Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es21 p. 27-36
  • Mach

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mach
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2021
  • Isiokwu Nta
  • Mọnde, Mach 1
  • Tuzdee, Mach 2
  • Wenezdee, Mach 3
  • Tọzdee, Mach 4
  • Fraịdee, Mach 5
  • Satọdee, Mach 6
  • Sọnde, Mach 7
  • Mọnde, Mach 8
  • Tuzdee, Mach 9
  • Wenezdee, Mach 10
  • Tọzdee, Mach 11
  • Fraịdee, Mach 12
  • Satọdee, Mach 13
  • Sọnde, Mach 14
  • Mọnde, Mach 15
  • Tuzdee, Mach 16
  • Wenezdee, Mach 17
  • Tọzdee, Mach 18
  • Fraịdee, Mach 19
  • Satọdee, Mach 20
  • Sọnde, Mach 21
  • Mọnde, Mach 22
  • Tuzdee, Mach 23
  • Wenezdee, Mach 24
  • Tọzdee, Mach 25
  • Fraịdee, Mach 26
  • Ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs
    Mgbe Anyanwụ Dachara
    Satọdee, Mach 27
  • Sọnde, Mach 28
  • Mọnde, Mach 29
  • Tuzdee, Mach 30
  • Wenezdee, Mach 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2021
es21 p. 27-36

Mach

Mọnde, Mach 1

“Kewapụnụ onwe unu,” ka Jehova sịrị, “kwụsịkwanụ imetụ ihe na-adịghị ọcha aka.” —2 Kọr. 6:17.

Ịhụ Chineke n’anya na iji Okwu ya kpọrọ ihe na-enyere anyị aka irubere Chineke isi, ma mgbe ndị ikwu anyị ma ọ bụ ndị enyi anyị na-achọ ịmanye anyị ka anyị soro ha mee omenala Baịbụl na-akwadoghị banyere ndị nwụrụ anwụ. Ha nwere ike ịchọ imenye anyị ihere ma ọ bụrụ na anyị esoghị ha, ikekwe, na-ekwu na anyị ahụghị onye ahụ nwụrụ anwụ n’anya ma ọ bụ na anyị anaghị akwanyere ya ùgwù. Ha nwekwara ike ikwu na àgwà anyị nwere ike ime ka onye ahụ nwụrụ anwụ merụọ ndị dị ndụ ahụ́. Ná mba Karịbian, ọtụtụ ndị kweere na mmadụ nwụọ, ihe ha na-asị na ọ bụ mmụọ onye ahụ nwere ike ịnọ gburugburu na-ata ndị mere ya ihe ọjọọ mgbe ọ dị ndụ ahụhụ. Otu akwụkwọ kwuru na mmụọ onye ahụ nwedịrị ike “ịkpa mkpamkpa n’obodo.” N’obodo ụfọdụ n’Afrịka, ha na-eji ihe kpuchie enyo ndị dị n’ụlọ onye nwụrụ anwụ ma che foto ya ihu n’ahụ́ ụlọ. Maka gịnị? Ụfọdụ na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ ekwesịghị ịhụ onwe ha. Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, o doro anya na anyị anaghị ekwere akụkọ ọ bụla na-abụghị eziokwu ma ọ bụ na-eme omenala ndị na-akwado ụgha Setan.—1 Kọr. 10:21, 22. w19.04 16 ¶11-12

Tuzdee, Mach 2

Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.—Mat. 7:12.

Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị ga-enyere ha aka imeso ndị ọzọ ihe otú dị mma. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara ihe Jizọs kụziri gbasara imere ndị ọzọ ihe anyị chọrọ ka ha meere anyị. Anyị niile chọrọ ka a na-emeso anyị ihe otú dị mma. N’ihi ya, anyị kwesịkwara ịna-emeso ndị ọzọ ihe otú dị mma. Anyị mee otú ahụ, ha nwekwara ike imeso anyị ihe otú ahụ. Ọ bụrụkwanụ na e mesoro anyị ihe n’ụzọ na-adịghị mma? Jizọs kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha nwee obi ike na Jehova ‘ga-eme ka ndị ọ họọrọ, bụ́ ndị na-etiku ya ehihie na abalị, nweta ikpe ziri ezi.’ (Luk 18:6, 7) Ihe a Jizọs kwuru na-emesi anyị obi ike na Chineke anyị na-ahụ ahụhụ niile anyị na-ata n’oge ikpeazụ a, nakwa na ọ ga-eme ka anyị nweta ikpe ziri ezi mgbe oge ya ruru. (2 Tesa. 1:6) Ọ bụrụ na anyị emee ihe Jizọs kwuru, anyị ga-emeso ndị mmadụ ihe n’ụzọ dị mma. E meso anyị ihe n’ụzọ na-adịghị mma n’ụwa Setan a, ịmata na Jehova ga-eme ka anyị nweta ikpe ziri ezi na-akasi anyị obi. w19.05 5 ¶18-19

Wenezdee, Mach 3

Dịrịnụ njikere mgbe niile ịzara ọnụ unu n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ unu ihe mere unu ji nwee olileanya ahụ unu nwere, ma jirinụ obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu na-eme otú ahụ. —1 Pita 3:15.

Ị̀ bụ nwa akwụkwọ? Ụmụ akwụkwọ ibe gị niile nwere ike ịna-eme ememme ụbọchị ọmụmụ ha. I nwere ike ịchọ isi na Baịbụl gwa ha ihe mere na ị naghị eso ha eme ya, ma gị echee na ị gaghị emeli ya. I nwere ike ịmụkwu banyere ya. E nwere ihe abụọ i nwere ike ibu n’obi amụ gbasara ya: (1) ka i mee ka obi sikwuo gị ike na ime ememme ụbọchị ọmụmụ anaghị amasị Jehova na (2) ka i mee ka obi kaa gị ịgbachitere ihe i kweere. (Mat. 14:6-11) I nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ụmụ akwụkwọ ibe m kwuru mere ha ji eme ememme ụbọchị ọmụmụ ha?’ Ị matachaa ihe mere ha ji eme ya, gị ejirizie akwụkwọ anyị mee ezigbo nchọnchọ. Ịgwa ụmụ akwụkwọ ibe gị ihe i kweere nwere ike ọ gaghị esichara gị ike otú i chere. Ọtụtụ n’ime ha na-eme ememme ụbọchị ọmụmụ ha n’ihi na ha chere na mmadụ niile na-eme ya. Ọ bụrụ na ị chọpụta otu ihe ma ọ bụ abụọ i nwere ike ịgwa ha banyere ya, i nwere ike ịgwa onye ji obi ya niile chọọ ịmata nke bụ́ eziokwu ihe ga-eru ya n’obi.—Kọl. 4:6. w19.05 29 ¶13

Tọzdee, Mach 4

Dị ka nwoke nke nne ya na-akasi obi, otú ahụ ka mụ onwe m ga na-akasi unu obi.—Aịza. 66:13.

Mgbe Ịlaịja onye amụma na-agba ọsọ ndụ, ọ dara mbà n’obi nke na ọ chọrọ ka ọnwụ bịa gburu ya. Jehova ziteere ya otu mmụọ ozi dị ike ka ọ gbaa ya ume. Mmụọ ozi ahụ meere Ịlaịja ihe dị ya mkpa mgbe ahụ. O nyere ya nri dị ọkụ ma gbaa ya ume ka o rie ya. (1 Eze 19:5-8) Akụkọ ahụ kụziiri anyị ihe bara ezigbo uru. Ọ na-akụziri anyị na obere ihe anyị meere mmadụ nwere ike inyere ya ezigbo aka. Ịkpọ onye dara mbà n’obi ka o soro anyị rie nri, inye ya obere onyinye ma ọ bụ ịkpọ ya n’ekwentị nwere ike ime ka obi sie ya ike na anyị hụrụ ya n’anya, nakwa na ihe banyere ya na-emetụ anyị n’obi. Ọ bụrụ na ọ dịghịrị anyị mfe iso mmadụ kwurịta otú obi dị ya, anyị nwere ike imere ya ihe ndị a ga-abara ya uru. Jehova rụrụ ọrụ ebube nye Ịlaịja ike o ji mee ogologo njem ruo Ugwu Horeb, n’ebe dị anya n’ebe ndị ahụ na-achọ igbu ya nọ. Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ a? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịkasi onye e metọrọ obi, anyị kwesịrị ibu ụzọ mee ka obi ruo ya ala ma ọ bụ n’ụlọ ha ma ọ bụkwanụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. w19.05 16 ¶11; 17 ¶13-14

Fraịdee, Mach 5

Ala ahụ ga-akwa ákwá arịrị, . . . ezinụlọ Netan naanị ya. —Zek. 12:12.

Ka e were ya na ị na-agụ amụma e buru na Zekaraya isi iri na abụọ, nke kwuru gbasara ọnwụ Mesaya. (Zek. 12:10) Ị gụrụ ya ruo amaokwu iri na abụọ, ị ga-ahụ na o kwuru na “ezinụlọ Netan” ga-akwa ákwá arịrị ma Mesaya nwụọ. Kama ịgụrụ gawa n’echebaraghị ihe ahụ e kwuru echiche, i nwere ike ịkwụsịtụ ma jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị jikọrọ ezinụlọ Netan na Mesaya?’ I nwere ike ime nchọnchọ ka ị matakwuo gbasara ya. Ntụaka etiti peeji dị n’amaokwu ahụ ga-eduga gị na 2 Samuel 5:14, ebe kwuru na Netan bụ otu n’ime ụmụ Eze Devid. Amaokwu Baịbụl ọzọ dị na ntụaka ahụ bụ Luk 3:31. O kwuru na Jizọs si n’ezinụlọ Netan, bụ́ nna nna Meri. Ihe a ị mụtara meziri ka i nwekwuo mmasị n’ihe ị na-amụ. Ị ma na Baịbụl buru amụma na Jizọs ga-esi n’ezinụlọ Devid. (Mat. 22:42) Ma, ụmụ nwoke Devid karịrị iri abụọ. Ị̀ hụlanụ ihe mere Zekaraya ji kwuo na ezinụlọ Netan nwere ihe mere ha ga-eji ruo uju ma Jizọs nwụọ? w19.05 30 ¶17

Satọdee, Mach 6

Gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.—Rom 12:2.

Gịnịzi ka anyị ga-eme? Ọ bụrụ na anyị ana-amụchi ihe anya, anyị ga-achọpụta n’onwe anyị na ihe anyị na-amụta na Baịbụl bụ eziokwu. Obi ga-esikwa anyị ike na ihe Chineke gwara anyị mee bụ ihe kacha mma anyị kwesịrị ime. Mgbe ahụ, anyị ga-agbanyesi mgbọrọgwụ ike, ‘gbasiekwa ike n’okwukwe’ dị ka osisi mgbọrọgwụ ya siri ezigbo ike. (Kọl. 2:6, 7) Ọ bụ gịnwa ka ọ dị n’aka ime ka okwukwe gị sie ike. N’ihi ya, na-eme ka ike nke na-eduzi uche gị dị ọhụrụ. Na-ekpe ekpere mgbe niile, na-arịọkwa Jehova ka o nye gị mmụọ ya. Na-atụgharị uche ma na-elebara ihe ndị ị na-eche n’echiche anya. Gị na ndị ezigbo mmadụ na-akpa. Meta ndị enyi ga-enyere gị aka ịgbanwe otú i si eche echiche. I mee otú ahụ, ị ga-echebe onwe gị ka ụwa Setan ghara imebi otú i si eche echiche. Ọ ga-emekwa ka ị kụghasịa “echiche na-ezighị ezi na ihe ọ bụla dị elu nke na-emegide ihe ọmụma Chineke.”—2 Kọr. 10:5. w19.06 13 ¶17-18

Sọnde, Mach 7

Ụdị ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ụzọ Chineke bụ́ Nna anyị si ele ihe anya bụ: ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha. —Jems 1:27.

Anyị kwesịrị ịnọgide na-enyere ndị mmadụ nwụnahụrụ aka otú ahụ Rut meere Neomi. (Rut 1:16, 17) Paula kwuru, sị: “Ozugbo di m nwụrụ, ọtụtụ ndị bịara nyere m aka ma kasie m obi. Ma ka oge na-aga, onye ọ bụla agawara mkpa ya. Ọnwụ di m malitekwara inye m nsogbu n’obi ọzọ. Ọ ga-adị mma ma ndị mmadụ ghọta na onye mmadụ nwụnahụrụ ka chọrọ enyemaka ha ma ọnwa ole na ole ma ọ bụdị afọ ole na ole onye ahụ nwụrụ gachaa.” O doro anya na mmadụ niile abụghị otu. Ọ na-adịrị ụfọdụ mfe inweta onwe ha ngwa ngwa. Ma, o nwere ndị obi na-agbawa mgbe ọ bụla naanị ha mewere ihe ha na onye ha nwụrụ anwụ na-emekọbu. Otú onye ọ bụla si eru uju dị iche. Ka anyị cheta na Jehova nyere anyị ọrụ ilekọta ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ. w19.06 24 ¶16

Mọnde, Mach 8

M ga-eji ihe kechie ọnụ m iji chee ya nche, mgbe onye ọ bụla bụ́ onye ajọ omume nọ n’ihu m.—Ọma 39:1.

Ọ bụrụ na a machie ọrụ anyị, anyị kwesịrị ịma na e nwere oge anyị kwesịrị “ịgbachi nkịtị.” (Ekli. 3:7) Anyị ekwesịghị ịgwa ndị ọzọ ihe ndị dị ka, aha ụmụnna anyị, ebe anyị na-ezukọ, otú anyị si ezi ozi ọma, nakwa otú anyị si enweta akwụkwọ anyị na ihe ndị ọzọ e ji amụ Baịbụl. Anyị ekwesịghị ịgwa ha ndị ọchịchị, ndị enyi anyị ma ọ bụ ndị ikwu anyị bi n’obodo anyị ma ọ bụ ná mba ọzọ. Ọ bụrụ na anyị agwa ha, anyị na-etinye ụmụnna anyị ná nsogbu. Ekwela ka obere ihe kpatara anyị nkewa. Ekwensu ma na ụlọ ọ bụla kewara ekewa agaghị eguzo. (Mak 3:24, 25) Ọ ga na-agbalị mgbe niile ime ihe ga-eme ka anyị kewaa. Ihe mere o ji na-eme ya bụ ka anyị lụsowe ụmụnna anyị ọgụ kama ịlụso yanwa. Ụmụnna ndị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ kwesịkwara ịkpachara anya maka ihe a. Ọ bụrụ na anyị agbalịa dozie okwu ọ bụla anyị na ụmụnna anyị nwere, ọ ga-eme ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-ekewa anyị.—Kọl. 3:13, 14. w19.07 11-12 ¶14-16

Tuzdee, Mach 9

Ohu nke Onyenwe anyị . . . kwesịrị ịbụ onye na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ, onye ruru eru izi ihe.—2 Tim. 2:24.

Ọtụtụ mgbe, ihe mere ndị mmadụ ji ege anyị ntị bụ otú anyị si gwa ha okwu, ọ bụghị ihe anyị kwuru. Obi na-adị ha ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri obịọma na akọ gwa ha okwu, na-egosikwa ha na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ. Anyị anaghị amanye ha ige anyị ntị. Kama, anyị na-agbalị ịghọta ihe mere na ha enweghị mmasị n’okpukpe, na-agbalịkwa ịghọta ha. Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl na-agwa ndị Juu okwu, o ji ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ mee ka ihe ọ na-ekwu doo ha anya. Ma, mgbe ọ na-agwa ndị ọkà mmụta Grik okwu n’Ariopagọs, o kwughị na ihe ọ na-agwa ha si na Baịbụl. (Ọrụ 17:2, 3, 22-31) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Pọl? Ị chọpụta na onye ị na-ezi ozi ọma ekweghị na Baịbụl, o nwere ike ịkacha mma ka ị ghara ịkpọtụ Baịbụl aha. Ọ bụrụ na ị chọpụta na o nwere ike ime mmadụ ihere ma ọ bụru na ndị ọzọ ahụ ebe gị na ya na-agụ Baịbụl, i nwere ike ime ya otú ahụ́ ga-erutụ ya ala, dị ka, gị na ya ịgụ nke dị n’ekwentị. w19.07 21 ¶5-6

Wenezdee, Mach 10

Lezienụ anya ka a ghara ịrata obi unu, unu ewee gaa fee chi ọzọ ma kpọọrọ ha isiala.—Diut. 11:16.

Setan ji akọ nwaa ndị Izrel ka ha fee arụsị. Ọ ma na nri dị ha mkpa, n’ihi ya, o ji ya nwaa ha ka ha mee ihe ọ chọrọ. Mgbe ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa ahụ, ha gbanwere otú ha si arụ ọrụ ugbo. Mgbe ha nọ n’Ijipt, ha na-aga n’Osimiri Naịl kuru mmiri gbaa ihe ndị ha kụrụ. Ma, e nweghị osimiri buru ibu dị n’Ala Nkwa ahụ. Ọ bụ mmiri zoro ezo na igirigi na-ede ihe ha kụrụ n’ubi. (Diut. 11:10-15; Aịza. 18:4, 5) N’ihi ya, ndị Izrel mụrụ ụzọ ọhụrụ ha ga-esi na-arụ ọrụ ugbo. Gịnị mere Jehova ji dọọ ha aka ná ntị banyere ife chi ọzọ mgbe ọ na-ekwu gbasara ụzọ ọhụrụ ha ga-esi na-akọ ugbo? Jehova ma na ndị Izrel ga-achọ ịmụta ụzọ ụfọdụ ndị na-efe chi ọzọ gbara ha gburugburu si akọ ugbo nakwa na otú ndị Kenan na-akọ ugbo si efe Bel kpara otú ha si eche echiche aka.—Ọnụ Ọgụ. 25:3, 5; Ikpe 2:13; 1 Eze 18:18. w19.06 3 ¶4-6

Tọzdee, Mach 11

Ihe m na-ekpe n’ekpere bụ ka ịhụnanya unu na-abawanye ụba.—Fil. 1:9.

Mgbe Pọl onyeozi, Saịlas, Luk, na Timoti rutere Filipaị bụ́ ebe ndị Rom na-achị, ha hụrụ ọtụtụ ndị chọrọ ịmatakwu gbasara Alaeze Chineke. Ha anọ nyere aka hiwe ọgbakọ n’ebe ahụ. Ndị niile na-eso ụzọ malitere izukọta ọnụ na-amụ ihe, ikekwe, n’ụlọ otu nwanna nwaanyị na-ele ọbịa nke ọma aha ya bụ Lidia. (Ọrụ 16:40) Ma o teghị aka, nsogbu abịara ọgbakọ ọhụrụ a. Ekwensu mere ka ndị iro malite ịkpagbu Pọl na ndị ọzọ n’ihi ozi ọma ha na-ekwusa. A nwụchiri Pọl na Saịlas, pịa ha ụtarị, tụọkwa ha mkpọrọ. Mgbe a tọhapụrụ ha, ha gara leta ụmụnna ndị ahụ ma gbaa ha ume. Mgbe e mechara, Pọl, Saịlas, na Timoti si n’obodo ahụ pụwa. Ma, ọ ga-abụ na Luk nọọrọ ebe ahụ. Olee ihe ọgbakọ ọhụrụ a ga-emezi? Jehova ji mmụọ nsọ ya nyere ha aka, ha anọgide na-efe ya. (Fil. 2:12) Ihe a mere ka Pọl jiri ha na-eme ọnụ. w19.08 8 ¶1-2

Fraịdee, Mach 12

Onye gbaziiri ihe bụkwa ohu onye gbazinyere ya ihe.—Ilu 22:7.

Ị̀ kwagara ebe ọzọ na nso nso a? Ịkwaga ebe ọzọ nwere ike ifu ezigbo ego. Iji ụgwọ anaghịkwa ara ahụ́. N’ihi ya, agbazirila ego gaa zụọ ihe na-adịghị gị mkpa n’eziokwu. (Ilu 22:3) Mgbe ihe siri ike, dị ka, mgbe anyị na-elekọta onye ezinụlọ anyị ahụ́ na-adịghị, o nwere ike isiri anyị ike ikpebi ego ole anyị ga-agbaziri. Ya dị otú ahụ, cheta na “ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike” nwere ike inyere gị aka ikpebi ihe ga-adị mma. Otú Jehova nwere ike isi zaa gị ekpere ahụ bụ ime ka i nwee udo nke ‘ga-eche obi gị na ike iche echiche gị nche,’ mee ka i wetuo obi kpebie ihe dị mma ị ga-eme. (Fil. 4:6, 7; 1 Pita 5:7) Nwee ezigbo ndị enyi. Na-akọrọ ezigbo ndị enyi gị otú obi dị gị na ihe ndị siiri gị ike, karịchaa ndị ụdị ihe ndị ahụ metụrụla. I mee otú ahụ, obi nwere ike ịna-adị gị mma. (Ekli. 4:9, 10) Ndị enyi gị nọ n’ebe ị nọbu ka ga-abụkwa ndị enyi gị. w19.08 22 ¶9-10

Satọdee, Mach 13

Ha wee kpọkọta ha na . . . Ha-Magedọn.—Mkpu. 16:16.

Gịnị mere Jehova ji si na Megido nweta aha agha ukwu ikpeazụ ya? A nọ na Megido na Ndagwurugwu Jezril nke dị ya nso lụọ ọtụtụ agha. E nwere mgbe ụfọdụ Jehova nyeere ndị ya aka ịlụso ndị iro ha ọgụ n’agha ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ “n’akụkụ mmiri Megido” ka Chineke nyeere Berak bụ́ onyeikpe n’Izrel aka imeri ndị agha Kenan, nke Sisera bụ ọchịagha ha. Berak na Debora bụ́ onye amụma nwaanyị kelere Jehova maka otú o si rụọ ọrụ ebube mee ka ha merie. Ha bụrụ abụ, sị: “Kpakpando si n’eluigwe . . . buso Sisera agha. Jehova, ka ndị iro gị niile si otú a laa n’iyi, ka ndị hụrụ gị n’anya dịrị ka mgbe anyanwụ ji ike ya dum na-awa.” (Ikpe 5:19-21, 31) N’Amagedọn, ndị iro Chineke ga-alakwa n’iyi, ma a ga-azọpụta ndị hụrụ ya n’anya. Ma, e nwere ezigbo ihe dị iche n’agha abụọ a. Ndị Chineke agaghị alụ ọgụ n’agha Amagedọn. Ha agaghịdị eji ngwá agha. Naanị ihe ga-eme ka ha dị ike bụ ‘ịnọrọ jụụ na ịtụkwasị’ Jehova na ìgwè ndị agha ya nke eluigwe obi.—Aịza. 30:15; Mkpu. 19:11-15. w19.09 9 ¶4-5

Sọnde, Mach 14

Bịakwutenụ m.—Mat. 11:28.

Otu ụzọ anyị ga-esi ‘bịakwute’ Jizọs bụ ịgbalịsi ike mụọ gbasara ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere. (Luk 1:1-4) O nweghị onye ga-emere anyị ya. Ọ bụ anyịnwa ga-eji aka anyị mụọ ihe Baịbụl kọrọ gbasara Jizọs. Otú ọzọ anyị sikwa ‘abịakwute’ Jizọs bụ ikpebi ka e mee anyị baptizim, anyị aghọọ ndị na-eso ụzọ ya. Ụzọ ọzọ anyị si ‘abịakwute’ Jizọs bụ ịgakwuru ndị okenye ọgbakọ mgbe anyị chọrọ enyemaka. Jizọs ji ụmụnna ndị a bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” na-elekọta atụrụ ya. (Efe. 4:7, 8, 11; Jọn 21:16; 1 Pita 5:1-3) Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike gaa gwa ha ka ha nyere anyị aka. Anyị agaghị atụ anya ka ndị okenye mara ihe dị anyị n’obi na ihe dị anyị mkpa. Chegodị gbasara otu nwanna aha ya bụ Julian. Ọ sịrị: “M gwara ndị okenye ka ha bịa nyere m aka. Nleta ha so n’ihe ọma kachanụ e meere m.” Ụdị ndị okenye abụọ ahụ letara Julian nwere ike inyere anyị aka ịmata “uche nke Kraịst,” ya bụ, ịghọta otú Jizọs si eche echiche na otú o si ele ihe anya ma na-eme ka ya. (1 Kọr. 2:16; 1 Pita 2:21) Aka ha ga-enyere anyị so n’onyinye kachanụ ha nwere ike inye anyị. w19.09 21 ¶4-5

Mọnde, Mach 15

Enwekwara m atụrụ ọzọ, ndị na-anọghị n’ogige atụrụ a.—Jọn 10:16.

Na Baịbụl, e nwere ndị nwoke na ndị nwaanyị nwere okwukwe, ndị Chineke nyere mmụọ nsọ ya, ma ha esoghị n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. Otu n’ime ha bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. (Mat. 11:11) Onye ọzọ bụ Devid. (Ọrụ 2:34) Ha na ọtụtụ ndị ọzọ so ná ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ mgbe ụwa ga-abụ paradaịs. Ha na oké ìgwè mmadụ ahụ ga-enwe ohere ha ga-eji gosi na ha na-akwado Jehova na ọchịchị ya. O nwetụbeghị mgbe Chineke si ná mba niile kpọkọta ọtụtụ nde mmadụ, mee ka ha dịrị n’otu. Ma ànyị nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, anyị kwesịrị ịna-enyere ọtụtụ ndị aka ka ha soro n’oké ìgwè mmadụ ahụ, ndị so ‘n’atụrụ ọzọ.’ N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka e nwee oké mkpagbu nke ga-ebibi ọchịchị niile na okpukpe niile na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala. Ihe ọma ga-emere ndị niile so n’oké ìgwè mmadụ ahụ abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Ha ga-enwe ike ife Jehova ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa.—Mkpu. 7:14. w19.09 31 ¶18-19

Tuzdee, Mach 16

N’oge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa. —2 Pita 3:3.

Ka ụwa Setan na-agbazi egwú ụla, anyị kwesịrị ịtụ anya na a ga-enwekwu ihe ndị ga-eme ka a mata ma ànyị ji obi anyị niile na-akwado Chineke na Alaeze ya. O nwere ike ndị mmadụ agaghị akwụsị ịkwa anyị emo. Ụdị ihe ahụ nwere ike ime karịchaa n’ihi na o nweghị ndị anyị na-akwado n’ụwa Setan. Anyị kwesịrị ịmụtakwu iguzosi ike n’ebe Jehova nọ ugbu a ka anyị nwee ike ime otú ahụ n’oké mkpagbu ahụ. N’oké mkpagbu ahụ, a ga-agbanwe ndị Jehova ji na-eduzi ndị ya n’ụwa. O nwere mgbe ọ ga-eru, a chịkọta ndị niile e tere mmanụ ka fọrọ n’ụwa, ha agaa eluigwe ka ha nwee ike soro lụọ agha Amagedọn. (Mat. 24:31; Mkpu. 2:26, 27) Ọ pụtara na Òtù Na-achị Isi agaghịzi eso anyị nọrọ n’ụwa a. Ma, oké ìgwè mmadụ ahụ ka ga-abụ ndị a haziri ahazi. Ụmụnna ruru eru so n’atụrụ ọzọ ga na-eduzi ndị Chineke. Anyị kwesịrị igosi na anyị na-akwado Jehova. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-akwado ụmụnna ndị ahụ ma na-eme ihe ha gwara anyị Chineke chọrọ ka anyị mee. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-alafere. w19.10 17 ¶13-14

Wenezdee, Mach 17

Ebe ị gara ka m ga-aga . . . Ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ. —Rut 1:16, 17.

Neomi bụ ezigbo nwaanyị hụrụ Jehova n’anya. Ma mgbe di ya na ụmụ ya ndị nwoke abụọ nwụrụ, ọ chọrọ ịgbanwe aha ya zawa “Mera,” nke pụtara “Obi Ilu.” (Rut 1:3, 5, 20, 21) Nwunye nwa ya bụ́ Rut ahapụghị ya n’oge ahụ nsogbu bịaara ya. Ọ bụghị naanị na Rut nyeere ya aka, kamakwa, ọ gwara ya okwu kasiri ya obi. Rut gwara Neomi ihe gosiri na ọ hụrụ ya n’anya nakwa na ọ ga-akwado ya. Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye nwanna anyị anwụọ, anyị kwesịrị inyere ya aka. E nwere ike iji di na nwunye tụnyere osisi abụọ toro n’akụkụ ibe ha. Ka afọ na-aga, mgbọrọgwụ osisi abụọ ahụ na-ahịkọta. Ọ bụrụ na otu anwụọ, o nwere ike ịkpa nke ọzọ aka ọjọọ. Otú ahụ ka o nwekwara ike ịdị onye di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụnahụrụ. Obi nwere ike ịgbawa ya ruo ogologo oge. w19.06 23 ¶12-13

Tọzdee, Mach 18

A na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya.—Jems 1:14.

Anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ụdị ihe anyị ji atụrụ ndụ nakwa n’awa ole anyị na-eji atụrụ ndụ. Ma anyị emeghị otú ahụ, oge anyị ji atụrụ ndụ nwere ike ịkarị nke anyị ji ejere Jehova ozi. Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịmata awa ole ị na-eji atụrụ ndụ. Ọ ga-adị mma ka i dekọọ awa ole i ji tụrụ ndụ n’otu izu. Gaa na kalenda dee awa ole i ji lee tiivi, nọọ n’Ịntanet, gwuokwa egwuregwu ndị dị n’ekwentị gị. Ị chọpụta na oge i ji atụrụ ndụ karịrị akarị, gbalịa depụta ihe ndị ị ga na-eme. Buru ụzọ wepụta oge ị ga-eji na-eme ihe ndị ka mkpa, gị ewepụtazie oge ị ga-eji na-atụrụ ndụ. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịrịọ Jehova ka o nyere gị aka ime ihe ahụ i dere. I mee otú ahụ, ị ga-enwe oge na ume ị ga-eji na-amụ ihe nke onwe gị, na-enwe ofufe ezinụlọ, na-aga ọmụmụ ihe, na-ekwusa ozi ọma ma na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, bụ́ ozi anyị na-ejere Jehova. O nwekwara ike ime ka obi ghara ịna-ama gị ikpe gbasara oge i ji atụrụ ndụ. w19.10 30 ¶14, 16; 31 ¶17

Fraịdee, Mach 19

Enwere m ike ịchọ ime ihe, ma enweghị m ike ịrụpụta ihe dị mma.—Rom 7:18.

N’ihe dị ka afọ 55, ndị Kọrịnt kpebiri ime otu ihe dị ezigbo mkpa. Mgbe ha nụrụ na nsogbu bịaara ụmụnna nọ na Jeruselem na Judia, ha kpebiri na ha ga-anakọta onyinye iji nyere ụmụnna ndị ahụ aka. (1 Kọr. 16:1; 2 Kọr. 8:6) Ma, mgbe ọnwa ole na ole gara, Pọl onyeozi nụrụ na ndị Kọrịnt emebeghị ihe ahụ ha kpebiri ime. N’ihi ya, o yiri ka a gaghị anakọtacha onyinye ha n’oge ka e nwee ike iji ya na onyinye ọgbakọ ndị ọzọ nyere gaa Jeruselem. (2 Kọr. 9:4, 5) Ihe ụmụnna nọ na Kọrịnt kpebiri ime dị mma. Pọl jakwara ha mma maka okwukwe ha na-enweghị atụ na otú ha si chọọ imesapụ aka. Ma, ọ gbakwara ha ume ka ha mechaa ihe ahụ ha bidoro. (2 Kọr. 8:7, 10, 11) Ihe ha mere na-akụziri anyị na o nwere ike isiri Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ike ime ihe ha kpebiri ime. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ezughị okè nwere ike ime ka anyị na-eyigharị ihe anyị kpebiri ime. Ihe anyị na-atụghị anya ya nwekwara ike ime ka o siere anyị ike ime ihe anyị kpebiri.—Ekli. 9:11. w19.11 26-27 ¶3-5

Satọdee, Mach 20

Burunụ ọta ukwu bụ́ okwukwe.—Efe. 6:16.

Otú ahụ ọta ukwu si echebe ọtụtụ ebe n’ahụ́ mmadụ ka okwukwe si echebe anyị ka anyị ghara itinye aka n’ihe ọjọọ ndị ụwa na-eme, dị ka omume rụrụ arụ, tigbuo zọgbuo, na ihe ndị ọzọ na-adịghị Chineke mma. E nwere ọgụ anyị bụ́ Ndị Kraịst na-alụ. Anyị na-alụsokwa ndị mmụọ ọjọọ ọgụ. (Efe. 6:10-12) Olee otú i nwere ike isi chọpụta ma okwukwe gị ọ̀ ga-esi ike ma ọnwụnwa bịara gị? Nke mbụ, i kwesịrị ikpe ekpere ka Chineke nyere gị aka. Ọzọ bụ na i kwesịrị inyocha Okwu Chineke ka ị mata ma okwukwe gị ọ̀ dịkwa otú Chineke chọrọ ya. (Hib. 4:12) Baịbụl kwuru, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị.” (Ilu 3:5, 6) Ugbu a, chebara ihe mere ná ndụ gị na nso nso a echiche na ihe i mere banyere ya. Dị ka ihe atụ, ihe ò siiri gị ezigbo ike? Ò mere ka i cheta nkwa Jehova kwere ná Ndị Hibru 13:5, ebe sịrị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị”? Nkwa ahụ ò mere ka obi sikwuo gị ike na Jehova ga-enyere gị aka? Ya bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na okwukwe gị dị otú o kwesịrị. w19.11 14 ¶1, 4

Sọnde, Mach 21

Ụmụ bụ ihe nketa si n’aka Jehova.—Ọma 127:3.

Nne na nna kwesịrị iwepụtara nwa ha ezigbo oge, jirikwa ike ha niile na-elebara ya anya. N’ihi ya, ọ bụrụ na di na nwunye amụọ ọtụtụ ụmụ n’enweghị nke ji ezigbo ihe tọ ibe ya, o nwere ike isiri ha ike ịna-elebara nke ọ bụla n’ime ha anya. Ụfọdụ ndị nne na nna mụrụ ọtụtụ ụmụ kwuru na ọ dịghịrị ha mfe. O nwere ike ime ka ike na-agwụkarị nne, obi ana-ajọkwa ya njọ. O nwere ike ime ka ọ ghara inwe ike ịmụ ihe, ikpe ekpere nakwa ịga ozi ọma otú o kwesịrị. Ihe ọzọ nwekwara ike isiri ya ike bụ ige ntị n’ọmụmụ ihe na irite uru na ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na di hụrụ nwunye ya n’anya na-eme ihe o nwere ike ime inyere nwunye ya aka ilekọta ụmụ ha, ma n’ọmụmụ ihe ma n’ụlọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike inyere nwunye ya aka rụọ ọrụ ndị dị n’ụlọ. Ọ ga-agbalịkwa ka Ofufe Ezinụlọ ha na-enwe kwa izu baara ha niile uru. O kwesịkwara ịna-akpọ ezinụlọ ya aga ozi ọma mgbe niile. w19.12 24 ¶8

Mọnde, Mach 22

Afọ Jubili ka afọ nke iri ise ga-abụrụ unu.—Lev. 25:11.

Olee uru Jubili baara ndị Izrel? Ka e were ya na onye Izrel ji ụgwọ, nke mere ka o ree ala ya ka o nwee ike ịkwụ ụgwọ ahụ. N’afọ Jubili, a ga-enyeghachi ya ala ahụ. N’ihi ya, onye ahụ ga-enwe ike ‘ịlaghachi n’ala ya.’ Ala ụmụ ya ga-eketa agaghị efu. Ka e werekwa ya na nwoke ihe siiri ike rere nwa ya, ma ọ bụdị ree onwe ya, ka ọ gaa gbawa ohu iji kwụọ ụgwọ o ji. O ruo n’afọ Jubili ahụ, ohu ahụ “ga-alaghachikwuru ezinụlọ ya.” (Lev. 25:10) N’ihi ya, o nweghị onye ga-abụ ohu mgbe niile n’enweghị olileanya. Jehova kwukwara, sị: “Ọ dịghị onye kwesịrị ịda ogbenye n’etiti unu, n’ihi na Jehova aghaghị ịgọzi gị n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka i nweta dị ka ihe nketa.” (Diut. 15:4) Ọ dị ezigbo iche n’ihe na-eme n’ụwa taa. Ihe anyị na-ahụ taa bụ na ndị ọgaranya na-abakwu ọgaranya, ndị ogbenye ana-adakwu ogbenye. w19.12 8-9 ¶3-4

Tuzdee, Mach 23

Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa.—Ilu 27:11.

Mgbe ọnwụnwa bịaara Jizọs, “o ji ibesi ákwá ike na anya mmiri kpesie ekpere ike.” (Hib. 5:7) Otú o si jiri obi ya niile kpee ekpere gosiri na ọ na-erubere Jehova isi, meekwa ka o kpebisikwuo ike ime ihe Nna ya chọrọ. Jehova weere ekpere Jizọs ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Otú Jizọs si bie ndụ mere Nna ya ezigbo obi ụtọ, meekwa ka o doo anya na ọ bụ ọchịchị Chineke kacha mma. Anyị ga-emeli ka Jizọs ma ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike ịna-erubere Jehova isi ma jiri obi anyị niile na-efe ya. Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, anyị ga-ekpesi ekpere ike ka Jehova nyere anyị aka n’ihi na anyị chọrọ ime ihe dị ya mma. Anyị ma na Jehova agaghị aza ekpere anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe na-adịghị ya mma. Ma, ọ bụrụ na anyị na-eme ihe dị Jehova mma, obi ga-esi anyị ike na ekpere anyị ga-adị ya ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Obi ga-esikwa anyị ike na otú anyị si erubere Nna anyị nke eluigwe isi ma jiri obi anyị niile na-efe ya ga-eme ya obi ụtọ. w19.11 21-22 ¶7-8

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 9) Luk 19:29-44

Wenezdee, Mach 24

Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche?—Mat. 24:45.

N’afọ 1919, Jizọs họpụtara ụmụnna ya ole na ole o tere mmanụ ka ha bụrụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” Ohu ahụ na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma, na-enyekwa ndị na-eso ụzọ Jizọs “nri ha n’oge kwesịrị ekwesị.” Setan na ụwa ya na-agbasi mbọ ike ịkwụsị ọrụ ohu ahụ na-arụ. A sị na Chineke anọnyereghị ohu ahụ, ha agaraghị enwe ike ịrụ ọrụ a. A lụọla agha ụwa nke mbụ na nke abụọ, nweekwa ụkọ ego n’ụwa niile. A na-akpagbukwa ndị Chineke ma na-echi ha ọnụ n’ala. N’agbanyeghị ihe a niile, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche ka na-enye ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ụwa nri n’oge ya. Chegodị gbasara ọtụtụ ihe nzukọ Jehova na-ewepụtara anyị taa n’efu n’ihe karịrị narị asụsụ itoolu. Ihe a kwesịrị ime ka o doo ewu na ọkụkọ anya na Chineke na-akwado ohu ahụ. Ozi ọma anyị na-ekwusa bụ ihe ọzọ gosiri na Jehova na-agọzi ohu ahụ. N’eziokwu, a na-ekwusa ozi ọma a “n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—Mat. 24:14. w19.11 24 ¶15-16

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 10) Luk 19:45-48; Matiu 21:18, 19; 21:12, 13

Tọzdee, Mach 25

A nụkwara olu [Kraịst] n’ihi na ọ tụrụ egwu Chineke.—Hib. 5:7.

N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, nnukwu onye nchụàjà na-esure ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ tupu ya achụọ àjà ọ chọrọ ịchụ. Ime ihe a na-eme ka o doo ya anya na o meela ihe niile Chineke chọrọ ka o mee tupu ya achụọ àjà ahụ. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nwere ihe dị mkpa o kwesịrị ime tupu ya enwee ike iji ndụ ya chụọ àjà. Ihe ahụ dị mkpa karịa ịzọpụta ụmụ mmadụ. Gịnị ka ọ bụ? O kwesịrị ibu ụzọ rubere Jehova isi n’oge niile ọ nọ n’ụwa ka Jehova nwee ike ịnabata àjà ọ bịara ịchụ. Jizọs ga-esi otú ahụ gosi na ime ihe Jehova chọrọ bụ otú mmadụ kwesịrị isi bie ndụ. Jizọs ga-eme ka o doo anya na ọ bụ Nna ya kwesịrị ịchị. N’oge niile Jizọs biri n’ụwa, o rubeere Nna ya isi n’ihe niile. N’agbanyeghị na ọtụtụ ọnwụnwa bịaara ya, o kpebisiri ike ime ka ndị mmadụ mata na ọ bụ otú Nna ya si achị kacha mma.—Fil. 2:8. w19.11 21 ¶6-7

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 11) Luk 20:1-47

Fraịdee, Mach 26

Ọ bụ unu rapaara m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche.—Luk 22:28.

N’oge niile Jizọs kwusara ozi ọma, ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ghọọrọ ya ezigbo ndị enyi. (Ilu 18:24) Jizọs ji ndị enyi ya a kpọrọ ihe. N’oge niile o jere ozi ya, e nweghị nwanne ya nwere okwukwe na ya. (Jọn 7:3-5) E nwedịrị mgbe ndị ikwu ya chere na isi emebiela ya. (Mak 3:21) Ma, Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ihe dị n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ. Ndịozi Jizọs mejọrọ ihe mgbe ụfọdụ. Ma, o lekwasịghị anya n’ihe ndị ha mejọrọ, kama, ọ chọpụtara na ha nwere okwukwe na ya. (Mat. 26:40; Mak 10:13, 14; Jọn 6:66-69) Mgbe ha na ya nọ n’abalị ikpeazụ tupu ya anwụọ, ọ gwara ha, sị: “Ana m akpọ unu ndị enyi m, n’ihi na ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.” (Jọn 15:15) O doro anya na ndị enyi Jizọs gbara ya ezigbo ume. w19.04 11 ¶11-12

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 12) Luk 22:1-6; Mak 14:1, 2, 10, 11

Ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs
Mgbe Anyanwụ Dachara
Satọdee, Mach 27

Mmụọ nsọ n’onwe ya so mmụọ anyị na-agba àmà na anyị bụ ụmụ Chineke.—Rom 8:16.

Olee otú mmadụ si amata na a họrọla ya ịga eluigwe? Ihe Pọl onyeozi degaara ndị Rom “a kpọrọ ịbụ ndị nsọ” ga-eme ka azịza ajụjụ a doo anya. Mgbe o kwuchara ihe e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa, o nwekwara ihe ọzọ ọ gwara ha. Ọ gwara ha, sị: “Unu anataghị mmụọ nke ịnọ n’ohu, nke na-akpata egwu ọzọ, kama unu natara mmụọ nke ịbụ ndị e doro dị ka ụmụ, bụ́ mmụọ nke anyị sitere na ya na-eti mkpu, sị: ‘Aba, Nna!’” (Rom 1:7; 8:15) Ọ pụtara na Chineke na-eji mmụọ nsọ ya eme ka o doo ndị e tere mmanụ anya na ọ họrọla ha ịga eluigwe. (1 Tesa. 2:12) E nwee ndị Jehova kpọrọ ịga eluigwe, ọ na-eme ka o doo ha anya na ọ họrọla ha. (1 Jọn 2:20, 27) Ọ bụghị onye ọzọ ga-eme ka obi sie Ndị Kraịst e tere mmanụ ike na e teela ha mmanụ. w20.01 22 ¶7-8

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 13) Luk 22:7-13; Mak 14:12-16 (Ihe ndị mere mgbe anyanwụ dachara: Naịsan 14) Luk 22:14-65

Sọnde, Mach 28

Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.—Jọn 15:13.

“Iwu nke Kraịst” dabeere n’ịhụnanya, nke bụkwanụ ihe kacha mma iwu kwesịrị ịdabere na ya. (Gal. 6:2) Ọ bụ ịhụnanya mere Jizọs ji mee ihe niile o mere. Onye na-enwere ndị mmadụ ọmịiko gosiri na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ bụ ụdị ọmịiko a mere Jizọs ji kụziere ìgwè mmadụ ihe, gwọọ ndị ọrịa, nye ndị agụụ ji nri, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. (Mat. 14:14; 15:32-38; Mak 6:34; Luk 7:11-15) Jizọs butere ọdịmma ndị ọzọ ụzọ. Ụzọ kachanụ o si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu bụ na ọ nwụrụ maka anyị. Anyị nwere ike ime ka Jizọs ma anyị were ya na mkpa ndị ọzọ nwere karịrị nke anyị. Anyị nwekwara ike iṅomi Jizọs ma anyị na-amụ otú anyị ga-esi na-enwekwuru ndị nọ n’ókèala anyị ọmịiko. Ọ bụrụ na ụdị ọmịiko a emee ka anyị na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma ma na-akụziri ha Baịbụl, anyị na-egosi na anyị na-edebe iwu nke Kraịst. w19.05 4 ¶8-10

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 14) Luk 22:66-71

Mọnde, Mach 29

[Jehova] zitere m ikwusara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụwo ha . . . , na ịtọhapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha lawa.—Luk 4:18.

Jizọs nyeere ndị mmadụ aka inwere onwe ha n’ụgha ndị ndú okpukpe na-akụzi. A manyere ọtụtụ ndị Juu n’oge ahụ ịna-eme omenala ndị mmadụ na ikwere ihe ndị na-abụghị eziokwu. (Mat. 5:31-37; 15:1-11) Ndị sịrị na ha na-enyere ha aka ife Chineke amaghịdị ihe bụ́ ife Chineke. E nwere ike ịsị na ha kpuru ìsì. Ebe ọ bụ na ha jụrụ Mesaya na eziokwu ọ kụziri, ha ka nọkwa n’ọchịchịrị nakwa ná mmehie. (Jọn 9:1, 14-16, 35-41) Jizọs kụziri eziokwu, kpaakwa àgwà ọma. O si otú ahụ kụziere ndị dị umeala n’obi otú ha ga-esi nwere onwe ha ná nkụzi ụgha. (Mak 1:22; 2:23–3:5) Jizọs mekwara ka ndị mmadụ nwere onwe ha n’ohu ha na-agbara mmehie ha ketara n’aka Adam. Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ mere ka Chineke nwee ike ịgbaghara mmehie ndị nwere okwukwe n’àjà ahụ ma na-ebi ndụ gosiri na ha nwere okwukwe na ya.—Hib. 10:12-18. w19.12 10 ¶8; 11 ¶10-11

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 15) Matiu 27:62-66

Tuzdee, Mach 30

E sikwa n’aka ya jiri mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa kaa unu akara, bụ́ ihe àmà e bu ụzọ nye anyị tupu anyị enweta ihe nketa anyị. —Efe. 1:13, 14.

Jehova na-eji mmụọ nsọ ya eme ka o doo Ndị Kraịst niile e tere mmanụ anya na ọ họrọla ha. Ọ bụ otú ahụ ka mmụọ nsọ si bụrụ ‘ihe àmà,’ ya bụ, ihe na-eme ka obi sie ha ike na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’eluigwe, ọ bụghị n’ụwa. (2 Kọr. 1:21, 22) Onye Kraịst ghọọ onye e tere mmanụ, ọ̀ pụtara na e nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịga eluigwe? Mba. Ọ ga-edo ya anya na a họrọla ya ka ọ gaa eluigwe. Ma, o kwesịrị icheta ihe Pita kwuru. Ọ sịrị: “Ụmụnna m, gbalịsienụ ike ọbụna karị ka unu mee ka òkù a kpọrọ unu na nhọrọ a họọrọ unu bụrụ ihe unu onwe unu ji n’aka; n’ihi na ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, unu agaghị ada mgbe ọ bụla.” (2 Pita 1:10) N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na a họrọla Onye Kraịst e tere mmanụ ịga eluigwe, naanị ihe ga-eme ka o nweta ụgwọ ọrụ ya bụ ma o jiri obi ya niile na-efe Jehova.—Fil. 3:12-14; Hib. 3:1; Mkpu. 2:10. w20.01 21-22 ¶5-6

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 16) Luk 24:1-12

Wenezdee, Mach 31

Onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.—Ilu 12:18.

Otu ihe mere ndị enyi Job atọ emetereghị ya ebere bụ na ha lekwasịrị anya naanị n’ihe ha na-ahụ anya. O meziri ka ha kwuo ihe na-adịghị mma banyere ya. Olee otú anyị ga-esi zere ime ụdị ihe a? Anyị kwesịrị ịghọta na ọ bụ naanị Jehova ma ihe niile gbasara ọnọdụ onye ọ bụla nọ na ya. Mmadụ kọwara gị nsogbu ya, jiri ndidi gee ya ntị nke ọma. Gosi ya na ihe na-eme ya na-ewute gị. Ọ bụ naanị mgbe ahụ ka ị ga-emetere ya ebere. Ọ bụrụ na anyị na-emetere ụmụnna anyị ebere, anyị agaghị eji nsogbu ha nọ na ya na-agba asịrị. Onye na-agba asịrị anaghị eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, ọ na-etisa ya. (Ilu 20:19; Rom 14:19) Ihe o kwuru nwekwara ike ịgbawakwu onye na-ata ahụhụ obi. (Efe. 4:31, 32) N’ihi ya, ọ dị mma ka anyị na-achọpụta ebe ụmụnna anyị na-eme nke ọma ma na-eche otú anyị nwere ike isi nyere ha aka idi nsogbu ha. w19.06 21-22 ¶8-9

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya