Nọvemba
Fraịdee, Nọvemba 1
Jụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa . . . na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke.—Taị. 2:12.
Mmadụ ịrụ ahụ́ ya ụka nwekwara ike ịpụta mmadụ ijide onwe ya ka o nwee ike imekwu nke ọma n’àgwà ya, nakwa n’otú o si eche echiche. Anyị ebughị àgwà a pụta ụwa. Anyị ga-amụ ya amụ. Ọ bụrụ na ndị nne na nna ejiri ndidi na-azụ ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova,” ha na-enyere ụmụ ha aka ịna-ejide onwe ha na inwe amamihe. (Efe. 6:4) Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị matara Jehova mgbe ha torola eto. E nwekwara ike ikwu na ndị malitere ife Jehova ọhụrụ dị ka ụmụaka. Ọ bụ eziokwu na ha nwere ike ịna-ejidetụ onwe ha, ma ha abụbeghị Ndị Kraịst tozuru okè. Ma, ha malite “iyiri mmadụ ọhụrụ” ma na-agbalị ịdị ka Kraịst, ha na-eji nwayọọ nwayọọ na-etozu okè. (Efe. 4:23, 24) Mmadụ ijide onwe ya so n’ihe dị mkpa na-eme ka onye ahụ tozuo okè. w18.03 29 ¶3-4
Satọdee, Nọvemba 2
Na-elenụ ọbịa.—Rom 12:13.
Jehova na nzukọ ya kpọrọ anyị ka anyị na-abịa ọmụmụ ihe. Anyị chọrọ ka ahụ́ ruo onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe anyị ala, karịchaa ndị ọhụrụ. (Rom 15:7) Ọ bụ Jehova kpọkwara ha, n’ihi ya, anyị kwesịrị ime ka ahụ́ ruo ha ala n’agbanyeghị otú ha dị ma ọ bụ ụdị uwe ha yi bịa. (Jems 2:1-4) Ọ bụrụ na onye ọhụrụ bịara ọmụmụ ihe anyị enweghị onye ya na ya nọ n’oche, ì nwere ike ịgwa ya ka gị na ya nọrọ? Obi ga-adị ya ụtọ ma i nyere ya aka ịghọta ihe a na-amụ ma ọ bụkwanụ ịchọta ebe a na-agụ na Baịbụl. Ime otú ahụ ga-abụ ụzọ dị mma anyị ga-esi ‘na-ele ọbịa.’ Oge ndị si n’ọgbakọ ọzọ, ndị nlekọta sekit, ma ọ bụkwanụ mgbe ụfọdụ, ndị si n’alaka ụlọ ọrụ bịa n’ọgbakọ anyị kwuo okwu, bụ oge anyị ga-eji lee ụmụnna ndị a ọbịa. (3 Jọn 5-8) Otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ya bụ ịkpọ ha ka ha bịa rie nri n’ụlọ anyị. Ì nwere ike ime ya? w18.03 15 ¶5, 7
Sọnde, Nọvemba 3
Gịnị na-egbochi ime m baptizim?—Ọrụ 8:36.
Chegodị banyere otu nwoke onye Juu, bụ́ onye na-emesi Ndị Kraịst ike. A mụrụ ya n’obodo ndị bi na ya nyefere Chineke onwe ha. Ma, Jehova jụrụ ndị Juu n’ihi na ha erubereghị ya isi. Nwoke ahụ bu omenala okpukpe ndị Juu n’isi, ma mechaa mụta ihe ka mma. Jizọs si n’eluigwe gwa ya okwu. Gịnị ka nwoke a mere? O ji obi ụtọ nabata aka onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Ananayas nyeere ya. Baịbụl kwuru banyere nwoke a, sị: “O bilikwara, e wee mee ya baptizim.” (Ọrụ 9:17, 18; Gal. 1:14) O doro anya na ị matala na nwoke onye Juu ahụ bụ onye e mechara kpọwa Pọl onyeozi. Ma, cheta na ozugbo ọ ghọtara na Chineke ji Jizọs na-emezu nzube ya, e mere ya baptizim n’egbughị oge. (Ọrụ 22:12-16) Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị a na-amụrụ Baịbụl taa, ma hà bụ ndị na-eto eto ma hà bụ ndị torola eto. w18.03 5-6 ¶9-11
Mọnde, Nọvemba 4
Enweghị m ike ịgwa unu okwu dị ka ndị mmụọ nsọ na-achị, kama dị ka ndị anụ ahụ́ na-achị.—1 Kọr. 3:1.
Ihe adịghịrị Jekọb mfe otú ahụ ọ na-adịghịrị anyị taa. O diri nsogbu Ịsọ nwanne ya na-enye ya, bụ́ onye chọrọ igbu ya. O bighị na nke a. O dikwara ihe nna nwunye ya mere ya, bụ́ onye gbara mbọ imegbu ya. Jekọb ji ofufe Chineke kpọrọ ihe n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị n’oge ahụ bụ ndị “anụ ahụ́” na-achị. (1 Kọr. 2:14-16) O nwere okwukwe ná nkwa ahụ Jehova kwere Ebreham. O lekọtara ezinụlọ ya nke ọma n’ihi na ọ ma na ezinụlọ ya ga-eso emezu nkwa ahụ. (Jen. 28:10-15) Ihe Jekọb kwuru na ihe ndị o mere gosiri na o chefughị nkwa ahụ Jehova kwere. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ chọpụtara na Ịsọ nwanne ya nwere ike igbu ya, ọ gwara Chineke, sị: ‘Ana m arịọ gị, napụta m . . . Gị onwe gị asịwo, “N’ezie, m ga-emeso gị ihe n’ụzọ dị mma, m ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka ájá dị n’oké osimiri.”’ (Jen. 32:6-12) Jekọb nwere okwukwe ná nkwa ahụ ma gosi ya n’omume. w18.02 20 ¶9-10
Tuzdee, Nọvemba 5
Ọ bụ nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, bụrụkwa onye ezi omume, ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.—Job 1:8.
E nwere ọtụtụ ihe gbanwere ná ndụ Job. Tupu nsogbu abịara ya, ọ bụ “onye kasị baa ọgaranya ná ndị Ọwụwa Anyanwụ niile.” (Job 1:3) Ọ bụ aka ji akụ̀, onye a ma ama, na onye a na-akwanyere ezigbo ùgwù. (Job 29:7-16) N’agbanyeghị ihe ndị a niile, o cheghị na ọ ka ndị ọzọ mma, ma ọ bụkwanụ chee na o nweghị uru Chineke baara ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova kpọrọ ya, “ohu m.” Setan mere ka nsogbu zuo Job ahụ́. Ọ kpachaara anya mee ya ka obi gbawaa Job, nakwa ka o chewe na ọ bụ Chineke kpataara ya nsogbu ndị ahụ. (Job 1:13-21) Mmadụ atọ sịrị na ha bịara ịkasi ya obi ji okwu ọjọọ saa ya ahụ́. Ha gwara ya na Jehova na-ata ya ahụhụ maka ihe ọjọọ ndị o mere. (Job 2:11; 22:1, 5-10) Ma, Job akwụsịghị ife Chineke. Mgbe nsogbu ndị ahụ kwụsịrị, Jehova nyeghachiri Job ihe ndị ahụ o nweburu okpukpu abụọ, meekwa ka ọ dịkwuo ndụ otu narị afọ na iri anọ. (Jems 5:11) N’oge ahụ niile, ọ kwụsịghị iji obi ya niile na-efe Jehova. w18.02 6 ¶16; 7 ¶18
Wenezdee, Nọvemba 6
Ndị mmadụ ga-abụ . . . ndị na-anya isi, ndị mpako . . . ndị nganga fụliri elu.—2 Tim. 3:2, 4.
Ndị na-akpa àgwà ndị a na-achọkarịkwa ka ndị ọzọ na-eto ha ma ọ bụ na-akwanyere ha ùgwù pụrụ iche. Otu onye ọkà mmụta kwuru na mpako bụ otu ụzọ mmadụ si efe onwe ya kama ife Chineke. Ụfọdụ ekwuola na mpako bụ àgwà jọgburu onwe ya n’ihi na ndị dị mpako anaghị achọ iji anya ahụ ndị ọzọ dị mpako. Jehova kpọrọ mpako asị. Ọ kpọkwara “anya dị elu” asị. (Ilu 6:16, 17) Mpako na-eme ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma. (Ọma 10:4) Ọ bụ àgwà e ji mara Ekwensu. (1 Timoti 3:6) Ma ọ dị mwute na ụfọdụ ndị fere Jehova n’oge ochie ghọrọ ndị mpako. Dị ka ihe atụ, Ọzaya bụ́ eze Juda, jeere Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ. Ma Baịbụl kwuru, sị: “Otú ọ dị, ozugbo o siri ike, obi ya wee dị mpako nke na ọ kpataara onwe ya mbibi, o wee meso Jehova bụ́ Chineke ya omume ekwesịghị ntụkwasị obi wee bata n’ụlọ nsọ Jehova isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.” Eze Hezekaya mechakwara dịrị mpako, ruo oge ụfọdụ.—2 Ihe 26:16; 32:25, 26. w18.01 28 ¶4-5
Tọzdee, Nọvemba 7
Onye ọ bụla n’ime unu nọrọ n’ụlọ ya wepụta ihe ma debe ya dị ka ihe si na-agara ya nke ọma.—1 Kọr. 16:2.
Baịbụl gwara anyị na ndị ohu Chineke si n’ihe ndị ha nwere nye onyinye iji kwado ọrụ ya. N’oge ụfọdụ, ndị Chineke nyere onyinye mgbe e nwere ihe a chọrọ ịrụ. (Ọpụ. 35:5; 2 Eze 12:4, 5; 1 Ihe 29:5-9) Mgbe Ndị Kraịst nụrụ na ụnwụ dara na Judia nakwa na ụmụnna nọ ebe ahụ chọrọ ka a gbatara ha ọsọ enyemaka, ha “kpebisiri ike, onye ọ bụla n’ime ha dị ka o nwere ike inye, izigara ụmụnna bi na Judia ihe enyemaka.” (Ọrụ 11:27-30) E nwere ụzọ dị iche iche ha si nweta onyinye ndị ahụ. N’oge ndịozi Jizọs, ụfọdụ Ndị Kraịst rere ihe ndị ha nwere, dị ka ala ha ma ọ bụ ụlọ ha ma wetara ndịozi ego ha retara na ha. Ndịozi ji ego ndị ahụ nyere ụmụnna ndị nọ ná mkpa aka. (Ọrụ 4:34, 35) Ndị Kraịst ndị ọzọ na-ewepụtakwa ego iche iji nye onyinye maka ọrụ ndị a na-arụrụ Jehova. Ma ndị dara ogbenye ma ndị bara ọgaranya nyere onyinye.—Luk 21:1-4. w18.01 18 ¶7; 19 ¶9
Fraịdee, Nọvemba 8
Ụmụ okoro ga-ada mbà, ike ga-agwụkwa ha.—Aịza. 40:30.
N’agbanyeghị na anyị nwere ike ịma otú e si eme ọtụtụ ihe, o nwere ihe ụfọdụ anyị na-agaghị emeli n’ike anyị. Ọ bụ ihe anyị niile kwesịrị ịghọta. Ọ bụ eziokwu na Pọl onyeozi nwere ike ime ọtụtụ ihe, ma o melighị ihe niile ọ chọrọ ime. Mgbe ọ gwara Chineke otú ọ dị ya, Chineke gwara ya, sị: “A na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” Pọl ghọtara ihe a Chineke gwara ya. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (2 Kọr. 12:7-10) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Pọl ghọtara na ọ bụ naanị ihe ole na ole ka o nwere ike imeli n’ike nke aka ya. Ọ chọrọ enyemaka nke onye ka ya ike. Mmụọ nsọ Chineke nwere ike inye Pọl ike ọ chọrọ. O nwekwara ike ime ka ọ rụọ ọrụ ndị ọ na-enweghị ike ịrụli n’ike nke aka ya. Mmụọ nsọ Chineke nwekwara ike imere anyị otu ihe ahụ. Ọ bụrụ na Jehova enye anyị ike, anyị ga-adị ike. w18.01 9 ¶8-9
Satọdee, Nọvemba 9
Ọ bụ malite n’oge ị bụ nwa ọhụrụ ka ị maara ihe odide ndị ahụ dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe iji nweta nzọpụta.—2 Tim. 3:15.
Nwa gị gwa gị na ya chọrọ ime baptizim, jiri ihe dị iche iche nzukọ Jehova wepụtara maka nne na nna nyere ya aka. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ime ka nwa gị ghọta na nnyefe o nyefere Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim abụghị ihe e ji egwu egwu, nakwa na ọ ga-abara ya ọtụtụ uru. Ebe ị bụ nne ma ọ bụ nna, i kwesịrị ịzụlite ụmụ gị “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” Ihe a bụ nnukwu ọrụ, nakwa ùgwù Jehova kwanyeere gị. (Efe. 6:4) N’ihi ya, i kwesịrị ịkụziri ụmụ gị ihe Baịbụl kwuru ma nyere ha aka ka ha kweta n’ihe ha na-amụ. Ọ bụrụ na ha ekwetasie ike, ọ ga-eme ka ha nyefee Jehova onwe ha ma jiri obi ha niile na-ejere ya ozi. Ka Okwu Chineke, mmụọ nsọ ya, na mbọ niile ị na-agba nyere ụmụ unu aka ka ha “mara ihe iji nweta nzọpụta.” w17.12 22 ¶17, 19
Sọnde, Nọvemba 10
Ị ga-ebili ka i nweta òkè gị mgbe ụbọchị ndị a gwụchara.—Dan. 12:13.
Mgbe ọ fọrọ obere ka Daniel ruo otu narị afọ, ọ kaala ezigbo nká. À ga-akpọlite ya n’ọnwụ ma ọ nwụọ? À na-ajụkwa ajụ? N’isi ikpeazụ nke akwụkwọ Daniel, Chineke gwara ya okwu iji mee ka obi sie ya ike. Ọ gwara ya, sị: “Gị onwe gị, gawa ruo n’ọgwụgwụ; ị ga-ezukwa ike.” Daniel ma na ndị nwụrụ anwụ na-ezu ike, marakwa na “ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol,” bụ́ ebe ọ ga-aga n’oge na-adịghị anya. (Ekli. 9:10) Ma, nke Daniel agwụbeghị. Jehova kwere ya ezigbo nkwa n’ọdịnihu. Mmụọ ozi gwara Daniel ihe a e kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. O nweghị oge a gwara ya na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ. Daniel ga-anwụ ma zuru ike. Ma, mgbe Daniel nụrụ nkwa a bụ́ “Ị ga-ebili ka i nweta òkè gị,” ọ ghọtara na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ n’ọdịnihu. Nke a ga-abụ mgbe ogologo oge gacharala, ya bụ, “mgbe ụbọchị ndị a gwụchara.” w17.12 7 ¶17-18
Mọnde, Nọvemba 11
Otu onye akaebe agaghị enwe ike ịgbagide mkpụrụ obi akaebe ka e wee gbuo ya.—Ọnụ Ọgụ. 35:30.
Jehova gwara ndị okenye Izrel ka ha na-ekpe ikpe ziri ezi ka ya. Ihe mbụ ndị okenye kwesịrị ime bụ ịchọpụta ma ihe niile onye ahụ kwuru ọ̀ bụ eziokwu. Ihe ọzọ ha ga-eme mgbe ha na-ekpebi ma hà ga-emere ya ebere ma ọ bụ na ha agaghị emere ya bụ ịchọpụta ihe mere onye ahụ ji gbuo mmadụ, àgwà ya, na ihe ndị o mere n’oge gara aga. Ndị okenye ga-achọpụtakwa ma onye ahụ gburu mmadụ n’amaghị ama ọ̀ kpọrọ onye ahụ asị ma chọọ igbu ya. (Ọnụ Ọgụ. 35:20-24) Ọ bụrụ na e nwere ndị akaebe, ọ dịkarịala ala mmadụ abụọ ga-agba akaebe tupu ha ekpebie na onye ahụ leziri anya gbuo mmadụ. Ndị okenye chọpụtachaa nke bụ́ eziokwu, ha ga-echebara onye ahụ echiche, ọ bụghị naanị ihe o mere. Ndị okenye kwesịrị iji amamihe chọpụta ihe mere o ji mee ihe ahụ. Nke ka nke, ha kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nye ha mmụọ nsọ ya nke ga-enyere ha aka iji amamihe kpee ikpe ahụ, ime ebere na ikpe ikpe ziri ezi ka ya.—Ọpụ. 34:6, 7. w17.11 16 ¶13-14
Tuzdee, Nọvemba 12
Na-echebara ihe ndị a echiche.—1 Tim. 4:15.
Anyị mụtara ụfọdụ eziokwu bara ezigbo uru mgbe anyị malitere ịna-eso ndị Chineke. Anyị mụtara na ọ bụ Jehova kere anyị ma nye anyị ndụ nakwa na e nwere ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ. Anyị mụtakwara na ịhụnanya Chineke mere ka o jiri Ọkpara ya chụọ àjà iji gbapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Ihe ọzọ anyị mụtara bụ na Alaeze Chineke ga-eme ka ahụhụ niile kwụsị nakwa na anyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe udo na obi ụtọ ga-adị. (Jọn 3:16; Mkpu. 4:11; 21:3, 4) Otú anyị si ghọta amụma Baịbụl ma ọ bụ amaokwu ụfọdụ nwere ike ịgbanwe mgbe ụfọdụ. Ụdị ihe ahụ mee, anyị kwesịrị iwepụta oge mụọ ya nke ọma ma chebara ya echiche. (Ọrụ 17:11) Ọ bụghị naanị na anyị ga-agbalị ịghọta ihe gbara ọkpụrụkpụ dị iche n’otú anyị si ghọta ya ugbu a na otú anyị si ghọta ya mgbe mbụ, kama anyị kwesịrị ịgbalị ka anyị ghọta obere ihe ndị a kọwara na nke ọhụrụ ahụ. Anyị ga-esi otú ahụ tinye eziokwu ọhụrụ ahụ n’ụlọ akụ̀ anyị. w17.06 12-13 ¶15-16
Wenezdee, Nọvemba 13
Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ.—Kọl. 3:5.
Anyị kwesịrị ịkpachara anya, nke ka nke, ma e nwee ihe nwere ike ime ka anyị mee omume rụrụ arụ Jehova kpọrọ asị. Dị ka ihe atụ, nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ kwesịrị ịmalite mgbe ahụ ha kwekọrịtara ịlụ kwurịta ihe ha na-ekwesịghị ime ma a bịa n’ihe gbasara imetụ ibe ha aka, isusu ọnụ ma ọ bụ ịnọ naanị ha n’ebe na-ekwesịghị ekwesị. (Ilu 22:3) Ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị mee omume rụrụ arụ Jehova kpọrọ asị bụ mgbe anyị gara ihe banyere achụmnta ego ebe ọzọ, ma ọ bụ mgbe anyị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe anyị na-arụkọ ọrụ. (Ilu 2:10-12, 16) Anyị kwesịkwara ịkpachara anya mgbe obi na-adịghị anyị mma na mgbe owu na-ama anyị. Anyị nwedịrị ike chọwa ịnabata onye ọ bụla bịakwutere anyị. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, kọọrọ Jehova na ụmụnna ka ha nyere gị aka.—Ọma 34:18; Ilu 13:20. w17.11 26 ¶4-5
Tọzdee, Nọvemba 14
Wepụtaranụ onwe unu obodo mgbaba.—Jọsh. 20:2.
Obi anaghị adị Jehova mma ma mmadụ gbuo mmadụ ibe ya. Ọ bụrụ na onye Izrel akpachara anya gbuo mmadụ ibe ya, nwanne onye ahụ e gburu egbu nke a na-akpọ “onye ọbọ ọbara” ga-egbu onye ahụ gburu nwanne ya. (Ọnụ Ọgụ. 35:19) Onye ahụ gburu mmadụ ga-eji ndụ ya kwụọ ụgwọ ọbara ahụ ọ wụfuru. Ọ bụrụ na e gbughị onye ahụ ozugbo, ọ ga-eme ka Ala Nkwa ahụ gharazie ịdị nsọ. Ọ bụ ya mere Jehova ji nye iwu, sị: “Unu emerụla ala unu bi; n’ihi na ọ bụ [ịwụfu] ọbara na-emerụ ala.” (Ọnụ Ọgụ. 35:33, 34) Ma, olee ihe ndị Izrel na-eme ma mmadụ gbuo mmadụ n’amaghị ama? Ọ bụ eziokwu na ọ maghị ama gbuo mmadụ, ma ikpe ọbara ka mara onye ahụ. (Jen. 9:5) Ma, a ga-emere onye ahụ ebere. O nweere onwe ya ịgbaga n’otu n’ime obodo mgbaba isii e nwere. Ọ gbaba ebe ahụ, o nweghị ọkọ ga-akọ ya. Ọ ga-anọ ebe ahụ ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà nwụrụ.—Ọnụ Ọgụ. 35:15, 28. w17.11 9 ¶3-5
Fraịdee, Nọvemba 15
Onye maara ihe na-ekpuchi ihe ihere.—Ilu 12:16.
Otu nwanna nwaanyị bụ́ onye Ọstrelia kwuru, sị: “Nna di m anaghị achọ iji ntị anụ eziokwu. Anyị chọọ ịga hụ ya, mụ na di m na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka imeda obi gwa ya okwu ma ọ kpasuo anyị iwe. Anyị na-ekwu oge anyị na ya ga-eji kwurịta okwu n’ekwentị, ka anyị ghara ikwu ogologo okwu ga-eme ka anyị na ya rụwa ụka na-enweghị isi.” Ọ bụrụ na gị na ha arụrịta ụka, obi nwere ike ịjọ gị njọ, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ị hụrụ ha n’anya ma chọọkwa ịna-eme ihe dị ha mma. Ma, cheta na i kwesịrị ịhụ Jehova n’anya karịa ndị ezinụlọ unu. Nke a nwere ike ime ka ha ghọta na ime ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka mmadụ dị ndụ. Ma, è tere ụgba ma è tere azụ̀, cheta na ị gaghị amanye ndị ọzọ ikweta eziokwu. Ma, mee ka ha ghọta otú ime ihe Jehova chọrọ sirila baara gị uru. Chineke hụrụ anyị n’anya ma chọọ ka ha jiri aka ha họrọ ma hà ga-efe ya ma ọ bụ na ha agaghị efe ya otú ahụ o meere anyị.—Aịza. 48:17, 18. w17.10 15-16 ¶15-16
Satọdee, Nọvemba 16
Ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya, ọ bụghị n’ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.—1 Jọn 3:18.
Ọ bụghị naanị ikwu na anyị hụrụ mmadụ n’anya, kama, anyị kwesịrị inyere onye ahụ aka mgbe ọ dị mkpa. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwanna enweghị ihe e ji enyere ndụ aka, anyị ekwesịghị ịgwa ya naanị okwu ọma. (Jems 2:15, 16) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na ndị mmadụ nọ na-eme ka anyị na-ejechi ozi ọma anya, ọ bụghị naanị ịna-ekpe ekpere ka Jehova “ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Mat. 9:38) Jọn onyeozi kwuru na anyị kwesịrị ịhụ ndị mmadụ n’anya “n’omume nakwa n’eziokwu.” N’ihi ya, ịhụnanya anyị ekwesịghị “ịbụ nke ihu abụọ.” (Rom 12:9; 2 Kọr. 6:6) Mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike na-eme ka ọ̀ hụrụ mmadụ n’anya, ma ịhụnanya ahụ ọ̀ bụ nke ezigbo ya? Olee ihe o bu n’obi? Ma, è nwere ihe dị ka ịhụnanya nke ihu abụọ? Mbanụ. Nke a abụghị ịhụnanya ma otu ma otu n’ihi na ọ baghị uru. w17.10 8 ¶5-6
Sọnde, Nọvemba 17
Ị ga na-agụkwa ihe dị na ya n’olu dị ala ehihie na abalị, . . . mgbe ahụkwa, ị ga-eji amamihe mee ihe.—Jọsh. 1:8.
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Okwu Chineke na-akpa ike ná ndụ anyị, anyị kwesịrị ịna-agụ ya mgbe niile. Ọ bụrụ na o kwe omume, anyị kwesịrị ịna-agụ ya kwa ụbọchị. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ n’ime anyị anaghị enwe ohere. Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla, ma ọrụ ndị dị anyị ezigbo mkpa, mee ka anyị ghara ịna-agụ Baịbụl. (Efe. 5:15, 16) Ọtụtụ ụmụnna ewepụtala oge ha ga-eji na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. E nwere ndị na-agụ n’ụtụtụ, nwee ndị na-agụ n’ehihie, nweekwa ndị na-agụ n’abalị. Obi dị ha otú ahụ ọ dị otu ọbụ abụ, bụ́ onye dere, sị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum.” (Ọma 119:97) Ọ bụghị naanị na anyị ga na-agụ Baịbụl, anyị kwesịkwara ịna-echebara ihe ndị anyị na-agụ echiche. (Ọma 1:1-3) Ịtụgharị uche n’ihe ndị anyị na-agụ ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe ndị anyị na-amụta na ya. Ma ànyị na-agụ Okwu Chineke nke e dere n’akwụkwọ ma ànyị na-agụ ya n’Ịntanet, ihe kwesịrị ịbụ mkpa anyị bụ ikwe ka o ruo anyị n’obi ma gbanwee anyị. w17.09 24 ¶4-5
Mọnde, Nọvemba 18
Unu niile, nweenụ . . . obi ọmịiko.—1 Pita 3:8.
Inwe ọmịiko apụtaghị na anyị ga na-enwere ndị mmadụ ọmịiko mgbe niile. Dị ka ihe atụ, Eze Sọl nupụụrụ Jehova isi mgbe o chere na ọ na-enwere mmadụ ọmịikọ. O gbughị Egag, bụ́ onye iro ndị Chineke. N’ihi ya, Jehova jụrụ ya ka ọ ghara ịbụkwa eze. (1 Sam. 15:3, 9, 15) Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ na-enyocha obi, marakwa mgbe a na-ekwesịghị inwere mmadụ ọmịiko. (Ákwá 2:17; Ezik. 5:11) N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ndị niile na-enupụrụ ya isi. (2 Tesa. 1:6-10) Oge ahụ abụghị oge ọ ga-emetere ha ebere. Ma, ibibi ha bụ otú ọ ga-esi nweere ndị ezi omume ọ ga-echebe, ọmịiko. O doro anya na ọ bụghị anyị ga-ekwu ndị a ga-ebibi na ndị a na-agaghị ebibi. Ma, anyị kwesịrị ime ihe ọ bụla anyị ga-eme ugbu a iji nyere ndị mmadụ aka. w17.09 10-11 ¶10-12
Tuzdee, Nọvemba 19
Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ . . . njide onwe onye.—Gal. 5:22, 23.
Njide onwe onye bụ àgwà Jehova Chineke ga-enyeliri anyị aka ịmụta. Ọ naghị esiri Jehova ike ijide onwe ya. Ma, ọ na-esiri anyị ike ime otú ahụ n’ihi na anyị ezughị okè. Ọtụtụ nsogbu ndị mmadụ na-enwe taa bụ n’ihi na ha anaghị ejide onwe ha. Nke a nwere ike ime ka ha na-eyigharị ihe ndị ha chọrọ ime, ghara ịna-eme nke ọma n’ọrụ ha, nakwa n’ụlọ akwụkwọ. O nwekwara ike ime ka ndị mmadụ na-agwa ibe ha okwu ọjọọ, na-aṅụbiga mmanya ókè, na-alụ ọgụ, na-agba alụkwaghịm, na-eji ụgwọ n’enweghị isi, ma na-aṅụ ọgwụ ọjọọ. Nsogbu ndị ọzọ o nwere ike ịkpata bụ ịga mkpọrọ, obi ọjọọ, ibute ọrịa ọjọọ n’ihi ịkwa iko, ịtụ ime ọkwà, nakwa nsogbu ndị ọzọ. (Ọma 34:11-14) Ọtụtụ ndị anaghịzi ejide onwe ha. Nchọpụta ndị e mere n’agbata afọ 1941 na afọ 1949 gosiri na ndị mmadụ anachaghị ejide onwe ha. Ma, ihe ndị a chọpụtara n’oge na-adịbeghị anya gosiri na ọ kala njọ. O kwesịghị iju ndị na-amụ Baịbụl anya n’ihi na Baịbụl kwuru na otu n’ime ihe ndị gosiri na anyị bi “n’oge ikpeazụ” bụ na ndị mmadụ ‘anaghị ejide onwe ha.’—2 Tim. 3:1-3. w17.09 3 ¶1-2
Wenezdee, Nọvemba 20
Udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu . . . nche.—Fil. 4:7.
Anyị nwee “udo nke Chineke,” obi na-eru anyị ala. Anyị ma na Jehova na-elekọta anyị, chọọkwa ka ihe gaziere anyị. (1 Pita 5:10) Anyị ghọta ihe a, ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị ma ọ bụ mee ka anyị ghara ịda mbà. N’oge na-adịghị anya, oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya n’ụwa ga-abịa. (Mat. 24:21, 22) Anyị amachaghị ihe ga-eme anyị n’otu n’otu. Ma, anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị. Ọ bụ eziokwu na anyị amaghị ihe niile Jehova ga-eme, anyị ma Chineke anyị. Anyị ma ihe ndị o meere ndị fere ya n’oge gara aga. Anyị ahụla na n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, Jehova ga-ahụ na e mezuru ihe bụ́ nzube ya. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eme ya otú a na-atụghị anya ya. Mgbe ọ bụla Jehova meere anyị ihe anyị na-atụghị anya ya, anyị na-enwe “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” w17.08 12 ¶16-17
Tọzdee, Nọvemba 21
Nweenụ ndidi ruo n’oge ọnụnọ nke Onyenwe anyị.—Jems 5:7.
Ndị amụma bụ́ Aịzaya na Habakọk jụrụ Jehova, sị: “Ruo ole mgbe?” (Aịza. 6:11; Hab. 1:2) Onyenwe anyị bụ́ Jizọs Kraịst jụdịrị ajụjụ a mgbe ọ hụrụ na ọtụtụ ndị enweghị okwukwe. (Mat. 17:17) N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya ma anyị jụọ ajụjụ ahụ. O nwere ike ịbụ na a na-emegbu anyị, ma ọ bụ na anyị na nká na ọrịa na-alụ. O nwere ike ịbụ na anyị na-echegbu onwe anyị n’ihi “oge dị oké egwu, nke tara akpụ” anyị bi na ya. (2 Tim. 3:1) O nwekwara ike ịbụ na àgwà ọjọọ ndị mmadụ na-akpa na-eme ka ike na-agwụ anyị. Nke ọ bụla ọ bụ, obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na ndị ji obi ha niile fee Jehova n’oge gara aga jụrụ ajụjụ a nwere ike ịna-enye anyị nsogbu n’obi. Jehova amaghịkwa ha ikpe maka ya. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ma ụdị nsogbu ahụ bịara anyị? Jems onye na-eso ụzọ zara ajụjụ a n’ihe e kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. w17.08 3-4 ¶1-3
Fraịdee, Nọvemba 22
Jirinụ akụ̀ ajọ omume metara onwe unu ndị enyi.—Luk 16:9.
Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha jiri “akụ̀ ajọ omume” meta ndị enyi n’eluigwe. Otu n’ime ụzọ doro anya anyị ga-esi gosi na anyị tụkwasịrị Chineke obi bụ iji ego anyị na-akwado ozi ọma Jizọs kwuru na a ga-ekwusa n’ụwa niile. (Mat. 24:14) Otu nwata nwaanyị bi n’India nwere obere igbe ego ọ na-etinye ego kịrịkịrị, ma nke ọ gaara eji azụrụ ihe o ji egwuri egwu. Mgbe igbe ahụ juru, o nyere ego dị na ya ka e jiri ya kwado ozi ọma a na-ekwusa. N’India, otu nwanna nke nwere ugbo akị bekee ji ọtụtụ akị bekee nye onyinye, buga ya n’ọfis ndị nsụgharị dị na Malayalam. O kwuru n’obi ya na ebe ọ bụ na ụmụnna ndị ahụ na-azụ akị bekee, na ibunye ha akị ahụ ga-abara ha uru karịa inye ha ego. O gosiri na o nwere “ezi amamihe.” Ụmụnna bi na Gris na-emekwa ihe yiri ya. Ha na-enye ezinụlọ Betel mmanụ oliv, chiiz, na ihe ndị ọzọ a na-eri eri. w17.07 8 ¶7-8
Satọdee, Nọvemba 23
Bụọrọnụ anyị otu n’ime abụ Zayọn.—Ọma 137:3.
Ọ dịghị ndị Juu a dọọrọ n’agha gaa Babịlọn nke ịbụ abụ. E kwesịrị ịkasi ha obi. Ma, Jehova si n’aka Saịrọs eze Peshia napụta ha otú ahụ o buru n’amụma. Saịrọs meriri Babịlọn ma kwuo, sị: “Jehova . . . enyewo m . . . ọrụ iwuru ya ụlọ na Jeruselem. Onye ọ bụla n’ime unu, n’etiti ndị ya niile, ka Jehova bụ́ Chineke ya nọnyere ya. Ya lawa.” (2 Ihe 36:23) Chegodị otú ihe a si kasie ndị Izrel bi na Babịlọn obi. Ihe Jehova mere abụghị naanị ịkasi mba Izrel obi, kama ọ kasikwara onye ọ bụla n’ime ha obi. Ọ na-emekwa otú ahụ n’oge anyị a. Chineke “na-agwọ ndị e tiwara obi, ọ na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.” (Ọma 147:3) O doro anya na ihe banyere ndị nwere nsogbu na-emetụ Jehova n’obi, ma nsogbu ha ọ̀ bụ ọrịa ma ọ̀ bụ na obi gbawara ha. Ọ chọsiri ike ịna-akasi anyị obi na ịna-eme ka obi dị anyị mma. (Ọma 34:18; Aịza. 57:15) Ọ na-enye anyị amamihe na ike anyị ga-eji na-edi nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị.—Jems 1:5. w17.07 18 ¶4-5
Sọnde, Nọvemba 24
Ebe akụ̀ unu dị, n’ebe ahụ ka obi unu ga-adịkwa.—Luk 12:34.
Jehova kacha nwee akụ̀ ma n’eluigwe ma n’ụwa. (1 Ihe 29:11, 12) Ebe ọ bụ Nna na-emesapụ aka, ọ na-ewere akụ̀ ya nye ndị niile ma na ọ bara ezigbo uru. Obi dị anyị ụtọ na Jehova enyela anyị akụ̀ ya ndị bara ezigbo uru. Ụfọdụ n’ime ha bụ (1) Alaeze Chineke, (2) ozi ọma anyị na-ekwusa na-azọ ndụ, na (3) eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke. Ma, ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ghara iji akụ̀ ndị a kpọrọ ihe, ya bụ, tụfuo ha. Anyị chọọ ijidesi ha ike, anyị kwesịrị ịna-echebara uru ha bara echiche ma jiri ha kpọrọkwuo ihe. N’eziokwu, ọtụtụ n’ime anyị gbanwere ndụ anyị kpamkpam ka anyị soro ná ndị Alaeze Chineke ga-achị. (Rom 12:2) Ma, a ka nwere ihe anyị kwesịrị ịna-eme. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ịchụ akụnụba, agụụ mmekọahụ ọ bụla rụrụ arụ, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ghara ime ka anyị jiri ihe gbasara Alaeze Chineke gwuwe egwu.—Ilu 4:23; Mat. 5:27-29. w17.06 9 ¶1; 10 ¶7
Mọnde, Nọvemba 25
Ị̀ maara ya?—Job 38:21.
O nweghị ebe Chineke gwara Job kpọmkwem ihe mere o ji na-ata ahụhụ. Ihe mere Jehova ji gwawa Job okwu abụghị ka ọ kọwaara ya ihe mere o ji na-ata ahụhụ, ka à ga-asị na Chineke kwesịrị ịzara ọnụ ya. Kama, Jehova chọrọ inyere Job aka ka ọ ghọta na o nweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere Chineke. O nyekwaara Job aka ịghọta na e nwere ihe ndị ka mkpa o kwesịrị ichebara echiche. (Job 38:18-20) Ihe a nyeere Job aka ilewe nsogbu ya anya otú kwesịrị ekwesị. Mgbe Job dichara nsogbu ya niile, otú Jehova si gwa ya okwu ò gosiri na Jehova enweghị obi ebere? Mbanụ. Job echeghịkwa otú ahụ. N’agbanyeghị ahụhụ ahụ niile, Job mechara kwuo ihe gosiri na ihe Chineke gwara ya dị ya mma. O kwudịrị, sị: “Ekwukwaghị m ihe m kwuru, echegharịwo m n’ájá na ntụ.” Ọ bụ uru ndụmọdụ a kapịrị ọnụ Jehova ji obiọma nye ya baara ya. (Job 42:1-6) Mgbe Job nabatachara ndụmọdụ Chineke nyere ya ma gbanwee otú o si eche echiche, Jehova mere ka ndị ọzọ mata na obi dị ya ụtọ maka otú Job si rubere ya isi n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara ya.—Job 42:7, 8. w17.06 24-25 ¶11-12
Tuzdee, Nọvemba 26
Meri họọrọ òkè dị mma, a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.—Luk 10:42.
Ihe ga-enyere anyị aka ịmata ma ọrụ ego ò meela ka anyị na-eleghara ihe gbasara ofufe Chineke anya bụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ịrụ ọrụ ego ọ̀ na-atọ m ụtọ, ma o ruzie n’ihe gbasara ofufe Chineke, o nweghị ihe m ga-eji ya kpọrọ?’ Anyị chebara ihe ndị a echiche, ọ ga-enyere anyị aka ịmata ihe anyị ji kpọrọ ihe karịchaa. Jizọs kụziiri anyị otú anyị ga-esi jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe karịa ihe ndị ọzọ. O nwere mgbe ọ gara n’ụlọ Meri na nwanne ya nwaanyị bụ́ Mata. Mata nọ na-agba kpuru kpuru kpuru ka o sie nri, Meri anọrọ n’akụkụ ụkwụ Jizọs na-egere ihe ọ na-ekwu. Mgbe Mata gwara Jizọs na Meri ekweghị enyere ya aka, Jizọs gwara ya ihe a e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. (Luk 10:38-42) Jizọs ji ihe ahụ kụziere Mata ihe bara uru. Ọ bụrụ na anyị achọghị ka ihe ndị ọzọ megharịa anyị anya, chọọkwa igosi na anyị hụrụ Jizọs n’anya, anyị kwesịrị ịna-ahọrọ “òkè dị mma,” ya bụ, iji ihe gbasara ife Chineke kpọrọ ihe. w17.05 24 ¶9-10
Wenezdee, Nọvemba 27
Ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị nna gị.—Ilu 1:8.
Ọ bụ nne na nna ka Jehova nyere ọrụ ịzụ ụmụ ha, ọ bụghị nne nne na nna nna ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ. (Ilu 31:10, 27, 28) Ma, ndị nne na nna na-amaghị asụsụ ndị ebe ha bi nwere ike ịchọ ka e nyere ha aka kụziere ụmụ ha ihe ka o ruo ha n’obi. Ịchọ ụdị enyemaka ahụ apụtaghị na ndị nne na nna na-agbara ọrụ e nyere ha ịzụ ụmụ ha ọsọ. Kama, o nwere ike iso n’otú ha ga-esi zụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) Dị ka ihe atụ, ndị nne na nna nwere ike ịgwa ndị okenye ka ha tụọrọ ha aro otú ha ga-esi na-eduzi ofufe ezinụlọ nakwa ka ha nyere ha aka chọta ndị ezigbo mmadụ ha na ụmụ ha ga na-akpa. Ha nwekwara ike ịna-akpọ ndị ezinụlọ ọzọ ka ha soro ha nwee ofufe ezinụlọ kwa mgbe kwa mgbe. Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ ndị na-eto eto na-eme nke ọma ma ha soro Ndị Kraịst ndị ọzọ na-aga ozi ọma, na-emekọkwa ihe ndị ọzọ ọnụ.—Ilu 27:17. w17.05 11-12 ¶17-18
Tọzdee, Nọvemba 28
Gbaga n’Ijipt.—Mat. 2:13.
Mgbe mmụọ ozi Jehova gwara Josef na Eze Herọd chọrọ igbu Jizọs, Jizọs na ndị mụrụ ya ghọrọ ndị gbara ọsọ ndụ n’Ijipt. Ha nọ ebe ahụ ruo mgbe Herọd nwụrụ. (Mat. 2:14, 19-21) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, a malitere ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs, ‘chụsasịa ha n’ógbè ndị dị gburugburu Judia na Sameria.’ (Ọrụ 8:1) Jizọs ma na ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya ga-agbapụ n’ụlọ ha gbaga ebe ọzọ. Ọ sịrị ha: “Mgbe ha kpagburu unu n’otu obodo, gbalaganụ n’obodo ọzọ.” (Mat. 10:23) Ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova so ná ndị a gbara ọsọ ndụ. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ọtụtụ n’ime ha gbazi aka ihe niile, ndị ha hụrụ n’anya anwụọkwa. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike nwee nsogbu mgbe ha na-agba ọsọ ndụ ma ọ bụ mgbe ha bi n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ, bụ́ ebe ndị mmadụ na-agba asịrị, na-aṅụ oké mmanya, na-agba chaa chaa, na-ezu ohi, na-akwakwa iko. Ma, obi na-esi ha ike ma ha cheta na ha ga-emecha si n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ pụta otú ahụ ndị Izrel si n’ala ịkpa pụta.—2 Kọr. 4:18. w17.05 3-4 ¶2-5
Fraịdee, Nọvemba 29
Ndị hụrụ iwu gị n’anya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghịkwa ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.—Ọma 119:165.
N’ọgbakọ, e nwere ike ime gị ma ọ bụ onye ị ma ihe yiri ka ọ̀ bụ mmegbu, ma ọ bụkwanụ unu ahụ ebe e mere ya onye ọzọ. Ekwela ka o mee ka ị sụọ ngọngọ. Kama, ebe anyị ji obi anyị niile na-efe Chineke, anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi anyị niile ma na-ekpe ekpere ka o nyere anyị aka. Anyị kwesịkwara icheta na o nwere ike ịbụ na anyị amaghị otú ihe niile si mee. Anyị ma nke ọma na o nwere ike ịbụ na ezughị okè mere ka anyị chee na ihe ahụ bụ mmegbu. Anyị ekwesịghị ịna-agba asịrị n’ihi na ime otú ahụ ga-eme ka ihe kakwuo njọ. N’ikpeazụ, kama idozi nsogbu ahụ n’onwe anyị, ka anyị kpebisie ike ịtụkwasị Jehova obi, nwee ndidi ma chere Jehova ka o dozie ya. O doro anya na anyị mee otú ahụ, obi ga-adị Jehova mma, ọ ga-agọzikwa anyị. N’eziokwu, ka obi sie anyị ike na Jehova, bụ́ ‘Onyeikpe ụwa dum,’ ga-eme ihe dị mma mgbe niile, “n’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.”—Jen. 18:25; Diut. 32:4. w17.04 22 ¶17
Satọdee, Nọvemba 30
Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya . . . Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere.—Aịza. 55:7.
Gịnị ga-eme ndị jụrụ ịgbanwe, bụ́ ndị na-akwado ihe ọjọọ ruo mgbe oké mkpagbu ahụ ga-abịa? Jehova kwere nkwa na ọ ga-ebibi ndị ọjọọ niile n’ụwa. (Ọma 37:10) Ndị ọjọọ nwere ike iche na ha ga-agbanahụ ikpe ahụ. Ọtụtụ ndị amụtala izochi ihe ọjọọ ha mere. Ọtụtụ mgbe, a naghịkwa ata ha ahụhụ maka ihe ha metara. (Job 21:7, 9) Ma, Baịbụl gwara anyị, sị: ‘Anya Chineke na-ahụ ụzọ mmadụ, ọ na-ahụkwa nzọụkwụ ya niile. Ọchịchịrị ma ọ bụ oké itiri ọ bụla adịghị, bụ́ ebe ndị na-eme ihe ọjọọ ga-ezo.’ (Job 34:21, 22) O nweghị ebe mmadụ ga-ezo ka Jehova Chineke ghara ịhụ ya. O nweghị onye ga-aghọgbuli Chineke. Ọ na-ahụ ihe niile ndị ọjọọ na-eme. A lụchaa agha Amagedọn, anyị ga-ele anya n’ebe ha na-anọ, ma anyị agaghị ahụ ha. Ha agaghịzi adị ruo mgbe ebighị ebi.—Ọma 37:12-15. w17.04 10 ¶5