Nchụso nke Nnwere Onwe na Senegal
N’EBE dị nso ụsọ oké osimiri site na Dakar, bụ́ isi obodo ọgbara ọhụrụ nke Senegal, ka e nwere obere Agwaetiti Gorée. N’ebe ahụ ka otu oké ihe guzo nke na-eme ka e cheta otu akụkụ dị mwute nke akụkọ ihe mere eme—otu ụlọ ndị ohu nke e wuru na 1776.
Ọ bụ otu n’ime ụlọ ndị dị otú ahụ ebe a na-ekpojupụta site na 150 ruo 200 ndị ohu n’ọnọdụ ndị na-adịghị mma ruo ihe dị ka ọnwa atọ tupu e jiri ụgbọ mmiri bupụ ha jee n’ebe ndị dị anya. E kewasịrị ezinụlọ iche iche, ndị nọ na ha ahụrịtaghịkwa ibe ha anya ọzọ; a pụrụ izije onye bụ nna na Louisiana nke dị na North America, buje onye bụ nne na Brazil ma ọ bụ Cuba, bujekwa ụmụ ha na Haiti, Guyana, ma ọ bụ Martinique. Lee nnọọ nlefuru anya nke a bụ nye nnwere onwe mmadụ! Nke a bụkwa ihe ncheta siri ike na nnwere onwe bụ ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ọ na-abụghị mmadụ nile nwerela ya mgbe nile.
Amatara m banyere nke a site n’akwụkwọ nta ahụ a na-enye ndị njem nke m nọ na-agụ mgbe m nọ n’ụgbọ elu nke na-eje Senegal, bụ́ mba kasị dịrị n’ebe ọdịda anyanwụ nke akụkụ Ọdịda Anyanwụ Africa ahụ nke nubara n’ime mmiri. Akụkụ dị larịị nke Senegal dị n’etiti ọzara ndị dị n’ebe ugwu na n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa oké ọhịa ndị dị n’ebe ndịda. N’ebe a ka ị pụrụ ịhụ osisi baobab ahụ mara mma, nke na-adị ogologo ndụ, ya na mkpụrụ ya ahụ dị mgbagwoju anya nke a na-akpọ achịcha enwe, nke a na-esi na ya emepụta mmanụ tartar. Nke a bụkwa ala ebe e nwere ọtụtụ enwe na nnụnụ ndị nwere ụcha dị iche iche na obodo nta dị iche iche ndị dị n’etiti ìgwè osisi mango.
Anọlara m azụ wee chee echiche banyere ojije nke a m nọworo na-echere ruo ogologo oge nke m na-eje n’ọnụ ụzọ nke a e si abanye n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Taa, Senegal, ya na nde mmadụ asaa ndị bi na ya, bụ́ ndị si n’agbụrụ dị iche iche, nwezuru nnwere onwe. Ma, ọ̀ pụrụ ịbụ na mmadụ nweere onwe ya n’anụ ahụ ma bụrụ onye nọ n’ohu nye ihe omume na nkwenkwe ụgha ndị na-anapụ ya ezi nnwere onwe? Atụsiri m anya ike izute ụmụnna ime mmụọ m na iji ntị m nụrụ ihe banyere ọganihu eziokwu ahụ nke na-eme ka ụmụ mmadụ pụọ n’ohu nweworo n’akụkụ ahụ nke ụwa.—Jọn 8:32.
‘Jehova Chọrọ Ka Unu Nwere Ụlọ nke a’
Ihe mbụ dị n’usoro ihe omume m bụ ije leta alaka ụlọ ọrụ Watch Tower na ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Dakar. Ka anyị rutere n’ụlọ ahụ bụ nke ọgbara ọhụrụ nke dị n’ógbè dị nnọọ jụụ, ahụtara m otu nnukwute mkpụrụ akwụkwọ J n’ihu ya. Ajụjụ mbụ m jụrụ ná njegharị anyị mere n’alaka ụlọ ọrụ ahụ bụ ihe mkpụrụ akwụkwọ ahụ bụ J nọchiri anya ya.
“Ọ bụ ihe na-akpali nnọọ mmasị,” ka onye na-eduzi m kọwara. “Mgbe anyị na-achọ ụlọ buru ibu karị na 1985, anyị bịara ileta ụlọ nke a, bụ́ nke a ka na-ewu ewu n’oge ahụ. Ma anyị chere na o buru ibu karịa ihe anyị chọrọ. Mgbe onye nwe ya nụrụ na anyị bụ Ndịàmà Jehova, ọ chọsiri nnọọ ike inye anyị ụlọ ahụ ná ngo, ebe ọ maara na anyị bụ ndị na-eme ihe n’eziokwu. ‘Eji m n’aka na Chineke unu, bụ́ Jehova, chọrọ ka unu nwere ụlọ nke a,’ ka ọ sịrị. ‘Leenụ! Ọbụna na e nwere nnukwute J n’ihu ya! Mgbe m gwara ha ka e tinye ya n’ebe ahụ, echere m na ọ ga-anọchite anya aha m, bụ́ John, ma ugbu a, eji m n’aka na ọ nọchitere anya aha Chineke ahụ, bụ́ Jehova!’ Anyị enwewo obi ụtọ ịnọ n’ọmarịcha ụlọ nke a ruo afọ ise gaworo aga.”
Ihe ọzọ m chọrọ bụ ịmara otú ọrụ nkwusa ahụ si malite na Senegal.
“E webatara mmiri na-enye nnwere onwe nke eziokwu na Senegal ná mmalite afọ ndị 1950 site n’aka otu n’ime Ndịàmà Jehova bụ onye France onye bịara ịrụ ọrụ ngó. Na 1965, e meghere otu alaka ụlọ ọrụ na Dakar ilekọta ọrụ nke mba ndị na-asụ asụsụ French, bụ́ Senegal, Mali, na Mauritania, tinyekwara mba ahụ na-asụ asụsụ Bekee, bụ́ Gambia. Kemgbe 1986, anyị anọwo na-elekọtakwa ọrụ a na-arụ na Guinea-Bissau, ebe a na-asụ asụsụ Portuguese.”
N’iburu n’uche na ihe karịrị 90 pasenti nke ndị bi n’ebe a abụghị ndị Kristian, ajụrụ m banyere ọganihu e nweworo. “Ọ bụ ezie na ọtụtụ mmadụ ná mba ndị a amaghị banyere Bible,” ka onye ahụ na-eduzi m kwuru, “ma ọrụ ahụ na-aga nnọọ n’ihu nke ọma. Na January 1991, anyị nwere obi ụtọ inwe 596 ndị nkwusa Alaeze. Nke ahụ na-egosi na ụmụnna ndị ebe ahụ na ndị ozi ala ọzọ anọwo na-arụsi nnọọ ọrụ ike.”
“Anụrụ m na e nwere ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ na-eje ozi n’ebe a,” ka m kwuru.
“Ee, anyị nwere ihe dị ka 60 ndị e kenyere ọrụ n’ókèala dị iche iche ndị anyị na-elekọta, ha sitekwara na mba 13 dị iche iche wee bịa. Ha na-arụsi ọrụ ike, ha enyewokwa aka n’ụzọ dị ukwuu n’ime ka ọrụ ahụ guzosie ike. Ụmụnna ndị ebe ahụ na-egosipụta mmụọ nke a n’ịhụnanya na ịnụ ọkụ n’obi ha nwere maka eziokwu ahụ. N’agbanyeghị iche nsogbu ndị dị ka enweghị ọrụ na inwe ihe onwunwe dị nta ihu, ọtụtụ ụmụnna na-etinye hour 15 na ihe karịrị nke ahụ n’ozi ubi kwa ọnwa. Anyị nwere olileanya na ị ga-ezute ụfọdụ n’ime ndị a ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ná nleta gị nke a.”
Enwere m nnọọ olileanya ime otú ahụ.
Iso Ndị Ozi Ala Ọzọ Jee n’Ubi
Margaret (onye nọworo n’ije ozi ala ọzọ ruo ihe karịrị 20 afọ ruokwa mgbe ọ nwụrụ n’oge na-adịghị anya gara aga) wepụtara onwe ya ịkpọrọ m jee n’ókèala ya n’etiti obodo ukwu ahụ. Anyị banyere n’otu ụgbọ ala car rapide (ụgbọ awara awara) iji wee matatụ otú ndụ ndị ebe ahụ dị. Ọ bụ n’ezie bọs nta nke na-akwụsị n’ọtụtụ ebe. Ọ na-ebu 25 ndị njem, ọ bụrụkwa na ha nile bụ ndị na-ebughị ibu, apụrụ m ịhụ na njem ahụ pụrụ ịfọdụ nke nta ka ọ bụrụ nke ntụsara ahụ. Ma, ọ dịghị nnọọ ụzọ ọ bụla a pụrụ iji kwuo na ndị inyom abụọ mụ na ha nọkọrọ n’oche ebughị ibu. Ma eji m ihu ọchị nagide ọnọdụ ahụ.
“N’ókèala m nke dị n’ógbè azụmahịa nke obodo ahụ, ị pụrụ ịhụ ọtụtụ ihe na-akpali mmasị,” ka Margaret kọwara mgbe anyị ruru n’ebe anyị na-eje. “Ị̀ hụrụ akpụkpọ ụkwụ ndị ahụ nwere ụcha dị iche iche?” ka ọ jụrụ, na-atụ aka n’obere ụlọ ahịa ụfọdụ ndị dị n’akụkụ okporo ụzọ. “E ji akpụkpọ atụrụ na akpụkpọ ewu e sijiri esiji wee mee ha.” Anyị jekwuuru ndị ahụ na-ere akpụkpọ ụkwụ, Margaret wee malite ịgwa ha okwu n’asụsụ ha, bụ́ Wolof. Ha gere ntị nke ọma, nweekwa mmasị nke ukwuu n’ihe osise Adam na Iv ndị dị n’akwụkwọ nta ahụ nke nwere ọtụtụ ihe osise ndị mara mma.
N’oge na-adịghị anya, ndị ahịa mbugharị bịakwutere anyị, ndị a maara n’ebe a dị ka ndị bana-bana, na-eche anyị ọtụtụ ihe dị iche iche n’ihu. Ụfọdụ ndị bu azịza; ndị ọzọ butere ákwà, igodo, ọgwụ, akpa nta, oroma, na ọbụna nnụnụ ndị dị ndụ. Otu n’ime ha chọrọ iresị m kora, bụ́ ngwa egwú e ji ebele a chawara ọkara wee mee, jirikwa osisi mee olu ya; a na-eji aka abụọ akpọ ya. Ahụtara m na n’azụ ya, e nwere otu ihe oyiyi nke ihu ekpo e ji akpụkpọ anụ, mpì ewu, na mkpo ihe dị iche iche ndị na-eweta “ihu ọma” wee mee. Anyị kọwara na anyị agaghị azụ ihe ọ bụla e ji akara ndị pụrụ inwe njikọ n’etiti ha na ime anwansi ma ọ bụ ihe megidere ozizi ndị Kraịst wee chọọ mma. N’ịbụrụ anyị ihe ijuanya, onye bana-bana ahụ kwenyeere anyị, na-ekwupụta na ya onwe ya bụ onye Alakụba. O zoro kora ahụ n’azụ nnukwute uwe ma ọ bụ boubou ya, wee gee ntị nke ọma mgbe Margaret na-eche akwụkwọ nta ahụ n’ihu ha, bụ́ nke e dere n’asụsụ Arabic. O nwere mmasị nke ukwuu nke na ọ naara akwụkwọ nta ahụ wee malite ịgụ ya ozugbo ahụ. Mgbe o kelesịrị anyị ekele nke ukwuu, o jiiri akwụkwọ nta ahụ na kora ahụ ọ na-ereghị wee pụọ. Anyị ji n’aka na ọ ga-amụ akwụkwọ nta ahụ mgbe ọ laruru.
Mgbe e mesịrị, mụ na John kwurịtara okwu, bụ́ onye bụwokwara onye ozi ala ọzọ ruo ihe karịrị 20 afọ.
“Ndị ebe a nwere nnọọ omume enyi, ị pụkwara ịgwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla i zutere okwu,” ka John gwara m. “Ekele a na-anụkarị, bụ́ ‘assalam alaikum’ pụtara ‘udo dịrị unu,’ ihe kakwa n’ọtụtụ mmadụ bụ ndị udo. Nke a bụ ala nke teranga, ma ọ bụ ile ọbịa anya nke ọma, a na-egosipụtakwa ya site n’inwe obi ọma, ezi mmetụta mmadụ, na obi ụtọ.” Ọ na-adịwanyere m mfe ịghọta ihe mere ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-eto eto bụ ndị mba ọzọ pụrụ iji hapụ ezinụlọ na ndị enyi ha bịa ije ozi n’ubi ozi ala ọzọ nke a.
Ịbụ Ndị Nweere Onwe Ha Ịgbaso Ije Ozi Oge Nile
Mmụọ ije ozi ala ọzọ nwere mmetụta dị omimi n’ahụ Ndịàmà bụ ndị ebe ahụ. Nke a pụtara ìhè karịsịa n’ihi na enweghị ọrụ nke zuru ebe nile na-eme ka iwere ozi ọsụ ụzọ oge nile bụrụ ezi ihe ịma aka. Marcel na Lucien, bụ́ ndị a tọhapụrụ site n’ọtụtụ àgwà ndị na-emerụ ahụ site n’ịmụta eziokwu Bible, kọwara, sị:
“Anyị chọrọ igosi obi ekele anyị site n’ịmalite ije ozi ọsụ ụzọ. Ma ọ bụ ihe siri ike ịchọta ọrụ nwa oge. Anyị nwalere ịrụ ọrụ ubi, ma ọ gaghị nke ọma. Ịsa ákwà iji nweta ihe anyị na-eri wekọọrọ akụkụ dị ukwuu nke oge anyị. Ugbu a, anyị nọ n’ọrụ nke imepụta achịcha, na-enwe ụlọ ahịa dị iche iche ndị anyị na-ebujere ihe mgbe nile, nke a na-agakwa nke ọma.” N’ezie, o were ha okwukwe na nkà dị ukwuu, tinyere mgbalị e ji ezi obi mee, ma nke a na-egosi na o kwere omume ịbanye n’ozi oge nile nile ọbụna mgbe ọnọdụ akụ na ụba na-adịghị mma.
Mgbe Ndịàmà Jehova malitere iduziri Michel ọmụmụ Bible, ọ na-eje mahadum dị na Dakar. “Enwere m obi ịda m̀bà n’ihi mmụọ adịghị ọcha nke ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ndị ahụ, ajụjụ ndị na-agbagwoju anya nọgidekwara na-enye m nsogbu,” ka ọ kọrọ. “N’ihi gịnị ka mmadụ ji bụrụ ohu nye àgwà na ọnọdụ ndị dị otú ahụ ndị na-emerụ ahụ? Bible nyere m azịza ha. O yiri ka e bupụwo ibu dị arọ n’ubu m. Ọ bụ ezie na ndị mụrụ m kwuru ka m nọgide n’ihe ọmụmụ m, amalitere m ije ozi ọsụ ụzọ inyeaka, mesịakwa jee ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile n’akụkụ fọdụrụ nke oge nile m nọrọ na mahadum. Ahụrụ m iso ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ dị ka onye ọsụ ụzọ, ọ bụghị ịchụso ọrụ a ga-arụ n’ime usoro ihe nke gaje iru njedebe ya n’isi nso, dị ka ihe na-enye m ọṅụ kachasị ukwuu.” Michel na-eje ozi ugbu a dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche na Mbour.
Ịlụ Karịa Otu Nwanyị Megide Ịlụ Otu Nwanyị nke Ndị Kraịst
Ọ bụghị mgbe nile ka omenala obodo na-ekwekọ n’ụkpụrụ ndị Kraịst, nke a pụkwara iweta ihe ịma aka ndị pụrụ iche. Alioune, bụ́ onye isi oche ndị nlekọta n’otu n’ime ọgbakọ isii nke Ndịàmà Jehova dị na Dakar na ógbè ndị gbara ya gburugburu, kọrọ, sị: “Mgbe mbụ m nụrụ eziokwu ahụ nke na-eme ka a pụọ n’ohu, enwere m ndị nwunye abụọ. Dị ka onye Alakụba nke na-eme ihe okpukpe ya kwuru, okpukpe m nyere m ohere inwe ọbụna karịa otú ahụ. Nna m nwere ndị inyom anọ, ọtụtụ n’ime ndị enyi m nwekwara ọtụtụ ndị inyom. Ọ bụ ụzọ a na-anara nke ọma n’Africa ebe a.” Ma gịnị bụ mmetụta nke ụzọ ndụ dị otú a?
“Inwe ihe karịrị otu nwunye pụrụ ịkpata ọtụtụ nsogbu,” ka Alioune kọwara, “karịsịa n’ihe metụtara ụmụntakịrị. Enwere m ụmụ iri site na nwunye m nke mbụ, nweekwa ụmụ abụọ site na nwunye nke abụọ. N’ezinụlọ ndị dị otú ahụ, nna na-abụkarị onye ọbịa n’ebe ụmụ ya nọ, ya mere ha adịghị erite uru site n’enyemaka na ọzụzụ ya. Ọ dabakwara na inwe ihe karịrị otu nwanyị echebeghị m site n’ịkwa iko. Kama nke ahụ, ọ bụ njide onwe onye, bụ́ mkpụrụ nke mmụọ Chineke, bụ ihe meworo nke ahụ.” Ya mere, gịnị ka Alioune mere?
“Emere m ka nwunye m nke abụọ laghachikwuru ndị mụrụ ya,” ka ọ gara n’ihu ikwu, “wee jiri akọ kọwaa na ọ bụghị na ọ dị ihe ọjọọ m chọpụtara n’ebe ọ nọ, kama ọ bụ iji mee ihe kwekọrọ n’ihe Chineke chọrọ m n’aka. Emere m ndokwa ndị pụrụ iche iji lekọta ụmụ m nile n’ụzọ anụ ahụ nakwa n’ụzọ ime mmụọ, enwekwara m ekele na taa ha na-ejekwara Jehova ozi. N’ime itoolu ndị bụ ndị nkwusa, ise emewo baptism, abụọ na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, atọ ndị nke ọzọ dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile na nke inyeaka. Eziokwu ahụ emewo ka m nwere onwe m n’ezie pụọ n’ọtụtụ n’ime nsogbu ndị ịzụ ụmụ na-akpata.”
Ife Arụsị Megide Ezi Ofufe
Ihe ọzọ dị n’usoro njem m bụ ije leta ógbè Casamance nke dị n’ebe ndịda. Ọ masịrị m ịhụ otú ihe nile si dịrị nnọọ ndụ, na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. N’ịbụ nke nnukwute Osimiri Casamance ahụ na-enye mmiri nke ọma ruo ihe dị ka 300 kilomita, ógbè ahụ na-emepụta osikapa, ọka, na ahụekere nke ọma. Gburugburu ime obodo ahụ, e nwere ọtụtụ ụlọ nta dị okirikiri ndị e wuru n’ụdị ụlọ elu, ndị e ji akịrịka kpuchie elu ha n’ụzọ nwere opi nke a na-eji echeta mmiri ozuzo nke a ga-eji mee ihe n’oge ọkọchị. Isi obodo ya, bụ́ Ziguinchor, bụ nke e wuru n’okpuru ọdọ nkwụ buru ibu. Enwere m obi ụtọ izute otu ọgbakọ na-anụ ọkụ n’obi nke ndị Jehova n’ebe a.
Dominic, bụ́ onye ozi ala ọzọ nke na-arụ ọrụ na Ziguinchor na n’ebe ndị dị ya gburugburu, gwara m na ọrụ nkwusa ahụ n’ógbè nke a na-aga nnọọ nke ọma. “Nanị n’afọ iri gara aga,” ka ọ sịrị, “e nwere ndị nkwusa 18 n’Ọgbakọ Ziguinchor. Ugbu a e nwere 80. Iji lekọta oké mmụba nke a, anyị ewuwo ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ, na-eji ájá uhie nke e nwetara kpọmkwem n’akụkụ ebe e wuru ụlọ nzụkọ ahụ. Ọrụ ihe owuwu ahụ ghọrọ oké ihe ịgba àmà nye ndị ebe ahụ. Ndị hụrụ mmadụ ndị sitere n’agbụrụ dị iche iche ka ha na-arụkọ ọrụ n’udo kwuru okwu ọma dị iche iche. N’otu mgbakọ sekit e nwere n’oge na-adịbeghị anya, ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwere bụ 206, e mekwara mmadụ 4 baptism.”
Ọtụtụ ndị bi n’akụkụ nke a nke Senegal ka na-agbaso nkwenkwe ndị mmụọ nke ndị nna ha ochie, na-efe arụsị dị iche iche ọ bụ ezie na ha na-ekwu na ha bụ ndị Kristian ma ọ bụ ndị Alakụba. Egere m ntị nke ọma n’akụkọ ahụ Victor kọrọ, onye bụ okenye n’Ọgbakọ Ziguinchor.
“A mụrụ m n’otu nnukwu ezinụlọ na-ekpere arụsị na Guinea. Mgbe a mụrụ m, nna m raara m nye otu mmụọ, ma ọ bụ mmụọ ọjọọ. Iji nweta ihu ọma nke mmụọ ahụ, ana m esi n’okpuru àkwà ebupụta otu igbe ojii mgbe mgbe, guzobe otu obere ebe ịchụ àjà, chụọkwara mpì anụ nke nọchiri anya mmụọ ọjọọ ahụ na-echebe m àjà ọbara. Ọbụna mgbe m ghọsịrị onye Katọlik, m ka nwere mmetụta nke ịbụ ohu nye ndị mmụọ ọjọọ ahụ. Mgbe m kwafetara na Senegal, Ndịàmà Jehova malitere iduziri m ọmụmụ Bible. Mụ na nwunye m mụtara na anyị apụghị ịnọgide ‘na-eri na table Jehova na table ndị mmụọ ọjọọ.’ (1 Ndị Kọrint 10:21) Ma mgbe m kwụsịrị ịchụ àjà ndị ahụ, ndị mmụọ ọjọọ ahụ malitere ịwakwasị anyị. Egwu tụrụ m ịtụfu igbe ojii ahụ na ihe nile metụtara ndị mmụọ ọjọọ ndị dị n’ime ya n’ihi na amaara m banyere otu nwoke onye isi gbakara mgbe o mere nke ahụ.” Lee nnọọ ọnọdụ amaghị nke ọ ga-eme Victor nọ n’ime ya!
“N’ikpeazụ, okwu dị ná Ndị Rom 8:31, 38, 39 nyere anyị ume nke dị mkpa iji wepụchasịa ihe nile metụtara ikpere arụsị. Ugbu a, anyị nweworo obi ike n’ebe Jehova nọ, anyị abụwo ndị a tọhapụrụ n’ezie. Ezinụlọ m dum nwere olileanya dị ebube nke inweta ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala, ebe ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-enwere onwe ha pụọ ná mmetụta nke ndị mmụọ ọjọọ.”
N’ikpeazụ, oge ruru mgbe m ga-ala. Ka m na-akwakọta ngwongwo m, atụgharịrị m uche ná nleta ahụ m na-apụghị ichefu echefu m mere na Senegal. Lee ihe na-ewusi okwukwe ike ọ bụwooro m izute, sorokwa ọtụtụ ndị kwurịta okwu, bụ́ ndị a tọhapụworo site n’agbụ nke iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ibi ndụ rụrụ arụ, na nkwenkwe ụgha, ndị na-enweta ọṅụ ugbu a n’ezi nnwere onwe. N’agbanyeghị ọnọdụ akụ na ụba ndị na-adịghị mma, ha na-enweta ọṅụ na afọ ojuju n’ijere Jehova ozi, bụ́ onye wetawooro ha olileanya e ji n’aka nke ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs. Lee ka anyị si nwee obi ụtọ nye ya, bụ́ onye meworo ka o kwe omume ịhụ na a kpọsara ozi ọma dị otú ahụ, ọ bụghị nanị na Senegal, kamakwa gburugburu ụwa n’ime “afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ”! (Aịsaịa 61:1, 2)—Ọ bụ onye ọzọ dere nke a.
[Map dị na peeji 8]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
SENEGAL
St. Louis
Louga
Thiès
Dakar
Kaolack
GAMBIA
Banjul
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
A na-ekesa mmiri nke eziokwu ahụ na-enye nnwere onwe n’ime obodo nta dị iche iche
Ebe obibi ndị ozi ala ọzọ na alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Dakar, Senegal
[Foto dị na peeji nke 10]
N’ogologo ụsọ oké osimiri ahụkwa, ndị Senegal na-anụ ozi ndị Kraịst