Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es18 p. 98-108
  • Ọktoba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọktoba
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2018
  • Isiokwu Nta
  • Mọnde, Ọktoba 1
  • Tuzdee, Ọktoba 2
  • Wenezdee, Ọktoba 3
  • Tọzdee, Ọktoba 4
  • Fraịdee, Ọktoba 5
  • Satọdee, Ọktoba 6
  • Sọnde, Ọktoba 7
  • Mọnde, Ọktoba 8
  • Tuzdee, Ọktoba 9
  • Wenezdee, Ọktoba 10
  • Tọzdee, Ọktoba 11
  • Fraịdee, Ọktoba 12
  • Satọdee, Ọktoba 13
  • Sọnde, Ọktoba 14
  • Mọnde, Ọktoba 15
  • Tuzdee, Ọktoba 16
  • Wenezdee, Ọktoba 17
  • Tọzdee, Ọktoba 18
  • Fraịdee, Ọktoba 19
  • Satọdee, Ọktoba 20
  • Sọnde, Ọktoba 21
  • Mọnde, Ọktoba 22
  • Tuzdee, Ọktoba 23
  • Wenezdee, Ọktoba 24
  • Tọzdee, Ọktoba 25
  • Fraịdee, Ọktoba 26
  • Satọdee, Ọktoba 27
  • Sọnde, Ọktoba 28
  • Mọnde, Ọktoba 29
  • Tuzdee, Ọktoba 30
  • Wenezdee, Ọktoba 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2018
es18 p. 98-108

Ọktoba

Mọnde, Ọktoba 1

Ọ ga-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha, ọ ga-anụkwa mkpu enyemaka ha na-eti, ọ ga-azọpụtakwa ha.​—⁠Ọma 145:19.

Jehova bụ “Chineke onye na-enye ntachi obi na nkasi obi.” (Rom 15:⁠5) Ọ bụ naanị ya na-aghọta ihe niile banyere ọnọdụ anyị, otú obi dị anyị, na otú e si zụọ anyị. N’ihi ya, ọ ma ihe ga-enyere anyị aka ịna-atachi obi. Olee otú Chineke ga-esi zaa ekpere anyị na-ekpe ka o nye anyị ike anyị ga-eji tachie obi? Jehova kwere nkwa ‘imere anyị ụzọ mgbapụ’ ma anyị rịọ ya ka o nyere anyị aka ịtachi obi. (1 Kọr. 10:13) Olee otú o si eme ya? Mgbe ụfọdụ, o nwere ike iwepụ ọnwụnwa bịaara anyị. Ma, ọtụtụ mgbe, ọ na-enye anyị ike ka anyị nwee ike ‘ịtachi obi n’ụzọ zuru ezu, jirikwa ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.’ (Kọl. 1:11) Ebe ọ bụ na ọ ma ihe anyị na-agaghị emeli na ihe anyị na-agaghị edili, ọ gaghị ekwe ka ọnwụnwa bịaara anyị sie ike nke na anyị agaghị ekwesịli ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ. w16.04 2:​5, 6

Tuzdee, Ọktoba 2

Ya mere, kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.​—⁠Mat. 22:⁠21.

Baịbụl gwara anyị ka anyị na-erubere ndị ọchịchị isi, gwakwa anyị ka anyị na-erubere Chineke isi mgbe niile. (Ọrụ 5:29; Taị. 3:⁠1) Olee otú anyị ga-esi mee ihe abụọ a? Jizọs kọwara ihe ga-enyere anyị aka ịmata onye anyị kwesịrị irubere isi. Ọ sịrị na anyị kwesịrị ime ihe e kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Otú anyị si eme ya bụ ịna-erubere iwu ndị ọchịchị isi, ịna-akwanyere ndị ọchịchị na ndị na-arụrụ ha ọrụ ùgwù, nakwa ịna-atụ ụtụ isi anyị. (Rom 13:⁠7) Ma, ọ bụrụ na ndị ọchịchị agwa anyị mee ihe Chineke sịrị anyị emela, anyị anaghị ekwe eme ya. Ma anyị anaghị akparị ha. Anyị agaghị etinye aka n’esemokwu ụwa a. (Aịza. 2:⁠4) Ebe ọ bụ na Jehova kwere ka ụmụ mmadụ na-achị, anyị anaghị emegide ha. Anyị anaghịkwa eso eme ihe ọ bụla ga-egosi na anyị hụrụ mba anyị n’anya ma ọ bụ na obodo anyị ka nke ndị ọzọ mma. (Rom 13:​1, 2) Anyị anaghị agba mbọ ka a gbanwee ndị ọchịchị ma ọ bụ na-agwa ndị na-azọ ọchịchị ihe ha ga-eme. Anyị anaghịkwa azọ ọchịchị ma ọ bụ tụnyere ndị ọzọ vootu. w16.04 4:​1, 2

Wenezdee, Ọktoba 3

Ka ọ dịrị gị ka onye mba ọzọ.​—⁠Mat. 18:⁠17.

Ọtụtụ mgbe, nwanna na nwanna nwee nghọtahie, naanị ha abụọ nwere ike idozi ya. Ha kwesịkwara ime otú ahụ. Ma, Jizọs kwuru na e nwere mgbe ụfọdụ ọgbakọ nwere ike inye aka. (Mat. 18:​15-17) Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na onye mejọrọnụ ekweghị echegharị ma nwanna ya, ndị akaebe, na ndị okenye gwachaa ya okwu? E kwesịrị iwere ya ka “onye mba ọzọ na onye ọnaụtụ.” Ọ bụrụ n’oge anyị a, ọ pụtara na e kwesịrị ịchụ onye ahụ n’ọgbakọ. Ihe a Jizọs kwuru e kwesịrị ime gosiri na “mmehie” ahụ abụghị obere nghọtahie. Kama ọ bụ (1) ụdị mmehie mmadụ abụọ nwere ike ikwurịta, nakwa (2) mmehie dị oké njọ nke na o nwere ike ime ka a chụọ mmadụ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na e dozilighị ya. Ụdị mmehie ahụ nwere ike ịbụ igwu wayo ma ọ bụ nkwutọ, nke na-emebi aha mmadụ. E kwesịrị ime ihe atọ ahụ Jizọs kwuru na Matiu 18:​15-17 naanị ma ọ bụrụ ụdị mmehie ndị a e kwuru okwu ha. w16.05 1:⁠14

Tọzdee, Ọktoba 4

Nọgidenụ na-aghọta ihe uche Jehova bụ.​—⁠Efe. 5:⁠17.

E nwere ọtụtụ ihe Baịbụl na-enyeghị iwu ọ bụla gbasara ha. Dị ka ihe atụ, Baịbụl akpọghị aha ụdị uwe Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eyi. Olee otú ihe a si gosi na Jehova ma ihe? Omenala na ụdị uwe a na-eyi abụghị otu ná mba niile. Ihe ndị a na-agbanwekwa ka oge na-aga. A sị na Baịbụl kpọrọ aha ụdị uwe ndị mmadụ ga na-eyi, ọ gaara aghọla ihe ndị mgbe ochie. Ọ bụ ụdị ihe ahụ mere na Baịbụl enyeghị anyị ọtụtụ iwu gbasara ụdị ọrụ Onye Kraịst kwesịrị ịna-arụ, ihe ndị anyị ga-eji na-atụrụ ndụ, ma ọ bụ ụdị ọgwụ anyị ga na-aṅụ. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na Baịbụl ekwughị ihe anyị ga-eme? Ụdị ihe ahụ mee, kama ime ihe dị anyị mma, anyị kwesịrị ichebara ihe anyị chọrọ ime echiche ma mee ihe ọ ga-abụ anyị mee, obi adị Jehova mma. Anyị mee otú ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-eme ka ihe anyị kpebiri ime gaa nke ọma.​—⁠Ọma 37:⁠5. w16.05 3:​2, 6

Fraịdee, Ọktoba 5

Unu nabatara ya, ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke.​—⁠1 Tesa. 2:⁠13.

O doro anya na anyị niile nwere amaokwu Baịbụl na-akacha amasị anyị. Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn na-akacha amasị ụfọdụ ndị n’ihi na ha kọwara otú Jizọs si gosi ọmarịcha àgwà ndị Jehova nwere. (Jọn 14:⁠9) E nwekwara ndị ebe na-akacha atọ ha ụtọ bụ akwụkwọ Baịbụl ndị kwuru banyere ihe ga-eme n’ọdịnihu. O nwere ike ịbụ akwụkwọ Mkpughe, n’ihi na ọ kọwara “ihe ndị na-aghaghị ime n’oge na-adịghị anya.” (Mkpu. 1:⁠1) È nwere onye n’ime anyị akwụkwọ Abụ Ọma na-akasitụbeghị obi ma ọ bụ onye na-amụtatụbeghị ihe bara uru n’akwụkwọ Ilu? N’eziokwu, Baịbụl bụ akwụkwọ e dere maka mmadụ niile. Ebe ọ bụ na anyị ejighị Baịbụl egwu egwu, anyị jikwa akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, obi na-adị anyị ụtọ maka ọtụtụ ihe a na-akụziri anyị n’akwụkwọ, broshọ, magazin, nakwa n’ihe ndị ọzọ. Anyị ma na ihe ndị a Jehova na-enye anyị na-eme ka okwukwe anyị sie ike, anyị na ya adịkwa ná mma.​—⁠Taị. 2:⁠2. w16.05 5:​1-3

Satọdee, Ọktoba 6

Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye. Ọ dịghị iwu na-emegide ihe ndị dị otú a.​—⁠Gal. 5:​22, 23.

E nwere ọtụtụ ụzọ mmụọ nsọ nwere ike isi na-akpụzi anyị. Dị ka ihe atụ, o nwere ike inyere anyị aka ịna-eṅomi àgwà Jizọs. Ihe e ji mara àgwà Jizọs bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Àgwà so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya. Anyị hụrụ Chineke n’anya, chọọ ịna-erubere ya isi, chọọkwa ka ọ na-akpụzi anyị n’ihi na anyị ma na iwu ya abụghị ibu arọ. Mmụọ nsọ nwekwara ike inyere anyị aka ka anyị ghara ikwe ka ụwa Setan mee ka anyị mụta àgwà ọjọọ ya. (Efe. 2:⁠2) Mgbe Pọl onyeozi bụ nwa okorobịa, ọ malitere ile ihe anya otú ndị ndú okpukpe ndị Juu dị mpako si ele ihe anya. Ma mmụọ nsọ mechara nyere ya aka ịgbanwe. O dere, sị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” (Fil. 4:13) N’ihi ya, ka anyị na-arịọ Jehova maka mmụọ nsọ ya otú ahụ Pọl mere. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile rịọ Jehova ka o nyere anyị aka, ọ gaghị eleghara arịrịọ anyị anya.​—⁠Ọma 10:17. w16.06 1:⁠12

Sọnde, Ọktoba 7

I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ.​—⁠Mkpu. 4:⁠11.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ bụrụ naanị Jehova bụ Chineke anyị, anyị kwesịrị ịna-efe naanị ya. Anyị agaghị na-efe ya, na-efekwa chi ndị ọzọ ma ọ bụ kwere n’ihe ọ bụla na-abụghị eziokwu ma ọ bụkwanụ na-eme ihe ndị na-efe chi ọzọ na-eme. Anyị kwesịrị icheta na ọ bụghị naanị na Jehova karịrị chi ndị ọzọ niile ma ọ bụ na ọ dị ike karịa chi ndị ọzọ, ọ bụ naanị ya ka anyị kwesịrị ịna-efe. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-efe naanị Jehova, anyị ga-akpachara anya ka ihe ọ bụla ọzọ ghara ịdị anyị mkpa karịa ife Jehova. Olee ụdị ihe o nwere ike ịbụ? N’Iwu Iri, Jehova mere ka o doo anya na ndị na-efe ya ekwesịghị ife chi ọzọ ma ọ bụ kpeere arụsị ọ bụla. (Diut. 5:​6-10) Taa, e nwere ọtụtụ ihe bụ́ ikpere arụsị. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike isi ike ịchọpụta. Ma, Jehova ka bụkwa “otu Jehova.” Iwu ya agbanwebeghịkwa.​—⁠Mak 12:29. w16.06 3:​10, 12

Mọnde, Ọktoba 8

Ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu nke eluigwe ga na-agbagharakwa unu.​—⁠Mat. 6:⁠14.

Mgbe Pita jụrụ Jizọs ma ànyị kwesịrị ịgbaghara mmadụ “ruo ugboro asaa,” Jizọs sịrị ya: “Ana m asị gị, ọ bụghị, Ruo ugboro asaa, kama, Ruo ugboro iri asaa na asaa.” O doro anya na ihe Jizọs kwuru pụtara na anyị kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ mgbe niile. Ọ bụ ya bụ ihe mbụ anyị kwesịrị ịna-eme. (Mat. 6:15; 18:​21, 22) Anyị kwesịrị ịna-echeta na ebe anyị niile na-emejọ ihe, anyị nwere ike ime ihe ga-ewe ndị ọzọ iwe. Anyị chọpụta na anyị emeela otú ahụ, Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịgakwuru onye ahụ anyị mejọrọ ma gbalịa ka anyị na ya mee udo. (Mat. 5:​23, 24) Ebe ọ bụ na obi na-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ọzọ eburughị anyị iwe n’obi n’ihi ihe anyị mejọrọ, anyịnwa ekwesịghị iburu ndị ọzọ iwe n’obi. (1 Kọr. 13:5; Kọl. 3:13) Ọ bụrụ na anyị ana-agbaghara ndị ọzọ, Jehova ga na-agbaghara anyị. N’ihi ya, ndị ọzọ mejọọ ihe, anyị kwesịrị iṅomi otú Nna anyị nke eluigwe si emere anyị ebere ma anyị mejọọ ihe.​—⁠Ọma 103:​12-14. w16.06 4:​15, 17

Tuzdee, Ọktoba 9

Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m; n’eziokwu, ọ bụ ike Chineke maka ịzọpụta onye ọ bụla nke nwere okwukwe.​—⁠Rom 1:⁠16.

N’oge ọgwụgwụ a, Jehova enyela ndị ya ọrụ ‘ikwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.’ (Mat. 24:14) Ozi ọma anyị na-ekwusa bụkwa “ozi ọma nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe ọma niile anyị na-atụ anya ha n’Alaeze Chineke ga-eru anyị aka n’ihi obiọma Jehova si n’aka Kraịst na-egosi anyị. (Ọrụ 20:24; Efe. 1:⁠3) Pọl ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma iji gosi na obi dị ya ụtọ maka obiọma na-erughịrị mmadụ Jehova gosiri ya. Ànyị na-eme otú ahụ Pọl mere? (Rom 1:​14, 15) Anyị bụ́ ndị mmehie na-erite uru n’obiọma na-erughịrị mmadụ Jehova na-egosi anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka anyị na-akụziri ndị ọzọ otú Jehova si egosi ịhụnanya ya nakwa otú ha nwere ike isi rite uru na ya. w16.07 4:​4, 5

Wenezdee, Ọktoba 10

Dịrịnụ njikere, n’ihi na n’oge awa nke unu na-echeghị na ọ pụrụ ịbụ ka Nwa nke mmadụ na-abịa.​—⁠Luk 12:⁠40.

Obere oge tupu Jizọs anwụọ, ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ugboro atọ banyere “onye na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31; 14:30; 16:11) Jizọs ma na Ekwensu ga na-eduhie ndị mmadụ ka ha ghara ịma na oge eruwela ka amụma ndị Chineke buru banyere ọdịnihu mezuo. (Zef. 1:14) Setan na-eji okpukpe ụgha niile dị n’ụwa emegharị ndị mmadụ anya. Gịnị ka ị na-achọpụta ma gị na ndị ọzọ na-akparịta ụka? Ọ̀ bụ na Ekwensu emebeghị “ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì” ka ha ghara ịma na Chineke ga-ebibi ụwa ochie a nakwa na Kraịst na-achị ugbu a n’Alaeze Chineke? (2 Kọr. 4:​3-6) Anyị chọwa ịgwa ndị mmadụ ihe ga-eme ụwa a n’oge na-adịghị anya, ọtụtụ n’ime ha na-eme ka ọ̀ gbasaghị ha. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị enweghị mmasị n’amụma ndị e buru na Baịbụl, anyị ekwesịghị ikwe ka ha mee ka anyị daa mbà. Anyị ma na anyị kwesịrị ịna-eche nche. w16.07 2:​11, 12

Tọzdee, Ọktoba 11

Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.​—⁠Efe. 5:⁠33.

N’ụbọchị nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ, obi na-abụ ha sọ aṅụrị. Mgbe ha na-akpa, otú ha si hụ ibe ha n’anya mere ka ha dị njikere ịlụ ma kwe nkwa na ha agaghị ahapụ ibe ha. Ha gbachaa akwụkwọ, malitezie ibi, ha kwesịrị ịgbanwe otú ha sibu eme ihe ka ha nwee ike inwe otu obi. Jehova bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye chọrọ ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ, na-ebikwa n’udo. Ọ bụ ihe mere o ji nye ha ezigbo ndụmọdụ n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. (Ilu 18:22) Ma, Baịbụl kwuru hoo haa na n’ihi ezughị okè, di na nwunye “ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” (1 Kọr. 7:28) Olee otú di na nwunye ga-esi mee ka mkpagbu ahụ belata? Olee ihe ga-eme ka Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye na-ebi n’udo? Baịbụl mere ka o doo anya na ịhụnanya dị mkpa. Ma, e nwere ụdị ịhụnanya dị iche iche di na nwunye kwesịrị ịna-egosi ibe ha. Dị ka ihe atụ, ha kwesịrị ịna-enwere ibe ha obi ọmịiko, na-egosikwa ibe ha ịhụnanya nwoke na nwaanyị. Ha mụta ụmụ, ha na ụmụ ha kwesịrị inwe ịhụnanya ndị ezinụlọ na-enwe n’ebe ibe ha nọ. Ma, ọ bụ ịhụnanya Ndị Kraịst na-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo. w16.08 2:​1, 2

Fraịdee, Ọktoba 12

Na-elezi onwe gị na ozizi gị anya mgbe niile.​—⁠1 Tim. 4:⁠16.

Timoti abụrụlarị aka ochie n’ikwusa ozi ọma mgbe Pọl gwara ya ihe a, ma ọ ga na-emekwu nke ọma n’ozi ọma ma ọ bụrụ na ọ ‘na-elezi onwe ya na ozizi ya anya.’ Ihe ga-eme ka okwu ya na-eru ndị mmadụ n’obi mgbe niile bụ ma ọ na-agbanwe otú o si ezi ihe. Anyị kwesịkwara ime ka Pọl, na-agbanwe otú anyị si ezi ndị mmadụ ozi ọma ka o ruo ha n’obi. Ọtụtụ mgbe, anyị anaghị ahụ ndị mmadụ n’ụlọ ma anyị gaa ozi ọma ụlọ n’ụlọ. N’ebe ụfọdụ, a naghị ekwe ka anyị gaa zie ndị mmadụ ozi ọma n’ụlọ ndị a gbara ogige. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ n’ókèala unu, ì nwere ike ịgba mbọ ka i si ụzọ ndị ọzọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma? Ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị so n’ụzọ ndị magburu onwe ha e si ezi ozi ọma. Ọtụtụ ụmụnna na-esi otú a ezi ọtụtụ ndị ozi ọma. Ha na-aga n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, n’ebe bọs na-akwụsị, n’ọma ahịa, n’ebe a na-atụrụ ndụ nakwa n’ebe ndị ọzọ. w16.08 3:​14-16

Satọdee, Ọktoba 13

Na-agbatịnụ aka kụdara akụda na ikpere na-adịghị ike.​—⁠Hib. 12:⁠12.

Jehova nyere anyị ụmụnna anyị nọ́ n’ụwa niile, bụ́ ndị hụrụ anyị n’anya ma na-agba anyị ume. (Hib. 12:​12, 13) N’oge ndịozi Jizọs, e nyeere ọtụtụ ndị nọ́ n’ọgbakọ ụdị aka ahụ. A na-emekwa otú ahụ taa. Erọn na Họọ jidere aka Mozis mgbe ndị Izrel na-alụ agha. (Ọpụ. 17:​8-13) Anyịnwa kwesịkwara ịna-achọ otú anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka. Olee ndị anyị ga-enyere aka? Ọ bụ ndị ha na nká na-alụ, ndị ọrịa na-enye nsogbu, ndị ndị ezinụlọ ha na-akpagbu, ndị owu na-ama ma ọ bụ ndị mmadụ nwụnahụrụ. Ndị ọzọ bụ ndị na-eto eto ndị ọgbọ ha na-enye nsogbu ka ha mee ihe ọjọọ ma ọ bụ ka ha chụwa ihe nke ụwa, ma ọ̀ bụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọzọ. (1 Tesa. 3:​1-3; 5:​11, 14) Chọọ otú ị ga-esi gosi ndị ọzọ na ị hụrụ ha n’anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’ozi ọma, mgbe unu na-erikọ nri, ma ọ bụ mgbe unu na-akparịta ụka n’ekwentị. w16.09 1:​13, 14

Sọnde, Ọktoba 14

Na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.​—⁠1 Kọr. 10:⁠31.

Anyị kwesịrị ịna-eyi uwe dị́ mma n’anya n’ihi Chineke anyị dị nsọ, ụmụnna anyị, na ndị anyị na-ezi ozi ọma. Anyị kwesịrị ịna-eyi uwe ga-eme ka a na-akwanyere ozi ọma anyị ùgwù, meekwa ka e too Jehova. (Rom 13:​8-10) Mgbe ọ kacha mkpa ka anyị yiri uwe dị mma bụ mgbe anyị na-eme ihe gbasara ofufe Chineke, dị ka ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Anyị kwesịrị ịna-eji ejiji ga-egosi na anyị bụ ‘ndị na-ekwupụta na anyị na-asọpụrụ Chineke.’ (1 Tim. 2:10) O doro anya na ụfọdụ uwe dị mma n’otu obodo nwere ike ọ gaghị adị mma n’obodo ọzọ. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-echebara omenala obodo echiche ka ha ghara iyi uwe ga-akpasu ndị ọzọ iwe. Anyị gaa mgbakọ, anyị kwesịrị iji ejiji dị mma n’anya kama iji ejiji ga-eme ka onye ọ bụla lewe anyị ka fim otú ahụ ndị ụwa na-eme. Anyị mee otú ahụ, obi ga-adị anyị ụtọ ikwu na anyị bụ Ndịàmà Jehova. N’eziokwu, ọnụ ga-aka anyị izi ndị ọzọ ozi ọma ma ohere ya dapụta. w16.09 3:​7, 8

Mọnde, Ọktoba 15

Ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.​—⁠Hib. 3:⁠4.

Ihe a Pọl kwuru ga-eme ka onye nụrụ ya chee echiche. Ọ bụ onye ụbụrụ ya na-aghọ nkọ ga-arụpụtali ihe bụ́ ọkpọka. Ọ bụrụ onye na-ekwu na Baịbụl abụghị Okwu Chineke, i nwekwara ike ịgwa ya ihe ga-eme ka o chee echiche. Chọpụta ihe onye ahụ kweere na ihe na-amasị ya. (Ilu 18:13) Ọ bụrụ na ihe gbasara sayensị na-amasị ya, obi nwere ike ịdị ya ụtọ ma ị gwa ya ihe ndị gosiri na ihe ọ bụla Baịbụl kwuru banyere sayensị bụ eziokwu. Ihe nwere ike ịmasị ụfọdụ ndị bụ igosi ha na amụma ndị e buru na Baịbụl na-emezu nakwa na ihe Baịbụl kọrọ mere n’oge ochie bụ eziokwu. I nwekwara ike igosi onye ahụ otú ihe Jizọs kụziri n’elu ugwu ma ọ bụ ihe ọzọ Baịbụl kwuru ga-esi mee ka ndụ ya ka mma. Cheta na ihe i kwesịrị iburu n’obi bụ ka i kwuo ihe ga-eru mmadụ n’obi, ọ bụghị ka okwu bie n’ọnụ gị. N’ihi ya, na-ege ntị nke ọma. Na-ajụ ezigbo ajụjụ, wetuokwa obi kwuo ihe i chere. Na-akwanyere ndị ị na-agwa okwu ùgwù, nke ka nke, ma ọ bụrụ ndị tọrọ gị. I mee otú ahụ, ha ga-akwanyere gị ùgwù ma gee gị ntị. w16.09 4:​14-16

Tuzdee, Ọktoba 16

Na-anabatanụ ibe unu.​—⁠Rom 15:⁠7.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ahụ́ ruo ndị bịara abịa ala n’ọgbakọ unu, jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ bụrụ na m nọ n’obodo ọzọ, olee otú m chọrọ ka ha si mesoo m?’ (Mat. 7:12) Anyị kwesịrị ịna-enwere ndị bịara ọhụrụ n’obodo anyị ndidi. Ná mmalite, o nwere ike anyị agaghị aghọta otú ha si akpa àgwà ma ọ bụ otú ha si eche echiche. Ma, kama ịtụwa anya ka ha mụta omenala anyị ozugbo, ọ́ gaghị aka mma ka anyị were ha otú ha dị? Anyị hụ ndị si obodo ọzọ bịa, o nwere ike ịdịrị anyị mfe ịmatakwu ha ma anyị mụọ banyere obodo ha na omenala ha. E nwee ndị anyị na-amachaghị n’ọgbakọ anyị ma ọ bụ n’ebe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị nwere ike ime nchọnchọ gbasara omenala ha ma anyị nwewe ofufe ezinụlọ. Ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị na ha na-adịkwu ná mma bụ ịkpọ ha ka ha bịa kụọ ngaji n’ezé n’ụlọ anyị. Ebe Jehova ‘megheere ndị mba ọzọ ọnụ ụzọ nke okwukwe,’ ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịkpọbata ndị bịara abịa n’ụlọ anyị, ya bụ, “ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe”?​—⁠Ọrụ 14:27; Gal. 6:10; Job 31:32. w16.10 1:​15, 16

Wenezdee, Ọktoba 17

Chesienụ echiche ike banyere onye ahụ nke diri okwu mmegide dị otú ahụ nke ndị mmehie kwuru.​—⁠Hib. 12:⁠3.

Mgbe Pọl kwuchara banyere ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nwere okwukwe, o kwuru banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ onye kacha tachie obi. Ndị Hibru 12:2 kwuru, sị: “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya, o diri osisi ịta ahụhụ, leghara ihere anya, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.” N’eziokwu, anyị kwesịrị ‘ichesi echiche ike banyere’ okwukwe Jizọs nwere mgbe ọnwụnwa kacha taa akpụ bịaara ya. Ndị Kraịst oge mbụ e gburu n’ihi okwukwe ha mere ka Jizọs. Dị ka ihe atụ, Antipas, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, ekweghị emebi iwu Chineke. (Mkpu. 2:13) Ụgwọ Chineke ga-akwụ ha bụ na ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe, nke karịrị ‘mbilite n’ọnwụ ahụ ka mma’ ndị oge ochie nwere okwukwe nọ na-atụ anya ya. (Hib. 11:35) Obere oge Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914, a kpọlitere ndị ahụ niile e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi, ha agaa eluigwe, bụrụ mmụọ, ka ha soro Jizọs chịa ụmụ mmadụ.​—⁠Mkpu. 20:⁠4. w16.10 3:⁠12

Tọzdee, Ọktoba 18

Na-agbanụ ibe unu ume kwa ụbọchị.​—⁠Hib. 3:⁠13.

Ụfọdụ ndị nne na nna anaghị aja ụmụ ha mma n’ihi na nne ha na nna ha ajaghị ha mma. A naghị aja ọtụtụ ndị e were n’ọrụ mma. Ọ bụ ya mere ha ji ekwu na ịgba mmadụ ume dị ezigbo ụkọ n’ụlọ ọrụ. Ọtụtụ mgbe, otú e nwere ike isi gbaa mmadụ ume bụ ịja ya mma maka ihe ọma o mere. Otú ọzọ e nwere ike isi gbaa ndị ọzọ ume bụ ịna-agwa ha àgwà ọma ha na-akpa ma ọ bụ ihe ga-eme ka obi dị ha mma mgbe ha “dara mbà.” (1 Tesa. 5:14) Okwu Grik a na-esikarị asụgharịta ‘ịgba ume’ pụtara ‘mmadụ ịkpọta onye ọzọ ka ọ bịa nọrọ ya n’akụkụ.’ Ka anyị na ụmụnna anyị na-efekọ Jehova, anyị nwere ike inwe ọtụtụ ohere anyị ga-eji kwuo ihe ga-agba ha ume. (Ekli. 4:​9, 10.) Ànyị na-eji ohere dabara adaba eme ka ndị ọzọ mata ihe mere anyị ji hụ ha n’anya, jirikwa ha kpọrọ ihe? Tupu anyị azaa ajụjụ a, anyị kwesịrị icheta na Baịbụl kwuru na “okwu e kwuru n’oge ya” magburu onwe ya.​—⁠Ilu 15:23. w16.11 1:​3-5

Fraịdee, Ọktoba 19

Lee ka o si dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ mgbe ụmụnne bikọtara ọnụ n’ịdị n’otu!​—⁠Ọma 133:⁠1.

Mgbe ndị Izrel rubeere Jehova isi, a haziri ha, ha adịrị n’otu. Chineke kwuru ihe ọ ga-emere ndị ya. Ọ sịrị: “M ga-eme ka ha dịrị n’otu, dị ka ìgwè atụrụ nke nọ n’ogige atụrụ.” (Maị. 2:12) Jehova sikwa n’ọnụ Zefanaya onye amụma kwuo, sị: “M ga-agbanwe asụsụ nke ndị dị iche iche ka ọ bụrụ asụsụ dị ọcha [bụ́ eziokwu dị na Baịbụl], ka ha niile wee na-akpọku aha Jehova, ka ha wee jiri otu obi na-efe ya ofufe.” (Zef. 3:⁠9) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị ji otu obi na-efe Jehova. N’oge ndịozi Jizọs, o doro anya na ndụmọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ nyeere Ndị Kraịst nọ́ na Kọrịnt na n’ebe ndị ọzọ aka ime ka ọgbakọ na-adị ọcha, na-adị n’udo ma na-adị n’otu. (1 Kọr. 1:10; Efe. 4:​11-13; 1 Pita 3:⁠8) Taa, a haziri ndị Jehova ahazi, ha adịrịkwa n’otu. Ha na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ụwa niile, na-agwa ha ihe ọma Chineke bu n’obi imere ụmụ mmadụ. w16.11 2:​16, 18

Satọdee, Ọktoba 20

Unu bụ . . . “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị pụrụ iche nke Chineke, ka unu wee kwusaa n’ebe niile ịdị mma” nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị.​—⁠1 Pita 2:⁠9.

N’ime narị afọ ole na ole mbụ mgbe Kraịst nwụchara, ọtụtụ ndị nwere ike ịgụ Baịbụl n’asụsụ Grik ma ọ bụ Latịn. N’ihi ya, ha nwere ike ịmata ihe dị iche n’ihe Okwu Chineke na-akụzi na ihe chọọchị na-akụzi. Ụfọdụ ndị matara na ihe ndị chọọchị na-akụzi bụ ụgha ma jụ ya. Ma, ịgwa ndị ọzọ ihe ha kweere bụ ịkpa nkụ ahụhụ. O nwedịrị ike ịta isi ha. Ka oge na-aga, ọtụtụ ndị anaghịzi asụ asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl. Chọọchị Katọlik ekweghị ka a sụgharịa Okwu Chineke n’asụsụ ndị mmadụ na-asụ n’oge ahụ. Onye ọ bụla na-ekwetaghị ihe chọọchị kwuru ga-eji anya ya hụ ntị ya. Ndị e tere mmanụ ji obi ha niile na-efe Chineke na-eji akọ ezukọ, ma ọ bụrụdị na ha na-ezukọ. Ndị e tere mmanụ, bụ́ “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze,” enweghị ike ife Chineke otú ha kwesịrị. Babịlọn Ukwu ahụ kere ndị mmadụ agbụ n’oge ahụ. w16.11 4:​8, 10, 11

Sọnde, Ọktoba 21

Ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke.​—⁠1 Kọr. 6:⁠9.

Anyị ekwesịghị ime mmehie ndị ahụ jọgburu onwe ha ụfọdụ ndị nọ́ na Kọrịnt mere. Anyị gbaara mmehie ndị ahụ ọsọ, ọ ga-egosi na obi dị anyị ụtọ maka obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke meere anyị, gosikwa na ‘mmehie abụghị nna anyị ukwu.’ Ma, ànyị kpebisiri ike ‘isi n’obi anyị na-erubere Chineke isi’ ma na-agbalịsi ike ka anyị ghara ime mmehie ụfọdụ ndị na-ewere na ọ dịchaghị njọ? (Rom 6:​14, 17) Chegodị banyere Pọl onyeozi. O doro anya na ọ naghị eme ihe ndị ahụ jọgburu onwe ha e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 6:​9-11. Ma, o kwuru na ya na-eme mmehie. Ọ sịrị: “Abụ m anụ ahụ́, onye e rere ịnọ n’okpuru mmehie. N’ihi na ihe m na-arụpụta ka m na-amaghị. N’ihi na ihe m na-achọ ime ka m na-adịghị eme; ma ihe m kpọrọ asị ka m na-eme.” (Rom 7:​14, 15) Ihe a Pọl kwuru gosiri na e nwere ihe ndị ọzọ o weere ka mmehie, ya ana-agbasikwa mbọ ike ka ọ ghara ime ihe ọjọọ ndị ahụ. (Rom 7:​21-23) Ka anyị na-eme otú ahụ o mere ma na-agbalịsi ike ‘isi n’obi anyị na-erubere Chineke isi.’ w16.12 1:​15, 16

Mọnde, Ọktoba 22

Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.​—⁠Ọma 55:⁠22.

Ọ bụrụ na e nwere ihe na-eme ka obi ghara iru gị ala, egwu ana-atụ gị, ma ọ bụ gị ana-echegbu onwe gị, gwa Nna gị nke eluigwe, bụ́ onye hụrụ gị n’anya, otú ọ dị gị n’obi. Mgbe i mechara ihe niile i nwere ike ime iji dozie nsogbu gị, ekpere i ji obi gị niile kpee ga-abara gị uru karịa ichegbuwe onwe gị. (Ọma 94:​18, 19) Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 4:​6, 7, Jehova nwere ike ịza ekpere anyị ji obi anyị niile na-ekpe mgbe niile. Olee otú o nwere ike isi mee ya? O nwere ike ime ka ahụ́ ruo anyị ala, ka anyị kwụsị ịna-echegbu onwe anyị. Ọtụtụ ndị esila n’ihe Chineke meere ha chọpụta na ihe a bụ eziokwu. Mgbe e nwere ihe na-echegbu ha, Chineke nyeere ha aka ka obi ruo ha ala otú mmadụ na-agaghị aghọtali. Chineke nwekwara ike imere gị ụdị ihe ahụ. N’ihi ya, “udo nke Chineke” nwere ike inyere gị aka imeri nsogbu ọ bụla bịaara gị. I nwere ike ịtụkwasị nkwa Jehova ji obiọma ya kwe gị obi. Ọ sịrị: “Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.”​—⁠Aịza. 41:10. w16.12 3:​3, 4

Tuzdee, Ọktoba 23

Mgbe Mozis tolitere, ọ bụ okwukwe ka o ji jụ ka a kpọọ ya nwa ada Fero.​—⁠Hib. 11:⁠24.

Mozis gbakụtara akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Ijipt azụ. “Ọ họọrọ ka e megbukọta ya na ndị Chineke kama ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge.” (Hib. 11:​25, 26) Ka anyị jiri ikike Chineke nyere anyị ikpebiri onwe anyị ihe kpọrọ ihe, jirikwa ya na-eme uche ya, si otú ahụ na-eṅomi okwukwe ndị ohu Chineke n’oge ochie dị ka Mozis. O nwere ike ịdị ka ọ̀ ka mfe ka onye ọzọ na-ekpebiri anyị ihe. Ma ọ bụrụ na anyị ana-ekwe ka onye ọzọ na-ekpebiri anyị ihe, ọ ga-eme ka anyị ghara inweta ngọzi anyị ga-enweta ma anyị na-ekpebi ihe anyị ga na-eme n’onwe anyị. E kwuru gbasara ngọzi ahụ na Diuterọnọmi 30:​19, 20. Amaokwu nke iri na itoolu gosiri ihe abụọ Chineke gwara ụmụ Izrel ka ha họrọ otu na ya. N’amaokwu nke iri abụọ, Jehova nyere ha ohere na-enweghị atụ ka ha gosi ya ihe dị ha n’obi. Anyịnwakwa nwere ike iji aka anyị họrọ ife Jehova. Ihe kacha mkpa anyị ga-eji maka ya jiri ikike Chineke nyere anyị kpebie ime ihe dị mma bụ iji gosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya nakwa iji too ya. w17.01 2:​10, 11

Wenezdee, Ọktoba 24

Tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma, . . . na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi.​—⁠Ọma 37:⁠3.

Jehova chọrọ ka anyị jiri ihe ndị o nyere anyị mee ihe ndị ga-aba uru. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, marakwa na anyị ga-enwe obi ụtọ ma anyị jiri ihe ndị a o nyere anyị mee ihe bara uru. Jehova makwa na e nwere ihe ndị ụmụ mmadụ na-agaghị emeli. Anyị agaghị ejili aka anyị ewepụ ezughị okè, mmehie, na ọnwụ. E nyeghịkwa anyị ikike ịtụrụ ndị ọzọ ụka, n’ihi na onye ọ bụla nwere ikike iji aka ya ekpebi ihe ọ ga-eme. (1 Eze 8:46) N’agbanyeghịkwa otú anyị maruru n’ihe, anyị dị ka ụmụaka ma e jiri anyị tụnyere Chineke. (Aịza. 55:⁠9) Anyị kwesịrị ikwe ka Jehova na-eduzi anyị n’ihe niile anyị na-eme ma tụkwasị ya obi na ọ ga na-akwado anyị ma na-emere anyị ihe ndị anyị na-agaghị emeliri onwe anyị. Mana, anyị kwesịkwara ịna-eme ihe anyị nwere ike ime iji dozie nsogbu anyị na iji nyere ndị ọzọ aka. N’eziokwu, anyị kwesịrị ‘ịtụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma’; anyị kwesịkwara ịna-eme ihe “n’ikwesị ntụkwasị obi.” w17.01 1:​2-4

Tọzdee, Ọktoba 25

Soro m gafere, mụ na gị ga-anọ na Jeruselem, m ga na-enye gị nri.​—⁠2 Sam. 19:⁠33.

Bazilaị jụrụ ime ihe Devid gwara ya. Maka gịnị? Ebe ọ bụ na o meela agadi, ọ gwara Devid na ya achọghị ịghọrọ ya ibu arọ. N’ihi ya, Bazilaị gwara Devid ka ọ kpọrọwa Kimham. Ọ ga-abụ na Kimham bụ nwa Bazilaị. (2 Sam. 19:​31-37) Ịdị umeala n’obi nyeere Bazilaị aka ime ihe kwesịrị ekwesị. Ihe mere o ji jụ ịga biri n’obí eze Devid abụghị n’ihi na o chere na ya erughị eru, ọ bụghịkwa n’ihi na ọ chọghị ihe ga-enye ndụ ya nsogbu. Kama ọ bụ maka na Bazilaị ma na ọnọdụ ya agbanweela, marakwa na e nwere ihe ndị ya na-agaghị emelizi. Ọ chọghị iwere ọrụ ọ ma na ya agaghị arụli. (Gal. 6:​4, 5.) Ọ bụrụ na anyị ana-achụ ọkwá ka a na-anwụ anwụ, ma ọ bụ na-achọ ịbụ onye a ma ama, naanị ihe ọ ga-eme bụ ime ka onwe anyị buwe anyị isi, anyị amalite ịsọ mpi, nke ga-emecha kpatara anyị nsogbu. (Gal. 5:26) Ọ bụrụ na anyị adịrị obi umeala, anyị na ụmụnna anyị ga na-arụkọ ọrụ ọnụ iji hụ na a na-eto Jehova, anyị ga na-agbakwa mbọ inyere ndị ọzọ aka.​—⁠1 Kọr. 10:31. w17.01 4:​5, 6

Fraịdee, Ọktoba 26

Chineke hụrụ ihe niile o mere, ma, lee! ha dị nnọọ mma.​—⁠Jen. 1:⁠31.

Jehova, bụ́ Onye kere anyị, dị egwu. Ihe niile o kere dị mma otú ọ chọrọ. (Jere. 10:12) Ihe ndị e kere eke gosiri na Jehova nyere iwu dị iche iche. O nyere ụmụ mmadụ na ihe ndị ọzọ o kere eke iwu ha ga na-erubere isi ka ihe niile nwee ike ịna-aga siriri werere. (Ọma 19:​7-9) N’ihi ya, ihe ọ bụla dị n’eluigwe na n’ụwa nwere ebe ọ na-adị, na-arụkwa ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ. Jehova haziri otú ihe ndị o kere eke ga-esi na-arụkọ ọrụ. N’ihi ya, ọ bụ iwu Jehova nyere mere ka ikuku dịrị n’ụwa, kpaara oké osimiri ókè, meekwa ka ihe ndị dị ndụ n’ụwa ghara ịnwụ. Ma ụmụ mmadụ ma ihe ndị ọzọ Chineke kere na-erubere iwu ndị a o nyere isi. O doro anya na otú ihe ndị Chineke kere si aga siriri werere na-egosi na e nwere ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ. Anyị gaa ozi ọma, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-agwa ndị mmadụ banyere Onye mere ka ihe ndị a niile na-aga n’usoro?​—⁠Mkpu. 4:11. w17.02 1:​4, 5

Satọdee, Ọktoba 27

Mozis . . . ka Chineke zipụrụ ka ọ bụrụ ma onye na-achị achị ma onye nnapụta site n’aka mmụọ ozi ahụ.​—⁠Ọrụ 7:⁠35.

Mgbe Mozis nwụrụ, Jọshụa nọchiri ya. Baịbụl kwuru na “ọchịagha nke ụsụụ ndị agha Jehova” mere ka Jọshụa nwee ike iduru ndị Chineke gaa lụso ndị Kenan agha. (Jọsh. 5:​13-15; 6:​2, 21) Mgbe Eze Hezekaya na-achị ndị Chineke, ìgwè ndị agha Asiria bịara ibibi Jeruselem. N’otu abalị, “mmụọ ozi Jehova gara gbuo otu narị puku na iri puku mmadụ asatọ na puku ise.” (2 Eze 19:35) Ndị mmụọ ozi zuru okè, ma ndị ha nyeere aka ezughị okè. E nwere mgbe Mozis na-edoghị Jehova nsọ. (Ọnụ Ọgụ. 20:12) Jọshụa ajụghị Jehova ihe ọ ga-eme tupu ya na ndị Gibiọn agbaa ndụ. (Jọsh. 9:​14, 15) E nwere mgbe obi Hezekaya “dị mpako.” (2 Ihe 32:​25, 26) N’agbanyeghị na ndị a ezughị okè, Jehova chọrọ ka ndị Izrel na-erubere ha isi. O ji ndị mmụọ ozi ya na-enyere ha aka. O doro anya na ọ bụ Jehova nọ na-edu ndị ya. w17.02 3:​7-9

Sọnde, Ọktoba 28

Ka ngọzi na nsọpụrụ na otuto na ike dịrị Onye ahụ nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa Atụrụ ahụ, ruo mgbe niile ebighị ebi.​—⁠Mkpu. 5:⁠13.

Ịsọpụrụ mmadụ pụtara igosi onye ahụ na anyị ejighị ya egwu egwu nakwa na anyị na-akwanyere ya ùgwù. Anyị kwesịrị ịtụ anya na onye ahụ mere ihe e kwesịrị iji maka ya na-asọpụrụ ya ma ọ bụ na ọ na-arụ ọrụ pụrụ iche. N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ, sị, Ònye ka anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ? Maka gịnị? Ihe Mkpughe 5:13 kwuru gosiri na ‘Onye ahụ nọ ọdụ n’ocheeze ahụ na Nwa Atụrụ ahụ’ kwesịrị ka a sọpụrụ ha. Mkpughe isi nke anọ kwukwara ihe mere e kwesịrị iji na-asọpụrụ Jehova. Ndị mmụọ e kere eke nọ n’eluigwe na-abụ abụ n’olu dara ụda iji too Jehova, bụ́ “Onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi.” Ha na-asị, “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.”​—⁠Mkpu. 4:​9-11. w17.03 1:​1, 2

Mọnde, Ọktoba 29

Onye tụkwasịrị obi n’obi nke ya dị nzuzu.​—⁠Ilu 28:⁠26.

Ihe ọtụtụ ndị na-ekwukarị bụ: Mee ihe obi gị gwara gị. Ma, mmadụ mee otú ahụ, o nwere ike ịkpatara ya nsogbu. E nwere ike ikwu na ime otú ahụ dị iche n’ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ikwe ka obi anyị na-ezughị okè ma ọ bụ ihe obi anyị na-agwa anyị megharịa anyị anya ma anyị kpebiwe ihe anyị ga-eme. Ihe ndị a kọrọ na Baịbụl na-eme ka anyị mata na mmadụ ime ihe obi ya gwara ya nwere ike ịkpatara ya ezigbo nsogbu. Nsogbu kachanụ bụ na obi ụmụ mmadụ na-ezughị okè “dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite.” (Jere. 3:17; 13:10; 17:9; 1 Eze 11:⁠9) N’ihi ya, gịnị nwere ike ime ma anyị chewe ma ọ bụ mewe ihe obi anyị gwara anyị mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme? Dị ka ihe atụ, gịnị nwere ike ime ma anyị kpebie ihe ndị anyị ga-eme mgbe iwe ji anyị? Anyị nwere ike ịma azịza ajụjụ a ma ọ bụrụ na anyị mere otú ahụ n’oge gara aga. (Ilu 14:17; 29:22) Ka ì chere na anyị ga-ekpebi ime ihe dị mma mgbe anyị dara mbà? (Ọnụ Ọgụ. 32:​6-12; Ilu 24:10) O doro anya na obi anyị nwere ike iduhie anyị ma anyị jiri otú obi dị anyị kpebie ihe dị mkpa anyị ga-eme. w17.03 2:​12, 13

Tuzdee, Ọktoba 30

[M ji] eziokwu na obi zuru ezu jee ije n’ihu gị.​—⁠2 Eze 20:⁠3.

Anyị na-emejọkarị n’ihi na anyị ezughị okè. Ma, obi dị anyị ụtọ na Jehova anaghị emeso anyị “dị ka mmehie anyị si dị,” ọ bụrụhaala na anyị echegharịa, jiri okwukwe na obi umeala na-arịọ ya mgbaghara n’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. (Ọma 103:10) Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nabata ofufe anyị na-efe ya kwa ụbọchị, anyị kwesịrị ‘iji obi anyị dum jeere ya ozi,’ otú ahụ Devid gwara Sọlọmọn ka o mee. (1 Ihe 28:⁠9) Iji “obi zuru ezu” na-efe Chineke pụtara mmadụ iji obi ya niile na-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Na Baịbụl, okwu bụ́ “obi” na-apụtakarị ụdị onye mmadụ bụ. Ihe ndị so na ya bụ ihe na-agụ mmadụ agụụ, ihe ọ na-eche, otú o si akpa àgwà, otú o si ele ihe anya, na ihe ndị o kpebiri ime. N’ihi ya, onye ji obi ya niile na-efe Jehova anaghị efe ya naanị ka a sị na ọ na-efe ya. Anyịnwa kwanụ? Ọ bụ eziokwu na anyị ezughị okè, anyị jiri obi anyị niile na-efe Chineke ma ghara ịna-eme ihu abụọ, ọ pụtara na anyị ji “obi zuru ezu” na-efe ya.​—⁠2 Ihe 19:⁠9. w17.03 3:​1, 3

Wenezdee, Ọktoba 31

[Jehova] na-ahụ onye dị umeala n’obi; ma ọ na-anọ onye na-ebuli onwe ya elu n’ebe dị anya.​—⁠Ọma 138:⁠6.

Ọ bụrụ na ihe ọma meere anyị, ò nwere ike bụrụ na Jehova ‘hapụrụ anyị iji lee anyị ule,’ ka a mata ihe dị anyị n’obi? Dị ka ihe atụ, nwanna nwere ike gbaa mbọ kwado ihe omume e nyere ya ná mgbakọ ma mee ya, ọtụtụ ndị ajaa ya mma maka ya. Gịnị ka ọ ga-eme? A jaa anyị mma, anyị kwesịrị icheta ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Unu onwe unu, mgbe unu mere ihe niile e kenyere unu, sịnụ, ‘Anyị bụ ndị ohu na-abaghị uru ọ bụla. Ihe anyị mere bụ ihe anyị kwesịrị ime.’” (Luk 17:10) E nwere ihe anyị ga-amụta n’ihe Hezekaya mere. Mpako ọ dị mere ka ọ ghara igosi na obi dị ya ụtọ maka “ihe ọma e meere ya.” (2 Ihe 32:​24-27, 31) Anyị chebara ọtụtụ ihe ọma Chineke meere anyị echiche, ọ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịkpa àgwà na-adịghị ya mma. Anyị ga na-agwa ndị ọzọ banyere Jehova nakwa ihe ọma ndị o meere anyị. w17.03 4:​12-14

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya