Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es18 p. 118-128
  • Disemba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Disemba
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2018
  • Isiokwu Nta
  • Satọdee, Disemba 1
  • Sọnde, Disemba 2
  • Mọnde, Disemba 3
  • Tuzdee, Disemba 4
  • Wenezdee, Disemba 5
  • Tọzdee, Disemba 6
  • Fraịdee, Disemba 7
  • Satọdee, Disemba 8
  • Sọnde, Disemba 9
  • Mọnde, Disemba 10
  • Tuzdee, Disemba 11
  • Wenezdee, Disemba 12
  • Tọzdee, Disemba 13
  • Fraịdee, Disemba 14
  • Satọdee, Disemba 15
  • Sọnde, Disemba 16
  • Mọnde, Disemba 17
  • Tuzdee, Disemba 18
  • Wenezdee, Disemba 19
  • Tọzdee, Disemba 20
  • Fraịdee, Disemba 21
  • Satọdee, Disemba 22
  • Sọnde, Disemba 23
  • Mọnde, Disemba 24
  • Tuzdee, Disemba 25
  • Wenezdee, Disemba 26
  • Tọzdee, Disemba 27
  • Fraịdee, Disemba 28
  • Satọdee, Disemba 29
  • Sọnde, Disemba 30
  • Mọnde, Disemba 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2018
es18 p. 118-128

Disemba

Satọdee, Disemba 1

Guzogidenụ ya, sienụ ike n’okwukwe, ebe unu maara na òtù ụmụnna unu niile ndị nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ a unu na-ata.​—⁠1 Pita 5:⁠9.

Pita onyeozi gbara Ndị Kraịst ume ka ha tachie obi n’ọtụtụ ọnwụnwa si n’aka Setan. Ihe Baịbụl kọrọ banyere “ndị tachiri obi” na-akụziri anyị otú anyị ga-esi kwesị ntụkwasị obi. Ọ na-eme ka obi sie anyị ike, na-echetakwara anyị na Chineke ga-agọzi anyị ma anyị na-erubere ya isi. (Jems 5:11) À na-emegide gị ma ọ bụ na-akpagbu gị? Ọ bụrụ na ị bụ okenye ọgbakọ ma ọ bụ onye nlekọta sekit, ọtụtụ ọrụ ị na-arụ hà na-agwụ gị ike? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe Pọl mere nwere ike inyere gị aka. A kpagburu Pọl nke ukwuu, ya ana-echegbukwa onwe ya mgbe niile banyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị iche iche. (2 Kọr. 11:​23-29) Ma, Pọl adaghị mbà. Ihe o mere mere ka okwukwe ndị ọzọ sikwuo ike. (2 Kọr. 1:⁠6.) Otú i si atachi obi nwekwara ike ịgba ndị ọzọ ume ịtachi obi. w16.04 2:​11, 14

Sọnde, Disemba 2

Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m . . . Na-ezi ha [ihe].​—⁠Mat. 28:​19, 20.

Ma ndị mmadụ hà kwetara ihe anyị na-ekwusa ma hà na-emegide anyị, ọtụtụ ndị kwetara na ihe e ji mara Ndịàmà Jehova bụ ozi ọma ha na-ekwusa. O nwere ike ịbụ na ị hụtụla ụfọdụ ndị n’ozi ọma, bụ́ ndị na-asị na ọ bụ eziokwu na ha ekwetaghị ihe ndị anyị kweere, ma ha na-akwanyere anyị ùgwù maka ozi ọma anyị na-ekwusa. Anyị ma na Jizọs buru amụma na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’elu ụwa dum mmadụ bi. (Mat. 24:14) Ọtụtụ okpukpe na-ekwu na ha na-ekwusa ozi ọma. Ma, naanị otú ha na-esikarị ekwusa ya bụ ịkọ ihe ọma meere ha, ịkụzi ihe na chọọchị, na tiivi, n’Ịntanet ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ a na-agbasa ozi. Ndị ọzọ chere na otú ha ga-esi kwusaa ozi ọma bụ ịrụ ọrụ ebere ma ọ bụ ịbụ ndị dọkịta, ndị nọọsụ, na ndị nkụzi. Ma, ọ̀ bụ ime ihe ndị a bụ ikwusa ozi ọma Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha kwusaa? w16.05 2:​1, 2

Mọnde, Disemba 3

Ana m akpọku Siza!​—⁠Ọrụ 25:⁠11.

Ọchịchị ụmụ mmadụ aghọọla ndị iro Alaeze Chineke, nke malitere ịchị n’afọ 1914. N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ niile. (Ọma 2:​2, 7-9) Ihe mere Chineke ji hapụ ụmụ mmadụ ka ha na-achị bụ na ha na-eme ka ọgba aghara ghara ịdị, nke na-enyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Rom 13:​3, 4) Chineke gwadịrị anyị ka anyị na-ekpe ekpere maka ndị na-achị achị ka anyị nwee ike ịna-efe ya n’enweghị nsogbu. (1 Tim. 2:​1, 2) Ọ bụrụ na a na-emegbu anyị, anyị nwere ike ịgwa ndị ọchịchị ka ha nyere anyị aka. Pọl mere otú ahụ. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na e nyefere Setan ọchịchị ụwa a, e nweghị ebe o kwuru na ọ bụ ya na-eduzi onye ọchịchị ọ bụla. (Luk 4:​5, 6) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwu ihe ga-eme ka mmadụ chewe na ọ bụ Ekwensu na-eduzi otu onye ọchịchị. Baịbụl kwuru na anyị ekwesịghị ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla.​—⁠Taị. 3:​1, 2. w16.04 4:​5, 6

Tuzdee, Disemba 4

Nọgidenụ na-aghọta ihe uche Jehova bụ.​—⁠Efe. 5:⁠17.

I nwere ike ịna-eche, sị, ‘Olee otú anyị ga-esi mata ihe dị Jehova mma ma ọ bụrụ na Baịbụl ekwughị hoo haa ihe anyị ga-eme?’ Ọ bụrụ na e nweghị iwu Baịbụl nyere gbasara ihe anyị chọrọ ikpebi, olee otú anyị ga-esi mata ihe bụ́ uche Chineke? Ọ bụ ikpe ekpere ma kwe ka o jiri mmụọ nsọ ya duzie anyị. Chegodị otú Jizọs si ghọta ihe Nna ya chọrọ ka o mee. Baịbụl kọrọ banyere ugboro abụọ Jizọs bu ụzọ kpee ekpere ma rụọ ọrụ ebube nye ìgwè mmadụ nri. (Mat. 14:​17-20; 15:​34-37) Ma, mgbe agụụ na-agụ Jizọs n’ala ịkpa, Ekwensu asị ya mee ka nkume ghọọ achịcha, o kweghị eme ya. (Mat. 4:​2-4) Ebe Jizọs ma ihe bụ́ uche Nna ya, ọ ma na ya ekwesịghị ime ka nkume ghọọ achịcha. N’eziokwu, Jizọs ghọtara na Chineke achọghị ka o jiri mmụọ nsọ mee ihe ga-abara naanị ya uru. Otú ahụ ọ jụrụ ime ihe Setan gwara ya gosiri na obi siri ya ike na Jehova ga na-eduzi ya ma na-enye ya nri. w16.05 3:​7, 8

Wenezdee, Disemba 5

Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru.​—⁠2 Tim. 3:⁠16.

E nwere onye ma ọ bụ ndị e bu n’obi dee ebe ụfọdụ na Baịbụl. N’ihi ya, tupu anyị agụwa Okwu Chineke, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o mee ka anyị mata na e nwere ihe anyị ga-amụta nakwa ka o nye anyị amamihe ka anyị nwee ike ịghọta ihe ọ chọrọ ka anyị mụta. (Ezra 7:10; Jems 1:⁠5) Ị gụwa Baịbụl, kwụsịtụ jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka ihe a na-akụziri m banyere Jehova? Olee otú m ga-esi mee ya? Olee otú m ga-esi jiri ya nyere ndị ọzọ aka?’ Anyị chebara ụdị ajụjụ ndị a echiche, anyị ga-amụtakwu ihe n’ebe anyị gụrụ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere àgwà ndị Baịbụl kwuru ọ ga-abụ mmadụ na-akpa, ya eruo eruo ịbụ okenye. (1 Tim. 3:​2-7) Ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime anyị abụghị okenye, anyị nwere ike iche na ebe a agbasachaghị anyị. Ma àgwà ndị ahụ e kwuru okwu ha nwere ike inyere anyị niile aka. w16.05 5:​7, 8

Tọzdee, Disemba 6

Lee! Dị ka ụrọ ọkpụite ji n’aka, otú ahụ ka unu dị n’aka m, unu ụlọ Izrel.​—⁠Jere. 18:⁠6.

Mgbe a dọọrọ ndị Juu n’agha laa Babịlọn, ha hụrụ na obodo ahụ jupụtara n’arụsị na ndị na-efe ndị mmụọ ọjọọ. Ma ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Daniel na ndị enyi ya atọ, ekweghị ka ndị Babịlọn mee ka ha mewe ihe ọjọọ. (Dan. 1:​6, 8, 12; 3:​16-18) Daniel na ndị enyi ya kpebisiri ike na ọ bụ naanị Jehova ka ha ga-efe nakwa na ọ bụ ya ga-akpụzi ha. Ha mekwara otú ahụ. N’agbanyeghị na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na Daniel biri ndụ ya niile na Babịlọn, mmụọ ozi Chineke kwuru na ọ bụ “nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu.” (Dan. 10:​11, 19) N’oge ochie, ọkpụite nwere ike itinye ụrọ n’ihe e ji akpụ ihe ka o nwee ike ịkpụ ihe yiri ihe ahụ. Ndị ohu Jehova taa ma na ọ bụ ya bụ Ọkaakaa Eluigwe na Ụwa, nakwa na ọ bụ ya nwere ikike ịkpụzi ndị mmadụ na mba dị iche iche. (Jere. 18:⁠6) Chineke nwekwara ikike ịkpụzi onye ọ bụla n’ime anyị. Ma, ọ na-ahapụ anyị ka anyị jiri aka anyị kpebie ihe anyị ga-eme, ọ chọkwara ka anyị jiri obi anyị niile na-erubere ya isi. w16.06 2:​1, 2

Fraịdee, Disemba 7

Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya.​—⁠Hib. 13:⁠5.

Setan chọrọ iji ihe ndị a na-emepụta n’ụwa a mee ka anyị chee na ọ bụ inwe ọtụtụ ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ. Ọ bụ aka ochie n’iji “ọchịchọ nke anya” arata mmadụ. (1 Jọn 2:​15-17; Jen. 3:6; Ilu 27:20) E nwere ọtụtụ ihe a na-emepụta n’ụwa, ma ndị bụ́ ọkpọka ma ndị na-enweghị ihe ha bụ. Ụfọdụ n’ime ha nwekwara ike ịmasị anyị. Ò nwetụla mgbe ị zụrụ ihe na-adịghị gị mkpa maka na ihe ahụ chabara gị n’anya mgbe ị hụrụ ya ma ọ bụ mgbe a na-akpọsa ya? Ì mechara chọpụta na o nweghị oké uru ihe ahụ baara gị? Ọ bụrụ na anyị ana-azụ ihe ndị na-adịghị anyị mkpa, ọ ga-eme ka ihe siere anyị ike, ike ana-agwụkwa anyị. Ihe ndị ahụ nwere ike ime ka uche anyị pụọ n’ozi anyị na-ejere Jehova, anyị agaghịzi enwe ohere ịmụ Baịbụl, ịkwadebe maka ọmụmụ ihe, ịga ọmụmụ ihe, na ịgachi ozi ọma anya. Cheta na Jọn onyeozi dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa.” w16.07 1:​3, 4

Satọdee, Disemba 8

Dị nnọọ ka e nwere ọtụtụ “chi” . . . , n’ebe anyị nọ, otu Chineke dị.​—⁠1 Kọr. 8:​5, 6.

Ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ bụ ma ndị Juu ma ndị Grik ma ndị Rom ma ndị mba ndị ọzọ. Ha sicha n’okpukpe dị iche iche, nwee omenala dị iche iche, ihe na-amasị ha dịkwa iche iche. N’ihi ya, o siiri ụfọdụ n’ime ha ike ịnabata ụzọ ọhụrụ e sizi na-efe Jehova ma ọ bụ ịkwụsị ihe ụfọdụ ha na-emebu. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji chetara ha na Ndị Kraịst nwere otu Chineke bụ́ Jehova. Oleekwanụ maka ọgbakọ Ndị Kraịst taa? Aịzaya onye amụma kwuru na “n’oge ikpeazụ,” ndị si ná mba di iche iche ga-enuba n’ugwu Jehova ka ha fee ya. Ha ga-asị: “Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.” (Aịza. 2:​2, 3) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị na-ahụ otú amụma a si na-emezu n’oge anyị a. Ụmụnna anyị si ebe dị iche iche, na-asụ ọtụtụ asụsụ, nwee omenala dị iche iche, jirikwa otu obi na-efe Jehova. Ma, otú a anyị si ebe dị iche iche nwere ike ime ka e nwee nsogbu mgbe ụfọdụ. w16.06 3:​15, 16

Sọnde, Disemba 9

Ọ kpọlitekọkwara anyị na ya ma nyekọọ anyị na ya oche n’ebe ndị dị n’eluigwe n’ihi na anyị na Kraịst Jizọs dị n’otu.​—⁠Efe. 2:⁠6.

O siri ike ichetụdị n’echiche ihe dị egwu Jehova ga-emere Ndị Kraịst e tere mmanụ mgbe ha ga-anọ n’ocheeze soro Kraịst na-achị n’eluigwe. (Luk 22:​28-30; Fil. 3:​20, 21; 1 Jọn 3:⁠2) Ha ga-abụ “Jeruselem ọhụrụ,” bụ́ nwaanyị Kraịst na-alụ ọhụrụ. (Mkpu. 3:12; 17:14; 21:​2, 9, 10) Ha ga-eso Jizọs ‘gwọọ mba niile.’ Ha ga-enyere ndị mmadụ aka ka ha gharazie ịbụ ndị ohu mmehie na ọnwụ, nyekwara ha aka ka ha zuo okè. (Mkpu. 22:​1, 2, 17) Otu n’ime ụzọ kachanụ Jehova ga-esi gosi ndị mmadụ obiọma ya na-erughịrị ha bụ na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha esi n’ili pụta. (Job 14:​13-15; Jọn 5:​28, 29) Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị fere Jehova n’oge ochie tupu Jizọs ejiri ndụ ya chụọ àjà nakwa ndị so ‘n’atụrụ ọzọ,’ bụ́ ndị fere Jehova ruo mgbe ha nwụrụ n’oge ikpeazụ a. Ha ga-ebilite ka ha soro fewekwa Jehova.​—⁠Jọn 10:16. w16.07 4:​13-15

Mọnde, Disemba 10

N’ụdị oge dị otú a ka unu na-ehi ụra, na-ezu ike!​—⁠Mak 14:⁠41.

‘Ịmụrụ anya’ apụtaghị naanị ibu n’obi na anyị agaghị ehi ụra. Ụbọchị ole na ole tupu ihe ahụ mere n’ogige Getsemeni emee, Jizọs gwara ndịozi ya ndị ahụ ka ha na-arịọsi Jehova arịrịọ ike. (Luk 21:36) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eche nche, anyị kwesịrị ịmụrụ anya ma na-ekpe ekpere. (1 Pita 4:⁠7) Ebe Jizọs kwuru na ọgwụgwụ ga-abịa ‘n’oge awa anyị na-echeghị na ọ ga-abụ,’ ugbu a abụghị oge anyị kwesịrị ihiwe ụra, chụwa ihe na-enweghị isi na ọdụ juru n’ụwa Setan a, bụ́kwanụ ihe ndị na-agụ anụ ahụ́ anyị. (Mat. 24:44) Chineke na Kraịst si na Baịbụl na-agwa anyị ihe ha ga-emere anyị n’oge na-adịghị anya nakwa otú anyị ga-esi na-eche nche. Anyị kwesịrị ịna-agba mbọ ka okwukwe anyị sie ike, ka anyị na Jehova dịrị ná mma, anyị eburukwa ụzọ na-achọ Alaeze ya. Anyị kwesịrị ịmata na oge na-akụzi kwarapụ kwarapụ, ka anyị nwee ike ịdị njikere maka ihe ga-eme n’oge na-adịghị anya. (Mkpu. 22:20) Ọ bụ ihe ga-eme ka anyị dị ndụ. w16.07 2:​15-17

Tuzdee, Disemba 11

Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam.​—⁠Kọl. 3:⁠13.

Di na nwunye ga na-ebi n’udo ma ha abụọ na-eleghara ihe ibe ha na-emejọ anya. Ha ga ‘na-ediri ibe ha ihe ma na-agbaghara ibe ha kpamkpam.’ Nke bụ́ eziokwu bụ na ha abụọ ga na-emejọ ihe. Ma, ha mejọọ, ha nwere ike ịmụta ihe n’ihe ha mejọrọ, gbaghara onye mejọrọnụ, hụkwa ibe ha n’anya otú ahụ Baịbụl kwuru. Ọ bụ ụdị ịhụnanya a ga-eme ka ha ‘dị n’otu.’ (Kọl. 3:14) Baịbụl kwukwara na ịhụnanya “nwere ogologo ntachi obi na obiọma. . . . Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ.” (1 Kọr. 13:​4, 5) Di na nwunye see okwu, ha kwesịrị idozi ya ozugbo, tupu ụbọchị ahụ agafee. (Efe. 4:​26, 27) Ịdị umeala n’obi na ịkata obi ga-eme ka mmadụ sị, “Ewela iwe. Gbaghara m.” Ma, ọ ga-eme ka di na nwunye na-edozi ihe seere ha, meekwa ka ha na-adịkwu ná mma. w16.08 2:6

Wenezdee, Disemba 12

M ga-enye unu ezi ntụziaka.​—⁠Ilu 4:⁠2.

Ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke bụ ọrụ kacha Jizọs mkpa. Ma, o wepụtara oge zụọ ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ na ndị nkụzi. (Mat. 10:​5-7) Ọ bụ eziokwu na Filip kwusasiri ozi ọma ike, o doro anya na o nyeere ụmụ ya ndị nwaanyị anọ aka ịmụta otú e si akụziri ndị ọzọ eziokwu Baịbụl. (Ọrụ 21:​8, 9) Taa, olee ihe mere o ji dị mkpa ka a na-azụ ndị ọzọ? N’ụwa niile, ọtụtụ ndị na-anabatakwu ozi ọma anyị na-ekwusa. Ndị ọhụrụ a na-emebeghị baptizim kwesịrị ịmata ihe mere o ji dị́ mkpa ka ha na-amụ ihe. E kwesịkwara ịkụziri ha otú ha ga-esi na-ezi ndị ọzọ ozi ọma, na-akụzikwara ha eziokwu Baịbụl. N’ọgbakọ anyị dị́ iche iche, e kwesịrị ịna-agba ụmụnna nwoke ume ka ha na-agbasi mbọ ike iru eru ịbụ ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye. Ndị nọterela aka n’ọgbakọ kwesịrị ịna-enye ndị ọhụrụ “ezi ntụziaka,” nke ga-enyere ha aka ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ. w16.08 4:​1, 2

Tọzdee, Disemba 13

Meenụ ka aka na-adịghị ike dị ike, meekwanụ ka ikpere na-ama jijiji sie ike.​—⁠Aịza. 35:⁠3.

Anyị na ụmụnna anyị jiri otu obi na-ejere Jehova ozi, ọ ga-eme ka anyị na ha dị n’otu. Ọ ga-eme ka anyị bụrụ ezigbo enyi, meekwa ka anyị na ha nwee obi ike n’ihe ọma Alaeze Chineke ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka ndị ọzọ dị ike, anyị ga na-enyere ha aka idi nsogbu ndị na-abịara ha, ha enweekwa olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. (Aịza. 35:⁠4) Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ozi Chineke, mee ka obi sie anyị ike na nkwa Chineke ga-emezu. N’eziokwu, ọ ga-eme ka anyị dị ike. Anyị cheta ụzọ dị iche iche Jehova si nyere ndị ohu ya aka n’oge ochie ma chebe ha, okwukwe anyị nwere n’ebe ọ nọ ga-esikwu ike, anyị atụkwasịkwuo ya obi. N’ihi ya, mgbe ọ bụla nsogbu bịaara gị, adala mbà. (Zef. 3:16) Kama, rịọ Jehova ka o nyere gị aka, kwekwa ka aka ya dị ike mee ka ị dị ike, na-edukwa gị ruo mgbe ị ga-enweta ihe ọma Alaeze ya ga-eme n’oge na-adịghị anya.​—⁠Ọma 73:​23, 24. w16.09 1:​16-18

Fraịdee, Disemba 14

Ihe ọ bụla a na-eme eme na ọrụ ọ bụla a na-arụ arụ nwere oge.​—⁠Ekli. 3:⁠17.

Mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eyi, anyị kwesịrị iburu n’obi ihe e kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. O doro anya na anyị nwere ike iyi uwe anyị yi n’ihi oyi, okpomọkụ, ihu ígwé, ụdị ebe anyị bi, na otú ihe dị. Ma, ihu ígwé anaghị eme ka iwu Jehova gbanwee. (Mal. 3:⁠6) Ná mba ndị e nwere okpomọkụ, ọ naghị adịcha mfe iyi uwe dị mma n’anya, nke ga-egosi na anyị nwere uche. N’ihi ya, obi na-adị ụmụnna anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị eyighị uwe tapaara anyị n’ahụ́ ma ọ bụ nke na-ahụ ụzọ. (Job 31:⁠1) Mgbe anyị gara ebe a na-egwu mmiri, uwe anyị yi egwu mmiri kwesịrị ịdị mma n’anya iji gosi na anyị dị umeala n’obi. (Ilu 11:​2, 20) Ọ bụrụgodị na ọ na-abụ ọtụtụ ndị ụwa gaa igwu mmiri, ya afọ obere ka ha gbara ọtọ, ihe bụ́ mkpa anyị bụ ime ihe ga-eme ka e too Chineke anyị dị nsọ anyị hụrụ n’anya. w16.09 3:​11, 12

Satọdee, Disemba 15

Ònye ka unu na-asị na m bụ?​—⁠Mat. 16:⁠15.

Ụjọ atụghị Jizọs ịjụ ndị na-eso ụzọ ya ihe ha kweere. Na-eme ka Jizọs. Ọ na-akacha mma ịgwa ụmụ gị ka ha kwuo obi ha mgbe ahụ́ ruru ha ala. E nwee ihe Baịbụl na-akụzi nke na-eme nwa gị obi abụọ, ekwela ka o wee gị iwe ma ọ bụ mee ka ị bawara ya mba. Wetuo obi nyere ya aka ka ọ mata azịza ajụjụ ndị ọ jụrụ. N’eziokwu, ọ dị mma ka nwa gị jụọ ajụjụ n’ihi na ọ ga-egosi na ọ chọrọ ịmata ihe. Mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, ọ jụrụ ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. (Luk 2:46) Gbaa mbọ ka ị mata ụmụ gị nke ọma. Mata ihe ha na-eche, otú obi dị ha na ihe bụ́ mkpa ha. Echekwala na ha nwere okwukwe naanị n’ihi na ha na-eso unu aga ozi ọma na ọmụmụ ihe. Na-agwa ha gbasara Jehova mgbe ọ bụla gị na ha na-emekọ ihe. Na-etinye ụmụ gị n’ekpere ma mgbe gị na ha na-ekpekọ ekpere ma mgbe naanị gị na-ekpe ekpere. Gbalịa mata ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara ha, ma nyere ha aka imeri ha. w16.09 5:​3-5

Sọnde, Disemba 16

Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.​—⁠Mat. 5:⁠3.

Ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-agbasi mbọ ike ịna-ezi “mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile” ozi ọma otú ahụ Jọn hụrụ ya n’ọhụụ. (Mkpu. 14:⁠6) Ì so ná ndị na-amụ asụsụ ọzọ? Ị̀ bụ onye ozi ala ọzọ ma ọ bụ na-eje ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu ná mba ọzọ, ka ị̀ malitela iso ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe n’obodo unu? Ebe anyị na-efe Chineke, anyị niile kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka okwukwe anyị na okwukwe ndị ezinụlọ anyị na-esi ike. Ma, o nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ ịna-amụ ihe nke onwe anyị n’ihi na anyị anaghị enwe efe. Ma, e nwere nsogbu ndị ọzọ ndị nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe na-enwe. E wezụga ịmụ asụsụ ọzọ, ndị nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe kwesịkwara ịna-amụ ihe ndị miri emi nke Chineke.​—⁠1 Kọr. 2:10. w16.10 2:​1-3

Mọnde, Disemba 17

Ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.​—⁠Mat. 26:⁠52.

Ndịàmà Jehova ka na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya ha nwere n’agbanyeghị na a na-emesi ha ezigbo ike. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị nọ n’ụlọ mkpọrọ n’Eritria, Sịngapọ, na Saụt Koria. Ọtụtụ mgbe, ihe mere e ji tụọ ha mkpọrọ bụ na ha mere ihe Jizọs kwuru. E nwere ọtụtụ ndị Jehova a na-anaghị echi ọnụ n’ala otú ahụ. Ọnwụnwa ndị na-abịara ha dị iche. Ọtụtụ n’ime ha na-ata ahụhụ n’ihi ịda ogbenye, agha, ma ọ bụ ọdachi na-emere onwe ya. E nwekwara ndị merela ihe ahụ Mozis, Aịzik, na Ebreham mere. Ha hapụrụ ikpori ndụ na ịbụ onye a ma ama n’ụwa n’ihi ijere Jehova ozi. Ha na-agbasi mbọ ike ka ha ghara ịchụrụ ihe nke ụwa gawa. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha hụrụ Jehova n’anya, nweekwa okwukwe siri ike na ọ ga-emezu nkwa o kwere iwepụ mmegbu niile ma mee ka ndị ji obi ha niile na-efe ya nweta ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ, bụ́ ebe ndị ezi omume ga-ebi.​—⁠Ọma 37:​5, 7, 9, 29. w16.10 3:​15, 16

Tuzdee, Disemba 18

Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.​—⁠Ọma 34:⁠18.

Mgbe ụjọ ji Jeremaya, obi adaakwa ya mbà, Jehova mere ka obi sie ya ike. (Jere. 1:​6-10) Mgbe Daniel onye amụma mere agadi, chegodị otú obi si dị ya ụtọ mgbe Chineke zitere otu mmụọ ozi ka ọ bịa gbaa ya ume. Mmụọ ozi ahụ kpọrọ Daniel “nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu.” (Dan. 10:​8, 11, 18, 19) Ị hụ ndị nkwusa, ndị ọsụ ụzọ, na ụmụnna ndị merela agadi ike na-adịghịzi, ị̀ ga-agba ha ume otú ahụ? Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, Chineke echeghị na ya ekwesịghị ịja ya mma ma gbaa ya ume ebe ọ bụ na ha abụọ rụkọrọ ọrụ n’eluigwe ọtụtụ afọ. Kama, Jizọs nụrụ ka Nna ya si n’eluigwe kwuo ugboro abụọ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Mat. 3:17; 17:⁠5) Chineke si otú ahụ jaa Jizọs mma, meekwa ka obi sie ya ike na ọ na-eme nke ọma. N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ nọ na-echegbu onwe ya. Jehova zitere otu mmụọ ozi ka ọ gbaa ya ume ma kasie ya obi.​—⁠Luk 22:43. w16.11 1:​7, 8

Wenezdee, Disemba 19

Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe.​—⁠Ekli. 7:⁠9.

Ọ naghị adị mfe ijide onwe anyị ma anyị chee na e mejọrọ anyị ma ọ bụ megbuo anyị. Ọ na-agbawa obi ma ọ bụrụ na a na-emegbu anyị n’ihi agbụrụ anyị, otú akpụkpọ ahụ́ anyị na-acha ma ọ bụ otú anyị dị. O nwere ike ịkacha fụọ anyị ka ose ma ọ bụrụ nwanna mere ya. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịna-ejide onwe anyị ma ghara ịna-ewe iwe ọsọ ọsọ otú ahụ Baịbụl kwuru. (Ilu 16:32) O doro anya na anyị niile kwesịrị ịgbakwu mbọ ka anyị na-agbaghara ndị ọzọ ma ghara ịna-ewe iwe ngwa ngwa. Jizọs kwuru na ọ bụrụ na anyị agbagharaghị ndị ọzọ, Jehova agaghị agbaghara anyị. (Mat. 6:​14, 15) Ì kwesịrị ịgbakwu mbọ ka ị na-agbaghara ndị ọzọ ma na-ejide onwe gị? Ọsụkọsụ na-asụkarị ndị na-anaghị ejide onwe ha. O nwere ike ime ka ndị mmadụ na-agbara ha ọsọ. Onye iwe nwere ike ime ka ụfọdụ ndị kpọwa ibe ha asị n’ọgbakọ.​—⁠Lev. 19:​17, 18. w16.11 3:​4-6

Tọzdee, Disemba 20

Olee ihe jikọrọ ezi omume na mmebi iwu? Ma ọ bụ, olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?​—⁠2 Kọr. 6:⁠14.

Nwanna Charles Taze Russell na mmadụ ole na ole so ya malitere ịmụsi Baịbụl ike n’ihe dị ka afọ 1870 n’ihi na ha chọrọ ịmụta eziokwu Baịbụl. Ná mmalite, ihe Nwanna Russell bu n’obi bụ ịmata nke na-akụzi eziokwu n’ime okpukpe ndị a ma ama n’oge ahụ. O leruru ozizi okpukpe dị iche iche anya, ma nke ndị na-abụghị Ndị Kraịst, ka ọ chọpụta ma hà na-akụzi ihe Baịbụl kwuru. N’oge na-adịghị anya, ọ chọpụtara na o nweghị nke na-akụzi ihe Baịbụl kwuru. N’otu oge, ọ gara hụ ụfọdụ ndị ụkọchukwu nọ́ n’Amerịka, buru n’obi na ha ga-ekweta eziokwu ya na ndị só ya mụtara na Baịbụl ma kụziwere ya ndị chọọchị ha. Ndị ụkọchukwu ndị ahụ achọghị ịma. Ndị Mmụta Baịbụl matara ihe ha kwesịrị ime. E kwesịghị inwe ihe ọ bụla ga-ejikọ ha na ndị ahụ kpebisiri ike ịna-akụzi ozizi ụgha. w16.11 4:⁠14

Fraịdee, Disemba 21

Nyefeenụ ahụ́ unu otú ahụ ugbu a ka ọ bụrụ ohu nke ezi omume, ka o wee rụpụta ihe dị nsọ.​—⁠Rom 6:⁠19.

Otú anyị si egosi na obi dị anyị ụtọ maka obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke meere anyị abụghị naanị na anyị agaghị akwa iko, ṅụbiga mmanya ókè ma ọ bụ mee mmehie ndị ọzọ ụfọdụ ndị mere na Kọrịnt. (1 Kọr. 6:​9-11) Ọ pụtaghị naanị na anyị agaghị akwa iko, kama ọ pụtakwara na anyị agaghị etinye aka ná ntụrụndụ rụrụ arụ. Ọ bụghị naanị na anyị anaghị aṅụbiga mmanya ókè, kama anyị anaghị aṅụ mmanya ruo mgbe ọ fọrọ obere ka o gbuwe anyị. O nwere ike ịbụ na anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị merie n’ọgụ anyị na-alụso omume ọjọọ ndị a. Ma, anyị ga-emerili n’ọgụ ahụ. Ihe anyị kwesịrị ibu n’obi bụ ka anyị ghara ime ma mmehie ndị dị oké njọ ma ndị e nwere ike iche na ha adịghị oké njọ. Anyị agaghị emetacha ihe niile. Ma, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike otú ahụ Pọl mere. Ọ gbara ụmụnna ya ume, sị: “Unu ekwela ka mmehie na-achị dị ka eze n’ahụ́ unu nke pụrụ ịnwụ anwụ ka unu wee na-erubere ọchịchọ ya isi.”​—⁠Rom 6:12; 7:​18-20. w16.12 1:​16, 19-21

Satọdee, Disemba 22

Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.​—⁠Gal. 5:​22, 23.

Jizọs kwere anyị nkwa na Nna anyị nke eluigwe ga-enye anyị mmụọ nsọ ma anyị rịọ ya. (Luk 11:​10-13) Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ àgwà ndị magburu onwe ha mmụọ nsọ na-enyere anyị aka ịna-akpa. E ji àgwà ndị a mara Chineke pụrụ ime ihe niile. (Kọl. 3:10) Ka ị na-amụta àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, gị na ndị ọzọ ga na-adịkwu ná mma. Ị ga-esi otú ahụ gbaara ọtụtụ ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ na-echegbu onwe ya ọsọ. O doro anya na ị ga-adị umeala n’obi ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịtụkwasị obi ‘n’aka dị ike nke Chineke’ na ‘ịtụkwasị Chineke nchegbu gị niile.’ (1 Pita 5:​6, 7) Ma, ịdị umeala n’obi ga-eme ka ị na-eme ihe ga-eme ka gị na Chineke na-adị ná mma, ya ana-akwadokwa gị. (Maị. 6:⁠8) Ọ bụrụ na ị ghọta na e nwere ihe ndị ị ga-emeli na ihe ndị ị na-agaghị emeli, o nwere ike ime ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị, n’ihi na ị ga-atụkwasị Chineke obi. w16.12 3:​7, 12

Sọnde, Disemba 23

Noa [bụ] onye na-ekwusa ezi omume.​—⁠2 Pita 2:⁠5.

Ebe Noa bụ “onye na-ekwusa ezi omume,” o ji obi ya niile kwusaa ozi ịdọ aka ná ntị Chineke dunyere ya. O doro anya na ozi ọma a o kwusara mere ka okwukwe ya sie ike. E wezụga ozi ọma o kwusara, o mere ihe niile o nwere ike ime iji rụọ ụgbọ Chineke gwara ya rụọ. (Hib. 11:⁠7) Anyị na-agbalị ‘inwe ọtụtụ ihe anyị na-arụ n’ọrụ Onyenwe anyị,’ otú ahụ Noa mere. (1 Kọr. 15:58) Ihe so n’ọrụ ndị ahụ bụ ịrụ ebe ndị anyị na-anọ efe Chineke, iso na-enye aka ná mgbakọ anyị dị iche iche, ịna-enye aka n’ọrụ a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ọfis ndị nsụgharị. Ma, nke kachanụ bụ na anyị na-ekwusa ozi ọma mgbe niile, ebe anyị ma na ọrụ a na-eme ka olileanya anyị nwere na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu sikwuo ike. N’eziokwu, ikwusa ozi ọma na-eme ka anyị kpebisikwuo ike na anyị agaghị ada mbà n’ọsọ ndụ anyị na-agba.​—⁠1 Kọr. 9:24. w17.01 1:​8, 9

Mọnde, Disemba 24

Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.​—⁠Gal. 6:⁠5.

Otu ihe dị mkpa bụ na anyị kwesịrị ịghọta na ọ bụ ndị ọzọ ka ọ dịịrị iji aka ha ekpebi ihe ha ga-eme, ọ bụghị anyịnwa ga-ekpebiri ha. Ebe ọ bụ na anyị niile nwere ikike ikpebiri onwe anyị ihe anyị ga-eme, ọ ga-esi ezigbo ike Ndị Kraịst abụọ ekpebie ime otu ihe. Ọ ga-esikwa ezigbo ike ha ekpebie otu ihe n’ihe banyere otú ha si akpa àgwà na otú ha si efe Chineke. Ọ bụrụ na anyị echeta na Onye Kraịst ọ bụla “ga-ebu ibu nke ya,” ọ ga-eme ka anyị ghọta na ọ bụ ha ka ọ dịịrị iji aka ha ekpebi ihe ha ga-eme, n’okwu ndị na-adịchaghị mkpa. (1 Kọr. 10:​32, 33) Jehova kere anyị niile otú anyị ga-enwe ike ịna-ekpebiri onwe anyị ihe anyị ga-eme. (2 Kọr. 3:17) Obi dị anyị ụtọ maka otú a o si kee anyị n’ihi na ọ na-eme ka anyị nwee ike ikpebi ihe ndị ga-egosi otú anyị hụruru Jehova n’anya. Ka anyị nọgide na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka otú a Chineke si kee anyị. Anyị ga-eme otú a ma anyị na-ekpebi ime ihe ndị dị ya mma, hapụkwa ndị ọzọ ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. w17.01 2:​15, 17, 18

Tuzdee, Disemba 25

Adịghịkwa m eme ihe ọ bụla n’uche nke aka m; kama m na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m.​—⁠Jọn 8:⁠28.

Ihe ga-eme ka ihe anyị na-amasị ndị ọzọ bụ ma anyị nwee ‘mmụọ dị jụụ, dịkwa nwayọọ,’ ọ bụghị ịna-etu ọnụ ma ọ bụ ịna-eme ka a hụchata anyị (1 Pita 3:​3, 4; Jere. 9:​23, 24) Ọ bụ otú anyị si ekwu okwu ma ọ bụ otú anyị si eme ka e si ama ma onwe anyị ọ̀ na-ebu anyị isi. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike malite ịna-agwa ndị ọzọ gbasara ihe ndị anyị na-arụ n’ọgbakọ, otú anyị si mara ihe na-aga n’ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ otú anyị na ụmụnna ndị a ma ama si bụrụ enyi. Ma ọ bụkwanụ, anyị nwere ike ikwu okwu otú ga-eme ka ndị ọzọ towe naanị anyị maka ihe anyị na ndị ọzọ mere. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Jizọs. Ebe o si nweta ọtụtụ n’ime ihe ndị o kwuru bụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. O kwuru ihe ndị a otú ga-eme ka ndị na-ege ya ntị mata na ha si n’aka Jehova, ọ bụghị n’echiche nke onwe ya. w17.01 4:⁠12

Wenezdee, Disemba 26

Erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.​—⁠Jen. 2:⁠17.

O siirighị Adam na Iv ike ịghọta iwu a. Irubere ya isi agaghịkwa eme ka ihe siere ha ike. A sị ka e kwuwe, ha agaghị erichali nri dị iche iche Chineke nyere ha. Setan bụ́ Ekwensu ji agwọ ghọgbuo Iv ka o nupụrụ Nna ya, bụ́ Jehova, isi. (Jen. 3:​1-5; Mkpu. 12:⁠9) Setan mere ka o yie ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ na Chineke gwara Adam na Iv ka ha ghara iri ‘mkpụrụ osisi niile dị n’ubi ahụ.’ Ọ dị ka à ga-asị na Setan na-ekwu, sị: ‘Ọ̀ pụtara na unu agaghị emeli ihe unu chọrọ ime?’ Ọ ghara ụgha chara acha, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.” Ọ gbalịrị ka Iv kweta na o kwesịghị ige Chineke ntị. Ọ sịrị ya: “Chineke maara na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe.” Setan kwuru na ihe mere Jehova ji sị ha erila mkpụrụ osisi ahụ bụ na ọ chọghị ka ha hụ ụzọ. Setan kwekwara Iv nkwa na-abụghị eziokwu, sị: “Unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.” w17.02 1:​8, 9

Tọzdee, Disemba 27

Jehova bụ́ Chineke gị ga-esi n’etiti ụmụnne gị họpụtara gị onye amụma nke dị ka mụ onwe m​—⁠ya ka unu ga-ege ntị.​—⁠Diut. 18:⁠15.

Aịzaya buru amụma na Onye a ga-abụ “onye ndú na ọchịagha.” (Aịza. 55:⁠4) Daniel si n’ike mmụọ nsọ dee banyere ọbịbịa “Mesaya bụ́ Onye Ndú.” (Dan. 9:25) Jizọs Kraịst mechara kwuo na ọ bụ ya bụ “Onye Ndú” ndị Chineke. (Mat. 23:10) Ndị na-eso ụzọ Jizọs ji obi ha niile na-eso ya, kwetasie ike na ọ bụ ya ka Jehova họọrọ. (Jọn 6:​68, 69) Gịnị mere ha ji kwetasie ike? Mgbe e mere Jizọs baptizim, Jọn Onye Na-eme Baptizim hụrụ ka “eluigwe na-ekewa, hụkwa ka mmụọ nsọ na-ebekwasị ya dị ka nduru.” (Mak 1:​10-12) N’oge niile Jizọs jere ozi ya n’ụwa, mmụọ nsọ Chineke nyere ya ike ịrụ ọrụ ebube na iji ikike Chineke nyere ya na-akụziri ndị mmadụ ihe. (Ọrụ 10:38) Mmụọ nsọ nyekwaara Jizọs aka ịhụ ndị ọzọ n’anya, inwe ọṅụ, na inwe okwukwe siri ike. (Jọn 15:9; Hib. 12:⁠2) O nweghị onye ndú ọzọ mere ihe gosiri na mmụọ nsọ nyere ya ike otú ahụ. O doro anya na ọ bụ Jehova họpụtara Jizọs ka ọ bụrụ Onye Ndú. w17.02 3:​15, 16

Fraịdee, Disemba 28

Na-echetanụ ndị na-edu ndú n’etiti unu.​—⁠Hib. 13:⁠7.

Na Pentikọst afọ 33, ndịozi Jizọs malitere iduzi ọgbakọ Ndị Kraịst. N’ụbọchị ahụ, “Pita biliri ọtọ, ya na ndịozi iri na otu ahụ,” ma zie ìgwè mmadụ ozi na-enye ndụ, ma ndị Juu ma ndị ha tọghatara atọghata. (Ọrụ 2:​14, 15) Ọtụtụ n’ime ha ghọrọ Ndị Kraịst. Mgbe e mechara, ndị ahụ chegharịrị ọhụrụ “nọkwa na-ege ntị n’ozizi ndịozi.” (Ọrụ 2:42) Ọ bụ ndịozi Jizọs na-ekwu ihe a ga-eji ego ọgbakọ mee. (Ọrụ 4:​34, 35) Ha na-akụziri ndị Chineke ihe, na-ekpekwa ekpere maka ha. Ha kwuru, sị: “Anyị ga-anọgidesi ike n’ikpe ekpere, na-ejekwa ozi banyere okwu Chineke.” (Ọrụ 6:⁠4) Ha họpụtara ụmụnna ma nke a na-akọ ka ha gaa kwusawa ozi ọma n’ebe a na-ekwusatụbeghị ya. (Ọrụ 8:​14, 15) Ka oge na-aga, ndị okenye ndị ọzọ e tere mmanụ so ndịozi bụrụ òtù na-achị isi na-eduzi ọgbakọ dị iche iche.​—⁠Ọrụ 15:⁠2. w17.02 4:4

Satọdee, Disemba 29

Na-enyenụ mmadụ niile ihe ruuru ha, . . . onye e kwesịrị ịsọpụrụ, sọpụrụnụ ya.​—⁠Rom 13:⁠7.

Ọ bụ mmụọ nke ụwa Setan na-eme ka ọtụtụ ndị na-ezughị okè na-akpa àgwà ọjọọ. Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji eme ụfọdụ ndị ka hà bụ chi kama ịkwanyere ha naanị ùgwù e kwesịrị ịkwanyere ha. Ha na-ebugo ndị isi chọọchị, ndị ọchịchị, ndị na-agba bọl, ndị na-eme fim, na ndị ọzọ a ma ama elu gafee ókè, na-emezi ha ka hà bụ chi. N’ihi ya, onye ukwu na onye nta na-eṅomi ihe ọ bụla ha na-eme, ma ihe ndị maara ha ahụ́ ma ejiji ha ma omume ha. Ezigbo Ndị Kraịst anaghị ewere ụdị ihe ahụ ka ịsọpụrụ mmadụ. Ọ bụ naanị Kraịst bụ mmadụ bitụrụla n’ụwa a anyị kwesịrị iṅomi ihe ọ bụla o mere. (1 Pita 2:21) Obi agaghị adị Chineke mma ma anyị na-asọpụrụ ndị mmadụ karịa otú anyị kwesịrị. Eziokwu anyị kwesịrị iburu n’obi bụ na “mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.” (Rom 3:23) N’eziokwu, e nweghị mmadụ ọ bụla e kwesịrị ịna-efe. w17.03 1:​6-8

Sọnde, Disemba 30

Obi Esa zuru ezu n’ụbọchị ya niile.​—⁠2 Ihe 15:⁠17.

Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike inyocha obi ya ka ọ mata ma ò ji obi ya niile na-efe Chineke. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ kpebisiri ike ime ihe dị Jehova mma, ịgbachitere ofufe ya, na ime ka ọgbakọ dị ọcha?’ Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ezinụlọ gị ma ọ bụ ezigbo enyi gị emehie ma jụ ichegharị, a chụọ ya n’ọgbakọ? Ị̀ ga-akwụsị gị na ya ịna-akpa? Gịnị ka obi gị ga-agwa gị mee? I nwere ike igosi na i ji obi gị niile na-efe Chineke otú ahụ Esa mere ma ị tụkwasị Chineke obi ma ndị mmadụ megidewe gị, ọ bụrụgodị na e nwere mgbe ụfọdụ i chere na ị gaghị edili ya. E nwere ike ịna-achọ gị okwu ma ọ bụ na-akwa gị emo n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ị bụ Onyeàmà Jehova. Ndị ọrụ ibe gị nwekwara ike ịna-akparị gị n’ihi na ị chọrọ iji abalị ole na ole gaa mgbakọ ma ọ bụkwanụ na ị naghị arụkarị ọrụ ma a gbasaa ọrụ. Ụdị ihe ahụ mee, kpeere Chineke ekpere otú ahụ Esa mere. (2 Ihe 14:11) Na-eme ihe dị mma. Cheta na Chineke nyeere Esa aka ma mee ka ọ dị ike. Ọ ga-emekwa ka ị dị ike. w17.03 3:​6-8

Mọnde, Disemba 31

Onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.​—⁠Ilu 21:⁠5.

Baịbụl gwara anyị na e nwee ihe dị mkpa anyị chọrọ ikpebi, na anyị ekwesịghị ikpebi ya ọkụ ọkụ. Anyị wepụta oge chee ihe niile gbasara ya, o nwere ike ime ka ihe anyị ga-ekpebi baara anyị uru. (1 Tesa. 5:21) Tupu onyeisi ezinụlọ ekpebie ihe ọ ga-eme, o kwesịrị iwepụta oge chọpụta ihe Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl kwuru gbasara ya, chọpụtakwa ihe ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ya chere gbasara ihe ahụ. Cheta na Chineke gwara Ebreham ka o gee nwunye ya ntị. (Jen. 21:​9-12) Ndị okenye kwesịkwara iwepụta oge na-eme nchọnchọ. Ha nwee ezi uche ma dị umeala n’obi, ha agaghị atụwa ụjọ na ndị ọzọ agaghịzi akwanyere ha ùgwù ma ha gbanwee ihe ha kpebiri n’ihi ihe ọhụrụ ha chọpụtara. Ha kwesịrị ịdị njikere ịgbanwe ihe ha chere na ihe ha kpebiri ime ma ọ dị mkpa. Anyị niile kwesịkwara ịna-eme ka ha. Ọ ga-eme ka udo dị n’ọgbakọ, ihe niile ana-agakwa siriri werere.​—⁠Ọrụ 6:​1-4. w17.03 2:16

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya