Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es18 p. 7-17
  • Jenụwarị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jenụwarị
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2018
  • Isiokwu Nta
  • Mọnde, Jenụwarị 1
  • Tuzdee, Jenụwarị 2
  • Wenezdee, Jenụwarị 3
  • Tọzdee, Jenụwarị 4
  • Fraịdee, Jenụwarị 5
  • Satọdee, Jenụwarị 6
  • Sọnde, Jenụwarị 7
  • Mọnde, Jenụwarị 8
  • Tuzdee, Jenụwarị 9
  • Wenezdee, Jenụwarị 10
  • Tọzdee, Jenụwarị 11
  • Fraịdee, Jenụwarị 12
  • Satọdee, Jenụwarị 13
  • Sọnde, Jenụwarị 14
  • Mọnde, Jenụwarị 15
  • Tuzdee, Jenụwarị 16
  • Wenezdee, Jenụwarị 17
  • Tọzdee, Jenụwarị 18
  • Fraịdee, Jenụwarị 19
  • Satọdee, Jenụwarị 20
  • Sọnde, Jenụwarị 21
  • Mọnde, Jenụwarị 22
  • Tuzdee, Jenụwarị 23
  • Wenezdee, Jenụwarị 24
  • Tọzdee, Jenụwarị 25
  • Fraịdee, Jenụwarị 26
  • Satọdee, Jenụwarị 27
  • Sọnde, Jenụwarị 28
  • Mọnde, Jenụwarị 29
  • Tuzdee, Jenụwarị 30
  • Wenezdee, Jenụwarị 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2018
es18 p. 7-17

Jenụwarị

Mọnde, Jenụwarị 1

Lụsie ọgụ ike maka okwukwe ahụ.​—⁠Jud 3.

Otu nwa agbọghọ ji ọsọ gaa zute nna ya. Obi dị ya ezigbo ụtọ ịhụ na ọ lọtara n’udo n’agha ọ gara lụọ. Otú nna ya si merie n’agha ahụ mere ka ọ bụwa abụ ma jiri ọṅụ na-agba egwú. Ma, ọ ga-abụrịrị na ihe ọzọ nna ya mere na ihe o kwuru juru ya anya. Nna ya dọwara uwe ya, tie mkpu, sị: “Ewoo, ada m! I meela ka obi gbawaa m.” Ọ gwaziri ada ya na ya ekwela Jehova nkwa nke ga-agbanwe ndụ ada ya ruo mgbe ebighị ebi. Nkwa ahụ o kwere pụtara na ada ya agaghị alụ di ma ọ bụ mụta nwa. Ma, ozugbo ahụ, ada Jefta gbara ya ume ka o mezuo nkwa ahụ o kwere Jehova. Ihe ahụ ọ zara gosiri na obi siri ya ezigbo ike na ihe ọ bụla Jehova chọrọ ka o mee ga-adị mma. (Ikpe 11:​34-37) Mgbe nna ya hụrụ na o nwere okwukwe, ọ ṅụrịrị ọṅụ n’ihi na ọ ma na otú o si kweta ime uche Jehova ga-eme Jehova obi ụtọ. Jefta na ada ya tụkwasịrị Jehova na otú o si eme ihe obi. Ha rubeere Jehova isi, ma mgbe ọ na-adịrịghị ha mfe. Ha chọrọ ime ihe dị Jehova mma. Ihe ọ bụla ha hapụrụ iji mee ya efughịkwa ọhịa. w16.04 1:1, 2

Tuzdee, Jenụwarị 2

Unu anụwo banyere ntachi obi Job, unu ahụwokwa ihe Jehova mesịrị mee.​—⁠Jems 5:⁠11.

O nwere ike iwute gị mgbe ụfọdụ ma enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ unu gwa gị okwu ọjọọ. O nwekwara ike ịbụ na ị na-arịa ezigbo ọrịa ma ọ bụ na-eru uju n’ihi na onye ị hụrụ n’anya nwụrụ. N’agbanyeghị ihe merenụ, ihe Job mere nwere ike ịkasi gị obi. (Job 1:​18, 19; 2:​7, 9; 19:​1-3) Job amaghị ihe mere ọtụtụ ọnwụnwa ji bịara ya. Ma, ọ daghị mbà. Olee ihe nyeere ya aka ịtachi obi? Nke mbụ bụ na ọ hụrụ Jehova n’anya, ọ chọghịkwa ime ihe ga-ewe ya iwe. (Job 1:⁠1) Job chọrọ ime ihe dị Chineke mma, ma mgbe ihe dị mma ma mgbe nsogbu bịara. Ihe ọzọ bụ na Jehova nyeere Job aka ịghọta ike ya. Otú o si mee ya bụ ịgwa Job banyere ihe ụfọdụ dị ebube o kere. Ihe a mere ka obi sikwuo Job ike na Jehova ga-eme ka ọnwụnwa ndị bịaara ya bie mgbe oge ruru. (Job 42:​1, 2) Ọ bụ ihe mechara mee. Jehova wepụrụ nsogbu Job, meekwa ka o nwee ihe ndị o nwere na mbụ. ‘Jehova nyeghachiri Job ihe niile o nwere, okpukpu abụọ.’ Job “mere agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.”​—⁠Job 42:​10, 17. w16.04 2:11, 13

Wenezdee, Jenụwarị 3

Bụrụnụ ndị dị akọ dị ka agwọ, ndị na-adịghị aghụghọ, dị ka nduru.​—⁠Mat. 10:⁠16.

Otú anyị ga-esi egosi na anyị “dị akọ” bụ ibu ụzọ chee banyere ihe nwere ike ime ka anyị tinyewe aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Anyị ga-egosi na anyị adịghị “aghụghọ” ma ọ bụrụ na anyị ekweghị ka e jiri ihe ndị ahụ nwata anyị. Anyị kwesịrị ịkpachara ezigbo anya ma ndị mmadụ kparịtawa banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Dị ka ihe atụ, anyị gwawa mmadụ banyere Alaeze Chineke, anyị agaghị ekwu na anyị kwetara ma ọ bụ na anyị ekwetaghị ihe otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ otu onye ọchịchị kwuru ma ọ bụ ihe o chere. Kama ikwuwe ihe ndị mmadụ chọrọ ime ka nsogbu ụmụ mmadụ kwụsị, jiri Baịbụl gosi otú Alaeze Chineke ga-esi kwụsị nsogbu niile kpamkpam. Ndị mmadụ rụwa ụka gbasara otu okwu, dị ka okwu gbasara nwoke ịlụ nwoke ibe ya na nwaanyị ịlụ nwaanyị ibe ya ma ọ bụ imepụ ime, gwa ha ihe Baịbụl kwuru na otú i si eme ihe ahụ o kwuru. Mmadụ kwuo na e kwesịrị iwepụ iwu ụfọdụ ma ọ bụ gbanwee ha, anyị anaghị akwado onye ahụ ma ọ bụ rụwa ya ụka, anyị anaghịkwa amanye ya ịgbanwe echiche ya. w16.04 4:8, 9

Tọzdee, Jenụwarị 4

Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. ​—⁠Mat. 28:⁠19.

Anyị kwesịrị ime ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, mee ha baptizim ma kụziere ha ihe. Ma nke mbụ anyị ga-ebugodị ụzọ mee bụ ịgakwuru ndị mmadụ. Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla kwere ekwe kwesịrị ‘ịga,’ ma ọ̀ bụ ịgafe okporo ámá ma ọ bụ ịgafe oké osimiri.” (Mat. 10:7; Luk 10:⁠3) Gịnị ka Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya mee? Ọ̀ chọrọ ka onye ọ bụla kwusara nke ya na-aga, ka ọ̀ chọrọ ka a hazie ha ahazie? Ebe ọ bụ na otu onye agaghị ekwusaliri “mba niile” ozi ọma, e kwesịrị ịhazi ndị na-eso ụzọ ya ahazi. Ọ bụ ihe Jizọs bu n’obi mgbe ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bụrụ “ndị na-akụta mmadụ.” (Mat. 4:​18-22) Jizọs anaghị ekwu banyere otu onye iwere ihe e ji egbu azụ̀ gaa tụba ya ná mmiri, nọrọzie na-eche ka azụ̀ bịa ịtụrụ ya. Kama, ọrụ ịkụ azụ̀ Jizọs na-ekwu okwu ya bụ nke a na-eji ụgbụ arụ. Ụdị ịkụ azụ̀ ahụ pụtara na a ga na-arụsi ọrụ ike, hazie ya ahazie, ọtụtụ ndị agbakọọkwa aka.​—⁠Luk 5:​1-11. w16.05 2:3, 4

Fraịdee, Jenụwarị 5

Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.​—⁠Ilu 3:​5, 6.

Anyị chọọ ịmata ihe bụ́ uche Jehova, anyị kwesịrị ịna-amụsi ihe ike. Anyị gụwa Okwu Chineke ma ọ bụ mụwa ya, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị, ‘Gịnị ka ihe a na-akụziri m banyere Jehova? Gịnị mere o ji mee ihe a o mere?’ Anyị kwesịrị inwe ụdị obi ahụ ọbụ abụ bụ́ Devid nwere mgbe o dere, sị: “Jehova, biko, mee ka m mara ụzọ gị; zi m ụzọ gị. Mee ka m jee ije n’eziokwu gị, kụziere m ihe, n’ihi na ị bụ Chineke nke nzọpụta m. Ọ bụ n’ebe ị nọ ka olileanya m dị ogologo ụbọchị dum.” (Ọma 25:​4, 5) Ị tụgharịwa uche n’ebe ị gụrụ na Baịbụl, i nwere ike ichebara ajụjụ ndị a echiche: ‘Olee otú m ga-esi mee ihe a ná ndụ m? Olee ebe m nwere ike ime ya? Ọ̀ bụ n’ụlọ, n’ụlọ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ka ọ̀ bụ n’ozi ọma?’ Ozugbo ị matara ebe i nwere ike ime ya, o nwere ike ịdịkwuru gị mfe ịmata otú ị ga-esi eme ya. w16.05 3:9, 11

Satọdee, Jenụwarị 6

Onye nlekọta kwesịrị ịbụ onye a na-apụghị ikwujọ ekwujọ.​—⁠1 Tim. 3:⁠2.

Àgwà ndị ahụ Jehova mere ka e dee na-eme ka anyị mata na e nwere àgwà ndị magburu onwe ha ọ chọrọ ka ndị okenye ọgbakọ na-akpa. (1 Tim. 3:​2-7) Ọ chọrọ ka ndị okenye bụrụ ndị ndị ọzọ ga na-eṅomi. Ọ ga-ajụkwa ha ajụjụ maka otú ha si emeso ọgbakọ ya, “nke o ji ọbara Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:28) Jehova chọrọ ka obi ruo anyị ala n’ihi otú ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru ya si elekọta anyị. (Aịza. 32:​1, 2) N’ihi ya, àgwà ndị ahụ ndị okenye kwesịrị inwe na-echetara anyị na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Nke bụ́ eziokwu bụ na Onye Kraịst ọ bụla nwere ike ịmụta ihe n’àgwà ndị ahụ e dere n’amaokwu ndị ahụ, ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime ha bụ ihe Jehova chọrọ ka Ndị Kraịst niile na-eme. Dị ka ihe atụ, anyị niile kwesịrị inwe ezi uche na uche zuru okè. (Fil. 4:5; 1 Pita 4:⁠7) Ka ndị okenye na-agbalị ka ha ghọọrọ “ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya,” anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ha ma ‘na-eṅomi okwukwe ha.’​—⁠1 Pita 5:3; Hib. 13:⁠7. w16.05 5:8-10

Sọnde, Jenụwarị 7

Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị.​—⁠Ilu 4:⁠23.

Olee àgwà ọjọọ ndị anyị kwesịrị izere? Ụfọdụ n’ime ha bụ mpako, ịkpachara anya na-eme mmehie, na enweghị okwukwe. Àgwà ndị a nwere ike ime ka anyị nupụwa isi, dịwakwa isi ike. (Dan. 5:​1, 20; Hib. 3:​13, 18, 19) Ọ bụ ihe mere Ọzaya eze Juda. (2 Ihe 26:​3-5, 16-21) Mgbe Ọzaya malitere ịbụ eze, ọ nọ “na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova,” ‘na-achọkwa Chineke.’ Ma, ‘ozugbo o siri ike, obi ya adịzie mpako’ n’agbanyeghị na ọ bụ Chineke nyere ya ike. Ọ gbalịdịrị isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ụlọ nsọ, ihe ọ bụ naanị ndị nchụàjà sí n’agbụrụ Erọn kwesịrị ime. Mgbe ndị nchụàjà gwara ya na o kwesịghị ime ya, iwe were ya n’ihi mpako ya. Gịnị meziri ya? Jehova menyere ya ihere, ya abụrụzie onye ekpenta ruo mgbe ọ nwụrụ. (Ilu 16:18) Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, mpako nwere ike ime ka anyị ‘chewe banyere onwe anyị karịa ka anyị kwesịrị iche,’ nke nwere ike ime ka anyị jụ ndụmọdụ sí n’Akwụkwọ Nsọ.​—⁠Rom 12:3; Ilu 29:⁠1. w16.06 2:3, 4

Mọnde, Jenụwarị 8

Jirikwa ịhụnanya na-ediri ibe unu ihe.​—⁠Efe. 4:⁠2.

Olee otú i si ele ụmụnna ndị omenala ha dị iche na nke unu anya? Asụsụ ha, ejiji ha, omume ha, na nri ha nwere ike ịdị iche na nke unu. Ị̀ na-agbara ha ọsọ ma na-agakwuru naanị ndị gị na ha si n’otu ebe? Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị a họpụtara ka ha bụrụ ndị nlekọta n’ọgbakọ unu, na sekit unu ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ dị n’ebe i bi bụ ndị ị tọrọ ma ọ bụ ndị si mba ọzọ ma ọ bụkwanụ n’agbụrụ ọzọ? Ị̀ na-ekwe ka ụdị ihe a mee ka i mewe ihe ga-eme ka ndị Jehova ghara ịdị n’otu ma ọ bụ inwe otu obi? Gịnị ka anyị ga-eme ka ụdị ihe ahụ ghara ime? Pọl nyere Ndị Kraịst bi n’Efesọs ndụmọdụ bara ezigbo uru. Efesọs bụ obodo bara ọgaranya, ọtụtụ ndị sí ebe dị iche iche bikwa na ya. (Efe. 4:​1-3) Pọl bu ụzọ kwuo banyere àgwà ndị dị ka ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi, na ịhụnanya. E nwere ike iji àgwà ndị a tụnyere idé ji ụlọ. w16.06 3:17, 18

Tuzdee, Jenụwarị 9

Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla.​—⁠Luk 12:⁠15.

Setan chọrọ ka anyị bụrụ ndị ohu Akụnụba kama ịbụ ndị ohu Jehova. (Mat. 6:24) Ma ọ bụrụ na ihe kacha anyị mkpa bụ ịkpata akụ̀, ndụ anyị agaghị enwe isi. O nwere ike ime ka obi ghara ịna-ezu anyị ike. Nke kadị njọ bụ na okwukwe anyị agaghịzi esi ike. (1 Tim. 6:​9, 10; Mkpu. 3:17) Ọ ga-adị ka ihe ahụ Jizọs kwuru n’ilu ọ tụrụ gbasara ọgha mkpụrụ. Ọ sịrị na mgbe a kụrụ mkpụrụ Alaeze Chineke “n’etiti ogwu . . . , ọchịchọ maka ihe ndị ọzọ na-awabata ma kpagbuo okwu ahụ, o wee ghọọ nke na-amịghị mkpụrụ.” (Mak 4:​14, 18, 19) Ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso, ugbu a abụghị oge anyị ga-eji na-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ. Anyị ekwesịghị ịtụ anya na e nwere akụ̀ anyị a na-agaghị ebibi n’oké mkpagbu ahụ n’agbanyeghị otú anyị si jiri ya kpọrọ ihe.​—⁠Ilu 11:4; Mat. 24:​21, 22. w16.07 1:5, 6

Wenezdee, Jenụwarị 10

Anyị niile nwetara . . . obiọma na-erughịrị mmadụ n’elu obiọma na-erughịrị mmadụ.​—⁠Jọn 1:⁠16.

Otu nwoke pụrụ n’isi ụtụtụ ịga goo ndị ga-arụrụ ya ọrụ n’ubi vaịn ya. Ya na ndị ọrụ ọ hụrụ kwekọrịtara ego ole ọ ga-akwụ ha, ha arụwa ọrụ. Ma, ọ chọpụtara na ọ chọkwuru ndị ọrụ, ya agaghachị n’otu ebe ahụ ugboro anọ ọzọ gokwuo ndị ọrụ. Ma, ọ gwara ha na ọ ga-akwụ ha ihe kwesịrị ekwesị n’agbanyeghị na ha niile amaliteghị ọrụ otu oge. Mgbe ha rụchara ọrụ ná mgbede, ọ kpọkọtara ha niile kwụọ ha otu ihe ahụ, ma ndị rụrụ ọrụ ọtụtụ awa ma ndị rụrụ naanị otu awa. Mgbe ndị nke bu ụzọ malite ọrụ hụrụ ego ole ọ kwụrụ ha, ha were iwe. Ma nwoke ahụ sịrị ha: ‘Ọ́ bụghị ihe anyị kwekọrịtara ka m kwụrụ unu? Ọ̀ bụ na enweghị m ikike ịkwụ ndị ọrụ m niile ego ole m chọrọ ịkwụ ha? Ka ùnu na-emere m anya-ụfụ maka na m bụ ezi mmadụ?’ (Mat. 20:​1-15) Ilu a Jizọs tụrụ na-akụziri anyị otu ihe dị mkpa banyere “obiọma na-erughịrị mmadụ” Jehova na-egosi anyị.​—⁠2 Kọr. 6:⁠1. w16.07 3:1, 2

Tọzdee, Jenụwarị 11

Lee! Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ. . . . Dee ha ede, n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.​—⁠Mkpu. 21:⁠5.

Ọ dị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ihi na ọgwụgwụ ụwa a adịla nso. (Mak 13:10) O doro anya na ozi ọma anyị na-ekwusa na-eme ka a mata obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ. Anyị kwesịrị iburu ya n’obi mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma. Ihe mere anyị ji ekwusa ya bụ ka anyị sọpụrụ Jehova. Otú anyị ga-esi na-eme ya bụ ime ka ndị mmadụ mata na ihe ọma niile Jehova kwere nkwa imere anyị n’ụwa ọhụrụ na-egosi na obiọma ya enweghị atụ. Mgbe anyị na-ezi ndị ọzọ ozi ọma, anyị nwere ike ịkọwara ha na Alaeze Kraịst chịwa, ụmụ mmadụ ga-erite uru niile ha kwesịrị irite n’ihe mgbapụta ahụ ma jiri nwayọọ nwayọọ zuo okè. Baịbụl sịrị: “A ga-emekwa ka ihe e kere eke nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Rom 8:21) Ọ bụ naanị obiọma pụrụ iche Jehova na-egosi anyị ga-eme ka ihe a kwe omume. w16.07 4:17-19

Fraịdee, Jenụwarị 12

Ka di na-enye nwunye ya ihe ruuru ya; ka nwunye na-emekwara di ya otú ahụ.​—⁠1 Kọr. 7:⁠3.

Baịbụl enyeghị iwu banyere ụdị egwuregwu di na nwunye ga na-egwu nakwa otú ha ga-egwuru ya. Ma, o kwuru na ụdị ihe ahụ adịghị njọ. (Abụ Sọlọ. 1:2; 2:⁠6) Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye kwesịrị ịna-enwere ibe ha ọmịiko. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya n’eziokwu, anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla mee ka anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị gbasaa. Ile ndị gba ọtọ emeela ka ụfọdụ di na nwunye see okwu ma ọ bụ gbasaa. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị ghara ile ndị gba ọtọ ma ọ bụ tinye aka n’ihe ọ bụla ọzọ gbasara mmekọahụ rụrụ arụ. Anyị ekwesịghịdị ịna-eme ihe ọ bụla ga-eme ka o yie ka ànyị na-achụ nwaanyị na-abụghị nwunye anyị ma ọ bụ nwoke na-abụghị di anyị. Ime otú ahụ agaghị egosi na anyị hụrụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-echeta na Chineke ma ihe niile anyị na-eche na ihe anyị na-eme, anyị ga-ekpebisikwu ike ime ihe ga-adị ya mma ma ghara ịhapụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị.​—⁠Mat. 5:​27, 28; Hib. 4:13. w16.08 2:7-9

Satọdee, Jenụwarị 13

Anyị akwụsịbeghị ikpe ekpere maka unu . . .  nakwa ịrịọ arịrịọ ka unu jupụta n’ezi ihe ọmụma.​—⁠Kọl. 1:⁠9.

Eziokwu ụmụnna ndị ahụ nọ na Kọlọsi mụtara ga-enyere ha aka ‘ịna-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu.’ Ọ ga-emekwa ka ha “na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla,” karịchaa n’ikwusa ozi ọma. (Kọl. 1:10) Ihe ga-enyere mmadụ aka ịna-efe Jehova nke ọma bụ ịna-agụ Baịbụl, na-amụchikwa ya anya. Ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime ka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ghọta. Obi kwesịrị isi anyị ike na ịmụ ihe bara ezigbo uru. N’eziokwu, anyịnwa kwesịrị ịna-amụchi Baịbụl anya. N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Mmadụ kwuo ihe dị iche n’ihe Baịbụl kwuru ma ọ bụ jụọ ajụjụ ndị siri ike, m̀ ga-ejili Baịbụl zaa onye ahụ ajụjụ ya? Anyị gwa ndị ọzọ ihe anyị mụtara mgbe anyị na-amụ Baịbụl na uru ọ baara anyị, anyị nwere ike ịgba ha ume ịmụsikwu Baịbụl ike ka hanwa ritekwa uru otú ahụ. w16.08 4:3, 4

Sọnde, Jenụwarị 14

N’ihi na anyị nwere mgba, . . . ọ bụghị megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.​—⁠Efe. 6:⁠12.

Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị ghara ikwe ka “ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike” n’ụwa megharịa anyị anya. Ihe ndị ahụ bụ ozizi ụgha, amamihe ụwa, àgwà ọjọọ ndị dị́ ka ịkwa iko, ịṅụ sịga, ịṅụbiga mmanya ókè na ịṅụ ọgwụ ike. Anyị kwesịkwara ịna-agbalịsi ike ka anyị ghara ịda mbà n’obi ma ọ bụ mee ihe ọjọọ na-agụ anyị. (2 Kọr. 10:​3-6; Kọl. 3:​5-9) Ànyị ga-emerili ndị iro ndị ahụ? Ee. Ma, ọ gaghị adị mfe. Pọl ji onwe ya tụnyere onye na-akụ ọkpọ n’oge ochie. Ọ sịrị: “Otú m si eti ọkpọ bụ ka m wee ghara ịdị na-eti ikuku.” (1 Kọr. 9:26) Anyị kwesịrị ịna-alụsi ọgụ ike ka anyị merie ndị iro anyị otú ahụ onye na-akụ ọkpọ na-agba mbọ ka o merie onye ọ bụ ya na ya. Jehova na-enyere anyị aka ma na-akụziri anyị otú anyị ga-esi eme ya. Ọ na-eji Baịbụl agwa anyị ihe anyị kwesịrị ime. Ihe ndị ọzọ o ji enyere anyị aka bụ akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, ọmụmụ ihe ọgbakọ, na mgbakọ dị́ iche iche. Ị̀ na-eme ihe ị na-amụta? w16.09 2:2, 3

Mọnde, Jenụwarị 15

Ọbụna Kraịst emeghị ihe masịrị onwe ya.​—⁠Rom 15:⁠3.

N’eziokwu, ime uche Chineke na inyere ndị ọzọ aka dị Jizọs mkpa karịa ime ihe dị́ ya mma. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-eyi uwe naanị maka na ọ dị anyị mma ma ya abụrụ na o nwere ike ime ka ndị mmadụ ghara ige ntị n’ozi ọma anyị na-ezi ha. (Rom 15:⁠2) Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịkụziri ụmụ ha ime ihe Baịbụl kwuru. Ọ pụtara na ha na ụmụ ha ga na-agba mbọ iji ejiji dị́ mma nke ga-eme Chineke obi ụtọ. (Ilu 22:6; 27:11) Ha kwesịkwara ịkụziri ụmụ ha ịdị na-akwanyere Chineke dị́ nsọ ha na-efe ùgwù. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eji ejiji dị́ mma ụmụ ha ga-amụta, wetuokwa obi na-agwa ha ihe ha kwesịrị ime. Ọ ga-amagbu onwe ya ma ndị nne na nna gosi ụmụ ha otú ha ga-esi enweta uwe dị́ mma na ebe ha ga-enweta ya. Ọ pụtara na ụmụaka ekwesịghị ịna-eyi efe naanị maka na ọ dị ha mma, kama ọ ga-abụ efe ga-eme ka a sọpụrụ Jehova, bụ́ Chineke ha na-anọchite anya ya. w16.09 3:13, 14

Tuzdee, Jenụwarị 16

Nwa akwụkwọ adịghị aka onye nkụzi ya, ma onye ọ bụla a kụziiri ihe n’ụzọ zuru okè ga-adị ka onye nkụzi ya.​—⁠Luk 6:⁠40.

Ihe Jizọs kụziri ruru ndị mmadụ n’obi n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya, mara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, hụkwa ndị mmadụ n’anya. (Luk 24:32; Jọn 7:46) Ịhụ Jehova n’anya otú ahụ ga-enyere ndị nne na nna aka ịna-akụziri ụmụ ha ihe ga-eru ha n’obi. (Diut. 6:​5-8; Luk 6:45) N’ihi ya, ndị nne na nna, na-amụsinụ Baịbụl na akwụkwọ anyị ike. Na-agbanụ mbọ ka unu matakwuo gbasara ihe Chineke kere, na-agụkwanụ isiokwu ndị kwuru banyere ya n’akwụkwọ anyị. (Mat. 6:​26, 28) Ọ bụrụ na unu na-eme otú ahụ, unu ga-amatakwu Jehova, nwekwuo obi ụtọ maka ihe ndị o kere, nweekwa ike ịna-akụziri ụmụ unu ihe. Ị mata eziokwu Baịbụl nke ọma, ị ga na-agwa ndị ezinụlọ gị banyere ya. Na-eme otú ahụ mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe unu na-amụ ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbe unu na-enwe ofufe ezinụlọ. Ihe ọzọ bụ na unu kwesịrị ịna-ekwu banyere ụdị ihe ahụ mgbe unu na-akparịta ụka kwa ụbọchị. I kwesịghị ịmanyewe ha ikwu okwu. Ọ bụghịkwa ihe a ga-eyiri oge. w16.09 5:6, 7

Wenezdee, Jenụwarị 17

Ọ dịghịkwa otu n’ime ha maara otú e si asụ asụsụ ndị Juu.​—⁠Nehe. 13:⁠24.

Ọ bụrụ na anyị anaghị aghọta asụsụ e ji amụ Okwu Chineke n’ọgbakọ anyị, okwukwe anyị nwere ike ịnyụwa ka ọkụ. Mgbe Nehemaya lọghachiri Jeruselem na narị afọ ise Tupu Oge Ndị Kraịst, o wutere ya mgbe ọ chọpụtara na ụfọdụ ụmụ ndị Juu sí Babịlọn lọta anaghị asụ Hibru. Ebe ụmụaka ndị ahụ na-enweghị ike ịghọta Okwu Chineke, o mere ka ha ghara inwe okwukwe na Jehova. (Nehe. 8:​2, 8) Ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ ndị nne na nna nọ́ n’ọgbakọ ndị na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe achọpụtala na okwukwe ụmụ ha ji nwayọọ nwayọọ na-anyụ ka ọkụ. N’ihi gịnị? Anyị gụwa ihe n’asụsụ na-abụghị nke anyị, o nwere ike ọ gaghị eru anyị n’obi otú ọ gaara eru anyị ma a sị na ọ bụ n’asụsụ anyị. Mmadụ nwekwara ike ịnọ ebe ọ na-agbalị ịna-asụ asụsụ ọzọ nke ọma, isi ana-agba ya gharaghara, ike ife Chineke ana-agwụkwa ya. N’ihi ya, ka anyị na-agba mbọ ịna-ejere Jehova ozi n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe, anyị ekwesịghị ikwe ka okwukwe anyị nyụwa ka ọkụ.​—⁠Mat. 4:⁠4. w16.10 2:4-6

Tọzdee, Jenụwarị 18

Okwukwe bụ . . . ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.​—⁠Hib. 11:⁠1.

Okwukwe Ndị Kraịst bụ àgwà bara ezigbo uru. Ma, ọ bụghị mmadụ niile nwere ya. (2 Tesa. 3:⁠2) Ma, Jehova na-eme ka onye ọ bụla jí obi ya niile na-efe ya nwee okwukwe. (Rom 12:3; Gal. 5:22) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na o mere ka anyị nwee okwukwe. Jizọs Kraịst kwuru na Nna ya nke eluigwe na-esi n’aka Ọkpara ya eme ka ndị mmadụ bịakwute ya. (Jọn 6:​44, 65) Mmadụ inwe okwukwe na Jizọs ga-eme ka a gbaghara ya mmehie ya. Onye ahụ ga-esi otú ahụ nwee olileanya na ya na Jehova ga-adị ná mma ruo mgbe ebighị ebi. (Rom 6:23) Ànyị ruru eru ka Jehova meere anyị ụdị ihe ọma a? Ebe anyị bụ ndị mmehie, naanị ihe anyị kwesịrị inweta bụ ọnwụ. (Ọma 103:10) Ma, Jehova hụrụ na anyị ga-emeli ihe ọma. O ji obiọma ya na-erughịrị mmadụ mee ka anyị nụ ozi ọma. N’ihi ya, anyị malitere inwe okwukwe ma nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.​—⁠1 Jọn 4:​9, 10. w16.10 4:1, 2

Fraịdee, Jenụwarị 19

[Pọl kwuru] ọtụtụ okwu iji gbaa ndị nọ n’ebe ahụ ume.​—⁠Ọrụ 20:⁠2.

N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst ibe ya, o kwuru okwu ọma banyere ha. Ya na ụfọdụ n’ime ha esorola gaa ebe dị iche iche ọtụtụ afọ. O doro anya na ọ ma ihe ndị ha na-anaghị emeta. Ma, o kwuru okwu ọma gbasara ha. Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru na Timoti bụ ‘nwa ya ọ hụrụ n’anya nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ime Onyenwe anyị’ nakwa na ihe banyere Ndị Kraịst ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi. (1 Kọr. 4:17; Fil. 2:​19, 20) Pọl gwara ọgbakọ dị na Kọrịnt okwu ọma banyere Taịtọs, kwuo na ọ bụ ‘onye ọrụ ibe ya maka ọdịmma ha.’ (2 Kọr. 8:23) O doro anya na ihe a Pọl kwuru gbara Timoti na Taịtọs ume. Pọl na Banabas gara ebe dị iche iche gbaa ụmụnna ha ume n’agbanyeghị na ịga ebe ndị ahụ nwere ike ịta isi ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na a chọrọ igbu ha na Listra, ha laghachiri ebe ahụ ka ha gaa gbaa ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ọhụrụ ume ka okwukwe ha sie ike. (Ọrụ 14:​19-22) Ìgwè mmadụ iwe ji chọrọ igbu Pọl n’Efesọs. Ma o mechara gbaa ndị na-eso ụzọ Jizọs ume n’ebe ahụ.​—⁠Ọrụ 20:⁠1. w16.11 1:10, 11

Satọdee, Jenụwarị 20

Ka unu dị n’otu n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’otu obi na n’otu echiche.​—⁠1 Kọr. 1:⁠10.

Jehova na-eduzi nzukọ ya taa. Ọ họpụtara Kraịst ka ọ bụrụ ‘onyeisi ọgbakọ ya,’ Kraịst ahọpụta “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ka ọ na-akụziri ndị Chineke ihe ma na-eduzi ha. (Mat. 24:​45-47; Efe. 5:23) Ohu ahụ kweere na Baịbụl bụ Okwu Chineke, jirikwa ya kpọrọ ihe otú ahụ òtù na-achị isi mere n’oge ndịozi Jizọs. (1 Tesa. 2:13) Baịbụl gwara anyị ka anyị na-agachi ọmụmụ ihe anya. (Hib. 10:​24, 25) Ọ gwara anyị ka anyị na-akụzi otu ihe. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị ka anyị buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Mat. 6:33) O kwukwara na anyị kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, nakwa mgbe anyị na-anọghị n’ozi. (Mat. 28:​19, 20; Ọrụ 5:42; 17:17; 20:20) Ọ gwara ndị okenye ka ha na-eme ka ọgbakọ dị ọcha. (1 Kọr. 5:​1-5, 13; 1 Tim. 5:​19-21) Jehova nyekwara ndị niile nọ́ ná nzukọ ya iwu ka ha na-eme ka ahụ́ ha, echiche ha, na omume ha na-adị ọcha.​—⁠2 Kọr. 7:⁠1. w16.11 3:7, 8

Sọnde, Jenụwarị 21

Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta.​—⁠Mkpu. 18:⁠4.

Ọtụtụ afọ tupu Agha Ụwa Mbụ, Nwanna Charles Taze Russell na Ndị Mmụta Baịbụl ndị ọzọ ghọtara na Krisendọm anaghị akụzi eziokwu Baịbụl. Ọ bụ ihe mere ha ji kpebie na e nweghị ihe ga-ejikọ ha na okpukpe ụgha. Ụlọ Nche Bekee nke Nọvemba 1879 kwuru hoo haa na chọọchị ọ bụla nke kwuru na ya bụ nwaanyị ahụ Kraịst na-alụ ọhụrụ, ma ya ana-akwado ndị ọchịchị n’eziokwu, so na Babịlọn Ukwu ahụ Baịbụl kpọrọ nwaanyị akwụna. (Mkpu. 17:​1, 2) Ndị na-atụ egwu Chineke n’oge ahụ matara ihe ha kwesịrị ime. Ha ekwesịghị ịtụ anya ka Chineke gọzie ha ma ọ bụrụ na ha na-akwado okpukpe ụgha. N’ihi ya, ọtụtụ Ndị Mmụta Baịbụl degaara chọọchị ha akwụkwọ ozi, kwuo na ha abụghịzi ndị òtù ha. w16.11 5:2, 3

Mọnde, Jenụwarị 22

Ndị na-eme ihe mmụọ nsọ chọrọ na-atụkwasị uche ha n’ihe mmụọ nsọ.​—⁠Rom 8:⁠5.

O nwere ike ịbụ na ị gụọla Ndị Rom 8:​15-17 n’oge a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. Amaokwu ndị ahụ kọwara otú Ndị Kraịst si amata na ha bụ ndị e tere mmanụ. Mmụọ nsọ na-agbara mmụọ ha àmà. Ọ bụ ndị e tere mmanụ ka e bu n’obi dee Ndị Rom isi asatọ. Ha natara “mmụọ ahụ” ebe ọ bụ na ha ‘na-eche ka e doo ha dị ka ụmụ, ka e jiri ihe mgbapụta tọhapụ ahụ́ ha.’ (Rom 8:23) N’ọdịnihu, ha ga-abụ ụmụ Chineke n’eluigwe, n’ihi na ha bụ Ndị Kraịst e mere baptizim, Chineke agbaghara ha mmehie ha n’ihi ihe mgbapụta ahụ, kpọọkwa ha ndị ezi omume ka ha nwee ike ịbụ ụmụ ya. (Rom 3:​23-26; 4:25; 8:30) Ma, ihe e kwuru ná Ndị Rom isi asatọ gbasakwara ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa n’ihi na Chineke weere ha ka ndị ezi omume. Ha nwekwara ike irite uru na ndụmọdụ e nyere ndị ezi omume n’ebe ahụ. w16.12 2:1-3

Tuzdee, Jenụwarị 23

Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla.​—⁠Mat. 6:⁠34.

Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara? O doro anya na ihe ọ na-ekwu abụghị na e nweghị mgbe onye na-efe Chineke ga-echegbu onwe ya. Kama, Jizọs ji ihe ahụ o kwuru na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya na nchegbu na-enweghị isi ma ọ bụ oké nchekasị anaghị eme ka nsogbu mmadụ nwere kwụsị. Ụbọchị nke ọ bụla na-enwe nsogbu nke ya. N’ihi ya, Ndị Kraịst ekwesịghị ibu nchegbu nke ụbọchị gara aga ma ọ bụ nke echi bukwasị na nke taa. Onye Kraịst nwere ike ịna-echegbu onwe ya mgbe ụfọdụ maka ihe nwere ike ime n’ọdịnihu. Ma, i kwesịghị ikwe ka ihe ị na-amaghị ma ọ̀ ga-eme chuwe gị ụra. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ mgbe, ihe nwere ike mee, ma ọ gaghị adị njọ otú anyị tụrụ ụjọ ya. Ihe ọzọ bụ na e nweghị ihe karịrị Chineke, bụ́ onye anyị na-akọrọ ihe niile na-echegbu anyị. Obi kwesịrị isi gị ike na Chineke ga-akwụ ndị tụkwasịrị ya obi ụgwọ ma nyere ha aka ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha banyere ihe gara aga, ihe na-eme ugbu a, na ihe ga-eme n’ọdịnihu. w16.12 3:13, 16

Wenezdee, Jenụwarị 24

Ndị dị obi umeala nwere amamihe.​—⁠Ilu 11:⁠2.

Mgbe Eze Sọl malitere ịchị ụmụ Izrel oge ochie, ọ dị obi umeala, ndị ọzọ na-akwanyekwara ya ùgwù. (1 Sam. 9:​1, 2, 21; 10:​20-24) Ma, obere oge ọ ghọchara eze, o mere ọtụtụ ihe gosiri na ọ dị mpako. E nwere otu oge Samuel onye amụma gburu oge ịga Gilgal chụọ àjà, Sọl enweghị ndidi chere ya. Ndị Filistia nọ na-ejikere ịbịa busoo ha agha, ọtụtụ ndị Izrel ana-ahapụkwa ya na-agbasasị. Ọ ga-abụ na Sọl nọ na-eche mgbe ahụ, sị: ‘M kwesịrị ime ihe ngwa ngwa ugbu a.’ N’ihi ya, ọ chụụrụ Chineke àjà, bụ́kwanụ ọrụ na-erughịrị ya. Ihe ahụ o mere wutere Jehova. (1 Sam. 13:​5-9) Mgbe Samuel rutere Gilgal, ọ baara Sọl mba. Kama Sọl ga-anabata ihe a gwara ya, ọ gọwara isi ya, chọwadị ibulara ya ndị ọzọ, na-emekwa ka o nweghị oké ihe dị n’ihe ahụ o mere. (1 Sam. 13:​10-14) Malite mgbe ahụ gawa, Sọl meweziri ihe ndị gosiri na ọ dị mpako, ndị mechara mee ka ọ gharazie ịbụ eze, ya na Jehova agharaziekwa ịdị ná mma. (1 Sam. 15:​22, 23) Ọ bụ eziokwu na Sọl dị umeala n’obi ná mmalite, ma otú ihe si gaara ya n’ikpeazụ jọgburu onwe ya.​—⁠1 Sam. 31:​1-6. w17.01 3:1, 2

Tọzdee, Jenụwarị 25

Ahọrọwo m Devid . . . , nwoke obi m nabatara.​—⁠Ọrụ 13:⁠22.

Ihe e ji mara Devid bụ na o ji obi ya niile eme uche Chineke. Ya na Bat-shiba kwara iko. (2 Sam. 11:​1-21) Devid agaghị emezili ihe o mehiere, ọ gaghịkwa agbanahụli nsogbu ndị si na ya pụta. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụfọdụ nsogbu ihe a o mere kpataara ya ga-adịgide ruo mgbe ọ ga-anwụ. (2 Sam. 12:​10-12, 14) N’ihi ya, o kwesịrị inwe okwukwe. Obi kwesịkwara isi ya ike na ebe ọ bụ na o chegharịala n’eziokwu, Jehova ga-agbaghara ya, nyekwara ya aka idi nsogbu ihe ndị o mere kpataara ya. Anyị niile na-emehiecha n’ihi na anyị ezughị okè. E nwere mmehie ụfọdụ ndị dị oké njọ karịa ibe ha. Anyị agaghịkwa emezili ụfọdụ n’ime mmehie ndị ahụ. Naanị ihe anyị ga-eme bụ idiwe nsogbu ndị si na ha pụta. (Gal. 6:⁠7) Ma, obi siri anyị ike na ọ bụrụhaala na anyị echegharịa, Jehova ga-emezu nkwa o kwere anyị na ọ ga-enyere anyị aka ná nsogbu bịaara anyị, a sịgodị na ọ bụ nke anyị kpataara onwe anyị.​—⁠Aịza. 1:​18, 19; Ọrụ 3:19. w17.01 1:​10-12

Fraịdee, Jenụwarị 26

Ụmụ mmadụ [enweghị] ike ịchọpụta ọrụ a rụworo n’okpuru anyanwụ; n’agbanyeghị otú ụmụ mmadụ na-agbalịsi ike ịchọ ya, ha adịghị achọpụta ya. Ọ bụrụgodị na ha asị na amamihe ha zuuru ha ịmata ya, ha agaghị enwe ike ịchọpụta ya.​—⁠Ekli. 8:⁠17.

Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, ọ ga-eme ka anyị kpebie ihe dị mma, a sịgodị na anyị amaghị ihe ga-emecha si na ya pụta. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị abanye n’ozi oge niile, anyị nwere ike ịna-eche ihe nwere ike ime anyị ma ahụ́ rịawa anyị, na otú anyị ga-esi elekọta ndị mụrụ anyị mere agadi, nakwa otú anyị ga-esi elekọta onwe anyị ma anyị kaa nká. O nweghị ihe anyị ga-ekpe n’ekpere ma ọ bụ mee na nchọnchọ, anyị amatachaa ihe anyị ga-eme. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ ga-eme ka anyị mara ihe anyị ga-emeli na ebe ike anyị ruru. Anyị mechaa nchọnchọ, jụọ ndị ọzọ ihe ha chere, kpeekwa ekpere ka Jehova duzie anyị, ka anyị mee ihe ọ bụla ọ chọrọ ka anyị mee. (Ekli. 11:​4-6.) Jehova ga-eme ka ihe anyị kpebiri ime gaa nke ọma, ma ọ bụkwanụ ya enyere anyị aka anyị amara ma ànyị ga-ekpebi ime ihe ọzọ.​—⁠Ilu 16:​3, 9. w17.01 4:14

Satọdee, Jenụwarị 27

Erila mkpụrụ si . . . na ya.​—⁠Jen. 2:⁠17.

Adam na Iv ga-ejizi aka ha kpebie ihe ha ga-eme. Hà ga-erubere Jehova isi, ka hà ga-ege agwọ ahụ ntị? Ha kpebiri inupụrụ Chineke isi. (Jen. 3:​6-13) Isi ahụ Adam na Iv nupụụrụ Jehova mere ka ha bụrụzie ndị na-ezughị okè. O mekwara ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma n’ihi na ‘anya ya dị nsọ nke ukwuu nke na ọ dịghị ele ihe ọjọọ.’ N’ihi ya, ọ gaghị ‘elegide nsogbu anya,’ ya bụ, leghara ihe ọjọọ anya. (Hab. 1:13) A sị na o leghaara ihe ọjọọ anya, ihe niile o kere ma n’eluigwe ma n’ụwa agaaraghị enwe olileanya. Nke ka nke bụ na a sị na Chineke emeghị ihe ọ bụla gbasara mmehie ahụ e mere n’ogige Iden, a gaaraghị atụkwasị ya obi. Ma, Jehova anaghị ahapụ iwu ya. Ọ naghị emebi ya. (Ọma 119:142) N’ihi ya, otú ahụ Chineke hapụrụ Adam na Iv ka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme apụtaghị na ha kwesịrị ileghara iwu ya anya. Isi ahụ ha nupụụrụ Jehova mere ka ha nwụọ, laghachi n’ájá e ji kee ha.​—⁠Jen. 3:19. w17.02 1:8, 10, 11

Sọnde, Jenụwarị 28

Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.​—⁠Mat. 4:⁠4.

Malite mgbe Jizọs bidoro ozi ya n’ụwa, o kwere ka Akwụkwọ Nsọ na-eduzi ya. N’ihe ikpeazụ o kwuru tupu ya anwụọ, o kwudịrị ihe ụfọdụ e buru n’amụma gbasara Mesaya. (Mat. 27:46; Luk 23:46) Ma, ndị isi okpukpe n’oge ahụ na-eleghara Okwu Chineke anya ma o kwuo ihe dị iche n’ihe ha na-eme. Jizọs kwuru ihe Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo banyere ha, sị: “Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị nnọọ anya n’ebe m nọ. Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m ofufe, n’ihi na ozizi ha na-ezi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.” (Mat. 15:​7-9) Jizọs kwere ka Okwu Chineke na-eduzi ihe ọ na-eme na ihe ọ na-akụzi. Mgbe ndị isi okpukpe ndị Juu bịara nwaa ya, o jighị amamihe nke ya ma ọ bụ ihe ndị ọ mụtara mgbe ọ nọ n’eluigwe zaa ha. Kama, o weere Akwụkwọ Nsọ ka o kwuchaa o bie.​—⁠Mat. 22:​33-40. w17.02 3:18, 19

Mọnde, Jenụwarị 29

Sọpụrụnụ ụdị mmadụ niile, . . . sọpụrụnụ eze unu.​—⁠1 Pita 2:⁠17.

Ndịàmà Jehova na-eji obi ha niile asọpụrụ ndị ọchịchị na ndị na-arụrụ ha ọrụ otú ha kwesịrị ịna-eme nakwa otú iwu obodo kwuru. Anyị na-akwado ha n’ọrụ ha na-arụ. N’eziokwu, anyị na-asọpụrụ ha ma na-akwado ha naanị otú Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ịsọpụrụ ha agaghị eme ka anyị nupụrụ Chineke isi ma ọ bụ mee ihe Onye Kraịst na-ekwesịghị ime. (1 Pita 2:​13-16) Ndị fere Jehova n’oge gara aga gosiri otú anyị kwesịrị isi na-asọpụrụ ndị ọchịchị na ndị na-arụrụ ha ọrụ. Mgbe Alaeze Rom nyere ndị mmadụ iwu ka ha gaa deba aha n’akwụkwọ, Josef na Meri mere otú ahụ. Ha gara Betlehem n’agbanyeghị na Meri ga-amụ nwa mbụ ya n’oge na-adịghị anya. (Luk 2:​1-5) Mgbe e mechara bo Pọl ebubo ụgha, o weturu obi zara ọnụ ya ma sọpụrụ Eze Herọd Agrịpa na Festọs, bụ́ gọvanọ Rom chịrị Judia.​—⁠Ọrụ 25:​1-12; 26:​1-3. w17.03 1:9, 10

Tuzdee, Jenụwarị 30

E dekwara ha ede ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị.​—⁠1 Kọr. 10:⁠11.

Mgbe ndị Izrel malitere ịna-eme ka ndị Kenan, bụ́ ndị na-efe arụsị ma na-eme omume rụrụ arụ, Jehova echebeghị ha n’aka ndị iro ha. (Ikpe 2:​1-3, 11-15; Ọma 106:​40-43) Ọ ga-abụrịrị na o siiri ezinụlọ ndị hụrụ Jehova n’anya ike ikwesị ntụkwasị obi n’afọ ndị ahụ tara akpụ. Ma, Baịbụl kwuru na e nwere ndị kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Jefta, Elkena, Hana, na Samuel. Ha kpebisiri ike ime Jehova obi ụtọ. (1 Sam. 1:​20-28; 2:26) N’oge anyị a, ndị mmadụ na-eche echiche ka ndị Kenan, na-akpakwa àgwà ka ha. Ihe bụ́ mkpa ha bụ inwe mmekọahụ, tigbuo zọgbuo, na ịchụ ego. Ma, aka ná ntị Jehova na-adọ anyị doro anya. Ọ chọrọ ichebe anyị otú ahụ ọ chọrọ ichebe ndị Izrel oge ochie ka ha ghara ịmụta àgwà ọjọọ. Ànyị ga-amụta ihe n’ihe ndị ha mejọrọ? (1 Kọr. 10:​6-10) Anyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-eche echiche ka ndị ụwa. (Rom 12:⁠2) Ànyị ga-agbalịsi ike ime otú ahụ? w16.04 1:4-6

Wenezdee, Jenụwarị 31

Onye nwere nghọta na-enweta ezi ntụziaka.​—⁠Ilu 1:⁠5.

Mgbe anyị na-ekpebi ihe dị mkpa, anyị kwesịrị isi na Baịbụl nweta ndụmọdụ ga-akacha baara anyị uru, rịọkwa Jehova ka o duzie anyị. Jehova ga-eme ka anyị nwee àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe bụ́ uche ya. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ihe a m kpebiri ime, ọ̀ ga-egosi na m hụrụ Jehova n’anya? Ọ̀ ga-eme ka ndị ezinụlọ m na-enwe obi ụtọ, udo adịkwa? Ọ̀ ga-egosi na m na-enwe ndidi ma dịrị obiọma?’ Jehova anaghị amanye anyị ịhụ ya n’anya na ife ya. N’ihi ya, ọ hapụrụ anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ma ànyị ga-efe ya ma ọ bụ na anyị agaghị efe ya. (Jọsh. 24:15; Ekli. 5:⁠4) Ma ọ chọrọ ka anyị na-eme ihe ndị ọzọ anyị kpebiri ime n’ihi ihe Baịbụl gwara anyị. Anyị nwee okwukwe siri ike n’otú Jehova si eduzi anyị ma na-eme ihe ọ gwara anyị, anyị ga-enwe ike ịna-ekpebi ihe ga-abara anyị uru. Anyị ga-esikwa otú ahụ gosi na anyị kwụsiri ike n’ụzọ anyị niile.​—⁠Jems 1:​5-8; 4:⁠8. w17.03 2:17, 18

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya