“Ụlọ A Bụ Nke Gị”
“ỤLỌ a bụ nke gị—anyị ewusawanyewo ya.” Lee nnọọ ka nke a si kọwaa mmetụta nke ndị ka jisịworo afọ abụọ rụọ ọrụ ike n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị n’Australia! Ọ bụ Jehova ka a gwara okwu ahụ, ọ bụkwa akụkụ nke otu abụ nke e dere maka ihe omume ahụ pụrụ iche. Ihe omume dị aṅaa ka ọ bụ? Ọ bụ nraranye nke mgbakwụnye ọhụrụ ndị ahụ e mere n’ụlọ Betel na ebe obibi akwụkwọ.
Mwusawanye n’Oge Na-adịghị Anya Otú A?
Ọ bụ ihe ịtụnanya na n’ihe na-erubeghị afọ asaa tupu mgbe ahụ, e mere otu nraranye yiri nke ahụ maka ụlọ Betel ahụ a ka wusịrị ọhụrụ n’Ingleburn, ná mpụga mpụga nke ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke Sydney, Australia. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ime mwusawanye n’oge na-adịghị anya otú a?
Otu ihe bụ na ọnụ ọgụgụ Ndịàmà nọ n’Australia amụbawo site n’ihe na-erughị 32,000 na 1981 ruo n’ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 51,152 n’October 1989, nke ahụ mekwara ka ọ dị mkpa inwe mmụba ná ndị na-arụ ọrụ na Betel. Ọzọkwa, e nwere oké mmụba n’akwụkwọ Australia na-ezipụrụ alaka ndị ọzọ. Ka ọ dị ugbu a, Australia na-ebipụta akwụkwọ na 37 asụsụ dị iche iche iji lekọta mkpa nke Fiji, Indonesia, Papua New Guinea, New Caledonia, New Zealand, Solomon Islands, Tahiti, Vanuatu, Niue, Western Samoa, Tonga, Tuvalu, na Wallis Islands, tinyekwara Australia. Ya mere, ezinụlọ Betel amụbawo ngwa ngwa gaa n’inwe 164 ndị nọ na ya.
Iji nweta ebe ezinụlọ nke a na-amụba amụba ga-ebi, ná mmalite 1987, e wuchara otu ụlọ mgbakwụnye ọhụrụ dị n’ọfịs nke nwere okpukpu atọ, na-eme ka e nwetakwuo ohere ahụ dị oké mkpa maka ọfịs. Ọzọ, Òtù Na-achị Isi nyere nkwado ka e wuo ụlọ mgbasapụ ebe obibi akwụkwọ nke ga-adị okpukpu atọ na mgbakwụnye ụlọ ebe obibi nke ga-adị okpukpu ise. Na January 1988, a malitere ọrụ n’ihe mgbakwụnye ahụ a ga-ewu n’ụlọ obibi akwụkwọ, nke ga-enyekwu ohere dị 38,800 square amaụkwụ [3,600 cu mita] nke ala ụlọ. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, a malitere ọrụ ná mgbakwụnye ụlọ ebe obibi ahụ, nke ga-eme ka e nwetakwuo 51 ọnụ ụlọ obibi dị iche iche.
Ịchụ Àjà na Inye Ihe n’Afọ Ofufo
E zipụrụ ọkpụkpọ òkù gaa n’ọgbakọ nile dị ná mba ahụ maka ndị ọrụ afọ ofufo, ndị ga-enwe ike isonyere “ezinụlọ ndị ọrụ owuwu ihe” ruo afọ abụọ. Nzaghachi e nwetara dị mma nke ukwuu, ndị ọrụ afọ ofufo na-arụ ụdị ọrụ dị iche iche wepụtara onwe ha ozugbo ahụ. A natara ihe karịrị 700 fọm e ji achọ ịbịa ọrụ owuwu ihe ahụ, n’oge dum nke owuwu ihe ahụ, e nwekwara ngụkọta nke 270 ndị ọrụ afọ ofufo ndị bịara rụọ ọrụ n’ihu ọrụ ahụ ruo ogologo oge dị site n’izu abụọ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ.
Otu Onyeàmà nwere ụlọ ọrụ na-akpọri ala na steti ahụ dị n’ebe ugwu, bụ́ Queensland. O rere otu akụkụ nke ụlọ ọrụ ya ahụ, ya na nwunye ya sonyekwara n’ezinụlọ ndị ọrụ owuwu ihe ahụ site ná mmalite ya. Ọ zụtara otu katapila e ji egwu ala nke nwere ụkwụ ígwè, rụọkwa ihe ka ukwuu n’ọrụ igwu ala ọ dị mkpa ka a rụọ, n’anaghị Society ego ọ bụla. Mgbe a rụsịrị ihe ka ukwuu n’ọrụ igwu ala a chọrọ, o rere ígwè katapila ahụ ma nọgidekwa na-arụ ọrụ n’akụkụ ndị ọzọ nke ọrụ owuwu ihe ahụ. Nke a bụ nanị otu ihe atụ nke ezi mmụọ achọghị ọdịmma onwe onye nke mmadụ nile gosipụtara n’oge dum owuwu ihe ahụ were.
Ndịàmà nyere ígwè ndị e ji awụ kọnkịrị ka e jiri ha mee ihe n’ịwụ 4,300 cubic yard [3,300 cu mita] dị mkpa maka okpukpu asatọ nke ụlọ abụọ ahụ. Ndị ọzọ nyere ngwá ọrụ ndị dị mkpa maka iwu tankị mmiri atọ e ji simenti wuo, ndị nke ọ bụla n’ime ba ga-abata 5,800 galọn [22,000 lita] mmiri, Ndịàmà ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ obibi akwụkwọ ahụ wepụtakwara onwe ha ịrụ ọrụ n’iwu tankị ndị ahụ.
Otú ọ dị, ọ bụghị ndị ọrụ afọ ofufo nile ahụ bụcha ndị ọkà n’ọrụ. N’eziokwu, ọtụtụ ụmụ okorobịa mụtara ọrụ ndị ọhụrụ kpọmkwem n’ihu ọrụ ebe ahụ. Ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ndị bricklayer maara ọrụ nke ọma mgbe ha na-enye aka ido otu ọkara nde brick e ji rụọ ọrụ ahụ dum. Ndị ọzọ mụtara otú e si edo tile nke na-adị n’ala ụlọ nakwa nke na-adị n’ahụ ájá, n’ime nanị izu ole na ole, otu nwanna nwanyị ghọkwara onye ọrụ iji akwụkwọ achọ ahụ ụlọ mma doro anya nke ọma.
Ụbọchi Nraranye
Ụbọchị nraranye, bụ́ Saturday, November 25, 1989, bọchara nnọọ nke ọma, anwụ na-achakwa—ụbọchị mara nnọọ mma ná ngwụcha nke oge opupu ihe ubi. E bupụsịwo ihe nile dị n’okpukpu nke abụọ nke ụlọ ọhụrụ ahụ a gbakwụnyere n’ebe obibi akwụkwọ ka o wee bụrụ ebe bụ isi a ga-anọ mee ihe omume nraranye ahụ. E ji ihe njikọ telivishọn a na-ahụ nanị na gburugburu ebe a chọrọ ka o jedebe jikọta ebe ahụ na okpukpu abụọ ndị nke ọzọ nke ụlọ obibi akwụkwọ ahụ, na ụlọ ebe e si ezipụ akwụkwọ, ụlọ nzukọ dị na Betel, nakwa ụlọ iri nri dị na Betel. Nke a mere ka ihe karịrị 3,000 mmadụ nwee ike ịnọsara ahụ n’ime ụlọ.
N’ihi na ohere e nwere ehighị nne, ọ bụ nanị ndị meworo baptism ruo 40 afọ ka a kpọrọ ka ha bịa, tinyere ndị ọbịa ndị ezinụlọ Betel na nke ndị ọrụ owuwu ihe kpọrọ n’onwe ha. E nyere ihe ntụrụndụ n’oge ụtụtụ, e nyekwara nri ehihie dị ụtọ nke a fụchiri afụchi n’ehihie. N’elekere 9:00 nke ụtụtụ, e mere nzukọ kwa afọ nke ụlọ ọrụ Watchtower Society of Australia, 21 mmadụ ahụ nile so n’ụlọ ọrụ ahụ e debara n’akwụkwọ iwu nke Australia bịachara. Mgbe e mesịrị ihe ndị iwu chọrọ ha n’aka, a kpọrọ ndị ọzọ òkù ịbata ná nzukọ ahụ, mmadụ nile nwekwara obi ụtọ ịnụrụ okwu Theodore Jaracz, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru.
N’elekere 1:45 ehihie, e ji 15 minit nke abu Alaeze meghee usoro ihe omume nraranye ahụ. Ndị na-ege ntị nwere obi ụtọ ịnụrụ akụkọ ozi dị iche iche, mkpirikpi akụkọ ndị na-atọ ọchị, ahụmahụ, na okwu nke mmadụ atọ ndị so n ‘Òtù Na-achị Isi, ndị bịaranụ, kwuru. N’ime ndị a, nke a bụ nke mbụ Carey Barber na Daniel Sydlik bịara n’ala ahụ dị n’okpuru. Nwanna Barber kwuru okwu n’isiokwu ahụ bụ “Owuwe Ihe Ubi Bụ Ọgwụgwụ nke Ọgbọ A,” ebe Nwanna Sydlik kwuru okwu n’isiokwu bụ “Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Jehova Bụ Chineke Ha.” Nwanna Jaracz, bụ́ onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ nke Australia dị ka onye nlekọta zoonu kwuru okwu nraranye ahụ.
Otu ihe na-enye obi ụtọ n’usoro ihe omume ahụ bụ ịbụ otu abụ nke nwere usoro ahịrị anọ tupu a malite okwu nraranye ahụ. N’ịbụ nke dabeere n’okwu dị n’Aịsaịa 60:22, isiokwu nke abụ ahụ bụ “Onye Nta Aghọọ Otu Puku.” Ná mkpụrụ okwu ndị dị na ya, e nyere Jehova ekele na ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo wepụtara onwe ha enwewo ihe ùgwù nke iwusawanye ‘ụlọ ya’ n’akụkụ nke a nke ubi ahụ zuru ụwa ọnụ.
[Foto dị na peeji nke 15]
Mgbakwụnye ọhụrụ e wuru n’ebe obibi akwụkwọ Watch Tower dị n’Ingleburn, N.S.W., Australia
C. Barber
T. Jaracz
D. Sydlik