Gee Ntị Ka Ị Nụ Mgbe A Ga-aza Ajụjụ Ndị A:
Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị nwee okwukwe n’agbanyeghị ọnọdụ ọ bụla anyị nọ? (Mak 11:22)
Olee uru ndị anyị na-erite ma anyị na-atụgharị uche n’ihe atụ ndị Baịbụl ji kọwaa Jehova? (Ọma 28:7; Luk 11:11-13; Diut. 32:4; Ọma 23:1)
Olee otú anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike? (Mak 9:24)
Gịnị bụ “mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị,” oleekwa otú anyị ga-esi zere ya? (Hib. 12:1)
Gịnị mere obi ji sie anyị ike na a ga-akwụ ndị nwere ezigbo okwukwe ụgwọ ọrụ? (Hib. 11:6)