Jun
Satọdee, Jun 1
Ikpuru na ọkpụrụkpụ ájá kpuchiri m ahụ́. Ọnyá na abụ juru m n’ahụ́.—Job 7:5.
Job na Jehova dị n’ezigbo mma. Ezinụlọ ya buru ibu, dịkwa n’udo. Ọ bakwara ezigbo ọgaranya. (Job 1:1-5) Ma, n’otu ụbọchị, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na Job gbazi aka ihe niile o nwere. Ihe mbụ mere ya bụ na anụ ụlọ ya niile nwụrụ. (Job 1:13-17) Ihe ọzọ mere ya bụ na ụmụ ya niile nwụrụ. Chegodị otú obi si gbawaa Job na nwunye ya mgbe ha matara na ụmụ ha iri anwụọla. Ka a sịkwa ihe mere Job ji dọwaa uwe ya mgbe ọ na-eru uju ma daa n’ala. (Job 1:18-20) Ihe ọzọ Setan mere Job bụ ịkpatara ya ọrịa na-asọ oyi. (Job 2:6-8) E nwere mgbe Job bụbu onye a ma ama a na-akwanyere ùgwù n’obodo ha. Ndị mmadụ na-abịakwute ya ka ọ gwa ha ihe ha ga-eme. (Job 31:18) Ma ugbu a, ha niile na-agbaziri ya ọsọ. O yiziri onye a chụpụrụ achụpụ, ụmụnne ya, ndị enyi ya, na ndị na-ejere ya ozi ajụ ya.—Job 19:13, 14, 16. w22.06 21 ¶5-6
Sọnde, Jun 2
Ka ịhụnanya mee ka anyị tozuo etozuo n’ụzọ niile.—Efe. 4:15.
Anyị mechaa baptizim, anyị niile kwesịrị ime ihe ahụ Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs ka ha mee. Ọ gbara ha ume ka ha bụrụ Ndị Kraịst bụ́ “dimkpa.” (Efe. 4:13) Ihe ọ pụtara bụ na ha ga-agbalị ‘na-emekwu nke ọma.’ Ị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ma, i nwere ike ịhụkwu ya n’anya. Olee otú i nwere ike isi eme ya? Pọl onyeozi kwuru gbasara otu ụzọ n’akwụkwọ Ndị Filipaị 1:9. Pọl kpere ekpere ka ịhụnanya ụmụnna nọ na Filipaị “na-abakwu ụba.” N’ihi ya, anyị nwere ike ịhụkwu Jehova n’anya. Olee otú anyị nwere ike isi eme ya? Ọ bụ ‘ịna-amatakwu uche Chineke nke ọma ma na-aghọtacha uche ya.’ Ọ bụrụ na anyị ana-amatakwu onye Jehova bụ, anyị ga na-ahụkwu ya n’anya, àgwà ya na otú o si eme ihe ana-amasịkwa anyị. Anyị ga na-achọsi ike ịna-eme ya obi ụtọ. Anyị agatụdịghị achọ ime ihe ga-akpasu ya iwe. Anyị ga-agbalịsi ike ghọta ihe ọ chọrọ ka anyị mee na otú anyị ga-esi eme ya. w22.08 2-3 ¶3-4
Mọnde, Jun 3
Ihe ndị a ka Jizọs Kraịst kpughere. Ọ bụ Chineke kpugheere ya ihe ndị a ka o gosi ndị ohu ya ihe ndị ga-emerịrị n’oge na-adịghị anya.—Mkpu. 1:1.
Ọ bụghị mmadụ niile nọ n’ụwa ka e deere akwụkwọ Mkpughe, kama ọ bụ ndị ohu Chineke nyefere ya onwe ha. Ebe anyị bụ ndị Chineke, o kwesịghị iju anyị anya na anyị so na-emezu amụma ụfọdụ e buru n’akwụkwọ a magburu onwe ya. Mgbe Jọn onyeozi mere agadi, o kwuru mgbe amụma ndị ahụ ga-emezu. Ọ sịrị: “Mmụọ nsọ mere ka m nọrọ n’ụbọchị Onyenwe anyị.” (Mkpu. 1:10) Mgbe Jọn dere ihe a n’ihe dị ka afọ 96, “ụbọchị Onyenwe anyị” ka dị ezigbo anya. (Mat. 25:14, 19; Luk 19:12) Ma, amụma ndị dị na Baịbụl gosiri na “ụbọchị Onyenwe anyị” malitere n’afọ 1914 mgbe e chiri Jizọs Eze n’eluigwe. Malite n’afọ ahụ gawa, amụma ndị e buru ná Mkpughe gbasara ndị Chineke malitere na-emezu. N’eziokwu, anyị bi “n’ụbọchị Onyenwe anyị.”—Mkpu. 1:3. w22.05 2 ¶2-3
Tuzdee, Jun 4
E [jidere] anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ.—Mkpu. 19:20.
A tụbara anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ ná ndụ n’ọdọ ọkụ nke sọlfọ mere ka ọ na-enwusi ike. N’ihi ya, mgbe ndị ọchịchị a ka na-achị, Jehova ga-ebibi ha kpamkpam. Olee otú ihe a si gbasa anyị? Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-akwado Chineke na Alaeze ya. (Jọn 18:36) Anyị ekwesịghị itinye aka n’ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa. O nwere ike isiri anyị ezigbo ike ime ya n’ihi na ndị ọchịchị chọrọ ka anyị jiri obi anyị niile na-akwado ha, ma n’okwu ọnụ anyị ma n’omume anyị. Ndị kwere kwadowe anụ ọhịa ahụ ga-enweta akara ya. (Mkpu. 13:16, 17) Mmadụ nweta akara ahụ, ya na Jehova agaghịzi adị ná mma. Ọ gaghịkwa enweta ndụ ebighị ebi. (Mkpu. 14:9, 10; 20:4) Ọ dị ezigbo mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị gbalịsie ike ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’agbanyeghị otú ọ bụla e nwere ike isi na-enye anyị nsogbu ka anyị kwado ọchịchị ụwa. w22.05 10-11 ¶12-13
Wenezdee, Jun 5
Ọ bụrụ na mmadụ ma ọrụ ya nke ọma, ọ ga-eguzo n’ihu ndị eze. Ọ gaghị eguzo n’ihu ndị nkịtị.—Ilu 22:29.
Otu ihe i nwere ike ikpebi ime bụ ịmụta otu nkà bara uru. Ọ bụrụ na anyịnwa amụtakwuo ịna-arụ ọrụ anyị nke ọma, anyị ga-adị njikere ịna-ejekwuru Jehova ozi. Chegodị gbasara ọtụtụ ndị ọrụ a chọrọ iji rụọ alaka ụlọ ọrụ, Ụlọ Mgbakọ, na Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche. Ọtụtụ ụmụnna ndị a mụtara ọrụ ndị ha na-arụ mgbe ha na ụmụnna ndị ọzọ ma ọrụ ndị ahụ nke ọma rụkọrọ ọrụ. Taa, ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị na-amụ nkà ndị dị mkpa ga-enyere ha aka ịna-arụzi Ụlọ Mgbakọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ihe a so n’otú Jehova Chineke, bụ́ “Eze mgbe ebighị ebi,” na Jizọs Kraịst, bụ́ “Eze ndị eze,” si jiri ụmụnna anyị ndị a nwere nkà na-arụ ọtụtụ ihe dị ịtụnanya. (1 Tim. 1:17; 6:15) Anyị chọrọ ịgbalịsi ike iji nkà anyị na-eto Jehova, ọ bụghị onwe anyị.—Jọn 8:54. w22.04 24 ¶7, 11
Tọzdee, Jun 6
Ego [na-echebe] mmadụ.—Ekli. 7:12.
Solomọn bara ezigbo ọgaranya, birikwa n’ụlọ mara ezigbo mma. (1 Eze 10:7, 14, 15) Ma, Jizọs enweghị ọtụtụ ihe. O nweghịkwa ụlọ nke ya. (Mat. 8:20) Ma, ha abụọ lere ego anya otú kwesịrị ekwesị n’ihi na ọ bụ Jehova Chineke nyere ha amamihe. Solomọn kwuru na ego nwere ike ịzụta ihe ndị dị ezigbo mkpa ná ndụ na ihe ụfọdụ anyị chọrọ na-adịghị ezigbo mkpa. Ma, n’agbanyeghị na Solomọn bara ezigbo ọgaranya, ọ ma na e nwere ihe ndị dị mkpa karịa ego. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Ọ ka mma inwe ezigbo aha kama inweju akụnụba.” (Ilu 22:1) Solomọn kwukwara na ihe ndị hụrụ ego n’anya nwere anaghị eme ka ha nwee obi ụtọ. (Ekli. 5:10, 12) O kwukwara na anyị ekwesịghị iche na ọ bụ ego bụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ n’ihi na ego mmadụ nwere nwere ike ifu n’otu ntabi anya.—Ilu 23:4, 5. w22.05 21 ¶4-5
Fraịdee, Jun 7
Jehova na-enwere unu ndidi ka o meere unu amara. Ọ gaghịkwa agba nkịtị. Ọ ga-emere unu ebere. Jehova bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ndị niile na-atụ anya ya na-enwe obi ụtọ.—Aịza. 30:18.
Anyị na Jehova ga na-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na anyị na-echebara ihe ndị ọ na-emere anyị ugbu a echiche. Ichebara ihe ndị o kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu echiche ga-eme ka anyị na-atụsi anya ike na anyị ga-efe ya ruo mgbe ebighị ebi. Ihe ndị a niile ga-eme ka anyị jiri ọṅụ na-efe ya ugbu a. Jehova ga-ebili inyere anyị aka mgbe ọ ga-ebibi ụwa ọjọọ a. Obi siri anyị ike na Jehova, bụ́ “Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi,” agaghị ekwe ka ụwa Ekwensu a jiri otu ụbọchị nọfee otú o kwesịrị. (Aịza. 25:9) Ka anyị nwee ndidi chere ka ụbọchị Jehova ga-anapụta anyị ruo. Ka ọ dị ugbu a, anyị kpebisiri ike ịna-ekpe ekpere, na-amụ Okwu Chineke ma na-eme ihe ndị anyị na-amụta, na-echebakwara ihe ọma ndị Chineke na-emere anyị echiche. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, Jehova ga-enyere anyị aka iji ọṅụ na-atachi obi n’ofufe ya. w22.11 13 ¶18-19
Satọdee, Jun 8
Ahapụkwala ntụziaka nne gị nyere gị.—Ilu 1:8.
Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla banyere baptizim Timoti, ma ọ ga-abụrịrị na obi tọgburu nne ya bụ́ Yunis atọgbu n’ụbọchị ahụ o mere baptizim. (Ilu 23:25) Yunis gbalịrị ịkụziri Timoti ịhụ Jehova na Jizọs n’anya. Nne na nna Timoti anaghị ekpe otu okpukpe. Nna ya bụ onye Grik. Nne ya na nne nne ya bụ ndị Juu. (Ọrụ 16:1) Ọ ga-abụ na Timoti ka bụ obere nwa mgbe nne ya Yunis na nne nne ya bụ́ Lọịs ghọrọ Ndị Kraịst. Ma, nna ya aghọghị Onye Kraịst. Olee ihe Timoti ga-eme ugbu a? Ndị nne bụ́ Ndị Kraịst hụkwara ezinụlọ ha n’anya. Ihe kacha ha mkpa bụ ime ka ụmụ ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Jehova jikwa mbọ ha na-agba ime ya kpọrọ ezigbo ihe. (Ilu 1:8, 9) Jehova enyerela ọtụtụ ndị nne aka ịkụziri ụmụ ha ịhụ ya n’anya na ife ya. w22.04 16-17 ¶1-3
Sọnde, Jun 9
Chineke mere ka imezu nzube ya dịrị ha n’obi.—Mkpu. 17:17.
N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka ‘imezu nzube ya dịrị n’obi’ ndị ọchịchị ụwa. Gịnị ka ọ ga-akpata? Ndị ọchịchị ahụ a kpọrọ “ndị eze iri” ga-alụso okpukpe ụgha ọgụ ma bibie ya. (Mkpu. 17:1, 2, 12, 16) Olee otú anyị si mara na mgbe a ga-ebibi Babịlọn Ukwu dị nso? Ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a bụ icheta na mmiri Osimiri Yufretis nke gbara Babịlọn oge ochie gburugburu so na-echebe ya. Akwụkwọ Mkpughe ji ọtụtụ nde ndị mmadụ na-akwado Babịlọn Ukwu ahụ tụnyere “mmiri” na-echebe ya. (Mkpu. 17:15) Ma, o kwukwara na mmiri ahụ ga-atakpọ, nke na-egosi na ọtụtụ ndị na-akwado okpukpe ụgha ga-akwụsị ịkwado ya. (Mkpu. 16:12) Taa, amụma ahụ na-emezu n’ihi na ihe gbasara okpukpe anaghịzi amasị ọtụtụ ndị. Anya ha dịzi n’ebe ndị ọzọ a ga-egboro ha mkpa ha. w22.07 5-6 ¶14-15
Mọnde, Jun 10
A ga-ekpe onye na-anaghị eme ebere ikpe n’emereghị ya ebere. Ma, e kpewe onye na-eme ebere ikpe, a ga-emere ya ebere.—Jems 2:13.
Ịgbaghara ndị ọzọ na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka obi ebere Jehova. N’otu ihe atụ Jizọs mere, o ji Jehova tụnyere nna ukwu gbaghaara otu n’ime ndị ohu ya nnukwu ụgwọ o ji ya ọ na-agaghị akwụli. Ma, ohu ahụ ọ gbaghaara ekweghị emere ohu ibe ya ebere. Ego ohu ahụ ji ya aharughị ka nke nna ya ukwu gbaghaara ya. (Mat. 18:23-35) Gịnị ka Jizọs ji ya na-akụziri anyị? O ji ya na-akụziri anyị na ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka ebere Jehova na-emere anyị, anyị ga na-agbaghara ndị ọzọ. (Ọma 103:9) Otu Ụlọ Nche e bipụtara ọtụtụ afọ gara aga kwuru na n’agbanyeghị ugboro ole anyị gbaghaara ndị mmadụ ibe anyị, e nweghị ike iji ya tụnyere ugboro ole Jehova si n’aka Jizọs Kraịst gbaghara anyị. Jehova na-emere ndị na-emere ndị ọzọ ebere ebere. (Mat. 5:7) Jizọs mere ka ihe a doo anya mgbe ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere.—Mat. 6:14, 15. w22.06 10 ¶8-9
Tuzdee, Jun 11
M ga-esi n’aka nwa gị gọzie mba niile dị n’ụwa n’ihi na i gere m ntị.—Jen. 22:18.
Jizọs bịara n’ụwa bụrụ mmadụ. Ọ kpara nnọọ àgwà ka Nna ya. (Jọn 14:9) N’ihi ya, anyị si n’aka ya mata Jehova Chineke ma hụ ya n’anya. Ihe ndị Jizọs na-akụzi na otú o si na-eduzi ọgbakọ Ndị Kraịst taa na-abara anyị uru. Ọ kụzierela anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ ga-eme ka anyị na Jehova dị ná mma. Ọnwụ Jizọs na-abakwara anyị uru. Mgbe a kpọlitere Jizọs, Jehova nabatara ndụ ya ahụ zuru okè o ji chụọ àjà, nke ‘na-asachapụ anyị mmehie niile.’ (1 Jọn 1:7) Ọ bụzi Eze dị ebube na-enweghị ike ịnwụ anwụ. Obi ga-adị ndị ohu Chineke ezigbo ụtọ mgbe a ga-ebibi Ekwensu. (Jen. 3:15) Obi ga-adị ndị ohu Chineke ezigbo ụtọ mgbe a ga-ebibi Ekwensu. Tupu mgbe ahụ, adala mbà. Chineke anyị bụ ekwu eme. Ọ ga-esi n’aka nwa nwaanyị ahụ meere “mba niile dị n’ụwa” ọtụtụ ihe ọma. w22.07 18 ¶13; 19 ¶19
Wenezdee, Jun 12
Anyị ga-atarịrị ụdị ahụhụ a.—1 Tesa. 3:3.
Ọ bụrụ na anyị ekpebiwe ihe anyị chọrọ ime, anyị ekwesịghị isi ọnwụ na ọ bụ naanị otu ihe ka anyị ga-eme. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụghị anyị ka ihe niile dị n’aka. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi nyere aka hiwe ọgbakọ na Tesalonaịka. Ma ndị mmegide mere ka Pọl si n’obodo ahụ pụọ. (Ọrụ 17:1-5, 10) A sị na Pọl siri ọnwụ nọrọ ebe ahụ, ọ gaara etinye ụmụnna ya ndị nọ ebe ahụ ná nsogbu. Ma, Pọl akwụsịghị inyere ha aka. Ihe o meziri bụ na o mere ihe ọ ga-emeli n’oge ahụ. Mgbe oge ụfọdụ gachara, o zigara Timoti ka ọ gaa nyere ndị ahụ ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ na Tesalonaịka aka. (1 Tesa. 3:1, 2) Obi tọgburu ụmụnna nọ na Tesalonaịka atọgbu. Anyị ga-amụta ihe n’ihe mere Pọl na Tesalonaịka. O nwere ike ịbụ na e nwere ọrụ anyị na-agbalị ka anyị ruo eruo ịrụ, ma ya abụrụ na otú ihe si dịrị anyị agaghị ekwe anyị iru eru ịrụ ya. (Ekli. 9:11) Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, gbalịa chọta ihe ọzọ ị ga-emeli. w22.04 25-26 ¶14-15
Tọzdee, Jun 13
Onye na-atachi obi n’ọnwụnwa na-enwe obi ụtọ.—Jems 1:12.
Otú Jehova si akasi anyị obi bụ ime ka anyị nwee olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Chegodị gbasara ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nwere ike ịkasi anyị obi ma nsogbu bịara anyị. Na Baịbụl, Jehova na-eme ka obi sie anyị ike na e nweghị ihe ọ bụla ga-enwe ike “ime ka Chineke kwụsị ịhụ anyị n’anya,” ọ sọkwa ya ya bụrụ nsogbu tara akpụ. (Rom 8:38, 39) O mekwara ka obi sie anyị ike na ọ “nọ ndị niile na-akpọku ya nso.” (Ọma 145:18) Jehova gwara anyị na ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi, anyị ga-edili nsogbu ọ bụla, nweedị obi ụtọ ọ bụrụgodị na anyị na-ata ahụhụ. (1 Kọr. 10:13; Jems 1:2) Okwu Chineke na-echetakwara anyị na nsogbu ndị na-abịara anyị anaghị adịte aka ma e jiri ha tụnyere ndụ ebighị ebi Chineke ga-enye anyị. (2 Kọr. 4:16-18) Jehova emeela ka anyị nwee ezigbo olileanya na ọ ga-ewepụ ndị na-akpata nsogbu anyị niile, ya bụ, Ekwensu na ndị ọjọọ na-eme ka ya. (Ọma 37:10) È nwere amaokwu Baịbụl ụfọdụ na-akasi obi i bu n’isi, ndị ga-enyere gị aka ịtachi obi ná nsogbu ndị ga-abịara gị? w22.08 11 ¶11
Fraịdee, Jun 14
Na-echebaranụ ihe ndị a echiche.—Fil. 4:8.
Ò nwere mgbe ị na-echegbu onwe gị ma ị̀ ga-enwe ike ịna-erubere iwu Jehova isi kwa ụbọchị nakwa kwa afọ? Jehova kwere anyị nkwa na ezi omume anyị ga-adịli ka “ebili mmiri na-anaghị akwụsị akwụsị.” (Aịza. 48:18) Were ya na ị nọ n’akụkụ oké osimiri, na-ele ka ebili mmiri na-enugharị n’akwụsịghị akwụsị. N’ebe ahụ dị jụụ, ị̀ ga-echewe na ebili mmiri ahụ nwere ike ịkwụsị otu ụbọchị? Mbanụ. Ị ma na ebili mmiri ahụ na-enugharị n’akwụsịghị akwụsị. Ị ga-emeli ka ezi omume gị dịrị ka ebili mmiri na-anaghị akwụsị akwụsị. Olee otú ị ga-esi eme ya? E nwee ihe ị chọrọ ikpebi, buru ụzọ chee ihe Jehova ga-achọ ka i mee. Meekwa ya. N’agbanyeghị otú ihe ahụ ị chọrọ ikpebi siruru ike, Jehova, bụ́ Nna gị hụrụ gị n’anya, dị njikere mgbe niile ime ka ị dị ike, nyekwara gị aka ka ị ghara ịkwụsị ime ezi omume kwa ụbọchị.—Aịza. 40:29-31. w22.08 30 ¶15-17
Satọdee, Jun 15
Ozugbo otu puku (1,000) afọ ahụ gwụchara, a ga-atọpụ Setan na mkpọrọ.—Mkpu. 20:7.
Otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị gachaa, a ga-atọhapụ Setan. Ọ ga-agbalịzi iduhie ndị mmadụ zuru okè. Mmadụ niile zuru okè ga-ejizi oge ule ahụ gosi ma hà ga-asọpụrụ aha Jehova ma kwado ọchịchị ya. (Mkpu. 20:8-10) A ga-eji ihe onye ọ bụla n’ime ha mere n’oge ahụ kpebie ma à ga-ede aha ya n’akwụkwọ nke ndụ otú a na-agaghị ehichapụli ya ehichapụ. Ụfọdụ ndị ga-emekwa ka Adam na Iv, jụ ọchịchị Jehova. Gịnị ga-eme ha? Mkpughe 20:15 gwara anyị, sị: ‘A tụbara onye ọ bụla a na-edeghị aha ya n’akwụkwọ nke ndụ n’ọdọ ọkụ ahụ.’ A ga-ebibi ndị niile nupụụrụ Jehova isi ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ọtụtụ n’ime ndị ahụ zuru okè ga-erubere Jehova isi n’oge ahụ. w22.09 23-24 ¶15-16
Sọnde, Jun 16
Ọ bụrụ na e bighị unu úgwù dị ka Iwu Mosis kwuru, a gaghị azọpụta unu.—Ọrụ 15:1.
Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ n’oge ndịozi nọ na-esi ọnwụ na e kwesịrị ibi ndị na-abụghị ndị Juu úgwù. O nwere ike ịbụ ka ndị na-anọghị n’ọgbakọ ghara ịna-akatọ ha. (Gal. 6:12) Pọl onyeozi ekwetaghị ihe ahụ ha kwuru. Ma, kama isiwe ọnwụ ka e mee ya otú ọ chọrọ, o weturu onwe ya ala hazie ka e were okwu ahụ gakwuru ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem. (Ọrụ 15:2) Ihe ahụ o mere mere ka ụmụnna ndị ahụ ka na-enwe obi ụtọ, udo adịrịkwa n’ọgbakọ. (Ọrụ 15:30, 31) E nwee ezigbo nsogbu, anyị na-eme ka udo dịrị ma ọ bụrụ na anyị ajụọ ndị Jehova họpụtara ka ha na-elekọta ọgbakọ ya ihe a ga-eme. Ọtụtụ mgbe, anyị ga-ahụ ihe Baịbụl chọrọ ka anyị mee n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl ma ọ bụ ná ntụziaka ndị nzukọ Jehova nyere. Ọ bụrụ na ihe ka anyị mkpa abụrụ ime ihe ndị ahụ a gwara anyị mee karịa ime ka ndị ọzọ mewe ihe anyị chere, anyị ga na-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ. w22.08 22 ¶8-9
Mọnde, Jun 17
Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya.—Ilu 17:17.
E nwere ihe ga-eme mgbe ụfọdụ, ọtụtụ n’ime anyị achọwa ezigbo enyi ha ga-akọrọ otú obi dị ha. O nwere ike isi ike mgbe ụfọdụ. O nwere ike ọ naghị adịrị anyị mfe ịkọrọ onye ọzọ ihe dị anyị n’obi. Obi ga-agbawakwa anyị ma anyị mata na enyi anyị kọọrọ ndị ọzọ ihe anyị kọọrọ ya. Ma, obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị nwee enyi obi siri anyị ike na ntị ọzọ agaghị anụ ihe anyị kọọrọ ya. Ndị okenye na-anaghị agwa ndị ọzọ ihe mmadụ gwara ha na-abụrụ ụmụnna ha ‘ebe ha ga-agbaba’ ma nsogbu bịara ha. (Aịza. 32:2) Obi na-esi anyị ike ịkọrọ ụmụnna ndị a otú ọ dị anyị maka na anyị ma na ntị ọzọ agaghị anụ ihe anyị gwara ha. Anyị anaghị aghụ ha ọnụ ka ha gwa anyị ihe ha na-ekwesịghị ịgwa onye ọzọ. Anyị na-akwanyekwara ndị bụ́ nwunye ndị okenye ùgwù maka na ha anaghị enye di ha nsogbu ka ha gwa ha ihe mmadụ gwara ha, nke onye ahụ na-achọghị ka ntị ọzọ nụ. N’eziokwu, ọ dị mma na onye bụ́ okenye anaghị agwa nwunye ya ihe ụmụnna na-achọghị ka onye ọzọ mara. w22.09 11 ¶10-11
Tuzdee, Jun 18
M bụ Chineke. A ga-eto m ná mba niile.—Ọma 46:10.
Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-anapụta ezigbo ndị ohu ya n’oge “oké mkpagbu” na-abịanụ. (Mat. 24:21; Dan. 12:1) Ọ ga-eme ya mgbe mba ndị gbakọrọ aka ọnụ, ya bụ, Gọg onye Megọg, ga-alụso ndị na-erubere Chineke isi n’ụwa niile ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ọ bụrụgodị na mba ndị ahụ ga-agbakọ aka ọnụ bụ otu narị mba na iri itoolu na atọ (193) so n’Òtù Mba Ụwa, ha niile enweghị ebe ha ga-eru Onye Kacha Elu na ndị agha ya nọ n’eluigwe. Jehova kwere anyị nkwa, sị: “M ga-eme onwe m ka m dị ebube, mee ka a mara na m dị nsọ, meekwa ka ọtụtụ mba mara m. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.” (Ezik. 38:14-16, 23) Ọgụ ahụ Gọg ga-alụso ndị Jehova ga-eme ka agha Amagedọn bido. Jehova ga-eji ya bibie “ndị eze niile nọ n’ụwa.” (Mkpu. 16:14, 16; 19:19-21) Ma, “naanị ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa. Ọ bụkwa ndị kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ ga-anọ na ya.”—Ilu 2:21, ihe e dere n’ala ala peeji ya. w22.10 16-17 ¶16-17
Wenezdee, Jun 19
Ọ bụ uche [Chineke] ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha marakwa eziokwu nke ọma.—1 Tim. 2:4.
Anyị anaghị enyocha obi. Ọ bụ naanị “Jehova na-enyocha ihe mmadụ bu n’obi.” (Ilu 16:2) Ọ hụrụ ụdị mmadụ niile n’anya n’agbanyeghị ezinụlọ ha si nakwa omenala ha. Jehova gbakwara anyị ume ka anyị ‘jiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya.’ (2 Kọr. 6:13) Anyị na-agba mbọ ịna-ahụ ụmụnna anyị niile n’anya, ọ bụghị ịna-ekpe ha ikpe. Ọ pụtakwara na anyị ekwesịghị ịna-ekpe ndị na-anọghị n’ọgbakọ ikpe. Ị̀ ga-amali onye ikwu gị na-anaghị efe Jehova ikpe, sị, “Nwoke ahụ enweghị ike ịbata n’ọgbakọ?” Mbanụ. Ikwu otú ahụ ga-abụ mmadụ ime ihe a na-enyeghị ya ikike ime nakwa ịbụ onye oké ezi omume. Jehova ka na-enye “mmadụ niile n’ebe niile” ohere ka ha chegharịa. (Ọrụ 17:30) Na-echeta mgbe niile na Jehova na-ewere onye na-eche na ya ka ndị ọzọ mma ka onye ajọ omume. Anyị jiri ezi omume Jehova kpọrọ ihe, anyị ga na-enwe obi ụtọ. Ọ ga-eme ka ndị ọzọ chọọ ịna-eme otú ahụ, meekwa ka ha hụkwuo anyị na Jehova n’anya. w22.08 31 ¶20-22
Tọzdee, Jun 20
Ha ga-amara na e nwere mgbe ha na onye amụma nọ.—Ezik. 2:5.
Anyị kwesịrị ịtụ anya na a ga na-emegide anyị n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Mmegide ahụ nwere ike ịka njọ n’ọdịnihu. (Dan. 11:44; 2 Tim. 3:12; Mkpu. 16:21) Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga na-enyere anyị aka. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jehova na-enyere ndị ohu ya aka mgbe niile ịrụ ọrụ o nyere ha n’agbanyeghị otú ọrụ ahụ siruru n’ike. Ka anyị kwuo banyere Ezikiel onye amụma mgbe ọ nọ na-ezi ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn ozi si n’aka Chineke. Olee ụdị ndị Ezikiel ziri ozi Chineke ziri ya? Jehova sịrị na ha bụ ndị “na-aka anya,” “ndị isi ike,” na “ndị nnupụisi.” Ha dị njọ ka ogwu na akpị. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji gwa Ezikiel ugboro ugboro, sị: “Atụkwala ụjọ.” (Ezik. 2:3-6) Ezikiel jezuru ozi ya n’ihi na (1) ọ bụ Jehova ziri ya ozi ahụ, (2) mmụọ nsọ Chineke nyere ya ike, (3) okwu Chineke mekwara ka okwukwe ya sie ike. w22.11 2 ¶1-2
Fraịdee, Jun 21
Ị ga-anwụrịrị n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya.—Jen. 2:17.
Jehova ekeghị ihe ndị dị ndụ n’ụwa ka ha na-adị ndụ ebighị ebi. O nwere mgbe ọ ga-eru, ha anwụọ. Ọ bụ naanị ụmụ mmadụ ka o kere ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. O kere ụmụ mmadụ ka ha ghara ịnwụ anwụ. Jehova kekwara anyị ka ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịdịrị ndụ na-aga. Baịbụl kwuru na Chineke “medịrị ka ịdị ndụ ebighị ebi na-agụ ndị mmadụ agụụ.” (Ekli. 3:11) Ọ bụ ya mere anyị ji were ọnwụ ka onye iro. (1 Kọr. 15:26) Ọ bụrụ na ezigbo ọrịa abịa anyị, ànyị na-agbachi nkịtị, chere ka anyị nwụọ? Mba. Anyị na-aga ụlọ ọgwụ. Mgbe ụfọdụkwa, anyị aṅụọ ọgwụ ka ọrịa ahụ kwụsị. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịnwụ. Ọ bụrụkwa na onye anyị anwụọ, ma ọ̀ bụ nwata ma ọ̀ bụ okenye, ọ na-agbawa anyị obi ruo ogologo oge. (Jọn 11:32, 33) A sị na Nna anyị hụrụ anyị n’anya ebughị n’obi ka anyị na-anọru ebighị ebi, o doro anya na ọ garaghị eke anyị ka anyị nwee ike ịdịrị ndụ na-aga, meekwa ka ọ na-agụ anyị agụụ ime otú ahụ. w22.12 3 ¶5; 4 ¶7
Satọdee, Jun 22
Ụmụnna unu niile ndị nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ a unu na-ata.—1 Pita 5:9.
N’oge a ihe siri ike, ọtụtụ ụmụnna anyị nwere ike ịna-arịa ọrịa, ụjọ nwekwara ike ịna-atụ ha, ma ọ bụ ya adị ha ka ha enweghị mmadụ. Gbalịa na-akpọtụrụ ụmụnna gị. Ọrịa na-efe efe malite, e nwere ike ịsị ndị mmadụ anọla ibe ha oké nso, ma mgbe anyị na ụmụnna anyị nọ. N’ụdị oge ahụ, o nwere ike ịdị gị otú ọ dị Jọn onyeozi. Ọ chọrọ ka ya na Geyọs enyi ya hụ ihu na ihu. (3 Jọn 13, 14) Ma, Jọn ma na ọ gaghị ahụli Geyọs n’oge ahụ. N’ihi ya, Jọn mere ihe ọ ga-emeli. O degaara ya akwụkwọ ozi. Ọ bụrụ na ị gaghị agali n’ụlọ ụmụnna gị, gbalịa si n’ụzọ ndị ọzọ kpọtụrụ ha. Ọ bụrụ na ị gbalịa na-akpọtụrụ ụmụnna gị, obi ga-esikwu gị ike na i nwere mmadụ, obi eruokwa gị ala. Kpọtụrụ ndị okenye ma ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị, kwekwa ka ha gbaa gị ume.—Aịza. 32:1, 2. w22.12 17-18 ¶6-7
Sọnde, Jun 23
Nna ukwu Josef kpọọrọ ya tụba n’ụlọ mkpọrọ, n’ebe a na-akpọchi ndị mkpọrọ eze.—Jen. 39:20.
Baịbụl kwuru na e nwere mgbe a tụrụ Josef ịga n’ụkwụ, keekwa ya agbụ ígwè n’olu. (Ọma 105:17, 18) Nsogbu Josef nọ na-aka njọ. O si n’ịbụ ohu a tụkwasịrị obi ghọzie onye mkpọrọ. È nweela mgbe nsogbu bịaara gị kakwuru njọ n’agbanyeghị na ị na-ekpesi ekpere ike gbasara ya? Ụdị ihe ahụ nwere ike ime. Jehova anaghị echebe anyị ka nsogbu ọ bụla ghara ịbịara anyị n’ụwa a Ekwensu na-achị. (1 Jọn 5:19) N’agbanyeghị ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ma nsogbu anyị niile, ihe gbasara anyị na-emetụkwa ya n’obi. (Mat. 10:29-31; 1 Pita 5:6, 7) Ihe ọzọkwa bụ na o kwere anyị nkwa, sị: “E nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị, e nweghịkwa ihe ga-eme ka m gbakụta gị azụ.” (Hib. 13:5) Jehova ga-enyere gị aka ịtachi obi, ọ bụrụgodị na nsogbu gị eyie ihe a na-enweghị ihe a ga-emeli gbasara ya. w23.01 15-16 ¶7-8
Mọnde, Jun 24
Chineke anyị . . . ga-agbaghara ya mmehie ya kpamkpam.—Aịza. 55:7.
Baịbụl na-emesi anyị obi ike na Jehova agaghị ahapụ anyị ma ọ bụrụ na anyị emejọọ ihe. Ndị Izrel mehiere Jehova ọtụtụ ugboro, ma mgbe ha ji obi ha niile chegharịa, Chineke gbaghaara ha. Ndị Kraịst n’oge ndịozi makwa na Chineke hụrụ ha n’anya. Jehova ji mmụọ nsọ mee ka Pọl onyeozi gbaa Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha ‘gbaghara ma kasie’ otu nwoke mere mmehie dị oké njọ ma chegharịa obi. (2 Kọr. 2:6, 7; 1 Kọr. 5:1-5) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova ahapụghị ndị na-efe ya mgbe ha mehiere ya. O nyeere ha aka, gbazie ha, meekwa ka ha bụrụ ndị enyi ya n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. O kwekwara nkwa imere ndị mmehie niile chegharịrị echegharị otu ihe ahụ taa. (Jems 4:8-10) Baịbụl na-egosi na Chineke nwere amamihe, na-ekpe ikpe ziri ezi, hụkwa anyị n’anya. Baịbụl na-egosi na Jehova chọrọ ka anyị mata ya. Ọ chọrọ ka anyị na ya bụrụ enyi. w23.02 7 ¶16-17
Tuzdee, Jun 25
Ọ dị mma na unu na-echebara amụma ndị a echiche.—2 Pita 1:19.
E nwere ezigbo ihe mere ọ na-eji atọ anyị ụtọ ịhụ otú ihe ndị na-eme n’ụwa taa si emezu amụma Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịma na oge a ga-ebibi ụwa Ekwensu a adịla nso. (Mat. 24:3-14) Pita onyeozi gbara anyị ume ka anyị na-echebara otú amụma ndị e buru na Baịbụl si emezu echiche ka o nwee ike ime ka okwukwe anyị sie ike. (2 Pita 1:20, 21) Pita onyeozi nyeere anyị aka ịmara ihe anyị kwesịrị iburu n’obi ma anyị lebawa anya n’amụma ndị e buru na Baịbụl. Ọ gbara anyị ume ka anyị ‘buru ụbọchị Jehova n’uche.’ (2 Pita 3:11-13) N’ihi gịnị? Ọ bụghị ka anyị jiri aka anyị gbakọta “ụbọchị na awa” Jehova ga-eme ka agha Amagedọn malite. Kama, ọ bụ n’ihi na anyị chọrọ iji oge fọọrọ anyị ‘na-akpa àgwà dị nsọ, na-efekwa Chineke.’ (Mat. 24:36; Luk 12:40) Anyị chọrọ ịna-akpa àgwà dị mma, jidekwa n’aka na ihe mere anyị ji agba mbọ na-efe Chineke bụ na anyị ji obi anyị niile hụ ya n’anya. Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ịkpachara anya n’ihe ndị anyị na-eme. w23.02 16 ¶4, 6
Wenezdee, Jun 26
Enwekwara m atụrụ ọzọ. . . . M ga-akpọtakwa ha.—Jọn 10:16.
E nwere ihe ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ kwesịrị ịna-eme ugbu a ka ha ruo eruo ibi na Paradaịs. Anyị kwesịrị igosi otú obi dị anyị maka ihe Jizọs mere. Dị ka ihe atụ, otú anyị si emeso ụmụnna Jizọs e tere mmanụ ga-egosi ma ànyị hụrụ Jizọs n’anya. Jizọs kwuru na ọ bụ ihe ya ga-eji ekpe ndị bụ́ atụrụ ikpe. (Mat. 25:31-40) Otú anyị ga-esi na-akwado ha bụ ịna-enyere ha aka n’ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 28:18-20) Anyị ekwesịghị ichewe ka anyị banye na Paradaịs tupu anyị amụta ụdị àgwà Jehova chọrọ ka ndị ga-ebi na ya na-akpa. Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-ekwu eziokwu, na-akwụwa aka ọtọ, gharakwa ịna-emefe ihe ókè. Anyị kwesịkwara ịna-erubere Jehova isi, na-akwado ụmụnna anyị, gharakwa ịhapụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-agbalịsi ike irubere Chineke isi n’ụwa ọjọọ a, ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-eme otú ahụ na Paradaịs. Anyị ga na-amụtakwa nkà na àgwà ndị na-egosi na anyị na-ejikere ibi n’ụwa ọhụrụ. w22.12 11-12 ¶14-16
Tọzdee, Jun 27
Onye ọ bụla hụrụ m n’anya, Nna m ga-ahụ ya n’anya.—Jọn 14:21.
Anyị hụrụ Eze anyị bụ́ Jizọs n’anya n’ihi na ọ bụ Onye Ọchịchị kacha mma. Jehova ji aka ya zụọ Ọkpara ya nke ọma ma họpụta ya ka ọ chịwa. (Aịza. 50:4, 5) Cheekwa gbasara otú Jizọs si hụ anyị n’anya nke na ọ nwụrụ n’ihi anyị. (Jọn 13:1) I kwesịrị iji obi gị hụ Jizọs n’anya n’ihi na ọ bụ Eze gị. Ọ kpọrọ ndị hụrụ ya n’anya ndị enyi ya, kwuokwa na ihe ga-egosi na ha hụrụ ya n’anya bụ ma ha na-erubere ya isi. (Jọn 14:15; 15:14, 15) Ọ bụ ihe ọma pụrụ iche meere mmadụ ma ọ bụrụ enyi Ọkpara Chineke. Ị ma na Jizọs dị umeala n’obi nakwa na ọ na-eme nnọọ ka Nna ya. Ị mụtala na o nyere ndị agụụ ji nri, kasie ndị dara mbà obi, gwọọkwa ndị na-arịa ọrịa. (Mat. 14:14-21) Ị hụkwala otú o si na-eduzi ọgbakọ ya taa. (Mat. 23:10) Ị makwa na ebe ọ bụ ya ga-achị anyị n’Alaeze Chineke, ọ ga-emere anyị ihe ndị ka ndị nke ahụ o mere. Olee otú ị ga-esi egosi na ị hụrụ Jizọs n’anya? Ọ bụ ịna-eme ka ya. Otu i nwere ike isi eme ya bụ ibugodị ụzọ nyefee Jehova onwe gị ma mee baptizim. w23.03 4 ¶8, 10
Fraịdee, Jun 28
Leenụ anya n’eluigwe hụ ihe ndị a. Ònye kere ha?—Aịza. 40:26.
Ihe ndị dị ịtụnanya Jehova kere anyị ga-esi na ha amụta ihe juru ma n’eluigwe ma n’ụwa. (Ọma 104:24, 25) Chegodị otú Chineke si kee anyị. O kere anyị otú ihe ndị mara mma ga na-amasị anyị. O kere anyị otú anyị ga-enwe ike ịna-ahụ ụzọ, ịna-anụ ihe, ịna-emetụ ihe aka, ịna-anụ ụtọ ihe, na ịna-anụ ísì ihe. Ihe mere o ji mee ya bụ ka ihe ndị ọzọ niile o kere na-atọ anyị ụtọ. Baịbụl gwara anyị ihe ọzọ dị mkpa mere anyị kwesịrị iji na-eleru ihe ndị Chineke kere anya. Anyị na-esi na ha amụta àgwà ndị Jehova nwere. (Rom 1:20) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i lee ihe ndị Jehova kere anya, ị ga-achọpụta na otú Jehova si kee ha dị egwu. Ọ̀ bụ na ha anaghị egosi na Jehova nwere amamihe? Cheekwa gbasara ụdị nri dị iche iche anyị nwere taa. Ihe a na-egosi na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Ọ bụrụ na anyị esi n’ihe ndị Jehova kere mụta àgwà ndị o nwere, ọ ga-eme ka anyị matakwuo ya nke ọma, meekwa ka anyị na ya bụrụ ezigbo enyi. w23.03 16 ¶4-5
Satọdee, Jun 29
Okwu gị niile bụ eziokwu.—Ọma 119:160.
Ka ihe na-akakwu njọ n’ụwa a, ọnwụnwa ndị ga-eme ka a mata ma obi ò siri anyị ike na ihe Baịbụl na-ekwu bụ eziokwu ga-abịara anyị. Ndị mmadụ nwere ike ịna-agbalị ime ka anyị nwewe obi abụọ ma ihe Baịbụl kwuru ọ̀ bụkwa eziokwu ma ọ bụ ma Jehova ọ̀ họpụtara ndị ga na-eduzi ndị na-efe ya taa. Ma, ọ bụrụ na obi esie anyị ike na Okwu Chineke bụ eziokwu, anyị ga-enwe ike imeri ihe ọ bụla chọrọ ime ka anyị gharazie inwe okwukwe. Anyị ga-ekpebisi ike ‘ịna-eso ntụziaka Jehova mgbe niile, sogide ya ruo n’isi.’ (Ọma 119:112) “Ihere agaghịkwa eme” anyị ịgwa ndị ọzọ gbasara eziokwu ahụ nakwa ịgba ha ume ka ha na-eme ihe o kwuru. (Ọma 119:46) Anyị ga-enwekwa ike ‘iji ọṅụ na-edi’ ihe isi ike ọ bụla, ma mkpagbu. (Kọl. 1:11; Ọma 119:143, 157) Eziokwu ahụ na-eme ka obi ruo anyị ala, na-eme ka obi sie anyị ike, na-akụzikwara anyị ihe anyị ga-eme. Ọ na-eme ka anyị nwee olileanya na ihe ga-aka mma mgbe Alaeze Chineke ga na-achị ụwa. w23.01 7 ¶16-17
Sọnde, Jun 30
Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu hụ ibe unu n’anya. Otú m hụrụ unu n’anya, hụnụ ibe unu n’anya otú ahụ.—Jọn 13:34.
N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, o kpere ekpere maka ndị na-eso ụzọ ya ruo ogologo oge. Jizọs rịọrọ Nna ya ka o “chebe ha n’ihi ajọ onye ahụ.” (Jọn 17:15) Ihe a o mere gosiri otú ọ hụruru ha n’anya. N’agbanyeghị na ọ ma na a na-aga ịta ya nnukwu ahụhụ n’oge na-adịghị anya, ihe nọ na-echegbu ya bụ ihe gbasara ndị na-eso ụzọ ya. Ebe anyị chọrọ ịna-eme ka Jizọs, anyị agaghị na-eche naanị gbasara onwe anyị. Kama, anyị ga na-ekpe ekpere mgbe niile maka ụmụnna anyị. Anyị mee otú ahụ, anyị na-erube isi n’iwu Jizọs, nke bụ́ ka anyị hụ ibe anyị n’anya, na-egosikwa Jehova na anyị ji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya. Ikpe ekpere maka ụmụnna anyị abụghị igbu oge. Baịbụl gwara anyị na “ekpere onye ezi omume na-ekpesi ike na-akpa ezigbo ike.” (Jems 5:16) Ụmụnna anyị nwere ọtụtụ nsogbu ha na-edi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere maka ha. w22.07 23-24 ¶13-15