị na-ekele ya na o nyere anyị ndụ. Ọ bụrụ na anyị nwere ekele n’ezie n’ebe Chineke nọ, ọ dị ihe anyị ga-eme. Gịnị bụ ihe ahụ?— Anyị ga na-ege Chineke ntị, anyị ga na-emekwa ihe ọ na-agwa anyị n’ime Bible. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị pụrụ igosi na anyị hụrụ Onye ahụ kere ihe nile n’anya.

Anyị kwesịrị igosi na anyị nwere ekele n’ebe Chineke nọ maka ihe nile o kere. N’ụzọ dị aṅaa? Gụọ ihe e dere n’Abụ Ọma 139:14; Jọn 4:23, 24; 1 Jọn 5:21; nakwa ná Mkpughe 4:11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya