Jun
Fraịdee, Jun 1
M ga-achụ onye ahụ dị ka àjà nsure ọkụ.—Ikpe 11:31.
Naanị otu nwa ka Jefta mụtara. Ọ bụ naanị ada ya ahụ ka o bu n’obi ga-amụta onye ga-aza aha ya ma ọ bụ keta ala ya. (Ikpe 11:34) Ma, ná Ndị Ikpe 11:35, Jefta ji obi ya niile sị: “Mụ onwe m emegheworo Jehova ọnụ m, enweghịkwa m ike ịgbanwe ihe m kwuru.” Jehova nabatara ihe ahụ niile Jefta mere ma gọzie ya. Ọ bụrụ gị, ị̀ gaara emezu nkwa i kwere otú ahụ Jefta mere? Mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị, anyị kwere ya nkwa na anyị ga na-eme uche ya, ihe ọ sọkwara ya bụrụ. Anyị ma mgbe ahụ na ọ gaghị adị mfe mgbe niile imezu nkwa ahụ. Ma, olee ihe anyị na-eme ma á gwa anyị mee ihe anyị na-achọghị ime? Ọ bụrụ na anyị erubere Chineke isi n’agbanyeghị na anyị achọbughị ime ya, anyị na-egosi na anyị na-emezu nkwa anyị kwere Chineke. Imezu nkwa anyị kwere Jehova nwere ike isiri anyị ezigbo ike, ma o nweghị mgbe ngọzi ya na-agaghị aka ihe ọ bụla anyị hapụrụ.—Mal. 3:10. w16.04 1:11, 14, 15
Satọdee, Jun 2
Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.—Mkpu. 2:7.
Jizọs ji mmụọ nsọ na-eduzi ọgbakọ Ndị Kraịst. Mmụọ nsọ nwere ike inyere anyị aka imeri ọnwụnwa na iji obi ike na-ekwusa ozi ọma. O nwekwara ike inyere anyị aka ime mkpebi dị mma. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịna-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị gaa ọmụmụ ihe ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka. Ọtụtụ mgbe, anyị na-amụ otú amụma ndị e buru na Baịbụl sirila mezuo. O nwere ike ime ka obi sikwuo anyị ike na Jehova ga-emezu ihe ndị o kwere nkwa ime n’ọdịnihu. Ụmụnna anyị na-agba anyị ume, ọ bụghị naanị mgbe ha na-eme ihe omume, kamakwa mgbe ha na-aza ajụjụ na mgbe ha ji obi ha niile na-abụ abụ iji too Jehova. (1 Kọr. 14:26) Mgbe anyị na ha na-akparịta ụka tupu ọmụmụ ihe amalite nakwa mgbe a gbasara, obi na-adị anyị mma n’ihi na anyị nwere ọtụtụ ndị enyi ihe banyere anyị na-emetụ n’obi n’eziokwu.—1 Kọr. 16:17, 18. w16.04 3:6, 7
Sọnde, Jun 3
Mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.—Mat. 28:19.
Jizọs kọwara ebe a ga-ekwusaru ozi ọma mgbe ọ sịrị na a ga-ekwusa ya “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) A ga-eme ka “ndị mba niile” bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ pụtara na a ga-ekwusaru ozi ahụ n’ụwa niile. Ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova kwusarurula ozi ọma n’ụwa niile otú ahụ Jizọs buru n’amụma. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? N’Amerịka, e nwere ihe dị ka narị puku ndị ụkọchukwu isii na chọọchị dị iche iche. Ma, Ndịàmà Jehova nọ ná mba ahụ dị ihe dị ka otu nde na narị puku abụọ. N’ụwa niile, ndị ụkọchukwu e nwere na Chọọchị Katọlik ji obere karịa narị puku anọ. Chegodị banyere Ndịàmà Jehova ole na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. N’ụwa niile, ihe dị ka nde mmadụ asatọ ewepụtala onwe ha ịna-ekwusa ozi ọma na narị mba abụọ na iri anọ. O doro anya na Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile, nke na-eme ka a na-eto Jehova ma na-asọpụrụ ya.—Ọma 34:1; 51:15. w16.05 2:13, 14
Mọnde, Jun 4
Onye na-ewekarị iwe na-akpalite esemokwu, onye ọ bụla nke na-ewekarị oké iwe na-eme ọtụtụ mmehie.—Ilu 29:22.
Ihe juru n’ụwa bụ ndị mmadụ na òtù dị iche iche na-eme ihe sọrọ ha, nke na-akpata mpako, itu ọnụ, na ịmarịta aka. Ọ bụrụ na mmadụ ana-akpa àgwà ndị a, ọ pụtara na ọ na-akwado ihe ahụ Setan kwuru na onye ọ bụla kwesịrị ịna-eme ihe masịrị ya n’agbanyeghị nsogbu o nwere ike ịkpatara ndị ọzọ. (Jen. 3:1-5) Ụdị àgwà ahụ na-akpata esemokwu. Ma, Jizọs kụziiri ndị mmadụ ka ha na-achọ udo, ọ bụrụgodị na o yiri ka ọ̀ ga-eme ka ihe siere ha ike. N’ihe Jizọs kụziri n’elu ugwu, o nyere ndụmọdụ magburu onwe ya gbasara idozi nghọtahie ma ọ bụ izere ihe nwere ike ịkpata esemokwu. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha dịrị obiọma, na-eme udo, ghara ịna-ebu iwe n’obi, ka ha na-edozi nghọtahie ozugbo, na-ahụkwa ndị iro ha n’anya.—Mat. 5:5, 9, 22, 25, 44. w16.05 1:4, 5
Tuzdee, Jun 5
Enwere m ike ịchọ ime ihe, ma enweghị m ike ịrụpụta ihe dị mma.—Rom 7:18.
Tupu anyị emee baptizim, e nwere àgwà ọjọọ ndị ọtụtụ n’ime anyị kwụsịrị ịna-akpa ka anyị nwee ike ịna-eme ihe Baịbụl kwuru. Ugbu a anyị mechara baptizim, anyị ghọtara na e nwere obere mgbanwe ndị anyị kwesịrị ime iji na-eṅomikwu Chineke na Kraịst. (Efe. 5:1, 2; 1 Pita 2:21) Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịchọpụta na anyị na-akatọkarị ndị ọzọ, na-atụ egwu mmadụ, na-agba asịrị, ma ọ bụ na-eme ihe ọzọ na-adịchaghị mma. Ịgbanwe ụdị àgwà ndị a ò siiri anyị ike karịa otú anyị tụrụ anya ya? Cheta na anyị ka bụ ndị na-ezughị okè. (Kọl. 3:9, 10) N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na anyị mechaa baptizim, ma ọ bụkwanụ nọọ ọtụtụ afọ n’ọgbakọ, anyị agaghịzi na-emejọ ihe, na-enwe ihe ga-adọla anyị azụ, ma ọ bụ na-eche echiche na-ezighị ezi. Anyị na àgwà ụfọdụ nwere ike ịna-alụ ọgụ ruo ọtụtụ afọ.—Jems 3:2. w16.05 4:3-5
Wenezdee, Jun 6
Onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị; n’eziokwu, ọ na-apịa onye ọ bụla ọ nabatara ịbụ nwa ya ihe.—Hib. 12:6.
O nwere ike ịbụ na ị nụtụla ka mmadụ sịrị: ‘Ọ bụ mgbe m mụrụ ụmụ ka m ghọtara uru aka ná ntị nne m na nna m dọrọ m baara m.’ Ka anyị na-etokwu, anyị nwere ike ịghọta uru ịdọ aka ná ntị bara, lewezie ya anya otú Jehova si ele ya, ya bụ na ọ na-egosi na a hụrụ anyị n’anya. (Hib. 12:5, 11) N’eziokwu, Jehova hụrụ ụmụ ya n’anya. Ọ bụ ya mere o ji ewetu obi na-adọ anyị aka ná ntị ma ọ bụ na-akpụzi anyị. Ọ chọrọ ka anyị mara ihe, na-enwe obi ụtọ, hụkwa ya n’anya. (Ilu 23:15) Ọ chọghị ka anyị tawa ahụhụ. Ọ chọghịkwa ka anyị bụrụ ndị mmehie na-ekweghị echegharị, bụ́ ndị a ga-emecha bibie. (Efe. 2:2, 3) Tupu anyị amụta eziokwu banyere Jehova, anyị na-akpa ọtụtụ àgwà na-adịghị ya mma. Ụfọdụ n’ime àgwà ndị ahụ nwedịrị ike ịdị ka nke anụ ọhịa. Ma n’ihi otú Jehova si na-akpụzi anyị, anyị gbanwere ma yizie ụmụ atụrụ.—Aịza. 11:6-8; Kọl. 3:9, 10. w16.06 1:7, 8
Tọzdee, Jun 7
Onye ọ bụla nke ga-eweda onwe ya ala dị ka nwatakịrị a bụ onye kasị ukwuu n’alaeze eluigwe.—Mat. 18:4.
Ọtụtụ ụmụaka na-adị umeala n’obi, na-achọsikwa ike ịmụta ihe. (Mat. 18:1-3) N’ihi ya, ndị nne na nna má ihe na-agbalịsi ike ka ụmụ ha mụta eziokwu Baịbụl ma jiri ya kpọrọ ihe mgbe ha ka dị obere. (2 Tim. 3:14, 15) N’eziokwu, ọ bụrụ na ndị nne na nna chọrọ ka ụmụ ha mụta ihe ha na-akụziri ha, hanwa kwesịrị ibu ụzọ mee ka eziokwu Baịbụl dịrị n’obi ha, ha ana-emekwa ihe ha na-akụziri ụmụ ha. Ha mee otú ahụ, ọ bụghị naanị na ụmụ ha ga na-anụ eziokwu Baịbụl ha na-akụziri ha, kamakwa ha ga na-ahụ otú ha si eme ya. Ha ga-aghọtakwa na ihe mere nne ha na nna ha ji na-adọ ha aka ná ntị bụ na ha hụrụ ha n’anya otú ahụ Jehova hụrụ ha. Ọ bụrụ na anyị eweda onwe anyị ala ma na-erubere Jehova isi mgbe niile, ọ ga-ahụ anyị n’anya nke ukwuu otú ahụ ọ hụrụ Daniel onye amụma. (Dan. 10:11, 19) Jehova ga-ejikwa Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na nzukọ ya na-akpụzi anyị ka anyị nwee ike ịbụ ‘ụmụ ya’ zuru okè n’ọdịnihu. w16.06 2:14, 17
Fraịdee, Jun 8
Ahọrọwo m Devid nwa Jesi, nwoke obi m nabatara.—Ọrụ 13:22.
Jehova hụrụ Devid n’anya. Ọ kpọrọ ya “nwoke obi ya nabatara.” (1 Sam. 13:13, 14) Ma, Devid na Bat-shiba mechara kwaa iko, nwaanyị ahụ adị ime. N’oge ahụ, di ya Yuraya nọ n’ebe ha na-alụ agha. Mgbe ọ lọrutere ụlọ, Devid mere ihe niile o nwere ike ime ka Yuraya na nwunye ya Bat-shiba nwee mmekọahụ ka ọ dịzie ka ọ̀ bụ Yuraya tụwara nwunye ya ime. Yuraya ekweghị eme ihe eze gwara ya. N’ihi ya, Devid kpara nkata ka e gbuo ya n’agha. Devid hụsiri anya maka ihe ọjọọ ahụ o mere. Nsogbu si n’elu si n’ala bịara ya na ezinụlọ ya. (2 Sam. 12:9-12) Ma, Chineke meere ya ebere n’ihi otú o si jiri obi ya niile na-eme ihe ziri ezi n’anya ya. (1 Eze 9:4) A sị na ị nọ mgbe ahụ, gịnị ka ị gaara eme? Ihe ọjọọ ahụ Devid mere ọ̀ gaara eme ka ị sụọ ngọngọ? w16.06 4:7
Satọdee, Jun 9
Na-elenụ anya, mụrụnụ anya, n’ihi na unu amaghị mgbe oge ahụ a kara aka bụ.—Mak 13:33.
Ndịàmà Jehova anaghị eji ihe ahụ Jizọs kwuru egwu egwu. Anyị ma na ‘oge ikpeazụ’ a agwụla agwụ nakwa na “oké mkpagbu” ahụ ga-amalite n’oge na-adịghị anya. (Dan. 12:4; Mat. 24:21) Anyị na-ahụ agha, omume rụrụ arụ, mmebi iwu, okpukpe ụgha, ụkọ nri, ọrịa na-efe efe, na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche n’ụwa. Anyị ma na ndị Jehova n’ụwa niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke otú a na-ekwusatụbeghị ya. (Mat. 24:7, 11, 12, 14; Luk 21:11) Anyị na-atụsi anya ike ịhụ uru ọbịbịa Onyenwe anyị ga-abara anyị nakwa otú ọ ga-esi mezuo nzube Chineke. (Mak 13:26, 27) Ma, ihe ọ sọkwara anyị mee, anyị agaghị ekwuli afọ oké mkpagbu ahụ ga-amalite, ma ya fọkwa ikwu ụbọchị na oge awa ọ ga-abụ. w16.07 2:2-4
Sọnde, Jun 10
Jiri nkwuwa okwu bịaruo ocheeze nke obiọma na-erughịrị mmadụ nso.—Hib. 4:16.
Ọ bụ obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ mere ka anyị nwee ike ịna-ekpe ekpere. Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù na anyị na-esi n’aka Jizọs ekpe ekpere mgbe ọ bụla. Anyị ‘si n’aka ya nwee nkwuwa okwu a ma jiri obi ike na-abịaru Chineke nso site n’okwukwe anyị nwere n’ebe ọ nọ.’ (Efe. 3:12) Ikpe ekpere mgbe ọ bụla bụ ihe magburu onwe ya na-egosi obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ. Pọl gwara anyị ka anyị kpeere Jehova ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ, ‘ka e wee meere anyị ebere, anyị enwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ n’oge kwesịrị ekwesị mgbe enyemaka dị anyị mkpa.’ (Hib. 4:16b) Mgbe ọ bụla nsogbu ma ọ bụ ọnwụnwa bịaara anyị, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Ọ na-aza ekpere anyị n’agbanyeghị na iwu ejighị ya ime otú ahụ, “ka anyị nwee obi ike wee sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?’”—Hib. 13:6. w16.07 3:12, 13
Mọnde, Jun 11
Sera . . . na-erubere Ebreham isi, na-akpọ ya “onyenwe m.” Unu aghọwokwa ụmụ ya.—1 Pita 3:6.
Noa na ụmụ ya atọ lụrụ otu nwaanyị otu nwaanyị. Ma, mgbe Iju Mmiri gachara, ọtụtụ ndị malitere ịlụ karịa otu nwaanyị. N’oge ahụ, ndị mmadụ na-aṅụ ịkwa iko ka mmiri n’ọtụtụ ebe. O sodị n’ihe ụfọdụ okpukpe na-eme n’oge ememme ha. Mgbe Ebreham na Sera nwunye ya kwagara na Kenan otú Chineke gwara ha, ụdị omume ọtụtụ ndị obodo ahụ na-eme gosiri na o nweghị ihe ha ji alụmdi na nwunye kpọrọ. Jehova bibiri Sọdọm na Gọmọra n’ihi na ndị bí na ha na-eme omume rụrụ arụ ma ọ bụ na-agbachi ndị na-eme ya nkịtị. Ebreham bụ ezigbo onyeisi ezinụlọ, Sera ana-erubekwara ya isi. (1 Pita 3:3-5) Ebreham mere ka nwa ya Aịzik lụta onye na-efe Jehova. Otú ahụkwa ka Aịzik meere nwa ya Jekọb, onye ebo iri na abụọ nke Izrel si n’agbụrụ ya. w16.08 1:10
Tuzdee, Jun 12
Onye nta ga-aghọ otu puku mmadụ, onye kasị nta ga-aghọkwa mba dị ike.—Aịza. 60:22.
Amụma a na-emezu n’oge ikpeazụ a. N’eziokwu, n’afọ ije ozi 2015, nde mmadụ asatọ, narị puku abụọ na iri abụọ, otu narị na ise kwusara ozi ọma n’ụwa niile. Ihe ikpeazụ e kwuru n’amụma ahụ kwesịrị ịgbasa onye ọ bụla bụ́ Onye Kraịst, n’ihi na Nna anyị nke eluigwe kwuru, sị: “Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka o mezuo ọsọ ọsọ n’oge ya.” Otú ahụ ndị nọ n’ụgbọala na-ama ma ọ gbasiwe ike ka anyị na-ahụ otú e si na-agbapụ ozi ọma ahụ ọsọ. N’ihi ya, gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịna-eme? Ànyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke? Ọtụtụ ụmụnna na-edejupụta akwụkwọ ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ndị na-akwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa ma ọ bụ soro na-arụ ihe ndị ọzọ a na-arụ ná nzukọ Jehova? Ma ànyị bụ nwoke ma ànyị bụ nwaanyị, anyị ‘nwere ọtụtụ ihe anyị ga-arụ n’ọrụ Onyenwe anyị.’—1 Kọr. 15:58. w16.08 3:1, 2
Wenezdee, Jun 13
Aka Jehova adịghị mkpụmkpụ nke na ọ pụghị ịzọpụta unu.—Aịza. 59:1.
Obere oge Jehova napụtachara ndị Izrel n’ohu ha nọ na-agba n’Ijipt, ndị Amalek bịara ịlụso ha ọgụ. Jọshụa ji obi ike duru ha gaa agha otú Mozis gwara ya. Mozis akpọrọzie Erọn na Họọ gawa n’otu ugwu dị nso, bụ́ ebe ha ga-anọ hụ ihe na-eme n’ọgbọ agha. Mozis mere ihe nyeere ndị Izrel aka imeri n’agha ahụ. O ji aka abụọ bulie mkpara Chineke elu. Aka ya abụọ dịrị n’elu otú ahụ, Jehova ana-eme ka ndị Izrel na-emeri ndị Amalek. Ma, Mozis wetuo aka ya maka na o gbuwela ya mgbu, ndị Amalek emeriwe. Erọn na Họọ buuru “nkume debe n’okpuru ya, o wee nọrọ ọdụ n’elu ya; Erọn na Họọ wee jide aka ya abụọ, otu onye n’otu akụkụ, onye nke ọzọ n’akụkụ nke ọzọ, aka ya wee kwụrụ otu ebe ruo mgbe anyanwụ dara.” Chineke ji aka ya dị ike mee ka ụmụ Izrel merie n’agha ahụ.—Ọpụ. 17:8-13. w16.09 1:5-7
Tọzdee, Jun 14
Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.—Rom 7:21.
Obi siri Pọl ike na ya ga-emeri n’ọgụ ahụ ma ọ bụrụ na ya atụkwasị Jehova obi, na-ekpe ekpere ka o nyere ya aka, nweekwa okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ. Anyịnwa kwanụ? Ọ bụrụ na anyị ana-agbalịsi ike ka anyị ghara ime ihe ọjọọ na-agụ anụ ahụ́ anyị, anyị ga-emerili n’ọgụ ahụ. Olee otú anyị ga-esi emeri? Ọ bụ ịna-eme ihe Pọl mere ma tụkwasị Jehova obi anyị niile kama ịtụkwasị onwe anyị obi nakwa inwe okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ. Oge ụfọdụ, Chineke nwere ike ịhapụ anyị ka anyị gosi otú ihe mere anyị si echegbu anyị. Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ezigbo ahụ́ adịghị anyị (ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị), ma ọ bụkwanụ na a na-emegbu anyị? Anyị ga-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi anyị niile ma ọ bụrụ na anyị arịọ ya ka o nye anyị ike anyị ga-eji na-efe ya, na-enwe obi ụtọ ma jiri adịm ná mma anyị na ya kpọrọ ihe. (Fil. 4:13) Ihe ndị merela ọtụtụ ndị ma n’oge Pọl ma n’oge anyị a gosiri na ikpe ekpere ga-enye anyị ike ma mee ka anyị nwee obi ike ịna-edi nsogbu ndị na-abịara anyị. w16.09 2:14, 15
Fraịdee, Jun 15
Ndị Juu na-asụ Grik malitere ịtamu ntamu megide ndị Juu na-asụ Hibru.—Ọrụ 6:1.
Ka ọgbakọ Ndị Kraịst nọ na-amụba, e nwere ihe merenụ. Ndị Juu na-asụ Grik nọ na-ekwu na a na-emegbu ụmụ nwaanyị ha di ha nwụrụ. Ihe ndịozi mere iji dozie nsogbu ahụ bụ na ha họpụtara ndị ikom asaa, ndị ga-ahụ na e nweghị onye e leghaara anya. Ndị ahụ niile ha họpụtara na-aza aha ndị Grik. O nwere ike ịbụ n’ihi na ndịozi Jizọs chọrọ ka obi ruo ụmụ nwaanyị ndị ahụ di ha nwụrụ ala. (Ọrụ 6:2-6) Ma ànyị kwere ma anyị ekweghị, e nwere omenala ndị riri anyị ahụ́. (Rom 12:2) Anyị nwere ike ịnụ ka ndị agbata obi anyị, ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị na-ekwu okwu ọjọọ banyere ndị ọzọ n’ihi ebe ha si, agbụrụ ha, ma ọ bụ otú akpụkpọ ahụ́ ha na-acha. Ụdị echiche ahụ ọ̀ na-akpa anyị aka ọjọọ? Gịnị ka anyị na-eme ma mmadụ chịwa anyị ọchị maka obodo anyị, ma eleghị anya, ha kwuwe ihe ụfọdụ gbasara omenala anyị, ha etinye ya nnu na ose? w16.10 1:7, 8
Satọdee, Jun 16
Àgwà [Chineke] ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma . . . A na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke.—Rom 1:20.
Anyị lee ihe ndị e kere eke anya ma chebara ha echiche, anyị ga-aghọta na ihe niile Chineke kere dị egwu. ‘Anyị ji okwukwe ghọta’ na e nwere Onye kere ihe niile n’agbanyeghị na a naghị ahụ ya anya. Anyị amatala na o nwere amamihe na àgwà magburu onwe ya. (Hib. 11:3, 27) Anyị ga-amatakwu banyere ihe ndị o kere ma anyị gụọ gbasara ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala. Ị ga-ahụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ha chọpụtara na vidio bụ́ The Wonders of Creation Reveal God’s Glory, na broshọ abụọ bụ́ Was Life Created? na The Origin of Life—Five Questions Worth Asking, nakwa n’akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? Na Teta! ị ga-ahụ ajụjụ ọnụ a gbara ndị ọkà mmụta sayensị na ndị ọzọ, ha ekwuo ihe mere ha ji kwere na Chineke ugbu a. Ị ga-ahụkwa isiokwu bụ́ “È Kere Ya Eke?” Ọ na-akọ ihe dị iche iche gbasara ụmụ anụmanụ na ihe ndị ọzọ Chineke kere nakwa otú ndị ọkà mmụta sayensị si na-agbalị imepụta ihe na-eme ka ha. w16.09 4:4, 5
Sọnde, Jun 17
A gbara àmà banyere ha site n’okwukwe ha.—Hib. 11:39.
Ndị ahụ niile kwesịrị ntụkwasị obi e kwuru ná Ndị Hibru isi 11 nwụrụ tupu Jizọs Kraịst, bụ́ “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa, emee ka ndị mmadụ nwewe olileanya ịga eluigwe. (Gal. 3:16) Ma, a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha nwee ike ịbụ ndị zuru okè mgbe ụwa ga-abụ paradaịs.—Ọma 37:11; Aịza. 26:19; Hos. 13:14. Ndị Hibru 11:13 kwuru banyere ụfọdụ n’ime ndị ahụ fere Chineke tupu oge Ndị Kraịst, sị: “Ndị a niile nwụrụ n’okwukwe, ọ bụ ezie na ha enwetaghị mmezu nke nkwa ndị ahụ, ma ha hụrụ ha n’ebe dị anya ma nabata ha.” Otu n’ime ha bụ Ebreham. Ò ji obi ụtọ na-atụ anya mgbe “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa ga na-achị? Jizọs zara ajụjụ a hoo haa mgbe ọ gwara ndị na-emegide ya, sị: “Ebreham nna unu ji ọṅụ dị ukwuu tụọ anya ịhụ ụbọchị m, ọ hụkwara ya wee ṅụrịa ọṅụ.” (Jọn 8:56) Otú ahụ ka Sera, Aịzik, Jekọb na ọtụtụ ndị ọzọ mere. Ha nọ na-atụsi anya ike ịhụ ‘obodo ahụ Chineke wuru ma mee,’ ya bụ, Alaeze ahụ ga-abịa n’ọdịnihu.—Hib. 11:8-11. w16.10 3:4, 5
Mọnde, Jun 18
Nọgide n’ekpere n’oge niile.—Efe. 6:18.
Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka anyị ghọta eziokwu Baịbụl, meekwa ka anyị nwee okwukwe n’ozi ọma. (Luk 10:21) Anyị ekwesịghị ịkwụsị ịna-ekele Jehova maka na o si n’aka Ọkpara ya, bụ́ “Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị,” mee ka anyị bịakwute ya. (Hib. 12:2) Anyị kwesịrị ịna-eme ka okwukwe anyị sie ike iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma ahụ Chineke meere anyị. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ekpe ekpere na ịna-amụ Okwu Chineke. (1 Pita 2:2) Omume anyị kwesịrị ịna-egosi ndị ọzọ na okwukwe anyị siri ike na Jehova ga-emezu nkwa ya. Dị ka ihe atụ, anyị ga na-ekwusa banyere Alaeze Chineke, na-enyekwara ndị ọzọ aka ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Anyị ga ‘na-emekwa ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma karịsịa, n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.’ (Gal. 6:10) Anyị ga na-agbalịsi ike ‘iyipụ mmadụ ochie ahụ na omume ya.’—Kọl. 3:5, 8-10. w16.10 4:11, 12
Tuzdee, Jun 19
[Jehova] ji nghọta kee eluigwe.—Ọma 136:5.
Otú Jehova si hazie eluigwe na ụwa dị egwu. N’ihi ya, o doro anya na Jehova chọrọ ka a hazie ndị na-efe ya ahazi nke ọma. Ọ bụ ya mere o ji nye anyị Baịbụl ka ọ na-eduzi anyị. Ọ bụrụ na anyị anaghị eme ihe Jehova na nzukọ ya gwara anyị, anyị agaghị enwe obi ụtọ, ndụ anyị agaghịkwa enwe isi. Otú Chineke si hazie ndị Izrel oge ochie enweghị atụ. Dị ka ihe atụ, n’Iwu Mozis, e nwere “ndị inyom na-eje ozi, bụ́ ndị jere ozi a haziri ahazi n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.” (Ọpụ. 38:8) Eze Devid mechara hazie ndị Livaị na ndị nchụàjà n’ìgwè n’ìgwè. (1 Ihe 23:1-6; 24:1-3) A hazikwara ọgbakọ Ndị Kraịst ahazi n’oge ndịozi Jizọs. E nwere òtù na-achị isi, bụ́ ụmụnna nwoke ndị na-eduzi ọgbakọ dị iche iche. Ná mmalite, ọ bụ ndịozi bụ òtù na-achị isi. (Ọrụ 6:1-6) Jehova mere ka e dee akwụkwọ ozi ndị e ji nye ọgbakọ dị iche iche ndụmọdụ na ntụziaka.—1 Tim. 3:1-13; Taị. 1:5-9. w16.11 2:3, 6, 8, 9
Wenezdee, Jun 20
Onye ọ bụla a ga-adọrọ n’agha, a ga-adọrọ ya n’agha!—Jere. 15:2.
N’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst, eze Babịlọn bụ́ Nebukadneza nke Abụọ na ìgwè ndị agha ya bịara lụsoo Jeruselem ọgụ. Baịbụl kwuru otú ha si sụọ ndị Juu akwụ. Ọ sịrị: “[Nebukadneza] wee jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha n’ime ụlọ nsọ ha, o nweghịkwara nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, okenye ma ọ bụ agadi ume na-adịkwaghị ọmịiko. . . . O wee gbaa ụlọ ezi Chineke ọkụ ma kwatuo mgbidi Jeruselem; ha gbakwara ụlọ elu ya niile ọkụ, gbaakwa arịa ya niile dị oké ọnụ ahịa ọkụ, iji bibie ihe niile.” (2 Ihe 36:17, 19) Mbibi e bibiri Jeruselem ekwesịghị iju ndị bi na ya anya. Ndị amụma Chineke dọrọ ha aka ná ntị ọtụtụ afọ na ọ bụrụ na ha akwụsịghị inupụrụ Iwu Chineke isi, ndị Babịlọn ga-anyụ ha ịkpakwụ. A ga-eji mma agha gbuo ọtụtụ ndị Juu. Onye ọ bụla a na-egbughị, a ga-adọrọ ya n’agha laa Babịlọn. Ọ ga-ebigide ebe ahụ nwụọ. w16.11 4:1, 2
Tọzdee, Jun 21
Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa.—Rom 5:12.
“Otu mmadụ” ahụ mmehie na ọnwụ si n’aka ya “bata n’ụwa” bụ Adam. N’ihi ya, “ọnwụ si n’aka otu onye ahụ chịa dị ka eze.” Pọl kwukwara na “obiọma dị ukwuu nke na-erughịrị mmadụ” si n’aka “otu onye ahụ, ya bụ, Jizọs Kraịst.” (Rom 5:12, 15, 17) Obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ abaarala ụmụ mmadụ uru. “A ga-eme ka ọtụtụ mmadụ ghọọ ndị ezi omume site ná nrubeisi nke otu onye ahụ.” N’eziokwu, obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke meere anyị “na-eduga ná ndụ ebighị ebi site na Jizọs Kraịst.” (Rom 5:19, 21) Iwu ejighị Jehova izite Ọkpara ya ka ọ bịa n’ụwa nwụọ maka anyị. Ihe ọzọ bụ na ụmụ mmadụ na-ezughị okè erughị eru ka Chineke na Jizọs nye ha ihe mgbapụta iji mee ka a gbaghara ha mmehie. N’ihi ya, ọ bụ obiọma na-erughịrị mmadụ mere ka Chineke na-agbaghara anyị, meekwa ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Anyị kwesịrị iji ihe ọma a na-enweghị atụ o meere anyị kpọrọ ihe ma na-ebi ndụ otú ga-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ya. w16.12 1:1, 6, 7
Fraịdee, Jun 22
Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ịbụ onye iro Chineke, n’ihi na ọ dịghị n’okpuru iwu Chineke.—Rom 8:7.
Anyị kwesịrị ileru onwe anyị anya. Maka gịnị? Pọl dere, sị: “Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ọnwụ.” (Rom 8:6) Ọ pụtara na o nwere ike mee ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma ugbu a, meekwa ka anyị nwụọ n’ọdịnihu. Ma, ihe Pọl kwuru apụtaghị na mmadụ malite “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́,” na onye ahụ ga-anwụrịrị. Onye ahụ nwere ike ịgbanwe. Chegodị banyere nwoke ahụ na-eme omume rụrụ arụ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt, onye mere ihe na-agụ ‘anụ ahụ́’ ya, a chụọ ya n’ọgbakọ. Ma, ọ gbanwere, kwụsị ime omume rụrụ arụ, malitekwa ime ihe dị Jehova mma. (2 Kọr. 2:6-8) Ebe nwoke ahụ gbanwere, Onye Kraịst n’oge anyị a nwekwara ike ịgbanwe, nke ka nke, onye mmehie ya na-erughị ka nke nwoke ahụ nọ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt. N’eziokwu, ihe Pọl kwuru gbasara ihe nwere ike imecha mee onye ‘na-atụkwasị uche n’anụ ahụ́’ kwesịrị ime ka Ndị Kraịst gbanwee ihe ọ bụla ha kwesịrị ịgbanwe. w16.12 2:5, 12, 13
Satọdee, Jun 23
Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.—Ọma 55:22.
Obi ga-eru anyị ala ma anyị ‘tụkwasị Jehova ibu’ ọ bụla na-anyịgbu anyị, ebe anyị ma na ọ ‘ga-akwado anyị.’ Obi siri anyị ezigbo ike na Chineke “pụrụ ime ihe nke ukwuu karịa ihe niile anyị na-arịọ ma ọ bụ na-eche n’echiche.” (Efe. 3:20) Chegodị echiche. Ọ bụghị naanị na Chineke ga-emere anyị ihe niile anyị na-arịọ ya, kama ọ ga-eme “karịa ihe niile anyị na-arịọ.” Ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ụgwọ ọrụ ahụ, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi anyị niile ma na-eme ihe o kwuru. Mozis gwara mba Izrel, sị: “Jehova aghaghị ịgọzi gị n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka i nweta dị ka ihe nketa, naanị ma ọ bụrụ na i gee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị wee lezie anya debe iwu a dum m na-enye gị taa. N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-agọzi gị dị nnọọ ka o kwere gị ná nkwa.” (Diut. 15:4-6) Obi ò siri gị ike na Jehova ga-agọzi gị ma i jiri obi gị niile na-efe ya? Obi kwesịrị isi gị ike. w16.12 4:8, 9
Sọnde, Jun 24
Ọ bụ unu ka Jehova . . . họọrọ ịbụ ndị ya, bụ́ ihe onwunwe pụrụ iche.—Diut. 7:6.
Ọ pụtaghị na Chineke nọkatara nnọọ họrọ ha. Ọ họọrọ ha n’ihi nkwa o kwere enyi ya Ebreham ọtụtụ narị afọ tupu oge ụmụ Izrel. (Jen. 22:15-18) Otú Jehova sikwa ekpebi ihe na-egosikwa na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, na-ekpekwa ikpe ziri ezi. Ihe gosiri na ọ bụ eziokwu bụ otú o si mesoo ụmụ Izrel n’agbanyeghị na ha hapụrụ ya gaa fee chi ọzọ ọtụtụ ugboro. Mgbe ọ bụla ha chegharịrị n’eziokwu, Jehova na-eji obi ya niile emere ha ebere, na-egosikwa ha na ya hụrụ ha n’anya. O kwuru, sị: “M ga-agwọ ekwesịghị ntụkwasị obi ha. M ga-eji obi m hụ ha n’anya.” (Hos. 14:4) Jehova gosiri anyị otú kacha mma mmadụ ga-esi jiri ikike o nwere kpebie ime ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Mgbe Jehova malitere ike ihe, o ji obi ọcha ya kee ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ otú ha ga na-ekpebi ihe ha ga-eme. Onye mbụ o si otú a kee bụ Ọkpara ya, bụ́ “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya.” (Kọl. 1:15) Tupudị Jizọs abịa n’ụwa, o kpebiri na ọ ga na-erubere Nna ya isi, ọ bụghị iso Setan nupụrụ Jehova isi. w17.01 2:3, 4
Mọnde, Jun 25
Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.—Hib. 6:10.
Ọ bụrụ na ọnọdụ anyị agbanwee, o nwere ike ime ka anyị nwekwuo ọrụ anyị ga na-arụ ma ọ bụkwanụ mee ka nke anyị na-arụ arụ beleta. Ma ànyị ka na-eto eto ma ànyị emeela agadi, ma ahụ́ ọ̀ dị anyị ma ahụ́ ọ̀ na-enyetụ anyị nsogbu, Jehova ma ọrụ kacha mma ọ ga-enye anyị ná nzukọ ya. Ọ naghị atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. O jikwa ihe ọ bụla anyị na-eme kpọrọ ihe. Ihe niile Jizọs rụrụ mere ya obi ụtọ, anyị nwekwara ike inwe obi ụtọ n’ihe ọ bụla anyị na-arụ. (Ilu 8:30, 31) Ihe ọ bụla onye dị umeala n’obi na-arụ n’ọgbakọ na-eju ya afọ. Inwetakwu ihe ùgwù n’ọgbakọ anaghị echu ya ụra, ọ naghịkwa emere ndị ọzọ anyaụfụ n’ihe ndị ha na-arụ. Kama, ọ na-eji ike ya niile arụ nke ọ bụla e nyere ya, na-enwekwa obi ụtọ na ya, n’ihi na o weere ya na ọrụ ọ bụla e nyere ya si n’aka Jehova. Ọ naghịkwa etinye anya n’ọrụ Jehova nyere ndị ọzọ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, ọ ga-enyere anyị aka iji obi anyị niile na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma na-akwado ha.—Rom 12:10. w17.01 3:13, 14
Tuzdee, Jun 26
Dị ka nwata ya na nna ya nọ, o so m bụrụ ohu n’ime ka ozi ọma na-aga n’ihu.—Fil. 2:22.
Ọ bụzi ndị okenye na-akatabeghị ahụ́ na-ahaziri ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ ụfọdụ, ebe e nwere ndị okenye katarala ahụ́. Ọ bụ eziokwu na e nyere ndị a na-akatabeghị ahụ́ ọrụ ndị a, ha ka kwesịrị ịna-ege ntị n’ezigbo ndụmọdụ ndị ahụ katarala ahụ́ na-enye ha. Timoti, bụ́ nwa okorobịa, so Pọl onyeozi jee ozi ọtụtụ afọ. E nwere mgbe Pọl degaara ndị Kọrịnt akwụkwọ ozi, sị: ‘M na-ezitere unu Timoti, ebe ọ bụ nwa m m hụrụ n’anya nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ime Onyenwe anyị; ọ ga-echetakwara unu otú m si eme ihe n’ime Kraịst Jizọs.’ (1 Kọr. 4:17) Obere ihe a Pọl kwuru gosiri na ya na Timoti na-emekọ ihe. Pọl ewepụtala oge kụziere Timoti “otú [yanwa bụ́ Pọl] si eme ihe.” Timoti mụtara ihe Pọl kụziiri ya nke ọma, ya emee ka Pọl hụ ya n’anya, nweekwa obi ike na Timoti ga-enyeliri ụmụnna ndị nọ na Kọrịnt aka. Ndị okenye kwesịrị ịmụta ezigbo ihe n’ihe a Pọl mere ka ha na-azụ ndị ọzọ ka ha rụwazie ọrụ ndị dị n’ọgbakọ. w17.01 5:13, 14
Wenezdee, Jun 27
A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.—Ọrụ 24:15.
Jehova chọrọ ka ndị mmadụ dị ndụ, ghara ịnwụ. Ebe Jehova bụ Isi Iyi nke ndụ, ọ bụ Nna onye ọ bụla a kpọlitere n’ọnwụ. (Ọma 36:9) N’ihi ya, ọ dabara adaba na Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe.” (Mat. 6:9) Jehova enyela Jizọs ọrụ dị mkpa ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 6:40, 44) Na Paradaịs, Jizọs ga-eme ihe gosiri na ọ bụ yanwa bụ “mbilite n’ọnwụ na ndụ.” (Jọn 11:25) Ọ bụghị naanị mmadụ ole na ole ka Jehova ga-emere ihe ọma. Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke na-eme uche Chineke, ọ bụ ya bụ nwanne m nwoke na nwanne m nwaanyị na nne m.” (Mak 3:35) Ihe Chineke bu n’obi gbasara “oké ìgwè mmadụ” a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị si ná mba niile na ebo niile na asụsụ niile, bụ ka ha bụrụ ndị na-efe ya. Ndị nwere okwukwe n’àjà ahụ Kraịst chụrụ ma mee ihe Chineke chọrọ ga-eso tie mkpu ọṅụ, sị: “Nzọpụta anyị si n’aka Chineke anyị, bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, nakwa n’aka Nwa Atụrụ ahụ.”—Mkpu. 7:9, 10. w17.02 2:10, 11
Tọzdee, Jun 28
Na-echetanụ ndị na-edu ndú n’etiti unu.—Hib. 13:7.
Iji mee ka a na-akụzi eziokwu Baịbụl n’asụsụ dị iche iche, e hiwere ụlọ ọrụ iwu kwadoro a na-akpọ Zion’s Watch Tower Tract Society n’afọ 1884, Nwanna Charles Taze Russell abụrụ onyeisi oche ya. Ọ mụrụ Baịbụl nke ọma. Ọ tụghị ụjọ ịgba ozizi ụgha n’anwụ, ya bụ, ozizi ndị dị ka Atọ n’Ime Otu na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ọ ghọtara na a gaghị ahụ Jizọs anya mgbe ọ ga-abịa ọzọ nakwa na “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” ga-agwụ n’afọ 1914. (Luk 21:24) Nwanna Russell ji oge ya, ike ya, na ego ya na-akọrọ ndị ọzọ eziokwu ndị a. O doro anya na n’oge ahụ dị mkpa, Jehova na onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst ji Nwanna Russell na-arụ ọrụ. Nwanna Russell achọghị ka ndị mmadụ towe ya. N’afọ 1896, o dere, sị: “Anyị achọghị otuto ma ọ bụ nsọpụrụ n’ihi ihe anyị na-ede; anyị achọghị ka a na-akpọ anyị Revren ma ọ bụ Rabaị. Anyị achọghịkwa ka a na-akpọ onye ọ bụla aha anyị.” O mechara kwuo, sị: “Ihe a abụghị ọrụ mmadụ.” w17.02 4:8, 9
Fraịdee, Jun 29
Amamihe nke onye maara ihe bụ ịghọta ụzọ ya.—Ilu 14:8.
E nwere ihe ndị anyị kwesịrị ịna-ekpebi. Ụfọdụ n’ime ha na-adị ezigbo mkpa, ụfọdụ anaghị adị. Ma, ọtụtụ n’ime ha nwere ike ịbara anyị uru ná ndụ ma ọ bụ ghọ anyị ahịa. Anyị kpebie ime ihe dị mma, o nwere ike ime ka anyị ghara inwe ọtụtụ nsogbu. Obi ga-erukwa anyị ala. Ma anyị kpebie ime ihe na-adịghị mma, o nwere ike ịkpatara anyị ọtụtụ nsogbu, meekwa ka obi koro anyị n’elu. Olee ihe ga-enyere anyị aka ikpebi ime ihe dị mma? Anyị kwesịrị inwe okwukwe na Chineke. O kwesịghị imewe anyị obi abụọ na ọ chọrọ inyere anyị aka nakwa na ọ ga-enye anyị amamihe anyị ga-eji kpebie ime ihe dị mma. Anyị kwesịkwara inwe okwukwe n’Okwu Jehova nakwa n’ihe ndị ọ na-eme, obi esiekwa anyị ike na ndụmọdụ ya ga-abara anyị uru. (Jems 1:5-8) Ka anyị na-abịarukwu Jehova nso, jirikwa Okwu ya kpọrọkwuo ihe, anyị na-atụkwasị ihe ndị o kwuru obi. N’ihi ya, anyị ga-amụta ịna-eleba anya n’Okwu Chineke tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eme. w17.03 2:2, 3
Satọdee, Jun 30
Ọ bụ gị ka anyị lekwasịrị anya.—2 Ihe 20:12.
Jehọshafat akwụsịghị iji obi ya niile na-efe Chineke otú ahụ nna ya bụ́ Esa mere, ma mgbe ìgwè ndị agha bịara ibuso Juda agha. (2 Ihe 20:2-4) Ụjọ tụrụ Jehọshafat. Ma, ‘o kpebiri ịchọ Jehova.’ N’ekpere o kpere, o ji obi umeala kwuo na ndị ya “enweghị ike iguzo n’ihu nnukwu ìgwè mmadụ a” nakwa na ya na ndị ya amaghị ihe ha ga-eme. Ọ tụkwasịrị Jehova obi ya niile, kwuo ihe a e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. O nwere mgbe ụfọdụ anyị na-agaghị ama ihe anyị ga-eme ma ọ bụdị ụjọ ejide anyị otú ahụ o jidere Jehọshafat. (2 Kọr. 4:8, 9) Ma cheta na Jehọshafat kwuru n’ekpere o kpere na ya na ndị ya amaghị ihe ha ga-eme. (2 Ihe 20:5) Ndị isi ezinụlọ kwesịrị iṅomi Jehọshafat. Ha kwesịrị ịrịọ Jehova ka o duzie ha ma nye ha ike ha ga-eji merie nsogbu ndị na-abịara ha. Ihere emela gị ịrịọ Jehova ihe ndị a n’ihu ndị ezinụlọ gị. I mee otú ahụ, ha ga-aghọta na ị tụkwasịrị Jehova obi. Chineke nyeere Jehọshafat aka. Ọ ga-enyekwara gị aka. w17.03 3:12, 13