Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 7/15 p. 23-26
  • Ndị Ntorobịa Bụ Ndị Kraịst Guzosienụ Ike n’Okwukwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ntorobịa Bụ Ndị Kraịst Guzosienụ Ike n’Okwukwe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Okwukwe Siri Ike Ji Dị Mkpa
  • ‘Dịrị Njikere Inye Ihe Nkwado’
  • ‘Nye Ihe Nkwado n’Ihu Onye Ọ Bụla’
  • Enyemaka Dị Adị
  • Ikwesị Ntụkwasị Obi Na-eweta Ngọzi
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Ịbụ Onye A Na-akwa Emo?
    Teta!—1999
  • Ndị Ntorobịa—Jehova Agaghị Echefu Ọrụ Unu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Kwusaara Ụmụ Akwụkwọ Ibe M Ozi Ọma?
    Teta!—2002
  • Ndị Na-eto Eto—Ka Ijere Jehova Ozi Na-agụsikwu Unu Agụụ Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 7/15 p. 23-26

Ndị Ntorobịa Bụ Ndị Kraịst Guzosienụ Ike n’Okwukwe

“ONYE ọ bụla aghaghị ịbịa.” Nke ahụ bụ okwa a mara. Ụmụ akwụkwọ nile nọ n’otu ụlọ akwụkwọ dị na Japan aghaghị ịbịa otu nzukọ ezumezu e nwere n’ụlọ nzukọ ha. Otu nwata akwụkwọ bụ onye Kraịst ekwenyereghị ụfọdụ n’ime echiche ndị e kwupụtara n’abụ ụlọ akwụkwọ ahụ. O chere n’echiche, sị, “Amaara m na a gaje ịkpọnye abụ ụlọ akwụkwọ ahụ. Ma m gaghị enwe ihe isi ike ọ bụla. Ihe m ga-eme bụ nanị ịnọrọ n’azụ dị ka m na-emebu.”

Otú ọ dị, mgbe nwata ahụ bụ Onyeàmà Jehova banyere n’ụlọ nzukọ ahụ, ọ hụrụ na ndị nkụzi nile nke ụlọ akwụkwọ ahụ nọ n’ahịrị oche nke azụ. N’ihi ya, ọ ghaghị ịnọ n’ihu ha. Mgbe ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ biliri maka abụ ụlọ akwụkwọ ahụ, ọ nọgidere na-anọdụ ala n’ụzọ nkwanye ùgwù. Ma nke a kpasuru ndị nkuzi ahụ iwe nke ukwuu. Ha gbalịrị ịkwalite ya ka o guzoro ọtọ. Ị̀ pụrụ iji anya nke uche hụ onwe gị n’ọnọdụ ahụ? Gịnị ka ị gaara emeworị?

Ihe Mere Okwukwe Siri Ike Ji Dị Mkpa

Ọ gaara adị nnọọ mma ma ụmụ mmadụ hapụ ndị Kraịst aka ma kwere ka ha na-adị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’akọ na uche ha e jiri Bible zụọ. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ọ na-adị mkpa ka ndị Kraịst chee ọnọdụ ndị siri ike ihu. Nke a ekwesịghị ịbụrụ anyị ihe ijuanya n’ihi na Ọkpara Chineke n’onwe ya, bụ́ Jisọs Kraịst, sịrị: “Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu.” (Jọn 15:20) E wezụga mkpagbu ndị pụtara ìhè, ndị ohu Jehova na-eche ule dị iche iche nke okwukwe ihu.

Ọtụtụ mgbe, ọ dị ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst mkpa inwe okwukwe siri ike iji chee ọnwụnwa ndị ha na-ezute n’ụlọ akwụkwọ ihu. Ọ pụrụ ịbụ na ha apụghị izere iso ụmụ akwụkwọ na-akpakọrịta, bụ́ ndị na-ekwu okwu rere ure ma ọ bụ na-akpa àgwà ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ndị Kraịst na-eto eto pụrụ iche ihe omume ndị na-abawanye ụba banyere ịhụ mba n’anya ihu na nrụgide nke isonye n’òtù dị iche iche, ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ ihe omume ọzọ ndị pụrụ ịkpata mmerụ ahụ n’ụzọ ime mmụọ. Ndị nkụzi ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ha pụrụ ịgbalị ịrụgide ndị Kraịst na-eto eto imebi okwukwe ha. N’ihi nke a, ndị ntorobịa na-asọpụrụ Chineke aghaghị ịdabere ná mmụọ Jehova iji nwee okwukwe dị mkpa iji wee mee ihe ịkwado olileanya ha.—Matiu 10:19, 20; Ndị Galetia 5:22, 23.

‘Dịrị Njikere Inye Ihe Nkwado’

Ndụmọdụ Pita onyeozi kwesịrị ekwesị nye ma ndị Kraịst na-eto eto ma ndị meworo okenye. Ọ sịrị: “Bụrụkwanụ ndị e doziworo mgbe dum ịgọpụrụ onye ọ bụla nke na-ajụ unu ajụjụ banyere olileanya nke dị n’ime unu, ma ka unu were nwayọọ na egwu gọpụ.” (1 Pita 3:15) Gịnị ka ọ na-ewe ịbụ onye dị njikere ime ngọpụ dị otú a? Nke mbụ, ị ghaghị ịghọta ihe Akwụkwọ nsọ na-akụzi. Iji wee were nguzo siri ike n’ụlọ akwụkwọ n’ihe metụtara ihe ndị dị ka ịhụ mba n’anya, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ma ọ bụ akparamagwa, ị ghaghị ibu ụzọ ghọta ihe mere ndị Kraịst ji nwee nguzo ahụ ha nwere, jirikwa obi eziokwu kwere na ya.

Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst ibe ya, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu: mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Ì kwenyere na nke ahụ? Dị ka Pọl gosiri, ọ dị mfe ịbụ onye e duhiere n’okwu banyere mkpakọrịta. Mmadụ pụrụ iyi onye bụ enyi, na onye dị nnọọ mma iso enwe mkpakọrịta. Ma ọ bụrụ na o nweghị otu nchegbu ahụ i nwere maka ijere Jehova ozi ma ọ bụ ọbụna kwere ná nkwa ndị ahụ Bible kwere, ọ bụ onye mkpakọrịta ọjọọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ndụ ya dabeere n’ụkpụrụ ndị dị iche, ihe ndị dị oké mkpa nye onye Kraịst pụkwara ịbụ ihe ndị na-adịghị oké mkpa nye ya.

Nke a abụghị ihe iju anya, n’ihi na Jisọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:16) Ọ bụ ihe na-apụghị ikwe omume mmadụ ịbụ ezi onye Kraịst, bụrụkwa n’otu oge ahụ akụkụ nke ụwa nke Setan bụ chi ya. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ị̀ na-ahụ ụzọ nnọpụiche dị otú ahụ site n’ụwa si echebe onye Kraịst pụọ ná mmebi na ahụ mgbakasị nke na-ewetara ọtụtụ ndị ihe otiti taa? Ya bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịghọta ihe mere na ị ghaghị ịnọgide ná nnọpụiche gị, ọbụna ma a sị na nke a pụtara na ị gaghị esonye n’ihe omume ụfọdụ a na-eme n’ụlọ akwụkwọ.a

E gosiri ịdị mkpa nke iguzosi ike n’okwukwe na idebe ọdịmma Alaeze n’ọkwá mbụ ná ndụ n’okwu metụtara otu nwa agbọghọ onye Kraịst. (Matiu 6:33) Mgbe a mara ọkwa na a ga-amalite ịmụgharị ihe omume a ga-eme n’oge ememe ngụsị akwụkwọ ha, ọ chọpụtara na e dokwara na a ga-eme ya n’otu ụbọchị ahụ a ga-enwe mgbakọ sekit nke Ndịàmà Jehova nke o mere atụmatụ ije. O dere akwụkwọ ozi n’ụzọ nkwanye ùgwù iji kọwaa ihe mere na ya agaghị anọ n’oge mmụgharị ihe omume ahụ, wee nye ya onye nkụzi ya tupu a malite klasị. Mgbe e mechiri klasị ahụ, onye nkụzi ahụ kpọrọ ya n’otu akụkụ wee gwa ya ka ọ kọwaghachi ọzọ ihe mere na ọ gaghị anọ n’oge mmụgharị ihe omume ahụ. Nwa agbọghọ ahụ na-akọ, sị: “Ọ chọrọ ịma ma ihe m ga-ekwu ọ̀ bụ otu ihe ahụ. Nke ahụ ọ̀ bụ echiche nke onwe m ka ihe dị n’ime akwụkwọ ozi ahụ ọ̀ bụ nanị okwu ndị nne m kwuru? Mgbe ọ hụrụ na m na-ekwu ihe doro m anya n’okwu ahụ, o megideghị m.”

‘Nye Ihe Nkwado n’Ihu Onye Ọ Bụla’

Ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst na-achọpụtakarị na ọ bụrụ na ha emee ka ọnọdụ ha doo ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ ibe ha anya tupu okwu ebilite, nrụgide a na-enye ha anaghị adị ukwuu mgbe ọ dịrị mkpa iche nsogbu ihu. Otu onye na-eto eto bụ onye Kraịst, bụ́ onye Japan kọrọ na mgbe ya dị afọ 11, ụlọ akwụkwọ ya chọrọ ka ụmụ akwụkwọ nile bịa otu nnọkọ oriri Krismas. Ụmụ akwụkwọ ndị nọ na klasị ndị ka elu rụgidere ya ka o kere òkè, ma ọ bịaghị nnọkọ ahụ, onye nkụzi ya ghọtakwara ọnọdụ ya. N’ihi gịnị? N’ihi na n’oge mmalite afọ ụlọ akwụkwọ ahụ, Onyeàmà ahụ na ndị mụrụ ya esorowo onye nkụzi ahụ nwee nzụkọ, ha wee kọwaa akụkụ dị iche iche nke ọnọdụ ndị Kraịst ha.

Mgbe ha na-ekere òkè n’ozi ubi, ụfọdụ ndị na-eto eto bụ ndị Kraịst na-atụ egwu izute ụmụ klasị ma ọ bụ ndị nkụzi ha. Ị̀ na-enwe mmetụta dị otú ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, gịnị mere i bughị ụzọ mee ihe ma mee ka ụmụ klasị gị mara na ị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na ihe mere i ji na-eme otú ahụ. Otu Onyeàmà Jehova dị afọ 14 kọrọ, sị: “Onye ọ bụla nọ n’ụlọ akwụkwọ maara ọnọdụ m dị ka onye Kraịst. N’eziokwu, ha maara ya nke ọma nke na ọ bụrụ na m zute nwa klasị m mgbe m na-ekere òkè n’ozi ahụ, anaghị m eme ihere ma ọlị. Ụmụ akwụkwọ ibe m na-egekarị ntị, ọtụtụ mgbe ha na-anarakwa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible.” Otu onye dị afọ 12 kọrọ na ya na-elepụ nnọọ anya izute ụmụ klasị ya mgbe ọ na-ekere òkè n’ije ozi ahụ. Kama ịbụ onye nwere nkụda mmụọ n’icheta nke a, ọ na-amụghachi mgbe mgbe ihe ọ gaje ikwu mgbe o mere. Otú a, ọ na-adị njikere inye nkọwa ndị ziri ezi banyere okwukwe ya.

N’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ, a na-ekwu na mmadụ pụrụ ịhọrọ ikere òkè ma ọ bụ ịhapụ ikere òkè n’ihe ndị a na-eme mgbe e mechisịrị akwụkwọ. Ma dị ka ọ na-adị n’ezie, ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ na-arụgide ndị mmadụ n’otu n’otu isonye n’ihe omume ndị ahụ. Otu onye Kraịst dị 20 afọ chọtara ụzọ dị mma iji mesoo nrụgide nke a. Ọ sịrị: “Ejere m ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka n’oge nile m nọ na kọleji. Onye ọ bụla maara na eji m ọrụ n’aka nke ukwuu n’ihe banyere okpukpe m nke mere na m pụghị isonye n’ihe ndị ọzọ.” Nwanne nwanyị nke Onyeàmà nke a tọtara gbasoro otu ụzọ ahụ. Ụfọdụ ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst na-esi n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka nke ha jere n’oge ha nọ n’ụlọ akwụkwọ banye kpọmkwem n’ọrụ ọsụ ụzọ oge nile dị ka ndị nkwusa Alaeze oge nile mgbe ha jesịrị ụlọ akwụkwọ ha.

Elefurula ezi mmetụta nke àgwà ọma gị na ịgba àmà i ji obi ike na-agba na-enwe. Kama ịgbachi nkịtị, gịnị mere i gosighị na i guzosiri ike n’okwukwe site n’ikwu okwu n’ụzọ nkwanye ùgwù ma n’atụghị egwu? Nke ahụ bụ ihe otu nwa agbọghọ onye Israel mere, bụ́ onye a dọrọworo n’agha, o wee bịa biri n’ezinụlọ nke onye ọchịagha Siria ahụ bụ Neaman. (2 Ndị Eze 5:2-4) E nyere aha Jehova otuto n’ihi ihe nwa agbọghọ nta ahụ mere n’echereghị ka e chetara ya echetara. Okwukwe yiri nke ahụ n’akụkụ nke gị pụkwara iwetara Chineke nsọpụrụ, nyekwara ndị ọzọ aka iwere ọnọdụ ha dị ka ndị na-eto aha ya.

Ihe bụ eziokwu bụ na anyị apụghị imebi okwukwe anyị ma nọgide na-abụ ndị Kraịst. Jisọs sịrị: “Ya mere, onye ọ bụla nke ga-ekwupụta m n’ihu mmadụ, ya ka mụ onwe m ga-ekwupụtakwa n’ihu Nna m nke bi n’eluigwe. Ma onye ọ bụla nke ga-agọnarị m n’ihu mmadụ, ya ka mụ onwe m ga-agọnarịkwa n’ihu Nna m nke bi n’eluigwe.” (Matiu 10:32, 33) Iguzosi ike n’okwukwe dị ka onye na-eso ụzọ Jisọs bụ ibu ọrụ siri ike, ọ́ bụghị otú ahụ?

Enyemaka Dị Adị

Iji wee guzosie ike dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ dị gị mkpa inwe okwukwe siri ike. Iji nweta nke ahụ, ị ghaghị ịmụsi Bible ike, na-eje nzukọ dị iche iche nke ndị Kraịst, na-ekerekwa òkè n’ozi ubi. Ọ bụrụ na ị ka na-eche na ọ dị ihe ị na-enwebeghị, gịnị ka ị pụrụ ime? Jemes onye ahụ na-eso ụzọ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na amamihe fọdụụrụ onye ọ bụla n’ime unu inwe, ya rịọ n’aka Chineke, onye na-enye mmadụ nile n’afọ ofufo, n’ataghịkwa ụta; a ga-ewerekwa ya nye ya.” (Jemes 1:5) Gwa Jehova okwu site n’ekpere banyere ihe isi ike gị; ọ pụrụ iwusi gị ike iji chee ọnwụnwa ma ọ bụ ule dị iche iche nke okwukwe gị ihu.

Gịnị ọzọ ka onye Kraịst na-eto eto pụrụ ime? Akwụkwọ Ilu na-agwa anyị, sị: “Gee nna gị, bụ́ onye mụrụ gị, ntị, eledakwala nne gị anya mgbe o mere agadi.” (Ilu 23:22) Pọl onyeozi kwadoro ndụmọdụ nke a, n’ihi na ọ sịrị: “Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ihe nile, n’ihi na nke a bụ ihe na-atọ ezi ụtọ n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Kọlọsi 3:20) Ndị nne na nna bụ ndị Kraịst pụrụ inyere unu aka iguzosi ike n’okwukwe. Gee ntị n’aro ndị ha na-atụ. Site n’enyemaka ha, nyochaa Akwụkwọ nsọ na akwụkwọ ndị dabeere na Bible, na-achọ echiche, ndụmọdụ, na ahụmahụ dị iche iche. Ma gị ma ndị mụrụ gị ga-enwe ọṅụ n’ime nke a, ọ ga-enyekwara gị aka imeri ime ihere ma ọ bụ egwu.—2 Timoti 1:7.

Jiri ndokwa nile Jehova Chineke mere site n’ọgbakọ ndị Kraịst mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Kwadebe nke ọma maka nzukọ dị iche iche. Soro ndị okenye na ndị ọzọ, bụ́ ndị nweworo ahụmahụ ndị yiri ndị ahụ ị na-eche ihu kwurịta okwu. Solomọn sịrị: ‘Onye maara ihe ga-anụ, wee tụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya; onye nghọta ga-enwetakwa ezi ndụmọdụ.’ (Ilu 1:5) Ya mere, mụta ihe n’aka ndị meworo okenye karị. Ị pụkwara ịmụta ihe site n’aka ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst, ndị na-enwe ihe ịga nke ọma n’imeri nsogbu ndị yiri nke gị.

Ikwesị Ntụkwasị Obi Na-eweta Ngọzi

Site n’iguzosi ike n’okwukwe, ị ga na-etinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ nke bụ ‘ịbụ onye guzosiri ike, onye a na-apụghị ifopụ efopụ, onye na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile.’ (1 Ndị Kọrint 15:58) Jehova maara, na-aghọtakwa nsogbu ndị ị na-eche ihu. O wusiwo ọtụtụ ndị ike, bụ́ ndị chere ihe isi ike yiri nke ahụ ihu, ọ ga-ewusikwa gị ike. Ọ bụrụ na ị dabere n’ebe Chineke nọ, ọ ga-akwado gị, n’ihi na onye ọbụ abụ ahụ sịrị: “Tụkwasị Jehova ihe o nyeworo gị dị ka ibu, ya onwe ya ga-anagidekwa gị: ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 55:22.

Pita dere, sị: “Ebe unu nwere ezi akọ na uche; ka e wee mee ka ihere mee ha, bụ́ ndị na-akpalị [“na-ekwutọ,” NW] ibi obi ọma unu n’ime Kraịst, n’ime ihe ahụ nke a na-ekwutọ unu n’ime ya.” (1 Pita 3:16) Ọ bụrụ na ị jụ imebi okwukwe gị n’ihe metụtara iwu na ụkpụrụ ezi omume nile nke Chineke, ị ga-enwe ezi akọ na uche, nke bụ ezi ngọzi sitere n’aka Jehova. Ọzọkwa, ị ga-esetịpụ ezi ihe nlereanya nye ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst, ndị ọ pụrụ ịbụ na okwukwe ha esighị ike. (1 Timoti 4:15, 16) Akparamagwa gị pụrụ ịgba ha ume ime mgbalị iguzosi ike n’okwukwe, wee si otú a nwee ike ịtachi obi n’ọnwụnwa.

Ị pụrụ ọbụna inyere ndị ahụ na-emegidebu ọnọdụ ndị Kraịst gị aka. Cheta okwu ndị a na-akpali olileanya: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ewepụkwala aka gị n’anyasị: n’ihi na ị dịghị ama nke ga-agazi agazi, ma ọ bụ nke a ma ọ̀ bụ nke ọzọ, ma ọ̀ bụ na ha abụọ ga-adị mma otu aka ahụ.” (Eklisiastis 11:6) Ònye maara ezi ihe ndị ga-esi ná mkpụrụ ọma ị ghara site n’omume ikwesị ntụkwasị obi gị pụta?

Otu n’ime ngọzi ndị kasị ukwuu ị ga-enweta bụ ọnọdụ ziri ezi n’ihu Chineke. N’ikpeazụ, iguzosi ike n’okwukwe ga-arụpụta ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3; tụlee Jemes 1:12.) O nweghị izu ike ọ bụla na-adị nwa mgbe pụọ n’ọnwụnwa nke a na-enweta site n’imebi okwukwe nke ruru eru iji tụfuo onyinye ahụ.

Gịnị banyere onye ntorobịa ahụ e hotara ná mmalite nke isiokwu a? Ee, ọ tachiri obi n’ahụmahụ ya. Mgbe nnọkọ ụlọ akwụkwọ ahụ gasịrị, o ji akọ gbalịa ịkọwara ndị nkụzi ya ọnọdụ ya. Ọ bụ ezie na ha anaraghị nkọwa ya, o nwere afọ ojuju nke ịmara na ya emewo ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ọ nọgidere na-akwado okwukwe ya ruo mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ. Mgbe ahụ, ọ ghọrọ onye ọsụ ụzọ. Ka ntachi obi nke i ji okwukwe na-enwe rụpụtakwa ihe obi ụtọ dị otú a. Ọ ga-eme otú ahụ ma ọ bụrụ na i guzosie ike n’okwukwe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka ntụle nke ndị a na ụkpụrụ Bible ndị ọzọ, lee akwụkwọ ahụ bụ Questions Young People Ask—Answers That Work, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 25]

ENYEMAKA DỊ ADỊ

◻ Gee ntị n’okwu amamihe nke ndị mụrụ gị, bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke.

◻ Jiri ndokwa ime mmụọ nile dị n’ọgbakọ ndị Kraịst mee ihe.

◻ Soro ndị okenye a họpụtara ahọpụta na ndị ọzọ ndị pụrụ inweworị nsogbu ndị yiri nke gị kwurịta okwu.

◻ Soro ndị Kraịst ndị ọzọ na-eto eto,

bụ́ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma n’imeri ihe mgbochi ndị yiri nke gị kwurịta okwu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya