Jun
Satọdee, Jun 1
Chineke bụ ịhụnanya.—1 Jọn 4:16.
Jehova na-agbazi anyị, na-akụziri anyị ihe ma na-azụ anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ihe mere o ji na-eme ya bụ ka anyị na ya nọgide na-adị ná mma, nakwa ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi. Ma, mgbe ụfọdụ, ịdọ aka ná ntị abụghị naanị inye mmadụ ndụmọdụ. Ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie dị oké njọ, o nwere ike ime ka ọ ghara iru eru ime ihe ụfọdụ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, ọ na-egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike inyere onye ahụ aka ịghọta na o kwesịrị ịna-ewepụtakwu oge na-amụ Baịbụl, na-echebara ihe ọ na-amụ echiche ma na-ekpe ekpere. Ime otú ahụ ga-eme ka adịm ná mma ya na Jehova sikwuo ike. (Ọma 19:7) Ka oge na-aga, o nwekwara ike iru eru ime ihe ndị ahụ ọ na-emebu. Ịchụ mmadụ n’ọgbakọ na-egosikwa na Jehova hụrụ onye ahụ n’anya n’ihi na ọ ga-eme ka ndị nọ n’ọgbakọ ghara ịmụta àgwà ọjọọ ahụ. (1 Kọr. 5:6, 7, 11) Ebe Chineke na-adọ anyị aka ná ntị otú kwesịrị ekwesị, ịchụ mmadụ n’ọgbakọ na-enyere onye ahụ aka ịghọta otú ihe o mere jọruru ná njọ, nyekwara ya aka ichegharị.—Ọrụ 3:19. w18.03 24 ¶5-6
Sọnde, Jun 2
E mekwara ha niile baptizim, ya na ndị ezinụlọ ya, n’egbughị oge.—Ọrụ 16.33.
Onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ amaghị nke a na-akọ n’Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, o kwesịrị ịmụta ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi, ghọtakwa ihe mmadụ ịbụ onye na-efe Chineke pụtara, ma kpebisie ike ịna-erube isi n’ihe Jizọs na-akụzi. Ihe ndị ọ mụtara n’obere oge ahụ a kụziiri ya ihe, nakwa otú obi si na-atọ ya ụtọ mere ka o mee baptizim. (Ọrụ 16:25-33) O doro anya na ọ nọgidere na-amụ Okwu Chineke mgbe o mechara baptizim. Gịnị ka ihe a merenụ ga-eme ka i mee ma nwa gị gwa gị na ya chọrọ ime baptizim n’ihi na ọ mụtala ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi, dị ka ihe mmadụ inyefe Chineke onwe ya na ime baptizim pụtara? I nwere ike ịgwa ya ka ọ gaa kọọrọ ndị okenye ka ha mara ma ò ruru eru ime baptizim. Mgbe o mechara baptizim, ọ ga na-amụ banyere Jehova n’oge niile ọ dị ndụ, ruodị mgbe ebighị ebi, otú ahụ ndị ọzọ e mere baptizim na-eme.—Rom 11:33, 34. w18.03 10 ¶8-9
Mọnde, Jun 3
Nwee . . . ụdị echiche ahụ Kraịst Jizọs nwere.—Rom 15:5.
Ọ bụrụ na anyị agbalịa jiri ofufe Chineke kpọrọkwuo ihe, mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka ịgbanwe otú anyị si eche echiche. Ọ ga-eme ka anyị jiri nwayọọ nwayọọ mụta iche echiche ka Kraịst. Ọ ga-enyekwara anyị aka iwepụ ihe ọjọọ anyị na-eche, meekwa ka anyị na-akpa àgwà ndị dị Chineke mma. Ọ bụrụ na anyị ana-eche echiche ka Kraịst, ọ ga-enyere anyị aka n’otú anyị si ekwu okwu, n’otú anyị si akpa àgwà n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, nakwa n’otú anyị si ekpebi ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị. Ihe ndị ahụ anyị kpebiri ime ga-egosi na anyị na-agbalị ime ka Kraịst. Ebe anyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, anyị achọghị ka ihe ọ bụla mebie adịm ná mma anyị na Jehova. Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, ịkpa àgwà ka Kraịst ga-enyere anyị aka ịgbara ọnwụnwa ahụ ọsọ. Tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eme, anyị kwesịrị ichebara ajụjụ ndị a echiche: ‘Olee ihe Baịbụl kwuru nke ga-enyere m aka? Olee ihe Kraịst ga-eme n’ụdị ihe a? Olee ihe ga-atọ Jehova ụtọ?’ w18.02 25 ¶12; 26 ¶14
Tuzdee, Jun 4
Ihe Noa masịrị Jehova.—Jen. 6:8.
N’oge nna nna ochie Noa bụ́ Inọk dịrị ndụ, ndị mmadụ na-akpa àgwà ọjọọ hie nne. Ha na-ekwudị ihe “na-awụ akpata oyi” gbasara Jehova. (Jud 14, 15) Ime ihe ike nọ na-arị ibe ya elu. Ma, mgbe o ruru n’oge Noa, ‘ụwa jupụtara n’ime ihe ike.’ Ụfọdụ ndị mmụọ ozi bịara n’ụwa, dịrị n’ụdị mmadụ ma lụrụ ụmụ nwaanyị. Ha mụtara ụmụ obi fere azụ ma na-eme ihe ike. (Jen. 6:2-4, 11, 12) Ma, Noa dị iche. “Ọ bụ onye na-enweghị ntụpọ n’etiti ndị ya na ha dịkọrọ ndụ. Noa so ezi Chineke jee ije.” (Jen. 6:9) Chegodị ihe ihe a Baịbụl kwuru na-akụziri anyị banyere nwoke ezi omume a. Nke mbụ, Noa so Chineke jee ije n’ụwa ọjọọ ahụ tupu iju mmiri. Ọ bụghị naanị afọ iri asaa ma ọ bụ afọ iri asatọ ka o biri n’ụwa ahụ, kama, o biri ihe fọrọ obere ka o ruo narị afọ isii. (Jen. 7:11) Nke abụọ bụ na Noa enweghị ọgbakọ ga-enyere ya aka ma ọ bụ gbaa ya ume otú anyị nwere n’oge a. Ọ ga-abụkwa na o nweghị ụmụnne ya nyeere ya aka. w18.02 4 ¶4-5
Wenezdee, Jun 5
Ndị mmadụ ga-abụ . . . ndị hụrụ ego n’anya.—2 Tim. 3:2.
Ego anaghị eju ndị hụrụ ego n’anya afọ. Ka ha na-agbalị inweju ya enweju, ha na-akpatara onwe ha “ọtụtụ ihe mgbu.” (1 Tim. 6:9, 10; Ekli. 5:10) Ego dị anyị niile mkpa. Ọ na-echebe anyị mgbe ụfọdụ. (Ekli. 7:12) Ma, onye nwere naanị ihe na-ezuru ya, ò nwere ike inwe obi ụtọ? Eheenụ. (Ekli. 5:12) Egọ nwa Jeke kwuru, sị: “Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba. Ka m rie nri e kenyere m.” Anyị nwere ike ịghọta ihe mere o ji kwuo na ya achọghị ịda ogbenye. Ọ gara n’ihu ikwu na ọ chọghị izu ohi n’ihi na ọ ga-eme ka a kpọọ Chineke aha ọjọọ. Ma, gịnị mere o ji kpee ekpere ka Chineke ghara inye ya akụnụba? O kwuru, sị: “Ka afọ ghara iju m, m wee gọnahụ gị, sị: ‘Ònye bụ Jehova?’” (Ilu 30:8, 9) Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”—Mat. 6:24. w18.01 24 ¶9-11
Tọzdee, Jun 6
Otú ahụ ka Nna m nke eluigwe ga-emesokwa unu ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu adịghị agbaghara nwanna ya site n’obi ya.—Mat. 18:35.
Ụzọ anyị ga-esi eme ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’otu bụ ịna-agbaghara ha kpamkpam. Anyị gbaghara ndị mejọrọ anyị, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ na Chineke na-agbaghara anyị mmehie anyị n’ihi àjà mgbapụta Kraịst. Iji gosi ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-agbaghara ndị ọzọ, Jizọs mere otu ihe atụ gbasara otu eze na ndị ohu ya. Biko gụọ Matiu 18:23-34 ma jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agbalị ime ihe a Jizọs kụziri? M̀ na-enwere ụmụnna m ndidi ma na-aghọta ha nke ọma? M̀ na-adị njikere ịgbaghara ndị mejọrọ m? Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere mmehie ndị ka ibe ha njọ. E nwekwara mmehie ndị na-anaghị adịrị anyị mfe ịgbaghara. Ma, ihe atụ ahụ Jizọs mere na-akụziri anyị ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme. Jizọs mere ka o doo anya na Jehova agaghị agbaghara anyị ma ọ bụrụ na anyị agbagharaghị ụmụnna anyị ma ha chegharịa n’eziokwu. Anyị kwesịrị ichebara ihe a echiche. Ka anyị na ụmụnna anyị nwee ike ịna-adị n’otu, anyị ga na-agbaghara ha otú Jizọs kụziri ka anyị na-eme. w18.01 15 ¶12
Fraịdee, Jun 7
Onye ọ bụla nke rịọrọ chi ọ bụla ma ọ bụ mmadụ ọ bụla ọzọ arịrịọ n’ime ụbọchị iri atọ ma e wezụga gị, eze, a ga-atụba ya n’olulu ọdụm.—Dan. 6:7.
N’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi Daniel, ọ chọghị ime ka ndị mmadụ chewe na ọ kwụsịla ife Jehova. Jehova gọziri Daniel n’ihi na o nwere obi ike ma rubere ya isi. Ọ napụtara ya n’aka ọdụm. Nke a mere ka ndị nọ n’obodo niile ndị Midia na Peshia na-achị nụ banyere Jehova. (Dan. 6:25-27) Olee otú anyị ga-esi enwe okwukwe ka Daniel? Ihe ga-eme ka okwukwe anyị sie ike abụghị naanị ịgụ Okwu Chineke, kama, ọ bụ ‘ịghọta ihe ọ pụtara.’ (Mat. 13:23) Anyị chọrọ ịmata otú Jehova si ele ihe anya. N’ihi ya, anyị kwesịrị iwepụta oge na-echebara ihe anyị gụrụ echiche. Ihe ọzọ dị anyị mkpa bụ isi n’ala ala obi anyị na-ekpe ekpere mgbe nsogbu ma ọ bụ ihe isi ike ndị ọzọ bịaara anyị. Ọ bụrụ na anyị ejiri okwukwe rịọ Jehova ka o nye anyị amamihe na ike, ọ ga-enye anyị ha.—Jems 1:5. w18.02 10-11 ¶13-15
Satọdee, Jun 8
Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.—Ọma 34:8.
Ma gịnwa bụ́ onye na-eto eto, bụ́ ohu Jehova e mere baptizim, nwekwara ike ịchọpụta na Jehova dị mma ma Jehova nye gị obi ike ị ga-eji gwa ndị ọzọ banyere ihe ndị i kweere. I nwere ike ime otú ahụ n’ozi ọma nakwa n’ụlọ akwụkwọ. Ọ na-esiri ụfọdụ ike izi ndị enyi ha ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ. Ọ ga-abụ na ị ma ihe kpatara ya. O nwere ike ịbụ na ị na-eche banyere ihe ha ga-eme ma i zie ha ozi ọma. Izi ìgwè mmadụ ozi ọma nwere ike ịkacha tụọ gị ụjọ karịa izi ndị mmadụ ozi ọma otu otu. Gịnị nwere ike inyere gị aka? Nke mbụ, chee ihe mere i ji kwetasie ike n’ihe ndị i kweere. Ùnu nwere ihe ndị ga-enyere gị aka ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi n’asụsụ unu na jw.org? Ọ bụrụ na o doghị gị anya ma ùnu nwere ya, gbalịa chọọ ha. E wepụtara ha iji nyere gị aka ichebara ihe ndị i kweere echiche, ihe mere i ji kwere ha, na otú ị ga-esi agwa ha ndị ọzọ. Obi sichaa gị ike n’ihe i kweere, gị akwadebekwa nke ọma, ị ga-achọ ịkọrọ ndị ọzọ banyere Jehova.—Jere. 20:8, 9. w17.12 26 ¶12, 14-15
Sọnde, Jun 9
Nọgide n’ihe ndị ị mụtara, ndị e mekwara ka i kwere.—2 Tim. 3:14.
Ịkụziri ụmụaka banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nakwa ihe ndị mere eme a kọrọ na Baịbụl abụghị ebe okwu biri. E mere ka Timoti “kwere.” Ihe okwu Grik e si na ya sụgharịa “ka i kwere” pụtara bụ “ime ka obi sie mmadụ ike” ma ọ bụ “ime ka mmadụ kwetasie ike na ihe o kweere bụ eziokwu.” Timoti ma Akwụkwọ Nsọ Hibru malite mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ. O mechara kweta na Jizọs bụ Mesaya. Olee otú ị ga-esi mee ka okwukwe ụmụ gị sie ike ka nke Timoti, ka e nwee ike ime ka ha kwere? Nke mbụ bụ inwe ndidi. Ime ka mmadụ kwere n’ihe a kụziiri ya na-ewe oge. Ọ bụghịkwanụ ihe ị ga-ebufere ụmụ gị naanị n’ihi na e mere ka i kwere. Nwa gị nke ọ bụla kwesịrị iji “ike iche echiche” ya kweta n’eziokwu Baịbụl. (Rom 12:1) Gịnwa bụ́ nne ma ọ bụ nna nwere ọrụ dị mkpa ị ga-arụ iji mee ka okwukwe nwa gị sie ike, nke ka nke, ma ọ jụọ gị ajụjụ. w17.12 19 ¶3, 5-6
Mọnde, Jun 10
Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.—Jọn 11:24.
Mata, bụ́ ezigbo enyi Jizọs, bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya, na-eru uju. Nwanne ya nwoke Lazarọs anwụọla. Ò nwere ihe ga-akasi ya obi? À na-ajụkwa ajụ? Jizọs gwara ya ihe mesiri ya obi ike. Ọ gwara ya, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” (Jọn 11:20-23) Obi siri Mata ezigbo ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọdịnihu. Jizọs rụziri ọrụ ebube. Ọ kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ n’ụbọchị ahụ. Anyị ekwesịghị ịtụwa anya na Jizọs ma ọ bụ Nna ya ga-arụrụ anyị ụdị ọrụ ebube a ugbu a. Ma, obi ò siri gị ike otú ahụ o siri Mata na a ga-akpọlite ndị nwụnahụrụ gị n’ọdịnihu? O nwere ike ịbụ di gị ma ọ bụ nwunye gị, nne gị, nna gị, nne nne gị ma ọ bụ nna nna gị. O nwekwara ike ịbụ na ị na-eru uju n’ihi na nwa gị nwụrụ. Ọ na-agụsi gị agụụ ike gị na ya ịmakụ, kwurịta okwu, ma ọ bụ chịa ọchị. Dị ka Mata, o nwere ezigbo ihe mere i kwesịrị iji jiri obi ụtọ kwuo, sị: ‘Amaara m na onye nwụnahụrụ m ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ.’ Ma, ọ dị mma ka Onye Kraịst ọ bụla chee ihe mere o ji kwere ná mbilite n’ọnwụ. w17.12 3 ¶1-2
Tuzdee, Jun 11
Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ, Iwu gị dịkwa n’ime obi m.—Ọma 40:8.
Jesus ejighị Iwu Mozis gwuo egwu. Nke a ekwesịghị iju anyị anya n’ihi na ọ bụ Nna ya bụ́ Jehova nyere Iwu ahụ. Ọ bụ ya bụ Onye kacha mkpa ná ndụ ya. Otú Baịbụl si gosi na Iwu Chineke na-atọ Jizọs ezigbo ụtọ ka ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa na-ekwu. Jizọs si n’okwu ọnụ ya nakwa n’omume ya gosi na Iwu Chineke zuru okè, baa uru, nakwa na ọ ga-emezurịrị. (Mat. 5:17-19) Ọ ga-abụrịrị na o wutere Jizọs mgbe ọ hụrụ ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-eme ihe dị iche n’ihe Iwu Nna ya kwuru. Ha na-akpachapụ anya eme ihe ndị kacha nta dị n’Iwu ahụ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ha, sị: “Unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpá akwụkwọ mint nakwa mkpá akwụkwọ dil nakwa mkpụrụ kọmin.” N’ihi ya, gịnị bụ nsogbu ha? O kwukwara, sị: “Ma unu na-eleghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya, ya bụ, ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi.” (Mat. 23:23) Ihe bụ́ mkpa ndị Farisii bụ ime iwu. Ha aghọtaghị ihe Iwu ahụ Jehova nyere pụtara. Ha chekwara na ha ka ndị ọzọ mma. Ma Jizọs ghọtara ihe mere Chineke ji nye Iwu ahụ, nakwa ihe iwu nke ọ bụla na-akụziri anyị banyere Jehova. w17.11 13 ¶1-2
Wenezdee, Jun 12
Ihe Chineke chọrọ bụ ka e doo unu nsọ, ka unu zere ịkwa iko.—1 Tesa. 4:3.
Ndị mmadụ nwere ike ịna-agwa anyị, sị: “Anyị kwesịrị ịna-ekpori ndụ. Gịnị mere na mmadụ na onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya inwe mmekọahụ ji dị njọ?” Ọ dịghị mma mmadụ ikwu na Onye Kraịst kwesịrị ịkwa iko. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Okwu Chineke kwuru na ịkwa iko adịghị mma. (1 Tesa. 4:4-8) Jehova kwesịrị inye anyị iwu n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. Iwu Chineke kwuru na ọ bụ naanị ndị lụrụ di na nwunye kwesịrị inwe mmekọahụ. Chineke na-enye anyị iwu n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ha na-abara anyị uru. Ezinụlọ ndị na-edebe iwu ndị ahụ na-ahụ ibe ha n’anya, na-asọpụrụ ibe ha, obi eruokwa ha ala. Chineke ga-ata ndị kpachaara anya na-enupụrụ ya isi, ahụhụ. (Hib. 13:4) Baịbụl gwara anyị otú anyị ga-esi gbaara ịkwa iko ọsọ. Otu ụzọ dị mkpa anyị ga-esi eme ya bụ ịkpachara anya n’ihe ndị anyị na-ele. (Mat. 5:28, 29) N’ihi ya, Onye Kraịst ekwesịghị ịna-ele ndị gba ọtọ ma ọ bụ na-ege egwú ndị na-ekwu gbasara omume rụrụ arụ.—Efe. 5:3-5. w17.11 22 ¶9-10
Tọzdee, Jun 13
Ọ dị mma ịbụku Chineke anyị abụ olu ụtọ.—Ọma 147:1.
Kemgbe ụwa, ndị na-efe Jehova na-eji abụ eto ya. Anyị kwesịrị icheta na mgbe ndị Izrel oge ochie na-erubere Jehova isi, ịbụ abụ bụ otu ụzọ dị mkpa ha si efe Chineke. Dị ka ihe atụ, mgbe Eze Devid kwadebere otú a ga-esi na-eje ozi n’ụlọ nsọ Chineke, ọ họpụtara puku ndị Livaị anọ ka ha jiri abụ na-eto Jehova. N’ime ọnụ ọgụgụ a, narị mmadụ abụọ na iri asatọ na asatọ bụ ‘ndị a zụrụ azụ ịbụrụ Jehova abụ, ha niile bụ ndị ọkà.’ (1 Ihe 23:5; 25:7) Mgbe ndị Izrel na-enyefe Jehova ụlọ nsọ ahụ, ha bụkwara abụ. Baịbụl kwuru, sị: “O wee ruo na ozugbo ndị ahụ bụ́ ndị na-afụ opi na ndị ahụ na-abụ abụ ji otu olu na-agụ egwú iji too Jehova ma kelee ya, ozugbo ha jikwa opi na ájà na ngwá egwú na-abụ abụ wee na-eto Jehova, . . . ebube Jehova jupụtara n’ụlọ ezi Chineke.” O doro anya na nnọkọ ahụ mere ka okwukwe ha sikwuo ike.—2 Ihe 5:13, 14; 7:6. w17.11 4 ¶4-5
Fraịdee, Jun 14
Unu echela na m bịara iweta udo n’elu ụwa; abịara m iweta, ọ bụghị udo, kama mma agha.—Mat. 10:34.
Jizọs ma na ọ bụghị mmadụ niile ga-ekweta n’ihe ndị ọ na-akụzi. Ọ makwa na ụfọdụ ndị ga na-emegide ndị na-eso ụzọ ya. N’ihi ya, ha kwesịrị inwe obi ike. Ihe Jizọs bu n’obi bụ ịkụziri ndị mmadụ eziokwu banyere Chineke, ọ bụghị ikewa ezinụlọ. (Jọn 18:37) Ma ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịmata na ọ gaghị adịrị ha mfe ịbụ ndị na-eso ụzọ ya mgbe niile, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ezigbo ndị enyi ha ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha anaghị efe Jehova. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ediela emo a na-akwa ha, nakwa ọjụjụ a jụrụ ha iji gosi na ha na-eme ihe dị Jizọs mma. Ma, ha eritela uru karịa ihe ha tụfuru. (Mak 10:29, 30) Ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ anyị ana-emegide anyị n’ihi na anyị na-efe Jehova, anyị kwesịrị ịna-ahụ ha n’anya. Ma, anyị kwesịkwara icheta na anyị ga-ahụ Chineke na Kraịst n’anya karịa otú anyị hụrụ ndị ezinụlọ anyị n’anya. (Mat. 10:37) Anyị kwesịrị ịghọta na Setan nwere ike iji maka na anyị hụrụ ndị ezinụlọ anyị n’anya mee ka anyị ghara irubere Jehova isi. w17.10 13 ¶3-6
Satọdee, Jun 15
O wee nubaghachi [Ajọ Omume] n’ime ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ahụ, buru opu ahụ dị arọ kpuchie ọnụ ya.—Zek. 5:8.
Ọhụụ a na-akụziri anyị na Jehova agaghị ekwe ka ndị na-eme ihe ọjọọ nọgide n’ọgbakọ. Ọ ga-ahụ na a chụpụrụ ha ozugbo. (1 Kọr. 5:13) Otú mmụọ ozi ahụ si gosi na Jehova ga-eme ya bụ iji okwuchi dị arọ kwuchie nkata ahụ ozugbo. N’ihi ya, ọhụụ a mere ka ndị Izrel dịrị ndụ n’oge Zekaraya mata na Jehova ga na-eme ka ọgbakọ ya dịrị ọcha. Ọhụụ ahụ chetakwaara ndị Juu ka ha ghara itinye aka n’ihe ọjọọ. Ndị na-efe Jehova ekwesịghị ikwe ka ihe ọjọọ bata n’ọgbakọ ma ọ bụ kwe ka ọ nọgide. Taa, Jehova akpọbatala anyị n’ọgbakọ ya dị ọcha. Ọ na-echebe anyị ma na-egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-eme ka nzukọ Jehova dịrị ọcha. E kwesịghị ikwe ka ndị na-eme ihe ọjọọ nọgide ná nzukọ Jehova. w17.10 24 ¶14-15; 25 ¶17-18
Sọnde, Jun 16
Ahụrụ m iwu gị n’anya.—Ọma 119:163.
Ọ bụ ndị Izrel ma ọ bụ ndị Juu dere akwụkwọ iri atọ na itoolu mbụ nke Baịbụl. Ọ bụ ha bụ ndị mbụ “e nyefere okwu dị nsọ nke Chineke.” (Rom 3:1, 2) Ma, ihe dị ka narị afọ atọ tupu Jizọs abịa n’ụwa, ọtụtụ ndị Juu anaghịzi aghọta asụsụ Hibru. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Alegzanda Onye Ukwu meriri ọtụtụ mba n’ụwa, si otú ahụ mee ka ọchịchị ndị Gris ruo ọtụtụ ebe. (Dan. 8:5-7, 20, 21) Ka ọchịchị ndị Gris bịara ruo ọtụtụ ebe, ọtụtụ ndị malitere ịsụ asụsụ Grik, ma ndị Juu bi n’obodo dị iche iche ndị Gris na-achị. Ma, ka ọtụtụ ndị Juu malitere ịsụ asụsụ Grik, ịghọta Akwụkwọ Nsọ e dere n’asụsụ Hibru bịara na-esiri ha ezigbo ike. Gịnị ka ha ga-eme? A malitere ịsụgharị Baịbụl e dere n’asụsụ Hibru gaa n’asụsụ Grik. A sụgharịchara ya n’ihe dị ka narị afọ abụọ tupu a mụọ Jizọs. Ihe a kpọrọ Akwụkwọ Nsọ Hibru niile a a sụgharịrị bụ Septuagint Grik. Baịbụl a bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru mbụ a sụgharịrị. w17.09 20 ¶7-9
Mọnde, Jun 17
M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.—Hib. 13:5.
Onye ị na-arụrụ ọrụ nwere ike ịgwa gị ka ị rụọ ọrụ mgbe a gbasara ọrụ nakwa ná ngwụcha izu, ya bụ, oge ndị i wepụtara ị ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ, na-aga ozi ọma, na ọmụmụ ihe. I kwesịrị inwe obi ike ị ga-eji gwa ya na ị gaghị e ji oge ndị ahụ arụ ọrụ ma si otú ahụ kụziere ụmụ gị inwe obi ike. Anyị kwesịkwara inwe obi ike anyị ga-eji nyere ụmụ anyị aka ikpebi ihe ndị ha ga-eme n’ozi Jehova, na inyere ha aka ime ha. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nne na nna nwere ike ha agaghị akata obi ịgwa ụmụ ha ka bụrụ ọsụ ụzọ, jewe ozi n’ebe e nwere mkpa, jewe ozi na Betel, ma ọ bụ soro ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ na-arụ ọrụ. Ụjọ nwere ike ịtụ ha na ụmụ ha agaghị elekọta ha ma ha mee agadi. Ma, ndị nne na nna ma ihe na-eme ihe gosiri na ha nwere obi ike, ma nwee okwukwe na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere. (Ọma 37:25) Ndị nne na nna nwee obi ike ma tụkwasị Jehova obi, ụmụ ha ga-amụtakwa ime otú ahụ.—1 Sam. 1:27, 28; 2 Tim. 3:14, 15. w17.09 30 ¶14-15
Tuzdee, Jun 18
Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ . . . njide onwe onye.—Gal. 5:22, 23.
Olee otú i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka ịmụta ịna-ejide onwe ha? Ndị nne na nna ma na ụmụ ha ebughị àgwà a pụta ụwa. Ọ bụ ya mere ha ji kwesi ịna-akpa àgwà ọma ka ụmụ ha mụtakwa ịna-akpa àgwà ọma. (Efe. 6:4) Ị chọpụta na ọ na-esiri ụmụ gị ike ịna-ejide onwe ha, jụọ onwe gị ma ị̀ na-ejide onwe gị. Ihe ga-enyere gị aka ịna-ejide onwe gị bụ ịna-agachi ozi ọma na ọmụmụ ihe anya, na-enwechikwa ofufe ezinụlọ anya. Ọ bụrụ na nwa gị asị gị meere ya ihe na-adịghị mkpa, gwa ya hoo haa na ị gaghị eme ihe ahụ. Jehova gwara Adam na Iv ihe ndị ha ga-eme na ihe ndị ha na-agaghị eme. Ihe ndị ahụ ọ gwara ha gaara enyere ha aka ịna-erubere Jehova isi. Otú ahụ ka ọ dịkwa aka ná ntị nne na nna na-adọ ụmụ ha. Ọ bụrụ na ha ana-adọ ụmụ ha aka ná ntị ma na-akpa àgwà ọma, ọ ga-eme ka ụmụ ha mụta ịna-ejide onwe ha. Irubere Chineke isi so n’otu n’ime ihe ndị kacha baa uru ụmụ gị kwesịrị ịmụta.—Ilu 1:5, 7, 8. w17.09 7 ¶17
Wenezdee, Jun 19
Ka e wee ghara inwe nkewa n’ahụ́, kama ka akụkụ ya niile wee na-elekọta ibe ha n’otu ụzọ ahụ.—1 Kọr. 12:25.
Ọnwụnwa ga na-abịara anyị ruo mgbe a ga-ebibi ụwa Setan a. Ọnwụnwa ndị na-abịara anyị bụ enweghị ọrụ, ọrịa, mkpagbu, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ndị ohi izuru ihe ndị anyị nwere, ma ọ bụkwanụ ihe isi ike ndị ọzọ. Iji nyere ibe anyị aka n’oge ọnwụnwa ndị ahụ, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-enwere ha ọmịiko. Anyị nwee obi ọmịiko, ọ ga-eme ka anyị jiri obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe. (Efe. 4:32) Àgwà ndị a so ná mmadụ ọhụrụ ahụ ga-enyere anyị aka iṅomi Chineke, nyekwara anyị aka ịkasi ndị ọzọ obi. (2 Kọr. 1:3, 4) Olee otú anyị ga-esi mekwuoro ndị si obodo ọzọ ma ọ bụ ndị na-enweghị ka ọ hà ha nọ n’ọgbakọ anyị ihe ọma? Anyị ga-emeta ha enyi, meekwa ka ha mata na ha bara uru n’ọgbakọ. (1 Kọr. 12:22) Ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-enwere ndị si mba ọzọ ọmịiko, na-agbalị ịmụta asụsụ ha. (1 Kọr. 9:23) Mbọ a ha na-agba abaala ezigbo uru. w17.08 23-24 ¶7-9
Tọzdee, Jun 20
Jehova bụ òkè m, ọ bụ ya mere m ga-eji chere ya.—Ákwá 3:24.
Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịdị njikere ichere, gosikwa na anyị nwere ndidi. Ma, gịnị ga-enyere anyị aka iji ndidi chere? Ọ bụ ịrịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. Cheta na ndidi so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Efe. 3:16; 6:18; 1 Tesa. 5:17-19) Rịọ Jehova ka o nyere gị aka iji ndidi tachie obi. Chetakwa ihe nyeere Ebreham, Josef, na Devid aka iji ndidi chere mgbe Jehova ga-emezu nkwa o kwere. Ọ bụ okwukwe ha nwere n’ebe Jehova nọ na otú ha si tụkwasị Jehova obi. Ha anọghị na-eche naanị gbasara onwe ha na ihe ndị ha chọrọ. Ka anyị na-eche otú ihe si gaziere ha, ọ ga-eme ka anyị nwee ndidi. N’ihi ya, a sịgodị na ọnwụnwa na nsogbu abịara anyị, anyị kpebisiri ike ‘ichere’ Jehova. N’eziokwu, anyị nwere ike ịjụ Jehova mgbe ụfọdụ, sị: “Ruo ole mgbe?” (Aịza. 6:11) Ma, mmụọ nsọ Chineke na-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ikwu ihe Jeremaya onye amụma kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. w17.08 7 ¶18-20
Fraịdee, Jun 21
Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ.—Ọma 40:8.
Mgbe Jizọs bụ nwata, o doro anya na o gwuru egwu, kporiekwa ndụ. Baịbụl kwuru na e nwere “oge ịchị ọchị . . . na oge ịwụli elu.” (Ekli. 3:4) Otú Jizọs si bịaruo Jehova nso bụ na ọ na-amụ Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, “nghọta o nwere na ihe ọ na-aza” juru ndị nkụzi nọ n’ụlọ nsọ anya. (Luk 2:42, 46, 47) Mgbe Jizọs toro, obi na-adị ya ezigbo ụtọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ma na ihe so n’ihe ndị Chineke chọrọ ka ọ na-eme bụ “izi ndị ogbenye ozi ọma . . . na ime ka ndị ìsì malite ịhụ ụzọ.” (Luk 4:18) Obi dị Jizọs ụtọ maka na o mere ihe Chineke chọrọ ka o mee. Ịkụziri ndị mmadụ gbasara Nna ya nke eluigwe mere ya obi ụtọ. (Luk 10:21) Otu ụbọchị Jizọs kụzichaara otu nwaanyị otú ọ ga-esi na-efe Chineke, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:31-34) Obi dị Jizọs ụtọ maka na o mere ihe gosiri na ọ hụrụ Chineke na ndị mmadụ n’anya. I mee otú ahụ, obi ga-adịkwa gị ụtọ. w17.07 23 ¶4-5
Satọdee, Jun 22
Udo nke Chineke . . . ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.—Fil. 4:7.
Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere gosiri na otú o si ṅomie Nna ya enweghị atụ. (Jọn 5:19) Ihe mere Chineke ji zite ya n’ụwa bụ ka ọ kasie “ndị e tiwara obi” na “ndị niile na-eru uju” obi. (Aịza. 61:1, 2; Luk 4:17-21) N’ihi ya, ihe e ji mara ya bụ ọmịiko. Ọ ghọtara otú ọ dị ndị na-ata ahụhụ, jirikwa obi ya niile chọọ inyere ha aka. (Hib. 2:17) Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na “Jizọs Kraịst bụ otu onye ahụ ọ bụ ụnyaahụ na taa, ruokwa mgbe ebighị ebi.” (Hib. 13:8) Baịbụl kpọrọ ya “Onye Nnọchiteanya Ukwu nke ndụ.” Ọ ghọtakwara otú iru uju na-adị. N’ihi ya, “o nwere ike ịgbatara ndị a na-ele ule ọsọ enyemaka.” (Ọrụ 3:15; Hib. 2:10, 18) Uju ndị mmadụ na-eru na-emetụ ya n’obi, ọ ghọtara otú ọ dị ha, ọ ga-akasikwa ha obi ‘n’oge ha chọrọ ka e nyere ha aka.’—Hib. 4:15, 16. w17.07 13 ¶6-7; 14 ¶10
Sọnde, Jun 23
Ebe akụ̀ unu dị, n’ebe ahụ ka obi unu ga-adịkwa.—Luk 12:34.
Setan na ụwa ya na-agbasi mbọ ike ka anyị ghara iji akụ̀ ndị bara ezigbo uru Jehova nyere anyị kpọrọ ihe. O nwere ike iji aghụghọ ya nweta anyị. Mmadụ nwere ike ikwe anyị nkwa ọrụ na-enye ezigbo ego. Anyị nwere ike ịrọwa nrọ ibi ndụ ndị oké ozu ma ọ bụ chọọ ịna-egosi na anyị bụ aka ji akụ̀. Ihe ndị a nwere ike imegharị anyị anya. Jọn onyeozi gwara anyị na ụwa a na-agabiga, ya na agụụ ihe ọjọọ ya. (1 Jọn 2:15-17) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka anyị ghara ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị jiri akụ̀ ndị a Chineke nyere anyị gwuo egwu. Dịrị njikere ịhapụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka ị ghara iji Alaeze Chineke kpọrọ ihe. Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ozi ọma. Ekwela ka ikwusa ozi ọma a na-azọ ndụ gwụ gị ike. Na-achọsi eziokwu Baịbụl ike. I mee otú ahụ, ị ga-akpatara onwe gị ‘akụ̀ n’eluigwe, ebe onye ohi na-adịghị eru nso, ebe nla na-adịghịkwa erichapụ.’—Luk 12:33. w17.06 13 ¶19-20
Mọnde, Jun 24
Otu ụbọchị n’ogige gị dị mma karịa otu puku ụbọchị n’ebe ọzọ.—Ọma 84:10.
Jehova anaghị achị ọchịchị aka ike. Ọ na-eme ka ndị ọ na-achị nwere onwe ha, meekwa ka ha na-enwe obi ụtọ. (2 Kọr. 3:17) Devid kwuru banyere Chineke, sị: “Ebube na ịma mma dị n’ihu ya, ike na ọṅụ dịkwa n’ebe ọ nọ.” (1 Ihe 16:7, 27) Ọbụ abụ bụ́ Itan dere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eti mkpu ọṅụ. Jehova, ọ bụ n’ìhè nke ihu gị ka ha na-eje ije. Ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihi aha gị ogologo ụbọchị dum, a na-ebuli ha elu site n’ezi omume gị.” (Ọma 89:15, 16) Ichebara ihe ọma Jehova na-emere anyị echiche ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na ọ bụ ọchịchị ya kacha mma. A naghị ajụ ajụ ma ihe a ọ̀ bụ eziokwu. Ebe ọ bụ Jehova kere anyị ma nye anyị ndụ, ọ ma ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ. Ọ na-enyekwa anyị ọtụtụ ihe ga-eme anyị obi ụtọ. Ihe ọ bụla ọ sịrị anyị mee ga-abara anyị uru, bụrụkwa ihe ga-emecha mee ka anyị na-enwe obi ụtọ, ọ bụrụgodị na ọ pụtara na anyị ga-ahapụ ihe ụfọdụ.—Aịza. 48:17. w17.06 29 ¶10-11
Tuzdee, Jun 25
Ihe a na-atụ anya ya nke e yigharịrị oge ya na-eme ka obi daa ọrịa.—Ilu 13:12.
Cheekwa gbasara otu nwanna nwaanyị bi n’Ịngland. Ọ chọrọ nwa elu, chọọ ala, ma nwa ekweghị abịa. Ka oge na-aga, ọ kwụsịrị ịhụ nsọ ya. O kwuru na obi gbawara ya, n’ihi na o doola ya anya na ọ gaghị amụta nwa n’ụwa ochie a. Ya na di ya kpebiri ịzụrụ nwa. Ma, o kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, m ka na-akwa arịrị. Ama m na ịzụrụ nwa na ịmụta nwa nke m abụghị otu ihe ahụ.” Baịbụl kwuru na a ga-esi “n’ịmụ nwa” chebe nwaanyị bụ́ Onye Kraịst. (1 Tim. 2:15) Ma, ọ pụtaghị na ịmụta nwa ga-eme ka nwaanyị nweta ndụ ebighị ebi. Kama, ọ pụtara na nwaanyị ilekọta ụmụ ya na ime ihe ndị ọzọ dị n’ụlọ nwere ike ime ka ọ ghara inwe ohere ọ ga-eji na-agba asịrị ma ọ bụ na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ya.—1 Tim. 5:13. w17.06 5-6 ¶6-8
Wenezdee, Jun 26
Gịnị ka ị na-enye [Chineke]; ọ̀ bụkwa gịnị ka ọ na-enweta n’aka gị?—Job 35:7.
Ihe a Elaịhu kwuru ọ̀ pụtara na mbọ anyị na-agba n’ozi Chineke abaghị uru ọ bụla. Mbanụ. Ihe o kwuru pụtara na ma anyị efeghị Jehova, o nweghị ihe ọ ga-ewepụ ya n’ahụ́. Jehova nwezuru ihe niile. Anyị agaghị emeli ka ọ bakwuo ọgaranya, ma ọ bụ sikwuo ike. Kama, ọ bụ ya nyere anyị nkà na ike ọ bụla anyị nwere, meekwa ka anyị na-akpa àgwà ọma. Ọ na-ahụkwa ihe anyị na-eji ya eme. Jehova na-ewere ihe ọma ọ bụla e meere ndị ohu ya na ọ bụ ya ka e meere ya. Ilu 19:17 sịrị: “Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe, ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.” Amaokwu Baịbụl a ọ̀ na-ekwu na Jehova na-ahụ ihe ọ bụla e meere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha? Ànyị kwesịrị ikwu na ọ bụrụ na anyị emeere ndị ọzọ ebere, Onye kere eluigwe na ụwa ga-ewere ya ka ego anyị gbazinyere ya, nke ọ ga-eji ihe ọma kwụọ anyị ụgwọ ya? À na-ajụkwa ajụ? Ihe Jizọs bụ́ Ọkpara ya kwuru gosiri na ọ bụ eziokwu.—Luk 14:13, 14. w17.04 29 ¶3-4
Tọzdee, Jun 27
Iwu Jehova na-atọ ya ụtọ, ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala ehihie na abalị.—Ọma 1:2.
E wezụga ịgụ Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, olee ihe ọzọ anyị ga-eme ka anyị jiri eziokwu Baịbụl kpọrọkwuo ihe? Ọ bụ ịgachi ọmụmụ ihe anya. Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche anyị na-enwe kwa izu so n’otú kachanụ e si akụziri anyị ihe. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta isiokwu nke ọ bụla a na-amụ, anyị kwesịrị ịkwadebe ya nke ọma. Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịgụ amaokwu Baịbụl nke ọ bụla dị n’isiokwu ahụ. Ugbu a, e nwere ike isi na jw.org/ig nweta Ụlọ Nche ma ọ bụ si na JW Library gụọ ya n’ọtụtụ asụsụ. E nwere ụdị nke ị ga-emepe n’ebe ahụ, gị enwee ike ịgụ amaokwu Baịbụl ndị dị n’isiokwu a na-amụ amụ ozugbo ị dụrụ ya aka. Ma, otú ọ bụla anyị si na-amụ ya, ịgụ amaokwu Baịbụl ndị dị na ya ma na-atụgharị uche na ha ga-eme ka anyị jiri eziokwu Baịbụl kpọrọkwuo ihe. w17.05 20 ¶14
Fraịdee, Jun 28
Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.—Rom 14:12.
Anyị mechaa baptizim, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-ejere Chineke ozi otú ahụ anyị kwere ya ná nkwa mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. O nweghị otú anyị ga-esi kagbuo nkwa anyị kwere Chineke mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. Ike gwụ mmadụ ijere Jehova ozi ma ọ bụ ibi ndụ ka Onye Kraịst, o kwesịghị ikwuwe na ya enyefeghị Chineke onwe ya n’eziokwu nakwa na baptizim o mere abụghị nke ezigbo ya. E nwere ike ikwu na baptizim o mere gosiri na o meela ka onye ọ bụla mara na ya ejirila obi ya niile nyefee Chineke onwe ya. Ọ ga-aza Jehova na ọgbakọ ya ajụjụ ma o mee mmehie ọ bụla jọgburu onwe ya. Anyị achọghị ka e kwuo na ‘anyị ahapụla ịhụnanya ahụ anyị nwere na mbụ.’ Kama, anyị chọrọ ka Jizọs gwa anyị, sị: “Amaara m ihe ndị ị na-eme, na ịhụnanya na okwukwe na ije ozi na ntachi obi gị, amakwaara m na ihe ndị ị na-eme n’oge na-adịbeghị anya karịrị ndị i mere n’oge gara aga.” (Mkpu. 2:4, 19) Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-emezu nkwa anyị kwere Jehova mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. Anyị mee otú ahụ, obi ga-abụ ya sọ aṅụrị. w17.04 6-7 ¶12-13
Satọdee, Jun 29
Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ, n’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.—Diut. 32:4.
Ebreham jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ na Onyeikpe nke ụwa dum agaghị eme ihe ziri ezi?” (Jen. 18:25) Ihe a ọ jụrụ gosiri na obi siri ya ike na Jehova ga-ekpe ndị Sọdọm na Gọmọra ikpe ziri ezi. Obi sikwara ya ike na Jehova agaghị ‘egbukọta onye ezi omume na onye ajọ omume.’ Ebreham sịrị na Jehova agaghị eme ya. Ihe mere obi ji sie ya ike bụ n’ihi na ọ bụ Jehova kacha ekpe ikpe ziri ezi, bụrụkwa onye ezi omume. N’eziokwu, okwu Hibru e si sụgharịta “ikpe ziri ezi” na “ezi omume” na-apụtakọ ọnụ ọtụtụ mgbe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru n’ihi na okwu abụọ a pụtara otu ihe. Ọ dabara adaba na ebe ọ bụ Jehova kacha bụrụ onye ezi omume, ihe ọ bụla o kpebiri na-ezi ezi. Baịbụl gwakwara anyị na “ọ hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya.”—Ọma 33:5. w17.04 18 ¶1-2
Sọnde, Jun 30
Ọ dịghị ihe ọzọ ga-eme ka m nwee obi ekele karịa ihe a, ya bụ, na m ga na-anụ na ụmụ m na-eje ije n’eziokwu ahụ.—3 Jọn 4.
Ndị nne na nna, iji ofufe Chineke kpọrọ ihe ga-enyere ụmụ unu aka ka ha na Jehova dịrị ná mma, ha enwetakwa ndụ ebighị ebi. Ụmụ unu hụ na unu ‘bu ụzọ na-achọ alaeze’ Chineke, ha ga-amụta ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga na-egboro ha mkpa ha kwa ụbọchị. (Mat. 6:33, 34) N’ihi ya, unu ebila ndụ okomoko. Jirinụ ozi Jehova kpọrọ ihe, kama ịchụwa ego ka à na-anwụ anwụ. Gbalịanụ ka unu ghara ịna-eji ụgwọ. Na-achọnụ “akụ̀ n’eluigwe,” ya bụ, na-emenụ ka unu na Jehova dịrị ná mma, kama ịchụwa akụnụba ma ọ bụ “otuto mmadụ.” (Mak 10:21, 22; Jọn 12:43) Unu ekwela ka mere nke a mere nke ọzọ mee ka unu ghara iwepụtara ụmụ unu ohere. Meenụ ka ha mata na unu ji ha eme ọnụ ma ha were ofufe Jehova ka ihe dị mkpa karịa ịchọwa ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ ịchụ akụnụba, ma hà na-achụtara ya onwe ha ma hà na-achụtara ya unu. Ndị ụwa na-eche na ọ bụ ụmụ kwesịrị ịkpatara nne na nna ha akụ̀. Unu echela otú ahụ. Chetanụ na “ọ bụghị ụmụ kwesịrị ịkpakọbara ndị mụrụ ha ihe, kama ọ bụ ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịkpakọbara ụmụ ha ihe.”—2 Kọr. 12:14. w17.05 8-9 ¶3-4