Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 5/15 p. 14-15
  • Ụmụ Anụmanụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụ Anụmanụ
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee otú ụmụ mmadụ kwesịrị isi na-emeso ụmụ anụmanụ?
  • Igbu ụmụ anụmanụ ọ̀ bụ ihe ọjọọ?
  • Ụmụ Anụmanụ Hà Na-aga Eluigwe?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ịrụsa Anụmanụ Arụrụala—Ọ̀ Dị Njọ?
    Teta!—1998
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ọ̀ Dị Njọ Iri Anụ?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 5/15 p. 14-15
Ebe otu nwoke na-adịda ịnyịnya aka n’ahụ́

IHE BAỊBỤL KWURU

Ụmụ Anụmanụ

O nweghị onye nọ n’ụwa ga-asị na ụmụ anụmanụ abaraghị ya uru. Ànyị ga-aza Chineke ajụjụ gbasara otú anyị si na-emeso ụmụ anụmanụ?

Olee otú ụmụ mmadụ kwesịrị isi na-emeso ụmụ anụmanụ?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-ekwu na anyị nwere ike ime ụmụ anụmanụ ihe ọ bụla anyị chọrọ. Ndị ọzọ ana-ekwu na anyị kwesịrị ịna-emeso ụmụ anụmanụ otú anyị si emeso mmadụ ibe anyị.

  • Otu nwoke na-ahụ na a naghị arụsa ụmụ anụmanụ arụrụala kwuru na e kwesịghị ịna-eji ha akpa ego ma ọ bụkwanụ na-eme ha ihe ọ bụla masịrị anyị.

  • E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Leona Helmsley. Nwaanyị a nwere ezigbo ego. Mgbe ọ na-ede otú a ga-esi kee akụnụba ya ma ọ nwụọ, o kwuru ka e jiri ihe karịrị ijeri naịra abụọ na-elekọta nkịta ya, kwuokwa ka e lie nkịta ahụ n’akụkụ ili ya ma ọ nwụọ.

Ihe ị ga-echebara echiche: Olee otú i chere anyị kwesịrị isi na-emeso ụmụ anụmanụ?

IHE BAỊBỤL KWURU

Jehova Chineke bụ́ Onye kere ihe niile kwuru na azụ̀ ndị dị n’oké osimiri, anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala ga-anọ n’okpuru ụmụ mmadụ. (Jenesis 1:28) N’ihi ya, o doro anya na Chineke kere ụmụ anụmanụ ka ha nọrọ n’okpuru ụmụ mmadụ.

Ihe Baịbụl kwuru tupu ya ekwuo ihe ahụ dị na Jenesis 1:28 gosikwara na ụmụ anụmanụ ga-anọ n’okpuru ụmụ mmadụ. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, ọ bụ n’onyinyo Chineke ka o kere ya; nwoke na nwaanyị ka o kere ha.”—Jenesis 1:27.

Otú Chineke si kee anyị pụrụ iche n’ihi na o kere anyị “n’onyinyo ya.” Ihe ọ pụtara bụ na o kere anyị ka anyị nwee amamihe, hụ ndị ọzọ n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi ka yanwa. O kekwara anyị otú ọ ga na-agụ anyị agụụ ife ya, nweekwa ike ịmata ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ụmụ anụmanụ agaghị emeli ihe ndị a n’ihi na Chineke ekeghị ha “n’onyinyo ya.” E kere ha ka ha nọrọ n’okpuru ụmụ mmadụ, ọ bụghị ka a na-emeso ha otú e si emeso ụmụ mmadụ.

Ọ̀ pụtaranụ na ụmụ mmadụ ga na-arụsa ụmụ anụmanụ arụrụala? Mba.

  • N’Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel, o kwuru ka a na-enye ụmụ anụmanụ nri nakwa na o nwere mgbe a ga-ahapụ ndị nke e ji arụ ọrụ ka ha zuo ike. O kwukwara ka e nyere ha aka ma ha baa ná nsogbu nakwa ka a ghara ikwe ka ha merụọ ahụ́.—Ọpụpụ 23:4, 5; Diuterọnọmi 22:10; 25:4.

“Ụbọchị isii ka ị ga-arụ ọrụ gị; ma n’ụbọchị nke asaa, arụla ọrụ, ka ehi gị na ịnyịnya ibu gị wee zuo ike, ka nwa ohu gị nwaanyị na onye mbịarambịa wee nweta ume.”—Ọpụpụ 23:12.

Igbu ụmụ anụmanụ ọ̀ bụ ihe ọjọọ?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-agba nta na ndị na-akụ azụ̀ na-ama ụma gbuo anụmanụ ma ọ bụ azụ̀ ha na-achọghị iji mee ihe ọ bụla. Ịchụgharị ha na igbu ha na-atọ ha ụtọ. Ndị ọzọ kwetara ihe otu nwoke Rọshịa na-ede akwụkwọ kwuru. Aha nwoke ahụ bụ Leo Tolstoy. O kwuru na igbu ụmụ anụmanụ na iri ha bụ ihe ọjọọ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke kwuru na ụmụ mmadụ nwere ike igbu anụmanụ ma ọ bụrụ na ọ ga-emerụ ha ahụ́. E nwekwara ike igbu ha ma ọ bụrụ na a chọrọ iji ha nweta ihe a na-eyi eyi. (Ọpụpụ 21:28; Mak 1:6) Baịbụl kwukwara na anyị nwere ike igbu ụmụ anụmanụ rie. Jenesis 9:3 kwuru, sị: “Anụ ọ bụla na-agagharị agagharị nke dị ndụ pụrụ ịbụrụ unu ihe oriri.” Ihe ọzọ bụ na Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka, ha egbute azụ̀ ha riri.—Jọn 21:4-13.

Ma, Baịbụl kwuru na Chineke “kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” (Abụ Ọma 11:5) N’ihi ya, o doro anya na Chineke achọghị ka anyị merụọ ụmụ anụmanụ ahụ́ ma ọ bụkwanụ mara ụma gbuo ha n’enweghị ihe anyị ji ha eme.

Ihe Baịbụl kwuru na-egosi na Chineke ejighị ndụ ụmụ anụmanụ egwu egwu.

  • Baịbụl kwuru na mgbe Chineke na-eke ihe, o mere “anụ ọhịa nke ụwa n’ụdị ya dị iche iche nakwa anụ ụlọ n’ụdị ya dị iche iche nakwa anụ ọ bụla ọzọ na-agagharị agagharị nke ala n’ụdị ya dị iche iche. Chineke wee hụ na ọ dị mma.”—Jenesis 1:25.

  • Baịbụl kwuru gbasara Jehova, sị: “Ọ na-enye anụmanụ ihe oriri ha.” (Abụ Ọma 147:9) Chineke kere ụwa otú ọ ga-eme ka ụmụ anụmanụ na-enweta nri ga-ezuru ha, hụkwa ebe ha ga-ebi.

  • Mgbe Eze Devid na-ekpe ekpere, ọ sịrị: “Jehova, ị na-azọpụta mmadụ na anụmanụ.” (Abụ Ọma 36:6) Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova ji Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ bibie ndị ajọ omume, o chebere mmadụ asatọ na ụdị anụmanụ dị iche iche.—Jenesis 6:19.

O doro anya na Jehova anaghị eji ụmụ anụmanụ egwu egwu. Ọ chọghịkwa ka ụmụ mmadụ na-arụsa ha arụrụala.

“Onye ezi omume na-elekọta mkpụrụ obi anụ ụlọ ya.”—Ilu 12:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya