Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼Olee ndụmọdụ bụ isi nke Ilu 27:23 na-enye ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ nakwa ndị Kraịst dum?
Amaokwu ahụ na-agụ, sị: “Mara ihu ìgwè ewu na atụrụ gị nke ọma, tụkwasị obi gị n’ìgwè anụ ụlọ gị nile.” (Ilu 27:23) E jiwo akụkụ ihe odide nke a mee ihe ọtụtụ ugbo iji gbaa ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ ume igosi mmasị n’ọnọdụ na ná nsogbu nile nke ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ, marakwa ha nke ọma. Agbamume dị otú ahụ kwesịrị ekwesị, ebe ọ bụ na Bible ji ndị okenye tụnyere ndị ọzụzụ atụrụ, jirikwa ọgbakọ tụnyere ìgwè atụrụ. (Ọrụ 20:28, 29; 1 Pita 5:2-4) Ma, ọ bụ ezie na ụkpụrụ dị n’elu ebe a dị irè, amaokwu ahụ abụghị banyere ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ n’ụzọ bụ isi.
Akwụkwọ Ilu nwere ọtụtụ amaokwu n’ime ya ndị kwụụrụ onwe ha dị ka ihe bụ kpọmkwem okwu ndụmọdụ, ma Ilu 27:23 bụ otu akụkụ nke otu ìgwè amaokwu: “Mara ihu ìgwè ewu na atụrụ gị nke ọma, tụkwasị obi gị n’ìgwè anụ ụlọ gị nile: n’ihi na ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka akụ dị; okpueze kwa, ọ̀ na-adịru ọgbọ nile? E kpopụwo ahịhịa ndụ, e wee hụ ahịhịa ndụ, chịkọtakwa ihe ọkụkụ nile nke ugwu nile. Ụmụ atụrụ dịịrị uwe oyiyi gị, ọnụ ahịa nke ọhịa gị ka ewu bụkwa: ara ewu ga-ezukwara nri gị, zuokwara nri ụlọ gị; bụrụkwa ihe ga-edebe ụmụ agbọghọ gị ndụ.”—Ilu 27:23-27.
Akụkụ okwu nke a sitere n’ike mmụọ nsọ na-ebuli elu ụzọ ndụ nke ịdị uchu, ịrụsi ọrụ ike, ibi ndụ dị mfe, na ịghọta ndabere anyị dabeere n’ebe Jehova nọ. Ọ na-eme nke a site n’ime ka ndụ onye Israel nke na-azụ atụrụ na-ebi n’ọhịa pụta ìhè, ma eleghị anya iji gosi ọdịiche dị n’etiti ya na ndụ okomoko nke dabeere n’azụmahịa na inweta uru ngwa ngwa.
“Akụ,” ma ọ bụ ihe onwunwe nke e nwetara n’ihe omume azụmahịa ndị dị ngwa, bụ́ nke na-arụpụta mmadụ ịbụ onye a ma ama (“okpueze”), pụrụ ifu ọsọ ọsọ, dị ka ọtụtụ ndị pụrụ ịgba akaebe. Otú a, e nwere ọtụtụ ihe a pụrụ ikwu iji kwadoo ibi ndụ dị mfe, dị ka nke ahụ ndị ọzụzụ atụrụ oge ochie gbasoro n’ilekọta ìgwè anụ ụlọ. Ụzọ ndụ ahụ dị mfe n’echiche nke bụ na o nweghị ihe nchekasị. Ọ dị mkpa ka onye na-azụ atụrụ legide ìgwè atụrụ ya anya, na-ejide n’aka na e chebere ìgwè atụrụ ahụ. (Abụ Ọma 23:4) Ọ bụrụ na ọ hụta nke na-arịa ọrịa ma ọ bụ nke merụrụ ahụ mgbe ọ na-elekọta ha, ọ pụrụ iji mmanụ nke na-eme ka ahụ dajụọ tee ya. (Abụ Ọma 23:5; Ezikiel 34:4; Zekaraịa 11:16) Ọ na-adabakarị na onye na-azụ atụrụ nke na-etinye uchu nke ọma, onye obi ya na-adị n’ìgwè anụ ụlọ ya, ga-ahụ ka mgbalị ya nile na-arụpụta ihe—mmụba na-abịa nke nta nke nta n’ọnụ ọgụgụ ìgwè atụrụ ya.
Onye ọzụzụ atụrụ nke na-arụsi ọrụ ike, na-elezikwa anya nwere ebe a pụrụ ịdabere na ya nke enyemaka si abịa—Jehova. Ò si aṅaa bụrụ otú ahụ? Ee, Chineke na-enye oge na mgbe dị iche iche ndị na-emekarị ka e nwee ahịhịa zuru ezu iji zụọ ìgwè atụrụ ahụ. (Abụ Ọma 145:16) Mgbe a na-enwekwaghị ahịhịa ndụ n’ebe ndị dị ala n’ihi mgbanwe nke oge ihu igwe, ahịhịa pụrụ ijupụta n’ebe ndị dị elu karị, bụ́ ebe onye ọzụzụ atụrụ nke na-elezi anya nke ọma pụrụ iduru ìgwè anụ ụlọ ya jee.
Ilu 27:26, 27 hotara ihe na-esi n’ọrụ dị otú ahụ apụta—nri na uwe oyiyi. N’ezie, nkọwa ahụ abụghị nke nri oké okomoko ma ọ bụ nri pụrụ iche ndị a nụchara anụcha, ọ dịghị enyekwa onye na-arụ ọrụ ihe mere ọ ga-eji tụọ anya inweta uwe oyiyi ndị kasị bụrụ ọgbara ọhụrụ ma ọ bụ ụdị ákwà kachasị mma. Ma ọ bụrụ na ọ dị njikere itinye mgbalị, onye ọzụzụ atụrụ ahụ na ezinụlọ ya pụrụ isi n’ìgwè ewu na atụrụ ahụ nweta mmiri ara (sikwa otú a nweta cheese) nakwa ají anụ nke a ga-eji kpaa uwe ndị siri ike.
Ya mere, ndụmọdụ ahụ bụ: “Mara ihu ìgwè ewu na atụrụ gị nke ọma” abụghị maka ndị nlekọta ime mmụọ n’ụzọ bụ isi; ọ bụ maka ndị Kraịst nile. Ọ na-emesi ike uru nke anyị inwe afọ ojuju mgbe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, bụ́ ndị anyị nwetara site n’ịnọgide n’ịrụsi ọrụ ike, na-atụkwasị obi na Chineke agaghị agbakụta anyị azụ. (Abụ Ọma 37:25; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:8, 12; Ndị Hibru 13:5) Ọ bụrụ na anyị ejiri Ilu 27:23-27 tụlee ndụmọdụ ahụ dị na Luk 12:15-21 na 1 Timoti 6:6-11, anyị na-ahụ ụzọ ndụmọdụ Chineke n’okwu a siworo nọgide na-abụ otu ihe. Ya mere, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịgụghachi Ilu 27:23-27, na-ajụ onye anyị, sị, ‘Àna m etinye nke a n’obi m, na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ m na-adị kwa ụbọchị?’
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.