Jenụwarị
Tuzdee, Jenụwarị 1
Ndị na-eme ihe ọjọọ apụghị ịghọta ikpe ziri ezi.—Ilu 28:5.
Ndị ọjọọ ga-anọgide ‘na-epulite dị ka ahịhịa ndụ,’ ka ọgwụgwụ ụwa na-eru nso. (Ọma 92:7) N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na ọtụtụ ndị taa anaghị akpa àgwà otú Chineke chọrọ. Oleezi otú anyị ga-esi ‘bụrụ ụmụ ọhụrụ n’ebe ihe ọjọọ dị; ma bụrụ dimkpa n’ike ịghọta ihe’? (1 Kọr. 14:20) Ebe ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si zara ajụjụ a. Ebe ahụ kwukwara, sị: “Ndị na-achọ Jehova pụrụ ịghọta ihe niile,” ya bụ, ihe niile ga-enyere ha aka ime ihe dị Jehova mma. Ilu 2:7, 9 na-akụzikwara anyị na Jehova na-enye ndị na-eme ihe ziri ezi amamihe. N’ihi ya, ha nwere ike ‘ịghọta ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ, bụ́ ụzọ dum nke ihe dị mma.’ Noa, Daniel, na Job nwere ụdị amamihe ahụ. (Ezik. 14:14) Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị Chineke taa. Gịnwa kwanụ? Ị̀ ‘na-aghọta ihe niile’ ga-enyere gị aka ime ihe dị Jehova mma? Ihe kacha mkpa ga-enyere gị aka bụ ịmata Chineke nke ọma. w18.02 8 ¶1-3
Wenezdee, Jenụwarị 2
E mere ha baptizim n’aha Onyenwe anyị Jizọs.—Ọrụ 19:5.
Nne ma ọ bụ nna, onye na-amụrụ mmadụ ihe ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ n’ọgbakọ ekwesịghị ịmanye mmadụ ka o mee baptizim. Jehova anaghị eme otú ahụ. (1 Jọn 4:8) Kama, mgbe anyị na-akụziri ha ihe, anyị kwesịrị ịgwasi ha okwu ike ka ha gbalịa ka ha na Chineke dịrị n’ezigbo mma. Ihe ga-eme ka onye ahụ chọọ ka e mee ya baptizim bụ eziokwu ọ mụtara na otú o si agụsi ya agụụ ike ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs. (2 Kọr. 5:14, 15) E nweghị afọ ole mmadụ ga-anọ tupu a sị na o ruola ime baptizim. Mmadụ niile abụghị otu, ụfọdụ ndị a na-amụrụ Baịbụl na-eme nke ọma ngwa ngwa karịa ibe ha. Mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ n’ụbọchị a na-eme ya baptizim. Ụbọchị ahụ bụkwa ụbọchị onye ahụ na-eji eche banyere ihe mmadụ inyefe Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim pụtara. Mmadụ ime ihe niile o kwesịrị ime ka ezigbo Onye Kraịst abụghị obere ọrụ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji jiri mmadụ ịbụ onye na-eso ụzọ ya tụnyere ịnyara yok. Ndị na-eso ụzọ Jizọs agaghị adịrị ‘onwe ha ndụ ọzọ, kama ha ga-adịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ha, e wee kpọlite ya.’—2 Kọr. 5:15; Mat. 16:24. w18.03 6-7 ¶14-17
Tọzdee, Jenụwarị 3
Unu echefula ile ọbịa, n’ihi na site na ya, ụfọdụ lere ndị mmụọ ozi ọbịa n’amaghị ama.—Hib. 13:2.
Ò nwetụla mgbe o siiri gị ike ile ndị ọzọ ọbịa? Ya bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịbụ na ohere gị na ndị ọzọ gaara eji enwe obi ụtọ, metakwa ezigbo ndị enyi ga-adị mgbe ebighị ebi, funahụrụ gị. Ile ọbịa bụ otu n’ime ihe ndị e ji achụ owu ọmụma ọsọ. Ma, i nwere ike ịna-ajụ, sị, ‘Gịnị mere ile ọbịa ji esiri ụfọdụ ndị ike?’ E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịkpata ya. Otu ihe nwere ike ịkpata ya bụ na ndị ohu Jehova anaghị enwecha ohere, ha nwere ọtụtụ ọrụ ha na-arụ. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike na-eche na ha enweghị oge ma ọ bụ ike ha ga-eji lee ọbịa. Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, i nwere ike ilebagharị anya n’oge ị haziri i ji na-eme ihe ndị ị na-eme ugbu a. Ì nwere ike ime mgbanwe ụfọdụ ka i nwee ike inwe oge na ume ị ga-eji ele ọbịa ma ọ bụ gaa na nke ndị chọrọ ile gị ọbịa? Akwụkwọ Nsọ gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-ele ọbịa. Ọ dịghị njọ iwepụta oge lee ndị ọzọ ọbịa. Ọ bụ ihe anyị kwesịrị ịna-eme. Ka i nwee ike ime ya, i nwere ike ịhapụtụ ihe ụfọdụ na-adịchaghị mkpa ị na-eme. w18.03 16 ¶13-14
Fraịdee, Jenụwarị 4
Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.—Luk 4:43.
A bịa ná ndị niile dịrị ndụ n’ụwa, ònye kacha jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe? O doronụ anya na ọ bụ Jizọs. N’oge niile ọ dịrị ndụ n’ụwa ma jee ozi ya, o gosiri na ọ chọrọ ime ka Nna ya bụ́ Jehova. Jizọs chere echiche ka Jehova, kpaa àgwà ka ya, mee uche ya, ihe wutekwara ya otú o si ewute Jehova. (Jọn 8:29; 14:9; 15:10) Dị ka ihe atụ, jiri ihe Aịzaya kwuru gbasara ụdị ọmịiko Jehova nwere tụnyere ihe Mak kwuru gbasara ụdị ọmịiko Jizọs nwere. (Aịza. 63:9; Mak 6:34) Ànyị dị njikere mgbe ọ bụla inyere ndị nọ ná mkpa aka ma si otú ahụ na-eṅomi Jizọs? Ihe ọzọ bụ na Jizọs ji ndụ ya niile na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ ihe. Ihe ndị a niile o mere bụ ihe e ji ama onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. w18.02 21 ¶12
Satọdee, Jenụwarị 5
Na-azụlitenụ [ụmụ unu] n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.—Efe. 6:4.
Ịzụ ụmụ abụghị obere ọrụ, karịchaa, n’ụwa nke oge a. (2 Tim. 3:1-5) Mgbe a mụrụ ụmụaka, ha amaghị aka nri na aka ekpe. Ha nwere akọnuche, ma e kwesịrị ịzụ ya azụ. (Rom 2:14, 15) Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na okwu Grik e si sụgharịa “ịdọ aka ná ntị” nwere ike ịpụta “ịzụ nwatakịrị ka o too.” Ọ bụrụ na nne na nna azụọ ụmụ ha n’ihi na ha hụrụ ha n’anya, obi ga na-eru ụmụ ha ala. Ha na-amụta na ọ bụghị ihe niile ka a ga-ekwe ha mee, nakwa na mkpebi ọ bụla ha mere nwere ike ịbara ha uru ma ọ bụ ghọ ha ahịa. Ọ bụ ya mere ndị nne na nna ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi ka o nye ha amamihe ya. Cheta na otú e si azụ ụmụ n’otu obodo dị iche n’otú e si azụ ha n’obodo ọzọ. Otú e si zụọ ụmụ n’otu ọgbọ na-adị iche n’otú e si azụ ha n’ọgbọ ọzọ. Ọ bụrụ na ndị nne na nna egee Chineke ntị, ha ekwesịghị ịna-ajụ onwe ha mgbe niile banyere otú ha ga-esi na-azụ ụmụ ha, ha agaghịkwa atụkwasị obi n’amamihe nke ha. w18.03 30 ¶8-9
Sọnde, Jenụwarị 6
Jirinụ egwu na ịma jijiji na-eme ihe ga-ewetara unu nzọpụta.—Fil. 2:12.
Ebe ị bụ Onye Kraịst e merela baptizim, ọ bụ gị ga-eme ihe a ga-eji azọpụta gị, ọ bụrụgodị na gị na ndị mụrụ gị ka bi. Gịnị mere o ji dị mkpa ka i buru ya n’obi? Ọ bụ n’ihi na e nwere ihe ọhụrụ ndị ị ga na-eche nakwa nsogbu ọhụrụ ndị gị na ha na-alụ ugbu a ị na-erubeghị afọ iri abụọ. Otu nwa agbọghọbịa kwuru, sị: “Iwe agaghị ewe nwatakịrị bụ́ Onyeàmà Jehova n’ihi na ọ taghị keeki e ji cheta ụbọchị ọmụmụ n’ụlọ akwụkwọ ha. Ma, n’ime afọ ole na ole mgbe agụụ inwe mmekọahụ ga-agụsi ya ike, e kwesịrị ime ka o kwetasie ike na irubere iwu Jehova isi ga-akacha abara ya uru mgbe niile.” Ma ndị e mere baptizim mgbe ha torola eto na-enwe ọtụtụ nsogbu ha na-atụghị anya na ọ ga-abịara ha. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ nsogbu ndị a na-enwe na alụmdi na nwunye, ọrịa, ma ọ bụ inweta ọrụ. N’agbanyeghị afọ ndụ anyị, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịnọgide na-eme ihe dị Jehova mma ma nsogbu bịara anyị.—Jems 1:12-14. w17.12 24 ¶4-5
Mọnde, Jenụwarị 7
Weenụ iwe, ma unu emehiela.—Efe. 4:26.
Ọ bụ mmadụ ole na ole ka e merela ụdị ihe e mere Devid. Ma, enyi Chineke a anọghị na-ebu iwe n’obi. Kama, o kwuru, sị: “Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma; ewela iwe naanị iji mee ihe ọjọọ.” (Ọma 37:8) Ihe kacha mkpa mere anyị ga-eji “hapụ” iwe iwe bụ n’ihi na anyị na-eṅomi Jehova bụ́ onye na-adịghị “emeso anyị dị ka mmehie anyị si dị.” (Ọma 103:10) Ma e nwekwara uru ‘ịhapụ’ iwe iwe na-abara anyị. Iwe nwere ike ime ka mmadụ nwewa ọbara mgbali elu na nsogbu iku ume. O nwekwara ike ime ka imeju, anyịnya ma ọ bụ elò na ihe ndị na-eme ka nri na-agbari ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma. Iwe jide anyị, anyị anaghị echekarị echiche nke ọma. Mgbe ụfọdụ, iwe nwere ike ime ka anyị daa mbà n’obi ruo ogologo oge. Ma Baịbụl kwuru na “obi dị jụụ bụ ndụ anụ ahụ́.” (Ilu 14:30) Oleezi ihe anyị ga-eme ma nwanna kpasuo anyị iwe, oleekwa otú anyị na ya ga-esi eme udo? Otú anyị nwere ike isi eme ya bụ ime ihe Baịbụl kwuru. w18.01 10 ¶14-15
Tuzdee, Jenụwarị 8
Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m n’ime Shiol. Ị gaghị ekwe ka onye na-eguzosi ike n’ebe ị nọ banye n’olulu.—Ọma 16:10.
Devid anaghị ekwu na ya agaghị anwụ ma ọ bụ gaa n’ili. Okwu Chineke kwuru hoo haa na ọ kara nká ma nwụọ, nakwa na ‘o sooro nna nna ya hà dinaa, e wee lie ya n’Obodo Devid.’ (1 Eze 2:1, 10) N’ihi ya, ònye ka Abụ Ọma 16:10 na-ekwu banyere ya? Mgbe izu ole na ole gachara Jizọs nwụrụ, a kpọlite ya n’ọnwụ, Pita gwara ọtụtụ puku ndị Juu na ndị ha tọghatara atọghata okwu. (Ọrụ 2:29-32) O chetaara ha na Devid nwụrụ, e lie ya. Ndị Pita na-agwa okwu ma ihe a ọ na-ekwu. Ma Baịbụl agwaghị anyị na o nwere onye n’ime ha gbaghara ihe a Pita kwuru na Devid “hụrụ ya tupu oge eruo ma kwuo okwu banyere mbilite n’ọnwụ” Mesaya. Pita kwuru ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 110:1 iji mesie okwu ya ike. (Ọrụ 2:33-36) Otú ahụ Pita si jiri Baịbụl mee ka ihe ọ na-ekwu doo ìgwè mmadụ ahụ anya mere ka ha kweta na Jizọs bụ “Onyenwe anyị na Kraịst.” Ha ghọtara na Abụ Ọma 16:10 mezuru mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. w17.12 10 ¶10-12
Wenezdee, Jenụwarị 9
A gụrụ ihe niile ọnụ, tụọkwa ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, e mesịa, e dere ịdị arọ ha niile n’akwụkwọ n’oge ahụ.—Ezra 8:34.
Òtù Na-achị Isi kwesịrị ntụkwasị obi ma nweekwa uche n’otú ha si eji ego ndị mmadụ nyere n’onyinye eme ihe. (Mat. 24:45) Ha na-arịọ Jehova ka o nyere ha aka ime ezigbo mkpebi, na-akapị ihe ndị a chọrọ iji ego ndị ahụ eme ọnụ, jirikwa ha mee ha. (Luk 14:28) Pọl onyeozi ji ego ndị e nwetara n’onyinye nyere ụmụnna ndị nọ ná mkpa na Judia aka. Ọ hụrụ na ndị wegara ego ndị ahụ ‘mere ihe n’eziokwu, ọ bụghị naanị n’anya Jehova, kamakwa n’anya ụmụ mmadụ.’ (2 Kọr. 8:18-21) Taa, nzukọ Jehova na-eme ihe a Ezra na Pọl mere. Ha na-elezi anya n’otú ha si eji ego ndị mmadụ na-enye n’onyinye na-eme ihe. (Ezra 8:24-33) N’oge na-adịbeghị anya, e nweela ọtụtụ ọrụ ọhụrụ ndị a na-arụ. Nzukọ Jehova na-achọ ụzọ ha ga-esi ebelata ego ndị a na-emefu ma mee ka ọrụ dịkwuo mfe ka ha nwee ike iji ego ndị mmadụ ji obi ha niile na-enye n’onyinye mee ihe ndị kacha mkpa. w18.01 19-20 ¶12-13
Tọzdee, Jenụwarị 10
Kwenụ ka udo nke Kraịst na-achịkwa obi unu.—Kọl. 3:15.
Anyị hụ ụmụnna anyị n’anya ma nwee obiọma, anyị ga na-agbaghara ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwanna agwa anyị ma ọ bụ mee anyị ihe were anyị iwe, anyị nwere ike icheta mgbe anyị mekwara ndị ọzọ otú ahụ. Ọ̀ bụ na obi atọghị anyị ụtọ na ha gbaghaara anyị mgbe anyị mejọrọ ha? (Ekli. 7:21, 22) Ihe kacha atọ anyị ụtọ bụ na Kraịst mere ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. Anyị niile hụrụ otu Chineke ahụ n’anya, na-ekwusa otu ihe, ọtụtụ nsogbu ndị anyị na-enwe ka ụmụnna anyị na-enwekwa. Ọ bụrụ na anyị adị obiọma, hụ ụmụnna anyị n’anya ma na-agbaghara ha, ọgbakọ anyị ga na-adị n’otu. Ọ ga-emekwa ka ihe ọ bụla ghara imegharị anyị anya n’ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ. Ihe atụ ndị e nwere na Baịbụl na-echetara anyị na anyaụfụ nwere ike ime ka anyị ghara inweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ. Dị ka ihe atụ, Ken nweere nwanne ya Ebel anyaụfụ ma gbuo ya. Kora, Detan, na Abaịram nwekwaara Mozis anyaụfụ ma megide ya. Eze Sọl nweere Devid anyaụfụ n’ihi otú ihe si na-agara ya nke ọma ma gbalịa igbu ya. w17.11 27 ¶9-10
Fraịdee, Jenụwarị 11
Ị ga-achọgharịkwa ma sie imi n’ala, jụọkwa ase nke ọma.—Diut. 13:14.
Mgbe ọ bụla ndị okenye so na kọmitii ikpe, ha kwesịrị ịsa anya ná mmiri chọpụta ma Onye Kraịst ahụ ò chegharịala ma ọ bụ na o chegharịbeghị. Ma, ọ naghị adịcha mfe. Otú e si ama na onye ahụ echegharịala bụ otú o si ele ihe ahụ o mere anya, otú o si kpaa àgwà na otú obi dị ya. (Mkpu. 3:3) Ka e nwee ike meere onye mere mmehie ebere, ọ ga-echegharị. Jehova na Jizọs na-enyocha obi, ma ndị okenye anaghị enyocha obi. Ọ bụrụ na ị bụ okenye, olee otú ị ga-esi chọpụta na mmadụ echegharịala n’eziokwu? Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịrịọ Jehova ka o nye gị amamihe na nghọta. (1 Eze 3:9) Nke abụọ bụ ime nchọnchọ n’Okwu Chineke nakwa n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ebipụtara anyị ka i nwee ike ịmata ihe dị iche ná “mwute nke ụwa” na ‘mwute dị ka uche Chineke si dị,’ ya bụ, ezigbo nchegharị. (2 Kọr. 7:10, 11) Chọpụta otú Baịbụl si kọwaa ndị chegharịrị ná mmehie ha na ndị na-echegharịghị. Olee otú Baịbụl si kọwaa otú obi dị ha, àgwà ha, na otú ha si eche echiche? w17.11 17 ¶16-17
Satọdee, Jenụwarị 12
[Ụmụaka] ga-abụ . . . ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi.—2 Tim. 3:2.
Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, ọtụtụ akwụkwọ, fim na ihe omume tiivi ụfọdụ na-eme ka o yie ka ọ̀ dị mma ụmụaka inupụrụ ndị mụrụ ha isi, nke bụ́ eziokwu bụ na nnupụisi na-eme ka ezinụlọ ghara ịdị n’otu. Nke a na-akpakwa obodo aka ọjọọ. Kemgbe ụwa, ndị mmadụ ma na ihe a bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, na Gris oge ochie, mmadụ kụọ ndị mụrụ ya ihe, a ga-anapụ ya ihe niile ruuru ya dị ka nwa amaala. N’iwu ndị Rom, a na-ewere onye kụrụ nna ya ihe ka onye gburu ọchụ. Ma n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ma n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, a gwara ụmụaka ka ha na-asọpụrụ ndị mụrụ ha. (Ọpụ. 20:12; Efe. 6:1-3) Olee ihe ga-enyere ụmụaka aka ịna-erubere ndị mụrụ ha isi ọ bụrụgodị na ndị ọzọ anaghị eme otú ahụ? Ọ bụrụ na ha ana-echebara ihe ọma ndị mụrụ ha meere ha echiche, obi kwesịrị ịdị ha ụtọ, ya emee ka ha na-erubere ha isi. Ụmụaka kwesịkwara ịghọta na Chineke, bụ́ Nna anyị, chọrọ ka ha na-erubere ndị mụrụ ha isi. Ọ bụrụ na ụmụaka ana-ekwu okwu ọma banyere nne na nna ha, ụmụaka ibe ha ga-amụtakwa ịsọpụrụ ndị nne na nna nke ha. w18.01 29 ¶8-9
Sọnde, Jenụwarị 13
Onye nke ọ bụla ga-adị ka ebe izere ifufe na ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo, dị ka mmiri iyi ndị dị n’ala mmiri na-adịghị, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala kpọrọ nkụ.—Aịza. 32:2.
Taa, Onye Kraịst mere mmehie dị oké njọ kwesịrị ịga hụ ndị okenye ka ha nyere ya aka ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Gịnị mere nke a ji dị ezigbo mkpa? Nke mbụ bụ na ọ bụ Jehova mere ndokwa ka ndị okenye kpee Onye Kraịst mere mmehie dị oké njọ ikpe otú Okwu ya kwuru. (Jems 5:14-16) Nke abụọ bụ na ndị okenye ga-enyere onye mere mmehie dị oké njọ ma chegharịa aka ka ya na Chineke dịghachi ná mma, nakwa ka ọ ghara ime mmehie ahụ ọzọ. (Gal. 6:1; Hib. 12:11) Nke atọ bụ na a họpụtara ndị okenye ma kụziere ha ka ha mee ka obi sie onye mere mmehie ma chegharịa ike, nyekwara ya aka ka obi ghara ịna-ama ya ikpe. Jehova kpọrọ ndị okenye dị otú ahụ “ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo.” (Aịza. 32:2) O doro anya na ndokwa a bụ otu ụzọ Chineke si emere anyị ebere. Ọtụtụ ndị na-efe Chineke achọpụtala na ahụ́ ruru ha ala mgbe ha kọọrọ ndị okenye mmehie ha mere, ndị okenye enyere ha aka. w17.11 10 ¶8-9
Mọnde, Jenụwarị 14
Ịdọ aka ná ntị . . . [na-ewute ewute].—Hib. 12:11.
N’agbanyeghị otú o si wute anyị, anyị ekwesịghị ịna-akpọ onye ezinụlọ anyị a chụrụ n’ọgbakọ n’ekwentị, na-ezigara ya ozi n’ekwentị, na-edegara ya akwụkwọ ozi, na-ezigara ya ozi iimel, ma ọ bụ na-ezigara ya ozi n’Ịntanet mgbe ọ na-adịghị mkpa. Ma, adakwala mbà. Baịbụl kwuru na ịhụnanya “na-enwe olileanya ihe niile.” N’ihi ya, anyị nwere olileanya na otu ụbọchị, ndị ezinụlọ anyị a chụrụ n’ọgbakọ ga-alaghachikwute Jehova. (1 Kọr. 13:7) Ọ bụrụ na ị hụ na onye ezinụlọ unu a chụrụ n’ọgbakọ agbanwewala àgwà ya, i nwere ike ịrịọ Jehova ka e jiri Baịbụl gbaa ya ume, nakwa ka ọ nabata ihe a Jehova na-agwa anyị, ya bụ, ka anyị ‘Laghachikwute ya.’ (Aịza. 44:22) Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ịhụ ya n’anya karịa otú anyị hụrụ mmadụ ọ bụla n’anya. Jizọs kwetasiri ike na ndị na-eso ụzọ ya ga-akata obi na-erubere ya isi ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ ha na-enye ha nsogbu. Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ unu na-enye gị nsogbu n’ihi na ị na-eso Jizọs, tụkwasị Jehova obi. Na-arịọ ya ka o nyere gị aka idi ya. (Aịza. 41:10, 13) Ka obi na-atọ gị ụtọ na ihe ị na-eme na-atọ Jehova na Jizọs ụtọ, nakwa na ha ga-agọzi gị n’ihi na ị na-erubere ha isi. w17.10 16 ¶19-21
Tuzdee, Jenụwarị 15
Yirinụ obi ọmịiko . . . dị ka uwe.—Kọl. 3:12.
Anyị hụ ndị na-ata ahụhụ n’ihi ọrịa na ime agadi, anyị na-enwere ha ọmịiko. Anyị na-atụsi anya ike mgbe ọrịa na ime agadi na-agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụ ya mere anyị ji ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. Tupu mgbe ahụ, ka anyị mee ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọrịa na ndị agadi aka. E nwere ihe otu nwoke na-ede akwụkwọ kwuru banyere mama ya merela agadi. Mama ya na-arịa ọrịa na-eme ka ụbụrụ ghara ịkpakọ mmadụ ọnụ. Nwoke a kwuru na e nwere otu ụbọchị mama ya metọrọ ákwà ya. Mgbe ọ na-achọ ihicha ya, mgbịrịgba ụzọ ha kụrụ. Ndị pịrị mgbịrịgba ahụ bụ ụmụnna nwaanyị abụọ na-abịakarị na nke mama ya. Ha jụrụ ma è nwere ihe ha ga-enyere ha aka mee. Mama ya sịrị na “e nwere, ma o nwere otú ọ dị.” Ụmụnna nwaanyị ahụ nyeere ya aka hichaa ákwà ya. Ha meere ya tii ma soro ya kwurịta okwu. Obi tọrọ nwa ya ezigbo ụtọ, ya asị na Ndịàmà Jehova “na-eme ihe ha na-akụziri ndị mmadụ.” Ọmịiko ị na-enwere ndị ọrịa na ndị agadi, ọ̀ na-eme ka i mee ihe niile i nwere ike ime iji nyere ha aka?—Fil. 2:3, 4. w17.09 9 ¶5; 12 ¶14
Wenezdee, Jenụwarị 16
Ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya, ọ bụghị n’ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.—1 Jọn 3:18.
Anyị mewere ụmụnna anyị ihe ọma iji gosi na anyị hụrụ ha n’anya, anyị kwesịrị ime ya “na nzuzo,” ma o kwe omume. (Mat. 6:1-4) Anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ ndị ọzọ. (Rom 12:10) Jizọs sara ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya ma si otú ahụ kwanyere ha ùgwù. (Jọn 13:3-5, 12-15) Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-adị umeala n’obi ka Jizọs ma na-ejere ndị ọzọ ozi. Ndịozi Jizọs aghọtachaghị ihe ahụ o mere ruo mgbe ha natara mmụọ nsọ. (Jọn 13:7) Otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù bụ ma anyị ghara ịna-eche na anyị ka ha mma n’ihi na anyị gụrụ akwụkwọ karịa ha, baa ọgaranya ma ọ bụ nwee ọrụ pụrụ iche anyị na-arụ n’ọgbakọ karịa ha. (Rom 12:3) Kama ịna-enwere ndị a na-eto anyaụfụ, anyị kwesịrị iso ha ṅụrịa ọṅụ ọ bụrụgodị na anyị chere na e kwesịkwara ito anyị. w17.10 9 ¶9-10
Tọzdee, Jenụwarị 17
Ana m eme ihe niile n’ihi ozi ọma, ka m wee bụrụ onye na-ezisara ya ndị ọzọ.—1 Kọr. 9:23.
Ọtụtụ ndị achọpụtala na ịgụrụ ndị ha na-ezi ozi ọma Baịbụl na-eme ka ozi ọma a na-ezi ha ruo ha n’obi. Dị ka ihe atụ, otu nwanna laghachiri na nke otu nwoke katarala ahụ́ o ziri ozi ọma. Nwoke a agụọla magazin anyị ọtụtụ afọ. Kama nwanna ahụ inye ya naanị Ụlọ Nche ọhụrụ, ọ gụụrụ ya amaokwu Baịbụl dị n’Ụlọ Nche ahụ. Ọ gụụrụ ya 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4, bụ́ ebe sịrị: “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile . . . na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.” Ebe a a gụụrụ ya na Baịbụl ruru agadi nwoke ahụ n’obi, ya agwa nwanna ahụ ka ọ gụọ ya ọzọ. Nwoke ahụ gwara nwanna ahụ na ya na nwunye ya chọrọ ihe ga-akasi ha obi. Ebe ahụ a gụụrụ ya mere ka ọ chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl na-ekwu. Ọ̀ bụ na i kwetaghị na Okwu Chineke na-akpa ike n’ozi ọma?—Ọrụ 19:20. w17.09 26 ¶9-10
Fraịdee, Jenụwarị 18
Matịa aka gị metụ ọbụna ọkpụkpụ ya na anụ ahụ́ ya, lee ma ọ́ gaghị akọcha gị n’ihu gị.—Job 2:5.
Ọ ga-abụ na ihe a Setan mere were ndị mmụọ ozi iwe, ma mee ka ha kpọọ ya asị. Ma, Jehova jidere onwe ya, meekwa ihe kwesịrị ekwesị. Kemgbe ahụ, ọ nọkwa na-eme ihe kwesịrị ekwesị nakwa ihe ndị gosiri na ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ. (Ọpụ. 34:6; Job 2:2-6) Maka gịnị? Jehova hapụrụ ka oge gaa n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama “ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) Otú Jehova si jide onwe ya na-akụziri anyị na tupu anyị ekwuo okwu ma ọ bụ mee ihe, anyị kwesịrị ichebara ya echiche ma ghara ime ihe ọkụ ọkụ. Ọ bụrụ na e nwere ihe dị mkpa ị chọrọ ikpebi ime, buru ụzọ chebara ya echiche. Rịọ Jehova ka o nye gị amamihe ị ga-eji kwuo ma ọ bụ mee ihe kwesịrị ekwesị. (Ọma 141:3) Ọ na-adịrị anyị mfe ime ihe anyị na-ekwesịghị ime ma a kpasuo anyị iwe. Ọtụtụ n’ime anyị akwaala mmakwaara mgbe anyị kwuchara okwu ma ọ bụ mee ihe n’echeghị echiche.—Ilu 14:29; 15:28; 19:2. w17.09 4 ¶6-7
Satọdee, Jenụwarị 19
Kpuwe [okpueze] n’isi Jọshụa nwa Jehọzadak bụ́ nnukwu onye nchụàjà.—Zek. 6:11.
Okpueze a e kpuwere Jọshụa, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà, ò mere ka ọ bụrụ eze? Mba. Jọshụa esighị n’ezinụlọ Eze Devid, n’ihi ya, o kwesịghị ịbụ eze. Okpueze e kpuwere Jọshụa nọchiri anya okpueze a ga-ekpuwe onye ga-abụ eze mgbe ebighị ebi na onye nchụàjà. A kpọrọ onye nchụàjà ahụ ga-abụ eze Ome. Baịbụl kwuru na Ome a bụ Jizọs Kraịst. (Aịza. 11:1; Mat. 2:23) Jizọs bụ ma Eze ma Nnukwu Onye Nchụàjà. Ọ bụ ya na-edu ndị mmụọ ozi Jehova. Ọ na-arụsikwa ọrụ ike iji hụ na ọ na-echebe ndị Jehova n’agbanyeghị tigbuo zọgbuo juru n’ụwa a. (Jere. 23:5, 6) N’oge na-adịghị anya, Kraịst ga-emeri ụwa a iji kwado ọchịchị Chineke na ichebe ndị na-efe Jehova. (Mkpu. 17:12-14; 19:11, 14, 15) Ma, tupu ya ebibie ụwa a, Jizọs ma ọ bụ Ome nwere nnukwu ọrụ ọ ga-arụ. w17.10 29 ¶12-14
Sọnde, Jenụwarị 20
Yipụnụ mmadụ ochie ahụ na omume ya.—Kọl. 3:9.
Gịnị ka ị ga-eme ma uwe gị ruo unyi, na-esikwa ísì? Ị ga-eyipụ ya ozugbo. Otú ahụ ka ọ dị ma anyị mata na anyị na-eme ihe na-adịghị Jehova mma, anyị kwesịrị ịgbanwe n’egbughị oge otú ahụ Pọl gwara Ndị Kraịst n’oge ya ka ha mee. Ọ sịrị ha: “Wepụnụ ha niile n’ebe unu nọ.” Otu mmehie so ná mmehie Pọl kwuru banyere ha bụ ịkwa iko. (Kọl. 3:5-9) Na Baịbụl, ihe so ‘n’ịkwa iko’ bụ mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ na nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị. Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha ‘mee ka akụkụ ahụ́ ha nwụọ,’ ya bụ, ka ha wepụ ọchịchọ ọ bụla gbasara “ịkwa iko.” Ihe Pọl kwuru mere ka o doo anya na anyị kwesịrị ịgbalịsi ike wepụ ụdị ọchịchọ ahụ. Ma, anyị ga-emerili n’ọgụ anyị na-alụso ihe na-agụ anụ ahụ́ anyị agụụ. w17.08 18 ¶5-6
Mọnde, Jenụwarị 21
M ga-echere Chineke nke nzọpụta m.—Maị. 7:7.
Nsogbu ndị anyị na-ahụ ugbu a yiri ụdị nsogbu e nwere n’oge Maịka onye amụma. Maịka dịrị ndụ n’oge eze ọjọọ bụ́ Ehaz na-achị. N’oge ahụ, ihe ọjọọ nọ na-arị ibe ya elu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị mmadụ nọ na-eme ‘ihe ọjọọ, na-emeta ya nke ọma.’ (Maị. 7:1-3) Maịka ma na ya agaghị ejili aka ya mee ka nsogbu ndị ahụ kwụsị. Anyị nwee okwukwe ka Maịka, anyị ga-eji obi anyị niile chere Jehova. Anyị adịghị ka onye mkpọrọ na-eche mgbe a ga-egbu ya. Ọ ga-echere, ma ọ̀ chọrọ ma ọ chọghị. Ma, ọ gaghị adị ya ka ụbọchị ahụ ruo eruo. Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị anyị. Anyị dị njikere ichere Jehova n’ihi na anyị ma na oge ruo, ọ ga-enye anyị ndụ ebighị ebi ahụ o kwere anyị ná nkwa. Ọ bụ ya mere anyị ji jiri “ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.” (Kọl. 1:11, 12) Mgbe anyị na-echere, anyị ekwesịghị ịna-atamu ntamu na Jehova na-egbu oge. Anyị mee otú ahụ, obi agaghị adị ya mma.—Kọl. 3:12. w17.08 4 ¶6-7
Tuzdee, Jenụwarị 22
Jehova na-enyere ndị dị umeala n’obi aka.—Ọma 147:6.
Gịnị ka anyị ga-eme ka Jehova nyere anyị aka? Anyị na ya kwesịrị ịdị n’ezigbo mma. Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ka anyị na ya nwee ike ịdị ná mma. (Zef. 2:3) Ndị dị umeala n’obi na-echere Chineke ka ọ kwụsị mmegbu a na-emegbu ha na ahụhụ ha na-ata. Jehova na-ele ndị dị otú ahụ anya ọma. Ma, Chineke “na-ewedaru ndị ajọ omume ala.” (Ọma 147:6b) Anyị achọghị ka Chineke mee anyị otú ahụ. Anyị chọrọ ka ọ hụ anyị n’anya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpọ ihe ọ kpọrọ asị asị. (Ọma 97:10) Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịkpọ mmekọahụ rụrụ arụ asị. Ọ pụtara na anyị kwesịrị ịgbara ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị kwaa iko ọsọ, ma ile ndị gba ọtọ. (Ọma 119:37; Mat. 5:28) O nwere ike isiri anyị ike. Ma, anyị kwesịrị ịgba mbọ mee ya n’ihi na ọ ga-eme ka Jehova gọzie anyị. Anyị agaghị emerili n’ọgụ a n’ike nke onwe anyị. Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. Anyị kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka. w17.07 19-20 ¶11-13
Wenezdee, Jenụwarị 23
Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe.—Ilu 19:17.
Iji ihe anyị nwere na-akwado ihe gbasara Alaeze Chineke na-eme ka anyị nwee ike ịna-enyere ndị ọzọ aka. Ụfọdụ ụmụnna nwere ego, ma ha agaghị abụli ndị ozi oge niile ma ọ bụ kwaga mba ọzọ ịga kwusawa ozi ọma. Obi na-adị ha ụtọ ịmata na a na-eji onyinye ha enyere ndị ọzọ na-ekwusa ozi ọma aka. A na-ejikwa onyinye si ndị mmadụ n’obi ebipụta ma na-ekesa akwụkwọ anyị, na-akwadokwa ozi ọma a na-ekwusa n’obodo ebe ọtụtụ ndị dara ogbenye, ma ọtụtụ ndị ana-abata n’ọgbakọ. Kemgbe ọtụtụ afọ, Baịbụl na-ada oké ọnụ n’obodo ndị dị ka Kongo, Madagaska, na Rụwanda. Mgbe ụfọdụ, ihe a na-eji azụta otu bụ ego mmadụ rụtara n’otu izu ma ọ bụdị n’otu ọnwa. Ọtụtụ mgbe, ụmụnna anyị na-eche ma ọ̀ bụ ha were ego ha gaara eji zụtara ezinụlọ ha nri zụrụ Baịbụl. Ugbu a, onyinye ọtụtụ ndị na-enye emeela ka nzukọ Jehova na-asụgharị Baịbụl, na-ekesakwa ya ka onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ nwee nke ya, ndị a na-amụrụ ihe enweekwa nke ha. A na-esi otú ahụ enwe “ịha nhata” n’ihe gbasara onyinye ụmụnna na-enye.—2 Kọr. 8:13-15. w17.07 9 ¶11
Tọzdee, Jenụwarị 24
Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.—Ilu 27:11.
Gịnị mere ichebara uru irubere Jehova isi bara echiche ga-eji kasie anyị obi? Ọ bụ n’ihi na e nwere uru ọnwụnwa bịaara anyị ga-aba. Ọ naghị egosi na Jehova na-ewesa anyị iwe. Kama, ọ na-eme ka anyị nwee ike igosi na anyị na-akwado ọchịchị Chineke. Ntachi obi anyị na-eme ka ihe anyị “dị Chineke mma,” na-emekwa ka olileanya anyị sikwuo ike. (Rom 5:3-5) Akụkọ Job na-eme ka o doo anya na “Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu, na-emekwa ebere.” (Jems 5:11) N’ihi ya, ka obi sie anyị ike na ọ ga-agọzi anyị na ndị niile na-akwado ọchịchị ya. Ịmata ihe a ga-enyere anyị aka ‘ịtachi obi n’ụzọ zuru ezu, jirikwa ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.’ (Kọl. 1:11) O doro anya na ọ naghị adị mfe ilekwasị anya n’otú anyị ga-esi na-akwado ọchịchị Jehova. N’ihi ya, nsogbu siri ike bịara anyị, anyị kwesịrị ịna-echeta mgbe niile na ọ dị mkpa ka anyị kwado ọchịchị Chineke. w17.06 26 ¶15-16
Fraịdee, Jenụwarị 25
Lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla.—Luk 12:15.
Ihe ọgbara ọhụrụ na-agba ọtụtụ ndị ara, ma efe ma ekwentị ma kọmputa ma ihe ndị ọzọ. N’ihi ya, Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịna-eme, ya nọtụ, ya echebara onwe ya echiche, ma jụọ onwe ya, sị: ‘Ihe onwunwe ọ̀ dịla m mkpa ruo nke na m na-ewepụta oge ime nchọnchọ gbasara ụgbọala ma ọ bụ uwe ndị pụtara ọhụrụ, na-echekwa banyere ha karịa otú m na-eme n’ihe gbasara ịkwado ọmụmụ ihe? Mere nke a mere nke ọzọ ò meela ka m ghara ịna-enwe ohere ikpe ekpere ma ọ bụ ịna-agụ Baịbụl?’ Anyị chọpụta na anyị jizi ihe onwunwe kpọrọ ihe karịa Jizọs, anyị kwesịrị icheta ihe a Jizọs kwuru e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Jizọs kwuru na mmadụ agaghị abụli ‘ohu nna ukwu abụọ.’ O kwukwara, sị: “Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” Ihe kpatara ya bụ na “nna ukwu” nke ọ bụla chọrọ ka anyị fee naanị ya. (Mat. 6:24) Ebe anyị na-ezughị okè, anyị niile kwesịrị ịna-alụso “ọchịchọ anụ ahụ́ anyị” ọgụ, ma ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ.—Efe. 2:3. w17.05 25-26 ¶15-16
Satọdee, Jenụwarị 26
Ana m eme ihe niile n’ihi ozi ọma, ka m wee bụrụ onye na-ezisara ya ndị ọzọ.—1 Kọr. 9:23.
Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị dị ka ite ájá. Ma ozi ọma anyị na-ekwusa dị ka akụ̀ bara ezigbo uru n’ihi na o nwere ike ime ka anyị na ndị anyị na-ezi ya nweta ndụ ebighị ebi. Otú Pọl onyeozi si jiri ozi ọma kpọrọ ihe mere ka ọ gbasie mbọ ike ịkụziri ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. (Rom 1:14, 15; 2 Tim. 4:2) O nyeere ya aka ịtachi obi mgbe a na-echi ya ọnụ n’ala. (1 Tesa. 2:2) Olee otú anyị ga-esi jiri ozi ọma kpọrọ ihe otú ahụ o mere? Otú ọzọ Pọl si gosi na o ji ozi ọma kpọrọ ihe bụ iji ohere ọ bụla zie ndị ọzọ ozi ọma. Anyị na-ezi ozi ọma mgbe anyị na-anọghị n’ozi ọma, n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, nakwa n’ụlọ n’ụlọ otú ahụ ndịozi na Ndị Kraịst oge mbụ mere. (Ọrụ 5:42; 20:20) O kwe anyị omume, anyị ga-achọ ụzọ anyị ga-esi jekwuoro Jehova ozi. Anyị nwere ike ịsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ ghọọ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Anyị nwekwara ike ịmụ asụsụ ọzọ, kwaga ebe ọzọ n’obodo anyị ma ọ bụkwanụ n’obodo ọzọ.—Ọrụ 16:9, 10. w17.06 10-11 ¶8-9
Sọnde, Jenụwarị 27
E wepụkwara ugwu niile na agwaetiti niile n’ọnọdụ ha.—Mkpu. 6:14.
Ọ bụghị ndị mmadụ n’otu n’otu na-akpata ọtụtụ ihe ọjọọ na-eme taa, kama ọ bụ òtù dị iche iche na-arụrụ aka. Chegodị banyere okpukpe ụgha ndị na-agwa ọtụtụ nde mmadụ ihe na-abụghị eziokwu gbasara Chineke na ihe ga-eme ụwa na ụmụ mmadụ n’ọdịnihu, na-ekwukwa na a gaghị atụkwasịli Baịbụl obi nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-abụghị eziokwu. Cheekwa banyere ọchịchị ndị na-akpata agha na igbu ndị agbụrụ ọzọ, na-emegbu ndị ogbenye na ndị na-enweghị ka ọ hà ha, na-akwadokwa iri ngarị na ile mmadụ anya n’ihu. E nwekwara ụlọ ọrụ ndị na-emetọsị ikuku na mmiri n’ihi anyaukwu, na-emebi akụ̀ ndị Chineke nyere ụmụ mmadụ n’ụwa, na-erigbukwa ọtụtụ ndị na-azụ ihe ha na-emepụta ka mmadụ ole na ole bụ́ ndị aka ji akụ̀ nwekwuo ego, ndị bụ́ ogbenye ọnụ ntụ abụrụ ájá dị n’ala. Baịbụl buru amụma na a ga-ebibi ọchịchị na òtù dị iche iche na-akwado ha, nakwa ndị niile na-anaghị akwado Alaeze Chineke.—Jere. 25:31-33. w17.04 11 ¶7-8
Mọnde, Jenụwarị 28
Agaghị m eweta ọdachi ahụ n’ụbọchị ya.—1 Eze 21:29.
Jehova, bụ́ onye “na-enyocha obi,” meere Ehab ebere. (Ilu 17:3) Olee otú ihe a Jehova mere dị ndị ma ihe ahụ jọgburu onwe ya Ehab mere? Otú Jehova si gbanwee ihe o kpebiri ime Ehab nwere ike ime ka a mata ma ndị ikwu Nebọt na ndị enyi ya hà tụkwasịrị Chineke obi. Ọ bụrụ na ha tụkwasịrị ya obi, ịdị umeala n’obi ga-echebe ha, mee ka ha jiri obi ha niile na-efe ya, obi esiekwa ha ike na ọ gaghị ekpeli ikpe na-ezighị ezi. (Diut. 32:3, 4) Nebọt, ụmụ ya, na ndị ikwu ya ga-ahụ ikpe ziri ezi zuru okè mgbe Jehova ga-akpọlite ndị ezi omume n’ọnwụ. (Job 14:14, 15; Jọn 5:28, 29) Onye dị umeala n’obi na-echetakwa na “ezi Chineke ga-ekpe ụdị ọrụ niile ikpe, tinyere ihe niile zoro ezo, iji kpebie ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ.” (Ekli. 12:14) N’eziokwu, Jehova kpewe ikpe, ọ na-echebara ihe ndị anyị na-amaghị echiche. N’ihi ya, ịdị umeala n’obi na-eme ka ndị aka ha dị ọcha ghara ịkwụsị ịtụkwasị Jehova obi. w17.04 24 ¶8-9
Tuzdee, Jenụwarị 29
Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile.—Ilu 17:17.
N’ihi ihe ndị na-eme n’ụwa, ọtụtụ ụmụnna anyị aghọọla ndị gbara ọsọ ndụ. Ọ naghị adị mfe. Chegodị otú ha ga-esi na-agbalị ịmụta ihe niile otu mgbe, ya bụ, asụsụ ndị ebe ahụ, omenala ha, na iwu ndị gbasara ịkwụ ụtụ isi, ụgwọ ọkụ na ụgwọ ihe ndị ọzọ, ịga ụlọ akwụkwọ, na ịzụ ụmụ. Ị̀ ga-ejili ndidi nyere ụmụnna ndị a aka n’akparịghị ha? (Fil. 2:3, 4) Mgbe ụfọdụ, ndị ọchịchị na-eme ka o siere ụmụnna ndị gbara ọsọ ndụ ike ịkpọtụrụ ọgbakọ dị n’ebe ha gbagara. Ụfọdụ ụlọ ọrụ ndị na-enyere ndị gbara ọsọ ndụ aka na-ekwu na ha ga-akwụsị inyere ụmụnna anyị aka ma ọ bụ jụ ịnabata ha n’obodo ha ma ha jụ ịrụ ọrụ ga-egbochi ha ịna-aga ọmụmụ ihe. Ụfọdụ ụmụnna ekwetala ịrụ ụdị ọrụ ahụ n’ihi ụjọ nakwa n’ihi na ha amaghị ihe ọzọ ha ga-eme. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịga hụ ụmụnna anyị gbatara ọsọ ndụ ozugbo ha rutere. Anyị kwesịrị ime ka ha ghọta na anyị hụrụ ha n’anya. Okwukwe ha nwere ike isikwu ike ma anyị nweere ha ọmịiko, nyekwara ha aka.—Ilu 12:25. w17.05 5 ¶9-10
Wenezdee, Jenụwarị 30
Ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.—Mat. 24:12.
Otu n’ime ihe ndị Jizọs kwuru a ga-eji mata “ọgwụgwụ usoro ihe a” bụ na ‘ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụ oyi.’ (Mat. 24:3) N’oge ndịozi Jizọs, ndị Juu kwuru na ha na-efe Chineke, ma ha kwere ka ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ nyụọ ka ọkụ. Ma, ọtụtụ Ndị Kraịst n’oge ahụ ji obi ha niile “na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst,” na-emekwa ihe gosiri na ha hụrụ Chineke, Ndị Kraịst ibe ha, na ndị na-ekweghị ekwe n’anya. (Ọrụ 2:44-47; 5:42) Ma, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ahụ kwere ka ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ nyụọ ka ọkụ. Mgbe Jizọs laghachichara n’eluigwe, ọ gwara ọgbakọ dị n’Efesọs, sị: “Ihe i mere nke na-adịghị m mma bụ na ị hapụwo ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ.” (Mkpu. 2:4) Gịnị mere o ji gwa ha ihe a? O nwere ike ịbụ na Ndị Kraịst ndị ahụ kwere ka ndị ụwa mee ka ha mewe ihe anụ ahụ́ ha chọrọ.—Efe. 2:2, 3. w17.05 17 ¶1-3
Tọzdee, Jenụwarị 31
Mezuo nkwa i kwere Jehova.—Mat. 5:33.
Jefta bụ onye ndú obi kara na onye agha na-anaghị atụ egwu. Hana, bụ́ nwunye Elkena, abụrụ nwaanyị dị umeala n’obi, onye na-elekọta di ya na ụlọ ya nke ọma. E wezụga na ha abụọ fere otu Chineke, è nwere ihe ọzọ ha mere? Onye nke ọ bụla kwere Chineke nkwa. Ha abụọ mezukwara nkwa ha kwere. Ihe ha mere kwesịrị ịkụziri ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị kwere Jehova nkwa taa ihe. Na Baịbụl, mmadụ ikwe Chineke nkwa pụtara na onye ahụ ji obi ya niile gwa Chineke na ya ga-arụrụ ya ọrụ, nye ya onyinye, jeere ya ozi, ma ọ bụ ghara ime ihe ụfọdụ. A naghị amanye mmadụ amanye ikwe ụdị nkwa ahụ. Onye ọ bụla na-eji aka ya ekwe ya. Ma, Chineke na-ewere ya ka ihe dị nsọ na ihe onye kwere ya ga-emezurịrị n’ihi na ọ dị ka ebe mmadụ ṅụrụ iyi na e nwere ihe ọ ga-eme ma ọ bụ ihe ọ na-agaghị eme.—Jen. 14:22, 23; Hib. 6:16, 17. w17.04 3 ¶1-2