Nọvemba
Fraịdee, Nọvemba 1
Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta, kama, na-ekwunụ naanị okwu dị mma . . . nke ga-abara ndị nụrụ ya uru, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike.—Efe. 4:29.
Onye Kraịst ekwesịghị ịna-akpọ mmadụ iyi. Ma, e nwere ụzọ ndị ọzọ mmadụ nwere ike isi kparịa mmadụ anyị kwesịkwara izere. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịna-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara ndị si n’agbụrụ ọzọ ma ọ bụ n’obodo ọzọ. Anyị kwesịkwara izere ịgwa ndị ọzọ okwu na-adịghị mma. Na-ekwu ihe ga-eme ka okwukwe ndị ọzọ sikwuo ike. Na-aja ndị ọzọ mma kama ịna-akatọkarị ha ma ọ bụ ịna-eme mkpesa. E nwere ọtụtụ ihe ndị Izrel nwere kwesịrị ime ka ha na-enwe obi ụtọ. Ma, ha akwụsịghị ịna-eme mkpesa. Ọ bụrụ na anyị ana-eme mkpesa mgbe niile, o nwere ike ime ka ndị ọzọ na-emekwa mkpesa. Cheta na ihe na-adịghị mma ndị gara inyopụta Ala Nkwa kwuru mere ka “ndị Izrel niile . . . malite ịkatọ Mosis.” (Ọnụ Ọgụ. 13:31–14:4) Ma, ọ bụrụ na anyị ana-aja ndị ọzọ mma, ọ ga-eme ka onye ọ bụla na-enwe obi ụtọ. N’ihi ya, na-achọ ụzọ ndị ị ga-esi jiri obi gị niile na-aja ụmụnna gị mma. w22.04 8 ¶16-17
Satọdee, Nọvemba 2
Malite mgbe a mụrụ m, e nyefere m n’aka gị ka i lekọtawa m. Ị bụ Chineke m malite mgbe m nọ n’afọ nne m.—Ọma 22:10.
Kemgbe oge Baịbụl, Jehova enyerela ọtụtụ ndị na-eto eto aka ịghọ ndị enyi ya. O nwekwara ike inyere ụmụ gị aka ịbụ ndị enyi ya ma ọ bụrụ na ha chọrọ. (1 Kọr. 3:6, 7) Ọ bụrụgodị na o yie ka ụmụ gị achọghị ife Jehova, Jehova agaghị akwụsị ịhụ ha n’anya. (Ọma 11:4) Ọ bụrụ na ha emee ihe ọ bụla gosiri na ha “nwere ezi obi,” ọ ga-adị njikere inyere ha aka ka ha bụrụ ndị enyi ya. (Ọrụ 13:48; 2 Ihe 16:9) O nwere ike inyere gị aka ikwu ihe kwesịrị ekwesị n’oge i kwesịrị ikwu ya ya eruo ụmụ gị n’obi. (Ilu 15:23) O nwekwara ike ime ka nwanna nọ n’ọgbakọ unu anya ruru ala meta ha enyi. Mgbe ụmụ gị tolitechakwara, Jehova nwere ike inyere ha aka icheta ihe ị kụziiri ha n’oge gara aga. (Jọn 14:26) Ọ bụrụ na ị na-eji okwu ọnụ gị na omume gị na-azụ ụmụ gị, Jehova ga-agọzi gị. w22.04 21 ¶18
Sọnde, Nọvemba 3
Dragọn ahụ wee [wee] iwe.—Mkpu. 12:17.
Ebe ọ bụ na Ekwensu anaghịzi enwe ike ịba n’eluigwe, ọ na-ewesozi ndị e tere mmanụ fọrọnụ n’ụwa ezigbo iwe n’ihi na ọ bụ ha na-anọchi anya Alaeze Chineke n’ụwa. Ọ bụkwa ha nwere “ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.” (2 Kọr. 5:20; Efe. 6:19, 20) N’afọ 1918, e boro ụmụnna asatọ ndị na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma anyị ebubo ụgha, maa ha ikpe ma tụọ ha mkpọrọ ọtụtụ afọ. Ọtụtụ ndị chere na a kwụsịla ọrụ ụmụnna ndị a e tere mmanụ. (Mkpu. 11:3, 7-11) Ma, n’ọnwa Mach afọ 1919, a tọhapụrụ ụmụnna ndị ahụ e tere mmanụ, mechaakwa kwuo na aka ha dị ọcha. Ụmụnna ndị ahụ malitere ozugbo kwusawa ozi ọma. Ma, Ekwensu akwụsịghị imegide ndị Chineke. Kemgbe ahụ, Ekwensu emeela ka mkpagbu “yiri osimiri” na-abịara ndị Chineke niile. (Mkpu. 12:15) N’eziokwu, anyị niile “kwesịrị ịtachi obi, nweekwa okwukwe.”—Mkpu. 13:10. w22.05 5-6 ¶14-16
Mọnde, Nọvemba 4
Anụkwara m na ndị ahụ a kara akara dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000).—Mkpu. 7:4.
N’ọhụụ e gosiri Jọn onyeozi, ọ hụrụ ìgwè abụọ na-akwado ọchịchị Jehova, hụkwa na ha nwetara ndụ ebighị ebi. Ìgwè nke mbụ dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000). E si n’ụwa họta ha ka ha gaa soro Jizọs chịa n’eluigwe. Ha na Jizọs ga-achị ụwa. (Mkpu. 5:9, 10; 14:3, 4) N’ọhụụ ahụ, Jọn hụrụ ka ha na Jizọs guzo n’Ugwu Zayọn n’eluigwe. (Mkpu. 14:1) Kemgbe oge ndịozi Jizọs, a họtala ọtụtụ ndị ga-eso n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ (144,000). (Luk 12:32; Rom 8:17) Ma, a gwara Jọn na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ha ga-afọ n’ụwa n’oge ikpeazụ a. (Mkpu. 12:17) N’ime oké mkpagbu ahụ, a ga-akpọrọ ndị ahụ fọdụrụ gaa eluigwe, ka ha sonyere ndị ibe ha rubeere Jehova isi ruo ọnwụ. Ha niile ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze Chineke.—Mat. 24:31; Mkpu. 5:9, 10. w22.05 16 ¶4-5
Tuzdee, Nọvemba 5
Na-eme ihe m nyere n’iwu.—Aịza. 48:18.
Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ele onwe ha anya otú kwesịrị ekwesị. Jizọs gwara ha na ‘Chineke madị ole ntutu niile dị n’isi ha dị.’ (Mat. 10:30) Ihe ahụ ọ gwara ha na-emesi anyị obi ike, karịchaa, ma ọ bụrụ na anyị chere na o nweghị uru anyị bara. Ihe ahụ o kwuru gosiri na ihe gbasara anyị na-emetụ Nna anyị nke eluigwe n’obi. O ji anyị kpọrọ ihe. Ebe ọ bụ na Jehova kwere ka anyị na-efe ya, marakwa na anyị ruru eru ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya, anyị ekwesịghị ịna-eche na e nweghị ihe anyị dị mma ya. N’ihe dị ka afọ iri na ise gara aga, otu Ụlọ Nche kwuru na anyị kwesịrị ịna-ele onwe anyị anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ sịrị: “N’ezie, anyị ekwesịghị ile onwe anyị anya dị ka ndị dị oké mkpa nke na onwe anyị na-ebu anyị isi; anyị ekwesịghịkwa ileda onwe anyị anya gabiga ókè ma chee na anyị abaghị uru. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịgbalị inwe echiche ziri ezi banyere onwe anyị, marakwa ihe ndị anyị ga-emeli na ndị anyị na-agaghị emeli. w22.05 24-25 ¶14-16
Wenezdee, Nọvemba 6
M na-arịọ arịrịọ . . . ka ha niile wee bụrụ otu.—Jọn 17:20, 21.
Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi eme ka ọgbakọ dịrị n’udo? Ọ bụ ịna-eme udo. (Mat. 5:9; Rom 12:18) Mgbe ọ bụla anyị bu ụzọ mewe ihe ga-eme ka anyị na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ dịrị n’udo, anyị na-eme ka ọgbakọ na-amakwu mma. Ka anyị buru n’obi na ọ bụ Jehova dọtara onye ọ bụla batara n’ọgbakọ ya. (Jọn 6:44) Chegodị otú obi si adị Jehova ụtọ ma ọ hụ ka anyị niile na-agbasi mbọ ike ka anyị na ndị bara ezigbo uru n’anya ya dịrịkwuo n’udo ma dịrị n’otu, ya bụ, ndị na-efe ya. (Aịza. 26:3; Hag. 2:7) Gịnị ka anyị ga-eme ka ọtụtụ ihe ọma Jehova na-enye ndị na-efe ya baara anyị ezigbo uru? Anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’ihe anyị na-amụ na Baịbụl. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịmụta àgwà Ndị Kraịst, nke ga-eme ka anyị ‘na-ahụ ibe anyị n’anya ka ụmụnne’ ma ‘na-enwere ha ọmịiko.’—Rom 12:10. w22.11 12-13 ¶16-18
Tọzdee, Nọvemba 7
M ga-agbaghara ha ajọ omume ha. Agaghịzi m echeta mmehie ha.—Jere. 31:34.
Ọ bụrụ na anyị ekweta na Jehova agbagharala anyị, ‘obi na-eru anyị ala.’ Ihe ọ pụtara bụ na akọnuche anyị agaghịzi na-apịa anyị ụtarị. Naanị mgbe obi ga-adị anyị otú a bụ ma ọ bụrụ “Jehova” gbaghaara anyị. (Ọrụ 3:19) Ọ bụrụ na Jehova agbaghara anyị, anyị na ya ga-adị ná mma, ya adịkwa ka anyị emehietụbeghị ya. Jehova gbaghara anyị, ọ gaghịzi na-ekwu na anyị mere ihe ahụ ma ọ bụ taa anyị ahụhụ maka ya. (Aịza. 43:25) Jehova na-eme ka mmehie anyị dịrị ezigbo anya “otú ọwụwa anyanwụ si dị ezigbo anya n’ọdịda anyanwụ.” (Ọma 103:12) Ọ bụrụ na anyị echebara otú Jehova si agbaghara anyị echiche, ọ ga-eme ka obi dị anyị ezigbo ụtọ, anyị ana-akwanyekwuru ya ùgwù. (Ọma 130:4) Ihe na-eme ka Jehova gbaghara mmadụ ma ọ bụ ghara ịgbaghara ya abụghị otú mmehie ya hà. Ebe ọ bụ Jehova kere anyị, bụrụ Onye na-enye anyị iwu na Onyeikpe anyị, ọ na-eji ihe ndị ọ ma ekpebi ma ọ̀ ga-agbaghara mmadụ ma ọ bụ ghara ịgbaghara ya. w22.06 5 ¶12-14
Fraịdee, Nọvemba 8
Onye ọ bụla na-abịakwute Chineke ga-ekwetarịrị na ọ dị adị nakwa na ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.—Hib. 11:6.
Jehova nyere ndị niile hụrụ ya n’anya olileanya magburu onwe ya. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka ọrịa, iru uju, na ọnwụ kwụsị. (Mkpu. 21:3, 4) Ọ ga-enyere “ndị dị umeala n’obi” nwere olileanya n’ebe ọ nọ aka ime ka ụwa ghọọ Paradaịs. (Ọma 37:9-11) Ọ ga-emekwa ka o kwe omume ya na onye ọ bụla n’ime anyị ịdị ná mma karịa otú anyị na ya dị ugbu a. Olileanya a magburu onwe ya. Ma, olee ihe mere anyị ga-eji kweta na Jehova ga-emezu nkwa ya? Ọ bụ n’ihi na o nwebeghị mgbe o kwere nkwa ghara imezu ya. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị inwe “olileanya n’ebe Jehova nọ.” (Ọma 27:14) Otú anyị si egosi na anyị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ bụ inwe ndidi ma jiri obi ụtọ chere ka Jehova mezuo nzube ya. (Aịza. 55:10, 11) Ka anyị na-erubekwara Jehova isi. Ka obi siekwa anyị ike na “ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” w22.06 20 ¶1; 25 ¶18
Satọdee, Nọvemba 9
Nna unu ma ihe na-akpa unu tupu unu arịọ ya.—Mat. 6:8.
Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova, bụ́ Onyeisi ezinụlọ anyị, ga-eme ihe ọ gwara ndị isi ezinụlọ niile ka ha na-eme na 1 Timoti 5:8. Ọ bụrụ na obi esie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ hụrụ ndị ezinụlọ anyị n’anya, ọ gaghị esiri anyị ike ikweta na anyị ga-enweta ihe ndị dị anyị mkpa. (Mat. 6:31-33) Jehova chọrọ ịna-egboro anyị mkpa anyị. Ọ hụrụ anyị n’anya, na-emesapụkwa aka. Mgbe o kere ụwa, ihe o mere abụghị naanị inye anyị ihe ndị ga-eme ka anyị dịrị ndụ. O mekwara ka ihe ndị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ n’ụwa ju eju bara abara. (Jen. 2:9) Ọ bụrụgodị na e nwee mgbe anyị nwere naanị ihe ndị dị anyị mkpa, ka anyị cheta na ọ bụ ya nyere anyị ndị nke anyị nwere enwe. (Mat. 6:11) Anyị kwesịrị ịna-echeta na ihe ọ bụla anyị hapụrụ maka ozi Jehova enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ihe ndị Jehova na-enye anyị ugbu a, na ndị ọ ga-enye anyị n’ọdịnihu.—Aịza. 65:21, 22. w22.06 15 ¶7-8
Sọnde, Nọvemba 10
Nri siri ike bụ maka ndị tozuru etozu.—Hib. 5:14.
Ọ bụghị naanị ndị chọrọ ịmụta eziokwu bụ ndị kwesịrị ịna-amụta ihe ndị siri ike Baịbụl na-akụzi. Anyị niile kwesịrị ịna-eme otú ahụ. Pọl onyeozi sịrị na ime ihe ndị ahụ anyị mụtara ga-enyere anyị aka ịmata “ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ.” O nwere ike isiri anyị ezigbo ike ime ihe Jehova kwuru ugbu a n’ihi na ọtụtụ ndị na-ebi ndụ rụrụ arụ. Ma, Jizọs na-ahụ na anyị na-amụta ihe ndị na-eme ka okwukwe anyị sie ike. Ọ bụ n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl ka anyị si amụta ihe ndị ahụ. Dị ka Jizọs, anyị emeela ka e too aha Chineke otú e kwesịrị ito ya. (Jọn 17:6, 26) Dị ka ihe atụ, n’afọ 1931, anyị malitere ịza aha si na Baịbụl, nke bụ́ Ndịàmà Jehova. Anyị si otú ahụ gosi na aha Chineke dị anyị ezigbo mkpa nakwa na anyị chọrọ ka e jiri ya mara anyị. (Aịza. 43:10-12) Ihe ọzọ bụ na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ dere aha Chineke ebe ọ bụla o kwesịrị ịdị. w22.07 11 ¶11-12
Mọnde, Nọvemba 11
Okwu gị bụ ọkụ m ji ahụ ebe m na-azọnye ụkwụ, bụrụkwa ìhè nke na-enwu n’ụzọ m.—Ọma 119:105.
Ihe ọzọ so n’eziokwu ndị dị na Baịbụl bụ ozi ọma gbasara Alaeze Chineke. Jizọs ji eziokwu gbasara Alaeze Chineke tụnyere akụ̀ zoro ezo. Jizọs kwuru na Matiu 13:44, sị: “Alaeze eluigwe dị ka akụ̀ e zoro n’ala, nke otu nwoke hụrụ wee zoo ya. Ọ gara ree ihe ndị o nwere wee zụọ ala ahụ n’ihi na ọṅụ juru ya obi.” Ị̀ hụrụ na ọ bụghị akụ̀ ahụ ka nwoke ahụ nọ na-achọ? Ma, mgbe ọ hụrụ ya, ọ hapụrụ ihe ndị dị ya ezigbo mkpa iji nweta ya. O rere ihe niile o nwere. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ma na akụ̀ ahụ bara ezigbo uru. Anyị ma na e nweghị ihe anyị ga-eji tụnyere ụdị ọṅụ anyị nwere ugbu a na anyị na-efe Jehova, nakwa olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi n’Alaeze Chineke. O nweghị ihe ọ bụla anyị hapụrụ ugbu a a ga-eji tụnyere obi ụtọ anyị na-enwe na anyị na Jehova dị n’ezigbo mma. Ihe kacha eme anyị obi ụtọ bụ na anyị “na-eme ya obi ụtọ.”—Kọl. 1:10. w22.08 15 ¶8-9; 17 ¶12
Tuzdee, Nọvemba 12
Gịnịzi mere m ga-eji eme ihe a jọgburu onwe ya ma mehie Chineke?—Jen. 39:9.
Olee otú Josef si mara na Chineke ya weere ịkwa iko ka ‘ihe jọgburu onwe ya’? N’oge ahụ, e debeghị Iwu Mosis, nke otu n’ime iwu dị na ya sịrị: “Akwala iko.” E dere ya mgbe narị afọ abụọ (200) gachara. (Ọpụ. 20:14) Ma, otú Josef maruru Jehova mere ka ọ mata na ịkwa iko agaghị adị ya mma n’obi. Dị ka ihe atụ, Josef ma na Jehova haziri ka otu nwoke lụọ otu nwaanyị. Ọ ga-abụrịrị na ọ nụrụ otú Jehova si chebe nne ya ochie bụ́ Sera ugboro abụọ ka a ghara imerụ ya. (Jen. 2:24; 12:14-20; 20:2-7) Ka Josef na-echebara ihe ndị a echiche, ọ ghọtara ihe dị mma na ihe dị njọ n’anya Chineke. Ebe ọ bụ na Josef hụrụ Jehova n’anya, o kpebisiri ike na ọ ga-eme ihe Jehova chọrọ ka o mee. w22.08 26 ¶1-2
Wenezdee, Nọvemba 13
Ọtụtụ ndị na-ehi ụra n’ime ala ga-eteta. Ụfọdụ ga-enweta ndụ ebighị ebi.—Ihe e dere n’ala ala peeji Dan. 12:2.
N’oge gara aga, anyị chere na amaokwu a na-ekwu banyere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe ma ọ bụ otú e si kwusasiwe ozi ọma ike mgbe ndị mmegide gbalịchara ịkwụsị ozi ọma anyị n’afọ 1918. Ma, anyị aghọtala ugbu a na ọ na-ekwu gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? E kwukwara gbasara ájá na Job 17:16. Okwu a sụgharịrị “ime ala” n’ihe e dere n’ala ala peeji Daniel 12:2 bụkwa otu okwu ahụ a sụgharịrị “ájá” na Job 17:16. Ihe ọ pụtara n’amaokwu ahụ bụ ili. Ihe ọ na-egosi bụ na Daniel 12:2 na-ekwu gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ma oge ikpeazụ a gachaa, mgbe a lụchara agha Amagedọn. Ma, Daniel 12:2 kwuru na ụfọdụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ “ga-enweta ndụ ebighị ebi.” Gịnị ka ọ pụtara? Ihe ọ pụtara bụ na n’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị, ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-enweta ndụ ebighị ebi ma ha bịa mata Jehova na Jizọs, gharakwa ịkwụsị ịmata ha, ma na-erubere ha isi.—Jọn 17:3. w22.09 21 ¶6-7
Tọzdee, Nọvemba 14
[Ịhụnanya] na-ekwere ihe niile.—1 Kọr. 13:7.
Ihe amaokwu a kwuru apụtaghị na Jehova chọrọ ka anyị tụkwasị ndị ọzọ obi n’enweghị ihe kpatara ya. Kama, ọ chọrọ ka anyị tụkwasị ha obi n’ihi na ha mere ihe gosiri na a ga-atụkwasịli ha obi. Ị manụ na ọ bụ àgwà mmadụ na-eme ka a na-akwanyere ya ùgwù. Otú ahụ ka ịtụkwasị mmadụ obi dị. Ọ na-ewekwa oge. Olee otú ị ga-esi mụta ịtụkwasị ụmụnna gị obi? Mata ha nke ọma. Gị na ha na-ekwurịta okwu n’ọmụmụ ihe. Hazie ka gị na ha rụọ n’ozi ọma. Na-enwere ha ndidi. Na-enye ha ohere igosi na a ga-atụkwasịli ha obi. Ná mmalite, o nwere ike ị gaghị akọrọ onye ị matara ọhụrụ ihe ụfọdụ gbasara onwe gị. Ma, ka gị na ya na-adịkwu ná mma, obi nwere ike iru gị ala ịkọrọ ya otú obi dị gị. (Luk 16:10) Ma, gịnị ka ị ga-eme ma nwanna ị kọọrọ ihe ụfọdụ kọọrọ ya onye ọzọ? Ejila ọkụ ọkụ sị na nke gị na ya agaala. Kama, nweere ya ndidi. Ekwekwala ka ihe ụmụnna ụfọdụ mere mee ka ị gharazie ịtụkwasị ụmụnna obi. w22.09 4 ¶7-8
Fraịdee, Nọvemba 15
Anya Jehova na-ahụzu ụwa niile.—2 Ihe 16:9.
Otu okenye aha ya bụ Miqueas chetara otu mgbe ụfọdụ ndị okenye mere ihe gbawara ya obi. Ma, nwanna a gosiri na ọ ka na-eche echiche nke ọma, gbalịsiekwa ike ijide onwe ya. O kpere ekpere ọtụtụ ugboro, rịọ Jehova ka o nye ya mmụọ nsọ na ike ọ ga-eji tachie obi. O mekwara nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ka ọ chọta ihe ga-enyere ya aka. Gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe a? Ọ bụrụ na nwanna emejọọ gị, nọrọ jii ma gbalịa ijide onwe gị ka ị ghara ichewe ihe na-adịghị mma. O nwere ike ịbụ na ị maghị ihe mere nwanna ahụ ji kwuo ihe o kwuru ma ọ bụ mee ihe o mere. N’ihi ya, kpee ekpere kọọrọ ya Jehova ma rịọ ya ka o nyere gị aka ile ihe ahụ anya otú onye ahụ si ele ya. Echela na nwanna ahụ bu n’obi ime gị ihe ọjọọ. Gbalịakwa ka i leghara ihe ahụ o mere gị anya. (Ilu 19:11) Cheta na Jehova ma otú ihe si dịrị gị nakwa na ọ ga-enye gị ike ị ga-eji na-atachi obi.—Ekli. 5:8. w22.11 21 ¶5
Satọdee, Nọvemba 16
Mụ na ndị na-ezochi ụdị ndị ha bụ [anaghị] anọ.—Ọma 26:4.
Na-emeta ndị hụrụ Jehova n’anya enyi. Ndị enyi gị nwere ike inyere gị aka ịbụ Onye Kraịst ma nke a na-akọ. (Ilu 13:20) E nwere otu nwanna bụzi okenye ugbu a aha ya bụ Julien. Ọ sịrị: “Mgbe m ka dị obere, ndị mụ na ha na-agakọ ozi ọma ghọrọ ezigbo ndị enyi m. Ha na-anụ ọkụ n’obi. Ha mekwara ka ịga ozi ọma na-atọ m ezigbo ụtọ. . . . Ọ bịakwara doo m anya na ihe mere na enwechaghị m ezigbo ndị enyi n’oge mbụ bụ na m na-emeta naanị ndị ọgbọ m enyi.” Gịnị ka i kwesịrị ime ma ị chọpụta na e nwere onye nọ n’ọgbakọ ga-emebi gị ma gị na ya kpawa? Pọl ma na e nwere ụfọdụ ndị nọ ọgbakọ n’oge ahụ echiche ha ma ọ bụ àgwà ha na-adịghị ka nke Ndị Kraịst. Ọ bụ ya mere o ji gwa Timoti ka ọ gbaara ndị dị otú ahụ ọsọ. (2 Tim. 2:20-22) Anyị anaghị eji adịm ná mma anyị na Jehova egwu egwu. Anyị gbara ezigbo mbọ tupu anyị na Jehova adịrị ná mma. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwe ka onye ọ bụla mee ka anyị na Nna anyị nke eluigwe ghara ịdị ná mma. w22.08 5-6 ¶13-15
Sọnde, Nọvemba 17
Gị na onye nzuzu emekọla ihe.—Ilu 14:7.
Anyị anaghị eme ka ndị kpọrọ iwu Chineke asị. Anyị na-amụta iji ụzọ Jehova akpọrọ ihe, ma iwu ya niile. Anyị ga-eji ya kpọrọkwuo ihe ma anyị jiri uru irubere ya isi na-aba tụnyere ọghọm na-adị n’inupụrụ ya isi. Chọpụta ụdị nsogbu ndị mmadụ na-akpatara onwe ha n’ihi na ha zuzuuru hapụ ige ntị n’ezigbo ndụmọdụ Jehova na-enye. Chezie otú ndụ gị si ka mma maka na ị na-erubere Jehova isi. (Ọma 32:8, 10) Jehova na-eme ka onye ọ bụla nwee ike inweta amamihe. Ma, ọ naghị amanye onye ọ bụla inweta ya. Ma, ọ kọwara ihe ga-eme ndị na-ekweghị ege ntị n’amamihe ya. (Ilu 1:29-32) Ha ‘ga-eji isi ha buru ihe ha metara.’ Ka oge na-aga, ha ga-ata ahụhụ n’ihi otú ha si ebi ndụ. N’ikpeazụ, Jehova ga-ebibikwa ha. Ma, Jehova kwere ndị gere ntị na ndụmọdụ ya ma mee ihe o kwuru nkwa, sị: “Obi ga-eru onye na-ege m ntị ala, ụjọ ọdachi agaghịkwa atụ ya.”—Ilu 1:33. w22.10 21 ¶11-13
Mọnde, Nọvemba 18
Onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova ma na-eme ihe ọ chọrọ na-enwe obi ụtọ.—Ọma 128:1.
Ịtụ egwu Jehova pụtara na otú anyị si akwanyere ya ùgwù ga-eme ka anyị ghara ime ihe ọ bụla ga-ewe ya iwe. (Ilu 16:6) N’ihi ya, anyị na-agbalịsi ike ka anyị na-erube isi n’iwu Chineke nyere na Baịbụl gbasara ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (2 Kọr. 7:1) Anyị ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Jehova chọrọ ma jụ ihe ndị ọ kpọrọ asị. (Ọma 37:27; 97:10; Rom 12:9) Mmadụ nwere ike ịma na ọ bụ Jehova kwesịrị ịna-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, onye ahụ kwesịrị ịna-eme ihe ndị ahụ Jehova kpebiri. (Rom 12:2) Ọ bụ omume anyị ga-egosi ma ànyị kwetara n’eziokwu na ihe ga-akacha baara anyị uru bụ irubere iwu Jehova isi. (Ilu 12:28) Otú ahụ ka ọ dị Devid n’obi. Ọ bụ ihe mere o ji sị Jehova: “Ị na-eme ka m mara ụzọ ndụ. Onye nọ n’ihu gị na-enwe ọṅụ na-enweghị atụ. Onye nọ n’aka nri gị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọma 16:11. w22.10 8 ¶9-10
Tuzdee, Nọvemba 19
Ọkpara ahụ enweghị ike ime otu mkpụrụ ihe bụ́ uche ya, kama ọ bụ naanị ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme ka ọ na-eme.—Jọn 5:19.
Jizọs lere onwe ya anya otú kwesịrị ekwesị. Tupu ya abịa n’ụwa, ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ magburu onwe ha n’ozi Jehova. Ọ bụ n’aka ya ka e si “kee ihe ndị ọzọ niile dị ma n’eluigwe ma n’ụwa.” (Kọl. 1:16) Mgbe e mere Jizọs baptizim, ọ ga-abụ na o chetara ihe ndị o mere mgbe ya na Nna ya nọ n’eluigwe. (Mat. 3:16; Jọn 17:5) Ma, ihe ndị ahụ o chetara emeghị ka ọ dịwa mpako. O nweghị mgbe o chere na ọ ka onye ọ bụla mma. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ihe mere o ji bịa n’ụwa abụghị ka “e jeere ya ozi, kama ọ bịara ka o jee ozi ma nye ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.” (Mat. 20:28) O kwukwara na ya “enweghị ike ime otu mkpụrụ ihe bụ́ uche ya.” Jizọs dị ezigbo umeala n’obi. O mere ihe magburu onwe ya anyị kwesịrị ịna-eme. w22.05 24 ¶13
Wenezdee, Nọvemba 20
Lọghachikwute Jehova.—Aịza. 55:7.
Jehova kpebiwe ma ọ̀ ga-agbaghara mmadụ, ihe ọ na-echebara echiche bụ ma onye ahụ ọ̀ ma na ihe ahụ ọ na-aga ime bụ mmehie. Jizọs ji ihe o kwuru na Luk 12:47, 48 mee ka ihe a doo anya. Ọ bụrụ na mmadụ kpachaara anya mee ihe gosiri na obi kpọrọ ya nkụ, nakwa ihe ọ ma ga-ewe Jehova iwe, onye ahụ mere mmehie dị oké njọ. Jehova nwere ike ikpebi na ọ gaghị agbaghara ya. (Mak 3:29; Jọn 9:41) Mana, Jehova ò nwere ike ịgbaghara ya? Ee. Jehova nwere ike ịgbaghara ya n’ihi na ihe ọzọ ọ na-echebara echiche bụ ma onye ahụ mere mmehie ò ji obi ya niile chegharịa. Nchegharị pụtara na mmadụ “agbanweela ihe ọ na-eche, àgwà ya, na ihe ọ chọrọ ime.” Ọ pụtakwara na onye ahụ kwara mmakwaara maka ihe ahụ o mere ma ọ bụkwanụ ihe o kwesịrị ime ọ na-emeghị. O wuteruru ya n’ọkpụkpụ. Ọ bụghị naanị ihe ọjọọ onye ahụ mere na-ewute ya, ọ na-ewutekwa ya na ya na Jehova adịghịzi ná mma, nke mere ka o mee ihe ọjọọ ahụ o mere. w22.06 5-6 ¶15-17
Tọzdee, Nọvemba 21
A ga-akpagbukwa ndị niile na-ebi ndụ otú na-egosi na ha na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.—2 Tim. 3:12.
Ndị iro anyị na-esi n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi nakwa n’Ịntanet akọsa ihe na-abụghị eziokwu banyere ụmụnna Jehova ji eduzi ọgbakọ ya. (Ọma 31:13) A nwụchiela ụfọdụ ụmụnna, ma bo ha ebubo na ha bụ ndị omekome. Ụdị ihe a mekwara Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs mgbe e boro Pọl onyeozi ebubo ụgha ma nwụchie ya. Ụfọdụ kwụsịrị inyere Pọl onyeozi aka mgbe a tụrụ ya mkpọrọ na Rom. (2 Tim. 1:8, 15; 2:8, 9) Chegodị otú obi dị Pọl n’oge ahụ. O diela ọtụtụ nsogbu maka ha. E nwedịrị mgbe o ji maka ha mee ihe gaara eme ka e gbuo ya. (Ọrụ 20:18-21; 2 Kọr. 1:8) Ka anyị ghara ime ka ndị ahụ gbaara Pọl ọsọ. N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya ma Ekwensu kpagbuwe ụmụnna Jehova ji eduzi ọgbakọ ya. Ihe ọ chọrọ bụ ka mkpagbu ahụ mee ka ha kwụsị irubere Jehova isi, menyekwa anyị ụjọ. (1 Pita 5:8) Akwụsịla ịkwado ụmụnna gị.—2 Tim. 1:16-18. w22.11 16-17 ¶8-11
Fraịdee, Nọvemba 22
Ọ̀ bụ na ị naghị atụ egwu Chineke?—Luk 23:40.
Ọ dị ka onye omekome ahụ chegharịrịnụ a kpọgidere n’osisi n’akụkụ Jizọs tupu ya anwụọ ọ̀ bụ onye Juu. Ndị Juu fere naanị otu Chineke, ma ndị mba ọzọ fere ọtụtụ chi. (Ọpụ. 20:2, 3; 1 Kọr. 8:5, 6) A sị na onye omekome ahụ bụ onye mba ọzọ, ajụjụ ahụ dị n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa gaara abụ, “Ọ̀ bụ na ị naghị atụ egwu chi ndị anyị na-efe?” Ihe ọzọ bụ na e zitere Jizọs “maka atụrụ furu efu, bụ́ mba Izrel,” ọ bụghị maka ndị mba ọzọ. (Mat. 15:24) Chineke mere ka ndị Izrel mata na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. O nwere ike ịbụ na onye omekome ahụ chegharịrịnụ ma ihe a. Ihe o kwuru gosikwara na o bu n’obi na Jehova ga-akpọlite Jizọs n’ọnwụ ka ọ chịa n’Alaeze Chineke. Ọ ga-abụ na nwoke ahụ bu n’obi na Chineke ga-akpọlitekwa yanwa n’ọnwụ. Ebe ọ bụ na onye omekome ahụ chegharịrịnụ bụ onye Juu, ọ ga-abụrịrị na ọ ma gbasara Adam na Iv na Paradaịs ahụ Jehova mere ka ha biri na ya. N’ihi ya, ọ ga-abụ na onye omekome ahụ ghọtara na Paradaịs ahụ Jizọs kwuru okwu ya na Luk 23:43 ga-abụ ebe mara mma ga-adị n’ụwa a.—Jen. 2:15. w22.12 8-9 ¶2-3
Satọdee, Nọvemba 23
Ha niile ji otu obi na-ekpe ekpere mgbe niile.—Ọrụ 1:14.
Anyị ga-ekwusali ozi ọma naanị ma mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Setan na-alụso anyị ọgụ ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma. (Mkpu. 12:17) E jiri anya mmadụ lewe ya, o nwetụdịghị ebe ike anyị ruru nke Setan. Ma, anyị ji ozi ọma anyị na-ekwusa na-emeri ya. (Mkpu. 12:9-11) Olee otú anyị si na-emeri ya? Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị na-egosi na anyị anaghị atụ ụjọ mba Setan na-aba. Mgbe ọ bụla anyị ziri ozi ọma, ọ bụ mmeri ka anyị meriri Ekwensu. N’ihi ya, anyị nwere ike ikwu na ọ bụ mmụọ nsọ na-enye anyị ike nakwa na ozi anyị na-eje dị Jehova mma. (Mat. 5:10-12; 1 Pita 4:14) Mmụọ nsọ Chineke ga-emeli ka anyị nwee ike imeri nsogbu ọ bụla bịaara anyị n’ozi anyị. (2 Kọr. 4:7-9) Ma, gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-enweta mmụọ nsọ? Anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere mgbe niile maka ya, obi esiekwa anyị ike na Jehova ga-anụ ekpere anyị. w22.11 5 ¶10-11
Sọnde, Nọvemba 24
Anyị na-agba unu ume, ụmụnna anyị, ka unu na-adọ ndị na-enupụ isi aka ná ntị, na-agụgụ ndị dara mbà, na-enyere ndị na-adịghị ike aka, na-enwekwara mmadụ niile ndidi.—1 Tesa. 5:14.
Anyị na-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya ma anyị na-agbasi mbọ ike eme ka anyị na ha dịrị n’udo. Anyị na-agbaghara ndị ọzọ ka Jehova. Ebe ọ bụ na Jehova hapụrụ Ọkpara ya ka ọ nwụọ n’ihi anyị, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbaghara ụmụnna anyị ma ha mejọọ anyị? Anyị achọghị ịdị ka ohu ọjọọ ahụ Jizọs ji mee ihe atụ. N’agbanyeghị na nna ya ukwu gbaghaara ya nnukwu ụgwọ o ji ya, o kweghị agbaghara ohu ibe ya ji ya obere ụgwọ. (Mat. 18:23-35) Ọ bụrụ na gị na nwanna enwee nghọtahie, gbaa mbọ mee ka gị na ya kpezie tupu gị agaa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (Mat. 5:23, 24) Ime otú ahụ ga-egosi na ị hụrụ Jehova na Jizọs n’anya nke ukwuu. w23.01 29 ¶8-9
Mọnde, Nọvemba 25
Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe ọma na-agbazinye Jehova ihe.—Ilu 19:17.
Otú i nwere ike isi mata ihe bụ́ mkpa nwanna bụ ịjụ ya ajụjụ ndị na-agaghị emenye ya ihere. (Ilu 20:5) Hà nwere nri ga-ezuru ha, ọgwụ, na ihe ndị ọzọ? À chọrọ ịchụ ha n’ọrụ ma ọ bụ ịchụpụ ha n’ụlọ ha? Hà chọrọ ka e nyere ha aka dejuo akwụkwọ ụfọdụ ka ndị ọchịchị nwee ike inyere ha aka? Jehova na-agwa anyị niile ka anyị na-agba ndị ọzọ ume ma na-enyere ha aka. (Gal. 6:10) Ọ bụrụgodị obere ihe ka anyị mere iji nyere onye na-arịa ọrịa aka, ọ ga-agba ya ezigbo ume. Nwatakịrị nwere ike iso papa ya ma ọ bụ mama ya gaa leta nwanna ma ọ bụ nyere ya aka. Onye na-eto eto nwere ike ịgara nwanna nwaanyị ozi ma ọ bụ gaa zụtara ya ihe. Anyị nwekwara ike isiri onye ahụ́ na-adịghị nri. Ụfọdụ ụmụnna na-ede ozi ekele zigara ndị okenye. Ị manụ na e nwee ọrịa na-efe efe, ọrụ ndị okenye na-aka nke oge ndị ọzọ. Ọ na-amagbu onwe ya ma anyị mee ihe anyị kwesịrị ime iji ‘na-agba ibe anyị ume ma na-eme ka ibe anyị dị ike.’—1 Tesa. 5:11. w22.12 22 ¶2; 23 ¶5-6
Tuzdee, Nọvemba 26
N’eziokwu, unu efuola ụzọ.—Mak 12:27.
Ndị Sadusii ma akwụkwọ ise mbụ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọma. Ma, ha na-eleghara eziokwu ndị dị mkpa dị na ha anya. Dị ka ihe atụ, legodị ihe Jizọs kwuru mgbe ndị Sadusii jụrụ ya gbasara mbilite n’ọnwụ. Ọ jụrụ ha, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụbeghị akụkọ osisi ogwu ahụ n’akwụkwọ Mosis? Chineke na-ekwu banyere ndị nwụrụ anwụ a ga-akpọlite n’ọnwụ mgbe ọ gwara Mosis, sị: ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.’” (Mak 12:18, 26) Ọ bụ eziokwu na ndị Sadusii ahụ agụọla amaokwu Baịbụl ahụ ọtụtụ ugboro, ihe Jizọs jụrụ ha gosiri na ha leghaara otu eziokwu dị ezigbo mkpa Akwụkwọ Nsọ na-akụzi anya, ya bụ na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ. (Luk 20:38) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ọ bụrụ na anyị agụwa Baịbụl, ka anyị gbalịa mata ihe niile amaokwu Baịbụl ahụ ma ọ bụ akụkọ Baịbụl ahụ na-akụziri anyị. Ihe anyị kwesịrị ịghọta abụghị naanị ihe amaokwu Baịbụl ahụ kwuru hoo haa. Anyị kwesịkwara ịghọta ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ amaokwu ahụ na-akụzi a na-ekwughị hoo haa. w23.02 10-11 ¶9-10
Wenezdee, Nọvemba 27
Anyị nwere oké ìgwè ndị àmà . . . gbara anyị gburugburu.—Hib. 12:1.
Ọnwụnwa ndị tara akpụ bịaara ndị àmà niile e kwuru okwu ha n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa, ma ha rubeere Jehova isi ná ndụ ha niile. (Hib. 11:36-40) Ntachi obi ha na ọrụ ha rụsiri ike ọ̀ lara n’iyi? Mbanụ. N’agbanyeghị na Chineke emezughị nkwa ya niile n’oge ha dị ndụ, ha akwụsịghị inwe olileanya n’ebe Jehova nọ. Ha kwetasiri ike na ha ga-ahụ mgbe a ga-emezu nkwa ndị ahụ n’ihi na obi siri ha ike na ha na Jehova dị ná mma. (Hib. 11:4, 5) Akụkọ ha ga-eme ka anyị kpebisie ike ịna-enwe olileanya n’ebe Jehova nọ. Ụwa anyị bi n’ime ya na-akakwu njọ. (2 Tim. 3:13) Ekwensu akwụsịbeghị ịnwa ndị Chineke. N’agbanyeghị nsogbu ndị ga-abịa n’ọdịnihu, ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-arụsi ọrụ ike n’ofufe Jehova, obi esie anyị ike na “anyị tụkwasịrị Chineke dị ndụ obi.”—1 Tim. 4:10. w22.06 25 ¶17-18
Tọzdee, Nọvemba 28
Ọ bụrụ na m nwụọ, olee uru ọ bara? . . . Ájá ọ̀ ga-eto gị?—Ọma 30:9.
Otu ihe mere anyị kwesịrị iji na-agba mbọ ka ahụ́ na-agbasi anyị ike bụ na ọ ga-eme ka anyị jiri ike anyị niile na-ejere Jehova ozi. (Mak 12:30) N’ihi ya, anyị anaghị eme ihe ọ bụla anyị ma na ọ ga-emerụ anyị ahụ́ ma ọ bụ kpatara anyị ọrịa. (Rom 12:1) Ma, n’agbanyeghị ihe ọ bụla anyị mere, anyị agaghị egbochili ọrịa niile. Ma, anyị na-eme ike anyị niile n’ihi na anyị ma na ọ ga-egosi Nna anyị nke eluigwe na anyị ji ndụ o nyere anyị kpọrọ ihe. Ọrịa na nká nwere ike ime ka anyị ghara ịna-eme ọtụtụ ihe ndị anyị na-emebu. Ihe a nwere ike ime ka obi na-ajọ anyị njọ. Ma, o kwesịghị ime ka anyị gharazie ime ihe ndị ga-eme ka ahụ́ na-agbasi anyị ike. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na n’agbanyeghị ọrịa ma ọ bụ nká, anyị ka nwere ike ịna-eto Jehova otú ahụ Eze Devid mere. Obi dị anyị ụtọ na Jehova ji anyị kpọrọ ihe n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. (Mat. 10:29-31) Ọ bụrụgodị na anyị anwụọ, Jehova ga-achọsi ike ịkpọlite anyị. (Job 14:14, 15) Ebe ọ bụ na anyị dị ndụ, anyị kwesịrị ịgba mbọ na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ na-agbasi anyị ike. w23.02 20-21 ¶3-5
Fraịdee, Nọvemba 29
Onye ọ bụla nke kwuluru mmụọ nsọ, a gaghị agbaghara ya ruo mgbe ebighị ebi.—Mak 3:29.
Aha oké ìgwè mmadụ so n’atụrụ ọzọ ahụ ọ̀ ga-adị n’akwụkwọ nke ndụ ma Amagedọn gachaa? Ee. (Mkpu. 7:14) Jizọs kwuru na ndị a, ndị dị ka atụrụ, “ga-enweta ndụ ebighị ebi.” (Mat. 25:46) Ma ndị gafere Amagedọn agaghị enweta ndụ ebighị ebi ozugbo. N’ime otu puku (1,000) afọ ahụ Jizọs ga-achị, ọ “ga-azụ ha dị ka atụrụ, dugakwa ha n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.” Ndị a ga-ede aha ha n’akwụkwọ nke ndụ otú a na-agaghị ehichapụli ya ehichapụ bụ ndị rubeere Jizọs isi, nakwa ndị Jehova kpebiri na ha rubeere ya isi. (Mkpu. 7:16, 17) Ma, a ga-ebibi ndị bụ́ ewu n’Amagedọn. Jizọs sị na ha “ga-anwụ ruo mgbe ebighị ebi.” (Mat. 25:46) Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ gwa anyị na “a ga-ama ndị a ikpe. Ikpe a ga-ama ha bụ mbibi ebighị ebi a ga-ebibi ha.”—2 Tesa. 1:9; 2 Pita 2:9. w22.09 16 ¶7-8
Satọdee, Nọvemba 30
E nwere oge kwesịrị ekwesị maka ihe ọ bụla.—Ekli. 3:1.
Ezinụlọ nwere ike iji oge ha ji eleru ihe ndị Jehova kere anya gwurie egwu, ahụ́ eruokwa onye ọ bụla ala, si otú ahụ mee ka ha na ibe ha dịkwuo ná mma. Jehova kere ebe ndị mara mma n’ụwa anyị nwere ike ịnọ mee ihe ndị na-atọ anyị ụtọ. Ọ na-amasị ọtụtụ ezinụlọ ịnọkọta ọnụ n’ebe ha nwere ike ịhụ ihe ndị Chineke kere, n’ime obodo, n’ugwu, ma ọ bụ n’akụkụ osimiri. N’ụwa ọhụrụ, ndị nne na nna na ụmụ ha ga-enwe ụdị ọṅụ ha na-enwetụbeghị ka ha na-ekiri ihe ndị Jehova kere. N’oge ahụ, e nweghị ihe ọ bụla ga-eme ka anyị tụọ ụmụ anụmanụ ụjọ, hanwa agaghịkwa atụ anyị ụjọ. (Aịza. 11:6-9) Anyị ga-enwe oge buru ibu anyị ga-eji na-eleru ihe ndị Jehova kere anya. (Ọma 22:26) Ndị nne na nna, unu echela ruo oge ahụ tupu unu amalite inyere ụmụ unu aka ka ileru ihe ndị Chineke kere eke anya na-amasị ha. Ka i ji ihe ndị Jehova kere na-akụziri ụmụ gị ihe, ha ga-abịa ghọta na ihe Eze Devid kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Jehova, . . . e nweghị onye rụtụrụla ọrụ ndị ị rụrụ.”—Ọma 86:8. w23.03 25 ¶16-17