Ịghọta Ihe Dị n’Akụkọ
“Ibukọrọ Ihe Mgbe Ochie E Gwutere n’Ala”
N’okpuru isiokwu ahụ, akwụkwọ akụkọ French ahụ a na-ebipụta kwa ụbọchị bu Le Monde kọrọ banyere otu onyeọkà n’ihe ndị dịrị ndụ n’oge ochie e gwupụtara n’ala n’lndia, onye “ihe àmà gosiri na ọ nọwo na-eduhie ndị ọrụ ibe ya ruo 20 afọ gara aga banyere ebe e si wetasịa ihe ndị dịrị ndụ n’oge ochie e gwupụtara n’ala, bụ́ ndị o wetara ka ha nyochaa.” E kwuru na ‘mbukọrọ’ ahụ metụtara izijere ha ihe mgbe ochie ndị e gwutere n’ala ndị e nwetara site na United States, Africa, Czechoslovakia, na British Isles, na-asi na ọ bụ n’Ugwu Himalaya ndị ahụ ka a chọtara ha. Onyeọkà mmụta sayensi nke a bipụtara ihe ndị ọ chọpụtara n’ihe karịrị 300 isiokwu dị iche iche. Ọ bụ otu onyeọkà mmụta sayensi bụ onye Australia kpughere aghụghọ nke a site n’akwụkwọ akụkọ ọkà mmụta sayensi ndị Britain ahụ bụ Nature. Ọ tụrụ ya n’anya ‘otú ọ pụrụ isi bụrụ na ọ dịghị onye ọ bụla rụrụ ụka banyere ọtụtụ ihe nchọpụta a na-enyo enyo otú a ruo nnọọ ogologo oge.’
Dị ka akwụkwọ akụkọ Le Monde ahụ si kwuo, otu ihe pụrụ ikpata ya bụ iwu ịgbachi nkịtị ahụ ọtụtụ ndị nkà mmụta sayensi na-erubere isi. Ihe odide ahụ hotara na ‘mbukọrọ’ ihe mgbe ochie ndị a e gwutere n’ala “emewo ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọmụma nile a chịkọtaworo [n’ime 20 afọ gara aga] banyere ọnọdụ ala nke ugwu Himalaya ndị ahụ bụrụ ihe na-abaghịzi uru.”
N’eziokwu, ihe omume ọhụrụ nke a nke aghụghọ ọkà mmụta sayensi adịghị eme ka a malite ịrụ ụka banyere ihe nile metụtara ọkà mmụta sayensi. Otú ọ dị, ọ na-enyekwu ihe àmà nke na-egesi na ọ bụrụ na e jiri ịrụ ụka nile nke ọkà mmụta ihe ndị dịrịi ndụ n’oge ochie ndị e gwupụtara n’ala maa izi ezi na-adịghị ada ada nke ihe ndekọ Bible aka, ọ na-abụkarị ihe na-akarịghị ihe ahụ Pọl onyeozi kpọrọ “mmegiderịta nke ‘ihe ọmụma’ ahụ nke na-abụghi ihe ọmụ ma ma ọlị.”—1 Timoti 6:20, The New Jerusalem Bible.
“Jupụtara n’Ọbara”
Na Colombia, South America, ndị isi nke òtù ndị na-ere ọgwụ ọjọọ, bụ́ ndị afọ tara mmiri, na-ego ụmụ okorobịa ka ha gbuo ndị ha na ha na-ama aka ma ọ bụ tinye ọgba aghara n’etiti ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị mba ahụ dum. Otu n’ime sicario, ma ọ bụ onye ogbu mmadụ e goro ego dị otú a, gwara ndị nta akụkọ nke Tiempo, bụ́ akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’asụsụ Spanish, na ‘igbu mmadụ mgbe ọ na-adịghị ihe e mere gị bụ ihe siri ike.’ Olee ụzọ ọ na-esi emejụ akọ na uche ya? Ọ kọwara, sị: “Amaara m na otu n’ime iwu Chineke bụ na i kwesịghị igbu mmadụ, ma n’ọnọdụ nke m ọ bụ ihe metụtara mmadụ igbu onye ọzọ ka o wee dịrị ndụ. Akọ na uche m na-akwado m igbu mmadụ n’ihi na ọ dị m mkpa inweta ego. Ị́ pụghị ịhụ na ana m arụ ọrụ ka m wee chọta ihe m ga-eji akwado ndụ m? . . . Tupu m na-apụta igbu mmadụ, ana m ekpeku Chineke na Nwa Aghọghọ ahụ Na-amaghị Nwoke ekpere ka ha chebe m.”
Ọ bụ ezie na ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ọkà mmụta okpukpe bụ́ ndị Katọlik ga-ajụ nkọwa dị otú a kpam kpam, ma ndị ndú chọọchị akwadowo iji ngwá agha buo agha “dị ka ihe ikpeazụ a ga-eme iji kwụsị ihe doro anya na ọ bụ ọchịchị aka ike nke nọworo ogologo oge.” Ọ bụrụ na ndị ọkà mmụta okpukpe na-akwado ime ihe ike n’ihi ikpe na-ezighị ezi nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ̀ ga-abụ ihe ijuanya na ụfọdụ ndị Katọlik, dị ka onye sicario nke a, na-akwado igbu mmadụ n’ihi ikpe na-ezighị ezi nke usoro akụ na ụba? Lee ka o si bụrụ ihe ize ndụ ịgwagbu Okwu Chineke.
N’anyasị mgbe a gaje ime ihe ikpe na-ezighị ezi kasị ukwuu e metụworo mgbe ọ bụla—nke metụtara njide, ikpe, na ogbugbu nke Jisọs Kraịst—Jisọs n’onwe ya jụrụ ime ihe ike n’ụdị ọ bụla. Ọ gwara Pita, sị: “Mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) N’ụzọ ezi uche dị na ya, olee otú ndị na-eme ihe ike pụrụ isi tụọ anya na Chineke Onye pụrụ ime ihe nile ga-ege ha ntị n’ọnọdụ ọ bụla, ebe amụma Aịsaịa kwuru hoo haa, sị: “Ọbụna mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, m gaghị adị na-anụ: aka unu jupụtara n’ọbara”?—Aịsaịa 1:15.
‘Nyeghachi Sisa Ihe nke Sisa’
Izere ịkwụ taks bụ nsogbu na-abawanye ụba n’ọtụtụ mba. Dị ka ihe atụ, na Spain, akwụkwọ akụkọ bụ El Diario Vasco kọrọ na ma ndị na-ere ala ma ndị na-azụ azụ nwere omenala nke ilezi anya zochie ọnụ ahịa a kwụrụ n’ezie maka ala ahụ. Ebe onye na-azụ azụ na onye na-ere ere pụrụ ikwekọ n’otu ọnụ ahịa maka ala ahụ a na-azụ, a na-edenye ọnụ ahịa dị nnọọ ala n’akwụkwọ nkwekọrịta ahụ. Ozugbo e mesịrị ihe ndekọ ahụ, a na-akwụ taks nke dabeere n’ọnụ ahịa ahụ e dere n’akwụkwọ. Akwụkwọ El Diario Vasco kọrọ na ihe ahụ onyeọkà iwu nọ n’ọkwá notary public bụ José María Segura Zurbano kwuru, nke bụ na ọ bụ ezie na ndị nọ n’ọkwá notary adịghị ekere òkè n’aghụghọ ahụ n’ezie, ma ha maara na ọnụ ahịa ala ahụ nke ha na-edeba n’akwụkwọ abụghị eziokwu. N’ihota otu ihe dị iche n’ihe omume aghụghọ nke a, Zurbano kwuru, sị: “Ná mba nke a, onye ọ bụla na onye agbata obi ya na-ekwucha okwu ụgha, nanị ndị na-adịghị eme otú ahụ bụ Ndịàmà Jehova. Mgbe ha na-azụ ma ọ bụ na-ere ihe, ọnụ ahịa [ala] nke ha na-ede n’akwụkwọ bụ ihe bụ eziokwu.”
A maara Ndịàmà Jehova nke ọma maka ime ihe n’eziekwu na ịkwụwa aka ha ọtọ. Ha maara na Jehova Chineke na-atụ anya ka ndị ohu ya gosipụta àgwà ndị dị otú ahụ n’ihe omume ha nile. Chineke kpọrọ “ire okwu ụgha” na “onyeàmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume” asị. N’okwu banyere ịkwụ taks, Jisọs Kraịst setịpụụrụ ndị na-eso ụzọ ya ụkpụrụ ha ga-agbaso mgbe ọ sịrị: “Nyeghachinụ Sisa ihe nke Sisa, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.”—Ilu 6:6-19; Mak 12:17.