Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 7/15 p. 26
  • Ihe Ekpere Pụtara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ekpere Pụtara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 7/15 p. 26

Ihe Ekpere Pụtara

“N’asụsụ Hibru, okwu bụ isi dịịrị ekpere sitere na mkpọrọgwụ okwu bụ, ‘ikpe ikpe’, ụdị ahụ nke na-egosi onye o metụtara, bụ́ nke e ji emekarị ihe . . . pụtakwara n’ụzọ nkịtị, ‘ikpe onwe onye ikpe.’” Otú ahụ ka akwụkwọ bụ The Authorised Daily Prayer Book kwuru. Ihe nke a pụtara bụ na otu n’ime ọrụ ndị ekpere na-arụ bụ na o kwesịrị inyere onye ahụ aka ịhụ ma ọ̀ na-erukwa eru n’ụkpụrụ na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ezi omume nile nke Chineke.

N’ihi nke a, n’ime Bible dum, a na-agwa anyị na ọ gwụlakwa ma mmadụ ọ̀ na-eme uche Chineke, a gaghị anara ekpere ya nke ọma. “Jehova dị anya n’ebe ndị na-emebi iwu nọ: ma ekpere ndị ezi omume ka ọ na-anụ.”—Ilu 15:29; 1 Jọn 5:14.

Nnyocha onwe onye n’ihu Jehova Chineke kwesịrị nnọọ ime ka onye ahụ na-ekpe ekpere nwee obi umeala, nweekwa mwute n’ihi ihe o mere. Nke a na-emesiwanye ihe atụ ahụ Jisọs mere ike banyere onye Farisii ahụ dị mpako na onye ọna ụtụ ahụ nwere mwute, bụ́ ndị bịara n’ụlọ nsọ ahụ ikpe ekpere.—Luk 18:9-14.

Otú a, ma ànyị na-ekpere Jehova ekpere iji kelee ya, nye ya otuto, ma ọ bụ rịọ ya arịrịọ, ekpere na-abụ oge nnyocha onwe onye mgbe nile. N’ụzọ dị otú a, ekpere na-adọta anyị nso n’ebe Jehova nọ, na-ewusikwa mmekọrịta anyị na ya ike.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya