Julaị
Fraịdee, Julaị 1
E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.—Mat. 28:18.
Anyị na Jizọs ga-adịrịrị ná mma ma anyị chọọ ka a na-aza ekpere anyị. Ihe ọ pụtara bụ na ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịsị “n’aha Jizọs” ma anyị kpechaa ekpere. Anyị ga-aghọta otú Jehova si eji Jizọs aza ekpere anyị. Jizọs sịrị ndịozi ya: “Ihe ọ bụla unu rịọkwara n’aha m, m ga-eme ya.” (Jọn 14:13) N’agbanyeghị na ọ bụ Jehova na-anụ ekpere anyị ma na-aza ya, ọ bụ Jizọs ka o nyere ikike ime ihe ọ bụla yanwa bụ́ Jehova kpebiri. N’ihi ya, tupu Chineke aza ekpere anyị, ọ na-ebu ụzọ achọpụta ma ànyị na-eme ihe Jizọs kwuru. Dị ka ihe atụ, Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu nke eluigwe ga na-agbagharakwa unu; ma ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu njehie unu.” (Mat. 6:14, 15) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-emeso ndị ọzọ otú Jehova na Jizọs si emeso anyị. w20.04 22 ¶6
Satọdee, Julaị 2
Anyị na-ezisara unu ozi ọma, ka unu wee hapụ ihe efu ndị a ma bịakwute Chineke ahụ dị ndụ.—Ọrụ 14:15.
Pọl onyeozi chọpụtara ihe ndị na-amasị ndị ọ na-ezi ozi ọma ma jiri ha zie ha ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ndị ọ na-agwa okwu na Listra amaghị ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, Pọl ji ihe ha ga-aghọta nke ọma gwa ha okwu. Ọ gwara ha gbasara oge mkpụrụ ji amị na ihe ga-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. Ọ gwara ha okwu ndị ha ga-aghọta, meekwara ha ihe atụ ndị ga-edo ha anya. Gbalịa chọpụta ihe ndị na-amasị ndị unu na-ezi ozi ọma ma jiri ha zie ha ozi ọma. Olee otú i nwere ike isi chọpụta ihe na-amasị mmadụ ma i rutewe ya ma ọ bụ ụlọ ya nso? Na-eleru anya ala. O nwere ike ịbụ na ọ na-asụchasị ahịhịa ma ọ bụ na-agụ akwụkwọ, na-emezi ụgbọala ma ọ bụkwanụ na-eme ihe ndị ọzọ. I nwere ike iji ihe ahụ ọ na-eme malite izi ya ozi ọma. (Jọn 4:7) Uwe mmadụ yi nwedịrị ike ịgwa gị ụdị onye ọ bụ. O nwere ike ime ka ị mata obodo ya, ọrụ ya, ma ọ bụ òtù egwuregwu na-amasị ya. w20.04 11 ¶11-12
Sọnde, Julaị 3
Na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.—1 Pita 5:7.
Ahụ́ anaghị eru ụfọdụ ụmụnna ala ma ha na ndị ọzọ nọrọ n’ihi na ha na oké nchegbu na-alụ. O nwere ike isiri ha ike ịnọ n’ebe ìgwè mmadụ nọ, ma ha ka na-agbalị abịa ọmụmụ ihe na mgbakọ. Ọ na-esiri ha ike ịgwa onye ha na-amaghị okwu, ma ha na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, obi sie gị ike na ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. E nwekwara ọtụtụ ndị ọ dị otú ọ dị gị. Cheta na obi dị Jehova ụtọ maka ozi i ji obi gị niile na-ejere ya. Ebe ọ bụ na ị kwụsịbeghị ife Jehova, o gosiri na Jehova na-agọzi gị, na-enyekwa gị ike. (Fil. 4:6, 7) Ọ bụrụ na ị na-efe Jehova n’agbanyeghị ọrịa ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ, ka obi sie gị ike na ihe ị na-eme dị Jehova mma. N’agbanyeghị na ahụ́ esighị ọtụtụ n’ime anyị ike, anyị na-atachi obi n’ọsọ nke ndụ ahụ. (2 Kọr. 4:16) Jehova ga-enyere anyị niile aka ịgbaru ọsọ ahụ n’isi. w20.04 31 ¶20-21
Mọnde, Julaị 4
Àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma . . . n’ihe ndị e kere eke.—Rom 1:20.
Otú Chineke si kee ụwa anyị a gosiri na o nwere amamihe. (Hib. 3:4) Ụwa pụrụ iche n’ihi na ọ bụ naanị ya ka e kere ka mmadụ nwee ike ibi na ya. E nwere ike iji ụwa anyị a tụnyere ụgbọ mmiri nọ n’oké osimiri. Ma, o nwere ihe dị iche n’ụgbọ mmiri mmadụ juru na ụwa anyị a. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ bụ ndị nọ n’ụgbọ mmiri ga-eji aka ha emepụta ikuku ha ga-ekuru, nri ha ga-eri na mmiri ha ga-aṅụ, ya abụrụkwa na e nweghị ebe ha ga-ekpofu ihe ndị ha na-achọghị, olee mgbe ha ga-anọru ndụ? Ọ gaghị ete aka ha anwụọ. Ma ụwa dị iche. E nwere ọtụtụ ijeri ụmụ mmadụ na anụmanụ bi na ya. Ọ bụ ụwa na-emepụta ikuku niile ha na-ekuru, nri ha na-eri na mmiri ha na-aṅụ. Ihe ndị a anaghịkwa akọ anyị. N’agbanyeghị na e nweghị ebe ọzọ ihe ndị anyị na-achọghị na-aga, ụwa anyị a ka mara mma, dịkwa mma obibi. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Jehova kere ụwa a otú ọ ga na-agbanwe ihe ndị anyị na-achọghị, mee ka ha baara anyị uru. w20.05 20 ¶3-4
Tuzdee, Julaị 5
Unu agaghị anwụ ma ọlị.—Jen. 3:4.
Setan gwara Iv na Jehova na-aghara ha ụgha, si otú ahụ kwutọọ aha Jehova. O sizi otú ahụ ghọọ Ekwensu ma ọ bụ onye nkwutọ. A ghọgburu Iv kpamkpam, ya ekweta ihe Setan kwuru. (1 Tim. 2:14) Ọ tụkwasịrị Ekwensu obi karịa Jehova. Ọ bụ ya mere o ji mee mkpebi kacha njọ mmadụ nwere ike ime. O kpebiri inupụrụ Jehova isi. O riri mkpụrụ osisi ahụ Jehova sị ha erila. Mgbe e mechara, o nyere Adam ụfọdụ mkpụrụ osisi ahụ. (Jen. 3:6) Chegodị ihe Iv gaara agwa Setan. Weregodị ya na ọ gwara ya ihe dị ka: “Amaghị m onye ị bụ. Ma ama m Nna m bụ́ Jehova. M hụrụ ya n’anya, tụkwasịkwa ya obi. O nyere mụ na di m ihe niile anyị nwere. Gịnị mere ị ga-eji kwuo ụdị ihe ọjọọ a gbasara ya? Si ebe a pụọ.” Obi gaara adị Jehova ezigbo ụtọ ma a sị na Iv gwara Setan ụdị ihe a. (Ilu 27:11) Ma, Iv ahụghị Jehova n’anya. Otú ahụ ka ọ dịkwa Adam. Ọ bụ ya mere na ha agbachitereghị ya mgbe a na-ekwutọ ya. w20.06 4 ¶10-11
Wenezdee, Julaị 6
Ndị inyom na-ezisa ozi ọma bụ ìgwè dị ukwuu.—Ọma 68:11.
Anyị kwesịrị ịna-aja ụmụnna nwaanyị mma maka ọrụ ha na-arụ n’ofufe Jehova. Ụfọdụ ọrụ ha na-arụ bụ ịrụ na ịrụzi ụlọ ndị nzukọ Jehova nwere, iso ndị ji asụsụ ọzọ ekwusa ozi ọma na inye aka n’ọrụ Betel. Ha na-eso agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka, na-asụgharị akwụkwọ anyị, na-asụ ụzọ ma na-eje ozi ala ọzọ. Ihe ọzọkwa bụ na ụmụnna nwaanyị na-akwado ndị di ha ná nnukwu ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ nakwa ná nzukọ Jehova. Ọ gakwaara esiri ụmụnna ndị a ike ịrụ ọrụ ha nke ọma dị ka ndị bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” ma a sị na ndị nwunye ha anaghị akwado ha. (Efe. 4:8) O doro ndị okenye maara ihe anya na ụmụnna nwaanyị bụ “ìgwè dị ukwuu” dị njikere ịrụ ọrụ, nakwa na ha so ná ndị kacha agba mbọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma. Ndị okenye makwa na ụmụnna nwaanyị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ na-eme nke ọma ma a bịa n’inyere ụmụ agbọghọ aka imeri nsogbu ndị na-abịara ha. (Taị. 2:3-5) N’eziokwu, anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị ndị nwaanyị n’anya ma na-aja ha mma. w20.09 23-24 ¶13-14
Tọzdee, Julaị 7
Ọ dịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.—Mat. 18:14.
Jehova anaghị echefu onye ọ bụla fere ya ma mechaa kwụsịtụ ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Ọ naghịkwa echefu ozi ha jeere ya. (Hib. 6:10) Aịzaya onye amụma mere ihe atụ mara ezigbo mma iji gosi otú Jehova si elekọta ndị ya. Ọ sịrị: “Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ ya dị ka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ ga-eji ogwe aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya; ọ ga-ekuru ha n’obi ya.” (Aịza. 40:11) Olee otú obi na-adị Jehova, bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ, ma otu atụrụ ya kpafuo? Ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya mere ka anyị ghọta otú obi na-adị Jehova. Ọ sịrị ha: “Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na otu nwoke nwere otu narị atụrụ ma otu n’ime ha akpafuo, ọ́ gaghị ahapụ iri itoolu na itoolu ahụ n’elu ugwu wee gaa chọwa nke ahụ kpafuru akpafu? Ọ bụrụ na ọ chọta ya, n’ezie, ana m asị unu, ọ ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ya karịa otú ọ na-aṅụrị n’ihi iri itoolu na itoolu ahụ na-akpafughị akpafu.”—Mat. 18:12, 13. w20.06 19-20 ¶8-9
Fraịdee, Julaị 8
Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta, agụụ ezi ọrụ na-agụ ya.—1 Tim. 3:1.
Obi dị anyị ụtọ na anyị na-efe Jehova otú anyị nwere ike. (Ọma 27:4; 84:10) Ọ bụrụ na nwanna nwoke achọọ ijekwuru Jehova ozi, ọ dị mma. Ma, ọ bụrụ na e nye ya ọrụ, o kwesịghị iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị. (Luk 17:7-10) Ihe kwesịrị ịbụ mkpa ya bụ iji umeala n’obi jeere ndị ọzọ ozi. (2 Kọr. 12:15) Baịbụl kọrọ gbasara ụfọdụ ndị chere gbasara onwe ha karịa ka ha kwesịrị. Dayọtrefis adịghị umeala n’obi. Nke a mere ka ọ chọọ “ịnọ n’ọkwá mbụ” n’ọgbakọ. (3 Jọn 9) Mpako mere ka Ọzaya chọọ ịrụ ọrụ Jehova na-enyeghị ya. (2 Ihe 26:16-21) Absalọm chọrọ ịbụ eze. N’ihi ya, o mere ka ndị mmadụ chee na ọ hụrụ ha n’anya ka ha nwee ike ịkwado ya. (2 Sam. 15:2-6) Akụkọ Baịbụl ndị a mere ka anyị ghọta na ihe ndị na-achọrọ onwe ha otuto anaghị amasị Jehova. (Ilu 25:27) Ka oge na-aga, ndị dị mpako na ndị na-achọ ka e too ha ga-enwe nsogbu.—Ilu 16:18. w20.07 4 ¶7-8
Satọdee, Julaị 9
Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.—Gal. 6:5.
Ụfọdụ ezinụlọ bụ́ Ndị Kraịst esila ná mba ha kwaga mba ọzọ n’ihi ihe isi ike. Ọ ga-emezi ka ọ bụrụ asụsụ a kacha asụ ná mba ahụ ha kwagara ka a ga-eji na-akụziri ụmụ ha ihe n’ụlọ akwụkwọ. O nwekwara ike ịdị mkpa ka nne na nna ha mụọ asụsụ ọhụrụ ahụ iji nwee ike nweta ọrụ. Ọ bụrụkwanụ na e nwere ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè na-eji asụsụ ha amụ ihe? Olee ọgbakọ nke ezinụlọ ahụ kwesịrị iso na-amụ ihe? Ọ̀ bụ ọgbakọ na-eji asụsụ a kacha asụ ná mba ahụ ha kwagara amụ ihe, ka ọ̀ bụ nke na-eji asụsụ ha amụ ihe? Onyeisi ezinụlọ kwesịrị ikpebi ọgbakọ nke ezinụlọ ya ga-eso na-amụ ihe. Ebe ihe a bụ ihe mmadụ ga-ekpebiri onwe ya, onyeisi ezinụlọ ahụ ga-echebara ihe ga-akacha baara ezinụlọ ya uru echiche. Anyị ekwesịghị ịkatọ ihe ọ bụla onyeisi ezinụlọ kpebiri gbasara ihe a. Ihe ọ bụla o kpebiri, ka anyị nabata ha n’ọgbakọ anyị ma jiri ha kpọrọ ihe.—Rom 15:7. w20.08 30 ¶17-18
Sọnde, Julaị 10
Chineke họkwaara ihe ndị na-adịghị ike nke ụwa.—1 Kọr. 1:27.
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nye anyị ike, anyị ekwesịghị ịna-eche na ọ bụ ike ọkpụkpụ aka anyị, otú anyị gụruru n’akwụkwọ, omenala anyị, ma ọ bụ ihe ndị anyị nwere ga-ekpebi ma ànyị bara uru. Ọ bụghị ihe ndị a na-eme ka anyị baa uru n’anya Jehova. N’eziokwu, ọ bụghị ọtụtụ ndị ohu Chineke ‘maara ihe n’ụzọ anụ ahụ́, dịrị ike, ma ọ bụ si n’ezinụlọ eze.’ (1 Kọr. 1:26) N’ihi ya, anyị ekwesịghị iwere ihe ndị anyị na-enweghị ka ihe ndị nwere ike igbochi anyị ife Jehova. Kama, were ya ka ohere i nwere iji hụ na Jehova na-enye gị ike ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nwere ndị na-eme ka obi ghara isi gị ike n’ihe ndị i kweere, rịọ Jehova ka o nye gị obi ike ị ga-eji kọwaara ha ihe i kweere. (Efe. 6:19, 20) Ọ bụrụ na ezigbo ọrịa ji gị, rịọ Jehova ka o nye gị ike ị ga-eji na-ejere ya ozi otú i nwere ike. Mgbe ọ bụla ị hụrụ na Jehova nyeere gị aka, okwukwe gị ga-esikwu ike. w20.07 17 ¶9
Mọnde, Julaị 11
Burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ.—Mat. 6:33.
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Alaeze Chineke bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị, anyị kwesịrị ịna-eme ka Ebreham, bụ́ onye hapụrụ ihe ụfọdụ iji mee Chineke obi ụtọ. (Mak 10:28-30; Hib. 11:8-10) Echela na ị gaghị enwe nsogbu ná ndụ gị. Nsogbu na-abịara ma ndị ji ndụ ha niile na-ejere Jehova ozi. (Jems 1:2; 1 Pita 5:9) E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ilekwasị anya n’ọdịnihu n’oge anyị a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ihe ndị na-eme n’ụwa gosiri na anyị bi n’oge ikpeazụ nke ụwa ọjọọ a. Otu n’ime ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị bụ ime ka ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie. N’oge ahụ, Jehova ga-akwụ Ebreham ụgwọ ọrụ maka okwukwe ya na ndidi ya. Otú ọ ga-esi eme ya bụ ịkpọlite ya na ezinụlọ ya n’ọnwụ n’ụwa a. Ị̀ ga-anọ soro nabata ha mgbe ahụ? I nwere ike ịnọ ya ma ọ bụrụ na i mee ka Ebreham, hapụ ihe ụfọdụ maka Alaeze Chineke, na-enwe okwukwe n’agbanyeghị nsogbu, nakwa ma ị mụta iji ndidi na-echere Jehova.—Maị. 7:7. w20.08 5-6 ¶13-14; 7 ¶17
Tuzdee, Julaị 12
Bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ, m ga-enye gị okpueze bụ́ ndụ.—Mkpu. 2:10.
Anyị ma na ọ bụrụ na ndị iro anyị egbuo anyị, Jehova ga-akpọlite anyị. O doro anyị anya na o nweghị ihe ha ga-eme ka anyị kwụsị ife Jehova. (Rom 8:35-39) Olileanya mbilite n’ọnwụ Jehova mere ka anyị nwee gosiri na amamihe ya enweghị atụ. O ji ya mee ka Ekwensu ghara ịna-eji ọnwụ eyi anyị egwu, meekwa ka obi sie anyị ike ịna-erubere Chineke isi. Ọ bụrụ na ndị iro Jehova asị na ha ga-egbu gị, ị̀ ga-atụkwasị Jehova obi na ọ ga-akpọlite gị n’ọnwụ? Olee otú ị ga-esi mara? Otu ụzọ bụ ịjụ onwe gị sị, ‘Mkpebi ọ bụla m na-eme kwa ụbọchị ọ̀ na-egosi na m tụkwasịrị Jehova obi?’ (Luk 16:10) I nwekwara ike ịjụ onwe gị sị, ‘Otú m si ebi ndụ ọ̀ na-egosi na m tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enye m ihe ndị dị m mkpa ma m buru ụzọ na-achọ Alaeze ya?’ (Mat. 6:31-33) Ọ bụrụ na ihe ị ga-aza n’ajụjụ ndị ahụ bụ ee, ị ga-adị njikere idi nsogbu ọ bụla ga-abịara gị.—Ilu 3:5, 6. w20.08 17-18 ¶15-16
Wenezdee, Julaị 13
Gbalịsie ike ka i chee onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye ihe ya dị ya mma, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, onye na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.—2 Tim. 2:15.
Anyịnwa kwesịri ịmụta iji Okwu Chineke na-akụzi ihe nke ọma. Anyị na-amụta ụzọ ụfọdụ e si eji ya akụzi ihe nke ọma n’ọmụmụ ihe. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ka ndị ọzọ kweta na eziokwu Baịbụl bara uru, anyị kwesịrị ịna-amụchi Baịbụl anya n’onwe anyị. Anyị kwesịrị iji Okwu Chineke mee ka okwukwe anyị sie ike. Ihe ọ pụtara bụ na ihe anyị ga na-eme abụghị naanị ịgụ Baịbụl. Anyị ga na-echebara ihe ndị anyị gụrụ na ya echiche, na-emekwa nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ka anyị nwee ike ịghọta ihe anyị gụrụ nke ọma ma kọwaa ya n’ụzọ dabara adaba. (1 Tim. 4:13-15) Anyị mee ihe a, anyị ga-enwe ike iji Okwu Chineke na-akụzi ihe nke ọma. Ihe anyị ga na-eme abụghị naanị ịgụrụ ndị mmadụ amaokwu ndị dị na Baịbụl. Kama, anyị kwesịrị inyere ha aka ịghọta ihe amaokwu ahụ na-ekwu na otú ha ga-esi eme ya eme. Ọ bụrụ na anyị ana-amụchi Baịbụl anya, anyị ga na-emekwu nke ọma n’otú anyị si eji ya akụziri ndị ọzọ ihe.—2 Tim. 3:16, 17. w20.09 28 ¶12
Tọzdee, Julaị 14
Chesienụ echiche ike banyere [Jizọs] . . . , ka ike wee ghara ịgwụ unu, unu ewee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.—Hib. 12:3.
Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere otú Jehova si enyere anyị aka, ọ ga-eme ka anyị tinye uche n’ọrụ ikwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ọ na-eji akwụkwọ anyị, ma ndị nke e biri ebi ma ndị nke a na-ebighị ebi, ihe ndị a na-egere egere, vidio, nakwa ihe omume tiivi anyị ndị a na-etinye n’Ịntanet enyeju anyị afọ. Chegodị echiche: E nwere ihe ndị dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet n’ihe karịrị otu puku asụsụ. (Mat. 24:45-47) Ihe ọzọ anyị ga-eme iji tinye uche anyị n’ikwusa ozi ọma bụ iṅomi Jizọs. O kweghị ka ihe ọ bụla mee ka uche ya pụọ n’ịgbara eziokwu àmà. (Jọn 18:37) Mgbe Ekwensu chọrọ inye ya “alaeze niile nke ụwa na ebube ha,” o kweghị ka o jiri ya rata ya. Mgbe ndị mmadụ chọkwara ime ya eze, ọ gụghị ya agụụ ịbụ eze ha. (Mat. 4:8, 9; Jọn 6:15) O nweghị mgbe ọ chọrọ ịbụ aka ji akụ̀. Mmegide e megidere ya emeghịkwa ka uche ya pụọ n’ikwusa ozi ọma. (Luk 9:58; Jọn 8:59) Ọnwụnwa bịara anyị, anyị agaghị ekwe ka o mee ka uche anyị pụọ n’ozi ọma ma anyị cheta ihe Pọl kwuru n’ihe mmụta dirị ụbọchị taa. w20.09 9-10 ¶6-7
Fraịdee, Julaị 15
Bụrụnụ ndị na-eṅomi m, ọbụna dị ka m bụ onye na-eṅomi Kraịst.—1 Kọr. 11:1.
Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ọtụtụ ụmụnna nwaanyị na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Ha na-aza ajụjụ ma na-eme ihe omume n’ọmụmụ ihe, na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha na-enye aka elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-egosikwa na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya. Ma, ha na-enwekwa nsogbu. Ụfọdụ n’ime ha na-elekọta ndị nne na nna ha mere agadi. Ndị ezinụlọ ụfọdụ n’ime ha na-emegide ha. Ụfọdụ ndị naanị ha na-azụ ụmụ na-agbalịkwa elekọta ụmụ ha. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akwado ụmụnna anyị ndị nwaanyị? Ọ bụ n’ihi na ụwa anaghị enyecha ụmụ nwaanyị nsọpụrụ ruuru ha. Ihe ọzọ bụ na Baịbụl sịrị ka anyị na-akwado ha. Dị ka ihe atụ, Pọl gwara ọgbakọ nọ na Rom ka ha nabata Fibi, ‘nyekwara ya aka n’ihe ọ bụla enyemaka ha pụrụ ịdị ya mkpa.’ (Rom 16:1, 2) Pọl so ná ndị kweere na ụmụ nwaanyị abachaghị uru. Ma ugbu a ọ ghọrọ Onye Kraịst, o ṅomiri Jizọs, na-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù ma na-enwere ha obiọma. w20.09 20 ¶1-2
Satọdee, Julaị 16
Mee . . . ndị na-eso ụzọ. . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.—Mat. 28:19, 20.
Iji nyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ka ọ gụwa ha agụụ ikwusa ozi ọma, anyị nwere ike ịjụ ha ajụjụ ndị a: “Olee otú ndụ gị sirila gbanwee n’ihi na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru? Ì chere na ndị ọzọ kwesịrị ịnụ ozi ọma a? Gịnị ka i nwere ike ime iji nyere ha aka?” (Ilu 3:27; Mat. 9:37, 38) Cheta na Jizọs nyere anyị iwu ka anyị na-akụziri ndị mmadụ ka ha “debe ihe niile” o nyere n’iwu. Ihe ndị so n’ihe ndị ahụ o nyere n’iwu bụ iwu abụọ kachanụ, ya bụ, ịhụ Chineke n’anya na ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya. (Mat. 22:37-39) Anyị ga-ahụrịrị Chineke na ndị mmadụ n’anya ka anyị nwee ike ikwusa ozi ọma. O doro anya na ikwusa ozi ọma nwere ike ịtụ ụfọdụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ụjọ. Ma, anyị nwere ike ime ka obi sie ha ike na Jehova ga-enyere ha aka iji nwayọọ nwayọọ kwụsị ịtụ mmadụ egwu.—Ọma 18:1-3; Ilu 29:25. w20.11 3 ¶6-8
Sọnde, Julaị 17
Anyị akwụsịbeghị ikpe ekpere maka unu.—Kọl. 1:9.
Mgbe ị na-akwadebe maka ọmụmụ Baịbụl, gwa Jehova banyere onye ị na-amụrụ ihe na otú ihe si dịrị ya. Rịọkwa Jehova ka o nyere gịnwa aka iji Baịbụl kụziere onye ahụ ihe nke ọma otú ga-eru ya n’obi. Echefula na ebumnobi gị bụ inyere ya aka ka o ruo eru ime baptizim. Ya na Jehova kwesịrị ịna-ekwurịta okwu. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ bụ ịna-ege Jehova ntị na ịna-agwa ya okwu. Otú ọ ga-esi na-ege ya ntị bụ ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. (Jọsh. 1:8; Ọma 1:1-3) O nwere ike ịgwa Jehova okwu n’ekpere kwa ụbọchị. Si n’ala ala obi gị kpee ekpere tupu unu amalite ọmụmụ ihe nakwa ná mmechi ọmụmụ ihe unu. Ọ ga-esi n’ekpere ị na-ekpe mụta isi n’obi ya na-ekpe ekpere, mụtakwa ịgwa Jehova Chineke okwu n’ekpere n’aha Jizọs Kraịst. (Mat. 6:9; Jọn 15:16) Chee otú ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị (ya bụ, ige Jehova ntị) na ikpe ekpere (ya bụ, ịgwa Jehova okwu) ga-esi nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ịbịarukwu Chineke nso.—Jems 4:8. w20.10 8 ¶8; 9 ¶10-11
Mọnde, Julaị 18
Na-agbasi mbọ ike ka unu nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.—Efe. 4:3.
Ndị Jehova taa ka chọkwara ịna-eme ihe n’usoro ma dịrị n’udo otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere. (Ọrụ 16:4, 5) Iji maa atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịga Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’ọgbakọ ọzọ ma ọ bụdị ná mba ọzọ, ị ma isiokwu a ga-amụ nakwa otú a ga-esi eduzi ya. Ihe a na-eme ka ahụ́ ruo gị ala. E nweghị ihe nwere ike ime ka ndị Jehova dị n’otu otú a ma ọ́ bụghị mmụọ nsọ Chineke. (Zef. 3:9) Olee ihe i nwere ike ime? Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-enye aka eme ka udo dị n’ọgbakọ? M̀ na-akwanyere ndị na-edu ndú n’ọgbakọ ùgwù? Ndị ọzọ hà ga-atụkwasịli m obi, karịchaa ma ọ bụrụ na m nwere ihe ndị m na-arụ n’ọgbakọ? M̀ na-abịa ihe n’oge, na-enyere ndị mmadụ aka ma dịrị njikere ijere ndị ọzọ ozi?’ (Jems 3:17) Ọ bụrụ na ị chọpụta na e nwere ebe i kwesịrị imezikwu, kpee ekpere ka Chineke nye gị mmụọ nsọ ya. Ka ị na-ekwe ka mmụọ nsọ na-eduzi otú i si eche echiche na ihe ndị ị na-eme, ka ụmụnna gị ga na-ahụkwu gị n’anya ma jiri gị kpọrọ ihe. w20.10 23 ¶12-13
Tuzdee, Julaị 19
Bụrụnụ ndị na-eme okwu Chineke, unu abụla ndị na-anụ naanị ọnụnụ.—Jems 1:22.
Anyị nwere ike iji Okwu Chineke mere enyo. (Jems 1:23-25) Ọtụtụ n’ime anyị na-ele enyo tupu anyị esi n’ụlọ anyị pụọ n’ụtụtụ ọ bụla. Ihe mere anyị ji eme ya bụ ka anyị mara ma è nwere ihe na-adịghị mma n’ahụ́ anyị anyị kwesịrị idozi tupu ndị ọzọ ahụ ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma anyị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ọ ga-enyere anyị aka ịhụ ebe ndị anyị kwesịrị imezi ihe n’otú anyị si eche echiche nakwa n’akparamagwa anyị. Ọtụtụ ndị achọpụtala na ọ bara uru ịgụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụtụtụ ọ bụla tupu ha apụwa. Ha na-ekwe ka ihe ha gụrụ duzie echiche ha. Ha na-agbalịkwa achọ otú ha ga-esi eme ihe ha mụtara n’Okwu Chineke n’ụbọchị ahụ niile. E wezụga ịgụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị, anyị kwesịkwara ịna-ewepụta oge kwa ụbọchị na-amụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị mụtara. Ihe a nwere ike ịdị ka o nweghị oké ihe ọ bụ, ma o so n’ihe ndị kacha mkpa anyị ga-eme iji nọgide na-aga n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ. E nwere ike ikwu na Okwu Chineke dị ka ígwè e ji enyocha ime ahụ́. O nwere ike ime ka anyị mata otú anyị dị n’ime. Ma, anyị ga-adịrịrị umeala n’obi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndụmọdụ Baịbụl ma ọ bụ ndụmọdụ Chineke si n’aka ndị o ji akụziri anyị ihe na-enye anyị baara anyị uru. w20.11 18 ¶3; 20 ¶8
Wenezdee, Julaị 20
A nọgidere na-eme ka ọgbakọ dị iche iche dị ike n’okwukwe, ha na-amụbakwa n’ọnụ ọgụgụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.—Ọrụ 16:5.
N’agbanyeghị na a kpagburu Ndị Kraịst oge mbụ ọtụtụ mgbe, e nwekwara oge ndị ha nwere udo. Gịnị ka ha ji oge ndị ahụ ha nwere udo mee? Ha ji ya kwusasie ozi ọma ike. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru na ha nọ “na-eje ije n’egwu Jehova.” Ha nọgidere na-ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, “ha nọgidekwara na-amụba.” Jehova gọziri ozi ọma ha ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa n’oge ahụ e nwere udo. (Ọrụ 9:26-31) Ndị Kraịst oge mbụ ji ohere ọ bụla dapụtaranụ zie ndị mmadụ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl onyeozi matara na e megheerela ya ọnụ ụzọ buru ibu n’Efesọs, o ji oge ahụ kwusaa ozi ọma ma mee ndị na-eso ụzọ n’obodo ahụ. (1 Kọr. 16:8, 9) Ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs gbakwuru mbọ kwusaa “ozi ọma banyere okwu Jehova.” (Ọrụ 15:30-35) Gịnị ka ọ rụpụtara? E kwuru ya n’ihe mmụta dịrị ụbọchị taa. w20.09 16 ¶6-8
Tọzdee, Julaị 21
Ọnwụ si n’aka otu onye.—1 Kọr. 15:21.
Mgbe Adam mere mmehie, ọ kpataara onwe ya na ụmụ ya nsogbu. Anyị ka na-ata ahụhụ mmehie ahụ Adam mere. Ma, ihe ga-adịrị anyị mma n’ọdịnihu n’ihi na Chineke kpọlitere Ọkpara ya n’ọnwu. “Mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ sikwa n’aka otu onye,” ya bụ, Jizọs. Pọl onyeozi kwuru, sị: “N’ihi na dị nnọọ ka mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam, otú ahụkwa ka a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.” (1 Kọr. 15: 22) Olee ihe Pọl bu n’uche mgbe o kwuru, sị: “Mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam”? O bu n’uche ụmụ Adam niile ketara mmehie, ezughị okè, na ọnwụ n’aka Adam. (Rom 5:12) Adam esoghị ná ndị a ‘ga-eme ka ha dị ndụ.’ Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ agaghị abara Adam uru n’ihi na Adam zuru okè ma kpachara anya nupụrụ Chineke isi. Ihe mere Adam ga-emecha mee ndị “Nwa nke mmadụ” ga-ewere ka “ewu” mgbe ọ ga-ekpe ikpe, ya bụ, ha ga-anwụ “ọnwụ ebighị ebi.”—Mat. 25:31-33, 46; Hib. 5:9. w20.12 5 ¶13-14
Fraịdee, Julaị 22
Jehova . . . na-ahụ onye dị umeala n’obi.—Ọma 138:6.
Ọ bụrụ na a họpụtaghị anyị ịrụ ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ, o nwere ezigbo ihe anyị ga-amụta n’aka ndị mmụọ ozi. Mgbe Eze Ehab na-achị, Jehova kpọkọtara ndị mmụọ ozi ma gwa ha ka ha tụọ aro otú a ga-esi arafu eze ahụ. Ọtụtụ n’ime ha tụrụ aro otú a ga-esi eme ya. Ma, Chineke gwara otu mmụọ ozi na aro nke ya dị mma, na ọ ga-arafu Ehab. (1 Eze 22:19-22) Ndị mmụọ ozi ndị nke ọzọ hà bịara daa mbà n’obi, na-ajụ onwe ha, sị: ‘Gịnị medịrị m ji nyewe onwe m nsogbu tụwa aro?’ Mba. Ndị mmụọ ozi dị umeala n’obi. Ha chọkwara ka otuto niile gaara Jehova. (Ikpe 13:16-18; Mkpu. 19:10) Na-echeta na ihe ùgwù kachanụ anyị nwere bụ ịza aha Jehova na ikwusa Alaeze ya. Ihe ùgwù abụghị ya ga-eme ka Jehova jiri anyị kpọrọ ihe. Anyị dịrị umeala n’obi, ọ bụ mgbe ahụ ka Jehova na ụmụnna anyị ga-eji anyị kpọrọ ihe. N’ihi ya, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịdị umeala n’obi. Chee banyere ndị dị umeala n’obi a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Jiri obi gị niile jeere ụmụnna gị ozi otú ọ bụla i nwere ike.—1 Pita 5:5. w20.12 26 ¶16-17
Satọdee, Julaị 23
Narakwanụ okpu agha bụ́ nzọpụta, na mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, okwu Chineke.—Efe. 6:17.
Okpu agha bụ́ nzọpụta bụ olileanya anyị nwere na Jehova ga-echebe anyị. Ọ bụkwa olileanya anyị nwere na Jehova ga-enye ndị niile na-efe ya ụgwọ ọrụ ha, nakwa na ọ bụrụgodị na ha anwụọ, ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ. (1 Tesa. 5:8; 1 Tim. 4:10; Taị. 1:1, 2) Olileanya anyị nwere maka nzọpụta na-echebe anyị ka anyị ghara ịna-eche echiche ọjọọ. Ọ na-eme ka anyị lekwasị anya ná nkwa ndị Jehova kwere, na-emekwa ka anyị ghara ikwe ka nsogbu ndị na-abịara anyị mee ka ike gwụ anyị. Anyị na-eyiri okpu agha ahụ ma anyị na-eche echiche otú Chineke si eche. Dị ka ihe atụ, anyị na-eme ka olileanya anyị dịrị n’ebe Chineke nọ, ọ bụghị n’akụnụba a na-ejighị n’aka. (Ọma 26:2; 104:34; 1 Tim. 6:17) Mma agha nke mmụọ nsọ bụ Okwu Chineke bụ́ Baịbụl. Mma agha ahụ nwere ikike ime ka ndị mmadụ mata ụgha dị iche iche a na-akụzi, mee ka ha nwere onwe ha na ya, nyekwara ha aka ịkwụsị àgwà ọjọọ. (2 Kọr. 10:4, 5; 2 Tim. 3:16, 17; Hib. 4:12) Ịmụ Baịbụl na ọzụzụ ndị anyị na-enweta ná nzukọ Jehova na-enyere anyị aka ịma otú e si eji mma agha ahụ nke ọma.—2 Tim. 2:15. w21.03 27 ¶4; 29 ¶10-11
Sọnde, Julaị 24
Mụ onwe m . . . nọrọ n’agwaetiti a na-akpọ Patmọs n’ihi ikwu banyere Chineke na ịgbara Jizọs àmà.—Mkpu. 1:9.
Ma mgbe a tụrụ Jọn onyeozi mkpọrọ n’ihi na ọ na-ekwusa ozi ọma banyere Jizọs, ọ nọgidere na-egosi na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya. Dị ka ihe atụ, o dere ihe e kpugheere ya ma zigara ya ọgbakọ dị iche iche ka ha nwee ike ịmata “ihe ndị na-aghaghị ime n’oge na-adịghị anya.” (Mkpu. 1:1) Ọ ga-abụ mgbe a tọhapụchara ya n’ụlọ mkpọrọ na Patmọs ka o dere akwụkwọ Jọn, bụ́ ebe ọ kọrọ gbasara ndụ Jizọs na ozi ya. O dekwara akwụkwọ ozi atọ iji gbaa ụmụnna ya ume ma mee ka ha dị ike. I nwere ike ịna-eme ka Jọn ma n’ihe ndị i kpebiri iji ndụ gị eme gosi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya. Ụwa Ekwensu ga-achọ ka i jiri oge gị niile na ike niile na-eme ihe ga-abara naanị onwe gị uru, na-achọ ka i nweta ego ma ọ bụ bụrụ onye a ma ama. Ma, Ndị Kraịst n’ụwa niile na-eji oge buru ibu ekwusa ozi ọma ma na-enyere ndị mmadụ aka ịbịaru Jehova nso. w21.01 10 ¶9-10
Mọnde, Julaị 25
Jọnatan wee hụ ya n’anya dị ka mkpụrụ obi nke ya.—1 Sam. 18:1.
Jọnatan gaara enwewere Devid anyaụfụ. Ebe Jọnatan bụ ọkpara Eze Sọl, ọ gaara asị na ọ bụ ya ka o ruuru ịnọchi nna ya. (1 Sam. 20:31) Ma, Jọnatan dị umeala n’obi, na-erubekwara Jehova isi. N’ihi ya, ọ kwadoro mkpebi Jehova mere ka Devid bụrụ eze. Ọ kwadokwara Devid n’agbanyeghị na ime otú ahụ were nna ya ezigbo iwe. (1 Sam. 20:32-34) Jọnatan hụrụ Devid n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere na o wereghị ya ka onye ya na ya na-azọ ihe. Jọnatan na-agba ụta nke ọma, bụrụkwa ezigbo onye agha. A makwa ya na papa ya bụ́ Sọl ama ka ndị “na-efe ọsọ karịa ugo” na ndị “dị ike karịa ọdụm.” (2 Sam. 1:22, 23) Ihe ndị a nwere ike ime ka Jọnatan tuwe ọnụ gbasara ihe ndị o mere. Ma, o meghị ka ọ mawa Devid aka ma ọ bụkwanụ nwewere ya anyaụfụ. Kama nke ahụ, Jọnatan nwere mmasị n’ebe Devid nọ n’ihi na o nwere obi ike ma tụkwasị Jehova obi. Dị ka ihe atụ, mgbe Devid gbuchara Golayat, Jọnatan bịara hụ ya n’anya otú o si hụ onwe ya. w21.01 21 ¶6; 22 ¶8-9
Tuzdee, Julaị 26
Nwoke bụkwa isi nke nwaanyị.—1 Kọr. 11:3.
Ndị Kraịst niile nọ n’okpuru Jizọs Kraịst bụ́ onyeisi zuru okè. Ma, ọ bụrụ na nwaanyị bụ́ Onye Kraịst alụọ di, ọ na-anọzi n’okpuru di ya bụ́ onye na-ezughị okè. O nwere ike ọ gaghị adịrị ya mfe ime otú ahụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na nwanna nwaanyị ekpebiwe onye ọ ga-alụ, o kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee ihe gosiri na nwanna a ga-abụ ezigbo onyeisi ezinụlọ? Ihe ka ya mkpa ná ndụ ọ̀ bụ ofufe Jehova? Ọ bụrụ na ọ bụghị ya, olee ihe mere m ji chee na ọ ga-emeli ka okwukwe anyị na-esikwu ike ma anyị lụchaa?’ Ụmụnna nwaanyị kwesịkwara ịjụ onwe ha sị: ‘Olee àgwà ndị m nwere ga-abara anyị uru ma anyị lụọ? M̀ na-enwe ndidi ma na-emesapụ aka? Mụ na Jehova ànyị dị n’ezigbo mma?’ (Ekli. 4:9, 12) Ọ bụrụ na nwaanyị emee mkpebi dị mma tupu ya alụọ di, o nwere ike ime ka alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma, ya na di ya ana-enwekwa obi ụtọ. Ọtụtụ nde ụmụnna anyị nwaanyị bụ ndị e ji ama atụ n’ido onwe ha n’okpuru di ha. E kwesịkwara ịja ha mma. w21.02 8 ¶1-2
Wenezdee, Julaị 27
Gafeta na Masedonia nyere anyị aka.—Ọrụ 16:9.
N’oge ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ ndị nkwusa kpebiri ịmụta asụsụ ọzọ ka ha nwee ike ịna-ekwusakwu ozi ọma n’ọgbakọ a chọkwuru ndị nkwusa. Ọ bụ hanwa ji aka ha kpebie ime ya ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi. N’agbanyeghị na o nwere ike iwe ha ọtụtụ afọ tupu ha amụta asụsụ ahụ nke ọma, ha na-abara ọgbakọ ezigbo uru. Àgwà ọma ha na ihe ndị ha mụtara na-enyere ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ aka. Obi dị anyị ụtọ n’ebe ụmụnna ndị a nọ. Ndị okenye ekwesịghị ịsị na nwanna erughị eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi naanị n’ihi na ọ naghị asụ asụsụ ọgbakọ ha ji amụ ihe nke ọma. Ndị okenye ga-eji ihe Baịbụl kwuru chọpụta ma nwanna ò ruru eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ọ bụghị ma ọ̀ na-asụ asụsụ ọgbakọ ji amụ ihe nke ọma.—1 Tim. 3:1-10, 12, 13; Taị. 1:5-9. w20.08 30 ¶15-16
Tọzdee, Julaị 28
Gụọnụ ya n’ihe ọṅụ, ụmụnna m, mgbe unu zutere ọnwụnwa dị iche iche.—Jems 1:2.
Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche na naanị ihe ga-eme ka ha na-enwe ọṅụ bụ ma ahụ́ gbasie ha ike, ma ha nwee nnukwu ego, ma ọ bụkwanụ ma ha na-ebi n’udo n’ezinụlọ ha. Ma, ọ bụ mmụọ nsọ Chineke na-eme ka mmadụ nwee ụdị ọṅụ ahụ Jems na-ekwu okwu ya. Ọ bụ ya mere anyị ga-eji na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị. (Gal. 5:22) Ihe na-eme ka Onye Kraịst na-enwe ọṅụ ma ọ bụ na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ ma ọ mata na ọ na-eme ihe dị Jehova mma, na-emekwa ka Jizọs. (Luk 6:22, 23; Kọl. 1:10, 11) E nwere ike iji ụdị ọṅụ a tụnyere ọkụ a mụnyere na lampụ. Ọkụ ahụ na-anọgide na-enwu n’agbanyeghị mmiri ozuzo ma ọ bụ ifufe. Anyị nwere ike ịna-enwe ụdị ọṅụ a n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị. Anyị agaghị akwụsị inwe ọṅụ ma mgbe ọrịa bịara anyị ma mgbe ego kọrọ anyị. Ịkwa emo na mkpagbu ndị ezinụlọ anyị na ndị ọzọ na-akpagbu anyị anaghị eme ka anyị kwụsị inwe ọṅụ. Anyị na-enwekwu ọṅụ mgbe ọ bụla ndị mmadụ chọrọ ka anyị kwụsị inwe ọṅụ. Ọnwụnwa ndị na-abịara anyị n’ihi okwukwe anyị na-egosi na anyị bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Mat. 10:22; 24:9; Jọn 15:20) Ọ bụ ya mere Jems ji dee ihe e kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị anyị nke taa. w21.02 27 ¶6
Fraịdee, Julaị 29
Okwu ọma na-eme ka [obi] ṅụrịa ọṅụ.—Ilu 12:25.
Ị na-agụ Baịbụl hụ amaokwu ndị kwuru gbasara uru ịnọ jụụ na ịtụkwasị Jehova obi bara, gbalịa bute ha n’isi. O nwere ike ịdị mma ka ị na-agụpụta ya agụpụta ma ọ bụ detuo ya n’akwụkwọ ka i nwee ike ịna-agụgharị ha. Jehova nyere Jọshụa iwu ka ọ na-agụ akwụkwọ Iwu ahụ n’olu dị ala ehihie na abalị ka o nwee ike jiri amamihe na-eme ihe. Ihe ọ gụtara n’akwụkwọ Iwu ahụ ga-enyere ya aka ka ọ ghara ịna-atụ ụjọ, nyekwara ya aka iji obi ike na-edu ndị Izrel. (Jọsh. 1:8, 9) Ọtụtụ ihe e dere na Baịbụl nwere ike ime ka obi ruo gị ala ma nsogbu ndị nwere ike ime ka i chegbuwe onwe gị bịara gị. (Ọma 27:1-3; Ilu 3:25, 26) N’ọmụmụ ihe anyị, anyị na-amụta ọtụtụ ihe n’okwu ndị a na-ekwu, ajụjụ ụmụnna anyị na-aza, nakwa ma anyị na ụmụnna anyị na-akparịta ụka. (Hib. 10:24, 25) Ọ bụrụkwa na anyị akọọrọ ụmụnna ndị anyị tụkwasịrị obi n’ọgbakọ nsogbu anyị, obi ga-eru anyị ala. w21.01 6, 7 ¶15-16
Satọdee, Julaị 30
Bụụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ihe nlereanya.—1 Tim. 4:12.
Mgbe i mere baptizim, i gosiri na i nwere ezigbo okwukwe, tụkwasịkwa Jehova obi. Obi dịkwa Jehova ezigbo ụtọ ịnabata gị n’ezinụlọ ya. Ihe i kwesịrị ime ugbu a bụ ịnọgide na-atụkwasị Jehova obi. O nwere ike ịdịrị gị mfe ịtụkwasị Jehova obi ma ị na-eme mkpebi ndị dị ezigbo mkpa ná ndụ gị. Ma, ọ bụrụkwanụ na i mewe mkpebi ndị ọzọ? Ọ dịkwa ezigbo mkpa ka ị tụkwasị Jehova obi ma ị na-ekpebi ihe ị ga-eme gbasara ụdị ihe ị ga-eji atụrụ ndụ, ụdị ọrụ ị ga-arụ, nakwa ụdị ihe ị ga-eme ná ndụ gị. Atụkwasịla onwe gị obi. Kama ime otú ahụ, chọta amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka ikpebi ihe ị ga-eme. Meekwa ihe ebe ahụ kwuru. (Ilu 3:5, 6) I mee otú ahụ, ị ga-eme Jehova obi ụtọ, ndị nọ n’ọgbakọ unu ana-akwanyekwara gị ùgwù. Nke bụ́ eziokwu bụ na gịnwa ezughị okè otú ahụ anyị niile na-ezughị. Mgbe ụfọdụ, i nwekwara ike imehie ihe. Ma, nke ahụ ekwesịghị igbochi gị ime ike gị niile n’ozi Jehova. w21.03 6 ¶14-15
Sọnde, Julaị 31
A napụtakwara m n’ọnụ ọdụm.—2 Tim. 4:17.
Ndị ezinụlọ unu hà na-akpagbu gị? Ì bi n’obodo ebe a machiri Ndịàmà Jehova ime ihe ụfọdụ ma ọ bụ machie ha iwu kpamkpam? Ọ bụrụ otú ahụ, ịgụ ihe e dere na 2 Tim. 1:12-16; 4:6-11, 17-22 nwere ike ịgba gị ume. Pọl onyeozi dere amaokwu Baịbụl ndị a mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ. Tupu gị agụọ amaokwu Baịbụl ndị ahụ, gwa Jehova nsogbu i nwere na otú obi dị gị maka ya. Ezorola ya ọnụ. Rịọzie ya ka o nyere gị aka ịchọpụta ihe ndị mere ná ndụ Pọl ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme maka nsogbu ahụ. Jehova gwara Pọl na a ga-akpagbu ya n’ihi na ọ bụ Onye Kraịst. (Ọrụ 21:11-13) Olee otú Jehova si nyere Pọl aka? Ọ zara ya ekpere ya, mechaakwa nye ya ike. E mekwara ka obi sie Pọl ike na ọ ga-enweta ụgwọ ọrụ ahụ ọ gbasiri mbọ ike inweta. Jehova mekwara ka ndị enyi Pọl nyere ya aka. w21.03 17-18 ¶14-15, 19