“Ihe Ndị A Ga-eme Ịji Zụlite Nwata Nwere Obi Uto na Ịhe Ịga Nke Ọma”
N’OKPURU isiokwu nke a, magazin ahụ bụ Medical Aspects of Human Sexuality bipụtara ihe odide nke Dr. Irene Jakab, bụ́ onye na-akụzi ihe banyere ịgwọ ọrịa uche na mahadum nọrọ n’ime ya depụta ihe o chere na ọ dị mkpa ka nwata wee bụrụ onye a zụlitere ịbụ dimkpa nke nwere ihe ịga nke ọma. Otu n’ime “ihe ndị a ga-eme” bụ mkpa nke ndị mụrụ ụmụ ịhụ nwa ha n’anya, duzie ya n’ihe banyere ihe bụ ezi ihe na ihe ọjọọ, nyekwa ya ọzụzụ n’ime mkpebi. O chere na “ihe ndị a ga-eme” ekwesịghị nnọọ ịgụnye iwe iwe ọkụ n’akụkụ ndị mụrụ ụmụ, ịchọ ka e mee ihe nile n’ụzọ zuru okè, ichegbubiga onwe onye ókè, ma ọ bụ ịgbachi ya nkịtị ka o mere otú sọrọ ya.
“Ihe ndị a ga-eme” nke Dr. Jakab dị nnọọ mma ruo n’ókè a pụrụ iji ha mee ihe. N’eziokwu, ọtụtụ puku afọ gara aga, Bible nyere ndị mụrụ ụmụ ndụmọdụ yiri nke ahụ. (Lee, dị ka ihe atụ, Ilu 4:1; 13:24; 22:6; Ndị Kọlọsi 3:21.) Otú ọ dị, Bible gụnyere otu ihe nke Professor Jakab na-agụnyeghị: oké mkpa nke ịkụziri ụmụntakịrị ka ha hụ Onye Kere ha n’anya, marakwa Okwu ya nke ọma. Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke [Jehova, NW].—Ndị Efesọs 6:4; Deuterọnọmi 6:4-7.
Ọ bụrụ na e nweghị ọzụzụ dị otú ahụ,ụmụntakịrị pụrụ itolite n’enweghị ezi ụkpụrụ omume. Ihe si na ya pụta pụrụ ịkpata oké ọdachi n’ime ụwa nke a na-adịghị ọcha nke rụkwara arụ.