‘Anyị Enwebeghị Obi Ụtọ Karịa Ka Ọ Dị Ugbu a’
Nke ahụ bu okwu otu nwanyị kwuru, bụ́ onye tinyere ndụmọdụ dị n’akwụkwọ ahụ bụ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ n’ọrụ. O nwere nsogbu alụmdi na nwunye, wee malite isoro nwanyị na-ehichasị ụlọ ya kwurịta ihe banyere nke a. Nwanyị ahụ na-ehichasị ụlọ dere, sị:
“Aro ndị m tụụrụ ya sitere kpọmkwem n’akwụkwọ ahụ. N’ikpeazụ, agwara m ya na enwere m otu akwụkwọ nke pụrụ ịmasị ya. Akọwaara m ya otú o siworo nyere m aka, na o nwekwara ọtụtụ ihe ezi uche dị n’ime ha, ndị sitere na Bible. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, mụ na ya kwurịtara okwu na telifonu o wee gwa m na ya na di ya agụwo akwụkwọ ahụ wee kpebie imesorịta onwe ha n’ụzọ dị mma karị.
“Ná mgbede taa, ọ kpọkwara m ọzọ ịgwa m, gụnyere ihe ndị ọzọ, na ọ dịbeghị mgbe ọ bula ọzọ ndụ ha bụ nke obi ụtọ karịa ka ọ dị ugbu a. Ha agụkọwo akwụkwọ ahụ ọnụ, chọpụta na ihe ndị dị n’ime ya sitere na Bible n’ezie, ha na-etinyekwa ụkpụrụ ndị ahụ dị n’ime ya n’ọrụ.”
Ọ bụrụ na ị chọrọ enyemaka n’ime ka alụmdi na nwunye gị bụrụ nke nwere obi ụtọ karị. ị pụrụ irite uru site n’akwụkwọ nke a. Nata otu site n’idejupụta na izite mpempe akwụkwọ dị n’okpuru ebe a. Nke a bu akụkụ nke ọrụ nkụzi Bible zuru ụwa ọnụ, nke e ji onyinye afọ ofufo na-akwado.
Biko ziterenụ m, n’anaghị m ego nzite ya, akwụkwọ ahụ e kwesiri mkpo ya ike, nke nwere 192 peji, bụ́ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ. (Degara address ahụ dị n’okpuru akwụkwọ maka ịmatakwu ihe banyere nke a.)