Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 5/15 p. 3-4
  • Gịnị Na-akpata Nsogbu Ezinụlọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Na-akpata Nsogbu Ezinụlọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ụfọdụ Ndị Na-akpata Nsogbu Ezinụlọ
  • Ihe Isi Ike Ezinụlọ Ihe Ịrịba Ama nke Oge Ndị A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • È Nwere Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ?
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Debe Chineke n’Ọkwá Mbụ ná Ndụ Ezinụlọ Gị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Jehova, ‘Ebe Anyị E Wusiri Ike n’Oge Nsogbu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 5/15 p. 3-4

Gịnị Na-akpata Nsogbu Ezinụlọ?

BOB tiri mkpu sị, ‘Ọ dị umengwụ! Ọ naghị eleta ụlọ nke ọma ma ọlị!’

Jean zaghachiri sị, ‘Nke ahụ abụghị eziokwu ma ọlị! Ọ dịghị enwe mmasị n’ihe ọ bụla m gbalịrị ime. Ọ bụ nwoke kasị eme nkọcha m hụtụrụla.’

Gịnị bụ nsogbu e nwere ná ndụ Bob na Jean?a Alụmdi na nwunye ọhụrụ ha ka dị nanị ọnwa anọ, ma ọ nọrọworị nso n’itisasị. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ha ka ọ dị otú ahụ, n’ihi na ihe ndekọ ọnụ ọgụgụ e nwere na-egosi na nkewa alụmdi na nwunye dị n’ebe nile. Ndị ọkà na-ekwu ugbu a na ọkara nke alụmdi na nwunye ọhụrụ ọ bụla na United States ga-ejedebe n’ịgba alụkwaghịm. N’otu aka ahụ, a na-enweta ihe ndekọ ọnụ ọgụgụ na-egosi ọnọdụ na-adịghị mma site n’ọtụtụ mba ndị ọzọ. Ma, ịgba alụkwaghịm bụ nanị otu akụkụ nke ọnọdụ ahụ. N’ọnụ ọgụgụ a na-ahụtụbeghị mbụ na n’ihi ọtụtụ ihe dị iche iche, ọtụtụ ezinụlọ nọ ná nsogbu.

Ihe Ụfọdụ Ndị Na-akpata Nsogbu Ezinụlọ

Ọ na-emetụta ụmụntakịrị nke ukwuu mgbe ọnọdụ ndị na-akpata nsogbu bilitere n’ezinụlọ. Magazin bụ Newsweek na-akọ, sị: “Otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụmụntakịrị nile a mụrụ n’afọ iri gara aga [na United States] yikarịrị ka hà ga-ebi n’ezinụlọ ebe a lụgharịrị nne ha ma ọ bụ ebe nna ha lụgharịrị nwanyị tupu ha eruo afọ 18. Nanị nne ma ọ bụ nna na-azụllite otu n’ime ụmụntakịrị anọ ọ bụla taa. A mụrụ ihe dị ka 22 pasenti nke ụmụntakịrị taa n’abụghị n’ime alụmdi na nwunye, n’ime ndị ahụ, ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ bụ ndị nne ka nọ n’agbata afọ ndụ iri na atọ na iri na itoolu mụrụ.”

N’izo aka n’ihe so na-akpata nsogbu ezinụlọ, onye ọkà n’ihe banyere imeso ụmụntakịrị mmeso ọjọọ, bụ́ J. Patrick Gannon na-asị: “Nnyocha ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya na-egosi na ọtụtụ iri nde nke ụmụ mmadụ tolitere n’ime ezinụlọ ndị na-adịghị agazi nke ọma [ebe ihe na-aga n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị], ebe ime ihe ike, mmadụ idina onye ikwu ya, ma ọ bụ imejọ mmetụta uche mmadụ nke ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata bụ ihe a na-ahụ kwa ụbọchị.” Ọ bụghị ihe iju anya na ọtụtụ ụmụntakịrị ndị e kpughere nye ọnọdụ ndị dị otú a pụrụ ịbụ na ha agaghị ama otú ha ga-esi zere nsogbu ezinụlọ mgbe ha ghọrọ okenye.

Ndị ụfọdụ na-ahụ ihe na-eme pụrụ ibugara mgbanwe dị iche iche nke ọnọdụ akụ na ụba, ọha na eze, na omume nke jupụtaworo na mba ndị mepere anya ụta banyere nsogbu ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ndị inyom ji na-abanye n’ọrụ akpaliwo ime ndokwagharị ndị na-agbakasị ahụ mgbe mgbe banyere ozi na ibu ọrụ dị iche iche ndị dị n’ụlọ. Ndị bụ nne na-eji obi erughị ala na-emeziwanye aka ọrụ ndị ha na-amaghị nke ọma, ndị bụ nna, n’amaghị ihe ọzọ ha ga-eme, na-agba mbọ ịrụ ọrụ ndị dị n’ụlọ, ụmụntakịrị na-ejikwa anya mmiri na-ahazigharị onwe ha ikwekọ ná ndụ a na-ebi n’ebe a na-elekọta ụmụntakịrị n’ụbọchị.

Ọtụtụ ezinụlọ gburugburu ụwa nọ n’oké ihe nrụgide. Otu onye mụrụ ụmụ nke na-arụ ọrụ ji nke a tụnyere “ibi ndụ n’ọnọdụ ihe mberede mgbe nile.” Ka a sịkwa ihe mere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara ndị a jụrụ ajụjụ ọnụ ná nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya ji kwuo na ‘ezinụlọ ndị America dị njọ ugbu a karịa otú ọ dị n’afọ iri gara aga,’ ọ bụkwa mmadụ ole na ole kwere na ọnọdụ ahụ ga-aka mma.

Ya mere nsogbu ezinụlọ bụ isiokwu nke a na-ekwu okwu ya mgbe nile n’ihe omume TV na redio. Ọha na eze na-agụchapụ akwụkwọ enyemaka dị iche iche ndị metụtara ezinụlọ, ụfọdụ na-enyekwa ndụmọdụ kwesịrị ekwesị ruo n’ókè ụfọdụ. Ọ bụ eziokwu na ndụmọdụ nke ‘ikwurịta okwu karị,’ ma ọ bụ ‘ime ka a mara mmetụta gị’ pụrụ inye aka, ọ naghị enwecha ike irute n’isi ihe na-akpata nsogbu ezinụlọ. Isiokwu nke na-eso ga-eme otú ahụ ma gosi otú a ga-esi mee ihe banyere nsogbu ezinụlọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Aha na-abụghị kpọmkwem nke ndị a na-akọ banyere ha iji mee ka a ghara ịmata ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya