Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es19 p. 77-87
  • Ọgọst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọgọst
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2019
  • Isiokwu Nta
  • Tọzdee, Ọgọst 1
  • Fraịdee, Ọgọst 2
  • Satọdee, Ọgọst 3
  • Sọnde, Ọgọst 4
  • Mọnde, Ọgọst 5
  • Tuzdee, Ọgọst 6
  • Wenezdee, Ọgọst 7
  • Tọzdee, Ọgọst 8
  • Fraịdee, Ọgọst 9
  • Satọdee, Ọgọst 10
  • Sọnde, Ọgọst 11
  • Mọnde, Ọgọst 12
  • Tuzdee, Ọgọst 13
  • Wenezdee, Ọgọst 14
  • Tọzdee, Ọgọst 15
  • Fraịdee, Ọgọst 16
  • Satọdee, Ọgọst 17
  • Sọnde, Ọgọst 18
  • Mọnde, Ọgọst 19
  • Tuzdee, Ọgọst 20
  • Wenezdee, Ọgọst 21
  • Tọzdee, Ọgọst 22
  • Fraịdee, Ọgọst 23
  • Satọdee, Ọgọst 24
  • Sọnde, Ọgọst 25
  • Mọnde, Ọgọst 26
  • Tuzdee, Ọgọst 27
  • Wenezdee, Ọgọst 28
  • Tọzdee, Ọgọst 29
  • Fraịdee, Ọgọst 30
  • Satọdee, Ọgọst 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2019
es19 p. 77-87

Ọgọst

Tọzdee, Ọgọst 1

Ọ bụghị dị ka m si chọọ, kama dị ka i si chọọ.—Mat. 26:39.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ezigbo ndị nkụzi, anyị ga-ebu ụzọ bụrụ ezigbo ụmụ akwụkwọ. (1 Tim. 4:15, 16) Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị Jehova nyere ikike ịdọ ndị ọzọ aka ná ntị. Ha kwesịrị ịnọgide na-adị umeala n’obi ma kwe ka Jehova na-eduzi ha ná ndụ. Ndị ọzọ hụ na ha dị umeala n’obi, ha ga na-akwanyere ha ùgwù. Ọ ga-adịkwara ha mfe ịnabata aka ná ntị ha na-adọ ha. Ka anyị tụlee gbasara Jizọs. Jizọs gere Nna ya ntị mgbe niile, ma mgbe ime otú ahụ na-adịghịrị ya mfe. O toro Nna ya maka ihe ndị ọ kụziri na amamihe o nyere ya. (Jọn 5:19, 30) Otú Jizọs si dị umeala n’obi nakwa otú o si rube isi mere ka ndị mmadụ bịakwute ya. O mekwara ka ọ bụrụ onye nkụzi na-eme ebere. (Mat. 11:29) Okwu o ji obiọma na-agwa ndị mmadụ gbara ha ume ma mee ka ndị dara mbà n’obi nwee ume. (Mat. 12:20) Ma mgbe ndịozi ya mere ihe kwesịrị iwe ya iwe, o ji obiọma meso ha ihe iji gosi na ọ hụrụ ha n’anya. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ otú o si gbazie ha mgbe ha na-arụrịta ụka gbasara onye ka ibe ya.—Mak 9:33-37; Luk 22:24-27. w18.03 26 ¶15-16

Fraịdee, Ọgọst 2

Ihe ya na ihe a yiri na-azọpụtakwa unu ugbu a, ya bụ, baptizim.—1 Pita 3:21.

Pita onyeozi ji baptizim tụnyere ụgbọ Noa wuru. Ụgbọ ahụ mere ka a mata na Noa ji obi ya niile chọọ ime ihe dị Chineke mma. O ji obi ya niile rụọ ọrụ Jehova nyere ya rụọ. Jehova zọpụtara Noa na ezinụlọ ya n’Iju Mmiri ahụ n’ihi okwukwe ya. Otú ahụ ụgbọ ahụ Noa wuru gosiri na o nwere okwukwe, ka baptizim a na-eme ndị mmadụ n’ihu ọha nwekwara ihe ọ na-egosi. Ọ na-egosi na Onye Kraịst enyefeela Jehova onwe ya n’ihi okwukwe o nwere na Kraịst. Ndị e mere baptizim na-erubere Chineke isi ma na-arụ ọrụ o nyere ha, otú ahụ Noa mere. Mgbe Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a, ọ ga-echebe ndị e mere baptizim na-efe ya, otú ahụ o chebere Noa n’Iju Mmiri ahụ. (Mak 13:10; Mkpu. 7:9, 10) Ọ bụ ihe a mere mmadụ inyefe Jehova onwe ya na ime baptizim ji dị ezigbo mkpa. Ọ bụrụ na mmadụ na-egbu oge ime baptizim n’ihi ihe na-enweghị isi, ndụ ebighị ebi nwere ike ịkwa ya. w18.03 4 ¶3-4

Satọdee, Ọgọst 3

Nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata.—Ilu 22:15.

Ụfọdụ ndị nne na nna nwere ike ịna-eche sị, ‘Ebe ọ bụ na nwa m emebeghị baptizim, e nweghị ike ịchụ ya n’ọgbakọ. Gịnị mere na ọ dịghị mma iche ụdị echiche a? (Jems 1:22) O doro anya na ndị nne na nna achọghị ka e mee nwa ha baptizim tupu ya ekpebie inyefe Jehova onwe ya. Ma, ọ dịghị mma iche na ọ bụrụ na nwatakịrị emebeghị baptizim, ọ gaghị aza Chineke ajụjụ. N’ihi Gịnị? Ọ bụghị naanị ndị mere baptizim ga-aza Jehova ajụjụ. Kama, nwatakịrị ga-aza Jehova ajụjụ n’ihi na ọ marala ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Jems 4:17) Kama igbochi nwatakịrị ime baptizim, ndị nne na nna maara ihe kwesịrị ịgbalị na-akpa àgwà ọma ụmụ ha ga-eṅomi. Ha kwesịrị ịmalite mgbe nwa ha dị obere na-akụziri ya ka ọ hụ ihe Jehova sị ka anyị na-eme n’anya ma kpọ ihe ndị ọ sịrị anyị emela asị. (Luk 6:40) Ịhụnanya nwatakịrị nwere n’ebe Jehova nọ ga-eme ka ọ ghara ime mmehie dị oké njọ, n’ihi na ọ ga-achọ ime ihe Jehova kwuru na ha dị mma.—Aịza. 35:8. w18.03 11 ¶12-13

Sọnde, Ọgọst 4

Noa so ezi Chineke jee ije—Jen. 6:9.

Noa akwụsịghị ime otú ahụ ruo narị afọ atọ na iri ise ọzọ mgbe Iju Mmiri ahụ gachara. (Jen. 9:28) Noa nwere okwukwe ma rube isi. Anyị kwesịkwara iṅomi ya. Anyị nwere ike iṅomi okwukwe Noa na otú o si rube isi. Otú anyị ga-esi eme ya bụ irubere Chineke isi, ịghara ịbụ nke ụwa Setan, nakwa ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Mat. 6:33; Jọn 15:19) Ọ bụ n’ihi ihe ndị a mere ụwa ejighị anya ahụ anyị. Dị ka ihe atụ, ebe ọ bụ na anyị kpebisiri ike ịna-erubere Chineke isi ma a bịa n’ihe gbasara inwe mmekọahụ na alụmdi na nwunye, ndị mmadụ nwere ike iji ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-emebi aha anyị. (Mal. 3:17, 18) Dị ka Noa, anyị na-atụ egwu Jehova, ọ bụghị ndị mmadụ. Anyị ma na ọ bụ naanị ya ga-enye anyị ndụ ebighị ebi. (Luk 12:4, 5) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ ga na-eme ihe ziri ezi n’anya Chineke ma mgbe ndị ọzọ na-akwa m emo ma ọ bụ na-akatọ m? M̀ tụkwasịrị Chineke obi na ọ ga-egboro m mkpa ezinụlọ m, ma mgbe ịkpa afọ ezinụlọ na-esi ezigbo ike?’ Ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi ma na-erubere ya isi ka Noa, obi kwesịrị isi gị ike na ọ ga na-elekọta gị.—Fil. 4:6, 7. w18.02 4 ¶4, 8; 5 ¶9-10

Mọnde, Ọgọst 5

Onye anụ ahụ́ na-achị adịghị anabata ihe ndị metụtara mmụọ Chineke.—1 Kọr. 2:14.

Ihe e ji mara ndị ụwa bụ na ha na-eme ihe na-abara naanị onwe ha uru. Pọl kọwara ya dị ka “mmụọ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi.” (Efe. 2:2) Mmụọ a na-eme ka ọtụtụ ndị soro ndị ọzọ na-eme ihe ha na-eme. N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ha na-eme ihe ha chere ziri ezi, ha anaghịkwa agba mbọ eme ihe Chineke kwuru. Ihe na-abụkarị mkpa onye anụ ahụ́ na-achị bụ ịchụ ego, isi ọnwụ na ọ ga-enweta ihe ndị o chere ruuru ya, nakwa ka ndị mmadụ na-akwanyere ya ùgwù. Ndị na-akpa àgwà ndị ahụ Baịbụl kpọrọ “ọrụ nke anụ ahụ́” so ná ndị anụ ahụ́ na-achị. (Gal. 5:19-21) Àgwà ndị ndị anụ ahụ́ na-achị na-akpa bụ ịkpata nkewa, ịdụnyere mmadụ úkwù ma e nwee esemokwu, ịkpata esemokwu, ịkpọpụ ibe ha n’ụlọikpe, akwanyereghị ndị isi ùgwù, iribiga nri ma ọ bụ ịṅụbiga mmanya ókè. Ha anaghịkwa agbaliri ọnwụnwa ọsọ ma ọ bịara ha.—Ilu 7:21, 22. w18.02 19 ¶3-5

Tuzdee, Ọgọst 6

Ndị mmadụ ga-abụ . . . ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya.—2 Tim. 3:2, 4.

Ọ dịghị njọ ịtụrụtụ ndụ. Jehova achọghị ka anyị na-ata ndụ anyị ahụhụ, ma ọ bụ ghara ime ihe ndị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. Baịbụl gwara ndị ohu Jehova, sị: “Gaa jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa obi aṅụrị ṅụọ mmanya gị.” (Ekli. 9:7) Na 2 Timoti 3:4, Baịbụl kwuru banyere ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya ma hapụ ịhụ Chineke n’anya. Buru n’obi na amaokwu ahụ ekwughị na ndị mmadụ ga-ahụ ihe ụtọ n’anya karịa otú ha hụrụ Chineke n’anya. Ọ bụrụ na o kwuru otú ahụ, ọ pụtara na ha hụtụrụ Chineke n’anya. Ma, ihe amaokwu ahụ kwuru bụ ‘kama ịhụ Chineke n’anya.’ Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “Amaokwu a anaghị ekwu na ha hụtụrụ Chineke n’anya. Kama, ọ na-ekwu na ha ahụtụdịghị Chineke n’anya.” Ihe a bụ ihe e kwuru iji dọọ ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya aka ná ntị. Baịbụl kọwara “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya” dị ka ndị “ihe ụtọ dị iche iche nke ndụ na-adọpụ uche ha.”—Luk 8:14. w18.01 25 ¶14-15

Wenezdee, Ọgọst 7

Jiri ihe gị ndị dị oké ọnụ ahịa sọpụrụ Jehova.—Ilu 3:9.

Jehova bụ Chineke na-emesapụ aka. Ihe niile anyị nwere si n’aka ya. Ọ bụ ya nwe ọlaọcha na ọlaedo nakwa akụ̀ ndị ọzọ dị n’ụwa. Ọ na-ejikwa ụfọdụ n’ime ha enyere ihe ndị dị ndụ aka. (Ọma 104:13-15; Hag. 2:8) Jehova nyere ndị Izrel mana na mmiri ruo afọ iri anọ mgbe ha nọ n’ala ịkpa. (Ọpụ. 16:35; Nehe. 9:20, 21) Jehova si n’aka Ịlaịsha onye amụma mee ka obere mmanụ nke otu nwaanyị di ya nwụrụ mụbaa. Ihe a Chineke meere nwaanyị a na-atụ egwu ya mere ka ọ kwụchaa ụgwọ o ji, ya enweekwa ego fọrọ ya na ụmụ ya ji na-eri nri. (2 Eze 4:1-7) Jehova mekwara ka Jizọs jiri ọrụ ebube nye ndị mmadụ nri, nyekwa ha ego mgbe ọ dị mkpa. (Mat. 15:35-38; 17:27) Jehova nwere ike iji ihe ọ bụla masịrị ya nyere ihe ndị o kere eke aka. Ma, ọ chọkwara ka ndị ohu ya jiri ihe ndị ha nwere na-akwado ọrụ nzukọ ya na-arụ.—Ọpụ. 36:3-7. w18.01 17 ¶1-3

Tọzdee, Ọgọst 8

Jehova, wepụ mkpụrụ obi m.—1 Eze 19:4.

Baịbụl kwuru na e nwere ndị ohu Chineke n’oge ochie chere na ha enweghịzi ike idi nsogbu ha. (Job 7:7) Gịnị nyeere ha aka idi ha? Ha tụkwasịrị Jehova obi ka o nye ha ike. Chineke anyị emechughịkwa ha ihu n’ihi na ọ “na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike.” (Aịza. 40:29) Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị Chineke n’oge anyị a chere na otú kacha mma ha ga-esi edi nsogbu ha bụ ‘ịhapụtụ ọgbakọ.’ N’ihi na ha chere na ife Jehova bụụrụ ha ibu arọ kama ịbụ ihe ọma Chineke meere ha. N’ihi ya, ha na-akwụsị ịgụ Okwu Chineke, ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma, bụ́kwanụ ihe Setan tụrụ anya na ha ga-eme. Ekwensu ma na ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị gbasara ofufe Chineke kpọrọ ihe, okwukwe anyị ga-esikwu ike. Ma ọ chọghị ka okwukwe anyị sie ike. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ike gwụrụ gị, ya adị gị ka olileanya adịghịzi, ahapụkwala Jehova. Gbalịa ka gị na ya dịkwuo ná mma n’ihi na ‘ọ ga-eme ka i guzosie ike, ọ ga-eme ka i sie ike.’ —1 Pita 5:10; Jems 4:8. w18.01 7-8 ¶2-3

Fraịdee, Ọgọst 9

Jehova . . . na-eme ka a rịdaa na Shiol, ọ na-emekwa ka a rịgote.—1 Sam. 2:6.

Ịlaịsha onye amụma kpọlitekwara mmadụ n’ọnwụ. Nke a bụ mbilite n’ọnwụ nke abụọ a kọrọ na Baịbụl. Otu nwaanyị Izrel a ma ama n’obodo Shunem lere Ịlaịsha ezigbo ọbịa. N’ihi ya, Chineke si n’aka onye amụma a mee ka nwaanyị a na di ya merela agadi mụta nwa nwoke. Mgbe afọ ole na ole gachara, nwa a nwụrụ. Chegodị otú obi si gbawaa nwaanyị ahụ. Di ya hapụrụ ya ka ọ gaa hụ Ịlaịsha n’Ugwu Kamel. Ọ gara ihe dị ka kilomita iri atọ. Onye amụma ahụ zigara onye na-ejere ya ozi bụ́ Gehezaị ka o buru ya ụzọ gaa Shunem kpọlite nwa ahụ n’ọnwụ. Ma, Gehezaị emelighị ya. Ịlaịsha na nwaanyị ahụ obi na-agbawa emechazie rute. (2 Eze 4:8-31) Ịlaịsha banyere n’ụlọ ebe ozu nwa ahụ nọ na Shunem, ma kpee ekpere. Jehova zara Ịlaịsha ekpere ma mee ka nwa ahụ dịghachi ndụ. Mgbe nne nwa ahụ hụrụ ya, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ. (2 Eze 4:32-37) O doro anya na ọ bụ Chineke kpọlitere nwa ahụ n’ọnwụ na Shunem. Nke a gosiri na ọ ga-akpọliteli ndị nwụrụ anwụ. w17.12 4 ¶7-8

Satọdee, Ọgọst 10

Nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata.—Ilu 22:15.

Ebe ọ bụ na amamihe dị iche na nzuzu, amamihe bụ otu n’ime ihe e ji ama onye tozuru okè. Ihe na-eme ka mmadụ bụrụ Onye Kraịst tozuru okè abụghị afọ ndụ ya, kama ọ bụ na onye ahụ na-atụ egwu Chineke ma dị njikere ịna-erubere ya isi. (Ọma 111:10) Ụmụ okoro na agbọghọ tozuru okè n’ọgbakọ anaghị ekwe ka ihe na-agụ ha agụụ ma ọ bụ nsogbu ndị enyi ha na-enye ha mee ka ha bụrụ “ndị ebili mmiri na-enugharị na ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị.” (Efe. 4:14) Kama, ‘a na-azụ ikike nghọta ha azụ,’ ka ha nwee ike “ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.” (Hib. 5:14) Iji gosi na ha eruwela ntozu okè, ha na-ekpebi ihe ndị bara uru ha ga-eme. Mmadụ kwesịrị inwe ụdị amamihe a ka e nwee ike ịzọpụta ya. (Ilu 24:14) N’ihi ya, i kwesịrị ịgwa ụmụ gị hoo haa ihe ndị ị ma Baịbụl kwuru bụ àgwà ọma ma ọ bụ àgwà ọjọọ. Ụmụ gị kwesịrị isi n’ihe ndị ị na-ekwu na ihe ndị ị na-eme mata na ị na-agba mbọ ime ihe Baịbụl kwuru.—Rom 2:21-23. w17.12 20-21 ¶12-13

Sọnde, Ọgọst 11

Na-ejenụ ije n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ . . . Mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.—Kọl. 4:5, 6.

Ọtụtụ ndị nwere ike ịna-eche na ihe a ndị mmadụ na-ekwu na ụmụ mmadụ ga-akwụsịli nsogbu ha bụ eziokwu. Maka gịnị? Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, ọ pụtara na anyị achọghị ka Chineke na-eduzi anyị, nakwa na mmadụ nwere ike ime ihe ọ bụla dị ya mma. Ihe ọzọ bụ na ndị mmadụ nwere ike ikwe n’ihe a ha na-ekwu, n’ihi na nchọpụta e mere gosiri na agha, ime mpụ, ọrịa, na ịda ogbenye na-ebelata. Otu akụkọ kwuru, sị: “Ihe mere ihe ji na-adịrị ndị mmadụ mma bụ na ụmụ mmadụ ekpebiela ime ka ụwa kakwuo mma.” Ọ bụrụ na ị nụ ihe ndị mmadụ na-ekwu nke nwere ike ịkpa okwukwe gị aka ọjọọ, mee nchọnchọ n’Okwu Chineke ka ị chọpụta ihe o kwuru banyere ihe ahụ, gị na nwanna ma nke a na-akọ kwurịtakwa ya. Chọpụta ihe mere ndị mmadụ ji na-enwe mmasị na ya, na ihe mere ihe ahụ ji ghara ịbụ eziokwu, nakwa ihe i nwere ike ikwu ma mmadụ gwa gị ya. N’eziokwu, anyị niile nwere ike ịgbalị ka anyị ghara ịna-eche echiche ka ndị ụwa. Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ime ihe a Pọl kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. w17.11 24 ¶14, 17

Mọnde, Ọgọst 12

Chineke, ana m ekele gị na adịghị m ka ụmụ mmadụ ndị ọzọ.—Luk 18:11.

Gịnị mere ndị Farisii anaghị achọ imere ndị ọzọ ebere? Baịbụl kwuru na ha ‘na-ewere ndị ọzọ dị ka ndị na-enweghị ihe ha bụ.’ (Luk 18:9-14) Na-eṅomi Jehova, ọ bụghị ndị Farisii. Na-emere ndị ọzọ ebere. (Kọl. 3:13) Otu ụzọ i nwere ike isi eme ya bụ ime ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịrịọ gị mgbaghara. (Luk 17:3, 4) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agbaghara ndị mere m ihe ọjọọ, n’agbanyeghị ugboro ole ha mere m ya? M̀ dị njikere ime ka mụ na onye mejọrọ m ma ọ bụ kpasuru m iwe dịghachi ná mma?’ Ka anyị nwee ike ịna-agbaghara ndị ọzọ, anyị ga-adị umeala n’obi. Ndị Farisii anaghị agbaghara ndị ọzọ n’ihi na ha na-ewere ha ka ndị na-enweghị ihe ha bụ. Ma, ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi, ‘na-ewere na ndị ọzọ ka anyị,’ ma na-agbaghara ha. (Fil. 2:3) Ị̀ ga-eṅomi Jehova ma dịrị umeala n’obi? I mee otú ahụ, ọ ga-adịrị ndị ọzọ mfe ịrịọ gị mgbaghara, dịkwara gị mfe ịgbaghara ha. Na-emere ndị ọzọ ebere ngwa ngwa, ewela iwe ọsọ ọsọ.—Ekli. 7:8, 9. w17.11 14-15 ¶6-8

Tuzdee, Ọgọst 13

Ọ dị mma ịbụku Chineke anyị abụ olu ụtọ.—Ọma 147:1.

I jiri olu gị tụnyere olu ndị ọzọ, ihere nwere ike imewe gị. Ma, nke a ekwesịghị ime ka ị ghara iji abụ na-eto Jehova n’ihi na ọ bụ ihe anyị kwesịrị ịna-eme. N’ihi ya, ị bụwa abụ, welie akwụkwọ abụ gị elu, weliekwa isi gị elu, ma jiri obi gị niile bụọ ya. (Ezra 3:11) Taa, n’ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nwere tiivi, a bụwa abụ, a na-egosi ya na tiivi. Nke a nwekwara ike inyere anyị aka ịbụ abụ. E meela ka ịbụ abụ Alaeze soro n’ihe a na-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze maka ndị okenye. Nke a ga-eme ka ndị okenye bute ụzọ n’ịbụ abụ n’ọmụmụ ihe. Otu ihe mere o ji esiri ọtụtụ ndị ike iji olu dara ụda bụọ abụ bụ ụjọ. O nwere ike ịbụ na ụjọ na-atụ ha na olu ha adịghị mma. Ma, anyị kwesịrị iburu n’obi na mgbe anyị na-ekwu okwu, “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Ma, nke a anaghị eme ka anyị ghara ikwu okwu. N’ihi ya, gịnị mere anyị ga-eji kwe ka olu abụ anyị na-adịghị mma mee ka anyị ghara iji abụ na-eto Jehova? w17.11 4-5 ¶9-10

Wenezdee, Ọgọst 14

Ọ ga-eme, ma ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu.—Zek. 6:15.

Ka Zekaraya hụchara ọhụụ nke asaa, o nwere ọtụtụ ihe ọ ga na-eche. Ọ ga-abụ na nkwa Jehova kwere na ọ ga-ata ndị ọjọọ ahụhụ gbara Zekaraya ume. Ma, o nwebeghị ihe gbanwerenụ. Ihe ọjọọ ka na-arị ibe ya elu. A rụchabeghịkwa ụlọ nsọ Jehova ha na-arụ na Jeruselem. Gịnị mere ndị Juu egbughị oge hapụ ọrụ ahụ Jehova nyere ha rụọ? Ihe mere ha ji laghachi Jeruselem, ọ̀ bụ ka ha chụwa ihe ga-abara naanị onwe ha uru? Jehova ma ihe ndị ya chọrọ. O mere ka Zekaraya hụ ọhụụ ikpeazụ iji mesie ndị Juu obi ike na ọ hụrụ ha n’anya, nakwa na obi dị ya ụtọ n’ihe niile ha merela. O kwekwara ha nkwa na ọ ga-echebe ha ma ha maliteghachi ọrụ o nyere ha. Jehova kwuru gbasara ụlọ nsọ ahụ ha nọ na-ewughachi n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. w17.10 26 ¶1; 27 ¶5

Tọzdee, Ọgọst 15

Chineke na-arụ ọrụ n’ime unu . . . ka unu wee na-enwe ọchịchọ ma na-eme ihe.—Fil. 2:13.

Ndị ọzọ kwesịrị inwe obi ike ma meekwa ihe bụ ụmụnna nwoke ndị merela baptizim. Ọ bụrụ na ha adịrị njikere ịghọ ndị ohu na-eje ozi ma ọ bụ ndị okenye, ọ ga-abara ọgbakọ ezigbo uru. (1 Tim. 3:1) Ma, ụfọdụ nwere ike ịna-egbu oge ime otú ahụ. O nwere ike bụrụ na nwanna mere mmehie n’oge gara aga, ma ugbu a, ya ana-eche na o rughị eru ịghọ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye. Nwanna ọzọ nwere ike ịna-eche na ya agaghị arụli ọrụ a chọrọ ka ọ rụọ. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, Jehova ga-enyere gị aka inwe obi ike. (Fil. 4:13) Cheta na o nwere mgbe Mozis chere na o rughị eru ịrụ otu ọrụ Jehova gwara ya ka ọ rụọ. (Ọpụ. 3:11) Ma, Jehova nyeere ya aka inwe obi ike ma rụọ ọrụ ahụ. Nwanna nwoke nwekwara ike inwe obi ike. Otú ọ ga-esi enwe ya bụ iji obi ya niile rịọ Chineke ka o nyere ya aka, nakwa ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ihe ọzọ ga-enyere ya aka bụ ịna-agụ akụkọ gbasara ndị nwere obi ike. O nwere ike iji obi umeala gakwuru ndị okenye ka ha zụọ ya, ma wepụta oge na-enye aka na-arụ ọrụ ndị e nwere n’ọgbakọ. w17.09 32 ¶19

Fraịdee, Ọgọst 16

Okwu Chineke anyị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.—Aịza. 40:8.

Ndị Kraịst taa ekwesịghị iche na Chineke nyere ndị sụgharịrị Septuagint, Baịbụl Wycliff, King James Version ma ọ bụ nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ, mmụọ nsọ ya ha ji sụgharịa Baịbụl ndị a. Ma, ọ bụrụ na anyị eleba anya ná mbọ ndị sụgharịrị Baịbụl ndị a gbara ịsụgharị ha, o doro anya na Okwu Jehova dịgidere otú ahụ o kwere ná nkwa. Nke a kwesịrị ime ka okwukwe anyị sikwuo ike na Jehova ga-emezukwa nkwa ya ndị ọzọ. (Jọsh. 23:14) Ọ bụrụ na anyị aghọta otú Jehova si mee ka Okwu ya dịgide, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, meekwa ka anyị hụkwuo ya n’anya. Gịnị mere Jehova ji nye anyị Baịbụl ma kwe nkwa na ọ ga-echebe ya? Ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya ma chọọ ka ọ kụziere anyị otú anyị nwere ike isi baara onwe anyị uru. (Aịza. 48:17,18) Nke a kwesịrị ime ka anyị hụkwa ya n’anya ma na-erubere ya isi.—1 Jọn 4:19; 5:3. w17.09 21-22 ¶13-14

Satọdee, Ọgọst 17

Sọpụrụ nna gị na nne gị.—Efe. 6:2.

Ọ gaghị adịrị gị mfe ịzụ ụmụ gị ka ha mee ihe a Baịbụl kwuru ma ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị anaghị efe Jehova. Na-asọpụrụ di gị ma ọ bụ nwunye gị, si otú ahụ na-akụziri ụmụ gị ịna-asọpụrụkwa ya. Lekwasị anya n’ebe ndị ọ na-eme nke ọma, ma na-ekele ya maka ha. Ekwula di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu ọjọọ n’ihu ụmụ gị. Kama, mee ka ha ghọta na onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-efe Jehova ma ọ̀ bụ na ọ gaghị efe ya. Àgwà ọma ụmụ gị nwere ike mee ka di gị ma ọ bụ nwunye gị na-anaghị efe Jehova, fewe ya. Ụfọdụ ndị di nwere ike machie nwunye ha bụ́ Onye Kraịst ịkụziri ụmụ ha Baịbụl ma ọ bụ kpọrọ ha na-aga ọmụmụ ihe. N’agbanyeghị ya, nwunye bụ́ Onye Kraịst ga-agbalị kụziere ụmụ ya eziokwu Baịbụl. (Ọrụ 16:1; 2 Tim. 3:14, 15) Ọ bụ eziokwu na ọ ga-eme ihe di ya kwuru, ma ọ ka nwere ike ịgwa ụmụ ya ihe o kweere mgbe ọ bụla o kwere omume. Ụmụ ha ga-esi otú ahụ mụta banyere Jehova, mụtakwa ihe Jehova kwuru bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.—Ọrụ 4:19, 20. w17.10 14 ¶9-10

Sọnde, Ọgọst 18

Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.—Efe. 5:1.

Jehova kere mmadụ n’onyinyo ya. N’ihi ya, ma ndị na-efe Chineke ma ndị na-anaghị efe ya na-enwere mmadụ ibe ha ọmịiko, ihe gbasara mmadụ ibe ha na-emetụkwa ha n’obi. (Jen. 1:27) Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ndị nweere mmadụ ibe ha ọmịiko. Ì chetara ndị akwụna abụọ ahụ nọ n’ihu Sọlọmọn na-azọ nwa? Mgbe Sọlọmọn chọrọ ịmata onye nke mụrụ nwa ahụ, o kwuru ka a kpọwaa nwa ahụ abụọ. Mgbe nwaanyị nke mụrụ nwa ahụ nụrụ ya, o nweere nwa ya ọmịiko. N’ihi ya, ọ rịọrọ ka eze kunye nwaanyị nke ọzọ nwa ahụ. (1 Eze 3:23-27) Onye ọzọ nweere mmadụ ibe ya ọmịiko bụ ada Fero. Mgbe ọ hụrụ nwa ọhụrụ bụ́ Mozis, ọ ma na ọ bụ onye Hibru, marakwa na e kwesịrị igbu ya. Ma, ‘o nweere ya ọmịiko,’ kpebie na ya ga-azụ nwa ahụ ka ọ bụrụ nwa ya.—Ọpụ. 2:5, 6. w17.09 8-9 ¶2-3

Mọnde, Ọgọst 19

[Jehova] na-enwere unu ndidi.—2 Pita 3:9.

Ịdị umeala n’obi bara ezigbo uru. Ọ bụ àgwà ndị niile ji obi ha niile na-efe Jehova kwesịrị inwe. (Ilu 22:4) Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, ọgbakọ ga-adị n’otu, udo adịrịkwa na ya. Ọ ga-emekwa ka Jehova meere anyị amara. Pita onyeozi kwuru, sị: “Unu niile, werenụ ịdị nwayọọ n’obi kee onwe unu n’otú unu si emeso ibe unu, n’ihi na Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.” (1 Pita 5:5) N’ụwa taa, ndị mmadụ na-ewere onye dị nwayọọ na onye nwere ogologo ntachi obi, ya bụ, ndidi ka onye na-esighị ike. Ma, ọ bụghị eziokwu. Ọmarịcha àgwà ndị a bụ àgwà Onye kacha ike n’eluigwe na n’ụwa nwere. Ọ bụ ya kacha enwe ndidi, kachakwa adị nwayọọ. Chegodị otú Chineke si si n’ọnụ ndị mmụọ ozi zaa Ebreham na Lọt ajụjụ ha nọ na-ajụ ya. (Jen. 18:22-33; 19:18-21) Cheekwa otú o si nweere mba Izrel nupụụrụ ya isi ndidi ruo ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ ise.—Ezik. 33:11. w17.08 25 ¶13-14

Tuzdee, Ọgọst 20

Udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu . . . nche.—Fil. 4:7.

Kpeenụ ekpere. Unu ga-enwe udo nke Chineke. Ma, cheta na Pọl kwuru na “udo nke Chineke . . . karịrị echiche niile.” Gịnị ka ọ pụtara? Otú e si kwuo ya n’ụfọdụ Baịbụl bụ udo nke Chineke nke “karịrị ihe niile anyị chọrọ” ma ọ bụ “ihe karịrị ihe niile ndị mmadụ bu n’obi.” Ihe Pọl na-ekwu bụ na “udo nke Chineke” karịrị ihe ọ bụla anyị nwere ike ịtụ anya ya. N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike anyị agaghị ama ihe anyị ga-eme ma nsogbu bịara anyị, Jehova ma. O nwekwara ike ime ihe anyị na-atụghị anya ya. (2 Pita 2:9) Olee otú anyị ga-esi nwee “udo nke Chineke” n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara anyị? Otú anyị ga-esi eme ya bụ anyị na Chineke anyị, bụ́ Jehova, ịdị n’ezigbo mma. Ọ bụ naanị “n’aka Kraịst Jizọs,” bụ́ onye ji ndụ ya chụọ àjà, ka anyị ga-esi bịaruo ya nso. Ihe mgbapụta ahụ Chineke nyere anyị bụ ihe ọzọ dị ịtụnanya o meere anyị. O meela ka Jehova nwee ike ịgbaghara anyị mmehie, anyị enwee akọnuche dị ọcha ma bịaruo ya nso.—Jọn 14:6; Jems 4:8; 1 Pita 3:21. w17.08 10 ¶7; 12 ¶15

Wenezdee, Ọgọst 21

Obi na-amata na mkpụrụ obi mmadụ nọ ná mwute, onye ọzọ agaghịkwa ekere òkè n’ịṅụrị ọṅụ ya.—Ilu 14:10.

Mgbe ụfọdụ, ọ bụ naanị onye ihe mere na-ama otú obi si gbawaa ya. O nwekwara ike isiri ya ike ikwucha otú obi dị ya. Ọ bụrụgodị na mmadụ ekwuo otú obi dị ya, ọ naghị adịchara ndị ọzọ mfe ịghọta ihe ọ na-agbalị ikwu. O doro anya na ọ naghị adị mfe ịma ihe ị ga-agwa onye na-eru uju. Ọtụtụ mgbe, ihe na-akacha aba uru ị ga-eme bụ ‘iso ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.’ (Rom 12:15) O siere gị ike ịma ihe ị ga-agwa onye na-eru uju ihu na ihu, o nwere ike ịkara gị mfe ide ihe ị chọrọ iji kasie ya obi na kaadị, n’ozi iimel, n’ekwentị, ma ọ bụ n’akwụkwọ ozi. I nwere ike ide ihe otu amaokwu Baịbụl kwuru, àgwà ọma ụfọdụ pụrụ iche onye ahụ nwụrụ anwụ na-akpabu, ma ọ bụ ihe na-eme gị obi ụtọ ị na-echeta gbasara ya. Echefula uru ekpere gị ga-abara nwanna na-eru uju, ma nke gị na ya kpekọrọ ma nke i chetara ya n’ekpere. w17.07 14-16 ¶13-16

Tọzdee, Ọgọst 22

Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.—Mat. 19:6.

Gịnị ka di na nwunye kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ha anaghị ebi n’udo? Ọ bụrụkwanụ na ihe ha hụrụ abụghị ihe ha tụrụ anya ya? Ọ ga-adị mma ka ha cheta otú Jehova si meso ndị Izrel. Ọ gwara ha na ya bụ di ha, hanwa abụrụ nwunye ya. (Aịza. 54:5; 62:4) Mba Izrel nupụụrụ Jehova isi ọtụtụ ugboro. Otú ha si na-emeso Jehova dị ka ebe nwaanyị na-anaghị erubere di ya isi. Ma, Jehova agbakụtaghị ha azụ ngwa ngwa. O meere ha ebere ọtụtụ ugboro. O kweghịkwa akagbu ọgbụgba ndụ ha na ya. (Ọma 106:43-45) Ọ̀ bụ na ụdị ịhụnanya ahụ anaghị eme ka anyị bịarukwuo Jehova nso? N’ihi ya, di na nwunye bụ́ ndị hụrụ Jehova n’anya na-eṅomi ya. Ha nwee nsogbu, ha anaghị achọ ime ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị iji dozie ya. Ha ghọtara na Jehova ejikọtala ha, nakwa na ọ chọrọ ka ha “rapara” n’ahụ́ ibe ha. Ọ bụ naanị ịkwa iko ka Baịbụl kwuru ga-eme ka mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm gaa lụọ onye ọzọ. (Mat. 19:5, 9) Ọ bụrụ na ha na-agbalịsi ike idozi ihe ọ bụla na-esere ha, ha ga-egosi na ha na-akwado ọchịchị Jehova. w17.06 31 ¶17-18

Fraịdee, Ọgọst 23

Anya unu ga-emeghe, unu ga-adịkwa ka Chineke.—Jen. 3:5.

Ihe Setan bụ́ Ekwensu mere gosiri na ọ chọghị ka e kweta na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. O kwuru na otú Chineke si achị adịghị mma nakwa na ọ na-abụ, Jehova hụ ihe ga-abara ndị o kere eke uru, ya ejichie ya. Ihe Ekwensu kwuru pụtara na ụmụ mmadụ chịwa onwe ha, obi ga-aka adị ha ụtọ, ihe adịkwara ha ná mma. (Jen. 3:1-4) Setan kwukwara na o nweghị mmadụ ji obi ya niile na-erubere Chineke isi, na onye ọ bụla ga-ajụ ọchịchị Jehova ma ọnwụnwa tara akpụ bịara ya. (Job 2:4, 5) N’ihi ihe ahụ Ekwensu kwuru, Jehova enyela ohere ka ihe ndị na-emenụ mee ka o doo ewu na ọkụkọ anya na onye jụrụ ọchịchị Chineke enweghị ebe o ji azụ aga. O doro anya na Jehova ma na ihe ahụ niile Ekwensu kwuru bụ ụgha. Gịnịkwanụ mere o ji kwe ka oge na-aga, nye Setan ohere ịgbalịwa ka o gosi na ihe o kwuru bụ eziokwu? Azịza ajụjụ a gbasara ndị niile o kere eke. (Ọma 83:18.) A sị ka e kwuwe, Adam na Iv jụrụ ọchịchị Jehova. Otú ahụkwa ka ọtụtụ ndị ọzọ mere kemgbe ahụ. Ihe a nwere ike ime ka ụfọdụ ndị chewe ma ihe ahụ Ekwensu kwuru ọ̀ bụ eziokwu. w17.06 22-23 ¶3-4

Satọdee, Ọgọst 24

Gaanụ mee . . . ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.—Mat. 28:19.

Ime ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-akụziri gị ọtụtụ ihe. Ọ ga-eme ka ị mụta ịna-arụ ọrụ gị nke ọma, otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-ekwurịta okwu, otú ị ga-esi na-akata obi, na otú ị ga-esi na-adị akọ. (Ilu 21:5; 2 Tim. 2:24) Ma ihe ga-akacha mee ka ọrụ a na-eme gị obi ụtọ bụ na ọ ga-eme ka ị mata otú ị ga-esi jiri Baịbụl gwa ndị ọzọ ihe i kweere. Ị ga-amụtakwa otú gị na Jehova ga-esi na-arụkọ ọrụ. (1 Kọr. 3:9) Ọrụ a ga na-atọ gị ụtọ ọ bụrụgodị na ọtụtụ ndị ị na-ezi ozi ọma anaghị achọ ige ntị. Ọ bụghị ọrụ otu onye. Ọgbakọ na-agbakọ aka achọ ndị ji obi ha niile na-achọ ịmata Chineke. Ọ bụ eziokwu na naanị otu nwanna nwere ike ịhụ onye ga-emecha ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs, mmadụ niile so na-achọ onye ahụ. Mmadụ niile nwekwara ike iso ṅụrịa ọṅụ. Dị ka ihe atụ, Brandon sụrụ ụzọ oge niile afọ itoolu n’ebe ọtụtụ ndị na-anaghị ekwe echegharị. Ọ sịrị: “Ọ bụ eziokwu na o nwebeghị onye m mụụrụ ihe n’ebe a mere baptizim, ndị ọzọ emeela otú ahụ. Obi dị m ụtọ na m kpebiri iji oge m niile na-arụ ọrụ a.”—Ekli. 11:6. w17.07 23 ¶7; 24 ¶9-10

Sọnde, Ọgọst 25

Ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ.—1 Sam. 1:18.

Ọnwụnwa bịaara Hana bụ́ nwunye Elkana hụrụ n’anya. Ọ mụtaghị nwa, nwunye di ya bụ́ Penina ana-amụ ka ọkụkọ. (1 Sam. 1:4-7) Penina nọ na-akwa Hana emo “kwa afọ.” Ihe a mere ka obi na-ajọ Hana ezigbo njọ. Ọ kọọrọ Jehova nsogbu ya n’ekpere ka ọ kasie ya obi. (1 Sam. 1:12) Obi siri ya ike na Jehova ga-eme ka ọ mụta nwa ma ọ bụ si n’ụzọ ọzọ tie ya aka n’obi. Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, birikwa n’ụwa Setan na-achị, ọnwụnwa na mkpagbu ga na-abịara anyị. (1 Jọn 5:19) Ma, obi dị anyị ụtọ ịmata na Jehova bụ “Chineke nke nkasi obi niile.” (2 Kọr. 1:3) Otu ụzọ anyị nwere ike isi merie ọnwụnwa ndị na-abịara anyị bụ ịna-ekpe ekpere. Hana kọọrọ Jehova otú ọ dị ya n’obi. N’ihi ya, ọnwụnwa bịara anyị, ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị ịgwa Jehova nsogbu ahụ. Anyị kwesịrị ịrịọsi ya arịrịọ ike, nke bụ́ iji obi anyị niile kpesie ekpere ike ma kọọrọ ya otú ọ dị anyị n’obi.—Fil. 4:6, 7. w17.06 6 ¶10-11

Mọnde, Ọgọst 26

Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya karịa ihe ndị a?—Jọn 21:15.

N’otu oge mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ chọpụtara na ndị na-eso ụzọ ya gara igbu azụ enweghị nke ha gbutere, ya asị ha: “‘Wụnyenụ ụgbụ n’akụkụ aka nri nke ụgbọ mmiri unu, unu ga-egbute azụ̀.’ Ha wee wụnye ya, ma ha enwekwaghị ike ịdọbata ya n’ihi otú azụ̀ si dị ọtụtụ.” (Jọn 21:1-6) Mgbe Jizọs nyechara ha nri ụtụtụ, o lere Saịmọn Pita anya, gwa ya ihe a e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Gịnị bụ ihe ndị a Jizọs kwuru okwu ha? Pita ejighị ọrụ igbu azụ̀ eti epele. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na Jizọs na-ajụ ya ihe o weere ka ihe kacha mkpa. Ọ̀ bụ azụ̀ na ọrụ igbu azụ̀ dị Pita mkpa karịa Jizọs na ihe ndị ọ kụziri? Pita zara ya, sị: “Ee, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị n’anya nke ukwuu.” (Jọn 21:15) N’eziokwu, Pita mezuru ihe ahụ o kwuru. Si mgbe ahụ gawa, o mere ihe gosiri na ọ hụrụ Jizọs n’anya. Otú o si mee ya bụ ịgbasi mbọ ike n’ikwusa ozi ọma, mechaakwa bụrụ ogidi n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ahụ. w17.05 22 ¶1-2

Tuzdee, Ọgọst 27

Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?—Hib. 13:6.

Otú a Pọl si tụkwasị Jehova obi nyeere ya aka idi nsogbu ndị bịaara ya. O kweghị ka nsogbu ya mee ka ike gwụ ya. Gịnị nyeere ya aka ime otú ahụ? Ọ bụ ịtụkwasị “Chineke nke nkasi obi niile” obi, bụ́ “onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.” (2 Kọr. 1:3, 4) Ịgwa Chineke okwu n’ekpere bụ otú anyị na ya ga-esi na-adị n’ezigbo mma. (Ọma 86:3; 1 Tesa. 5:17; Rom 12:12) Anyị wepụtakwuo oge na-agwa Jehova otú obi dị anyị, ọ ga-eme ka anyị bịarukwuo Nna anyị nke eluigwe, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” nso. (Ọma 65:2) Ihe ọzọ bụ na anyị hụ otú Jehova si zaa ekpere anyị, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya. Ọ ga-edokwu anyị anya na “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso.” (Ọma 145:18) Inwe ụdị obi ike ahụ n’ebe Jehova nọ ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị ọzọ nwere ike ịbịara anyị n’ọdịnihu. w17.05 19 ¶9-10

Wenezdee, Ọgọst 28

Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.—1 Sam. 16:7.

Gịnị ka ị ga-eme ma ndị okenye kpebie ihe ị na-aghọtaghị ma ọ bụ ihe ị na-ekwetaghị? Ụdị ihe a ga-eme ka a mata ma ànyị tụkwasịrị Jehova na ọgbakọ ya obi. Olee otú ịdị umeala n’obi ga-esi chebe gị ma ụdị ọnwụnwa ahụ bịara gị? Ka anyị leba anya n’ụzọ abụọ. Nke mbụ bụ na ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị ghọta na anyị amaghị ihe niile merenụ. N’agbanyeghị otú anyị maruru, ọ bụ naanị Jehova na-enyocha obi. Ọ bụrụ na anyị amata eziokwu a doro anya, ọ ga-eme ka anyị dị umeala n’obi, ghọta na e nwere ihe ndị anyị na-amaghị, gbanweekwa otú anyị si ele okwu ahụ anya. Nke abụọ bụ na ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka irubere Jehova isi ma nwee ndidi, chere ya ka o mezie ihe ọ bụla bụ́ ikpe na-ezighị ezi. Sọlọmọn kwuru ụdị ihe ahụ mgbe o dere, sị: “Ọ gaghị adịrị onye ajọ omume mma ma ọlị, ọ gaghịkwa eme ka ụbọchị ndụ ya . . . dị ogologo.” (Ekli. 8:12, 13) N’eziokwu, ịdị umeala n’obi ga-abara ma anyịnwa ma onye ọ bụla ọ gbasara ezigbo uru.—1 Pita 5:5. w17.04 25-26 ¶10-11

Tọzdee, Ọgọst 29

N’eziokwu, e si n’ala ndị Hibru tọrọ m; n’ebe a kwa, ọ dịghị ihe ọ bụla m mere nke mere ha ga-eji tụba m n’ụlọ mkpọrọ.—Jen. 40:15.

O doro anya na e megburu Josef. O kwukwara na ya emeghị ihe ahụ e kwo tụọ ya mkpọrọ. Ọ bụ ya mere o ji gwa obu ihe ọṅụṅụ ahụ ka ọ gwa Fero gbasara ya. Maka gịnị? O kwuru, sị: “Ka m si n’ụlọ a pụta.” (Jen. 40:14) Ihe a Josef kwuru ọ̀ pụtara na o weere ụwa ya otú o si hụ ya ma gbachi nkịtị? Mbanụ. Ọ ma na e mere ya ọtụtụ ihe ọjọọ. Ọ kọwaara obu ihe ọṅụṅụ ahụ ihe merenụ n’ihi na ọ bụ onye nwere ike inyere ya aka. Ma, cheta na Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla gosiri na Josef gwara onye ọ bụla, ma ọ bụdị Fero, na ọ bụ ụmụnne ya tọọrọ ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ụmụnne Josef bịara n’Ijipt, ha na ya ekpezie, Fero nabatara ha, gwa ha ka ha were Ijipt ka obodo ha ma na-eri “ihe ọma dị n’ala Ijipt.”—Jen. 45:16-20. w17.04 20-21 ¶12-13

Fraịdee, Ọgọst 30

Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi! Lee otú a na-apụghị ịchọpụtacha ikpe ya, na otú a na-apụghị ịchọpụtacha ụzọ ya.—Rom 11:33.

Otu ihe mere o ji bụrụ Jehova kwesịrị ịchị bụ na ọ bụ ya ghọtara, marakwa otú e si elekọta eluigwe na ụwa. Dị ka ihe atụ, chegodị otú Chineke si mee ka Ọkpara ya nwee ike ịgwọ ọrịa ndị nyịrị ndị dọkịta. (Mat. 4:23, 24; Mak 5:25-29) Jehova ewereghị ya ka ọrụ ebube. Ọ ghọtara otú ahụ́ mmadụ si arụ ọrụ, nweekwa ike imezi ihe ọ bụla mebiri na ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe gbasara ikike o nwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ na igbochi ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ụwa a Setan na-achị ahụbeghị otú a ga-esi dozie okwu ndị mmadụ na-ese n’otu mba nakwa nke mba na mba na-ese. Ọ bụ naanị Jehova ma otú udo ga-esi adị n’ụwa. (Aịza. 2:3, 4; 54:13) Ka anyị na-amụ banyere ihe ọmụma Jehova na amamihe ya, obi dị anyị otú ahụ ọ dị Pọl onyeozi, bụ́ onye kwuru ihe e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. w17.06 28 ¶6-7

Satọdee, Ọgọst 31

Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.—Mak 10:9.

O nweghị ihe ọtụtụ ndị n’ụwa ji alụmdi na nwunye kpọrọ. E nwee ihe seere ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha, ha na-agba alụkwaghịm. Ma, Ndị Kraịst anaghị eme otú ahụ. (1 Kọr. 7:27) Ọ bụrụ na anyị emezughị nkwa anyị kwere mgbe anyị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ọ pụtara na anyị ghaara Chineke ụgha. Ị manụ na Chineke kpọrọ ndị ụgha asị. (Lev. 19:12; Ilu 6:16-19) Obi anaghị adị Jehova mma ma mmadụ jiri aghụghọ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm. (Mal. 2:13-16) Jizọs kụziri na naanị ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm bụ ma otu n’ime ha kwaa iko, onye nke ọzọ ajụ ịgbaghara ya. (Mat. 19:9; Hib. 13:4) Mmadụ chọọkwanụ ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya? Baịbụl kwukwara hoo haa ihe e kwesịrị ime. (1 Kọr. 7:10, 11) Baịbụl ekwughị na e nwere ihe kwesịrị ime ka di na nwunye hapụ ibe ha. Ma, ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye ekpebiela ịhapụ di ha ma ọ bụ nwunye ha n’ihi ihe ụfọdụ, dị ka ma ọ bụrụ na di ha ma ọ bụ nwunye ha ekweghị ha fee Jehova maka na ọ dapụla n’ezi ofufe ma ọ bụ na-akụ ha isi aba okpu. w17.04 7 ¶14-16

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya