Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es22 p. 47-57
  • Mee

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ—2022
  • Isiokwu Nta
  • Sọnde, Mee 1
  • Mọnde, Mee 2
  • Tuzdee, Mee 3
  • Wenezdee, Mee 4
  • Tọzdee, Mee 5
  • Fraịdee, Mee 6
  • Satọdee, Mee 7
  • Sọnde, Mee 8
  • Mọnde, Mee 9
  • Tuzdee, Mee 10
  • Wenezdee, Mee 11
  • Tọzdee, Mee 12
  • Fraịdee, Mee 13
  • Satọdee, Mee 14
  • Sọnde, Mee 15
  • Mọnde, Mee 16
  • Tuzdee, Mee 17
  • Wenezdee, Mee 18
  • Tọzdee, Mee 19
  • Fraịdee, Mee 20
  • Satọdee, Mee 21
  • Sọnde, Mee 22
  • Mọnde, Mee 23
  • Tuzdee, Mee 24
  • Wenezdee, Mee 25
  • Tọzdee, Mee 26
  • Fraịdee, Mee 27
  • Satọdee, Mee 28
  • Sọnde, Mee 29
  • Mọnde, Mee 30
  • Tuzdee, Mee 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ—2022
es22 p. 47-57

Mee

Sọnde, Mee 1

Ọ nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru ha.​—Luk 2:51.

Mgbe Jizọs ka bụ nwata n’ụwa, o kpebiri irubere nne na nna ya isi. O nweghị mgbe ọ jụrụ ige ha ntị, na-eche na ya ka ha mara ihe. O doro anya na Jizọs ejighị ọrụ ya dị ka diọkpara n’ezinụlọ ha gwuo egwu. Ọ gbalịrị mụta ọrụ n’aka nna ya bụ́ Josef ka o nwee ike ịna-enyere ndị ezinụlọ ha aka. O nwere ike ịbụ na nne na nna Jizọs gwara ya gbasara ụzọ dị ịtụnanya e si mụọ ya nakwa ihe mmụọ ozi Chineke kwuru gbasara ya. (Luk 2:​8-19, 25-38) Ma, ọ sịghị na nke ahụ a kọọrọ ya ezuorola ya. O jikwa aka ya mụọ Akwụkwọ Nsọ. Olee otú anyị si mara na Jizọs ji ịmụ Okwu Chineke kpọrọ ihe? Otú anyị si mara bụ na mgbe ọ ka bụ nwata, “nghọta o nwere na ihe ọ na-aza [ndị nkụzi nọ na Jeruselem] nọ na-eju” ha anya. (Luk 2:​46, 47) Mgbe Jizọs dị naanị afọ iri na abụọ, o doola ya anya na Jehova bụ Nna ya.​—Luk 2:​42, 43, 49. w20.10 29 ¶13-14

Mọnde, Mee 2

E si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst.​—1 Kọr. 15:12.

Okwukwe anyị nwere na Jizọs si n’ọnwụ bilie bụ ihe mere anyị ji nwee okwukwe na a ga-akpọlite ndị ọzọ nwụrụ anwụ. Mgbe Pọl bidoro ikwu gbasara mbilite n’ọnwụ, o kwuru ihe atọ bụ́ eziokwu. Ha bụ (1) “Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị.” (2) “E liri ya.” (3) “A kpọlitere ya n’ụbọchị nke atọ dị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru.” (1 Kọr. 15:​3, 4) Gịnị ka ọnwụ Jizọs, olili ya, na mbilite n’ọnwụ ya na-akụziri anyị? Aịzaya onye amụma kwuru na a ga-ebipụ Mesaya ahụ “n’ala ndị dị ndụ,” nakwa na “ili ya ga-adị n’etiti ndị ajọ omume.” Ma e nwekwara ihe ọzọ ga-emenụ. Aịzaya kwukwara na Mesaya ahụ ga-eburu ‘mmehie nke ọtụtụ ndị.’ Jizọs mezuru ihe a mgbe o ji ndụ ya chụọ àjà. (Aịza. 53:​8, 9, 12; Mat. 20:28; Rom 5:8) N’ihi ya, ọnwụ Jizọs, olili ya, na mbilite n’ọnwụ ya mere ka anyị nwee olileanya na anyị ga-enwere onwe anyị n’aka mmehie na ọnwụ, nakwa na anyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ. w20.12 2-3 ¶4-6; 5 ¶11

Tuzdee, Mee 3

Mụ onwe m nwere ihe mere m ga-eji nwee obi ike n’anụ ahụ́, ma ọ bụrụ na ọ dị onye ọ bụla nwere. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ọzọ echee na ya nwere ihe mere ọ ga-eji nwee obi ike n’anụ ahụ́, m nwere karịa ya​—Fil. 3:4.

Pọl onyeozi kwusara ozi ọma ọtụtụ mgbe n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Dị ka ihe atụ, n’ụlọ nzukọ dị na Tesalonaịka, “ya na [ndị Juu] nọ na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ ruo ụbọchị izu ike atọ.” (Ọrụ 17:​1, 2) Pọl bụ onye Juu. N’ihi ya, ọ ga-abụ na obi ruru ya ala ikwusa ozi ọma n’ụlọ nzukọ. (Ọrụ 26:​4, 5) Ebe ọ bụ na Pọl ghọtara ndị Juu nke ọma, ahụ́ ruru ya ala izi ha ozi ọma. (Fil. 3:5) Mgbe ndị mmegide mere ka Pọl si na Tesalonaịka na Beria gbapụ, ọ gbagara Atens. N’ebe ahụkwa, “ọ malitere iso ndị Juu na ndị ọzọ bụ́ ndị na-efe Chineke na-atụgharị uche n’ụlọ nzukọ.” (Ọrụ 17:17) Ma mgbe Pọl na-ekwusa ozi ọma n’ahịa, ndị o ziri ozi ọma dị iche. Ndị o ziri ozi ọma bụ ma ndị ọkà mmụta ma ndị Jentaịl ndị ọzọ. Ha weere ihe o kwuru ka “ozizi ọhụrụ.” Ha sịrị ya: “Ị na-akụzi ihe ndị anyị na-anụtụbeghị ná ntị.”​—Ọrụ 17:​18-20. w20.04 9 ¶5-6

Wenezdee, Mee 4

Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.​—Rom 7:21.

Ọ bụrụ na o nwere àgwà ọjọọ gị na ya na-alụ, echela na nke ị na-eme agwụla. Cheta na anyị niile na-emejọ ihe. Anyị niile chọrọ ka Chineke meere anyị amara n’ihi àjà mgbapụta Jizọs. (Efe. 1:7; 1 Jọn 4:10) Ụmụnna anyị ga-agba anyị ume. Ha nwere ike ige anyị ntị mgbe anyị na-agwa ha okwu ma gwa anyị okwu ga-agba anyị ume. (Ilu 12:25; 1 Tesa. 5:14) Otu nwanna nwaanyị onye Naịjirịa aha ya bụ Joy, onye ya na ịda mbà n’obi na-alụ, kwuru, sị: “Gịnị ka m gaara emeli ma e wezụga ụmụnna anyị? Aka ụmụnna anyị nyeere m gosiri na Jehova zara m ekpere. Esila m n’aka ha mụta otú m ga-esi gbaa ndị ọzọ dara mbà n’obi ume.” Anyị kwesịrị ịma na ọ bụghị mgbe niile ka ụmụnna anyị ga-achọpụta na anyị chọrọ agbamume. N’ihi ya, anyị nwere ike ịgakwuru nwanna ma nke a na-akọ n’ọgbakọ gwa ya na anyị chọrọ ka a gbaa anyị ume. w20.12 23-24 ¶7-8

Tọzdee, Mee 5

Ana m akpọ unu ndị enyi m.​—Jọn 15:15.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na mmadụ bụrụ enyi, ihe mbụ i kwesịrị ime bụ iwepụta oge ka gị na ya na-akparịta. Ka unu na-akparịta gbasara otú obi dị unu na ihe ndị unu na-eche, unu ga-abụ enyi. Mgbe ụfọdụ, ọ naghị adịrị anyị mfe ịbụ ezigbo ndị enyi Jizọs. Otu ihe na-akpata ya bụ na anyị ahụtụbeghị Jizọs. Ọ bụkwa otú ọ dị ọtụtụ n’ime Ndị Kraịst n’oge ndịozi. N’agbanyeghị ya, Pita onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na unu ahụghị ya, unu hụrụ ya n’anya. Ọ bụ ezie na unu adịghị ele ya anya ugbu a, ma unu nwere okwukwe n’ebe ọ nọ.” (1 Pita 1:8) N’ihi ya, anyị na Jizọs ga-abụli ezigbo enyi n’agbanyeghị na anyị ahụtụbeghị ya. Ihe ọzọkwa bụ na anyị agaghị agwali Jizọs okwu. Anyị kpewe ekpere, ọ bụ Jehova ka anyị na-agwa okwu. Ọ bụ eziokwu na anyị na-ekpe ekpere n’aha Jizọs, ọ bụghị ya ka anyị na-agwa okwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs achọghị ka anyị na-agwa ya okwu n’ekpere. N’ihi gịnị? N’ihi na ekpere bụ otu ụzọ anyị si efe ofufe. Ọ bụkwa naanị Jehova ka anyị kwesịrị ife. (Mat. 4:10) N’agbanyeghị nke ahụ, anyị ka nwekwara ike igosi na anyị hụrụ Jizọs n’anya. w20.04 20 ¶1-3

Fraịdee, Mee 6

[Chineke] ga-eme ka unu guzosie ike, ọ ga-eme ka unu sie ike.​—1 Pita 5:10.

E nwere ọtụtụ nsogbu ndị na-agba ọsọ na Gris oge ochie na-enwe, dị ka, ike ọgwụgwụ na ahụ́ mgbu. Ihe na-enyere ha aka bụ naanị ọzụzụ e nyere ha na ike ha. A na-azụkwa anyị otú ahụ a zụrụ ha ka anyị nwee ike ịgba ọsọ nke anyị nke ọma. Ma, e nwere ihe anyị ji ka ha mma. Ike anyị ji na-agba ọsọ si n’aka Jehova. Ike ya anaghịkwa agwụ agwụ. Jehova kwere anyị nkwa na ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi, ọ ga na-azụ anyị, na-enyekwa anyị ike. E nwere ọtụtụ nsogbu ndị bịaara Pọl onyeozi. E wezụga na ndị mmadụ kparịrị ya ma kpagbuo ya, e nwere mgbe ike gwụrụ ya, nweekwa otu nsogbu ọ kpọrọ “ogwu n’anụ ahụ́” kpara ya aka ọjọọ. (2 Kọr. 12:7) Ma, kama ikwe ka nsogbu ndị ahụ mee ka ọ kwụsị ife Jehova, ha mere ka ọ tụkwasịkwuo Jehova obi. (2 Kọr. 12:​9, 10) Ihe a o mere mere ka Jehova nyere ya aka ná nsogbu ya niile. w20.04 29 ¶13-14

Satọdee, Mee 7

Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m . . . adọtaghị ya.​—Jọn 6:44.

Anyị na Jehova, Jizọs na ndị mmụọ ozi ‘ịrụkọ ọrụ’ bụ onyinye ọzọ a na-anaghị ahụ anya. (2 Kọr. 6:1) Anyị na ha na-arụkọ ọrụ mgbe ọ bụla anyị na-ekwusa ozi ọma. Pọl kwuru na yanwa na ndị ya na ha so na-ekwusa ozi ọma bụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Anyị kwusawa ozi ọma, anyị na Jizọs na-arụkọkwa ọrụ. Cheta na mgbe Jizọs nyechara ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha “mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ,” ọ sịrị ha: “M nọnyeere unu.” (Mat. 28:​19, 20) Oleekwanụ otú anyị na ndị mmụọ ozi si arụkọ ọrụ? Obi dị anyị ụtọ na ndị mmụọ ozi na-eduzi anyị ma anyị na-ezisara “ndị bi n’ụwa” “ozi ọma ebighị ebi.” (Mkpu. 14:6) Olee uru enyemaka Jehova, Jizọs na ndị mmụọ ozi baarala anyị? Ka anyị na-agha mkpụrụ nke Alaeze, ụfọdụ n’ime ha ga-ada n’obi ndị chọrọ ige ntị ma too. (Mat. 13:​18, 23) Ònye na-eme ka mkpụrụ nke eziokwu too n’obi mmadụ ma mịa mkpụrụ? Jizọs kọwara ya n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. w20.05 30 ¶14-15

Sọnde, Mee 8

Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị.​—Rom 12:2.

Ọtụtụ nde ezinụlọ ekewaala n’ihi ịgba alụkwaghịm. Ndị ezinụlọ bi n’otu ụlọ nwedịrị ike ghara ịdịcha ná mma. Otu onye ọrụ ya bụ inye ndị ezinụlọ ndụmọdụ kwuru na “nne, nna, na ụmụaka nwedịrị ike ghara ịna-ekwurịta okwu n’ihi na ha ji oge ha niile na-apị ekwentị, kọmputa ma ọ bụ na-egwu egwuregwu kọmputa. Ọ bụ eziokwu na ha bi n’otu ụlọ, ma ha amaghị ibe ha nke ọma.” Anyị achọghị ịdị ka ndị ụwa na-anaghị ahụ ibe ha n’anya. Kama, anyị chọrọ ịna-enwere ma ndị ezinụlọ anyị ma ụmụnna anyị ọmịiko. (Rom 12:10) Anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị n’anya otú anyị si hụ ndị ezinụlọ anyị anyị na ha dị ná mma n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-enwere ụmụnna anyị ọmịiko, ọ ga-eme ka anyị na ha jiri obi ụtọ na-efe Jehova.​—Maị. 2:12. w21.01 20 ¶1-2

Mọnde, Mee 9

Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.​—Ọma 86:11.

Òtù egwuregwu ndị nọ na ya na-emekọ ihe ọnụ nwere ike imeri karịa nke ndị nọ na ya na-anaghị emekọ ihe ọnụ. Ọ bụrụ na ihe ị na-eche, otú obi na-adị gị na ihe na-agụ gị agụụ abụrụ ihe ndị gbasara ofufe Jehova, obi gị ga-adị ka ndị òtù egwuregwu ahụ mere nke ọma. Cheta na Setan chọrọ ime ka ị ghara iji obi gị niile na-efe Chineke. Ọ chọrọ ka ị ghara ịma ma ị̀ ga-eme ihe ị chọrọ ma ọ̀ bụkwanụ ihe Jehova chọrọ. Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ife Jehova, ị kwesịrị iji obi gị niile na-efe ya. (Mat. 22:​36-38) Ekwekwala ka Setan mee ka ị ghara iji obi gị niile na-efe Chineke. Na-ekpe ụdị ekpere ahụ Devid kpere. Ọ sịrị: “Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.” Kpebisie ike ịna-eme ihe ahụ ị na-ekpe n’ekpere ná ndụ gị. N’ụbọchị ọ bụla, kpebisie ike na ihe ọ bụla ị ga-eme, ma nnukwu ihe ma obere ihe, ga-egosi na ị na-atụ egwu aha Jehova. Ebe ị bụ Onyeàmà Jehova, i mee otú ahụ, ị na-eme ihe dabara n’aha ị na-aza. (Ilu 27:11) Anyị niile ga-enwekwa ike iso Maịka onye amụma kwuo, sị: “Anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi.”​—Maị. 4:5. w20.06 13 ¶17-18

Tuzdee, Mee 10

Ọ ga-ejikwa ọnụma gawa ka o kpochapụ ọtụtụ ndị ma laa ha n’iyi.​—Dan. 11:44.

Ọgụ a eze ugwu na mba ndị ọzọ ga-alụso ndị Chineke ga-akpasu Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ezigbo iwe, meekwa ka agha Amagedọn malite. (Mkpu. 16:​14, 16) N’oge ahụ ka a ga-ebibi eze ugwu na mba ndị ọzọ so na Gọg nke ala Megọg. O nweghịkwa onye “ga-enyere ya aka.” (Dan. 11:45) Daniel 12:1 kwuru otú a ga-esi bibie eze ugwu na mba ndị na-akwado ya nakwa otú a ga-esi zọpụta anyị. Gịnị ka ihe e kwuru n’amaokwu a pụtara? Maịkel bụ aha ọzọ nke Eze anyị na-achị ugbu a bụ́ Jizọs Kraịst. Jizọs “guzo ọtọ n’ihi” ndị Chineke kemgbe afọ 1914 e hiwere Alaeze Chineke n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, ọ “ga-ebili” ma laa ndị iro Chineke n’iyi n’agha Amagedọn. Agha ahụ ga-abụ ihe ikpeazụ ga-eme n’ihe ndị Daniel kpọrọ “oge ahụhụ” kachanụ e nwetụrụla.​—Mkpu. 6:2; 7:14. w20.05 15 ¶15-17

Wenezdee, Mee 11

A kpọọrọ Josef gbadata n’Ijipt.​—Jen. 39:1.

O nweghị ihe Josef ga-emeli maka ọnọdụ ya n’oge ahụ ọ na-agba ohu, nakwa n’oge ahụ ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ. Gịnị nyeere ya aka ịna-enwe obi ụtọ? Kama itinye uche ya n’ihe ndị ọ na-agaghịzi emeli, o ji ike ya niile na-arụ ọrụ e nyere ya. Josef weere Jehova ka Onye kacha ya mkpa ná ndụ. N’ihi ya, Jehova gọziri ihe niile Josef na-eme. (Jen. 39:​21-23) Akụkọ Josef na-akụziri anyị na ụwa a dị njọ, nakwa na ndị mmadụ nwere ike imegbu anyị. Nwanna anyị nwedịrị ike imejọ anyị. Ma, anyị were Jehova ka Oké Nkume anyị, ma ọ bụ ebe Mgbaba anyị, anyị agaghị ada mbà ma ọ bụ kwụsị ife ya. (Ọma 62:​6, 7; 1 Pita 5:10) Chetakwa na Josef dị ihe dị ka afọ iri na asaa mgbe Jehova mere ka ọ rọọ nrọ ndị ahụ pụrụ iche. Ihe a gosiri na Jehova tụkwasịdịrị ndị ohu ya na-eto eto obi. Taa, e nwere ọtụtụ ndị na-eto eto na-eme ka Josef. Ha nwekwara okwukwe na Jehova. A tụọla ụfọdụ n’ime ha mkpọrọ n’ihi na ha ekweghị akwụsị ife Chineke.​—Ọma 110:3. w20.12 16 ¶3; 17 ¶5, 7

Tọzdee, Mee 12

Ha kpọkwara ndịozi ahụ, pịa ha ihe, ma nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu n’aha Jizọs.​—Ọrụ 5:40.

Pita onyeozi na Jọn onyeozi nwere obi ụtọ na a kpagburu ha n’ihi na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ma na-akụziri ndị mmadụ gbasara ya. (Ọrụ 4:​18-21; 5:​27-29, 41, 42) E nweghị ihe mere ndịozi ahụ kwesịrị iji mewe ihere. N’agbanyeghị na ndị obodo ejighị Ndị Kraịst kpọrọ ihe n’oge ndịozi, Ndị Kraịst nyeere ndị mmadụ ezigbo aka karịa ndị ahụ na-akpagbu ha. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Baịbụl ụfọdụ n’ime Ndị Kraịst ndị ahụ dere nyeere ọtụtụ nde mmadụ aka ma mee ka ha nwee olileanya. Alaeze ahụ ha kwusara banyere ya na-achị n’eluigwe ugbu a, ọ ga-achịkwa ụwa niile n’oge na-adịghị anya. (Mat. 24:14) Ma, ọchịchị ndị Rom oge ochie ahụ kpagburu Ndị Kraịst adaala kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, ebe ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ahụ bụzi ndị eze n’eluigwe ugbu a. Ma ndị ahụ kpagburu ha anwụọla. Ọ bụrụ na ha emechaa soro ná ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ, ha ga-eso ná ndị Alaeze ahụ Ndị Kraịst ahụ ha kpọrọ asị kwusara ga-achị.​—Mkpu. 5:10. w20.07 15 ¶4

Fraịdee, Mee 13

[Ebreham] nọ na-echere obodo ahụ nke nwere ezi ntọala, bụ́ obodo nke ọ bụ Chineke bụ onye wuru ma mee ya.​—Hib. 11:10.

Otú Ebreham si nwee okwukwe ná nkwa ahụ Jehova kwere ya mere ka ọ dị ka ọ na-ahụ Onye E Tere Mmanụ ma ọ bụ Mesaya, onye ga-abụ Eze nke Alaeze Chineke. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị Juu, sị: “Ebreham nna unu ji ọṅụ dị ukwuu tụọ anya ịhụ ụbọchị m, ọ hụkwara ya wee ṅụrịa ọṅụ.” (Jọn 8:56) O doro anya na Ebreham ma na ụfọdụ n’ime ụmụ ya ga-eso chịa n’Alaeze Chineke. Ọ dịkwa njikere ichere Jehova ka o mezuo nkwa ahụ. Olee otú Ebreham si gosi na ọ dị njikere ichere obodo ahụ ma ọ bụ Alaeze Chineke? Nke mbụ bụ na Ebreham abụghị nwa amaala obodo ọ bụla. Ọ nọ na-akwaga obodo dị iche iche. O nweghị ebe o ji mere obodo ya, e nweghịkwa onye ọchịchị ọ bụla ọ kwadoro. Ihe ọzọkwa bụ na Ebreham ehiweghị ọchịchị nke ya. Kama nke ahụ, ọ nọ na-erubere Jehova isi, na-echekwa ka o mezuo nkwa ya. Ihe a gosiri na Ebreham nwere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ. w20.08 3 ¶4-5

Satọdee, Mee 14

A tọhapụwo onye nwụrụ anwụ ná mmehie ya.​—Rom 6:7.

Jehova kwere nkwa na e nweghị onye dị ndụ mgbe ahụ Kraịst ga na-achị ga-asị: “Ana m arịa ọrịa.” (Aịza. 33:24) N’ihi ya, ahụ́ ga-agbasi ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ike. Ma, ha agaghị ezu okè ozugbo. Ma ọ́ bụghị ya, ndị mabu ha agaghị amakwa ha. O yiri ka mmadụ niile hà ga-eji nwayọọ nwayọọ zuo okè n’ime otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị. Ọ bụ naanị ná ngwụcha puku afọ ahụ ka Jizọs ga-enyefe Nna ya Alaeze ahụ. Mgbe ahụ, Alaeze ahụ arụzuola ọrụ ya, ma ime ka mmadụ niile zuo okè. (1 Kọr. 15:​24-28; Mkpu. 20:​1-3) Chegodị otú obi ga-adị gị ịnabata onye gị nwụrụ anwụ. Obi ụtọ ọ̀ ga-eme ka ị chịwa ọchị ka ọ̀ bụ ka i bewe ákwá? Obi ụtọ ọ̀ ga-eme ka ị bụwa abụ iji too Jehova? Otu ihe doro anya bụ na obi ga-adị gị ezigbo ụtọ n’ebe Nna gị hụrụ gị n’anya na Ọkpara ya nọ n’ihi ime ka e nwee mbilite n’ọnwụ. w20.08 16-17 ¶9-10

Sọnde, Mee 15

Onye ọ bụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya, otu onye n’ụzọ a, onye ọzọ n’ụzọ ọzọ.​—1 Kọr. 7:7.

Pọl gbara Ndị Kraịst ume ka ha lee ma hà ga-ahapụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ka ha nwee ike ijere Jehova ozi. (1 Kọr. 7:​8, 9) O doro anya na Pọl eledaghị ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ họọrọ Timoti, bụ́ onye na-alụbeghị nwaanyị n’oge ahụ, ka ọ rụọ ọrụ ndị dị mkpa. (Fil. 2:​19-22) N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na otu nwanna ruru eru karịa ibe ya naanị n’ihi na ọ lụọla nwaanyị ma ọ bụ n’ihi na ọ lụbeghị. (1 Kọr. 7:​32-35, 38) Ma Jizọs ma Pọl akụzighị na Ndị Kraịst ga-alụrịrị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ha agaghị alụ. Olee ihe anyị nwere ike ikwu gbasara ịlụ di ma ọ bụ nwunye na alụghị di ma ọ bụ nwunye? Ụlọ Nche Ọktoba 1, 2012, kwuru, sị: “N’eziokwu, mmadụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ mmadụ ịhapụ ịlụ alụ bụcha onyinye si n’aka Chineke. . . . Jehova ewereghịkwanụ mmadụ ịhapụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ka ihe ihere ma ọ bụ ihe ga-eme ka mmadụ nwewe mwute.” N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-akwanyere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ùgwù n’ọgbakọ. w20.08 28 ¶8-9

Mọnde, Mee 16

Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ, . . . naanị Nna m maara.​—Mat. 24:36.

Ná mba ụfọdụ, ndị mmadụ na-eji obi ha niile anabata ozi ọma anyị na-ekwusa. Ọ bụ ihe ha na-achọ kemgbe. Ma ná mba ndị ọzọ, ndị mmadụ anaghị enwecha mmasị n’ihe banyere Chineke ma ọ bụ Baịbụl. Olee otú ọ dị n’ebe i bi? Nke ọ bụla ọ bụ, Jehova chọrọ ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma ruo mgbe ọ ga-asị na o zuola. Mgbe ọ bụla oge Jehova ruru, ọrụ ikwusa ozi ọma ga-akwụsị, “mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Mat. 24:14) Jizọs kwuru ihe ndị a ga-eji ama oge ikpeazụ a. O kwukwara na ihe ndị ahụ nwere ike ime ka uche ndị na-eso ụzọ ya pụọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma. N’ihi ya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-echenụ nche.” (Mat. 24:42) N’oge Noa, e nwere ihe ụfọdụ mere ka uche ndị mmadụ pụọ n’ihe Noa na-agwa ha. Taa, ụdị ihe ndị ahụ nwekwara ike ime ka uche anyị pụọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma. (Mat. 24:​37-39; 2 Pita 2:5) N’ihi ya, gbalịsie ike jiri ọrụ a Jehova nyere anyị kpọrọ ihe. w20.09 8 ¶1-2, 4

Tuzdee, Mee 17

A ga-akpagbukwa ndị niile na-achọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.​—2 Tim. 3:12.

Ekwensu “na-ewe oké iwe.” Anyị na-aghọkwa onwe anyị aghụghọ ma anyị chee na anyị ga-agbanahụ iwe ya. (Mkpu. 12:12) N’oge na-adịghị anya, a ga-ele okwukwe anyị ule. A ga-enwekwa “oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a.” (Mat. 24:21) N’oge ahụ, ndị ezinụlọ anyị nwere ike ịna-emegide anyị. E nwekwara ike ịmachi ọrụ anyị. (Mat. 10:​35, 36) Onye ọ bụla n’ime anyị ọ̀ ga-emeli ka Eze Esa ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka ma chebe anyị? (2 Ihe 14:11) Jehova na-akwadebe anyị taa ka okwukwe anyị sie ike maka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọ na-eduzi “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ka ọ na-enye anyị ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị’ ka anyị nwee ike ịnọsi ike n’ofufe ya. (Mat. 24:45) Ma, anyịnwa ga-emekwa òkè nke anyị iji mee ka okwukwe anyị sie ike.​—Hib. 10:​38, 39. w20.09 18 ¶16-18

Wenezdee, Mee 18

Obi onye eze dị ka iyi n’aka Jehova. Ebe ọ bụla ọ chọrọ, ya echee ya ihu.” ​—Ilu 21:1.

Ọ bụrụ na ọ bụ uche Jehova, o nwere ike iji ike mmụọ nsọ ya mee ka ndị nọ n’ọchịchị mee ihe ọ chọrọ. Ndị mmadụ nwere ike igwu ọwa mmiri iji chee mmiri ihu ebe ha chọrọ. Otú ahụkwa ka Jehova nwere ike iji mmụọ ya gbanwee echiche ndị ọchịchị ka ha nwee ike ime ihe bụ́ nzube ya. Jehova mee ụdị ihe a, ọ na-eme ka ndị ọchịchị mee mkpebi ga-abara ndị ya uru. (Tụlee Ezra 7:​21, 25, 26.) Gịnị ka anyị nwere ike ime? Anyị nwere ike ikpe ekpere “maka ndị eze na ndị niile nọ n’ọkwá dị elu” mgbe ha chọrọ ime mkpebi ga-emetụta ọmụmụ ihe anyị ma ọ bụ ozi anyị. (1 Tim. 2:​1, 2; Nehe. 1:11) Anyị na-ekpesi ekpere ike maka ụmụnna anyị ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere.​—Ọrụ 12:5; Hib. 13:3. w20.11 15 ¶13-14

Tọzdee, Mee 19

Mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim.​—Mat. 28:19.

Ọ bụrụ na ọ bụ gịnwa mụụrụ mmadụ ihe, obi na-atọgbu gị atọgbu ịhụ ka ọ na-eme baptizim. (1 Tesa. 2:​19, 20) Otú o si na-eme nke ọma ma mechaa mee baptizim gosiri na gị na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ unu gbara ezigbo mbọ nyere ya aka. (2 Kọr. 3:​1-3) Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịmata na kemgbe afọ anọ, a na-eduziri ihe dị ka nde mmadụ iri ọmụmụ Baịbụl kwa ọnwa n’ụwa niile. N’oge ndị ahụkwa, e mere ihe karịrị narị puku mmadụ abụọ na puku iri asatọ baptizim kwa afọ, ha aghọọ Ndịàmà Jehova nakwa ndị ọhụrụ na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. Olee otú anyị ga-esi enyere ọtụtụ n’ime ndị ahụ a na-amụrụ Baịbụl aka ime baptizim? N’oge a Jehova ka na-enye ndị mmadụ ohere ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ha aka ime baptizim ozugbo. Oge adịghịzi.​—1 Kọr. 7:29a; 1 Pita 4:7. w20.10 6 ¶1-2

Fraịdee, Mee 20

Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.​—Jems 4:6.

Eze Sọl emeghị ihe Jehova gwara ya mee. Mgbe Samuel onye amụma gwakwara ya banyere ihe ahụ o mejọrọ, o kwetaghị na o mejọrọ ihe. Kama nke ahụ, ọ gbalịrị ịgọrọ isi onwe ya, na-ekwu na ihe o mere adịghị njọ nke otú ahụ nakwa na ọ bụ ndị ọzọ kpatara ya. (1 Sam. 15:​13-24) E nweekwala oge mbụ Sọl kpara ụdị àgwà a. (1 Sam. 13:​10-14) Ọ dị mwute na Sọl bịara dị mpako. Ọ gbanweghị otú o si eche echiche. N’ihi ya, Jehova dọrọ ya aka ná ntị ma jụ ya. Ọ bụrụ na anyị achọghị ịdị ka Sọl, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị a: ‘Ọ bụrụ na mụ agụta ihe m kwesịrị ime n’Okwu Chineke, m̀ na-achọ ihe m ga-ekonye aka ghara ime ya? M̀ na-eche na ihe m na-eme adịchaghị njọ? M̀ na-ata ndị ọzọ ụta maka ihe mụnwa mejọrọ?’ Ọ bụrụ na e nwere ajụjụ nke anyị zara ee na ya, ọ pụtara na anyị kwesịrị ịgbanwe otú anyị si eche echiche na otú anyị si akpa àgwà. Ma anyị emeghị ya, mpako nwere ike iri anyị isi, nke nwere ike ime ka Jehova jụ anyị, anyị agaghịzi abụ ndị enyi ya. w20.11 20 ¶4-5

Satọdee, Mee 21

Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa, tupu oge ọdachi erute, ma ọ bụ tupu afọ ndị ahụ erute, mgbe ị ga-asị: “Ha adịghị atọ m ụtọ.”​—Ekli. 12:1.

Ị bụrụ onye eto, kpebie onye ị ga-efe. I kwesịrị ịchọpụta n’onwe gị onye Jehova bụ, ihe bụ́ nzube ya, na otú ị ga-esi na-akwado nzube ya. (Rom 12:2) Ọ bụ mgbe ahụ ka ị ga-enwe ike ime mkpebi kacha mkpa ná ndụ gị, ya bụ, ife Jehova. (Josh. 24:15) Ọ bụrụ na ị na-agụ Baịbụl ma na-amụchi ya anya, ọ ga-eme ka ị hụkwuo Jehova n’anya, okwukwe gị esikwuokwa ike. Mee ka ime uche Jehova bụrụ ihe mbụ ná ndụ gị. Ụwa Setan na-ekwu na ọ bụrụ na i jiri nkà ndị i nwere mee ihe ga-abara onwe gị uru, ị ga-enwe obi ụtọ. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-agbalịsi ike ka ha nweta akụnụba na-eji “ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.” (1 Tim. 6:​9, 10) Ma ọ bụrụ na i gee Jehova ntị ma mee ka ime uche ya bụrụ ihe mbụ ná ndụ gị, ihe ga-agaziri gị, ‘ị ga-ejikwa amamihe mee ihe.’​—Josh. 1:8. w20.10 30 ¶17-18

Sọnde, Mee 22

Aghaghịkwa m izisa . . . ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.​—Luk 4:43.

N’oge Ndị Kraịst oge mbụ, ozi ọma Jizọs ziri mere ka ndị mmadụ nwee olileanya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha rụrụ ọrụ ahụ ọ malitere gawa, ya bụ, ka ha gbaa àmà banyere ya ruo “n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) N’eziokwu, ha enweghị ike ịrụ ọrụ a n’ike aka ha. Mmụọ nsọ, ya bụ, “ihe inyeaka ahụ” Jizọs kwuru okwu ya, dị ha mkpa. (Jọn 14:26; Zek. 4:6) Ndị na-eso ụzọ Jizọs nwetara mmụọ nsọ na Pentikọst afọ 33. Mmụọ nsọ nyeere ha aka, ha amalite ikwusa ozi ọma ozugbo. N’oge na-adịghịkwa anya, ọtụtụ puku nabatara ozi ọma ha. (Ọrụ 2:41; 4:4) Mgbe a malitere ịkpagbu ha, ha atụghị ụjọ, kama, ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka. Ha rịọrọ ya, sị: ‘Nye ndị ohu gị ike ka anyị nọgide na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla.’ Ha jupụtara ná mmụọ nsọ ma nọgide na-ekwu “okwu Chineke n’atụghị egwu.”​—Ọrụ 4:​18-20, 29, 31. w20.10 21 ¶4-5

Mọnde, Mee 23

Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo; . . . a [kpọlitekwa] ya.​—1 Kọr. 15:​3, 4.

Gịnị mere obi ji sie anyị ike na Jehova kpọlitere Jizọs n’ọnwụ? E nwere ọtụtụ ndị ji anya ha hụ na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. (1 Kọr. 15:​5-7) Onye mbụ n’ime ha Pọl onyeozi kpọrọ aha bụ Pita onyeozi, ya bụ, Sifas. E nwekwara ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ gbara akaebe na Pita hụrụ na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. (Luk 24:​33, 34) “Mmadụ iri na abụọ ahụ,” ya bụ, ndịozi Jizọs, hụkwara Jizọs mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ. Jizọs Kraịst ‘pụtakwara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise n’otu mgbe.’ Ọ ga-abụ na mgbe Jizọs pụtara n’ihu ha bụ ná nnọkọ ahụ mere ha obi ụtọ ha nwere na Galili e kwuru okwu ya na Matiu 28:​16-20. Jizọs ‘pụtakwara n’ihu Jems.’ Jems a nwere ike ịbụ onye nne ji ya na ya, bụ́ onye na-ekwebughị na Jizọs bụ Mesaya. (Jọn 7:5) Mgbe Jems hụrụ Jizọs mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, o kwetaziri na Jizọs bụ Mesaya ahụ. Ọ dị mma ịmara na n’ihe dị ka n’afọ 55 mgbe Pọl dere akwụkwọ ozi a, ọtụtụ ndị ji anya ha hụ na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ka nọ ndụ. N’ihi ya, onye ọ bụla ọ na-eme obi abụọ nwere ike ịga jụọ ha. w20.12 3 ¶5, 7-8

Tuzdee, Mee 24

Jehova ga-enye ya ume mgbe ọ nọ n’ute ọrịa.​—Ọma 41:3.

Mgbe anyị na-arịa ọrịa, karịchaa, ọrịa na-ekweghị ala ala, o nwere ike isiri anyị ike iche echiche nke ọma. N’ihi ya, na-arịọ Jehova maka enyemaka ya. Ọ bụ eziokwu na ọ naghị esi n’ụzọ ọrụ ebube agwọ anyị ugbu a, ma ọ na-akasi anyị obi. O nwekwara ike inye anyị ike anyị ga-eji na-edi ya. (Ọma 94:19) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka otu nwanna bịa nyere anyị aka ma anyị chọọ onye ga-arụrụ anyị ọrụ dị n’ụlọ. O nwekwara ike ime ka ụmụnna anyị soro anyị kpee ekpere. Ihe ọzọ bụ na o nwere ike ime ka anyị cheta ihe anyị mụrụ na Baịbụl ga-akasi anyị obi, dị ka, olileanya izu okè n’ụwa ọhụrụ mgbe ọrịa na-agaghịzi adị. (Rom 15:4) Ma, anyị nwere ike ịna-eche na anyị anaghị ekwusacha ozi ọma otú anyị chọrọ. E tinyere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Laurel n’ígwè na-enyere ya aka iku ume ruo afọ iri atọ na asaa. O nwere ọrịa kansa. A waakwala ya ahụ́ ọtụtụ ugboro. O nwekwara ọrịa ọjọọ na-arịa ya n’akpụkpọ ahụ́ ya. Ma, o meghị ka ọ ghara ịna-ezi ozi ọma. Ọ na-ezi ndị nọọsụ na ndị ọzọ na-abịa eleta ya n’ụlọ ya ozi ọma. O si otú a nyere, ọ dịkarịa ala, mmadụ iri na asaa aka ha abịa fewe Jehova. w20.12 24 ¶9; 25 ¶12

Wenezdee, Mee 25

Jehova nọnyeere m; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?​—Ọma 118:6.

Enyemaka dị Pọl onyeozi mkpa. N’ihe dị ka n’afọ 56, ìgwè mmadụ si n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem kpụpụta Pọl onyeozi n’èzí ka ha gbuo ya. N’echi ya, mgbe a kpọpụtara Pọl na Sanhedrin, ọ fọrọ obere ka ndị iro ya dọrie ya. (Ọrụ 21:​30-32; 22:30; 23:​6-10) N’oge ahụ, ọ ga-abụ na Pọl chere sị, ‘Ruo ole mgbe ka m ga na-edi mmegbu ndị a?’ Olee otú e si nyere Pọl aka? N’abalị ụbọchị e jidere Pọl, Onyenwe anyị Jizọs guzoro n’akụkụ ya, sị: “Nwee obi ike! N’ihi na dị ka ị nọworo na-agba àmà nke ọma n’ihe banyere m na Jeruselem, otú ahụkwa ka ị na-aghaghị ịgba àmà na Rom.” (Ọrụ 23:11) Agbamume a bịara nnọọ n’oge ya. Jizọs jara Pọl mma maka otú o si gbaa àmà na Jeruselem. O kwere Pọl nkwa na ọ ga-eru Rom n’enweghị nsogbu ọ bụla, nakwa na ọ ga-agbakwuru ya àmà n’ebe ahụ. Mgbe Pọl nụchara ihe a Jizọs kwuru, ọ ga-abụ na ọ dị ya otú ahụ ọ na-adị nwatakịrị nna ya ku n’aka ya. w20.11 12 ¶1, 3; 13 ¶4

Tọzdee, Mee 26

Anyị nwere olileanya a . . . Ọ bụ nke e ji n’aka, nke guzosikwara ike.​—Hib. 6:19.

Olileanya anyị dị ka “arịlịka maka mkpụrụ obi.” Ọ na-eme ka obi ruo anyị ala mgbe nsogbu bịaara anyị ma ọ bụ mgbe anyị na-echegbu onwe anyị. Chee gbasara nkwa Jehova kwere na n’ọdịnihu, ihe ọ bụla na-echegbu anyị ga-ala ka naị. (Aịza. 65:17) Na-eche gbasara otú ọ ga-adị ma ị nọrọ n’ụwa ọhụrụ ebe nsogbu na-adịghịzi. (Maị. 4:4) Ọ bụrụ na ị na-akọrọ ndị ọzọ gbasara olileanya gị, ọ ga-eme ka obi sie gị ike na ọ ga-emezu. Gbalịa mee ike gị niile n’ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ị na-eme otú ahụ, ị ga-enwe “obi ike zuru ezu n’olileanya ahụ ruo ọgwụgwụ.” (Hib. 6:11) Ka ụwa ochie a na-agba egwú ụla ya, ọtụtụ nsogbu ndị nwere ike ime ka anyị chegbuwe onwe anyị ga-abịara anyị. Anyị ga-enwe ike idi nsogbu ndị ahụ ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka ịnọrọ jụụ, ọ bụghị ịtụkwasị onwe anyị obi. Ka ihe niile anyị ga-eme gosi na anyị nwere okwukwe ná nkwa Jehova kwere anyị nke bụ́: “Unu ga-adị ike naanị site n’ịnọrọ jụụ na ịtụkwasị m obi.”​—Aịza. 30:15. w21.01 7 ¶17-18

Fraịdee, Mee 27

Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu.​—Jems 5:11.

Ị̀ hụrụ na Jems 5:11 kwuru na Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu, kwuokwa na ọ na-eme ebere? (Ọpụ. 34:6) Otu ụzọ Jehova si emere anyị ebere bụ ịgbaghara anyị mmehie anyị. (Ọma 51:1) Na Baịbụl, ime ebere abụghị naanị ịgbaghara mmadụ ihe o mejọrọ. Ebere bụ otú ọ na-adị anyị n’obi ma anyị hụ onye nọ n’ahụhụ. Ọ na-eme ka anyị chọọ inyere onye ahụ aka. Jehova kwuru na otú ọ na-adị ya n’obi inyere anyị aka karịrị nke nne na-elekọta nwa ya. (Aịza. 49:15) Anyị nọrọ n’ahụhụ, obi ebere Jehova na-eme ka o nyere anyị aka. (Ọma 37:39; 1 Kọr. 10:13) Otu ụzọ anyị si emere ụmụnna anyị ebere bụ ịghara iburu ha iwe n’obi ma ha mee anyị ihe ọjọọ. (Efe. 4:32) Ma, ụzọ bụ́ isi anyị si emere ụmụnna anyị ebere bụ inyere ha aka ma nsogbu bịara ha. Anyị si otú ahụ na-eme ka Jehova, bụ́ onye kacha enwe ọmịiko.​—Efe. 5:1. w21.01 21 ¶5

Satọdee, Mee 28

Kraịst . . . [hapụụrụ] unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.​—1 Pita 2:21.

Onyeisi ezinụlọ ekwesịghị iji oge buru ibu na-akpa afọ ezinụlọ ya nke ga-eme ka ọ ghara inwe ohere ọ ga-eji na-enyere ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma, na-emekwa ka obi dị ha mma ma na-azụ ha. Jehova na-azụ anyị ma na-agbazi anyị n’ihi na ọ chọrọ inyere anyị aka. (Hib. 12:​7-9) Jizọs mekwara ka Nna ya, jiri ịhụnanya zụọ ndị nọ n’okpuru ya. (Jọn 15:​14, 15) Ọ na-abara onye mejọrọ ihe mba, dịrịkwa obiọma. (Mat. 20:​24-28) Ọ ma na anyị ezughị okè nakwa na anyị na-emejọ ihe ọtụtụ ugboro. (Mat. 26:41) Onyeisi ezinụlọ chọrọ ime ka Jehova na Jizọs ga-echeta na ndị ezinụlọ ya ezughị okè. Ọ naghị eweso nwunye ya ma ọ bụ ụmụ ya “oké iwe.” (Kọl. 3:19) Kama, ọ na-eme ihe e kwuru ná Ndị Galeshia 6:1 ma gbalịa iji “mmụọ dị nwayọọ” gbazie ha, na-echeta na yanwa ezukwaghị okè. Dịkwa ka Jizọs, ọ na-echeta na ụzọ kacha mma ọ ga-esi akụziri ndị ezinụlọ ya ihe bụ ịna-eme ihe ọ chọrọ ka ha na-eme. w21.02 6-7 ¶16-18

Sọnde, Mee 29

Ihe niile na-eku ume, ka ha too Jaa.​—Ọma 150:6.

Jehova ji ihe mgbapụta ahụ zụta ndụ nke ndị niile nọ n’ọgbakọ nakwa ndụ ụmụ mmadụ niile nwere okwukwe na Jizọs. (Mak 10:45; Ọrụ 20:28; 1 Kọr. 15:​21, 22) N’ihi ya, ọ dabara adaba na ọ họpụtara Jizọs, bụ́ onye nyere ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta, ka ọ bụrụ isi nke ọgbakọ ya. Ebe Jizọs bụ onyeisi anyị, o nwere ikike inye iwu onye ọ bụla n’ime anyị, ezinụlọ ọ bụla, nakwa ọgbakọ niile ga-edebe. O nwekwara ikike ịhụ na e debere iwu ahụ. (Gal. 6:2) Ihe Jizọs na-eme abụghị naanị inye anyị iwu. Ọ hụrụ anyị n’anya, na-elekọtakwa anyị nke ọma. (Efe. 5:29) Ụmụnna nwaanyị na-erubere ndị Jizọs họpụtara ilekọta ha isi iji gosi na ha na-akwanyere Jizọs ùgwù. Ụmụnna nwoke na-akwanyekwara ụmụnna nwaanyị ùgwù iji gosi na ha ji ndokwa Jehova mere ka e nwee ndị isi kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na mmadụ niile nọ n’ọgbakọ aghọta ihe mere Jehova ji hazie ka e nwee ndị isi ma na-erubere ndị isi isi, ọgbakọ niile ga-adị n’udo. Nke kachanụ bụ na ọ ga-eme ka e too Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya bụ́ Jehova. w21.02 18-19 ¶14-17

Mọnde, Mee 30

Devid wee malite ịjụ Jehova ase.​—1 Sam. 30:8.

Mgbe Devid na ụmụ nwoke ndị ya na ha so nọ n’ebe ha gbagara ọsọ ndụ, ha hapụrụ ndị ezinụlọ ha gaa agha. Mgbe ha pụrụ, ndị iro bịara bukọrọ ihe niile ha nwere n’ụlọ, kpọrọkwa ndị ezinụlọ ha. Devid nwere ike iche na otú a ọ bụ dike n’agha, ọ ga-ama ihe ọ ga-eme iji napụta ndị ezinụlọ ha a kpọọrọ. Kama ime otú ahụ, ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ịma ihe ọ ga-eme. Ọ jụrụ Jehova, sị: “Ọ̀ bụ m chụwa ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga nke a?” Jehova gwara Devid ka ọ chụwa ha, meekwa ka obi sie ya ike na ọ ga-emeri ha. (1 Sam. 30:​7-10) Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’akụkọ a? Gakwuru ndị ọzọ ka ha nye gị ndụmọdụ tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme. Ndị na-eto eto, unu na nne na nna unu kwurịta ya. I nwekwara ike ịgakwuru ndị okenye maara nke a na-akọ ka ha nye gị ndụmọdụ. Jehova tụkwasịrị ndị okenye ndị a obi. Gịnwa nwekwara ike ịtụkwasị ha obi. Jehova na-ele ha anya ka “onyinye” n’ọgbakọ. (Efe. 4:8) Ị ga na-eme mkpebi ndị dị mma ma ọ bụrụ na ị na-eṅomi okwukwe ha, na-egekwa ntị n’aro ndị ha na-atụrụ gị. w21.03 4-5 ¶10-11

Tuzdee, Mee 31

[E nweghị ihe ga-enwe] ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke.​—Rom 8:​38, 39.

Jizọs kwuru na ọ bụrụ na anyị anaghị eme ihe anyị mụtara, anyị dị ka nwoke na-arụ ụlọ n’elu ájá. Ọ na-arụsi ọrụ ike, ma mbọ ya niile ga-akụ afọ n’ala. N’ihi gịnị? N’ihi na oké ifufe na idei mmiri bịa, ụlọ ahụ ga-ada. (Mat. 7:​24-27) Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ọ bụrụ na anyị anaghị eme ihe ndị anyị mụtara, mbọ anyị niile ga-akụ afọ n’ala. Ọ ga-emekwa ka o siere anyị ike idi ọnwụnwa ma ọ bụ mkpagbu. Ma, ọ bụrụ na anyị na-amụ Baịbụl, na-emekwa ihe ndị anyị mụtara, anyị ga na-eme mkpebi ndị dị mma, obi ana-eru anyị ala, okwukwe anyị ana-esikwa ike. (Aịza. 48:​17, 18) Iji nwee ike ịna-erubere Jehova isi n’oge nsogbu, anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere, na-amụchikwa Baịbụl anya. Anyị kwesịkwara icheta na ihe kacha mkpa bụ ịna-eme ka e too Jehova. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova agaghị agbahapụ anyị. O nweghịkwanụ ihe onye ọ bụla nwere ike ime iji mee ka ọ kwụsị ịhụ anyị n’anya.​—Hib. 13:​5, 6. w21.03 15 ¶6; 18 ¶20

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya