Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es22 p. 88-97
  • Septemba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Septemba
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ—2022
  • Isiokwu Nta
  • Tọzdee, Septemba 1
  • Fraịdee, Septemba 2
  • Satọdee, Septemba 3
  • Sọnde, Septemba 4
  • Mọnde, Septemba 5
  • Tuzdee, Septemba 6
  • Wenezdee, Septemba 7
  • Tọzdee, Septemba 8
  • Fraịdee, Septemba 9
  • Satọdee, Septemba 10
  • Sọnde, Septemba 11
  • Mọnde, Septemba 12
  • Tuzdee, Septemba 13
  • Wenezdee, Septemba 14
  • Tọzdee, Septemba 15
  • Fraịdee, Septemba 16
  • Satọdee, Septemba 17
  • Sọnde, Septemba 18
  • Mọnde, Septemba 19
  • Tuzdee, Septemba 20
  • Wenezdee, Septemba 21
  • Tọzdee, Septemba 22
  • Fraịdee, Septemba 23
  • Satọdee, Septemba 24
  • Sọnde, Septemba 25
  • Mọnde, Septemba 26
  • Tuzdee, Septemba 27
  • Wenezdee, Septemba 28
  • Tọzdee, Septemba 29
  • Fraịdee, Septemba 30
Inyocha Akwụkwọ Nsọ—2022
es22 p. 88-97

Septemba

Tọzdee, Septemba 1

M ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla.​—Joel 2:28.

Mgbe Pita si n’ike mmụọ nsọ na-ekwughachi ihe Joel buru n’amụma, o ji okwu dịtụ iche kwuo ya. (Ọrụ 2:​16, 17) Kama Pita ịsị “mgbe e mesịrị,” ọ sịrị: “N’oge ikpeazụ.” N’amaokwu a, oge ikpeazụ ọ na-ekwu gbasara ya bụ tupu e bibie Jeruselem na ụlọ nsọ ya. Chineke ga-awụkwasị “ụdị anụ ahụ́ ọ bụla” mmụọ nsọ ya. Ihe a gosiri na ogologo oge gafere tupu amụma Joel ahụ emezuo. Ọ bụ mgbe Chineke wụkwasịchara ndị ya mmụọ nsọ n’oge ndịozi ka ha bidoro ikwusa ozi ọma ga-emecha ruo ebe niile n’ụwa. N’ihe dị ka afọ 61, mgbe Pọl degaara Ndị Kọlọsi akwụkwọ ozi, o kwuru na e kwusaala ozi ọma ahụ “n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.” (Kọl. 1:23) “Ihe niile e kere eke” Pọl na-ekwu okwu ya pụtara ebe ya na ndị ọzọ garuru. Jehova ejirila mmụọ nsọ ya mee ka ozi ọma ahụ gazuo ọtụtụ ebe n’ụwa taa. E nwere ike ikwu na o ruola ná “nsọtụ ụwa.”​—Ọrụ 13:47. w20.04 6-7 ¶15-16

Fraịdee, Septemba 2

Mụ onwe m ga-achọta atụrụ m wee lekọta ha.​—Ezik. 34:11.

Jehova hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị n’anya, ma atụrụ ya ọ bụla kpafuru akpafu. (Mat. 18:​12-14) Chineke kwere nkwa na ya ga-achọ atụrụ ya, nyekwara ha aka ka ya na ha dịghachi ná mma. O kwukwara ihe ndị ọ ga-eme. Ihe ndị ahụ yiri ihe onye ọzụzụ atụrụ bụ́ onye Izrel na-eme ma atụrụ ya kpafuo. (Ezik. 34:​12-16) Nke mbụ, onye ọzụzụ atụrụ ahụ ga-achọ atụrụ ahụ. O nwere ike ịgba ezigbo mbọ ka o nwee ike ịchọta ya, ya eweekwa ya oge. Ọ hụzie atụrụ ahụ, ya akpọlata ya. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na atụrụ ahụ merụrụ ahụ́ ma ọ bụ na agụụ na-agụ ya, onye ọzụzụ atụrụ ahụ ga-eji nwayọọ nyere ya aka, kechie ọnyá ya, kuru ya ma nye ya nri. Ndị okenye, bụ́ ndị na-azụ “ìgwè atụrụ Chineke,” kwesịrị ịna-eme ihe ndị a ma ha chọọ inyere onye ọ bụla hapụrụ ọgbakọ aka. (1 Pita 5:​2, 3) Ndị okenye na-achọ ha, nyere ha aka ịlọghachi n’ọgbakọ, nyekwara ha aka ka ha na Jehova dịghachi ná mma iji gosi ha na ha hụrụ ha n’anya. w20.06 20 ¶10

Satọdee, Septemba 3

Ihe a kụrụ [n’ubi] achaala maka owuwe ihe ubi.​—Jọn 4:35.

Ihe mere Jizọs ji were ya na ihe ubi achaala maka owuwe ihe ubi ọ̀ bụ maka na ọ na-atụ anya ka ọtụtụ ndị sowe ya? Mba. Akwụkwọ Nsọ ebula ụzọ kwuo na ọ bụ mmadụ ole na ole ga-enwe okwukwe na ya. (Jọn 12:​37, 38) Jizọs nwere ike ịmata ihe dị ndị mmadụ n’obi. (Mat. 9:4) Ọ bụ eziokwu na ndị ọ kacha lekwasị anya na-akụziri ihe bụ mmadụ ole na ole ga-ekwere na ya, o jikwa ịnụ ọkụ n’obi kwusaara mmadụ niile ozi ọma. Ebe ọ bụ na anyịnwa enweghị ike ịmata ihe dị mmadụ n’obi, anyị ekwesịghị iwere ụfọdụ ndị ma ọ bụ ndị nọ n’ókèala ụfọdụ ka ndị na-enweghị ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Kama nke ahụ, ka anyị na-ewere ndị mmadụ ka ndị nwere ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ma, cheta na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ihe ubi achaala, ya bụ, na oge a ga-aghọrọ ha eruola. Ndị mmadụ nwere ike ịgbanwe ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Jehova na-ewere ndị nọ n’ókèala anyị ka ndị nwere ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs nakwa dị ka “ihe a na-achọsi ike.” (Hag. 2:7) Ọ bụrụ na anyị ewere ndị mmadụ otú Jehova na Jizọs si were ha, anyị ga-agbalị mata banyere ha na ihe ndị na-amasị ha. Anyị agaghị ewere ha ka ndị na-agaghị echegharị, kama ka ndị ga-emecha ghọọ ụmụnna anyị. w20.04 13 ¶18-19

Sọnde, Septemba 4

Ana m akpọ unu ndị enyi m, n’ihi na ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.​—Jọn 15:15.

Okwu Chineke mere ka o doo anya na anyị ga-ahụ Jizọs n’anya ma anyị chọọ ime ihe dị Jehova mma. Otu ihe anyị nwere ike ime iji bụrụ ndị enyi Jizọs bụ ịmata ya nke ọma. Ihe ga-enyere anyị aka ịmata Jizọs bụ ịgụ akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Anyị na-echebara ihe a kọrọ gbasara ndụ Jizọs na Baịbụl echiche, ọ ga-eme ka anyị hụ Jizọs n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù n’ihi otú o si meso ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na ọ bụ Nna Ukwu ndị na-eso ụzọ ya, o mesoghị ha ihe ka ohu. Kama nke ahụ, ọ gwara ha otú obi dị ya na ihe ndị ọ na-eche. Ihe na-ewute ha wutere Jizọs. O sokwa ha bee ákwá. (Jọn 11:​32-36) Ndị na-emegide ya chọpụtadịrị na ya na ndị nabatara ozi ya bụ enyi. (Mat. 11:19) Ọ bụrụ na anyị ana-emeso ndị ọzọ otú Jizọs si meso ndị na-eso ụzọ ya, anyị na ha ga na-adịkwu ná mma, obi ga na-adịkwu anyị ụtọ, anyị ga-ahụkwukwa Jizọs n’anya ma na-akwanyekwuru ya ùgwù. w20.04 22 ¶9-10

Mọnde, Septemba 5

Eze ndịda ga-eji ụsụụ ndị agha buru ibu ma dị ike jikere ibu agha.​—Dan. 11:25.

N’afọ 1870, Briten ghọrọ alaeze ukwu kachanụ n’ụwa. Ọ bụkwa ndị agha ya kacha ike n’ụwa. Amụma Daniel kwuru banyere otu obere mpi nke meriri mpi atọ ndị ọzọ. Obere mpi ahụ nọchiri anya Briten, ebe mpi ndị nke ọzọ nọchiri anya Frans, Spen, na Nedalandz. (Dan. 7:​7, 8) Ọ bụkwa Briten bụ eze ndịda ruo mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ. N’otu oge ahụ, Amerịka ghọrọ mba kacha baa ọgaranya. Ha na Briten malitekwara imekọ ihe ọnụ. N’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ, Amerịka na Briten jikọrọ aka lụọ agha ma kpaa ezigbo ike. Ha mechara ghọọ mba abụọ kacha ike n’ụwa. Dị ka Daniel buru n’amụma, eze ahụ nwetara “ụsụụ ndị agha buru ibu.” Kemgbe oge ikpeazụ a, ọ bụ Briten na Amerịka jikọrọ aka bụrụ eze ndịda. w20.05 4 ¶7-8

Tuzdee, Septemba 6

N’ebe iyi si asọpụta, n’ebe ahụ ka ọ na-asọghachi.​—Ekli. 1:7.

Ihe mere mmiri dị n’ụwa akpụkọghị akpụkọ bụ na ụwa adịghị oké anya n’ebe anyanwụ dị. A sị na ụwa nọ anyanwụ nso karịa otú ọ dị ugbu a, mmiri niile dị na ya ga-ata, ụwa adị ọkụ, kpọọ nkụ, o nweghịkwa ihe ọ bụla ga-adịli ndụ na ya. Ọ bụrụkwanụ na ụwa nọtụ anyanwụ n’ebe dị anya, ihe niile dị n’ụwa ga-ajụ oyi ma kpụkọọ. Ma, ebe ọ bụ na Jehova dowere ụwa ebe o kwesịrị ịnọ, otú ụwa si emepụta mmiri mere ka e nwee ihe ndị dị ndụ. Anyanwụ na-amịkọrọ mmiri dị ma n’osimiri ma n’elu ala laa n’elu, ya aghọọ urukpuru. Kwa afọ, mmiri anyanwụ na-amịkọrọ karịrị mmiri niile dị n’ọdọ mmiri niile dị n’ụwa. Mmiri ahụ na-anọ ihe dị ka abalị iri na mbara ígwé tupu ya ezoo ka mmiri ma ọ bụkwanụ daa ka snoo. Mmiri ahụ na-emecha sọba n’osimiri ma ọ bụkwanụ n’iyi, anyanwụ amịkọrọkwa ya ọzọ. Jehova mere ya ka ọ dịrị otú a ka mmiri ghara ịkọ n’ụwa. Ihe a gosiri na Jehova nwere amamihe, dịrịkwa ike.​—Job 36:​27, 28. w20.05 22 ¶6

Wenezdee, Septemba 7

Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu.​—Ọrụ 1:8.

Jizọs gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ. (Luk 11:​9, 13) Jehova na-eji mmụọ nsọ ya enye anyị “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Kọr. 4:7) Ọ bụ mmụọ nsọ Chineke na-enyere anyị aka idi ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ịbịara anyị. Mmụọ nsọ nwekwara ike inyere anyị aka ịrụ ọrụ ndị e nyere anyị n’ozi Jehova. O nwekwara ike ime ka anyị na-emekwu nke ọma n’ọrụ anyị. Anyị ma na ihe mere anyị ji enwe ike ime ihe ndị anyị na-eme n’ozi Jehova bụ na mmụọ nsọ ya na-enyere anyị aka. Anyị nwere ike igosi na anyị ji mmụọ nsọ kpọrọ ihe ma anyị na-ekpe ekpere ka Jehova nyere anyị aka ịchọpụta echiche ma ọ bụ ọchịchọ na-ezighị ezi dị anyị n’obi. (Ọma 139:​23, 24) Ọ bụrụ na anyị arịọ Jehova maka ya, ọ ga-eji mmụọ nsọ ya mee ka anyị chọpụta echiche ma ọ bụ ọchịchọ ọjọọ anyị nwere. Anyị kwesịkwara ịrịọ Jehova ka o jiri mmụọ nsọ nye anyị ike iwepụ ya n’obi anyị. Anyị mee otú ahụ, Jehova ga-ahụ na anyị achọghị ime ihe ọ bụla ga-eme ka ọ kwụsị iji mmụọ nsọ ya na-enyere anyị aka.​—Efe. 4:30. w20.05 28-29 ¶10-12

Tọzdee, Septemba 8

Emewokwa m ka ha mara aha gị.​—Jọn 17:26.

Anyị na-eme ka Jizọs ma anyị na-agbachitere aha Jehova. Jizọs mere ka a mara aha Nna ya. Otú o si mee ya bụ na ọ na-akpọ Nna ya aha ya, na-akụzikwara ndị mmadụ ụdị onye Nna ya bụ. Dị ka ihe atụ, àgwà ya dị iche na nke ndị Farisii. Ndị Farisii na-eme ka o yie ka Jehova ọ̀ dị obi ọjọọ, na-achọ ka ụmụ mmadụ mee ihe ha na-agaghị emeli, nọrọ ha n’ebe dị anya, bụrụkwa onye obi kpọrọ nkụ. Ma Jizọs mere ka ndị mmadụ mara na Nna ya na-echebara ha echiche, na-enwere ha ndidi, hụ ha n’anya, na-agbagharakwa ha. Ihe ọzọkwa bụ na ọ na-akpa àgwà ka Nna ya n’ihe niile ọ na-eme n’ụbọchị. O si otú ahụ nyere ndị mmadụ aka ịmata Jehova. (Jọn 14:9) Dị ka Jizọs, anyị nwere ike ịna-agwa ndị mmadụ ihe anyị ma gbasara Jehova, na-akụziri ha na Chineke hụrụ ha n’anya, dịrịkwa obiọma. Anyị na-eme otú ahụ, anyị na-egosi na ihe ahụ Ekwensu na-ekwu gbasara Chineke abụghị eziokwu. Anyị na-eme ka aha Jehova dịrị nsọ, ma n’obi ndị mmadụ, jirikwa okwu ọnụ anyị na omume anyị na-egosi ndị mmadụ ụdị onye Jehova bụ. Anyị na-eme ka e wepụ aha Jehova n’ụta ma anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịmata ihe bụ́ eziokwu gbasara Chineke. w20.06 6 ¶17-18

Fraịdee, Septemba 9

Ka anyị ghara ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, na-akpali ịsọ mpi n’etiti onwe anyị, na-enwere ibe anyị anyaụfụ.​—Gal. 5:26.

E nwere ezigbo ihe anyị nwere ike iji ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet mee, dị ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị iji ya na-akparịta. Ma, ị̀ chọpụtala na ihe ndị mmadụ na-etinye n’ebe ahụ bụ ihe ndị ha ji eme ka ndị mmadụ na-enwe mmasị n’ebe ha nọ? O yiri ka hà ji ya eme ka ndị mmadụ mata na ha sokwa biri. Ụfọdụ na-ekwu ihe ndị na-adịghị mma gbasara foto ha ma ọ bụ nke ndị ọzọ tinyere. A gwara Ndị Kraịst ka ha dịrị umeala n’obi nakwa ka ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ha n’obi. N’ihi ya, ha ekwesịghị ime ụdị ihe ndị a n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet. (1 Pita 3:8) Ọ bụrụ na ị na-aga n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet, jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe ndị m na-ede, foto ma ọ bụ vidio ndị m na-etinye n’ebe ahụ, ọ̀ na-egosi na m na-ebuli onwe m elu? Ò nwere ike ime ka ndị ọzọ mewere m anyaụfụ? Ndị Kraịst ekwesịghị ịchọ ibuliwe onwe ha elu. Ha na-eme ihe Baịbụl kwuru e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị ghara ịna-ebuli onwe anyị elu ma ọ bụ na-achọ ime ka ndị mmadụ na-ewere anyị ka ndị dị mkpa.​—1 Jọn 2:16. w20.07 6 ¶14-15

Satọdee, Septemba 10

N’oge gara aga, abụ m onye nkwulu na onye mkpagbu na onye na-akparị mmadụ. Otú ọ dị, e meere m ebere, n’ihi na amaghị m ihe mgbe ahụ.​—1 Tim. 1:13.

Tupu Pọl onyeozi aghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst, ọ bụ nwa okorobịa na-akparị mmadụ, nakwa onye na-emegide ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 7:58) Jizọs kwụsịrị Pọl, bụ́ onye a ma dị ka Sọl mgbe ahụ, ịkpagbu ọgbakọ Ndị Kraịst. Jizọs si n’eluigwe gwa Pọl okwu ma mee ka o kpuo ìsì. Pọl gakwuuru ndị ahụ ọ na-akpagbubu ka ha nyere ya aka ka ọ hụwa ụzọ. O medakwara obi nabata aka onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Ananayas nyeere ya bụ́ onye mere ka ọ hụwa ụzọ. (Ọrụ 9:​3-9, 17, 18) Pọl mechara ghọọ onye a ma ama n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ma, o chefughị ihe Jizọs kụziiri ya n’ụzọ Damaskọs. Pọl nọgidere na-adị umeala n’obi. O jikwa obi ya niile nabata aka ụmụnna ya nyeere ya. O kwuru na ha bụ ndị ‘na-eme ka ya dị ike.’​—Kọl. 4:​10, 11. w20.07 18-19 ¶16-17

Sọnde, Septemba 11

Ọ dị Nna unu mma inye unu alaeze.​—Luk 12:32.

N’agbanyeghị na Jehova bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ na-enye ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ ka ha rụọ. Dị ka ihe atụ, ọ họpụtara Ọkpara ya ịbụ Eze nke Alaeze ya. Ọ ga-enyekwa otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ha na Jizọs ga-eso chịa ikike ụfọdụ. Jehova zụrụ Ọkpara ya ka ọ bụrụ Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà. (Hib. 5:​8, 9) Ọ zụkwara ndị ha na Jizọs ga-eso chịa ka ha nwee ike ịrụ ọrụ ha, ma, ọ naghị achọ ịgwa ha otú ha ga-esi na-arụ ya. Ọ tụkwasịrị ha obi na ha ga-eme uche ya. (Mkpu. 5:10) Ọ bụrụ na Nna anyị nke eluigwe bụ́ onye enyemaka mmadụ ọ bụla na-adịghị mkpa na-enye ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ, anyịnwa kwesịkwara ịna-eme otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ ma ọ bụ okenye n’ọgbakọ, na-enye ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ ka Jehova. Achọkwala ka ị na-agwa ha otú ha ga-esi na-arụ ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ka Jehova, ị ga-ahụ na ọrụ ga na-aga nke ọma, gị ana-azụ ndị ọzọ, meekwa ka obi sie ha ike n’ọrụ ha.​—Aịza. 41:10. w20.08 9, 10 ¶5-6

Mọnde, Septemba 12

Nwa nke mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ihe furu efu.​—Luk 19:10.

Olee otú Jehova chọrọ ka obi dịrị anyị maka atụrụ ya furu efu? Jizọs gosiri anyị ihe anyị kwesịrị ime. Ọ ma na Jehova ji atụrụ ya niile kpọrọ ihe. N’ihi ya, Jizọs mere ihe niile o nwere ike ime iji nyere “atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel” aka ịlọghachikwute Jehova. (Mat. 15:24) Jizọs bụ ezigbo onye ọzụzụ atụrụ. N’ihi ya, o mere ike ya niile ka atụrụ Jehova ọ bụla ghara ịkpafu. (Jọn 6:39) Pọl onyeozi gwara ndị okenye nọ n’ọgbakọ Efesọs ka ha na-eme ka Jizọs. Ọ gwara ha, sị: “Unu aghaghị inyere ndị na-adịghị ike aka, unu aghaghịkwa iburu okwu Onyenwe anyị Jizọs n’uche, mgbe ya onwe ya sịrị, ‘A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.’” (Ọrụ 20:​17, 35) Amaokwu a gosiri na ndị okenye nwere ọrụ dị mkpa n’ilekọta ndị Jehova. Otu okenye bi na Spen aha ya bụ Salvador kwuru, sị: “M chewe otú Jehova si were atụrụ ya kpafuru akpafu, ọ na-eme ka m chọkwuo inyere ha aka. Ama m na Jehova chọrọ ka m na-enyere ha aka.” w20.06 23 ¶15-16

Tuzdee, Septemba 13

Ihe mbụ niile agabigawo.​—Mkpu. 21:4.

Jehova ga-eji ndidi chere ruo mgbe Jizọs chịchara otu puku afọ tupu ya atụwa anya na anyị ga-ezu okè. Tupu mgbe ahụ, Jehova dị njikere ịgbaghara anyị mmehie anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-eme ka Jehova na-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-emeta ma na-enwere ha ndidi. Jizọs na ndị mmụọ ozi nwere obi ụtọ mgbe mbụ e kere ụwa. Chetụgodịnụ ụdị obi ụtọ ha ga-enwe ma ha hụ na ụwa a jupụtaziri ná ndị zuru okè hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya. Chee ụdị obi ụtọ ndị ahụ ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe ga-enwe ma ha hụ ka ọchịchị ha na-abara ndị mmadụ uru. (Mkpu. 4:​4, 9-11; 5:​9, 10) Cheekwa otú ọ ga-adị mgbe obi ụtọ ga-anọchi ákwá, mgbe ọrịa, iru uju, na ọnwụ na-agaghịzi adị ruo mgbe ebighị ebi. Ruo mgbe ihe ndị a ga-eme, kpebisie ike na ị ga na-eme ka Nna anyị hụrụ anyị n’anya, nwee amamihe, na-enwekwa ndidi. I mee otú ahụ, ị ga na-enwe obi ụtọ, n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara gị. (Jems 1:​2-4) Anyị nwere ezigbo obi ụtọ maka nkwa Jehova kwere anyị “na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ.”​—Ọrụ 24:15. w20.08 19 ¶18-19

Wenezdee, Septemba 14

A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.​—Mat. 24:14.

Baịbụl bụ onyinye magburu onwe ya Chineke nyere anyị. Nna anyị nke eluigwe nyere ndị dere ya mmụọ nsọ ka ha dee ya n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Jehova ji Baịbụl zaa anyị ajụjụ ndị kacha mkpa anyị nwere ike ịjụ, dị ka: Olee ebe anyị si bịa n’ụwa? Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ? nakwa Gịnị ka ọdịnihu anyị ga-abụ? Jehova chọrọ ka anyị niile mata azịza ajụjụ ndị a. Ọ bụ ya mere o ji mee ka a sụgharịa Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ. Taa, a sụgharịala akwụkwọ niile dị na ya ma ọ bụ akwụkwọ ụfọdụ dị na ya n’ihe karịrị puku asụsụ atọ. Baịbụl bụ akwụkwọ a kacha sụgharịa ma kesaa n’ụwa. Anyị nwere ike igosi na obi dị anyị ụtọ maka Baịbụl Chineke nyere anyị ma anyị na-agụ ya kwa ụbọchị, na-atụgharị uche n’ihe ọ na-akụzi ma na-eme ike anyị ime ihe anyị mụtara. Anyị na-egosikwa na obi dị anyị ụtọ ma anyị gbalịa zie ọtụtụ ndị ozi ọma gbasara Alaeze Chineke.​—Ọma 1:​1-3; Mat. 28:​19, 20. w20.05 24-25 ¶15-16

Tọzdee, Septemba 15

Okwu Jehova ghọrọ ihe na-ewetara m nkọcha na mkparị ogologo ụbọchị dum.​—Jere. 20:8.

O nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jeremaya onye amụma. Ndị ọ gara kwusaara ozi ọma egeghị ya ntị. Ha kọchara ya ma kparịa ya “ogologo ụbọchị dum.” (Jere. 20:​8, 9) Ọ dara mbà n’obi nke na ọ chọdịrị ịkwụsị ikwusa okwu Chineke. Ma, o meghị otú ahụ. N’ihi gịnị? “Okwu Jehova” dị ka ọkụ na-ere ere n’ime Jeremaya. O nweghịkwa ike idi ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ ga-adị anyị ma anyị na-amụ Baịbụl kwa ụbọchị ma na-echebara ya echiche. Ọ ga-eme ka anyị na-enwekwu ọṅụ, na-emekwukwa nke ọma n’ozi anyị. (Jere. 15:16) N’ihi ya, ị daa mbà n’obi, rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Ọ ga-enyere gị aka imezi ebe ndị ị na-anaghị emecha nke ọma, nyere gị aka n’ọrịa gị, nyekwara gị aka ịna-ele ọrụ ndị nọ n’ọgbakọ anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ ga-enyekwara gị aka ịna-ele ozi gị anya otú kwesịrị ekwesị. Kọọrọ Nna gị nke eluigwe ihe niile na-enye gị nsogbu n’obi. Jehova ga-enyere gị aka imeri ịda mbà n’obi. w20.12 27 ¶20-21

Fraịdee, Septemba 16

Na-emeso . . . ụmụ nwaanyị mere okenye dị ka ndị nne, na-emeso ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne gị ndị nwaanyị n’ịdị ọcha niile.​—1 Tim. 5:​1, 2.

Ọ bụ n’ọmụmụ ihe ka ụfọdụ ụmụnna nwaanyị na ụmụnna ha kacha anọrị. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ohere ahụ mee ka ahụ́ ruo ha ala, soro ha kwurịta okwu, meekwa ka ha mara na anyị na-eche banyere ha. Ka anyị ṅomie Jizọs, na-ewepụta oge ka anyị na ụmụnna anyị ndị nwaanyị na-anọrị. (Luk 10:​38-42) Anyị nwere ike ịkpọ ha ka ha bịa soro anyị rie nri n’ụlọ anyị ma ọ bụ ka ha soro anyị gaa tụrụ ndụ. N’oge ndị a, anyị kwesịrị ịna-agwa ha ihe ndị na-agba ume. (Rom 1:​11, 12) Ndị okenye kwesịrị ịna-eme ka Jizọs. Ọ ma na mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye agaghị adịrị ụfọdụ ndị mfe. Ma, o mere ka o doo anya na ịlụ di na nwunye ma ọ bụ ịmụ ụmụ abụghị ihe ga-eme ka mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ. (Luk 11:​27, 28) Kama nke ahụ, ihe ga-eme ka mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ onye ahụ ibute ihe gbasara ofufe Jehova ụzọ ná ndụ ya. (Mat. 19:12) Ndị okenye karịchaa kwesịrị ịna-emeso ụmụnna nwaanyị ihe dị ka ụmụnne ha ndị nwaanyị nakwa dị ka ndị nne ha. Ndị okenye kwesịrị iwepụta oge tupu ọmụmụ ihe amalite nakwa mgbe a gbasara ka ha na ụmụnna nwaanyị kwurịta okwu. w20.09 21-22 ¶7-9

Satọdee, Septemba 17

Onye ọrụ ubi na-echere mkpụrụ dị oké ọnụ ahịa . . . Unu onwe unu, nweenụ ndidi.​—Jems 5:​7, 8.

N’Izrel, onye ọrụ ugbo na-akụ mkpụrụ ya mgbe mmiri mbụ zochara, nke dabara n’etiti ọnwa Ọktoba. Ọ na-aghọrọkwa mkpụrụ ya mgbe mmiri kwụsịrị izo, nke dabara n’etiti ọnwa Eprel. (Mak 4:28) Ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi dị ka onye ọrụ ugbo ahụ, ọ ga-egosi na anyị ma ihe. Ma, ihe a nwere ike isiri anyị ike. Ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-achọkarị ka mbọ ha gbara rụpụta ihe ozugbo. Ma, anyị chọọ ka ubi anyị mepụta mkpụrụ anyị ga-aghọrọ, o nwere ihe ndị anyị kwesịrị ime, dị ka, ịkọ ya, ịkụ mkpụrụ na ya, na ịgba ya mmiri. Otú ahụ ka anyị kwesịkwara ịna-eme n’ọrụ ikwusa ozi ọma. Ọ ga-ewe oge tupu anyị emee ka ndị anyị na-ezi ozi ọma kwụsị ịkpa ókè ma hụwa ndị mmadụ n’anya. Inwe ndidi ga-eme ka ike ghara ịgwụ anyị ma ọ bụrụ na ndị mmadụ anaghị ege anyị ntị. Ọ bụrụkwa na e nwere ndị na-ege anyị ntị, anyị ka kwesịkwara ịna-enwe ndidi. Anyị agaghị amanyeli onye anyị na-amụrụ Baịbụl inwe okwukwe na Chineke. O nwedịrị oge ụfọdụ o siiri ndị na-eso ụzọ Jizọs ike ịghọta ihe Jizọs na-akụziri ha. (Jọn 14:9) Ka anyị cheta na anyị nwere ike ịkụ mkpụrụ ma gbaa ya mmiri, ma ọ bụ Chineke na-eme ka o too.​—1 Kọr. 3:6. w20.09 11 ¶10-11

Sọnde, Septemba 18

M ga-eji obi m dum too Jehova n’etiti ìgwè ndị na-akpachi anya bụ́ ndị ziri ezi nakwa n’ime nzukọ ha.​—Ọma 111:1.

Anyị niile chọrọ ka ndị anyị na-amụrụ ihe mechaa mee baptizim. Otu ụzọ anyị nwere ike isi nyere ha aka bụ ịgba ha ume ka ha na-abịa ọmụmụ ihe. Ndị a na-amụrụ Baịbụl bidoro ịbịa ọmụmụ ihe ozugbo na-akacha eme nke ọma. Ụfọdụ ndị na-agwa ndị ha na-amụrụ Baịbụl na e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha ga-amụta ma ha bịa ọmụmụ ihe anyị. Gụọnụ Ndị Hibru 10:​24, 25, kọwaakwara ya uru ịbịa ọmụmụ ihe ga-abara ya. Jiri obi ụtọ gwa ya ihe ị mụtara n’ọmụmụ ihe ị gara na nso nso a. Ọ ga-aka eme ka ọ chọwa ịbịa ọmụmụ ihe karịa naanị ịgwa ya ka ọ bịa. Ihe onye ị na-amụrụ ihe ga-ahụ n’ụbọchị mbụ ọ ga-abịa ọmụmụ ihe ga-akarị ihe ọ bụla ọ hụtụrụla n’okpukpe ndị ọzọ ọ gatụrụla. (1 Kọr. 14:​24, 25) Ọ ga-ahụ ụmụnna ndị ọzọ ọ ga-esi n’aka ha mụta ezigbo ihe. Ha ga-enyekwara ya aka ịna-eme nke ọma ma ruo eru ime baptizim. w20.10 10-11 ¶14-15

Mọnde, Septemba 19

Olee onye ozizi dị ka [Chineke]?​—Job 36:22.

Mmụọ nsọ ga-enyere gị aka ịma otú ị ga-esi eme ihe ndị ị mụtara n’Okwu Chineke. Kpee ụdị ekpere otu ọbụ abụ kpere. Ọ sịrị: “Jehova, biko, kụziere m ụzọ gị. M ga-eje ije n’eziokwu gị. Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.” (Ọma 86:11) N’ihi ya, nọgide na-amụ Baịbụl na ihe ndị nzukọ Jehova na-ewepụtara anyị. Ma, ihe mere i ji na-amụ ihe ndị a abụghị naanị ka ị mụta ihe. I kwesịkwara ime ka eziokwu bamie gị n’obi, na-emekwa ihe ị mụtara. Mmụọ nsọ Jehova ga-enyere gị aka ime ya. I kwesịkwara iji ihe ị mụtara na-agba ụmụnna gị ume. (Hib. 10:​24, 25) N’ihi gịnị? N’ihi na ha bụ ndị ezinụlọ anyị. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka isi n’obi gị na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe nakwa ka i mee ihe omume e nyere gị n’ụzọ kacha mma i nwere ike. I mee ihe ndị a, ị na-egosi Jehova na Ọkpara ya na ị hụrụ “atụrụ” ha n’anya. (Jọn 21:​15-17) N’ihi ya, na-esi n’ọtụtụ ihe Jehova ji akụziri anyị ihe na-amụta ihe. Ị ga-esi otú ahụ na-ege Onye Ozizi anyị kachanụ ntị. w20.10 24-25 ¶15-17

Tuzdee, Septemba 20

Ha niile wee hapụ ya gbaa ọsọ.​—Mak 14:50.

Olee otú Jizọs si mesoo ndịozi ya n’oge ahụ ha dara mbà n’ihi ụjọ? Obere oge a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu atụla egwu! Gaanụ kọọrọ ụmụnna m [na a kpọlitela m n’ọnwụ].” (Mat. 28:10a) Jizọs ahapụghị ndịozi ya. N’agbanyeghị na hanwa hapụrụ ya, ọ ka nọkwa na-akpọ ha “ụmụnna m.” Jizọs mere ka Jehova. O meere ha ebere ma gbaghara ha. (2 Eze 13:23) Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ihe banyere ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma na-emetụ anyị n’obi. Ha ka bụkwa ụmụnna anyị, anyị hụkwara ha n’anya. Anyị ka na-echeta ọrụ ha rụsiri ike maka Jehova n’oge ndị gara aga. Ụfọdụ n’ime ha rụsiri ọrụ ike ruo ọtụtụ afọ. (Hib. 6:10) Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ka ha lọghachi. (Luk 15:​4-7) N’ihi ya, na-agba ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma ume ka ha na-abịa ọmụmụ ihe. Ọ bụrụkwa na ha abịarute n’ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị kwesịrị ịnabata ha nke ọma. w20.11 6 ¶14-17

Wenezdee, Septemba 21

Unu agabigala ihe e dere ede.​—1 Kọr. 4:6.

Jems na Jọn na mama ha bịakwutere Jizọs gwa ya ka o mee ihe ike ya na-erughị ime. N’egbughị oge, Jizọs gwara ha na ọ bụ naanị Nna ya ka ọ dị n’aka ikpebi onye ga-anọ Jizọs n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe n’Alaeze. (Mat. 20:​20-23) Ihe a Jizọs mere gosiri na ọ ma ebe ike ya ruru, ọ chọghịkwa ịgafe ya. O nwetụghị mgbe o mere ihe Jehova na-enyeghị ya ikike ime. (Jọn 12:49) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ya? Anyị na-eme ka Jizọs ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Baịbụl kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke taa. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ achọọ ka anyị nye ya ndụmọdụ, anyị agaghị agwa ya ihe anyị chere ozugbo n’ebughị ụzọ chebara ya echiche. Kama, anyị ga-egosi ya ihe Baịbụl na ihe ndị e ji amụ Baịbụl kwuru gbasara ya. Anyị na-eme otú ahụ, anyị na-egosi na anyị ma ebe ike anyị ruru. Anyị na-egosikwa na anyị dị umeala n’obi n’ihi na anyị ghọtara na ndụmọdụ Jehova karịrị nke anyị.​—Mkpu. 15:​3, 4. w20.08 11 ¶14-15

Tọzdee, Septemba 22

Abụla onye ezi omume gabiga ókè, egosikwala na ị bụ onye maara ihe gabiga ókè. Gịnị mere ị ga-eji kpatara onwe gị mbibi?​—Ekli. 7:16.

Ọ bụrụ na i chere na ọ dị mkpa ka i nye enyi gị ndụmọdụ, olee ihe ndị i kwesịrị iburu n’uche? Tupu gị agakwuru ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Àbụ m “onye ezi omume gabiga ókè”?’ Onye bụ́ onye ezi omume gabiga ókè anaghị eji iwu Jehova ekpe mmadụ ikpe, kama ọ na-eji ihe o chere ekpe mmadụ ikpe. Ọ naghịkwa emere mmadụ ebere. I nyochaa onwe gị nke ọma ma chọpụta na ọ dị mkpa ka ị gwa enyi gị okwu, gwa ya ihe ahụ o mejọrọ hoo haa ma jụọ ya ajụjụ ndị ga-enyere ya aka ịghọta ihe ahụ o mejọrọ. Jide n’aka na ihe ị na-agwa ya gbakwasịrị ụkwụ n’Akwụkwọ Nsọ. Na-echetakwa na ọ bụghị gịnwa ka enyi gị ga-aza ajụjụ, kama ọ bụ Jehova. (Rom 14:10) Jiri ihe dị n’Okwu Chineke nyere ya aka. I nyewe mmadụ ndụmọdụ, ṅomie ọmịiko Jizọs. (Ilu 3:5; Mat. 12:20) Gịnị mere ihe a ji dị mkpa? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ otú anyị si mesoo ndị ọzọ ihe ka Jehova ga-esikwa emeso anyị ihe.​—Jems 2:13. w20.11 21 ¶13

Fraịdee, Septemba 23

Kwụsịnụ ile mmadụ anya n’ihu wee na-ekpe ikpe, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.​—Jọn 7:24.

Ị̀ ga-achọ ka ndị mmadụ jiri ụcha gị, otú ihu gị dị, ma ọ bụkwanụ otú ị hà na-ekpebi ụdị onye ị bụ? O nwere ike ị gaghị achọ. Ọ na-akasi anyị obi ịmara na Jehova anaghị eji ihe anya na-ahụ ekpebi ụdị mmadụ anyị bụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Samuel hụrụ ụmụ Jesi, ọ hụghị ihe Jehova hụrụ. Jehova gwara Samuel na otu n’ime ụmụ Jesi ndị nwoke ga-abụ eze Izrel. Ma, ònye ka ọ ga-abụ? Mgbe Samuel hụrụ ọkpara Jesi bụ́ Elayab, ọ sịrị: “N’ezie, onye Jehova tere mmanụ guzo n’ihu ya.” Otú Elayab dị mere ka Samuel chee na ọ bụ ya ga-abụ eze. “Ma Jehova sịrị Samuel: ‘Elela anya n’ọdịdị ya na ogo ya, n’ihi na ajụwo m ya.’ ” Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe a? Jehova gwaziri ya, sị: “Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.” (Sam. 16:​1, 6, 7) Anyị kwesịrị ịna-eme ka Jehova ma anyị mesowe ụmụnna anyị ihe. w20.04 14 ¶1; 15 ¶3

Satọdee, Septemba 24

Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.​—Jọn 4:35.

Jizọs nọ na-agafe n’ubi a kụrụ ọka. O nwere ike ịbụ na ọka ndị ahụ ka na-eto eto. (Jọn 4:​3-6) Ọ bụ n’ihe dị ka ọnwa anọ na-abịa abịa ka a ga-aghọrọ ọka ndị ahụ. Jizọs kwuru ihe nwere ike ịgbagwoju ndị nọ ebe ahụ anya. Ọ sịrị: “Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.” (Jọn 4:​35, 36) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? O doro anya na Jizọs na-ekwu gbasara ịkpọkọta ndị mmadụ, ọ bụghị iwere ihe ubi. Chegodị gbasara ihe ka mepụrụnụ. N’agbanyeghị na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe, Jizọs ziri nwaanyị Sameria ozi ọma, ya egee ntị. Ka Jizọs nọ na-ekwu gbasara ubi nke ihe a kụrụ na ya ‘chara maka owuwe ihe ubi,’ ọtụtụ ndị Sameria, bụ́ ndị si n’ọnụ nwaanyị ahụ nụ gbasara Jizọs, nọ n’ụzọ na-abịa ịmụtakwu ihe n’aka ya. (Jọn 4:​9, 39-42) Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru gbasara ihe a, sị: “Otú ndị ahụ si bịakwute Jizọs ozugbo . . . gosiri na ha dị ka ọka karala aka na-eche ka a ghọrọ ya.” w20.04 8 ¶1-2

Sọnde, Septemba 25

Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.​—Hib. 10:24.

Ọmụmụ ihe anyị na-enyere anyị aka ịmụta otú e si ekwusa ozi ọma nke ọma. Dị ka ihe atụ, n’ọmụmụ ihe, a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-eji ihe ndị dị n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe akụzi ihe nke ọma. N’ihi ya, na-akwadebe ọmụmụ ihe nke ọma. Na-ege ntị nke ọma n’ọmụmụ ihe. Egbula oge ime ihe ị mụtara n’ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ị ga-abụ “ezi onye agha nke Kraịst Jizọs.” (2 Tim. 2:3) Ndị ọzọ na-enyere anyị aka bụ ìgwè ndị mmụọ ozi dị ike. Chegodị ihe otu mmụọ ozi nwere ike ime. (Aịza. 37:36) Chezie ihe ìgwè ndị mmụọ ozi ga-emeli. O nweghị mmadụ ma ọ bụ mmụọ ọjọọ dị ike ka ndị agha Jehova. Onye Jehova nọnyeere ka ndị iro ya ike n’agbanyeghị ole ha dị. (Ikpe 6:16) Ihe a bụ eziokwu. Na-echeta ihe ndị a mgbe ọ bụla onye ọrụ ibe gị, nwa akwụkwọ ibe gị ma ọ bụ onye ikwu gị na-abụghị Onyeàmà Jehova na-eyi gị egwu. Cheta na ọ bụghị naanị gị na-alụ ọgụ a. Ebe ọ bụ ihe Jehova kwuru ka ị na-eme, ọ ga-anọnyere gị. w21.03 29 ¶13-14

Mọnde, Septemba 26

Ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, “ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.”​—1 Kọr. 15:32.

O nwere ike ịbụ na Pọl onyeozi na-ekwu ihe dị n’Aịzaya 22:​13, bụ́ ebe kwuru gbasara àgwà ụmụ Izrel na-akpa. Kama ime ka ha na Chineke dịrị ná mma, ihe bụ́ mkpa ha bụ ikpori ndụ. Echiche ha nwere bụ na ha kwesịrị ikpori ndụ ugbu a n’ihi na ọnwụ nwere ike ịbịa mgbe ọ bụla. Ọ bụkwa ụdị echiche a ka ọtụtụ ndị nwere taa. Ebe anyị ma na Jehova ga-akpolite ndị nwụrụ anwụ, o kwesịrị ime ka anyị mara ụdị ndị anyị na ha ga-abụ enyi. Ụmụnna nọ na Kọrịnt ekwedịghị iso ndị na-ekweghị ná mbilite n’ọnwụ na-akpa. Ihe a na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị imeta ndị nwere echiche ka anyị rie taa nwụọ echi enyi. Iso ụdị ndị ahụ na-akpa nwere ike ime ka Onye Kraịst nwewe echiche na-ezighị ezi ma ọ bụ kwụsị ịkpa ezi àgwà. O nwedịrị ike ime ka onye ahụ bido mewe mmehie. N’ihi ya, Pọl dọsiri anyị aka ná ntị ike, sị: “Meenụ ka uche unu zuo okè n’ụzọ ezi omume, unu anọkwala na-eme mmehie.”​—1 Kọr. 15:​33, 34. w20.12 9 ¶3, 5-6

Tuzdee, Septemba 27

Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwaanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.​—1 Kọr. 11:3.

Amaokwu a kọwara otú Jehova si hazie ezinụlọ ya ma n’eluigwe ma n’ụwa. Ihe abụọ ya na ịbụ onyeisi so bụ ikike e nyere mmadụ na ịza ajụjụ ihe e ji ikike ahụ mee. Jehova bụ “isi” ma ọ bụ onye nwe ikike kachanụ. Ụmụ ya niile, ma ndị mmụọ ozi ma ụmụ mmadụ, ga-aza ya ajụjụ ihe ha ji ikike o nyere ha mee. (Rom 14:10; Efe. 3:​14, 15) Jehova mere Jizọs onyeisi ọgbakọ. Ma, Jizọs ga-aza Jehova ajụjụ otú o si meso ha. (1 Kọr. 15:27) Jehova mere ndị di isi nke nwunye ha na ụmụ ha. Oleezi otú nwoke ga-esi amụta ịbụ ezigbo onyeisi ezinụlọ? O kwesịrị ibu ụzọ ghọta ihe Jehova chọrọ ya n’aka. O kwesịkwara ịma ihe mere Jehova ji mee ndị ụfọdụ ndị isi nakwa otú ọ ga-esi eṅomi Jehova na Jizọs. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka nwoke mata ihe ndị a? Ọ bụ n’ihi na Jehova nyere ndị isi ezinụlọ ikike ụfọdụ, ọ chọkwara ka ha jiri ya mee ihe kwesịrị ekwesị.​—Luk 12:48b. w21.02 2 ¶1-3

Wenezdee, Septemba 28

Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.​—Aịza. 48:17.

Anyị kwesịrị ịna-echefu ihe ụfọdụ otú ahụ Jehova na-eme. Dị ka ihe atụ, o nweghị onye na-echeta ihe karịa Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na anyị emejọọ ya ma chegharịa, ọ na-agbaghara anyị ma chefuo ihe ahụ anyị mejọrọ. (Ọma 25:7; 130:​3, 4) Ọ chọkwara ka anyị na-emekwa otú ahụ ma ndị ọzọ mejọọ anyị ma gosi na ihe ha mere wutere ha. (Mat. 6:14; Luk 17:​3, 4) Anyị nwere ike iji ụbụrụ anyị bụ́ onyinye magburu onwe ya Jehova nyere anyị mee ka e too ya, si otú ahụ gosi na obi dị anyị ụtọ. Ụfọdụ ndị na-eji ụbụrụ ha eme ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Ha na-eji ya ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, ebe ọ bụ Jehova kere anyị, o doro anya na ihe ọ bụla o kpebiri ga-aka mma karịa ihe anyị ga-ekpebiri onwe anyị. (Rom 12:​1, 2) Ọ bụrụ na anyị erubere ya isi, anyị ga-enwe udo. (Aịzaya 48:18) Ọ ga-emekwa ka anyị mata ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme ná ndụ anyị, ya bụ, ime ka e too ya ma mee ya obi ụtọ.​—Ilu 27:11. w20.05 23-24 ¶13-14

Tọzdee, Septemba 29

Na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ.​—Rom 12:10.

Olee otú anyị nwere ike isi na-enwere ụmụnna anyị ọmịiko taa? Ọ bụrụ na anyị amatakwuo ụmụnna anyị, o nwere ike ime ka ọ dịrị anyị mfe ịna-aghọta ha ma na-enwere ha ọmịiko. Ebe mmadụ si ma ọ bụ afọ ole ọ dị ekwesịghị ime ka anyị na ya ghara ịbụ enyi. Cheta na Jọnatan ji ihe dị ka afọ iri atọ tọ Devid. Ma ha abụọ ghọrọ ezigbo enyi. È nwere onye tọrọ gị ma ọ bụ onye ị tọrọ nọ n’ọgbakọ unu ì nwere ike imeta enyi? Anyị mee otú ahụ, anyị na-egosi na anyị hụrụ “òtù ụmụnna dum n’anya.” (1 Pita 2:17) Inwere ụmụnna anyị ọmịiko ọ̀ pụtara na otú anyị na ha niile ga-esi adị ná mma ga-aha otu? Mba. Ọ gaghị ekwe omume. Ọ dịghị njọ anyị na ụfọdụ ụmụnna anyị ịdị ná mma karịa ndị ọzọ n’ihi na ihe na-amasị ha na-amasị anyị. Jizọs na-akpọ ndịozi ya niile ndị enyi ya, ma ọ bụ Jọn ka ọ kacha hụ n’anya. (Jọn 13:23; 15:15; 20:2) Ma Jizọs anaghị emelara Jọn ihe.​—Mak 10:​35-40. w21.01 23 ¶12-13

Fraịdee, Septemba 30

O yiri ka ùnu na-ekpere chi dị iche iche karịa ndị ọzọ.​—Ọrụ 17:22.

Otú Pọl onyeozi si zie ndị Jentaịl nọ n’Atens ozi ọma dị iche n’otú o si zie ndị Juu nọ n’ụlọ nzukọ ozi ọma. O leruru anya n’ihe na-eme gburugburu ya, chọpụtakwa ihe ndị ha na-eme n’okpukpe ha. (Ọrụ 17:23) Ihe ọzọ Pọl mere bụ na o ji ihe ha kweere zie ha ozi ọma. Pọl dị njikere ịgbanwe otú o si ekwusa ozi ọma. Ọ gwara ndị Atens na ozi ọma ọ na-ekwusa si n’aka “Chi [ahụ] A Na-amaghị Ama” ha na-agbalị ife kemgbe. N’agbanyeghị na ndị Jentaịl amaghị Akwụkwọ Nsọ, Pọl akwụsịghị izi ha ozi ọma. Kama nke ahụ, o weere ha ka ọka kara aka na-eche ka a ghọrọ ya. Ọ bụ ya mere o ji zie ha ozi ọma otú ọ ga-amasị ha. Na-eleru anya ala ka Pọl. Leruo anya ka ị hụ ihe ndị ga-enyere gị aka ịmata ihe ndị ị na-ezi ozi ọma kweere. Olee ihe ndị ị hụrụ n’ihu ụlọ onye ị chọrọ izi ozi ọma ga-enyere gị aka ịmata gbasara ya? Aha ya, ejiji ya, ma ọ bụ otú o si ekwu okwu, ò mere ka ị mata okpukpe ya? w20.04 9-10 ¶7-8

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya