Otú E Si Eji Akwụkwọ A Agụ Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị
N’akwụkwọ a, ị ga-ahụ amaokwu Baịbụl a ga-agụ kwa ụbọchị na ihe a kọwara gbasara ya. I nwere ike ịgụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị mgbe ọ bụla ị chọrọ. Ma, ọ na-akara ọtụtụ ndị mma ịgụ ya n’ụtụtụ. Ọ na-eme ka ha nwee ike ịna-eche gbasara ihe ahụ ha gụrụ n’ụbọchị ahụ niile. Ọ na-akachakwa mma ma ezinụlọ gụkọọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị ọnụ. N’ụwa niile, ndị na-eje ozi na Betel na-agụkọ ya ọnụ ma ha richaa nri ụtụtụ.
E si n’Ụlọ Nche (w) Eprel 2022 ruo Mach 2023 nweta ihe ndị a kọwara gbasara amaokwu Baịbụl ndị ahụ. N’akụkụ ebe e dere Ụlọ Nche e si nweta ya, ị ga-ahụ peeji e si nweta ihe ahụ a kọwara. Nọmba ọzọ so ya bụ nọmba paragraf ebe o si. (Lee anya n’ihe e sere n’okpuru ebe a.) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe e kwuru n’ebe ahụ, i nweziri ike ịgụ isiokwu ahụ.