Nọvemba
Wenezdee, Nọvemba 1
Jehova ga-akụziri ha niile ihe.—Jọn 6:45.
E nweela ọtụtụ ụzọ Jehova si nyere anyị aka. O meela ka obi na-eru gị ala ma mgbe a na-akpagbu gị n’ozi ọma. O nyerela gị aka icheta amaokwu Baịbụl dabara adaba ị ga-agụrụ onye nwere mmasị. O nyekwala gị ike ị ga-eji nọgide na-ezi ozi ọma n’agbanyeghị na e nwere ndị na-achọghị ige gị ntị. (Jere. 20:7-9) Otú ọzọ Jehova si gosi anyị ịdị mma ya bụ ịzụ anyị maka ozi ọma. N’ọmụmụ ihe etiti izu anyị, anyị na-ele vidio ndị na-enyere anyị aka ịmụta otú e si ezi ozi ọma. A gbakwara anyị ume ka anyị na-esi otú ahụ na-ezi ozi ọma. Na mbụ, ụjọ nwere ike ịna-atụ anyị isi ụzọ ọhụrụ zie ozi ọma. Ma, ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị nwere ike ịchọpụta na ọ na-amasị ndị anyị na-ezi ozi ọma. N’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ ndị anyị na-aga, a na-agba anyị ume isi ụzọ ndị nwere ike ịdị iche n’ụzọ ndị anyị sibu ezi ozi ọma na-ezi ozi ọma. Ime ihe a nwere ike ghara ịdịchara anyị mfe. Ma ọ bụrụ na anyị emee ha, Jehova ga-agọzi anyị. w21.08 27 ¶5-6
Tọzdee, Nọvemba 2
Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa, n’ihi na oge a anyị bi na ya jọrọ njọ.—Efe. 5:16.
N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Kọrịnt, ọ dọsiri ha aka ná ntị ike. Mgbe o dechara akwụkwọ ozi ahụ, o zigaara ha Taịtọs. Ihe mere o ji mee ya bụ na ọ chọrọ ịma otú obi dị ha mgbe ha natara akwụkwọ ozi ahụ. Obi tọkwara ya ezigbo ụtọ mgbe ọ nụrụ na ha nabatara ndụmọdụ o nyere ha. (2 Kọr. 7:6, 7) Ndị okenye nwere ike ime ka Pọl ma ọ bụrụ na ha ana-ewepụta oge ka ha na ụmụnna ha na-anọrị. Otu ụzọ ha nwere ike isi eme ya bụ ịna-abịa ọmụmụ ihe n’oge ka ha nwee ike ịna-agba ụmụnna ha ume. Nkeji ole na ole nwere ike izu iji gbaa nwanna ume. (Rom 1:12) Okenye na-eme ka Pọl na-eji Okwu Chineke eme ka okwukwe ụmụnna ya sie ike, na-emekwa ka obi sie ha ike na Jehova hụrụ ha n’anya. Ọ na-achọkwa ohere ndị ọ ga-eji jaa ha mma maka ebe ndị ha na-eme nke ọma. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka okenye nye ndụmọdụ, ọ na-agba mbọ hụ na ndụmọdụ ya si n’Okwu Chineke. Ọ naghị ezo ọnụ. Ma ọ na-eji obiọma enye ndụmọdụ n’ihi na ọ hụrụ ụmụnna ya n’anya, chọọkwa ka ha mee ihe ọ gwara ha.—Gal. 6:1. w22.03 28-29 ¶11-12
Fraịdee, Nọvemba 3
Anyị nwere akụ̀ a n’arịa e ji ụrọ kpụọ, ka ike karịrị ike nkịtị wee bụrụ nke Chineke, n’abụghịkwa nke si n’aka anyị onwe anyị.—2 Kọr. 4:7.
Taa, Jehova na-enye ndị ya “ike karịrị ike nkịtị” ka ha nwee ike ịnọgide na-ejere ya ozi. Otu ụzọ Jehova si eme ka anyị nweta ike bụ ekpere. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 6:18, Pọl onyeozi gbara anyị ume ka anyị ‘nọgide n’ekpere.’ Chineke ga-aza ekpere anyị ma nye anyị ike. Mgbe ụfọdụ, nsogbu nwere ike izu anyị ahụ́ ma ọ bụkwanụ anyị agaghị ama ihe anyị ga-ekpe n’ekpere. Ma, Jehova chọrọ ka anyị kpee ekpere ọ bụrụgodị na anyị amaghị otú anyị ga-esi agwa ya otú o si dịrị anyị n’obi. (Rom 8:26, 27) Ọ na-ejikwa Baịbụl eme ka anyị dị ike. Pọl gụrụ Okwu Chineke iji nweta ike na nkasi obi. Anyịnwa kwesịkwara ime otú ahụ. (Rom 15:4) Ka anyị na-agụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya, Jehova nwere ike iji mmụọ nsọ ya mee ka anyị ghọta otú ihe anyị gụrụ nwere ike isi nyere anyị aka ná nsogbu anyị.—Hib. 4:12. w21.05 22 ¶8-10
Satọdee, Nọvemba 4
Chineke na-enye unu ume . . . Ọ na-eme ka unu nwee mmasị ime ihe, na-enyekwa unu ike unu ji eme ya.—Fil. 2:13.
Anyị nwere ike ịrụ ọrụ a Chineke nyere anyị ịkụziri ndị mmadụ ihe n’agbanyeghị na anyị na nsogbu ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ime ndị na-eso ụzọ na-alụ. Otú ihe si dịrị anyị nwere ike ime ka anyị ghara imecha otú anyị chọrọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụnna anyị emeela agadi ma ọ bụkwanụ na-arịa ọrịa. Ọ̀ bụ otú a ka ọ dị gịnwa? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị achọpụtala na anyị nwere ike iji ekwentị ma ọ bụ siri n’Ịntanet duziere ndị mmadụ ọmụmụ ihe. N’ihi ya, i nwere ike ịnọ n’ụlọ gị malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl ma na-amụrụ ya ihe. O nwekwara uru ọzọ isi otú a ezi ozi ọma bara. Ụfọdụ ndị chọrọ ịmụ Baịbụl, ma, ha anaghị anọ ya n’oge ụmụnna anyị ji aga ozi ọma. Ha nwere ike ịnọ ya n’isi ụtụtụ ma ọ bụkwanụ n’abalị. Ì nwere ike iwepụta ohere mụọrọ ha ihe mgbe ahụ? Jizọs kụziiri Nikọdimọs ihe n’abalị, bụ́ oge kaara Nikọdimọs mma.—Jọn 3:1, 2. w21.07 5 ¶10-11
Sọnde, Nọvemba 5
Ọ bụ n’ọnụ ka ndị a bịakwuteworo m, ọ bụkwa naanị egbugbere ọnụ ha ka ha ji nye m otuto, ha emewo ka obi ha dị anya n’ebe m nọ.—Aịza. 29:13.
Ọ gbagwojuru ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim anya na ndị na-eso ụzọ Jizọs anaghị ebu ọnụ. Jizọs kọwaara ha na ọ dịghị mkpa ka ha na-ebu ọnụ ebe ọ bụ na ya ka dị ndụ. (Mat. 9:14-17) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ndị Farisii na ọtụtụ ndị na-emegide Jizọs katọrọ ya n’ihi na ọ naghị eso ọtụtụ omenala ha. Iwe were ha mgbe ọ gwọrọ ndị ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike. (Mak 3:1-6; Jọn 9:16) Ha kwuru na ha na-edebe Ụbọchị Izu Ike, ma o nweghị nsogbu ha hụrụ n’ịzụ ahịa n’ụlọ nsọ. O were ha ezigbo iwe mgbe Jizọs katọrọ ihe ahụ ha na-eme. (Mat. 21:12, 13, 15) Iwe were ndị Jizọs ziri ozi ọma n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret mgbe Jizọs kọọrọ ha ihe ụfọdụ mere n’Izrel iji gosi na ha bụ ndị na-achọkarị ọdịmma onwe ha na ndị na-enweghị okwukwe. (Luk 4:16, 25-30) Ihe ndị a Jizọs mere ndị mmadụ na-atụghị anya ha mere ka ha sụọ ngọngọ.—Mat. 11:16-19. w21.05 5 ¶13-14
Mọnde, Nọvemba 6
Anyị ma otú o si anwata ndị mmadụ.—2 Kọr. 2:11.
Otu ụzọ Jehova si adọ anyị aka ná ntị ka anyị zere mpako na anyaukwu bụ ịgba anyị ume ka anyị mụta ihe n’ihe ndị mere ndị ọzọ. E kwuwe okwu anyaukwu, o nwere ike ịbụ Setan bụ́ Ekwensu na-agbatakarị anyị n’obi. Mgbe ọ bụ mmụọ ozi Jehova, ọ ga-abụ na e nwere ọtụtụ ọrụ Jehova nyere ya. Ma, nke ahụ ezughịrị ya. Ọ chọrọ ka e fewe ya ofufe ruuru naanị Jehova. Setan chọrọ ka anyị dịrị ka ya. N’ihi ya, ọ na-agbalị ime ka ihe anyị nwere ghara iju anyị afọ. Ọ malitere ime ihe a mgbe ọ nwara Iv. Jehova nyere Iv na di ya ọtụtụ ihe oriri na-atọ ezigbo ụtọ, ya bụ, “mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi” ahụ, e wepụ otu. (Jen. 2:16) N’agbanyeghị nke ahụ, Setan ghọgburu Iv ma mee ka o chee na naanị ihe ga-eme ka obi dị ya mma bụ ma o rie mkpụrụ osisi ahụ Chineke sị ha erila. Ihe Iv nwere ejughị ya afọ. Anyị ma ihe nke ahụ kpatara. Iv mere mmehie, mechaakwa nwụọ.—Jen. 3:6, 19. w21.06 14 ¶2-3; 17 ¶9
Tuzdee, Nọvemba 7
Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, junụ n’ụwa, na-elekọtakwanụ ya.—Jen. 1:28.
Jehova chọrọ ka Adam na Iv mụọ ụmụ, chọọkwa ka ha lekọta ụwa a nke ọma. Ọ bụrụ na ha rubeere Jehova isi ma mee ihe ọ chọrọ ka ha mee, ha na ụmụ ha gaara abụ ndị ezinụlọ Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Adam na Iv bara uru n’ezinụlọ Jehova. N’Abụ Ọma 8:5, Devid kwuru gbasara mmadụ, sị: “I mere ka ndị mmụọ ozi katụ ya. I ji ebube na ùgwù chọọ ya mma.” Nke bụ́ eziokwu bụ na e nyeghị ụmụ mmadụ ụdị ikike na amamihe e nyere ndị mmụọ ozi. (Ọma 103:20) Ma, ihe Baịbụl kwuru gosiri na ndị mmụọ ozi ji obere ihe ka ụmụ mmadụ. Ma, ọ dị mwute na Adam na Iv anọgideghị n’ezinụlọ Jehova. Ihe a kpara ụmụ ha aka ọjọọ. Ma, nzube Jehova agbanwebeghị. Ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ na-erubere ya isi bụrụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi. w21.08 2-3 ¶2-4
Wenezdee, Nọvemba 8
“Ọ bụghị ìgwè ndị agha ga-eme ihe ndị a, ọ bụghịkwa ike mmadụ, kama ọ bụ mmụọ m ga-eme ha.” Ọ bụ ihe Jehova. . . . kwuru.—Zek. 4:6.
Taa, a na-akpagbu ọtụtụ ndị na-efe Jehova. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị bi n’ebe ndị ọchịchị machiri anyị ịrụ ọrụ anyị, e nwekwara ike ịnwụchi ụmụnna anyị ma ‘kpụga ha n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze.’ Ọ ga-abụkwara ha àmà. (Mat. 10:17, 18) Otú e si emegide ụmụnna anyị ndị ọzọ dịkwa iche. Ụfọdụ bi n’obodo ndị ọchịchị na-amachighị ha ife Jehova, mana ndị ezinụlọ ha ekpebisie ike na ha ga-eme ka ha kwụsị ife Chineke. (Mat. 10:32-36) Ọtụtụ mgbe, ọ bụrụ na ndị ezinụlọ ụmụnna ndị a na-akpagbu ha achọpụta na mbọ ha na-agba ịkwụsị ụmụnna anyị ife Jehova akụọla afọ n’ala, ha na-akwụsị ịkpagbu ha. E nwedịrị ụfọdụ ndị na-akpagbubu ndị ezinụlọ ha mechara ghọọ Ndịàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi. Ọ bụrụ na a na-akpagbu gị, adala mbà. Nwee obi ike. Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya dị ike na-akwado gị. N’ihi ya, i kwesịghị ịtụ ụjọ. w22.03 16 ¶8
Tọzdee, Nọvemba 9
Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.—Ọma 97:10.
Baịbụl kwuru na Jehova kpọrọ ‘mpako, ịgha ụgha, na igbu onye aka ya dị ọcha’ asị. (Ilu 6:16, 17) Ọ kpọkwara “ndị tigbuo zọgbuo na ndị na-aghọ aghụghọ asị.” (Ọma 5:6) Jehova kpọrọ àgwà ọjọọ ndị a asị nke na o ji maka ya bibie ndị niile na-eme ha n’oge Noa n’ihi na ha mere ka tigbuo zọgbuo ju n’ụwa. (Jen. 6:13) Jehova sikwa n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Malakaị kwuo na ọ kpọrọ onye ọ bụla ji aghụghọ gbaa nwunye ya aka ya dị ọcha alụkwaghịm asị. Jehova anaghị anabata ofufe ha na-efe ya. Ha ga-azakwa ya ajụjụ maka ihe ha mere. (Mal. 2:13-16; Hib. 13:4) Jehova chọrọ ka anyị ‘kpọọ ihe ọjọọ asị.’ (Rom 12:9) Ọ pụtara na ọ chọrọ ka ihe ọjọọ na-asọ anyị oyi, ka anyị ghara inwe mmasị na ya chaa chaa. N’ihi ya, ichetụdị echiche ime ihe Jehova kpọrọ asị kwesịrị ịna-asọ anyị oyi. w22.03 4-5 ¶11-12
Fraịdee, Nọvemba 10
Ndị niile na-atụ anya ya na-enwe obi ụtọ.—Aịza. 30:18.
N’oge na-adịghị anya, Nna anyị nke eluigwe ga-agọzi anyị n’Alaeze ya. Ndị na-echere Jehova ga-enweta ọtụtụ ngọzi ma ugbu a ma n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ. Mgbe ndị Chineke ga-aba n’ụwa ọhụrụ, nsogbu na nchegbu ha na ya na-alụ taa agaghịzi adị. Ikpe na-ezighị ezi na ihe mgbu ga-ala ka naị. (Mkpu. 21:4) O nweghịzi ihe ọ bụla ga na-echegbu anyị n’ihi na anyị ga-enwe ihe niile n’uju. (Ọma 72:16; Aịza. 54:13) Ihe a ga-amagbu nnọọ onwe ya. Jehova na-akwadebe anyị ugbu a ka anyị nwee ike ibi n’ụwa ọhụrụ ya. Otú o si eme ya bụ inyere anyị aka imeri nsogbu ndị na-abịara anyị, ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị anyị nwere, nakwa ịmalite kpawa àgwà ndị na-amasị ya. Adala mbà, akwụsịkwala ife Jehova. Ndụ kacha mma ka dị n’ihu. Ka anyị na-ele anya ka ihe ndị a magburu onwe ha mee n’ọdịnihu, ka anyị jiri obi ụtọ jiri ndidi na-eche ka Jehova mee ihe ndị o kwuru na ọ ga-eme. w21.08 13 ¶17-19
Satọdee, Nọvemba 11
Unu echefukwala ịna-eme ihe ọma na ịna-enye ndị ọzọ ihe n’ihi na ụdị àjà ndị a na-adị Chineke ezigbo mma.—Hib. 13:16.
Ọ dịghị anya Ndị Kraịst nọ na Judia nwetachara akwụkwọ ozi a ha ahapụ ụlọ ha, ihe ha ji akpa afọ ha, na ndị ikwu ha na-abụghị Ndị Kraịst “malite ịgbaga n’ugwu.” (Mat. 24:16) N’oge ahụ, ọ dị ezigbo mkpa ka ha na-enyere ibe ha aka. Ọ bụrụ na ha na-eji ihe ndị ha nwere na-enyere ibe ha aka tupu ha agbapụ, ọ gaghị esiri ha ike ịna-eme ya n’ebe ọhụrụ ahụ ha gbagara. Ọ bụghị mgbe niile ka ụmụnna anyị ga-agwa anyị ihe ndị dị ha mkpa. N’ihi ya, mee ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịgwa gị ka i nyere ha aka. O doro anya na ị ma ụmụnna nọ n’ọgbakọ unu dị njikere inyere ndị ọzọ aka. Ha anaghị eme ka anyị chee na anyị na-enye ha nsogbu. Anyị ma na ha ga-adị njikere inyere anyị aka mgbe ọ bụla. Anyị chọkwara ịna-eme ka ha. w22.02 23-24 ¶13-15
Sọnde, Nọvemba 12
Ka unu na-adị n’otu otú mmụọ nsọ mere ka unu dịrị.—Efe. 4:3.
N’oge na-adịbeghị anya, a hazigharịrị ọgbakọ na sekit dị iche iche. Ọ bụrụ na a sị anyị gafee n’ọgbakọ ọzọ, o nwere ike isitụrụ anyị ike ịhapụ ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị. Ọ̀ bụ mmụọ nsọ Chineke na-agwa ndị okenye ebe ha ga-eziga onye nkwusa ọ bụla? Mba. Iche banyere ihe a nwere ike ime ka o sitụrụ anyị ike ime ihe ha gwara anyị. Ma, Jehova tụkwasịrị ndị okenye obi na ha ga-ekpebi ihe dị mma. Anyị kwesịkwara ịtụkwasị ha obi. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-erubere ndị okenye isi ọ bụrụgodị na ihe ha sịrị anyị mee abụghị ihe anyị gaara achọ ime? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na anyị emee ya, ọ ga-eme ka ndị Chineke na-adị n’otu. Ihe na-aga nke ọma n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ndị niile nọ n’ọgbakọ ejiri obi umeala na-erube isi n’ihe ndị okenye kwuru. (Hib. 13:17) Ihe kadị mkpa bụ na irubere ndị Jehova họpụtara ka ha na-elekọta anyị isi ga-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi.—Ọrụ 20:28. w22.02 4-5 ¶9-10
Mọnde, Nọvemba 13
Na-agbasi mbọ ike n’ịgụpụta ihe n’ihu ọha, n’ịdụ ndị ọzọ ọdụ, nakwa n’izi ihe.—1 Tim. 4:13.
Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke mere baptizim, i nwere ike ịgba mbọ ka otú i si ekwu okwu na otú i si akụzi ihe kakwuo mma. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na ‘obi gị niile’ adịrị n’ịgụ ihe, n’ikwu okwu, na n’ịkụzi ihe, ọ ga-abara ndị na-ege gị ntị uru. (1 Tim. 4:15) Gbaa mbọ ka ị gụọ ma mee ihe ndị e kwuru na broshọ bụ́ Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe. Mụọ otu n’ime ha n’otu oge. Gbaa mbọ ka i mee ya n’onwe gị n’ụlọ. Gbaakwa mbọ ka i mee ihe e kwuru ebe ahụ n’oge ọzọ ị ga-ekwu okwu n’ọmụmụ ihe. Gakwuru onye na-enye ndụmọdụ ma ọ bụkwanụ okenye ọzọ “na-agbasi mbọ ike n’ikwu okwu na n’ịkụzi ihe.” (1 Tim. 5:17) Ihe ị ga-eme abụghị naanị ịmata otú e si akụzi ihe, kama, otú e si enyere ndị na-ege ntị aka ka okwukwe ha sikwuo ike, nakwa otú ị ga-esi eme ka ndị na-ege gị ntị mee ihe ị na-ekwu. I mee otú ahụ, ma gị ma hanwa ga-enwekwu ọṅụ. w21.08 24 ¶17
Tuzdee, Nọvemba 14
Dịrịnụ umeala n’obi, na-ewerekwanụ na ndị ọzọ ka unu.—Fil. 2:3.
Ọ bụrụ na anyị ana-ewere na ndị ọzọ ka anyị, anyị na ndị nwere nkà karịa anyị agaghị na-ama aka. Kama nke ahụ, obi ga-adị anyị ụtọ maka ya, karịchaa, ma ọ bụrụ na ha ji nkà ndị ahụ na-efe Jehova. Ihe a ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’udo, dịrịkwa n’otu. Anyị agaghị na-emere ndị ọzọ anyaụfụ ma ọ bụrụ na anyị amara ebe ike anyị ruru. Ọ bụrụ na anyị ma ebe ike anyị ruru, anyị agaghị na-achọ igosi na anyị ka onye ọ bụla ọzọ nwee nkà ma ọ bụkwanụ na anyị ka ndị ọzọ mma. Kama nke ahụ, anyị ga na-achọ otú anyị ga-esi mụta ihe n’aka ndị nwere nkà karịa anyị. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na otu nwanna nọ n’ọgbakọ bụ ọkà n’ikwu okwu ihu ọha, anyị nwere ike ịjụ ya otú o si akwado okwu ya. Ọ bụrụ na e nwere nwanna nwaanyị nọ n’ọgbakọ ma esi nri nke ọma, anyị nwere ike ịjụta ya ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịna-esi nri nke ọma. w21.07 16 ¶8-9
Wenezdee, Nọvemba 15
[Jehova] anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.—Diut. 32:4.
Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ gwara anyị na Jehova kwuru ka e gbuo otu nwoke Izrel nọ na-akpa nkụ n’Ụbọchị Izu Ike. Ma, n’akwụkwọ Samuel nke Abụọ, anyị gụtara na mgbe ọtụtụ afọ gachara, Jehova gbaghaara Eze Devid mgbe ọ kwara iko, gbuokwa mmadụ. (Ọnụ Ọgụ. 15:32, 35; 2 Sam. 12:9, 13) Anyị nwere ike ịna-eche, sị, ‘Gịnị mere Jehova ga-eji gbaghara Devid, onye gburu mmadụ, kwaakwa iko, ma kwuo ka e gbuo onye mmehie ya yiri ihe na-abụghị oké ihe?’ Ọ bụghị mgbe niile ka Baịbụl na-agwa anyị ihe niile merenụ gbasara ihe ọ kọrọ. Dị ka ihe atụ, anyị ma na Devid ji obi ya niile chegharịa ná mmehie ya. (Ọma 51:2-4) Ma, olee ụdị mmadụ nwoke ahụ mebiri iwu Ụbọchị Izu Ike bụ? Ihe o mere ò wutere ya? Ò mebiela iwu Jehova na mbụ? À dọbuola ya aka ná ntị, ya ajụ ịnabata ya? Baịbụl agwaghị anyị. Ma, ihe ndị anyị mụtara banyere Chineke ga-eme ka obi sie anyị ike na “ihe niile Jehova na-eme na-egosi na ọ bụ onye ezi omume.”—Ọma 145:17. w22.02 2-3 ¶3-4
Tọzdee, Nọvemba 16
Onye dị umeala n’obi ma ihe.—Ilu 11:2.
Mmadụ ịma ebe ike ya ruru ga-eme ka ọ ghara ịtụ anya ime ihe ndị ọ na-agaghị emeli. Nke ahụ ga-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ ma na-arụsi ọrụ ike. Anyị nwere ike iji onye ma ebe ike ya ruru tụnyere onye ji ụgbọala na-arị ugwu. Onye na-anya ụgbọala ahụ ga-etinye ya na gịa ga-arịli ugwu ahụ. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ime ka ụgbọala ahụ na-aga nwayọọ nwayọọ, ma, ọ ga na-aga ruo mgbe ọ rịchara ugwu ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa onye ma ebe ike ya ruru. Ọ ma mgbe ọ ga-adị mkpa ka o jiri nwayọọ nwayọọ na-eme ihe ka o nwee ike ịnọgide na-ejere Jehova ozi ma na-enyere ndị ọzọ aka. (Fil. 4:5) Chegodị gbasara Bazilaị. Ọ dị afọ iri asatọ mgbe Eze Devid gwara ya ka ọ bịa bụrụ otu n’ime ndị ndụmọdụ ya. Ebe Bazilaị ma ebe ike ya ruru, ọ jụrụ ime ihe eze gwara ya. Ọ ma na e nwere ọtụtụ ihe ndị ọ na-agaghịzi emeli. O kwuziri ka Kimham, bụ́ nwa okorobịa, nọchite anya ya. (2 Sam. 19:35-37) Dịkwa ka Bazilaị, obi na-atọ ndị mere agadi ụtọ ịhapụrụ ụmụ okorobịa ọrụ ndị ha na-arụbu ka ha rụwa. w21.09 10 ¶6-7
Fraịdee, Nọvemba 17
O nweghịkwa onye ma m ma e wezụga Nna m. O nweghịkwa onye ma Nna m ma e wezụga m na onye ọ bụla m chọrọ ịkụziri gbasara ya.—Luk 10:22.
Ọ̀ na-esiri gị ike iwere Jehova ka Nna hụrụ gị n’anya? Ọ na-esiri ụfọdụ n’ime anyị ike. Ọ bụrụ na papa gị ahụghị gị n’anya, o nwere ike isiri gị ike ikweta na e nwere nna nwere ike ịhụ gị n’anya. Ma, ihe ga-eme ka obi ruo anyị ala bụ na Jehova ghọtara nnọọ otú ọ dị anyị. Ọ chọrọ ka anyị na ya dịrị ná mma. Ọ bụ ya mere Okwu ya ji gwa anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Jehova hụrụ anyị n’anya. O kwukwara na ọ ga-abụ Nna kacha mma anyị nwere ike inwe. Jizọs nwere ike inyere anyị aka ịbịaru Jehova nso. Jizọs ma Jehova nke ọma, na-akpakwa àgwà ka ya. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna m.” (Jọn 14:9) Dị ka deede anyị, Jizọs na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-akwanyere Nna anyị ùgwù ma na-erubere ya isi, otú anyị ga-esi ghara ime ihe na-ewute ya, nakwa otú anyị ga-esi na-eme ihe dị ya mma. Otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa nyeere anyị aka ịghọta na Jehova dị obiọma, hụkwa anyị n’anya. w21.09 21 ¶4-5
Satọdee, Nọvemba 18
Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke ndị e nyefere unu n’aka ka unu na-elekọta.—1 Pita 5:2.
Ndị Jehova dị n’otu, na-efekwa ezi Chineke. Otu ọrụ gbara ọkpụrụkpụ Jehova nyere ndị okenye bụ ịhụ na ọgbakọ ya na-adị ọcha. Ọ bụrụ na Onye Kraịst emee mmehie dị oké njọ, Jehova na-atụ anya na ndị okenye ga-ekpebi ma onye ahụ ọ̀ ka kwesịrị ịnọ n’ọgbakọ. Otu n’ime ihe ndị ha ga-achọpụta bụ ma ihe onye ahụ mere ò wutere ya n’eziokwu. Onye ahụ nwere ike ime ka ihe o mere ò wutere ya. Ma, ha ga-achọ ịma ma ọ̀ kpọrọ ihe ọjọọ ahụ o mere asị n’eziokwu. Ò kpebisiela ike na ọ gaghị eme ya ọzọ? Ọ bụrụ na ihe mere o ji mee ihe ahụ bụ n’ihi na ya na ndị ọjọọ na-akpa, ọ̀ dị njikere ịkwụsị iso ha akpa? Ndị okenye na-ekpe ekpere, leba anya n’ihe ndị merenụ, chọpụta ihe Baịbụl kwuru na otú obi dị onye ahụ mere mmehie gbasara ihe ahụ o mere. Ha ga-ekpebizi ma à ga-ahapụ ya n’ọgbakọ. Mgbe ụfọdụ, a na-achụ ụdị onye ahụ n’ọgbakọ.—1 Kọr. 5:11-13. w22.02 5 ¶11-12
Sọnde, Nọvemba 19
Yirinụ àgwà ọhụrụ.—Kọl. 3:10.
Ma ànyị ka mere baptizim ụbọchị ole na ole gara aga ma ọ bụkwanụ kemgbe ọtụtụ afọ, anyị niile chọrọ ịna-akpa àgwà otú Jehova chọrọ. Iji mee ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ihe ndị anyị na-eche n’echiche. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe kacha eme ka anyị na-akpa àgwà otú anyị si akpa àgwà bụ ihe anyị na-eche n’echiche. Ọ bụrụ na ihe anyị na-echekarị bụ ihe na-agụ anụ ahụ́ anyị agụụ, anyị ga na-ekwu ma na-eme ihe ndị na-adịghị mma. (Efe. 4:17-19) Ma, ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe dị mma mgbe niile, ihe anyị ga na-ekwu na ihe anyị ga na-eme ga-abụ ihe dị Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova mma. (Gal. 5:16) Ma, anyị agaghị egbochili ihe ọjọọ ịbata anyị n’obi chaa chaa. Ma, anyị nwere ike ikpebi na anyị agaghị eme ihe ọjọọ ahụ na-abata anyị n’obi. Tupu anyị emee baptizim, ọ dị mkpa ka anyị kwụsị ịna-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe ndị na-adịghị Jehova mma. Ihe a bụ ihe mbụ na ihe kacha mkpa anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iyipụ àgwà ochie. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova ezigbo mma, anyị kwesịrị iyiri àgwà ọhụrụ. w22.03 8 ¶1-2
Mọnde, Nọvemba 20
Unu mere ihe niile otú kwesịrị ekwesị iji hụ na unu doziri nsogbu a.—2 Kọr. 7:11.
Ọ naghị adịrị ndị okenye mfe ịchọpụta ma onye mere mmehie dị oké njọ ò chegharịala n’eziokwu. N’ihi gịnị? Ndị okenye enweghị ike ịma ihe dị mmadụ n’obi. N’ihi ya, ha na-agbalị ịchọpụta ma è nwere ihe na-egosi na nwanna ahụ echegharịala n’eziokwu. Ndị okenye ga-achọ ịhụ ihe gosiri na ihe o mere wutere ya nakwa na ọ gbanweela otú o si eche echiche na otú o si akpa àgwà. O nwere ike iwe ọtụtụ oge tupu ya emee ihe ndị gosiri na o chegharịala. Onye a chụrụ n’ọgbakọ kwesịrị ịna-abịachi ọmụmụ ihe anya, na-emekwa ihe ndị okenye gwara ya nke bụ́ ikpechi ekpere anya na ịmụchi ihe anya iji gosi na o ji obi ya niile chegharịa. O kwesịkwara ịgbalịsi ike zere ihe ndị ahụ mere o ji mee mmehie. Ọ bụrụ na ọ gbalịsie ike mee ka ya na Jehova dịghachi ná mma, obi ga-esi ya ike na Jehova ga-agbaghara ya kpamkpam. Ndị okenye ga-anabatakwa ya n’ọgbakọ. w21.10 6 ¶16-18
Tuzdee, Nọvemba 21
Emerela onwe gị arụsị a pịrị apị ma ọ bụ ihe yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ ihe dị n’ụwa . . . Akpọrọla ha isiala.—Ọpụ. 20:4, 5.
N’oge niile Jizọs nọ n’eluigwe nakwa mgbe ọbịara n’ụwa a, o fere naanị Jehova n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu. (Luk 4:8) Ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ịna-eme otú ahụ. Ma Jizọs ma ndị na-eso ụzọ ya ejighị ihe oyiyi fee Chineke. Ebe ọ bụ na Chineke bụ mmụọ, o nweghị otú mmadụ ga-esi kpụọ ihe ọ bụla ga-eyi ya. (Aịza. 46:5) Oleekwanụ banyere ịkpụ ndị sent na ịgwa ha okwu n’ekpere? N’iwu nke abụọ Jehova nyere ụmụ Izrel, o kwuru ihe dị n’amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si. Ihe ebe ahụ kwuru doro ndị niile na-achọ ime ihe Jehova kwuru anya. Ndị na-akọ akụkọ ihe mere n’oge ochie kwuru na Ndị Kraịst oge ochie fere naanị Chineke. Taa, Ndịàmà Jehova na-eme ihe ahụ Ndị Kraịst oge ochie mere. w21.10 19-20 ¶5-6
Wenezdee, Nọvemba 22
Ka onye nọ n’elu ụlọ ghara ịrịdata ka o buru ngwongwo n’ụlọ ya.—Mat. 24:17.
Jizọs dọrọ Ndị Kraịst bi na Judia n’oge ọ nọ n’ụwa aka ná ntị na oge na-abịa mgbe ‘ndị agha ga-agba Jeruselem gburugburu.’ (Luk 21:20-24) Ọ bụrụ na nke ahụ emee, ha kwesịrị ‘ịmalite ịgbaga n’ugwu.’ Mgbapụ ahụ ha ga-agbapụ ga-eme ka a zọpụta ha. Ma, ọ ga-eme ka ha hapụ ọtụtụ ihe. Afọ ole na ole gara aga, otu Ụlọ Nche kwuru na ha hapụrụ ubi ha na ụlọ ha, n’akwaraghị ngwongwo ndị ha nwere n’ụlọ. Ha weere ofufe Jehova ka ihe dị mkpa karịa ihe ọ bụla maka na obi siri ha ike na Jehova ga-echebe ha ma kwado ha. O kwukwara na e nwere ike inwe ihe ga-eme ka a mata ma ọ̀ bụ ihe ndị anyị nwere dị anyị mkpa karịa nzọpụta a ga-azọpụta ndị niile na-erubere Chineke isi. Ihe nwere ike isiri anyị ike n’oge ahụ, ya adịkwa mkpa ka anyị hapụ ihe ụfọdụ anyị nwere. Anyị kwesịrị ịdị njikere ime ihe ọ bụla anyị kwesịrị ime. w22.01 4 ¶7-8
Tọzdee, Nọvemba 23
Chineke, ịhụnanya gị pụrụ iche enweghị atụ.—Ọma 36:7, ihe e dere n’ala ala peeji ya.
Oge na-adịghị anya ndị Izrel si n’Ijipt pụta, Jehova mere ka Mosis mata aha ya na àgwà ndị o nwere. Ọ gwara ya, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nwere ọmịiko ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye ịhụnanya ya pụrụ iche na eziokwu ya dị ukwuu, onye na-egosi puku kwuru puku ọgbọ na ọ hụrụ ha n’anya, onye na-agbaghara ajọ omume na mmebi iwu na mmehie.” (Ọpụ. 34:6, 7; ihe e dere n’ala ala peeji ya) Jehova ji ihe ndị a o kwuru gbasara ụdị onye ọ bụ mee ka Mosis mata otu ihe gbara ọkpụrụkpụ gbasara ịhụnanya ya pụrụ iche. Gịnị ka ọ bụ? Ihe Jehova na-ekwu abụghị naanị na ya na-egosi ịhụnanya pụrụ iche, kama, na “ịhụnanya ya pụrụ iche dị ukwuu.” E nwere ebe ndị ọzọ e kwuru ihe ndị yiri ya na Baịbụl. (Ọnụ Ọgụ. 14:18; Nehe. 9:17; Ọma 86:15; 103:8; Joel 2:13; Jona 4:2) N’ebe ndị a niile, ọ bụ naanị Jehova ka e kwuru na o nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ọ bụghị ụmụ mmadụ. Ọ dị mkpa ịmata na Jehova si otú a kọwaa onwe ya na Baịbụl. Nke a gosiri na ịhụnanya pụrụ iche dị ya ezigbo mkpa. w21.11 2-3 ¶3-4
Fraịdee, Nọvemba 24
Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere ndụ unu.—Mat. 6:25.
Ndị di na nwunye nwere ike ịmụta ihe n’aka Pita onyeozi na nwunye ya. Mgbe ihe dị ka ọnwa isii ruo otu afọ ya na Jizọs hụchara nke mbụ ya gara, o mere mkpebi dị ezigbo mkpa ná ndụ ya. Ihe Pita ji akpa afọ ya bụ ịkụ azụ̀. N’ihi ya, mgbe Jizọs kpọrọ ya ka o jiri oge ya niile na-eso ya, Pita chebaara ezinụlọ ya echiche mgbe ọ na-ekpebi ihe ọ ga-eme. (Luk 5:1-11) Pita kpebiri iso Jizọs na-aga ekwusa ozi ọma. Ọ ga-abụkwa na nwunye Pita kwadoro mkpebi a o mere. Baịbụl kwuru ihe gosiri na mgbe a kpọlitechara Jizọs Kraịst n’ọnwụ, nwunye Pita so Pita gaa ebe ụfọdụ. (1 Kọr. 9:5) O doro anya na àgwà ọma nwunye Pita kpara dị ka ezigbo Onye Kraịst mere ka Pita nwee ike inye ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ndụmọdụ n’atụghị ụjọ ọ bụla. (1 Pita 3:1-7) O doro anya na Pita na nwunye ya tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga na-egboro ndị butere ihe gbasara Alaeze ya ụzọ ná ndụ ha mkpa ha.—Mat. 6:31-34. w21.11 18 ¶14
Satọdee, Nọvemba 25
Na-emenụ ka m.—1 Kọr. 11:1.
Pọl onyeozi hụrụ ụmụnna ya n’anya. Ọ rụsiri ọrụ ike n’ihi ha. (Ọrụ 20:31) Ụmụnna ya hụkwara ya n’anya maka ya. N’otu oge, mgbe ndị okenye nọ n’Efesọs matara na ha agaghị ahụ Pọl ọzọ, “ha niile malitere ibe ezigbo ákwá.” (Ọrụ 20:37) Ndị okenye na-arụsi ọrụ ike na-emekwa ka Pọl. Ha hụrụ ụmụnna ha n’anya, na-emekwa ike ha niile iji nyere ha aka. (Fil. 2:16, 17) Mgbe ụfọdụ, ọ na-esiri ndị okenye ike ime ihe niile ha kwesịrị ime. Gịnị ga-enyere ha aka? Ndị okenye na-arụsi ọrụ ike nwere ike ịmụta ihe n’aka Pọl. Pọl bụ mmadụ nkịtị dị ka anyị. O zughị okè. O nwekwara mgbe o siiri ya ike ime ihe dị mma. (Rom 7:18-20) O nwekwara ọtụtụ nsogbu ndị ya na ha lụrụ. Ma ihe ndị a niile emeghị ka Pọl kwụsị ịna-arụsi ọrụ ike iji nyere ụmụnna ya aka ma ọ bụ mee ka ọ kwụsị ịna-enwe ọṅụ. Ọ bụrụ na ndị okenye ana-eme ka Pọl, ha ga-eji ọṅụ na-efe Jehova, ma mgbe ihe siiri ha ike. w22.03 26 ¶1-2
Sọnde, Nọvemba 26
Unu ga na-edebekwa ụbọchị izu ike m. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.—Lev. 19:3.
Levitikọs 19:3 kwuru gbasara idebe Ụbọchị Izu Ike. Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mosis, n’ihi ya, ọ dịghị mkpa ka ha na-edebe iwu Ụbọchị Izu Ike. Ma, anyị nwere ike ịmụta ezigbo ihe n’otú ndị Izrel si debe iwu ahụ nakwa otú o si baara ha uru. A na-eji Ụbọchị Izu Ike ezu ike maka ọrụ ndị a rụrụ n’izu ma jiri oge ahụ lekwasị anya n’ihe gbasara ofufe Chineke. N’ihi ya, ọ dabara adaba na Jizọs gara n’ụlọ nzukọ dị n’obodo ya n’Ụbọchị Izu Ike ma gụọ Okwu Chineke. (Ọpụ. 31:12-15; Luk 4:16-18) Iwu Chineke nyere na Levitikọs 19:3 ka anyị ‘na-edebe ụbọchị izu ike ya’ kwesịrị ime ka anyị na-ewepụtakwu oge n’ihe ndị anyị na-eme iji nwee ike ịna-efe Chineke. Ì chere na e nwere ihe ndị i kwesịrị ime iji na-emekwu nke ọma na ya? Ọ bụrụ na ị na-ewepụta oge mgbe niile na-efe Chineke, ọ ga-eme ka gị na ya dịrị n’ezigbo mma, nke bụ́kwanụ ihe dị ezigbo mkpa ga-eme ka ị dị nsọ. w21.12 5 ¶13
Mọnde, Nọvemba 27
Ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie, ka ha wee chegharịa.—Luk 5:32.
N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ya na ụdị mmadụ niile na-akpakọrịta. Ya na ndị bara ọgaranya na ndị nwere ikike riri nri. O wepụtakwara nnukwu oge ya na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu ji nọrịa. Ọ na-emetakwara ndị a na-ele anya ka “ndị mmehie” ebere. Ụfọdụ ndị oké ezi omume sụrụ ngọngọ n’ihi ihe Jizọs mere. Ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gịnị mere unu ji soro ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ?” Ihe Jizọs zara ha bụ ihe o kwuru n’amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si. (Luk 5:29-31) Ogologo oge tupu Mesaya abịa, Aịzaya onye amụma kwuru na ụwa ga-ajụ ya mgbe ọ ga-abịa. Ọ sịrị: “Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya . . . Ọ bụkwa onye anyị wepụrụ ihu anyị n’ebe ọ nọ. E ledara ya anya, ọ dịghịkwa ihe anyị ji ya kpọrọ.” (Aịza. 53:3) “Ndị mmadụ” ga-ezere Mesaya ahụ. N’ihi ya, ndị Juu n’oge Jizọs kwesịkwara ịtụ anya na ndị mmadụ agaghị ekwere na Jizọs. w21.05 8-9 ¶3-4
Tuzdee, Nọvemba 28
Jehova ga-emekwa ka ọ gbakee.—Jems 5:15.
Ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ anaghị eme ihe a gwara ha ngwa ngwa. (Jems 1:22) Ụfọdụ n’ime ha na-emelara ndị bara ọgaranya ihe. (Jems 2:1-3) E nwekwara ndị nke na-anaghị ejideli ire ha aka. (Jems 3:8-10) Ụmụnna ndị ahụ nwere ezigbo nsogbu. Ma, Jems ma na ha ga-agbanweli. O ji obiọma gbazie ha. Ma, o zoghị ọnụ ịgwa ha ihe ndị ha kwesịrị ime. Ọ gwakwara ndị nke chọrọ enyemaka ka ha gakwuru ndị okenye ka ha nyere ha aka. (Jems 5:13, 14) Ihe anyị na-amụta: Ezola ọnụ, ma ewerekwala ndị mmadụ ka ndị na-enweghị ike ịgbanwe. O nwere ike ịna-esiri ọtụtụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ike ime ihe Baịbụl kwuru. (Jems 4:1-4) O nwere ike iwetụ ha oge ịkwụsị àgwà ọjọọ ụfọdụ nakwa ịna-akpa àgwà ka Ndị Kraịst. Anyị kwesịrị iji obi ike na-agwa ndị anyị na-amụrụ ihe ihe ndị ha kwesịrị ịgbanwe. Anyị kwesịkwara iburu n’obi na ha ga-agbanweli, tụkwasịkwa Jehova obi na ọ ga-eme ka ndị dị umeala n’obi bịa fewe ya, nyekwa ha ike ha ga-eji gbanwee ihe ndị ha kwesịrị ịgbanwe ná ndụ ha.—Jems 4:10. w22.01 11 ¶11-12
Wenezdee, Nọvemba 29
Onye ọ bụla nke na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ ákwá onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-ebe ga-akpọ òkù ma a gaghị aza ya.—Ilu 21:13.
Ndị Kraịst niile na-agba mbọ ịna-eme ebere ka Jehova. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na Jehova agaghị ege onye ọ bụla na-anaghị emetere ndị ọzọ ebere ntị. O nweghị onye n’ime anyị ga-achọ ka Jehova ghara ịna-anụ ekpere ya. N’ihi ya, anyị anaghị ajụ ige Onye Kraịst ibe anyị na-ata ahụhụ ntị, kama, anyị na-adị njikere mgbe niile “ịnụ ákwá onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-ebe.” Anyị na-eburu ihe a Baịbụl kwuru n’obi nke bụ́: “A ga-ekpe onye na-anaghị eme ebere ikpe n’emereghị ya ebere.” (Jems 2:13) Ọ bụrụ na anyị amata na e kwesịrị imere anyị ebere, ọ ga-eme ka anyị na-emere ndị ọzọ ebere. Anyị kwesịkwara igosi na anyị na-eme ebere, karịchaa, mgbe onye mere mmehie chegharịrị, a nabatakwa ya n’ọgbakọ. Ihe ndị a kọrọ na Baịbụl banyere ndị nwere obiọma ma na-eme ebere ga-enyere anyị aka ịna-eme ebere ma ghara ịna-akpọchi obi anyị. w21.10 12 ¶16-17
Tọzdee, Nọvemba 30
Nọdụnụ ala ebe a ka m gaa ebe nke ọzọ kpee ekpere.—Mat. 26:36.
N’abalị ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụwa mgbe ozi ya na-akụrụ ọnụ, ọ gara chọọ ebe dị jụụ o nwere ike ịnọ tụgharịa uche ma kpee ekpere. Ọ chọtara ebe dị jụụ n’ogige Getsemeni. N’oge ahụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe dị ezigbo mkpa gbasara ekpere. Mgbe ha rutere n’ogige Getsemeni, chi ejiela. O nwere ike ịbụ n’ime ime abalị. Jizọs gwara ndịozi ya ka ha “na-eche nche,” ya agawazie ikpe ekpere. (Mat. 26:37-39) Ma, ka ọ nọ na-ekpe ekpere, ụra buuru ha. Mgbe ọ hụrụ na ha na-ehi ụra, ọ gwakwara ha ọzọ, sị: “Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile.” (Mat. 26:40, 41) Jizọs ma na ike gwụchara ha. Ọ ma na ‘anụ ahụ́ adịghị ike.’ Ma, ugboro abụọ ọzọ Jizọs gara ikpe ekpere, mgbe ọ laghachiri, ọ hụkwara na ndịozi ya anaghị ekpe ekpere, kama ha na-ehi ụra.—Mat. 26:42-45. w22.01 28 ¶10-11