Febụwarị
Tọzdee, Febụwarị 1
Ka unu hụ ibe unu n’anya otú m hụrụ unu n’anya.—Jọn 15:12.
Gịnị ka ihe e kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa pụtara? Jizọs kọwara na ihe ọ pụtara bụ na Ndị Kraịst ga-ahụ ibe ha n’anya karịa onwe ha ma ọ bụkwanụ na ha ga-adị njikere ịnwụ maka ibe ha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Okwu Chineke kwuru na ịhụnanya dị ezigbo mkpa. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ amaokwu Baịbụl kacha amasị ọtụtụ ndị bụ: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) “Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.” (Mat. 22:39) “Onye hụrụ ndị ọzọ n’anya na-adị njikere mgbe niile ịgbaghara ha ma ha mejọọ ya.” (1 Pita 4:8) “Ịhụnanya anaghị akwụsị akwụsị.” (1 Kọr. 13:8) Amaokwu Baịbụl ndị a na ndị ọzọ mere ka o doo anya na anyị kwesịrị inwe àgwà a magburu onwe ya. Ọ bụ Jehova ka ezigbo ịhụnanya si n’aka. Ọ bụ naanị ndị Jehova nyere mmụọ nsọ ya ga-ahụli ibe ha n’anya n’eziokwu. (1 Jọn 4:7) Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị na ọ bụ naanị ezigbo ndị na-eso ụzọ ya ga-eji obi ha niile hụ ibe ha n’anya. Ihe Jizọs kwuru na-emezu. Ọtụtụ ndị achọpụtala ndị bụ́ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ihi otú ha si hụ ibe ha n’anya. w23.03 27-28 ¶5-8
Fraịdee, Febụwarị 2
A gbagharala gị mmehie gị.—Luk 7:48.
Ì kwesịrị ịgbalị na-agbagharakwu ndị ọzọ? Ihe mbụ i nwere ike ime bụ ịgụ akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl gbasara ndị gbaghaara ndị ọzọ na ndị na-agbagharaghị ndị ọzọ ma tụgharịa uche na ha. Chee gbasara ihe Jizọs mere. O ji obi ya niile gbaghara ndị ọzọ. (Luk 7:47) Ọ na-elegharakwa ihe ndị ha mejọrọ anya ma lekwasị anya n’ihe ọma ndị ha nwere ike ime. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ndị Farisii n’oge Jizọs na-eme. Ha “na-ele ndị ọzọ anya ka ndị na-enweghị ihe ha bụ.” (Luk 18:9) Ọ bụrụ na i chebachaara akụkọ ndị a echiche, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m na-achọpụta n’ebe ndị ọzọ nọ? Olee àgwà ha ndị m na-elekwasịkarị anya?’ Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịgbaghara mmadụ, gbalịa dee àgwà ọma niile onye ahụ nwere i chetara. Jụzie onwe gị, sị: ‘Olee otú Jizọs si were onye a? Jizọs ọ̀ ga-agbaghara ya?’ Isi otú a amụ ihe ga-enyere anyị aka ịgbanwe otú anyị si eche echiche. Na mbụ, o nwere ike isiri anyị ike ịgbaghara onye mejọrọ anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-agbakwu mbọ, ka oge na-aga, ọ ga-adịkwuru anyị mfe ịgbaghara ndị mmadụ. w22.04 23 ¶6
Satọdee, Febụwarị 3
Jizọs wee ziga mmụọ ozi ya, ya ejiri ihe ndị nwere ihe ha nọchiri anya ha [kpugheere] ya Jọn ohu ya.—Mkpu. 1:1.
N’akwụkwọ Mkpughe, e ji ihe ụfọdụ nọchie anya ndị iro Chineke. O kwuru gbasara anụ ọhịa dị iche iche. Dị ka ihe atụ, e nwere “otu anụ ọhịa nke si n’oké osimiri na-apụta. O nwere mpi iri na isi asaa.” (Mkpu. 13:1) Anụ ọhịa na-eso ya bụ “anụ ọhịa ọzọ nke si n’ala na-apụta.” Anụ ọhịa a malitere ikwu okwu ka dragọn, na-emekwa ka “ọkụ si n’eluigwe daa n’ụwa.” (Mkpu. 13:11-13) E nwekwara anụ ọhịa ọzọ dị iche. Ọ bụ “anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie” nke nwaanyị akwụna nọ n’elu ya. Anụ ọhịa atọ ndị a nọchiri anya ndị iro Jehova Chineke na Alaeze ya kemgbe ụwa. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị mata ndị a bụ́ ndị iro Chineke. (Mkpu. 17:1, 3) Anyị kwesịrị ịghọta ihe anụ ọhịa ndị a na nwaanyị ahụ nọchiri anya ha. Ihe ga-enyere anyị aka ịghọta ya bụ ikwe ka Baịbụl kọwaara anyị ya. E nwere ọtụtụ n’ime ihe ndị e ji mee ihe atụ n’akwụkwọ Mkpughe a kọwara n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl. w22.05 8-9 ¶3-4
Sọnde, Febụwarị 4
Jiri obi gị niile . . . hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.—Mat. 22:37.
Ụfọdụ n’ime ndị na-efe Jehova enweghịzi ike ime ihe ndị ha chọrọ ime n’ozi Jehova n’ihi na ha akawala nká ma ọ bụ na ha na-arịa ọrịa. Ọ bụrụ na e nwee ihe ị na-anaghị emeli, ya emee ka ike na-agwụ gị mgbe ụfọdụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka Jehova chọrọ m n’aka?’ Jehova chọrọ ka ị na-emere ya ihe niile i nwere ike imere ya ugbu a. Legodị ihe atụ a. Ka e were ya na e nwere otu nwanna nwaanyị dị afọ iri asatọ ike na-agwụ n’ihi na ọ naghịzi agali ozi ọma otú ọ na-agabu mgbe ọ dị afọ iri anọ. N’agbanyeghị na ọ na-eme ike ya niile, o chere na obi adịghị Jehova ụtọ maka ya. Ma, ihe a o chere ọ̀ bụ eziokwu? Chebagodịrị ya echiche. Ọ bụrụ na nwanna nwaanyị a meere Jehova ihe niile o nwere ike imere ya mgbe ọ dị afọ iri anọ, ka na-emekwara Jehova ihe niile o nwere ike imere ya ugbu a ọ dị afọ iri asatọ, ọ kwụsịbeghị imere Jehova ike ya niile. Ọ bụrụ na anyị emeere Jehova ihe niile anyị nwere ike imere ya, ọ ga-enwe ezigbo obi ụtọ. Ọ ga-asị anyị, ‘Unu mere nke ọma.’ (I nwere ike ịtụle Matiu 25:20-23.) Ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ana-elekwasị anya n’ihe anyị ga-emeli kama ilekwasị anya n’ihe anyị na-agaghị emeli. w22.04 10 ¶2; 11 ¶4-6
Mọnde, Febụwarị 5
Ahụkwara m obodo nsọ ahụ, bụ́ Jeruselem Ọhụrụ.—Mkpu. 21:2.
Mkpughe isi 21 ji otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ahụ tụnyere obodo mara ezigbo mma a kpọrọ “Jeruselem Ọhụrụ.” Obodo ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Ihe e dere n’elu nkume ndị ahụ bụ “aha iri na abụọ nke ndịozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpu. 21:10-14; Efe. 2:20) E nweghị obodo ọ bụla ọzọ dị ka ya. Okporo ámá ya bụ ezigbo ọlaedo. E ji nkume pel rụọ ọnụ ụzọ ámá ya iri na abụọ. E ji nkume dị oké ọnụ tọọ ntọala mgbidi ya. O nwekwara akụkụ anọ há nhata. (Mkpu. 21:15-21) Ma, Jọn chọpụtara na e nwere ihe na-adịghị na ya. Legodị ihe o kwuru. Ọ sịrị: “Ahụghị m ụlọ nsọ n’obodo ahụ, n’ihi na Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọ nsọ ya. Ìhè anyanwụ na ọnwa abaghị uru n’obodo ahụ, n’ihi na ebube Chineke na-enye ya ìhè. Ọkụ ya bụkwa Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpu. 21:22, 23) Jehova na ndị so na Jeruselem Ọhụrụ ahụ ga-anọ. N’ihi ya, ụlọ nsọ agaghịzi adị ha mkpa.—Hib. 7:27; Mkpu. 22:3, 4. w22.05 17-18 ¶14-15
Tuzdee, Febụwarị 6
Na-edirinụ ibe unu ihe, na-agbagharakwanụ ibe unu kpamkpam . . . Jehova gbaghaara unu kpamkpam, unu kwesịkwara ịna-emere ibe unu otú ahụ.—Kọl. 3:13.
Ọ bụ eziokwu na Jehova bụ Onye kere anyị, Onye na-enye anyị iwu, na Onyeikpe anyị, ọ bụkwa Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya. (Ọma 100:3; Aịza. 33:22) Ọ bụrụ na anyị emehie ya ma jiri obi anyị niile chegharịa, ọ bụghị naanị na ọ ga-agbagharali anyị, ọ chọkwara ịgbaghara anyị. (Ọma 86:5) Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma gwa anyị ihe ga-emesi anyị obi ike. Ọ sịrị: “Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.” (Aịza. 1:18) Anyị niile na-ekwu ma ọ bụ mee ihe ndị nwere ike ịkpasu ndị ọzọ iwe n’ihi na anyị ezughị okè. (Jems 3:2) Ma nke ahụ apụtaghị na anyị na ha agaghị adịli ná mma. Anyị na ha ga-adịli ná mma ma ọ bụrụ na anyị amụta ịna-agbaghara. (Ilu 17:9; 19:11; Mat. 18:21, 22) Ọ bụrụ na mmadụ emee obere ihe were anyị iwe, Jehova chọrọ ka anyị gbaghara ya. E nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ịgbaghara ya. A sịdị ka e kwuwe, Jehova na-agbaghara anyị “kpamkpam.”—Aịza. 55:7. w22.06 8 ¶1-2
Wenezdee, Febụwarị 7
Na-emenụ ka ndị ahụ, bụ́ ndị okwukwe ha na ndidi ha mere ka e kwe ha nkwa.—Hib. 6:12.
Ọ bụ eziokwu na anyị ekwesịghị ịna-eji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ, ma anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ndị ọzọ na-efe Jehova. Iji maa atụ, ka anyị lee ihe anyị ga-amụta n’aka Jizọs. N’agbanyeghị na o zuru okè, anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’ọmarịcha àgwà ndị o nwere na ihe ndị magburu onwe ha o mere. (1 Pita 2:21) Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike na-eme ka ya, anyị ga na-efekwu Jehova nke ọma. Na Baịbụl, anyị ga-ahụ akụkọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị anyị nwere ike ịna-eme ka ha n’agbanyeghị na ha ezughị okè. Chee gbasara Eze Devid. Jehova kpọrọ ya “nwoke obi m nabatara.” (Ọrụ 13:22) E nwere ụfọdụ ihe jọgburu onwe ha Devid mere. Ma, anyị ka nwere ike ịmụta ihe n’aka ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bịaghị gọrọwa onwe ya. Kama, ọ nabatara ndụmọdụ e nyere ya, chegharịakwa. Ihe o mere wuteruru ya n’ọkpụkpụ. Ọ bụ ya mere Jehova ji gbaghara ya.—Ọma 51:3, 4, 10-12. w22.04 13 ¶11-12
Tọzdee, Febụwarị 8
Mmadụ . . . ga-enye ihe niile o nwere ka ọ zọọ ndụ ya.—Job 2:4.
Baịbụl kwuru na ọnwụ bụ onye iro. (1 Kọr. 15:25, 26) Ụjọ ọnwụ nwere ike ịtụ anyị, karịchaa ma ọ bụrụ na anyịnwa ma ọ bụ onye anyị na-arịa ezigbo ọrịa. Gịnị mere anyị ji atụ ụjọ ọnwụ? Ọ bụ n’ihi na Jehova kere anyị ka anyị chọọ ịdị ndụ ebighị ebi. (Ekli. 3:11) Ma, ụjọ ọnwụ nwere ike ichebe anyị. O nwere ike ime ka anyị na-eri nri dị mma ma na-emega ahụ́, gaa hụ dọkịta ma ṅụọ ọgwụ mgbe ahụ́ na-adịghị anyị, gharakwa ime ihe ọ bụla nwere ike ịta isi anyị. Setan ma na ndụ anyị dị anyị ezigbo mkpa. O kwuru na anyị nwere ike ịhapụ ihe ọ bụla, ma adịm ná mma anyị na Jehova, iji mee ka anyị dịrị ndụ n’ụwa ochie a. (Job 2:5) Ihe a Ekwensu kwuru bụ okpookpo ụgha. Ma, ebe o “nwere ikike ịkpata ọnwu,” ọ na-agbalị iji ụjọ ọnwụ a anyị na-atụ eme ka anyị kwụsị ife Jehova.—Hib. 2:14, 15. w22.06 18 ¶15-16
Fraịdee, Febụwarị 9
Unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.—Efe. 4:26.
Ndị ọchịchị machie ozi ọma anyị iwu, anyị na ụmụnna anyị nwere ike ịna-ezukọ naanị n’obere ìgwè. N’ihi ya, ọ bụ mgbe ahụ ka ọ kacha dịrị mkpa ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo. Na-alụso Setan ọgụ, ọ bụghị ibe unu. Leghara ihe nwanna gị mejọrọ anya, ma ọ bụ gị agaa ozugbo ka gị na ya kwurịta ya. (Ilu 19:11) Dịrịnụ njikere inyere ibe unu aka. (Taị. 3:14) Aka ụmụnna nọ n’ìgwè ozi ubi otu nwanna nwaanyị ihe siiri ike nyeere ya baara ndị niile nọ n’ìgwè ha uru. O mere ka ha dịkwuo ná mma ka otu ezinụlọ. (Ọma 133:1) Ọtụtụ puku ụmụnna anyị na-efe Jehova n’agbanyeghị iwu ndị ọchịchị machiri ozi ọma anyị. Ụfọdụ ụmụnna nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi ihe ha kweere. Anyị nwere ike ịna-ekpe ekpere maka ha na ndị ezinụlọ ha nakwa maka ụmụnna ndị katara obi na-akwado ha n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka a nwụchiekwa hanwa. Ụmụnna ndị ahụ na-eji Baịbụl agba ndị ahụ a tụrụ mkpọrọ ume, na-egboro ha mkpa ha, na-agbachitekwara ha n’ụlọikpe. (Kọl. 4:3, 18) Echefula na ekpere gị nwere ike ịkpa ike.—2 Tesa. 3:1, 2; 1 Tim. 2:1, 2. w22.12 26-27 ¶15-16
Satọdee, Febụwarị 10
Gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị̀ na-akụzikwara onwe gị?—Rom 2:21.
Ụmụaka na-emekarị ka nne na nna ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị nne na nna zuru okè. (Rom 3:23) Ma, ndị nne na nna kwesịrị ịgbalịsi ike na-akpa àgwà ọma ha chọrọ ka ụmụ ha mụta. Otu nna kwuru gbasara ụmụaka, sị: “Ha na-achọ ime ihe ọ bụla ha hụrụ anyị na-eme.” Ọ sịkwara: “Ha ga-ekwuli mgbe ọ bụla ihe anyị na-eme dị iche n’ihe anyị na-akụziri ha.” N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ụmụ anyị hụ Jehova n’anya, anyị kwesịrị iji obi anyị niile hụ Jehova n’anya, omume anyị ana-egosikwa ya. E nwere ọtụtụ ụzọ ndị nne na nna nwere ike isi kụziere ụmụ ha ka ha hụ Jehova n’anya. Otu nwanna dị afọ iri na asaa aha ya bụ Andrew kwuru, sị: “Papa m na mama m na-akụziri m mgbe niile na ikpe ekpere dị ezigbo mkpa. Kwa abalị, mụ na papa m na-ekpe ekpere, ọ bụrụgodị na mụ ekpeela ekpere nke m. Ọ na-adịrị m mfe mgbe niile ikpe ekpere nakwa iwere Jehova ka Nna m hụrụ m n’anya.” Ndị nne na nna, na-echetanụ mgbe niile na otú unu si hụ Jehova n’anya nwere ike inyere ụmụ unu aka ịhụkwa ya n’anya. w22.05 28 ¶7-8
Sọnde, Febụwarị 11
Baptizim . . . na-azọpụtakwa unu ugbu a.—1 Pita 3:21.
Otu n’ime ihe ndị mbụ anyị ga-eme iji ruo eruo ime baptizim bụ iji obi anyị niile chegharịa ná mmehie anyị. (Ọrụ 2:37, 38) Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile chegharịa, ọ ga-eme ka anyị gbanwee àgwà anyị. Ị̀ kwụsịla ịkpa àgwà ndị na-adịghị Jehova mma, dị ka ime omume rụrụ arụ, ịṅụ sịga na ịkpọ anwụrụ, ma ọ bụkwanụ ikwu okwu rụrụ arụ ma ọ bụ ịkparị mmadụ? (1 Kọr. 6:9, 10; 2 Kọr. 7:1; Efe. 4:29) Na-agba mbọ ka i nwee ike ịgbanwe. Gwa onye na-amụrụ gị Baịbụl ma ọ bụkwanụ okenye ọgbakọ ka o nyere gị aka. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto ya na nne na nna ya ka bi, na-agwa ha ka ha nyere gị aka ịkwụsị àgwà ndị na-adịghị mma ị na-akpa na-egbochi gị ime baptizim. Ọ dịkwa mkpa ka ị na-emechi ihe ndị gbasara ofufe Chineke anya. Ihe ndị so na ha bụ ịga ọmụmụ ihe na iso na-eme ihe ndị a na-eme na ya. (Hib. 10:24, 25) Ọ bụrụ na i ruo iso ụmụnna aga ozi ọma, gbalịa na-agachi ya anya. w23.03 10-11 ¶14-16
Mọnde, Febụwarị 12
Jehova Chineke wee sị agwọ ahụ: “Ebe ọ bụ na i mere ihe a, ana m abụ gị ọnụ.”—Jen. 3:14.
Ndị e kwuru gbasara ha n’amụma ahụ e buru na Jenesis 3:14, 15 bụ “agwọ,” na “nwa” agwọ ahụ. O doro anya na agwọ nkịtị agaghị aghọta ihe Jehova kwuru n’ogige Iden. N’ihi ya, onye Jehova mara ikpe ga-abụrịrị onye nwere ọgụgụ isi. Ònye ka ọ bụ? Mkpughe 12:9 mere ka onye ọ bụ doo anya. Ebe ahụ kwuru na “agwọ mbụ ahụ” bụ Ekwensu. Mgbe ụfọdụ, Baịbụl kwuo nwa ma ọ bụ ụmụ, ọ na-ekwu gbasara ndị na-akpa àgwà ma na-eche echiche ka onye e nwere ike ịkpọ nna ha. N’ihi ya, “nwa” agwọ ahụ bụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Jehova isi na ụmụ mmadụ ndị na-emegide Jehova na ndị ya otú ahụ Ekwensu na-eme. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ọrụ ha n’eluigwe n’oge Noa, na ụmụ mmadụ ọjọọ na-eme ka nna ha bụ́ Ekwensu.—Jen. 6:1, 2; Jọn 8:44; 1 Jọn 5:19; Jud 6. w22.07 14-15 ¶4-5
Tuzdee, Febụwarị 13
Na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.—Fil. 1:10.
Pọl onyeozi hụrụ ụmụnna ya n’anya nke ukwuu. Yanwa takwara ahụhụ. N’ihi ya, ọ ga-emeteliri ụmụnna ya ndị nsogbu bịaara ebere. E nwere otu oge Pọl na-enweghịzi ego, ya arụwa ọrụ ka o nwee ike ịna-egbo mkpa ya nakwa nke ndị ya na ha so. (Ọrụ 20:34) Ọrụ ya bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu. Mgbe ọ garuru Kọrịnt, o bu ụzọ soro Akwịla na Prisila na-akpa ákwà ụlọikwuu. Ma “n’ụbọchị izu ike ọ bụla,” ọ na-ekwusara ndị Juu na ndị Grik ozi ọma. Ma mgbe Saịlas na Timoti rutere, “Pọl malitere iji oge ya niile na-ekwusa okwu Chineke.” (Ọrụ 18:2-5) Pọl echefughị ihe kacha ya mkpa ná ndụ, ya bụ, ife Jehova. Ebe ọ bụ na Pọl rụsiri ọrụ ike kwusaa ozi ọma, na-arụkwa ọrụ o ji na-egbo mkpa ya, ọ ga-agbali ụmụnna ya ume. O chetaara ha ka ha ghara ikwe ka nsogbu ndị ha nwere nakwa igbo mkpa ezinụlọ ha mee ka ha hapụ “ihe ndị ka mkpa,” ya bụ, ihe niile gbasara ofufe Jehova. w22.08 20 ¶3
Wenezdee, Febụwarị 14
A ga-ebukwa ụzọ kwusaa ozi ọma ná mba niile.—Mak 13:10.
Taa, Chineke chọrọ ka a na-ekwusa ozi ọma gbasara Alaeze ya n’ụwa niile. (1 Tim. 2:3, 4) Ihe a bụ ọrụ Jehova. Otú ọrụ a si dị ezigbo mkpa mere o ji gwa Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka ọ na-eduzi ya. Obi kwesịrị isi anyị ike na ebe ọ bụ na Jizọs na-eduzi anyị, a ga-ekwusacha ozi ọma a otú Jehova chọrọ ya tupu ọgwụgwụ abịa. (Mat. 24:14) Olee otú anyị si mara? Obere oge tupu Jizọs alaa eluigwe, ya na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya zukọrọ n’ugwu dị na Galili. Ọ gwara ha, sị: “E nyela m ike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” Legodị ihe ọzọ ọ gwara ha. Ọ sịrị: “N’ihi ya, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Mat. 28:18, 19) N’ihi ya, ihe so n’ikike e nyere Jizọs bụ iduzi ọrụ ikwusa ozi ọma. Ihe a Jizọs kwuru mere ka o doo anya na ọ bụ ya ka ga na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma ruo n’oge anyị a. w22.07 8 ¶1, 3, 4
Tọzdee, Febụwarị 15
Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta, ndị mere ezi ihe ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ndụ, ndị mere ajọ omume ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe.—Jọn 5:28, 29, Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ.
Ndị ezi omume, bụ́ ndị mere ihe ọma tupu ha anwụọ, ga-enweta “mbilite n’ọnwụ nke ndụ” n’ihi na e deela aha ha n’akwụkwọ nke ndụ. Ihe ọ pụtara bụ na mbilite n’ọnwụ nke “ndị mere ezi ihe” e kwuru okwu ya na Jọn 5:29 bụkwa mbilite n’ọnwụ nke “ndị ezi omume” e kwuru okwu ya n’Ọrụ Ndịozi 24:15. Ihe a a kọwara dabara n’ihe e kwuru ná Ndị Rom 6:7. Ebe ahụ sịrị: “Onye nwụrụ anwụ enwerela onwe ya ná mmehie ya.” Mgbe ndị ezi omume ahụ nwụrụ, a kagburu mmehie ha mere. Ma Jehova ka na-echeta ihe ọma niile ha mere. (Hib. 6:10) Ndị ezi omume a a kpọlitere n’ọnwụ ka kwesịrị ịna-erubere Jehova isi ma ọ bụrụ na ha achọghị ka e hichapụ aha ha n’akwụkwọ nke ndụ. w22.09 17-18 ¶13, 15
Fraịdee, Febụwarị 16
E [nwere] ike ịtụkwasị ọrụ [Jehova] niile obi.—Ọma 33:4.
Daniel onye amụma gosiri otú e si abụ onye a tụkwasịrị obi. N’agbanyeghị na a dọọrọ ya n’agha laa Babịlọn, àgwà ya mere ka a mata na ọ bụ onye a ga-atụkwasịli obi. Ndị mmadụ tụkwasịkwuru ya obi mgbe Jehova nyeere ya aka, ya akọwaa nrọ ndị Eze Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn rọrọ. (Dan. 4:20-22, 25) Mgbe ọtụtụ afọ gara, Daniel gosikwara na ọ bụ onye a ga-atụkwasịli obi mgbe ọ kọwara ozi gbara onye ọ bụla gharịị, nke e dere n’ahụ́ ájá n’obí eze Babịlọn. (Dan. 5:5, 25-29) Darayọs eze ndị Midia na ndị o mere ndị isi mechara chọpụtakwa na “mmụọ pụrụ iche na-akpa ike n’ahụ́” Daniel. Ha kwuru na Daniel “na-akwụwa aka ọtọ. Ọ naghị eleghara ọrụ ya anya, ọ naghịkwa arụrụ aka.” (Dan. 6:3, 4) Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ndị mmadụ hà weere m ka onye a ga-atụkwasịli obi?’ Anyị ga-eme ka e too Jehova ma anyị bụrụ ndị a ga-atụkwasịli obi. w22.09 8-9 ¶2-4
Satọdee, Febụwarị 17
N’ihi ya, na-emenụ ka Chineke, maka na unu bụ ụmụ ya ọ hụrụ n’anya.—Efe. 5:1.
Irube isi n’iwu Jehova nyere anyị gbasara ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ na-abara anyị uru. Ị̀ ghọtara ihe kpatara ya? Chegodị ihe ga-eme ma a sị na ụlọ akụ̀ niile dị n’otu mba na-eji aka ha emepụta ego nke ha, nke ga-adị iche n’ego mba ahụ. Ọ ga-akpata ọgba aghara. Ọ bụrụkwa na ndị dọkịta na ndị nọọsụ anaghị eme ihe iwu obodo kwuru gbasara otú e kwesịrị isi na-agwọ ndị ọrịa, ụfọdụ ndị ọrịa nwere ike ịnwụ. N’eziokwu, inwe iwu a tụkwasịrị obi na-echebe ndị mmadụ. Otú ahụkwa ka iwu ndị Chineke nyere anyị gbasara ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ si echebe anyị. Jehova na-agọzi ndị niile na-agbalị na-erubere ya isi. O kwere nkwa, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọma 37:29) Cheedị otú ndị mmadụ ga-esi dị n’otu, dịrị n’udo, obi ana-adịkwa ha ụtọ mgbe mmadụ niile ga na-erubere iwu Jehova isi. Ọ bụ ụdị ndụ ahụ ka Jehova chọrọ ka i nweta. N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere onye ọ bụla n’ime anyị ji kwesị iji ezi omume kpọrọ ihe. w22.08 27-28 ¶6-8
Sọnde, Febụwarị 18
Na-eche echiche nke ọma n’ihe niile.—2 Tim. 4:5.
E nwee ihe mere n’ọgbakọ nke were anyị ezigbo iwe, o nwere ike isiri anyị ike irubere Jehova na ọgbakọ ya isi. Olee otú anyị ga-esi merie ụdị nsogbu ahụ? Anyị kwesịrị ịna-eche echiche nke ọma, mụrụ anya, ma mee ka okwukwe anyị sie ike. Otú anyị si egosi na anyị na-eche echiche nke ọma bụ ịnọ jii, chebara ihe merenụ echiche ma gbalịa ka anyị lee ya anya otú Jehova si ele ya. Anyị mee otú ahụ, anyị agaghị ekwe ka otú obi dị anyị mee ka anyị chewe ihe na-adịghị mma. O nwere ike ịbụ na nwanna mere ihe wutere anyị. O nwedịrị ike ịbụ okenye ma ọ bụ nwanna ọzọ e nyere ọrụ n’ọgbakọ. Ọ ga-abụ na nwanna ahụ ebughị n’obi ime ihe ga-ewute gị. (Rom 3:23; Jems 3:2) Ma, o nwere ike ịbụ na ihe o mere were gị ezigbo iwe. I nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ebe ọ bụ na nwanna mere m ụdị ihe a, ihe a ọ̀ ka bụzikwa ọgbakọ Chineke?’ Ọ bụ ihe Setan chọrọ ka anyị chewe. (2 Kọr. 2:11) Ụdị echiche ahụ nwere ike ime ka anyị hapụ Jehova na ọgbakọ ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ibu iwe n’obi. w22.11 20 ¶1, 3; 21 ¶4
Mọnde, Febụwarị 19
Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ.—Ọma 27:14.
Jehova emeela ka anyị nwee ezigbo olileanya na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi. Ụfọdụ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe. Ha ga-abụ mmụọ na-enweghị ike ịnwụ anwụ. (1 Kọr. 15:50, 53) Ma, ọtụtụ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa n’obi ụtọ, n’arịaghịkwa ọrịa ọ bụla. (Mkpu. 21:3, 4) Ma ànyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, anyị anaghị eji olileanya anyị egwu egwu. Obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ndị anyị na-atụ anya ha n’ọdịnihu ga-emezu n’ihi na ọ bụ Jehova kwere nkwa ihe ndị ahụ. (Rom 15:13) Anyị ma nkwa o kwere, marakwa na ọ na-emezu nkwa ya mgbe niile. (Ọnụ Ọgụ. 23:19) Obi siri anyị ike na Jehova chọrọ imezu ihe niile o kwuru na ọ ga-eme, nweekwa ike ọ ga-eji emezu ha. Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya. Ọ chọkwara ka anyị tụkwasị ya obi. Ọ bụrụ na olileanya anyị nwere na Jehova esie ike, anyị ga-enwe ike idi ọnwụnwa ndị na-abịara anyị ma nwee obi ike na ọṅụ n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. w22.10 24 ¶1-3
Tuzdee, Febụwarị 20
Ha bụ ndị na-enupụ isi . . . na-achọghị ịnụ iwu Jehova.—Aịza. 30:9.
Aịzaya buru amụma na Jehova ga-ahapụ ndị Juu ka ọdachi dakwasị ha ebe ọ bụ na ha achọghị ige ntị. (Aịza. 30:5, 17; Jere. 25:8-11) Ọ bụ ihe mechara mee mgbe ndị Babịlọn dọọrọ ha n’agha. Ma, e nwere ụfọdụ n’ime ndị Juu na-erubere Jehova isi. Aịzaya gwara ha na otu ụbọchị, Jehova ga-eme ka ha laghachi Izrel. (Aịza. 30:18, 19) Ọ bụkwa ihe merenụ. Jehova mechara mee ka ha si na Babịlọn pụta. Ma, ọtụtụ afọ gafere tupu Jehova emee ya. Cheta na amaokwu nke 18 sịrị: “Jehova na-enwere unu ndidi ka o meere unu amara.” O gosiri na ọtụtụ afọ ga-agafe tupu a napụta ndị Juu na-erubere Chineke isi. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị Izrel nọrọ afọ iri asaa na Babịlọn tupu ndị fọrọ afọ n’ime ha alaghachi Jeruselem. (Aịza. 10:21; Jere. 29:10) Ozugbo ha lọtara n’obodo ha, ha kwụsịrị ibe ákwá, ọnụ abụrụzie ha ọchị ọchị. w22.11 9 ¶4
Wenezdee, Febụwarị 21
Ndị a kpagburu n’ihi ezi omume na-enwe obi ụtọ.—Mat. 5:10.
Taa, n’obodo ụfọdụ, ụmụnna anyị na-edi ihe ndịozi Jizọs diri mgbe a na-akpagbu ha maka na ha na-ekwusa gbasara Jizọs. Ndị na-ekpe ikpe n’ụlọikpe ndị Juu gwara ha ọtụtụ ugboro “ka ha ghara ikwu ihe ọ bụla ma ọ bụ izi ihe ọ bụla n’aha Jizọs.” (Ọrụ 4:18-20; 5:27, 28, 40) Ma ha ma na onye nwere ikike karịa ndị ikpe ahụ gwara ha ka ha “kwusaara ndị mmadụ ozi ọma ma gbaa àmà nke ọma” gbasara Kraịst. (Ọrụ 10:42) N’ihi ya, Pita na Jọn kwuchitere ọnụ ha ma jiri obi ike kwuo na ha ga-erubere Chineke isi karịa ndị ikpe ndị ahụ, kwuokwa na ha agaghị akwụsị ikwu gbasara Jizọs. (Ọrụ 5:29) Mgbe a pịachara ndịozi ahụ ihe n’ihi na ha na-erubere Chineke isi, ha si ebe ahụ ndị Sanhedrin nọ pụọ, “na-aṅụrị ọṅụ maka na Chineke gụrụ ha ná ndị e kwesịrị imenye ihere n’ihi aha Jizọs,” ha akwụsịghịkwa ikwusa ozi ọma.—Ọrụ 5:41, 42. w22.10 12-13 ¶2-4
Tọzdee, Febụwarị 22
Ịbịa Chineke nso dị m mma.—Ọma 73:28.
O doro anya na anyị bido ịmụ gbasara Jehova, ihe mbụ anyị ga-amụta bụ ihe ndị na-esighị ike Baịbụl na-akụzi. N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Hibru, ọ kpọrọ ihe ndị ahụ “ihe ndị na-ataghị akpụ.” Ihe a o kwuru apụtaghị na “ihe ndị mbụ a kụziiri anyị” abaghị uru. Ọ sịrị na ha yiri mmiri ara e ji azụ nwa ọhụrụ. (Hib. 5:12; 6:1) Ma, ọ gwakwara Ndị Kraịst niile na ọ bụghị naanị ihe ndị ahụ na-esighị ike Baịbụl na-akụzi ka ha kwesịrị ịmụta. Kama, ha kwesịrị ịgba mbọ mụtakwuo ihe ndị siri ike Baịbụl na-akụzi. Ịmụta gbasara eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na Baịbụl ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike? Ị̀ dị njikere ịna-emekwu nke ọma ma na-amụtakwu gbasara Jehova na nzube ya? Ọ na-esiri ọtụtụ n’ime anyị ike ịmụ ihe. Ọ̀ bụ otú ọ na-adị gị? Ị̀ mụtara ịgụ ihe nke ọma na ịmụ ihe nke ọma n’ụlọ akwụkwọ? Ịmụ ihe ọ̀ na-atọ gị ụtọ, na-abakwara gị uru? Ka ì chere na ịmụ ihe anaghị agara gị aka? Ọ bụrụ otú ọ dị gị, ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. Ma, Jehova nwere ike inyere gị aka. O zuru okè, bụrụkwa Onye Nkụzi kachanụ e nwere. w23.03 9-10 ¶8-10
Fraịdee, Febụwarị 23
Dịrịnụ umeala n’obi, kwerekwanụ ka Chineke kụọ okwu ya dị ka mkpụrụ n’ime unu. Okwu ya nwere ike ịzọpụta unu.—Jems 1:21.
Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị ga-ekwe ka Okwu Chineke gbanwee ụdị ndị anyị bụ. Naanị ihe ga-eme ka ihe ndị anyị na-amụta na Baịbụl banyere obi ebere, ọmịiko, na ịhụnanya gbanwee ndụ anyị bụ ma anyị zere ịdị mpako. Otú anyị si emeso ndị ọzọ ihe nwere ike igosi ma ànyị na-ekwe ka Okwu Chineke gbanwee anyị. Ndị Farisii ekweghị ka Okwu Chineke gbanwee ha. Ọ bụ ya mere ha ji “ama ndị ikpe na-amaghị ikpe.” (Mat. 12:7) Ihe anyị na-eche gbasara ndị ọzọ na otú anyị si emeso ha ihe ga-egosikwa ma ànyị na-ekwe ka Okwu Chineke gbanwee anyị. Dị ka ihe atụ, ànyị na-ekwukarị gbasara ihe ọma ndị ọzọ na-eme, ka ọ̀ bụ naanị ihe ọjọọ ha na-eme ka anyị na-ekwu gbasara ya? Ànyị na-emere ndị ọzọ ebere, dịrịkwa njikere ịgbaghara ha, ka ànyị na-akatọkarị ha, na-ebukwara ha iwe n’obi? Ihe anyị zara n’ajụjụ ndị a nwere ike igosi ma ànyị na-ekwe ka ihe ndị anyị na-agụta na Baịbụl na-agbanwe echiche anyị na ihe ndị anyị na-eme.—1 Tim. 4:12, 15; Hib. 4:12. w23.02 12 ¶13-14
Satọdee, Febụwarị 24
Mụnwa, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m na-asị gị, “Atụla egwu. M ga-enyere gị aka.”—Aịza. 41:13.
Legodị akụkọ Josef onye Arimatia. Ọ bụ onye ndị Juu na-akwanyere ezigbo ùgwù. Ọ bụ onye Sanhedrin, ya bụ, ụlọikpe ndị Juu kacha elu. Ma, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, Josef enweghị obi ike. Jọn kwuru na Josef “bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ma ọ na-ezo ya ezo n’ihi na ọ na-atụ egwu ndị Juu.” (Jọn 19:38) Ọ bụ eziokwu na Josef nwere mmasị n’ozi ọma Alaeze Chineke, o meghị ka ndị ọzọ mata na o nwere okwukwe na Jizọs. O nwere ike ịbụ na ụjọ ya bụ na ndị mmadụ agaghị na-akwanyere ya ùgwù ma ha mata na ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs. Nke ọ bụla ọ bụ, Baịbụl gwara anyị na mgbe Jizọs nwụchara, Josef “katara obi gakwuru Paịlet ma rịọ ya ka e bunye ya ozu Jizọs.” (Mak 15:42, 43) Josef ezoghịzi ezo na ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs. Ụjọ mmadụ ọ̀ tụtụla gị otú a ọ tụrụ Josef? w23.01 30 ¶13-14
Sọnde, Febụwarị 25
Ndị gị ga na-enwe obi ụtọ. Ndị na-ejere gị ozi, ndị gị na ha na-anọ mgbe niile, ha ana-ege ntị n’okwu onye amamihe ị na-ekwu, ga na-enwekwa obi ụtọ.—1 Eze 10:8.
Eze nwaanyị Shiba nụrụ akụkọ banyere udo na ọganihu ndị Izrel nwere n’oge ọchịchị Solomọn. O si n’obodo ya dị ezigbo anya gaa Jeruselem ka o jiri anya ya hụ. (1 Eze 10:1) Mgbe ọ hụchara ihe na-eme n’ọchịchị Solomọn, o kwuru ihe dị n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Ma otú ihe dị n’ọchịchị Solomọn dị ka ịtụpenye anyị azụ̀ ihe Jehova ga-emere ndị mmadụ mgbe Ọkpara ya bụ́ Jizọs ga na-achị. Jizọs ka Solomọn. O nweghị ebe Solomọn hụrụ azụ ya anya. Solomọn bụ mmadụ na-ezughị okè. Ihe ndị o mejọrọ mechara mee ka ihe siwere ndị Chineke ike. Ma, Jizọs bụ Onye Ọchịchị zuru okè nke na-anaghị emejọ ihe. (Luk 1:32; Hib. 4:14, 15) Jizọs egosikwala na ya agaghị eme mmehie ma ọ bụ mee ihe ọ bụla ga-akpatara ndị ọ ga-achị nsogbu. Obi atọgbuola anyị na ọ bụ ya bụ Eze anyị. w22.12 10-11 ¶9-10
Mọnde, Febụwarị 26
Na-eruberenụ ndị na-eduzi unu isi, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha, n’ihi na ha na-eche unu nche.—Hib. 13:17.
Gịnị ka anyị ga-eme ma e nwee ọrịa na-efe efe n’ebe anyị bi? Anyị kwesịrị ige ndị ọchịchị ntị. Ha nwere ike ịgwa anyị ka anyị na-akwọ aka anyị, ghara ịna-anọ ndị mmadụ nso, na-ekpuchi imi na ọnụ, ma ọ bụkwanụ ka anyị na-anọpụ iche ma anyị bute ọrịa ahụ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a, anyị na-egosi na anyị ji ndụ Jehova nyere anyị kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na ihe gbata gbata emee, ndị enyi anyị na ndị agbata obi anyị nwere ike ịna-akọsa ihe na-abụghị eziokwu, ma ọ bụkwanụ a na-akọsa ya na tiivi na redio. Kama ikwere “ihe niile e kwuru,” anyị kwesịrị ikwere ihe ndị doro anya na ha si n’aka ndị ọchịchị nakwa ndị dọkịta. (Ilu 14:15) Òtù Na-achị Isi na alaka ụlọ ọrụ na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka ha mata otú ihe si aga tupu ha agwa anyị ihe anyị ga-eme gbasara ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ha gwara anyị, anyị nwere ike ichebe onwe anyị nakwa ndị ọzọ. Ihe a nwekwara ike ime ka a na-eto Ndịàmà Jehova n’ebe anyị bi.—1 Pita 2:12. w23.02 23 ¶11-12
Tuzdee, Febụwarị 27
[Gee] ntị ma mụta ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke unu.—Diut. 31:13.
Mgbe ndị Izrel batara n’Ala Nkwa ahụ, ha bi n’ebe dị iche iche. Ndị Izrel bi n’otu ebe nwere ike ichefu ndị Izrel ibe ha bi n’ebe ndị ọzọ. Ma, Jehova haziri ka ndị Izrel na-abịakọta ọnụ mgbe ụfọdụ ka ha nụ ka a na-agụpụta Okwu ya ma na-akọwa ya. (Diut. 31:10-12; Nehe. 8:2, 8, 18) Chegodịnụ otú obi ga-adị onye Izrel na-efe Chineke mgbe ọ bịarutere Jeruselem hụ ihe nwere ike iru ọtụtụ nde ndị Izrel ibe ya si n’ebe dị iche iche gbakọta ọnụ ife Chineke. Jehova si otú ahụ nyere ndị ya aka ịdị n’otu. Mgbe e mechara hiwe ọgbakọ Ndị Kraịst, ndị nọ na ya bụ ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nakwa ndị si n’ebe dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ha bara ọgaranya, ụfọdụ abụrụ ogbenye. Mana ha dị n’otu. Ihe ga-eme ka Ndị Kraịst ndị ahụ ghọta Okwu Chineke bụ ma Ndị Kraịst ibe ha na-enyere ha aka nakwa ma ha na-agbakọta ọnụ ife Chineke.—Ọrụ 2:42; 8:30, 31. w23.02 3 ¶7
Wenezdee, Febụwarị 28
Onye ọ bụla kweere ga-enweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 6:47.
Jehova kwere nkwa na ndị na-erubere ya isi ga-adị “ndụ ebighị ebi.” (Rom 6:23) Ọ bụrụ na anyị echee banyere nkwa a Jehova kwere, anyị ga-ahụkwu ya n’anya. Chegodị ihe a: Ọ bụ otú Nna anyị nke eluigwe hụruru anyị n’anya mere o ji chọọ ka anyị dị ndụ ebighị ebi ka ihe ọ bụla ghara ikewa anyị na ya. Nkwa ndụ ebighị ebi a Chineke kwere anyị ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị anyị na-enwe ugbu a. Ọ bụrụgodị na ndị iro anyị asị na ha ga-egbu anyị, anyị agaghị enupụrụ Chineke isi. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na anyị nwụọ n’ihi na anyị na-erubere Jehova isi, ọ ga-akpọlite anyị n’ọnwụ, anyị enweekwa olileanya na anyị agaghị anwụ ọzọ. (Jọn 5:28, 29; 1 Kọr. 15:55-58; Hib. 2:15) Ihe mere anyị ji mara na Jehova ga-emeli ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi bụ na ọ bụ ya na-enye ndụ, yanwa na-adịrukwa mgbe ebighị ebi. (Ọma 36:9) Baịbụl gosiri na Jehova dị kemgbe nakwa na ọ ka ga-adịgide.—Ọma 90:2; 102:12, 24, 27. w22.12 2 ¶1-3
Tọzdee, Febụwarị 29
Gịnị ga-eme ka Kraịst kwụsị ịhụ anyị n’anya? Ọ̀ bụ ahụhụ, ka ọ̀ bụ nsogbu, ka ọ̀ bụ mkpagbu?—Rom 8:35.
Ebe anyị bụ ndị Jehova, ọ naghị eju anyị anya na nsogbu na-abịara anyị. Anyị ma na Baịbụl kwuru na “ọtụtụ nsogbu ga-abịara anyị tupu anyị abanye n’Alaeze Chineke.” (Ọrụ 14:22) Anyị makwa na ụfọdụ nsogbu anyị nwere taa agaghị akwụsị ruo mgbe anyị ga-abanye n’ụwa ọhụrụ Chineke ebe ‘ọnwụ na-agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.” (Mkpu. 21:4) Jehova anaghị echebe anyị ka nsogbu ọ bụla ghara ịbịara anyị. Ma, ọ na-enyere anyị aka idi ya. Legodị ihe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst bi na Rom. O bu ụzọ kwuo nsogbu ụfọdụ na-abịara ya na ụmụnna ya. Ọ sịziri: “Anyị na-emeri n’ihi na onye ahụ hụrụ anyị n’anya na-enyere anyị aka.” (Rom 8:36, 37) Ihe ọ pụtara bụ na Jehova ga-emeli ka ihe ị na-eme na-aga nke ọma ọ bụrụgodị na nsogbu gị akwụsịbeghị. w23.01 14 ¶1-2