Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es25 p. 108-118
  • Nọvemba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọvemba
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
  • Isiokwu Nta
  • Satọdee, Nọvemba 1
  • Sọnde, Nọvemba 2
  • Mọnde, Nọvemba 3
  • Tuzdee, Nọvemba 4
  • Wenezdee, Nọvemba 5
  • Tọzdee, Nọvemba 6
  • Fraịdee, Nọvemba 7
  • Satọdee, Nọvemba 8
  • Sọnde, Nọvemba 9
  • Mọnde, Nọvemba 10
  • Tuzdee, Nọvemba 11
  • Wenezdee, Nọvemba 12
  • Tọzdee, Nọvemba 13
  • Fraịdee, Nọvemba 14
  • Satọdee, Nọvemba 15
  • Sọnde, Nọvemba 16
  • Mọnde, Nọvemba 17
  • Tuzdee, Nọvemba 18
  • Wenezdee, Nọvemba 19
  • Tọzdee, Nọvemba 20
  • Fraịdee, Nọvemba 21
  • Satọdee, Nọvemba 22
  • Sọnde, Nọvemba 23
  • Mọnde, Nọvemba 24
  • Tuzdee, Nọvemba 25
  • Wenezdee, Nọvemba 26
  • Tọzdee, Nọvemba 27
  • Fraịdee, Nọvemba 28
  • Satọdee, Nọvemba 29
  • Sọnde, Nọvemba 30
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
es25 p. 108-118

Nọvemba

Satọdee, Nọvemba 1

I meela ka ọnụ ụmụaka na ụmụ ọhụrụ too gị.​—Mat. 21:16.

Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere ụmụ gị aka ịkwadebe azịza ha ga-aza nke ga-adaba n’afọ ole ha dị. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịna-amụ ihe ndị dị ezigbo mkpa n’ọmụmụ ihe, dị ka nsogbu di na nwunye ma ọ bụkwanụ otú anyị ga-esi zere omume rụrụ arụ. Ma, e nwekwara ike inwe otu paragraf ma ọ bụ abụọ ụmụaka nwere ike ịza ajụjụ na ha. I kwesịkwara inyere ụmụ gị aka ka ha ghọta ihe mere na ọ bụghị mgbe ọ bụla ha weliri aka ka e nwere ike ịkpọ ha ka ha zaa ajụjụ. Ịkọwara ha ihe a ga-eme ka iwe ghara iwe ha ma a kpọọ ndị ọzọ ka ha zaa ajụjụ kama ịkpọ hanwa. (1 Tim. 6:18) Anyị niile ga-enweli ike ịkwadebe ezigbo azịza ga-eme ka e too Jehova ma gbaa ụmụnna anyị ume. (Ilu 25:11) Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịkọ ihe ụfọdụ gbasara onwe anyị, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị ghara ịna-ekwukarị gbasara onwe anyị. (Ilu 27:2; 2 Kọr. 10:18) Kama ime otú ahụ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka ihe kacha anyị mkpa bụrụ ikwu gbasara Jehova, Okwu ya, na ndị ya.​—Mkpu. 4:11. w23.04 24-25 ¶17-18

Sọnde, Nọvemba 2

Ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra otú ndị ọzọ na-ehi, kama ka anyị mụrụ anya ma na-eche echiche nke ọma.​—1 Tesa. 5:6.

Anyị kwesịrị inwe ịhụnanya ka anyị nwee ike ịmụrụ anya ma na-eche echiche nke ọma. (Mat. 22:37-39) Ịhụ Chineke n’anya ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’ozi ọma anyị na-ekwusa n’agbanyeghị nsogbu o nwere ike ịkpatara anyị. (2 Tim. 1:7, 8) Ebe ọ bụ na anyị hụrụ ndị na-anaghị efe Jehova n’anya, anyị na-ezi ozi ọma ọ bụrụgodị iji akwụkwọ ozi na ekwentị ezi ya. Anyị nwekwara olileanya na otu ụbọchị, ndị mmadụ ga-agbanwe ma bido ime ihe dị mma. (Ezik. 18:27, 28) Anyị kwesịkwara ịhụ ụmụnna anyị n’anya. Otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ ha n’anya bụ ‘ịna-agba ibe anyị ume ma na-eme ka ibe anyị dị ike.’ (1 Tesa. 5:11) Anyị na-agba ibe anyị ume otú ahụ ndị agha nọ n’ọgbọ agha na-emere ibe ha. Anyị anaghị akpachara anya eme ihe ga-ewute ụmụnna anyị ma ọ bụ jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọjọọ. (1 Tesa. 5:13, 15) Anyị na-egosikwa na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya ma anyị na-asọpụrụ ụmụnna ndị na-eduzi ọgbakọ.​—1 Tesa. 5:12. w23.06 9 ¶6; 11 ¶10-11

Mọnde, Nọvemba 3

Ọ bụrụ na [Jehova] kwuo ihe, ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ya?​—Ọnụ Ọgụ. 23:19.

Otu ụzọ anyị ga-esi eme ka okwukwe anyị na-esi ike bụ ịtụgharị uche n’ihe mgbapụta ahụ. Ihe mgbapụta ahụ na-eme ka obi sie anyị ike na nkwa Chineke kwere ga-emezurịrị. Ọ bụrụ na anyị echee echiche nke ọma gbasara ihe mere Chineke ji nye ihe mgbapụta ahụ nakwa ihe o furu ya, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike na nkwa Chineke kwere inye anyị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya ga-emezurịrị. Olee ihe mere anyị ji kwuo ya? Olee ihe o furu Jehova iji nye anyị ihe mgbapụta ahụ? Jehova zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, onye ya na ya kacha dịrị ná mma, ya esi n’eluigwe bịa a mụọ ya n’ụwa, ya abụrụ mmadụ zuru okè. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, e nweghị ụdị nsogbu ọ na-edighị. O mechara hụsie anya ma nwụọ ọnwụ ahụhụ. Ị̀ hụlanụ ihe o furu Jehova iji nye anyị ihe mgbapụta ahụ? Chineke anyị hụrụ anyị n’anya agaraghị ekwe ka Ọkpara ya bịa taa ahụhụ ma nwụọ ma ọ bụrụ na ihe ọma ndị anyị ga-enweta maka ya agaghị adịte aka. (Jọn 3:16; 1 Pita 1:18, 19) Ebe ọ bụ na o furu Jehova ihe dị otú a iji nye anyị ihe mgbapụta ahụ, obi siri anyị ike na ọ ga-ahụ na anyị dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ. w23.04 27 ¶8-9

Tuzdee, Nọvemba 4

Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị?​—Hos. 13:14.

Jehova ọ̀ chọrọ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ? À na-ajụkwa ajụ? O si n’ike mmụọ nsọ mee ka ụfọdụ ndị so dee Baịbụl dee nkwa o kwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọdịnihu. (Aịza. 26:19; Mkpu. 20:11-13) Ọ bụrụ na Jehova ekwe nkwa, ọ ga-emezurịrị ya. (Josh. 23:14) N’eziokwu, ọ na-agụsi Jehova agụụ ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Chegodị banyere ihe Job kwuru. Obi siri ya ike na ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-agụsi Jehova agụụ ike ịkpọlite ya n’ọnwụ. (Job 14:14, 15) Otú ahụkwa ka Jehova chọsiri ike ịkpọlite ndị ohu ya niile nwụrụ anwụ. Ọ na-agụsi ya agụụ ike ime ka ha dị ndụ ọzọ, ahụ́ agbasie ha ike, obi adịkwa ha ụtọ. Oleekwanụ otú obi dị ya maka ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ, ndị a na-enyeghị ohere ịmụta eziokwu gbasara Jehova? Chineke anyị hụrụ anyị n’anya chọkwara ịkpọlite hanwa. (Ọrụ 24:15) Ọ chọrọ ka e nye ha ohere ịghọ ndị enyi ya, ha adịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa.​—Jọn 3:16. w23.04 9 ¶5-6

Wenezdee, Nọvemba 5

Ọ bụ Chineke ga-enye anyị ike. ​—Ọma 108:13.

Olee otú ị ga-esi eme ka olileanya i nwere sikwuo ike? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa, gụọ amaokwu Baịbụl ndị kọwara otú Paradaịs ga-adị, tụgharịakwa uche na ha. (Aịza. 25:8; 32:16-18) Chee gbasara otú ndụ ga-adị n’ụwa ọhụrụ. Were ya na ị na-ahụ onwe gị ebe ahụ. Ọ bụrụ na anyị ana-eche mgbe niile banyere ụwa ọhụrụ anyị na-atụ anya ya, nsogbu ndị anyị nwere ga-adị anyị ka ihe na-anaghị “adịte aka, idi ha na-adịkwa mfe.” (2 Kọr. 4:17) Jehova ga-eji olileanya o nyere gị mee ka ị dị ike. O nyela gị ihe ndị ga-eme ka ị dị ike. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ị chọrọ enyemaka iji rụọ ọrụ e nyere gị, iji die ọnwụnwa ndị na-abịara gị, ma ọ bụkwanụ iji na-enwe obi ụtọ, rịọsie Jehova arịrịọ ike n’ekpere, mụọkwa ihe n’onwe gị ka ị hụ otú Jehova ga-esi enyere gị aka. Kwe ka ụmụnna gị gbaa gị ume. Mee ka olileanya i nwere sie ike n’obi gị. I mee ihe ndị a, ‘Chineke ga-eji ike ya dị ebube mee ka ị dị ike, ka i wee na-atachi obi n’ihe niile, jirikwa ọṅụ na-edi ihe niile.’​—Kọl. 1:11. w23.10 17 ¶19-20

Tọzdee, Nọvemba 6

Na-ekelenụ Chineke maka ihe niile.​—1 Tesa. 5:18.

E nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-ekele Jehova n’ekpere anyị. Anyị nwere ike ikele ya maka ihe ọma ọ bụla anyị nwere. A sị ka e kwuwe, ihe ọma ọ bụla anyị nwere si n’aka ya. (Jems 1:17) Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịgwa ya otú obi si atọ anyị ụtọ maka ụwa mara mma o nyere anyị, nakwa maka otú ihe ndị o kere eke si atụ anyị n’anya. Anyị nwekwara ike ikele ya maka ndụ anyị dị, ndị ezinụlọ anyị, ndị enyi anyị, nakwa maka olileanya o nyere anyị. Anyị kwesịkwara ịna-ekele Jehova maka otú o si kwe ka anyị na ya dị ná mma. O nwere ike ịdị mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị gbaa mbọ chee gbasara ihe ndị mere o kwesịrị iji na-ekele Jehova. Anyị bi n’ụwa ndị mmadụ na-anaghị ekele ndị meere ha ihe. Ihe na-aka ndị mmadụ mkpa bụ ihe ndị ha chọrọ inweta, ọ bụghị otú ha ga-esi gosi na obi dị ha ụtọ maka ihe ndị ha nwere. Ọ bụrụ na anyị amụta àgwà ahụ, ekpere anyị nweziri ike ịbụ naanị arịrịọ. Ọ bụrụ na anyị achọghị ka nke ahụ mee, anyị kwesịrị ịgbalị na-amụta ikele Jehova maka ihe niile ọ na-emere anyị.​—Luk 6:45. w23.05 4 ¶8-9

Fraịdee, Nọvemba 7

O kwesịrị inwe okwukwe mgbe ọ na-arịọ ya. O kwesịghị inwe obi abụọ ọ bụla.​—Jems 1:6.

Ọ na-ewute Nna anyị hụrụ anyị n’anya bụ́ Jehova ma anyị na-ata ahụhụ. (Aịza. 63:9) Ma, ọ naghị ewepụrụ anyị nsogbu anyị niile. E nwere ike iji nsogbu ndị ahụ tụnyere osimiri ma ọ bụ ọkụ. (Aịza. 43:2) Ma, o kwere anyị nkwa na ọ ga-enyere anyị aka ‘ịgafe’ ha. Ọ gaghị ekwe ka nsogbu ndị na-abịara anyị mee ka anyị kwụsị ife ya. Jehova na-enyekwa anyị mmụọ nsọ ya nke na-enyere anyị aka idi nsogbu ndị anyị nwere. (Luk 11:13; Fil. 4:13) N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa iji die nsogbu anyị, nọsiekwa ike n’ofufe ya. Jehova chọrọ ka anyị tụkwasị ya obi. (Hib. 11:6) Mgbe ụfọdụ, nsogbu na-abịara anyị na-eyi ihe anyị na-agaghị edili. Anyị nwedịrị ike ịna-enwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ ga-enyekwara anyị aka. Ma, Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enye anyị ike anyị ga-eji ‘wụfee mgbidi.’ (Ọma 18:29) N’ihi ya, kama ịnọ na-enwe obi abụọ, anyị kwesịrị ikpe ekpere, nwee okwukwe siri ike na Jehova ga-aza ekpere anyị.​—Jems 1:6, 7. w23.11 22 ¶8-9

Satọdee, Nọvemba 8

Ịhụnanya . . . dị ka ọkụ na-enwusi ike, bụ́ ọkụ nke Jaa. Mmiri na-ekwo ekwo enweghị ike imenyụ ịhụnanya, osimiri enweghịkwa ike ibupụ ya.​—Abụ Solo. 8:6, 7.

Otú a e si kọwaa ịhụnanya magburu onwe ya. Ọ na-emesi di na nwunye obi ike na ha ga-ahụli ibe ha n’anya n’eziokwu. Ọ bụ di na nwunye ka ọ dị n’aka ịgba mbọ ka ha na-ahụ ibe ha n’anya ụbọchị niile ha dị ndụ. Iji maa atụ, ọkụ a kwanyere akwanye nwere ike inwuru na-aga naanị ma a na-etinyekwu ya nkụ. A hapụ ya, ọ ga-emecha nyụọ. Otú ahụkwa ka ịhụnanya di na nwunye dị. O nwere ike isi ike ruo oge niile ha dị ndụ ma ọ bụrụ na ha ana-agba mbọ ka ha na-adịkwu ná mma. Mgbe ụfọdụ, di na nwunye nwere ike ịchọpụta na ịhụnanya ha ajụwala oyi, karịchaa, ma ọ bụrụ na ihe na-esiri ha ike n’ihi ụkọ ego, ọrịa, ma ọ bụ nsogbu dị n’ịzụ ụmụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na di na nwunye achọghị ka “ọkụ nke Jaa” nyụọ, ha kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma. w23.05 20-21 ¶1-3

Sọnde, Nọvemba 9

Atụla egwu.​—Dan. 10:19.

Iji nwee obi ike, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Nne na nna anyị nwere ike ịna-agwa anyị ka anyị nwee obi ike. Mana, ha agaghị ekenyeli anyị obi ike ha nwere otú ahụ nna si ekenye ụmụ ya akụ̀ ya. Ịmụta inwe obi ike dị ka ịmụta aka ọrụ. Otu ụzọ i nwere ike isi mụta aka ọrụ bụ ile onye na-akụziri gị ya anya nke ọma, na-emekwa ihe o mere. Otú ahụ ka inwe obi ike dị. Ọ bụrụ na anyị ana-ele ndị ọzọ nwere obi ike anya nke ọma, na-emekwa ka ha, anyị ga-amụta inwe obi ike. Dị ka Daniel, anyị kwesịrị ịma Okwu Chineke nke ọma. Anyị ga-agba mbọ ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-agwa ya okwu mgbe niile, na-agwakwa ya otú obi dị anyị. Anyị kwesịkwara ịtụkwasị Jehova obi, obi esie anyị ezigbo ike na ọ ga-akwado anyị mgbe niile. Ọ bụrụzie na ọnwụnwa abịara anyị, anyị ga-enwe obi ike. Ndị mmadụ na-akwanyekarịrị ndị nwere obi ike ùgwù. O nwekwara ike ime ka ndị nwere ezi obi bịa mata gbasara Jehova. O doro anya na e nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwesị inwe obi ike. w23.08 2 ¶2; 4 ¶8-9

Mọnde, Nọvemba 10

Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile.​—1 Tesa. 5:21.

A na-eji okwu Grik e si sụgharịta “na-achọpụta” akọwa ihe a na-eme mgbe a chọrọ ile ma ihe ndị dị ka ọlaọcha na ọlaedo hà bụ nke ezigbo ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-achọpụta ma ihe anyị nụrụ ma ọ bụ ihe anyị gụrụ ọ̀ bụ eziokwu. Ọ ga-adịkwu ezigbo mkpa ka anyịnwa mee otú ahụ ka oké mkpagbu na-eru nso. Kama ịna-ekwere ihe ọ bụla ndị mmadụ kwuru, anyị kwesịrị ịna-eche echiche nke ọma ma mata ma ihe anyị nụrụ ma ọ bụ ihe anyị gụrụ ọ̀ dabara n’ihe Baịbụl na nzukọ Jehova kwuru. Anyị mee otú ahụ, a gaghị eji ozi si n’aka ndị mmụọ ọjọọ duhie anyị. (Ilu 14:15; 1 Tim. 4:1) Anyị ma na a ga-azọpụta ndị Jehova n’oké mkpagbu. Ma, anyị amaghị ihe ga-eme onye nke ọ bụla n’ime anyị echi. (Jems 4:14) N’agbanyeghị ya, ma ànyị ga-adị ndụ gafee oké mkpagbu ma ànyị ga-anwụ tupu ya abịa, a ga-eji ndụ ebighị ebi kwụọ anyị ụgwọ ma ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi. Ka anyị niile lekwasị anya n’olileanya magburu onwe ya anyị nwere ma dịrị njikere maka ụbọchị Jehova. w23.06 13 ¶15-16

Tuzdee, Nọvemba 11

[Ọ na-eme] ka ndị amụma ya mara ihe ọ na-achọghị ka ndị ọzọ mara.​—Emọs 3:7.

Anyị amaghị otú amụma ụfọdụ dị na Baịbụl ga-esi emezu. (Dan. 12:8, 9) Ma, naanị na anyị aghọtaghị kpọmkwem otú amụma ga-esi emezu apụtaghị na amụma ahụ agaghị emezu. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ịghọta ihe anyị kwesịrị ime n’oge dabara adaba otú ahụ o mere n’oge gara aga. A ga-eti mkpu, sị: “Udo adịla, obi eruokwala anyị ala!” (1 Tesa. 5:3) Mgbe ahụ, ndị ọchịchị ụwa ga-alụso okpukpe ụgha ọgụ ma bibie ya. (Mkpu. 17:16, 17) Ha ga-abịazi ịlụso ndị Chineke ọgụ. (Ezik. 38:18, 19) Ihe ndị a ga-eme ka agha Amagedọn, bụ́ agha ikpeazụ, bido. (Mkpu. 16:14, 16) Obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ndị a ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ma, tupu mgbe ahụ, ka anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya na-emere anyị. Otú anyị ga-esi egosi ya bụ ịna-ege ntị n’amụma ndị dị na Baịbụl, na-enyekwara ndị ọzọ aka ime otú ahụ. w23.08 13 ¶19-20

Wenezdee, Nọvemba 12

Ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya, n’ihi na ịhụnanya si n’aka Chineke.​—1 Jọn 4:7.

Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu gbasara okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ihe o ji mechie okwu ya bụ: “Nke kacha [n’àgwà a] niile bụ ịhụnanya.” (1 Kọr. 13:13) Gịnị mere Pọl ji kwuo ihe ahụ? N’ọdịnihu, ọ gaghị adị mkpa ka anyị nwee okwukwe ná nkwa ndị Chineke kwere gbasara ụwa ọhụrụ ma ọ bụkwanụ nwee olileanya na nkwa ndị ahụ ga-emezu n’ihi na ha emezuola. Ma, anyị ka kwesịrị ịna-ahụ Jehova na ndị mmadụ n’anya mgbe niile. N’eziokwu, anyị ga na-ahụkwu ha n’anya ruo mgbe ebighị ebi. Ihe ọzọ bụ na ọ bụ ịhụnanya ka e ji amata ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya, mmadụ niile ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” (Jọn 13:35) Ihe ọzọ bụ na ịhụ ibe anyị n’anya na-eme ka anyị dịrị n’otu. Pọl kpọrọ ịhụnanya ihe “na-eme ka mmadụ niile dịrị n’otu.” (Kọl. 3:14) Jọn onyeozi degaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ ozi, sị: “Onye ọ bụla hụrụ Chineke n’anya kwesịkwara ịhụ nwanna ya n’anya.” (1 Jọn 4:21) Ọ bụrụ na anyị egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya, ọ na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya. w23.11 8 ¶1, 3

Tọzdee, Nọvemba 13

Tụfuo ibu arọ ọ bụla.​—Hib. 12:1.

Baịbụl ji ndụ Ndị Kraịst tụnyere ịgba ọsọ. A ga-eji ndụ ebighị ebi kwụọ ndị gbaruru ọsọ ahụ n’isi ụgwọ ọrụ. (2 Tim. 4:7, 8) Anyị kwesịrị ime ike anyị niile ka anyị ghara ịkwụsị ịgba ọsọ ahụ, karịchaa, n’ihi na ọsọ ahụ agwụwala agwụ. Pọl onyeozi kwuru ihe ndị ga-enyere anyị aka imeri n’ọsọ ahụ. Ọ gwara anyị ka anyị “tụfuo ibu arọ ọ bụla . . . Ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ anyị na-agba.” Ihe Pọl na-ekwu ọ̀ bụ na e nweghị ibu Onye Kraịst kwesịrị iburu? Ọ bụghị ihe ọ na-ekwu. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na anyị kwesịrị ịtụfu ibu ọ bụla na-adịghị mkpa. Ụdị ibu ndị a nwere ike ịdọla anyị azụ, mee ka ike gwụ anyị. Anyị chọọ ịna-atachi obi, anyị kwesịrị ịchọpụta ozugbo ibu ọ bụla nwere ike ịdọla anyị azụ ma tụfuo ya n’egbughị oge. Ma, anyị ekwesịghịkwanụ ịtụfu ibu ndị anyị kwesịrị iburu. Ma ọ́ bụghị ya, anyị agaghịzi eru eru ịgba ọsọ ahụ.​—2 Tim. 2:5. w23.08 26 ¶1-2

Fraịdee, Nọvemba 14

Ka ihe kacha unu mkpa ghara ịbụ ịchọ mma elu ahụ́.​—1 Pita 3:3.

Ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị na-enyere anyị aka ka anyị ghara isi ọnwụ ka ndị mmadụ hapụ ihe ha kpebiri mewe nke anyị. Dị ka ihe atụ, ọ na-amasị ụfọdụ ụmụnna anyị nwaanyị itecha ntecha. Ma, e nwere ndị ọ na-anaghị amasị. Ụfọdụ Ndị Kraịst na-aṅụ mmanya na-aba n’anya, ma ha anaghị aṅụfe ya ókè. Mana, e nwere ndị nke kpebiri na ha agaghị aṅụ ya chaa chaa. Ndị Kraịst niile chọrọ ka ahụ́ na-agbasi ha ike, ma ihe ha na-ekpebi gbasara otú a ga-esi agwọ ha ọrịa na-adị iche iche. Ọ bụrụ na anyị ekwetasie ike na ihe anyị kpebiri ime kacha mma ma gbalịwa ka ndị ọzọ kweta ime ka anyị, o nwere ike ime ka ụfọdụ ụmụnna zọhie ụkwụ. O nwekwara ike ịkpata esemokwu. (1 Kọr. 8:9; 10:23, 24) Dị ka ihe atụ, Jehova anaghị agwa anyị uwe anyị ga-eyi na nke anyị na-agaghị eyi. Kama, ọ gwara anyị ihe ga-enyere anyị aka ịhọrọ ụdị uwe anyị ga-eyi. Anyị kwesịrị ịna-eji ejiji otú gosiri na anyị bụ ndị ozi Chineke, ndị na-eche echiche nke ọma, ndị na-emeru ihe n’ókè, nakwa ndị “na-ele ihe anya otú dị mma.” (1 Tim. 2:9, 10) N’ihi ya, anyị anaghị achọ ka ndị mmadụ lewe anyị n’ihi ụdị uwe anyị yi. Ihe Baịbụl kwuru na-enyekwara ndị okenye aka ka ha ghara inye iwu gbasara ụdị uwe mmadụ ga-eyi, ma ọ bụ ụdị isi mmadụ ga-eme ma ọ bụkwanụ ụdị isi mmadụ ga-akpụ. w23.07 23-24 ¶13-14

Satọdee, Nọvemba 15

Geenụ m ntị nke ọma ma rie ihe dị mma. Mgbe ahụ ka nri na-edozi ahụ́ ga-atọ unu ezigbo ụtọ.​—Aịza. 55:2.

Jehova gosiri anyị otú anyị ga-esi enwe obi ụtọ n’ọdịnihu. Ihe na-abụ mkpa ndị na-aza òkù “nwaanyị nzuzu” nke na-eme mkpọtụ na-akpọ ndị mmadụ bụ ihe “na-atọ ụtọ,” ya bụ, iji omume rụrụ arụ na-ekpori ndụ. Ihe ọ ga-akpatara ha bụ na ha ga-aba “n’ime ime ili.” (Ilu 9:13, 17, 18) Ma ihe ndị zara òkù “ezigbo amamihe” na-enweta dị ezigbo iche. (Ilu 9:1) Anyị na-amụta ịhụ ihe Jehova hụrụ n’anya n’anya ma kpọọ ihe ọ kpọrọ asị asị. (Ọma 97:10) Obi na-adịkwa anyị ụtọ ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa rite uru n’aka “ezigbo amamihe.” Ọ dị nnọọ ka à ga-asị na anyị nọ “n’ebe ndị dị elu n’obodo na-akpọ ndị mmadụ òkù, sị: ‘Onye ọ bụla na-amaghị ihe, ya bata ebe a.’” Ọ bụghị naanị ná ndụ anyị dị ugbu a ka ọ na-abara anyị na ndị na-aza òkù ahụ uru. Uru anyị na-erite na-adịgide adịgide. Ọ ga-eme ka anyị nwee ike ‘ịdị ndụ’ ebighị ebi ka anyị ‘na-ebi ndụ otú na-egosi na anyị na-aghọta ihe.’​—Ilu 9:3, 4, 6. w23.06 24 ¶17-18

Sọnde, Nọvemba 16

Onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ ka dike mma, onye na-ejide onwe ya ma iwe wewe ya kakwa onye meriri obodo mma.​—Ilu 16:32.

Olee otú obi na-adị gị ma onye gị na ya na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ nwa klas gị jụọ gị gbasara ihe i kweere? Ụjọ ọ̀ na-atụwa gị? Ọ na-atụ ọtụtụ n’ime anyị. Ma, ihe onye ahụ jụrụ anyị nwere ike inyere anyị aka ịghọta ihe ọ na-eche ma ọ bụ ihe o kweere. Ọ ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe izi ya ozi ọma. Ma, mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike ịjụ anyị ajụjụ otú na-egosi na o kwetaghị ihe anyị kwuru ma ọ bụ na ọ chọrọ ka anyị na ya rụwa ụka. O kwesịghị iju anyị anya. A sị ka e kwuwe, a kọọrọ ụfọdụ n’ime ha ihe na-abụghị eziokwu gbasara ihe anyị kweere. (Ọrụ 28:22) Ihe ọzọ bụ na anyị bi ‘n’oge ikpeazụ,’ oge ọtụtụ ndị “na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla,” bụrụkwa “ndị tigbuo zọgbuo.” (2 Tim. 3:1, 3) I nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee otú m ga-esi wetuo obi ma ọ bụ jiri olu ọma zaghachi mmadụ ma ọ chọọ ka anyị rụwa ụka gbasara ihe m kweere?’ Gịnị ga-enyere gị aka? Ọ bụ ịdị nwayọọ. Onye dị nwayọọ anaghị ewe iwe ngwa ngwa. Kama, ọ na-ejide onwe ya mgbe a kpasuru ya iwe ma ọ bụ mgbe ọ na-amaghị ihe ọ ga-aza. w23.09 14 ¶1-2

Mọnde, Nọvemba 17

Ị ga-eme ha ndị isi n’ụwa niile. ​—Ọma 45:16.

Mgbe ụfọdụ, nzukọ Jehova na-enye anyị ntụziaka ndị na-echebe anyị. Dị ka ihe atụ, a na-adọ anyị aka ná ntị gbasara ịhụ ego n’anya nakwa gbasara ime ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka anyị mebie iwu Chineke. Jehova na-agọzikwa anyị ma anyị soro ntụziaka o nyere anyị n’ihe ndị a. (Aịza. 48:17, 18; 1 Tim. 6:9, 10) O doro anya na Jehova ka ga-eji ụmụ mmadụ na-eduzi ndị ya n’oge oké mkpagbu nakwa n’ime otu puku afọ Kraịst ga-achị. Ànyị ga-eso nduzi Jehova? Ihe ga-ekpebi ihe anyị ga-eme n’oge ahụ bụ otú anyị si eso nduzi Jehova na-enye anyị taa. N’ihi ya, ka anyị na-eso nduzi Jehova mgbe niile, ma nke o si n’aka ụmụ nwoke ọ họpụtara ilekọta anyị na-enye anyị. (Aịza. 32:1, 2; Hib. 13:17) Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị kwesịrị ịtụkwasị Onye Ndú anyị bụ́ Jehova obi na ọ ga-edu anyị ka ihe ọ bụla ghara ime adịm ná mma anyị na ya, duruokwa anyị ebe anyị na-aga, ya bụ, n’ụwa ọhụrụ, ebe anyị ga-adị ndụ ebighị ebi. w24.02 25 ¶17-18

Tuzdee, Nọvemba 18

Ọ zọpụtala unu n’ihi amara ya. ​—Efe. 2:5.

Obi dị Pọl onyeozi ụtọ ife Jehova. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ọ dịịrị ya mfe. Ọtụtụ mgbe, Pọl gara ebe dị ezigbo anya. Ime njem n’oge ahụ adịghị mfe. N’ụfọdụ njem Pọl mere, ọ ‘hụsiri anya ma n’osimiri ma n’aka ndị ohi.’ E nwekwara mgbe ndị mmegide tiri ya ihe. (2 Kọr. 11:23-27) Ọ bụghịkwa mgbe niile ka ụmụnna mere ihe gosiri na obi dị ha ụtọ maka mbọ ọ na-agba inyere ha aka. (2 Kọr. 10:10; Fil. 4:15) Gịnị nyeere Pọl aka ịnọsi ike n’ozi Jehova? Pọl si na Baịbụl nakwa n’ihe ndị mere ná ndụ ya mụta àgwà ndị Jehova nwere. Obi siri Pọl ike na Jehova hụrụ ya n’anya. (Rom 8:38, 39; Efe. 2:4, 5) O mekwara ka ọ hụ Jehova n’anya nke ukwuu. Otú Pọl si gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya bụ ‘ijere ndị nsọ ozi ma ka na-ejere ha ozi.’​—Hib. 6:10. w23.07 9 ¶5-6

Wenezdee, Nọvemba 19

Na-erubere ndị ọchịchị isi.​—Rom 13:1.

Ọtụtụ ndị kwetara na e kwesịrị inwe ndị ọchịchị, nakwa na e kwesịrị ịna-erubere ụfọdụ n’ime iwu “ndị ọchịchị” nyere isi. Ma, ọ na-esikwara otu ndị ahụ ike irubere ndị ọchịchị isi ma ọ bụrụ na iwu ahụ adịghị ha mma ma ọ bụ na ha chere na o zighị ezi. Baịbụl kwuru na ọchịchị ụmụ mmadụ na-akpata ahụhụ, na ọ dị n’aka Ekwensu, nakwa na a ga-ebibi ya n’oge na-adịghị anya. (Ọma 110:5, 6; Ekli. 8:9; Luk 4:5, 6) Ọ gwakwara anyị na “onye ọ bụla na-emegide ndị ọchịchị na-agba ihe Chineke haziri ụkwụ.” Ka ọ dị ugbu a, Jehova kwere ka ndị ọchịchị na-achị ka ihe ụfọdụ nwee ike ịna-aga otú o kwesịrị. Ọ na-atụkwa anya ka anyị na-erubere ha isi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ‘ịna-enye mmadụ niile ihe ruuru ha,’ ya bụ, ma ịtụ ụtụ isi, ma ịsọpụrụ ha, ma irubere ha isi. (Rom 13:1-7) Anyị nwere ike iwere iwu ụfọdụ ha nyere ka ihe na-akpata nsogbu, ihe na-adịghị mma, ma ọ bụ ihe siri ike ndebe. Ma, anyị na-erubere Jehova isi. Jehova gwakwara anyị ka anyị na-erubere ndị ọchịchị isi ma ọ bụrụ na ihe ha gwara anyị mee abụghị imebi iwu Chineke.​—Ọrụ 5:29. w23.10 8 ¶9-10

Tọzdee, Nọvemba 20

Mmụọ Jehova wee mee ka ọ dị ike.​—Ikpe 15:14.

Mgbe a mụrụ Samsịn, ndị Filistia na-achị ndị Izrel, na-emegbukwa ha. (Ikpe 13:1) Ndị Izrel tara ezigbo ahụhụ n’ihi otú ndị Filistia si emekpọ ha ọnụ. Jehova họọrọ Samsịn ka ‘ọ malite ịzọpụta ndị Izrel n’aka ndị Filistia.’ (Ikpe 13:5) Samsịn kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi iji rụọ ọrụ a o nyere ya. N’otu oge, ndị agha ndị Filistia bịara ijide Samsịn na Lihaị. O nwere ike ịbụ na Lihaị dị na Juda. Ndị Juda tụrụ ezigbo egwu. N’ihi ya, ha kpebiri ịkpọrọ Samsịn kpọnye ndị iro ya. Ndị obodo Samsịn ji ụdọ ọhụrụ abụọ kee Samsịn ma kpọpụta ya, kpọnye ya ndị Filistia. (Ikpe 15:9-13) Ma, ‘mmụọ Jehova mere ka ọ dị ike,’ mee ka ụdọ ahụ e ji kee ya dọbisịa. ‘Ọ hụziri ọkpụkpụ agba oké jakị nke na-akpọbeghị nkụ,’ were ya kụgbuo otu puku (1,000) ụmụ nwoke ndị Filistia.​—Ikpe 15:14-16. w23.09 2-3 ¶3-4

Fraịdee, Nọvemba 21

Ihe a ka Chineke zubere, ma n’oge gara aga ma n’ọdịnihu, na ọ ga-esi n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị mezuo.​—Efe. 3:11.

Jehova ejirila nwayọọ nwayọọ mee ka anyị si na Baịbụl mata ‘ihe o zubere, ma n’oge gara aga ma n’ọdịnihu.’ Jehova nwere ike isi n’ụzọ dị iche iche mezuo nzube ya. Ọ na-emezukwa ihe ọ bụla ọ chọrọ n’ihi na ọ “na-eme ka ihe niile mezuo nzube ya.” (Ilu 16:4) Ihe Jehova na-eme ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi. Gịnị bụ nzube Jehova? Oleekwa ihe ụfọdụ ọ gbanwere iji mezuo nzube ya? Chineke gwara nwoke na nwaanyị mbụ ihe bụ́ nzube ya maka ha. Ha ga-amụ ‘ọmụmụ, baa ụba, ju n’ụwa, na-elekọtakwa ya, ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ anọrọ n’okpuru ha.’ (Jen. 1:28) Mgbe Adam na Iv nupụrụ isi ma mee ka mmadụ niile nọ n’ụwa bụrụ ndị mmehie, nzube Jehova agbanweghị. Kama, ọ gbanwere otú nzube ya ahụ ga-esi mezuo. Ozugbo ahụ, o kpebiri na ọ ga-ehiwe otu Alaeze n’eluigwe nke ga-emezu nzube mere o ji kee ụwa na ụmụ mmadụ.​—Mat. 25:34. w23.10 20 ¶6-7

Satọdee, Nọvemba 22

A sị na Jehova anaghị enyere m aka, m gaarala anwụ kemgbe.​—Ọma 94:17.

Jehova nwere ike inyere anyị aka ịnọsi ike n’ofufe ya. O nwere ike isiri anyị ike ịnọsi ike n’ofufe Jehova, karịchaa ma ọ bụrụ na e nwere àgwà na-adịghị mma anyị na-agbalị ịkwụsị kemgbe ọtụtụ afọ. Mgbe ụfọdụ, ụdị àgwà ahụ nwere ike iyi ihe siri ike ịkwụsị karịa nke Pita onyeozi. Ma Jehova nwere ike inye anyị ike ka anyị ghara ịda mbà. (Ọma 94:18, 19) Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna ya na ụmụ nwoke ibe ya nwere mmekọahụ ruo ọtụtụ afọ tupu ya amụta eziokwu. Ọ gbanwere ndụ ya kpamkpam ma na-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru. Ma, e nwere mgbe ụfọdụ echiche ọjọọ na-abata ya n’obi. Olee ihe nyeere ya aka ịnọsi ike n’ofufe Jehova? Ọ sịrị: “Jehova na-enye anyị ike.” Ọ sịkwara: “Mmụọ Jehova enyerela m aka . . . ịmụta na m ga-anọsili ike n’eziokwu . . . Jehova ji m na-arụ ọrụ. N’agbanyeghị na mụ ezughị okè, ọ ka na-enye m ike.” w23.09 23 ¶12

Sọnde, Nọvemba 23

Ịdị umeala n’obi na ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ baa ọgaranya, dịrị ndụ ma bụrụ onye a na-akwanyere ùgwù.​—Ilu 22:4.

Ụmụnna nwoke na-eto eto, unu agaghị abụ Ndị Kraịst tozuru etozu n’agbaghị mbọ ọ bụla. Unu kwesịrị ịchọta ndị na-akpa àgwà ọma unu ga na-eme ka ha. Mụtanụ ịna-echebara ihe echiche, ịbụ ndị a ga-atụkwasịli obi, nakwa àgwà ndị ga-abara unu uru ná ndụ ma kwadebe maka ọrụ ndị unu ga-arụ n’ọdịnihu. Mgbe ụfọdụ, i chechaa ọrụ ndị ị ga-arụ n’ọdịnihu, o nwere ike ịdị gị ka ị gaghị arụli ha. Ma, ị ga-arụli ha. Cheta na Jehova chọsiri ike inyere gị aka. (Aịza. 41:10, 13) Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụnna gị n’ọgbakọ ga-enyekwara gị aka. Ọ bụrụ na ị ghọọ Onye Kraịst tozuru etozu, ndụ gị ga-aka mma, gị ana-enwekwa obi ụtọ. Anyị hụrụ unu bụ́ ụmụ nwoke na-eto eto n’anya. Ka Jehova gọzie unu nke ukwuu ka unu na-agbalịsi ike ugbu a ịbụ Ndị Kraịst tozuru etozu. w23.12 29 ¶19-20

Mọnde, Nọvemba 24

Leghara ihe ọjọọ e mere [gị] anya.​—Ilu 19:11.

Ka e were ya na gị na ụmụnna gara nnọkọ. Unu kporiri ndụ ná nnọkọ ahụ ma see foto. Unu sedịrị foto abụọ ọzọ, a dịghị ama ama ya abụrụ na nke mbụ ahụ adịghị mma. Ugbu a, unu enweela foto atọ. Ma, n’otu n’ime ha, e nwere otu nwanna ihu ya gbarụrụ agbarụ. N’ihi ya, ị ga-ewepụ ya n’ihi na ị ka nwere foto abụọ ọzọ ebe ụmụnna niile na-achị ọchị, ma nwanna ahụ. A na-enwekarị oge anyị na ụmụnna anyị ji nọrịa, mee ihe ndị tọrọ anyị ụtọ. Ma, ka e were ya na e nwere otu oge nwanna kwuru ma ọ bụ mee ihe na-adịghị mma. Gịnị ka anyị kwesịrị ime gbasara ya? Anyị kwesịrị ịgbalị chefuo ya n’ihi na e nwere ihe ndị ọzọ dị mma gbasara onye ahụ anyị kwesịrị ịna-echeta. (Efe. 4:32) Anyị ga-echefuli ihe ahụ n’ihi na e nwere oge ndị ọzọ dị mma anyị na ya nọrịrị. Ọ bụ ụdị ihe ndị a ka anyị kwesịrị ịna-echeta ma jiri ha kpọrọ ihe. w23.11 12-13 ¶16-17

Tuzdee, Nọvemba 25

Ka ụmụ nwaanyị na-eji ejiji dị mma, . . . otú ụmụ nwaanyị ndị na-efe Chineke kwesịrị ịna-eme. ​—1 Tim. 2:9, 10.

Okwu Grik a sụgharịrị ihe a Pọl kwuru ebe a na-egosi na nwaanyị bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịna-eji ejiji otú a ga na-akwanyere ya ùgwù nakwa otú na-egosi na ọ na-eche gbasara otú obi na-adị ndị ọzọ. Anyị ji ụmụnna nwaanyị na-eme ihe a Pọl kwuru ebe a eme ọnụ. Nghọta bụ àgwà ọzọ dị mkpa ụmụ nwaanyị niile bụ́ Ndị Kraịst tozuru etozu kwesịrị inwe. Gịnị bụ nghọta? Ọ bụ mmadụ inwe ikike ịmata ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi ma mee ihe ziri ezi. Ka anyị kwuo gbasara Abigel. Di ya mere mkpebi na-adịghị mma ga-akpatara ndị niile bi n’ụlọ ya nsogbu. Abigel mere ihe ozugbo. Ihe ahụ o mere zọrọ ọtụtụ ndị ndụ. (1 Sam. 25:14-23, 32-35) Nghọta na-enyekwara anyị aka ịma mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu na mgbe anyị kwesịrị ịgba nkịtị. Ọ na-eme ka anyị ghara imenye ndị ọzọ ihere ebe anyị na-egosi ha na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ.​—1 Tesa. 4:11. w23.12 20 ¶8-9

Wenezdee, Nọvemba 26

Ka anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi na anyị nwere olileanya na anyị ga-enweta ebube Chineke.​—Rom 5:2.

Ọ bụ ọgbakọ dị na Rom ka Pọl onyeozi degaara ihe ndị a. Ụmụnna ndị o degaara akwụkwọ ozi ahụ amụtala banyere Jehova na Jizọs, nwee okwukwe, ghọọkwa Ndị Kraịst. N’ihi ya, Chineke ‘kpọrọ ha ndị ezi omume maka na ha nwere okwukwe.’ O jikwa mmụọ nsọ ya tee ha mmanụ. (Rom 5:1) N’eziokwu, ha nwere olileanya magburu onwe ya. Obi sikwara ha ike na ọ ga-emezu. Pọl mechara degara Ndị Kraịst e tere mmanụ n’Efesọs akwụkwọ ozi gbasara olileanya Chineke mere ka ha nwee. Ihe so n’olileanya ahụ bụ inweta ‘ihe ọma dị ebube o kwere nkwa inye ndị nsọ.’ (Efe. 1:18) Pọl chetakwaara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi ebe ha ga-enweta ụgwọ ọrụ ha. Ọ kpọrọ ya ‘olileanya inweta ihe e doweere ha n’eluigwe.’ (Kọl. 1:4, 5) N’ihi ya, olileanya Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere bụ na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha adịrị ndụ ebighị ebi n’eluigwe, bụ́ ebe ha ga-eso Kraịst chịa.​—1 Tesa. 4:13-17; Mkpu. 20:6. w23.12 9 ¶4-5

Tọzdee, Nọvemba 27

Udo Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ, [ga-eche] obi unu na echiche unu nche.​—Fil. 4:7.

Okwu Grik e si sụgharịta “iche nche” bụ okwu ndị agha. A na-ejikarị ya akọwa otú ndị agha na-esi eche obodo nche ka aka ndị iro ghara ịkpara ya. Ọ bụrụ na ndị agha ana-eche obodo nche, obi na-eru ndị nọ na ya ala mgbe ha na-ehi ụra n’ihi na ha ma na e nwere ndị agha na-echebe ha. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa ma udo Chineke na-enye na-eche obi anyị na echiche anyị nche. Obi na-eru anyị ala n’ihi na anyị ma na e nweghị ihe ga-eme anyị. (Ọma 4:8) Dị ka anyị hụrụ n’ihe mere Hana, ọ bụrụgodị na ọnọdụ anyị agbanweghị ozugbo, obi ka nwere ike iru anyị ala. (1 Sam. 1:16-18) Ọ bụrụ na obi eruo anyị ala, ọ na-emekarị ka ọ dịrị anyị mfe iche echiche nke ọma ma mee mkpebi dị mma. Gịnị ka anyị nwere ike ime? Ọ bụrụ na obi ekoro gị n’elu, rịọ Jehova ka o nyere gị aka otú ahụ ndị bi n’obodo si akpọ ndị nche ka ha bịa chebe ha. Olee otú ị ga-esi eme ya? Na-ekpe ekpere ruo mgbe Jehova mere ka obi ruo gị ala. (Luk 11:9; 1 Tesa. 5:17) Ọ bụrụ na nsogbu abịara gị, akwụsịla ikpe ekpere. Ị ga-ahụ otú udo Chineke na-enye ga-esi eche obi gị na echiche gị nche.​—Rom 12:12. w24.01 21 ¶5-6

Fraịdee, Nọvemba 28

Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.​—Mat. 6:9.

Ka Jizọs doo aha Nna ya nsọ, o diri ọnụ niile e mekpọrọ ya, mkparị, na ụgha a ghagidere ya. Ọ ma na o ruberela Nna ya isi n’ihe niile. O kweghị ka ihere mee ya. (Hib. 12:2) Ọ makwa na ọ bụ Setan na-akpatara ya nsogbu ndị ahụ n’oge ahụ taara ya ezigbo akpụ. (Luk 22:2-4; 23:33, 34) Setan fooro ntutu taa na ọ ga-eme ka Jizọs kwụsị ife Chineke. Ma, Setan dara kụọ afọ n’ala. Jizọs gosiri na Setan bụ ezigbo onye ụgha nakwa na Jehova nwere ndị ohu ji obi ha niile na-erubere ya isi, ndị dị njikere irubere ya isi ọ bụrụgodị na a na-ata ha ezigbo ahụhụ. Ị̀ chọrọ ime ka obi dị Eze gị na-achị achị ugbu a ụtọ? Akwụsịla ito aha Jehova. Na-enyere ndị ọzọ aka ịmata ụdị onye Chineke bụ. I mee otú ahụ, ị na-eso nzọụkwụ Jizọs. (1 Pita 2:21) Dịkwa ka Jizọs, ị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa, na-egosikwa na onye iro ya bụ́ Ekwensu bụ onye ụgha na-enweghị ihere ná ndụ ya. w24.02 11 ¶11-13

Satọdee, Nọvemba 29

Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ maka ihe ọma niile o meere m?​—Ọma 116:12.

N’ime afọ ise gara aga, ihe karịrị otu nde mmadụ emeela baptizim, ghọọkwa Ndịàmà Jehova. I nyefee Jehova onwe gị, ị họrọla ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, meekwa ka ime uche Chineke bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị. Gịnị ka i kwesịrị ime ka ị bụrụ Onye Kraịst nyefere Jehova onwe ya? Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ya jụ onwe ya.” (Mat. 16:24) Okwu Grik a sụgharịrị ‘mmadụ ịjụ onwe ya’ nwekwara ike ịpụta ‘mmadụ ịghara ịna-eme ihe masịrị ya.’ Ebe i nyefere Jehova onwe gị, i kwesịrị ịjụ ihe ọ bụla na-anaghị amasị Jehova. (2 Kọr. 5:14, 15) Ọ pụtakwara mmadụ ịjụ “ọrụ ndị e ji mara anụ ahụ́,” dị ka ịkwa iko. (Gal. 5:19-21; 1 Kọr. 6:18) Ịjụ ihe ndị a ọ̀ ga-eme ka ihe siere gị ike ná ndụ? Mba. Ọ gaghị esiri gị ike ma ọ bụrụ na ị hụrụ Jehova n’anya, ya edookwa gị anya na iwu ya ga-abara gị uru.​—Ọma 119:97; Aịza. 48:17, 18. w24.03 2 ¶1; 3 ¶4

Sọnde, Nọvemba 30

Ihe gị masịrị m.​—Luk 3:22.

Ndị Jehova na-enye mmụọ nsọ ya bụ ndị ihe ha masịrị ya. (Mat. 12:18) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘È nweela àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ m na-akpa ná ndụ m?’ Ị̀ chọpụtala na ị na-enwere ndị ọzọ ndidi karịa ka ị na-enwe tupu gị amata Jehova? N’eziokwu, ọ bụrụ na ị na-amụtakwu àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ọ ga-edokwu gị anya na ihe gị masịrị Jehova. Jehova na-eme ka ihe mgbapụta ahụ baara ndị ihe ha masịrị ya uru. (1 Tim. 2:5, 6) Ma, ọ bụrụkwanụ na obi anyị ana-agwa anyị na ihe anyị amasịghị Jehova, n’agbanyeghị na anyị nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, meekwa baptizim? Cheta na anyị ekwesịghị ịna-ekwere ihe niile obi anyị na-agwa anyị. Mana, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. Ọ na-ewere ndị nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ ka ndị ezi omume, kwekwa nkwa ịgọzi ha.​—Ọma 5:12; Rom 3:26. w24.03 30 ¶15; 31 ¶17

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya