Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es20 p. 47-57
  • Mee

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2020
  • Isiokwu Nta
  • Fraịdee, Mee 1
  • Satọdee, Mee 2
  • Sọnde, Mee 3
  • Mọnde, Mee 4
  • Tuzdee, Mee 5
  • Wenezdee, Mee 6
  • Tọzdee, Mee 7
  • Fraịdee, Mee 8
  • Satọdee, Mee 9
  • Sọnde, Mee 10
  • Mọnde, Mee 11
  • Tuzdee, Mee 12
  • Wenezdee, Mee 13
  • Tọzdee, Mee 14
  • Fraịdee, Mee 15
  • Satọdee, Mee 16
  • Sọnde, Mee 17
  • Mọnde, Mee 18
  • Tuzdee, Mee 19
  • Wenezdee, Mee 20
  • Tọzdee, Mee 21
  • Fraịdee, Mee 22
  • Satọdee, Mee 23
  • Sọnde, Mee 24
  • Mọnde, Mee 25
  • Tuzdee, Mee 26
  • Wenezdee, Mee 27
  • Tọzdee, Mee 28
  • Fraịdee, Mee 29
  • Satọdee, Mee 30
  • Sọnde, Mee 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2020
es20 p. 47-57

Mee

Fraịdee, Mee 1

Unu ga-ahụkwa onye mbịarambịa n’anya.​—Diut. 10:19.

N’oge na-adịbeghị anya, e nweela ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ gbaga n’ọtụtụ mba. I nwere ike ịmụta otú e si ekele mmadụ n’asụsụ ha. I nwekwara ike ịmụ okwu ụfọdụ nwere ike ime ka ha nwee mmasị. I nweziri ike isi na jw.org gosi ha vidio na akwụkwọ anyị ndị dị n’asụsụ ha. Jehova mere ka anyị nwee Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ka anyị nwee ike ịmụtakwu otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma. Ihe ndị anyị na-amụta n’ọmụmụ ihe a na-enyere ọtụtụ ndị aka ịkata obi ịga nletaghachi na ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Ndị nne na nna, kụzierenụ ụmụ unu ka ha na-aza ajụjụ otú ha si ekwu okwu, si otú ahụ mee ka ìhè ha na-enwu. Ajụjụ dị nkenke ụmụaka si n’ala ala obi ha zaa emeela ka ụfọdụ ndị na-abịa ọmụmụ ihe anyị bata n’ọgbakọ.​—1 Kọr. 14:25. w18.06 22-23 ¶7-9

Satọdee, Mee 2

Na-anabatanụ ibe unu, dị nnọọ ka Kraịst nabatara anyị.​—Rom 15:7.

Ọ dị mma ka anyị cheta na o nwere mgbe anyị bụ “ndị mba ọzọ,” ma ọ bụ ndị mbịarambịa nọ Chineke n’ebe dị anya. (Efe. 2:12) Ma, Jehova ji “ụdọ ịhụnanya” dọta anyị n’ebe ọ nọ. (Hos. 11:4; Jọn 6:44) Kraịst nabatakwara anyị. E nwere ike ịsị na o megheere anyị ụzọ ka anyị soro n’ezinụlọ Chineke. Ebe ọ bụ na Jizọs ji obi ya niile nabata anyị n’agbanyeghị na anyị ezughị okè, anyị kwesịkwara ịnabata mmadụ niile. Ka anyị na-eru ọgwụgwụ ụwa ochie a nso, o doro anya na adịghị n’otu, ịkpọasị, na tigbuo zọgbuo ga na-arị ibe ha elu. (Gal. 5:​19-21; 2 Tim. 3:13) Ma, ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị na-achọ amamihe nke si n’elu nke ga-enyere anyị aka ka anyị na-enwekwu udo ma ghara ịkpọ ndị mmadụ asị. (Jems 3:​17, 18) Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ndị enyi si ná mba dị iche iche, na-anabata otú ha si eme ihe, na-amụdị asụsụ ha ma o kwe omume. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, udo anyị ga-asọ ka osimiri, ikpe ziri ezi anyị adịkwa ka ebili mmiri nke oké osimiri.​—Aịza. 48:​17, 18. w18.06 12 ¶18-19

Sọnde, Mee 3

[Yirinụ] akpụkpọ ụkwụ bụ́ ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo n’ụkwụ unu.​—Efe. 6:15.

Onye agha Rom na-eyighị akpụkpọ ụkwụ ya adịbeghị njikere ịga agha. Ihe e ji mee akpụkpọ ụkwụ ya bụ akpụkpọ anụ atọ a nyakọtara ọnụ. Otú a e si rụọ ya mere ka akpụkpọ ụkwụ ahụ sie ezigbo ike, ya adịkwa ya mma n’ụkwụ. Akpụkpọ ụkwụ ndị agha Rom na-eyi na-enyere ha aka ịlụ agha nke ọma, ma ụdị nke Ndị Kraịst na-eyi na-enyere ha aka ikwusa ozi ọma nke udo. (Aịza. 52:7; Rom 10:15) N’agbanyeghị ya, ọ chọrọ ka anyị kata obi zie ndị mmadụ ozi ọma mgbe ọ dị mkpa. Bo, onye dị afọ iri abụọ kwuru, sị: “Ụjọ na-atụ m izi ụmụ klas m ozi ọma. Ama m na ihere mere m. M cheta ya, amaghị m ihe kpatara ya. Ma ugbu a, obi na-atọ m ụtọ na m na-ezi ndị ọgbọ m ozi ọma.” Ọtụtụ ndị na-eto eto achọpụtala na obi na-eru ha ezigbo ala izi ozi ọma ma ha kwadebe nke ọma. w18.05 29 ¶9-11

Mọnde, Mee 4

Na-amị mkpụrụ dị ukwuu.​—Jọn 15:8.

Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “M na-enye unu udo m.” (Jọn 14:27) Olee otú udo a ga-esi nyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma? Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma, anyị na-enwe udo n’ihi na anyị ma na anyị na-eme ka obi na-atọ Jehova na Jizọs ụtọ. (Ọma 149:4; Rom 5:​3, 4; Kọl. 3:15) Mgbe Jizọs kwuchara na ya chọrọ ka ọṅụ ndịozi ya na-enwe “zuo ezu,” ọ gwara ha ihe mere o ji dị mkpa ka ha jiri obi ha niile na-ahụ ibe ha n’anya. (Jọn 15:​11-13) O kwukwara, sị: Ana  m akpọ unu ndị enyi m.” O nweghị ihe magburu onwe ya karịa mmadụ na Jizọs ịbụ enyi. Olee ihe ndịozi Jizọs ga-eme ka ha na Jizọs na-abụ enyi? Ha ‘ga-aga n’ihu na-amị mkpụrụ.’ (Jọn 15:​14-16) Afọ abụọ tupu mgbe ahụ, Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze eluigwe eruwo nso.’” (Mat. 10:7) N’ihi ya, ná mgbede ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya nọ, ọ gbara ha ume ka ha nọgide na-ekwusa ozi ọma.​—Mat. 24:13; Mak 3:14. w18.05 20-21 ¶15-16

Tuzdee, Mee 5

Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.​—Gal. 6:7.

Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, lekwasị anya ná mkpebi i mere ijere Jehova ozi . Nke a pụtara na ị ga-eji oge gị niile na-eme ihe ndị i kpebiri ime n’ozi Jehova. Ndị ọgbọ gị nwere ike iji oge ha niile na-ekpori ndụ. Ha nwekwara ike ịgwa gị ka i soro ha. I kwesịrị igosi ndị ọzọ na mkpebi ahụ i mere dị gị ezigbo mkpa. Ekwela ka ndị ọgbọ gị megharịa gị anya. E nwere ọtụtụ ụzọ ị ga-esi mee ka ndị ọgbọ gị ghara imegharị gị anya. Dị ka ihe atụ, gbaara ụdị ọnọdụ ọ bụla nwere ike ime ka ị baa ná nsogbu, ọsọ. (Ilu 22:3) Chee gbasara nsogbu ndị o nwere ike ịkpatara gị ma i soro ha na-eme ihe ọjọọ. Ihe ọzọ bụ ikweta na e kwesịrị inye gị ndụmọdụ. Ọ bụrụ na ị dị umeala n’obi, ọ ga-eme ka i gee ndị mụrụ gị nakwa ụmụnna ndị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ, ntị. (1 Pita 5:​5, 6) Ị̀ ga-adị umeala n’obi ma nabata ndụmọdụ ga-abara gị uru? w18.04 28-29 ¶14-16

Wenezdee, Mee 6

Jidesienụ ihe unu nwere ike ruo mgbe m ga-abịa. Onye meriri emeri, debekwa ihe m nyere n’iwu ruo ọgwụgwụ, m ga-enye ya ikike ịchị mba niile.​—Mkpu. 2:​25, 26.

N’ozi Jizọs zigaara ụfọdụ ọgbakọ dị n’Eshia Maịnọ, o gosiri na obi dị ya ụtọ maka ọrụ ha rụrụ. Dị ka ihe atụ, ihe o ji bido ozi o zigaara ọgbakọ dị na Tayataịra bụ: “Amaara m ihe ndị ị na-eme, na ịhụnanya na okwukwe na ije ozi na ntachi obi gị, amakwaara m na ihe ndị ị na-eme n’oge na-adịbeghị anya karịrị ndị i mere n’oge gara aga.” (Mkpu. 2:19) Ihe Jizọs jara ha mma maka ya abụghị naanị maka ọrụ ha rụsiri ike, kama ọ jakwara ha mma maka àgwà ọma ha, bụ́ ndị mere ka ha rụọ ọrụ ọma ndị ahụ. N’agbanyeghị na Jizọs ga-agwa ụfọdụ n’ime ha ebe ha ga-emezi ihe, ọ gbara ha ume mgbe ọ na-ebido ozi ahụ, gbaakwa ha ume mgbe ọ na-emechi. (Mkpu. 2:​27, 28) Chegodị ụdị ikike Jizọs nwere ebe ọ bụ ya bụ onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụghị iwu na ọ ga-ekele anyị maka ihe ndị anyị na-emere ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-ekele anyị. Ndị okenye kwesịkwara iṅomi ya. w19.02 16 ¶10

Tọzdee, Mee 7

Judas na Saịlas . . . gbara ụmụnna ahụ ume, meekwa ka ha sie ike, site n’ịgwa ha ọtụtụ okwu.​—Ọrụ 15:32.

Òtù na-achị isi n’oge ndịozi Jizọs gbara ma ndị na-edu ndú n’ọgbakọ nakwa Ndị Kraịst niile ume. Ha zipụrụ Pita na Jọn, bụ́ ndị sokwa n’òtù na-achị isi, ka ha gaa kpeere ndị ahụ ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ ekpere ka ha nweta mmụọ nsọ. (Ọrụ 8:​5, 14-17) Ihe a òtù na-achị isi mere gbara Filip na ndị ahụ o ziri ozi ọma ha aghọọ Ndị Kraịst ume. Taa, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-agba ma ndị nọ n’ozi oge niile pụrụ iche ma ụmụnna niile ume. Anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi ume ha na-agba anyị, otú ahụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs si ṅụrịa ọṅụ. N’afọ 2015, Òtù Na-achị Isi wepụtara broshọ Lọghachikwute Jehova. Ihe mere ha ji wepụta ya bụ ka e jiri ya gbaa ndị hapụrụ ọgbakọ ume ka ha lọghachi n’ọgbakọ. w18.04 19 ¶18-20

Fraịdee, Mee 8

Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.​—Jọn 8:32.

Ndị mmadụ nwere ike ị na-eche na ọ bụrụ na ha enwerekwuo onwe ha, na ihe ga-akara ha mma. Ma, ọ̀ bụ eziokwu? Olee otú i chere ụwa gaara adị ma a sị na e nweghị iwu ọ bụla? Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia kwuru na iwu obodo dị iche iche na-echebe ndị mmadụ, ma na-egbochi ha ime ihe ụfọdụ ha chọrọ ime. Nke a anaghị adị mfe mgbe niile. Ọ bụ ya mere e ji nwee ọtụtụ iwu, ọtụtụ ndị ọkàiwu, nakwa ndị ọkàikpe na-akọwara ha ndị mmadụ, ma na-ahụ na ha debere ha. E nwere ihe abụọ Jizọs kwuru anyị ga-eme ka anyị nwee ike inwe ezigbo nnwere onwe. Nke mbụ, anyị ga-ekweta eziokwu ndị ọ kụziri. Nke abụọ, anyị ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya. Ime ihe ndị a ga-eme ka anyị nweta ezigbo nnwere onwe. Ma, olee ihe anyị ga-enwere onwe anyị na ya? Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme mmehie bụ ohu nke mmehie. . . . Ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga-enwere onwe unu n’ezie.”​—Jọn 8:​34, 36. w18.04 6-7 ¶13-14

Satọdee, Mee 9

Unu niile, . . . ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ unu n’obi.​—1 Pita 3:8.

Obi na-atọ anyị ụtọ ma anyị na ndị na-eche gbasara anyị na ndị chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma nọrọ. Ha na-agbalị ịmata ihe anyị na-eche na otú obi dị anyị. Ha na-achọpụtakwa ihe bụ́ mkpa anyị ma nyere anyị aka, mgbe ụfọdụ, ha na-eme ya tupu anyị agwa ha ka ha nyere anyị aka. Obi na-adị anyị ụtọ ma ndị mmadụ gosi na ‘ihe banyere anyị na-emetụ ha n’obi.’ Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị igosi ndị mmadụ na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. Ma, ọ naghị adị mfe mgbe niile. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na anyị ezughị okè. (Rom 3:23) Anyị na-echekarị gbasara onwe anyị. N’ihi ya, anyị ga-agbasi mbọ ike ka anyị na-eche gbasara ndị ọzọ. O nwere ike isiri ụfọdụ n’ime anyị ike igosi ndị ọzọ na ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi n’ihi otú e si zụọ anyị ma ọ bụkwanụ n’ihi ihe ndị merela ná ndụ anyị. Ihe ọzọ bụ na anyị nwere ike ịmụta àgwà ndị bi n’ebe anyị bi na-akpa. N’oge ikpeazụ a, ọtụtụ ndị achọdịghị ịma otú obi na-adị ndị ọzọ. Kama, ha bụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya.” (2 Tim. 3:​1, 2) Ọ bụrụ na anyị ana-eṅomi Jehova na Ọkpara ya Jizọs Kraịst, ọ ga-eme ka anyị na-egosikwu na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi. w19.03 14 ¶1-3

Sọnde, Mee 10

Chebe obi gị.​—Ilu 4:23.

Iwu ikpeazụ n’ime Iwu Iri ahụ kwuru ka mmadụ ghara ịna-enwe anyaukwu ma ọ bụ ihe onye ọzọ nwere ịna-agụ ya agụụ. (Diut. 5:21; Rom 7:7) Jehova nyere iwu a iji kụzie ihe dị ezigbo mkpa, ya bụ na ndị ya kwesịrị ichebe obi ha. Ọ ma na tupu mmadụ emee ihe ọjọọ, ọ na-ebu ụzọ eche ya n’obi ya. Ụdị ihe a mere Eze Devid. Ọ bụ ezigbo mmadụ. Ma otu ụbọchị, nwunye onye ọzọ gụrụ ya agụụ. Ihe a mere ka o mee mmehie. (Jems 1:​14, 15) Devid kwara iko, gbalịa imegharị di nwaanyị ahụ anya ma mechaa gbuo ya. (2 Sam. 11:​2-4; 12:​7-11) Ihe Jehova na-ahụ abụghị naanị otú mmadụ dị n’elu ahụ́. Ọ na-ahụ ihe dị anyị n’obi. (1 Sam. 16:7) E nweghị ihe anyị na-eche n’echiche, otú obi dị anyị ma ọ bụ ihe anyị na-eme ọ na-amaghị. Ọ na-ahụ ihe ọma ndị dị n’obi anyị, chọọkwa ka anyị na-eme ha. Ma, ọ chọrọ ka anyị chọpụta mgbe ihe ọjọọ batara anyị n’obi ma wepụ ya tupu ya emee ka anyị mee ihe ọjọọ.​—2 Ihe 16:9; Mat. 5:​27-30. w19.02 21 ¶9; 22 ¶11

Mọnde, Mee 11

Chọọnụ Jehova, unu niile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa . . . Chọọnụ ịdị umeala n’obi.​—Zef. 2:3.

Na Baịbụl, a kọwara Mozis dị ka onye “dị nnọọ umeala n’obi karịa mmadụ niile nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụ. 12:3) Ma, nke a ọ̀ pụtara na ọ bụ onye na-esighị ike, onye ọ na-esiri ike ime mkpebi, nakwa onye na-anaghị akwụrụ n’ụkwụ ya? Ọ bụ otú a ka ụfọdụ ndị si akọwa onye dị umeala n’obi. Ma, nke ahụ abụghị eziokwu. Mozis bụ ohu Chineke dị ike, onye na-emere onwe ya mkpebi, nakwa onye nwere obi ike. Jehova nyeere ya aka ya agakwuru eze Ijipt dị ike, duru ihe dị ka nde ndị Izrel atọ gafere ala ịkpa, nyekwara ha aka imeri ndị iro ha. Anyị enweghị ụdị nsogbu ndị ahụ Mozis meriri. Ma kwa ụbọchị, anyị na ndị na-eme ka ọ na-esiri anyị ike ịdị umeala n’obi na-emekọrịta ihe, nsogbu ndị na-emekwa ka o siere anyị ike ịdị umeala n’obi na-abịakwara anyị. Ma, anyị nwere ezigbo ihe ga-eme ka anyị dịrị umeala n’obi. Jehova kwere anyị nkwa na “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa.” (Ọma 37:11) Ị̀ ga-asị na ị dị umeala n’obi? Ndị ọzọ, hà ga-ekwukwa otu ihe ahụ banyere gị? w19.02 8 ¶1-2

Tuzdee, Mee 12

Ahụhụ ga-adịrị ndị na-asị na . . . ihe ọjọọ bụ ihe ọma.​—Aịza. 5:20.

Ụmụ mmadụ nwere akọnuche kemgbe ụwa. Mgbe Adam na Iv nupụchaara Jehova isi, ha gara zoo onwe ha. Nke a gosiri na akọnuche ha na-ama ha ikpe. E nwere ike iji ndị na-azụghị akọnuche ha nke ọma tụnyere ụgbọ mmiri ihe e ji akwọ ya na-adịghị mma. Iji ihe e ji akwọ ụgbọ mmiri nke na-anaghị arụ ọrụ nke ọma akwọ ụgbọ mmiri nwere ike ịkpata ọdachi. Ikuku ma ọ bụ mmiri na-asọ asọ nwere ike iburu ụgbọ mmiri ahụ gaa ebe ọzọ. Ihe e ji akwọ ụgbọ mmiri a rụziri nke ọma ga-enyere onye na-akwọ ya aka ịga ebe ọ na-aga. E nwere ike iji akọnuche anyị tụnyere ihe ahụ e ji akwọ ụgbọ mmiri. Akọnuche anyị na-agwa anyị ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ ma na-eduzi anyị ime ihe ziri ezi. Ma, ka akọnuche anyị nwee ike iduzi anyị, anyị ga-azụ ya nke ọma. Ọ bụrụ na mmadụ azụghị akọnuche ya nke ọma, ọ gaghị agwa ya na ihe ọ chọrọ ime dị njọ. (1 Tim. 4:​1, 2) Ụdị akọnuche ahụ nwedịrị ike ime ka anyị kweta na “ihe ọjọọ bụ ihe ọma.” w18.06 16 ¶1-3

Wenezdee, Mee 13

[Kwụsịnụ] ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị.​—Rom 12:2.

Anyị kwesịrị ịgbalị zere echiche ụwa ndị yiri ka hà dị mma ma e lee ha anya elu elu. Dị ka ihe atụ, otú e si kọọ otu akụkọ gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na redio, tiivi ma ọ bụkwanụ n’akwụkwọ akụkọ nwere ike ime ka mmadụ chọwa ịkwado ihe ahụ a kọrọ. Ụfọdụ akụkọ gbasara ihe na-amasị ndị mmadụ nwekwara ike ịgba ndị mmadụ ume ka ha chụwa ihe nke ụwa a. Ụfọdụ fim na akwụkwọ na-eme ka ndị mmadụ chewe na ibu ụzọ achọ ọdịmma onwe ha na nke ezinụlọ ha bụ ihe kwesịrị ekwesị. Ụdị echiche ndị a na-eleghara eziokwu Baịbụl anya. Baịbụl kwuru na ihe ga-agaziri anyị na ezinụlọ anyị ma anyị jiri obi anyị niile hụ Jehova n’anya. (Mat. 22:​36-39) Ihe a apụtaghị na ọ dị njọ mmadụ iji ihe ndị dị mma na-atụrụ ndụ. Ma, anyị kwesịrị ịgbalị jụọ onwe anyị ajụjụ ndị a: ‘Ànyị na-achọpụtali ma ò nwere otú ihe ahụ anyị ji na-atụrụ ndụ si na-akụzi echiche ụwa a? Ànyị na-agbalịsi ike ka anyị na ụmụ anyị ghara ile ihe omume tiivi na ịgụ akwụkwọ ndị e ji akụzi echiche ụwa a? Ọ bụrụ na ụmụ anyị anụ ma ọ bụ hụ ihe ndị e ji akụzi echiche ụwa, ànyị na-enyere ha aka ịmata ihe bụ́ echiche Jehova?’ w18.11 22 ¶18-19

Tọzdee, Mee 14

Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.​—Aịza. 41:10.

Jehova na-egosi na ya nọnyeere anyị. Otú o si mee ya bụ ige anyị ntị nke ọma na ịhụ anyị n’anya. Lee ihe o kwuru iji gosi na ya hụrụ anyị n’anya. Ọ sịrị: “Ị dị oké ọnụ ahịa n’anya m, a gụọla gị n’onye kwesịrị nsọpụrụ, m hụkwara gị n’anya.” (Aịza. 43:4) O nweghị ihe ọ bụla nọ n’eluigwe na n’ụwa a ga-eme ka Jehova kwụsị ịhụ anyị n’anya. Ọ gaghị akwụsị ịnọnyere anyị. (Aịza. 54:10) Jehova anaghị ekwe anyị nkwa na ya ga-ewepụ ihe ndị na-eme ka ndụ na-esiri anyị ike, ma ọ gaghị ekwe ka nsogbu ndị yiri “mmiri” rikpuo anyị ma ọ bụ kwe ka ọnwụnwa ndị yiri “ire ọkụ” dịgide. O mesiri anyị obi ike na ya ga-anọnyere anyị, ma na-enyere anyị aka imeri ọnwụnwa ndị ahụ. Olee ihe Jehova ga-eme? Ọ ga-eme ka anyị kwụsị ịtụ ụjọ, ka anyị nwee ike ịnọgide na-efe ya, ọ bụrụgodị na anyị anọrọ n’ọnụ ọnwụ. (Aịza. 41:13; 43:2) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị nkwa a Chineke kwere anyị obi, ya bụ, “m ga-anọnyere gị,” obi ga-esikwa anyịnwa ezigbo ike ka anyị na-edi ọnwụnwa ndị bịaara anyị. w19.01 3 ¶4-6

Fraịdee, Mee 15

Atụmatụ ndị dị n’obi mmadụ dị ọtụtụ, ma, ọ bụ nzube Jehova ga-eguzosi ike.​—Ilu 19:21.

Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ọ ga-abụ na ndị nkụzi, ndị na-enye ndụmọdụ n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ agbaala gị ume ka ị gaa mahadum ma ọ bụ mee ihe ọzọ ga-eme ka ị baa ọgaranya. Ma, Jehova na-agba gị ume ka i mee ihe dị iche. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova chọrọ ka ị mụta ihe a na-akụziri gị n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ọ ga-enyere gị aka ịkpa afọ gị mgbe ị gụchara. (Kọl. 3:23) Ọ maara na ọ bụ ugbu a ị ka na-eto eto ka ị ga-eme mkpebi ndị dị mkpa ga-enyere gị aka ná ndụ. N’ihi ya, ọ chọrọ ka i jiri ihe ndị dị n’Okwu ya mee mkpebi ndị dị ya mma n’oge ikpeazụ a. (Mat. 24:14) Jehova ma ihe ga-eme ụwa ọjọọ a n’ọdịnihu, marakwa mgbe ọgwụgwụ ya ga-abịa. (Aịza. 46:10; Mat. 24:​3, 36) Jehova maara gị nke ọma, marakwa ihe ndị ga-eme gị obi ụtọ na ihe ndị ga-eme gị obi ọjọọ. Ndụmọdụ mmadụ nyere nwere ike yie ihe dị mma, ma o nweghị uru ọ bụla ọ bara ma ọ bụrụ na o sighị n’Okwu Chineke. w18.12 19 ¶1-2

Satọdee, Mee 16

Onye ajọ omume [agaghị] anọ.​—Ọma 37:10.

Kama, “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” Devid kwukwara, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọma 37:​11, 29; 2 Sam. 23:2) Olee uru i chere nkwa a baara ndị chọrọ ime uche Chineke? O mere ka ha na-atụ anya na otu ụbọchị, naanị ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa a, nakwa na ọ ga-aghọ paradaịs ọzọ ka ogige Iden. Ka oge na-aga, ọtụtụ ndị Izrel, bụ́ ndị na-ekwu na ha na-efe Jehova, hapụrụ ya, hapụkwa ofufe ya. N’ihi ya, Chineke kwere ka ndị Babịlọn merie ha, mebie obodo ha, ma dọrọ ọtụtụ n’ime ha n’agha. (2 Ihe 36:​15-21; Jere. 4:​22-27) Ma, ndị amụma Chineke kwuru na ndị Izrel ga-alaghachi n’obodo ha mgbe ha nọchara afọ iri asaa na Babịlọn. Amụma ndị a niile mezukwara. Ha bakwaara anyị uru taa. Ọ na-egosi na a ga-enwe paradaịs n’ụwa. w18.12 4 ¶9-10

Sọnde, Mee 17

N’ihi na dị ka eluigwe dị elu karịa ụwa, otú ahụ ka ụzọ m dị elu karịa ụzọ unu, otú ahụkwa ka echiche m dị elu karịa echiche unu.​—Aịza. 55:9.

Ọtụtụ n’ime ndụmọdụ ụwa na-enye anaghị adaba n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ma, ànyị ga-asị na ndụmọdụ ụwa a na-aba uru taa karịa ndụmọdụ Baịbụl? Jizọs kwuru, sị: “A na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Mat. 11:19) Ụwa enweela ọtụtụ ọganihu n’ihe gbasara nkà na ụzụ. Ma, ha na-agba ọnyụpa ma a bịa n’iwepụrụ ndị mmadụ nsogbu ndị na-eme ha ụra aga n’anya, dị ka agha, ịkpa ókè agbụrụ na ime mpụ. Ụwa na-akụzi na ịkwa iko enweghị ihe o mere. Ma, ọtụtụ ndị kwetara na ịkwa iko etisaala ọtụtụ ezinụlọ, kpatara ọtụtụ ndị ọrịa na nsogbu ndị ọzọ. Oleekwanụ maka Ndị Kraịst na-ele ihe anya otú Chineke si ele ya? Ha na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ ha, ha anaghịkwa ebute ọrịa ndị na-esi n’omume rụrụ arụ. Ha na ụmụnna ha zuru ụwa ọnụ dịkwa n’udo. (Aịza. 2:4; Ọrụ 10:​34, 35; 1 Kọr. 6:​9-11) Ihe a niile ọ́ naghị egosi na echiche Jehova karịrị echiche ụwa a? w18.11 20 ¶8-10

Mọnde, Mee 18

Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.​—1 Kọr. 15:33.

Ọ bụ eziokwu na anyị na-agbalị ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na-emekọrịta ihe ma na-akpaso ha àgwà ọma, anyị ga-akpachara anya ka ha ghara ime ka anyị mebie iwu Chineke n’ihi na anyị chọrọ ime ihe dị ha mma. Anyị ga na-agbalị ka anyị na ha na-emekọrịta ihe. Ma, naanị ndị anyị na ha ga na-akpachi anya bụ ndị hụrụ Jehova n’anya. Ndị niile na-eje ije n’eziokwu ga-adị nsọ. (Aịza. 35:8; 1 Pita 1:​14-16) Mgbe anyị ka batara n’ọgbakọ, anyị mere mgbanwe ka anyị nwee ike ịna-eme ihe Baịbụl kwuru. Ụfọdụ n’ime anyị mere ezigbo mgbanwe. N’agbanyeghị nke ọ bụla anyị mere, anyị ekwesịghị ikwe ka omume rụrụ arụ juru n’ụwa a mebie àgwà ọma anyị. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ime omume rụrụ arụ? Chee echiche ihe o furu Jehova iji mee ka anyị dị nsọ. O ji ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst chụọ àjà maka anyị. (1 Pita 1:​18, 19) Ka anyị nwee ike ịna-adị ọcha n’anya Jehova, anyị ga na-echeta uru àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ baara anyị. w18.11 11 ¶10-11

Tuzdee, Mee 19

M ga-echere Chineke nke nzọpụta m. Chineke m ga-anụ olu m.​—Maị. 7:7.

Ọtụtụ ndị ozi oge niile kwuru na iji ozi ha kpọrọ ihe enyerela ha aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ọnọdụ ha. Ihe a gosiri na ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị bara uru n’agbanyeghị ọnọdụ anyị ma tụkwasị Jehova obi anyị niile, obi ga na-eru anyị ala. Anyị nwere ike ịchọpụta na otú anyị si jiri oge anyị mee ihe bara uru mgbe ọnọdụ anyị gbanwere mere ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma. Ihe nwere ike ịgbanwe na mberede ná ndụ anyị. E nwere ike inye anyị ihe ọzọ anyị ga na-arụ ná nzukọ Jehova, anyị nwekwara ike rịawa ọrịa, ma ọ bụ lekọtawa onye ezinụlọ anyị. N’agbanyeghị ihe ọ bụla nwere ike ime, ka obi sie gị ike na Jehova ga na-elekọta gị ma na-enyere gị aka n’oge kwesịrị ekwesị. (Hib. 4:16; 1 Pita 5:​6, 7) Ka ọ dịgodị, gbalịa na-eme ihe bara uru n’ọnọdụ ị nọ ugbu a. Na-abịaru Nna gị nke eluigwe nso n’ekpere, mụtakwa ịtụkwasị ya obi gị niile. I mee ihe ndị a, obi ga na-eru gị ala n’agbanyeghị otú ihe si gbanwee ná ndụ gị. w18.10 30 ¶17; 31 ¶19, 22

Wenezdee, Mee 20

[Jehova] maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.​—Ọma 103:14.

Baịbụl gwara anyị otú Jehova si echebara ndị ya echiche. Dị ka ihe atụ, chegodị otú Jehova si nyere Samuel aka ịgwa Ilaị, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà, ihe Jehova gwara ya na ọ ga-eme ya na ndị ezinụlọ ya, nke e dere na 1 Samuel 3:​1-18. Iwu Jehova kwuru ka ụmụaka na-erubere ndị agadi isi, nke ka nke, onyeisi. (Ọpụ. 22:28; Lev. 19:32) N’ihi ya, o siri ike iche n’echiche na Samuel ga-agakwuru Ilaị n’ụtụtụ, kata obi gwa ya ihe Chineke kwuru na ọ ga-eme ya na ndị ezinụlọ ya. Baịbụl gwara anyị na “ụjọ na-atụkwa Samuel ịkọrọ Ilaị banyere ọhụụ ahụ.” Ma, Chineke mere ka o doo Ilaị anya na ọ bụ Samuel ka ọ na-akpọ. Ọ bụ ya mere Ilaị ji gwa Samuel ka ọ gwa ya ihe Chineke gwara ya ma ghara izochiri ya “ihe ọ bụla.” Samuel rubeere ya isi ma “gwa ya okwu ahụ niile.” Ozi a Samuel ziri Ilaị bụkwa ihe e bu ụzọ gwa Ilaị. (1 Sam. 2:​27-36) Akụkọ a na-kụziri anyị otú Jehova si echebara anyị echiche nakwa otú o si mara ihe. w18.09 23 ¶2; 24 ¶4-5

Tọzdee, Mee 21

Jehova, ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị? . . . Onye [na-ekwu] eziokwu n’obi ya.​—Ọma 15:​1, 2.

Ọtụtụ mmadụ na-aghakarị ụgha taa. N’isiokwu bụ́ “Ihe Mere Anyị Ji Agha Ụgha,” nke otu nwoke aha ya bụ Y. Bhattacharjee dere, o kwuru, sị: “Ụgha abaala ndị mmadụ n’ọbara.” Ihe ọ pụtara bụ na ndị mmadụ na-eche na o nweghị ihe dị njọ n’ịgha ụgha. Ndị mmadụ na-aghakarị ụgha iji chebe onwe ha. O nwere ike ịbụ ka ha kpuchie ihe ha mejọrọ ma ọ bụ mpụ ndị ha mere. Ha na-aghakwa ụgha iji nweta ego ma ọ bụ iji nweta ihe ga-abara ha uru. Isiokwu ahụ kwukwara na ọ naghị esiri ụfọdụ ndị ike ịghara “ndị ha na-amaghị ndị ha bụ, ndị ọrụ ibe ha, ndị enyi ha, nakwa ndị ha hụrụ n’anya ụgha.” Olee ihe ụgha a niile kpatarala? O meela ka ndị mmadụ kwụsị ịtụkwasị ibe ha obi, meekwa ka enyi na enyi tisaa. Devid gwara Jehova, sị: “Eziokwu nke dị n’ime obi mmadụ na-atọ gị ụtọ.” (Ọma 51:6) Devid ma na ikwu eziokwu na-esi n’obi anyị. Ezigbo Ndị Kraịst ‘na-agwa ibe ha eziokwu’ n’ihe niile ha na-eme ná ndụ.​—Zek. 8:16. w18.10 7 ¶4; 8 ¶9-10; 10 ¶19

Fraịdee, Mee 22

O wee na-edu ha n’enweghị ihe mere ha, egwu atụghịkwa ha.​—Ọma 78:53.

Mgbe ndị Izrel hapụrụ Ijipt n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, ọ ga-abụ na ha karịrị nde atọ. E nwere ụmụaka nakwa ndị agadi n’ime ha. Ọ ga-abụkwa na ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọrịa ma ọ bụ ndị nwere nkwarụ. Ụdị ìgwè mmadụ a kwesịrị inwe Onye Ndú ga na-aghọta ha ma na-echebara ha echiche. Jehova si n’aka Mozis gosi na ya bụ ụdị onye ahụ. Nke a mere ka obi sie ndị Izrel ike mgbe ha na-ahapụ Ijipt ha bi kemgbe a mụrụ ha. (Ọma 78:52) Olee otú Jehova si mee ka obi sie ndị ya ike, ahụ́ eruokwa ha ala? Otú o si mee ya bụ na ọ haziri ha n’usoro “dị ka ndị agha” mgbe o si n’Ijipt kpọpụta ha. (Ọpụ. 13:18) Otú a Jehova si hazie ndị Izrel mere ka obi sie ha ike na Chineke ha kwụ ha n’azụ. Jehova nyekwara ha “ígwé ojii na-edu ha n’ehihie,” nakwa “ìhè ọkụ” nke na-edu ha n’abalị iji mee ka ha mata na ọ nọnyeere ha, na-edu ha ma na-echebe ha. (Ọma 78:14) N’eziokwu, obi a Jehova mesiri ndị Izrel ike kwesịrị ekwesị n’ihi ihe ọzọ na-aga ime. w18.09 26 ¶11-12

Satọdee, Mee 23

A sị nnọọ na ị ga-ezobe m na Shiol . .  na ị ga-ekpebi oge m ga-anọru, i wee cheta m.​—Job 14:13.

N’oge Baịbụl, nsogbu ụfọdụ ndị ohu Chineke nwere mere ka obi na-ajọ ha ezigbo njọ nke na ha chọrọ ka ọnwụ bịa gburu ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ahụ́ na-egbu Job ezigbo mgbu nke mere ka ọ chọọ ịnwụ, o kwuru, sị: “Mkpụrụ obi m akpọwo ndụ m asị.” (Job 10:1) Obi adịghị Jona mma n’ihi otú egwú si dagharịa n’ozi o jere, ya emee ka o kwuo, sị: “Ugbu a, Jehova, biko, wepụ mkpụrụ obi m, n’ihi na ọ kaara m mma ịnwụ anwụ karịa na m dị ndụ.” (Jona 4: 3) Otú ahụ ka ọ dịkwa Ịlaịja onye amụma. Nsogbu ndị bịaara ya mere ka ọ rịọ Jehova ka o mee ka ọ nwụọ. Ọ sịrị: “O zuwo! Ugbu a, Jehova, wepụ mkpụrụ obi m.” (1 Eze 19:4) Ma, Jehova hụrụ ndị ohu ya ndị a n’anya nke na ọ chọrọ ka ha dịrị ndụ. Jehova akatọghị ha maka otú o si dịrị ha n’obi. Kama, o nyeere ha aka ka ndụ malitekwa ịtọ ha ụtọ ka ha nwee ike ịnọgide na-efe ya. w18.09 13 ¶4

Sọnde, Mee 24

Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.​—1 Kọr. 3:9.

Ihe e ji mara ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ bụ ile ọbịa. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu a sụgharịrị “ile ọbịa” pụtara “imere ndị anyị na-amaghị ihe ọma.” (Hib. 13:2) E nwere ihe atụ ndị dị n’Okwu Chineke kụziiri anyị otú anyị nwere ike isi na-ele ọbịa. (Jen. 18:​1-5) Anyị kwesịrị ịna-enyere ndị ọzọ aka mgbe ọ bụla, ma hà bụ “ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe” ma ọ bụ na hà abụghị. (Gal. 6:10) Ì nwere ike ile ndị ozi oge niile ọbịa ma si otú ahụ mee ka gị na Chineke na-arụkọ ọrụ? (3 Jọn 5, 8) Oge ahụ bụ oge anyị na-eji ‘agbarịta ibe anyị ume.’ (Rom 1:​11, 12) Okwu Chineke gwara ụmụnna nwoke ka ha gbalịa ruo eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ma si otú ahụ mee ka ha na Jehova na-arụkọ ọrụ. (1 Tim. 3:​1, 8, 9; 1 Pita 5:​2, 3) Ndị na-eme otú a na-achọ igboro ndị mmadụ mkpa ha, nyekwara ha aka n’ihe ndị gbasara ofufe Chineke. (Ọrụ 6:​1-4) Ụmụnna ndị na-arụ ọrụ ndị a ga-agwa gị na obi na-atọ ha ezigbo ụtọ inyere ndị ọzọ aka. w18.08 24 ¶6-7; 25 ¶10

Mọnde, Mee 25

Abasirila okenye mba ike. Kama nke ahụ, na-arịọ ya arịrịọ dị ka nna gị.​—1 Tim. 5:1.

N’agbanyeghị na e nyere Timoti ikike ịgwa ụmụnna ndị merela agadi ihe ndị ha ga na-eme, o kwesịrị ịna-enwere ha ọmịiko ma na-asọpụrụ ha. Ọ bụrụkwanụ na onye tọrọ anyị akpachara anya mee mmehie ma ọ bụ na-eme ka ndị ọzọ na-eme ihe na-adịghị Jehova mma? Jehova anaghị eji afọ ndụ mmadụ ekpebi otú o si ewere onye ahụ. Ọ gaghịkwa eleghara onye mere mmehie anya n’ihi na ọ bụ agadi. Buru ihe a Aịzaya 65:20 kwuru n’obi. Ọ sịrị: “A ga-akọcha onye mmehie, ọ bụ ezie na ọ gbaala otu narị afọ.” N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, e gosikwara ụdị ihe a. (Ezik. 9:​5-7) Ma, ihe kwesịrị ịbụ mkpa anyị bụ ịna-asọpụrụ Onye Ochie ahụ, bụ́ Jehova Chineke. (Dan. 7:​9, 10, 13, 14) Ọ bụrụ na anyị mee otú ahụ, ụjọ agaghị atụ anyị ịgbazi onye mere mmehie n’agbanyeghị afọ ndụ ya.​—Gal. 6:1. w18.08 11 ¶13-14

Tuzdee, Mee 26

Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile, ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.​—Ilu 14:15.

Ebe anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịmụta otú anyị ga-esi eleru akụkọ anyị nụrụ anya iji mata ma ọ̀ bụ eziokwu. (Ilu 3:​21-23; 8:​4, 5) Ọ bụrụ na anyị amụtaghị ya, ọ ga-adịrị Setan na ụwa ya mfe ime ka anyị na-eche echiche otú na-ekwesịghị ekwesị. (Efe. 5:6; Kọl. 2:8) Ma, ọ bụ mgbe anyị matara ihe niile merenụ ka ọ ga-edo anyị anya ma ihe ahụ anyị nụrụ ọ̀ bụ eziokwu. Taa, akụkọ na-ezo ka mmiri. Ọ bụ n’Ịntanet, tiivi na ihe ndị ọzọ ka e si enweta akụkọ ndị ahụ. Ndị enyi anyị na ndị ọzọ nwekwara ike izitere anyị ọtụtụ ozi n’ekwentị nakwa n’iimel. Ebe ọ bụ na ndị mmadụ na-ama ụma agbasa ọtụtụ akụkọ ndị na-abụghị eziokwu, anyị kwesịrị ịkpachara anya ma chọpụta ma akụkọ ndị ahụ anyị nụrụ hà bụ eziokwu. w18.08 3 ¶1, 3

Wenezdee, Mee 27

Chineke meere gị amara.​—Luk 1:30.

Mgbe oge ruru ka a mụọ Ọkpara Chineke n’ụwa, Jehova họọrọ otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke aha ya bụ Meri ka ọ mụọ ya. Meri bi n’obere obodo a na-akpọ Nazaret. Obodo a dị anya ma e si Jeruselem nakwa ụlọ nsọ ya mara mma gawa ya. (Luk 1:​26-33) Ihe Meri mechara gwa Elizabet onye ikwu ya gosiri na ya na Jehova bụ ezigbo enyi. (Luk 1:​46-55) N’eziokwu, Jehova nọ na-ele Meri ma gọzie ya otú ọ na-atụghị anya ya n’ihi na o ji obi ya niile na-efe ya. Mgbe Meri mechara mụọ Jizọs, Jehova emeghị ka ndị isi a ma ama na Jeruselem nakwa na Betlehem mata ihe merenụ ma si otú ahụ kwanyere ha ùgwù. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ndị ọzụzụ atụrụ dị umeala n’obi nọ na-azụ atụrụ ha n’azụ Betlehem ma kọọrọ ha ya. (Luk 2:​8-14) Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ gaziri hụ Jizọs mgbe ahụ a mụrụ ya ọhụrụ. (Luk 2:​15-17) Ọ ga-abụ na o juru Meri na Josef ezigbo anya na a kwanyeere Jizọs ụdị ùgwù a. w18.07 9-10 ¶11-12

Tọzdee, Mee 28

Jehova wee weso Sọlọmọn oké iwe.​—1 Eze 11:9.

Gịnị mere Jehova ji weso Sọlọmọn oké iwe? Baịbụl kwuru, sị: “N’ihi na obi ya apụwo n’ebe Jehova . . .  nọ, bụ́ onye pụtara ìhè n’ihu ya ugboro abụọ. Ọ bụkwa banyere ihe a ka o nyere ya iwu ka ọ ghara iso chi ọzọ dị iche iche; ma o debeghị ihe ahụ Jehova nyere ya n’iwu.” Ihe a Sọlọmọn mere mere ka Chineke kwụsị ịnọnyere ya ma na-enyere ya aka. Ụmụ Sọlọmọn achịghịzi Izrel niile. Ha takwara ahụhụ ruo ọtụtụ narị afọ. (1 Eze 11:​9-13) Ihe kacha eme ka ndị ohu Chineke kwụsị ife ya bụ ma ha na ndị na-amaghị iwu ya ma ọ bụ ndị na-ejighị iwu ya kpọrọ ihe na-akpachi anya. Ọ bụ ụdị ihe a mere Sọlọmọn. Ụfọdụ nwere ike ịnọ n’ọgbakọ, ma ha na Chineke adịghị n’ezigbo mma. Ndị ọzọ nwere ike ịbụ ndị ikwu anyị, ndị agbata obi anyị, ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị na-anaghị efe Jehova. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ bụrụ na ndị anyị na ha na-akpa ejighị iwu Chineke kpọrọ ihe, ka oge na-aga, ha nwere ike ime ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. w18.07 19 ¶9-10

Fraịdee, Mee 29

Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.​—1 Jọn 5:19.

Setan na-eji fim na ihe ndị a na-egosi na tiivi eme ka ọtụtụ ndị na-eche echiche ka ya. Ọ ma na ihe akụkọ na-eme abụghị naanị ime ka anyị na-enwe obi ụtọ, kama ọ na-akụziri anyị otú anyị ga-esi eche echiche, otú obi kwesịrị isi na-adị anyị, nakwa otú anyị ga-esi na-akpa àgwà. Jizọs ji akụkọ kụziere ndị mmadụ ihe. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe atụ o mere gbasara onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi na otu nwa okorobịa hapụrụ ụlọ ma mefusie ihe o nwere. (Mat. 13:34; Luk 10:​29-37; 15:​11-32) Ma, ndị na-eche echiche ka Setan nwere ike iji akụkọ mebie echiche anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ilezi anya họrọ akụkọ ndị anyị na-ege. Fim na ihe ndị a na-egosi na Tiivi nwere ike ịna-eme anyị obi ụtọ ma na-akụziri anyị ihe n’emebighị echiche anyị. Ma anyị kwesịrị ịkpachara anya. Mgbe anyị na-ahọrọ ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Fim a ma ọ bụ ihe a a na-egosi na Tiivi, ọ̀ na-akụziri m na ọ dị mma ime ihe na-agụ anụ ahụ́ m agụụ?’ (Gal. 5:​19-21; Efe. 2:​1-3) Gịnị ka ị ga-eme ma ị chọpụta na ihe a na-egosi na tiivi na-akwado echiche Setan? Zere ya otú ahụ i nwere ike isi zere ọrịa na-efe efe. w19.01 15-16 ¶6-7

Satọdee, Mee 30

Narakwanụ okpu agha bụ́ nzọpụta.​—Efe. 6:17.

Otú ahụ okpu agha si echebe ụbụrụ onye agha, ka “olileanya nke nzọpụta” si echebe uche anyị. (1 Tesa. 5:8; Ilu 3:21) Olee otú Setan nwere ike isi mee ka anyị kpupụ okpu agha anyị? Chegodị otú o si nwaa Jizọs. O doro Setan anya na Jizọs ga-emecha chịa ụmụ mmadụ. Ma, Jizọs ga-echere ruo mgbe Jehova ga-eme ya eze. Tupu mgbe ahụ, ọ ga-ata ahụhụ ma nwụọ. N’ihi ya, Setan nyere Jizọs ohere ịbụ eze ozugbo. Setan gwara Jizọs na ọ bụrụ na o fee ya ofufe, ọ ga-eme ka ọ chịwa ụmụ mmadụ ozugbo. (Luk 4:​5-7) Setan makwa na Jehova ekwela anyị nkwa imere anyị ihe ọma n’ụwa ọhụrụ ya. Ma, anyị ga-echere, nsogbu nwekwara ike ịbịara anyị tupu oge ahụ. N’ihi ya, Setan na-egosi anyị ihe ndị ọ ga-abụ anyị mee, anyị ekporiwe ndụ ugbu a. Ọ chọrọ ka anyị buru ụzọ na-achụ akụnụba, nweta ihe ọ bụla anyị chọrọ ugbu a. Ọ chọkwara ka anyị ghara ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke.​—Mat. 6:​31-33. w18.05 30-31 ¶15-17

Sọnde, Mee 31

Ka obi na-atọkwa gị ụtọ n’oge ị bụ okorobịa.​—Ekli. 11:9.

Ebe ị bụ nwa okorobịa ma ọ bụ agbọghọ, o doro anya na Jehova chọrọ ka obi na-atọ gị ụtọ. Lekwasị anya n’ihe ndị i kpebiri ime n’ozi Jehova, na-emekwa ihe Jehova kwuru n’ihe niile ị na-eme ná ndụ gị. Ị malite ngwa ngwa mewe ha, ị ga-ahụ na Jehova ga na-eduzi gị, na-echebe gị ma na agọzi gị. Chebara ndụmọdụ niile o si na Baịbụl na-enye gị echiche, ma mee ihe a Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.” (Ekli. 12:1) Ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ kwesịrị ka a jaa ha mma maka otú ha si lekwasị anya n’ozi ha na-ejere Jehova. Otú ha si eme ya bụ ime ihe ndị ahụ ha kpebiri ime n’ozi Jehova, na iji ozi ọma kpọrọ ihe. Ihe ọzọ bụ na ha kpebisiri ike na ụwa agaghị emegharị ha anya. Obi kwesịrị isi ha ike na mbọ ha na-agba n’ozi Jehova agaghị efu ọhịa. Ụmụnna ha hụrụ ha n’anya, kwụ ha n’azụ. Ha tụkwasị Jehova obi, ihe ndị ha kpebiri ime ga-aga nke ọma. w18.04 29 ¶17, 19

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya