Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 11/15 p. 24-27
  • Ozi Ọma Erute Ime Ime Obodo South Africa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Ọma Erute Ime Ime Obodo South Africa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Ụlọ Akwụkwọ Ụbọchị “Sunday” n’Ala Ndị Zulu
  • N’Ógbè Mbara Ọhịa ahụ nke Na-ekpo Ntụ
  • Onye Chiifu Enye Iwu!
  • Iji Ọṅụ Na-enyere Ọtụtụ Ndị Na-achọ Eziokwu Aka
  • Mkpụrụ nke Ịrụsi Ọrụ Ike
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 11/15 p. 24-27

Ozi Ọma Erute Ime Ime Obodo South Africa

ÌGWÈ mmadụ ndị iwe ji, ndị uwe ojii ndị na-achịkwa ọgba aghara, ikuku tear gas. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e jiwo ọgba aghara dị otú ahụ tisasịa obodo nta na obodo ukwu dị iche iche dị na South Africa. Ọbụna ebe ime ime obodo ahụ mara mma—ebe ihe karịrị 40 pasenti nke ndị ala ahụ bi—agbanarịbeghị ajọ mmetụta nile nke ime ihe ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Otú ọ dị, n’etiti ihe a nile, Ndịàmà Jehova anọgidewo na-ekwusa “ozi ọma nke udo.”—Ndị Efesọs 6:15.

Ruo ọtụtụ afọ, Ndịàmà ahụ anọwo na-eme nkwusa ọnwa atọ ha na-eme kwa afọ, bụ́ nke e chere ihu n’ebe ndị bi n’ime ime obodo dị. Dị ka ihe atụ, na 1990, ihe karịrị 12,000 ndị nkwusa Alaeze ndị si na 334 ọgbakọ dị iche iche keere òkè ná mkpọsa nke a. Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, a ghaghị imeri ọtụtụ ihe mgbochi iji rute n’ebe ndị a bisasịrị ebisasị n’ime ime obodo ebe ndịda Africa nọ.

Gụnyere ihe ndị ọzọ, Ndịàmà ahụ aghaghị ime ihe banyere ọtụtụ omenala na asụsụ dị iche iche. Leekwa nnọọ ụdị ngwakọta ihe dị iche iche ọ bụ! Dị ka ihe atụ, e nwere ndị na-arụ ọrụ ugbo, bụ́ ndị na-asụ asụsụ Bekee na asụsụ Afrikaans, nweekwa ndị Pedi, Sotho, Tsonga, Tswana, Venda, Xhosa, na ndị Zulu. Ìgwè nke ọ bụla nwere àgwà na asụsụ nke ha dị iche. E nwekwara ebe dị iche iche dị anya a ga-eje, tinyekwara ụzọ ọjọọ. Ihe ndị a nile chọrọ mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà na mmefu oge na ego dị ukwuu. Ma n’agbanyeghị nke a, Jehova agọziwo n’ụba mgbalị nile ha mere. Ka anyị kọọrọ unu ihe dị nta banyere ihe isi ike na ihe ịga nke ọma nke akụkụ nke a pụrụ iche nke ọrụ nkwusa ahụ.—Tụlee Malakaị 3:10.

Ụlọ Akwụkwọ Ụbọchị “Sunday” n’Ala Ndị Zulu

Kpọmkwem n’etiti ala ndị Zulu ahụ nke na-abụchaghị ebe okpomọkụ ka e nwere ndagwurugwu ahụ dị omimi nke Osimiri Umvoti. Site n’oké nkume ndị dị n’elu ugwu ya, mmadụ pụrụ ịhụ nchịkọta dị iche iche nke ụlọ akịrịka ndị Zulu ka ọ gbatịpụrụ gaa n’ihu. N’otu ụbọchị Sunday na 1984, ndị nkwusa Alaeze abụọ batara n’ime ndagwurugwu ahụ nke dị n’okporo ụzọ ahụ gbagọrọ agbagọ, na-ekpokwa ntụ. Ógbè ahụ na-ekpọ ọkụ nke ukwuu, na-akpatakwa ọsụsọọ nke na a gụgharịwo ebe ahụ aha ịbụ Kwa-Sathane (Ebe Setan)—nke doro anya na ọ bụ izo aka n’ozizi ụgha ahụ nke ọkụ ala mmụọ ebe Ekwensu na-elekọta.

N’ịbụ ndị ọsụsọọ dere n’ahụ, ụmụnna ahụ bịakwutere otu nwanyị aha ya bụ Doris, onye na-eduzi otu klasị Sunday school. Mgbe ọ nụsịrị ozi Alaeze ahụ, Doris kpọrọ Ndịàmà ahụ òkù ozugbo ka ha gwa ìgwè ahụ ọ na-eduzi okwu, bụ́ nke ihe dị ka 40 ndị ntorobịa mejupụtara. Gịnị si na nke a pụta? Ụmụnna ahụ bịaghachiri n’izu na-esonụ, na-eji 70 akwụkwọ ahụ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible, maka iji ya mee ihe n’ụlọ akwụkwọ dị n’obodo ahụ. N’izu ole na ole, ọdịdị ụlọ akwụkwọ Sunday school ahụ gbanwere gaa na nke ìgwè ọmụmụ Bible. Kama ịbụ abụ chọọchị, a na-abụ abụ Alaeze dị iche iche n’ụzọ ndị Africa si abụ abụ, na-enwe ndakọ dị ụtọ dị nnọọ ka e si kee ya. N’oge na-adịghị anya, ìgwè ahụ mụbara gaa n’ihe karịrị 60 mmadụ. Otu nwanna tiri mkpu, sị: “Lee nnọọ ahụmahụ na-enye obi ụtọ ọ bụ ikere òkè n’ịgbanwe ụlọ akwụkwọ Sunday school nke a ka ọ ghọọ ebe a na-efe ezi ofufe!”

N’Ógbè Mbara Ọhịa ahụ nke Na-ekpo Ntụ

N’ihi ntinye aka chọọchị dị iche iche tinyere n’ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ, ọtụtụ ndị ọcha na-arụ ọrụ ugbo na-eji nlezi anya eme ihe, ọbụna na-enyo ihe enyo banyere onye ọ bụla nke ji ozi Bible na-abịakwute ha. Rịba ama akụkọ nke a si n’aka otu ìgwè ndị si Johannesburg, ndị gara njem ihe dị ka 640 kilomita ikwusa ozi ọma n’otu ógbè dị na Transvaal.

“Anyị anọwo na-aga njem n’ebe ugwu, na-agabiga mbara ọhịa ahụ gbasapụrụ agbasapụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ hour anọ ugbu a. A na-ahụ onyinyo ụgha nke ihe yiri mmiri n’okporo ụzọ ahụ kwụ ọtọ n’okpuru anyanwụ nke Africa. Na mberede, okporo ụzọ ebe e tere ágbá kwụsịrị, anyị wee malite ịgba n’ụzọ ájá, bụ́ nke na-adịghị larịị, jupụtakwa n’ebe ụzọ na-adịghị mma. N’ikpeazụ, otu ụzọ ájá dị warara duuru anyị gaa n’otu ubi.

“‘Ị bọọla chi, Meneer [Nna anyị ukwu],’ ka anyị kwuru iji kelee otu onye ọrụ ubi gbara dimkpa.

“‘Ndewo,’ ka o ji olu ike zaghachi. ‘Ọ̀ dị ihe m ga-emere unu?’

“Mgbe anyị kọwasịrị ndị anyị bụ, anyị kọwara ihe mere anyị ji bịa. Anyị ka kpụ okwu n’ọnụ mgbe o tiri mkpu, sị: ‘Onye dominee [ụkọchukwu] m dọrọ m aka ná ntị banyere unu! Unu nile bụcha ndị Kọmunist na Ndị Na-emegide Kraịst. Sinụ n’ala m pụọ ozugbo tupu m . . . !’

“Otú onye ọrụ ubi ahụ si nọrọ gosiri na ọ pụrụ ịmalite ime ihe ike ozugbo. N’enweghị ihe ọ bụla ọzọ anyị pụrụ ime, anyị kpebiri ịpụ ma ‘tichapụ ájá ụkwụ anyị.’ (Matiu 10:14) E nwere ájá dị ukwuu n’ebe ahụ iji mee nke a n’ụzọ nkịtị.

“Mgbe anyị jere n’ubi nke ọzọ, nzaghachi anyị nwetara bụ otu ihe ahụ. Mgbe ahụ, anyị wee cheta na onye ụkọchukwu Chọọchị Dutch Reformed bi n’ebe ahụ anọwo jiri telifon na-eme ihe, bụ́ onye nọ na-adọ ‘ìgwè atụrụ ya’ aka ná ntị banyere ‘ihe ize ndụ’ nke na-abịa n’ógbè ha. N’ikpeazụ, anyị zutere otu onye ọrụ ubi onye, ọ bụ ezie na o nweghị mmasị n’onwe ya, kwuru, sị: ‘Ee, unu pụrụ ịgwa ndị na-arụrụ m ọrụ okwu.’

“Anyị anọwo nnọọ na-eche maka ohere nke ahụ. E nwere ihe dị ka obere ụlọ ájá iri ndị dị gburugburu osisi acacia ụfọdụ. Anyị hụtara ndị nọ n’ime ụlọ nta ndị ahụ na-enyopụta anya ka anyị na-akwapụtasị akwụkwọ dị iche iche n’elu ihe mkpuchi injin ụgbọ ala anyị. Otu nkwakọba Bible, nkwakọba ọzọ nke akwụkwọ ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, na otu nkwakọba nke Akwukwọm nke Akukọ Bible na akwụkwọ nta dị iche iche mezuru ngosipụta ahụ. Otu n’ime ụmụ okoro nta ndị bi ebe ahụ ji ọsọ gbagaa ịkọrọ ndị obodo ahụ na anyị abịarutewo. N’oge na-adịghị anya, ìgwè nke ihe dị ka 30 mmadụ zukọtara gburugburu ụgbọ ala ahụ ịnụrụ ozi anyị.

“A kpọnyeere ha okwu e buwororịị ụzọ gụnye na tepu n’asụsụ Tswana. Lee nnọọ ka ndị a si nwee obi ụtọ ịnụ ozi ọma nke Alaeze Chineke na nke olileanya Paradaịs n’asụsụ nke ha! Ha ji oké mkpali kwurịta okwu mgbe e chere ha akwụkwọ ndị ahụ n’ihu. Tupu ogologo oge, o siiri anyị ike ịgụkọta akwụkwọ ole anyị tinyere. Ọbụna na otu agadi nwoke kwere ígwè ahụ e ji akpọ tepu ọnụ. O metụrụ anyị n’ahụ nke ukwuu mgbe a na-egosipụta obi ekele maka ozi ọma n’ọtụtụ ụzọ nta dị iche iche—imumu ọnụ ọchị, ibitụ anyị aka, iji olu dị nta sị anyị ‘Unu emeela.’

“N’enweghị onye gwara ha ka ha mee ya, ụmụntakịrị ahụ guzoro n’ahịrị nke na-akwụzichaghị akwụzi wee bụọ abụ ọdịnala ha na-eji asị mmadụ laa nke ọma. Na mberede, ụzọ ọjọọ ahụ nke na-ekpo ntụ na nzaghachi ahụ na-adịghị mma a na-enweta mgbe ụfọdụ pụrụ anyị n’uche. Mgbalị nile anyị mere kwesịrị nnọọ ekwesị!”

Onye Chiifu Enye Iwu!

Otu ọgbakọ dị na Soweto nwere ọrụ nke ikwusa ozi ọma n’ógbè ebe otu agbụrụ bi nke dị n’obodo ọwụwa anyanwụ nke Piet Retief. Omenala ndị ebe ahụ chọrọ ka onye ọbịa ọ bụla buru ụzọ jee gwa onye induna (chiifu) ndị ebe ahụ ihe ọ bịara ime. Ụmụnna mezuru ndokwa ahụ. Lee nnọọ ihe ijuanya ọ bụụrụ ha mgbe onye chiifu ahụ nabatara ha nke ọma ọbụna nye ha ebe obibi n’ụlọ nke aka ya! Ọzọkwa, o deere ndị nkwusa ahụ akwụkwọ nkọwa ha ga na-eji aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, kanyekwa ya akara nke ya. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Ndị a bụ ndị nkwusa Alaeze Chineke. Kpọbata ha n’ụlọ gị, geekwa ha ntị.”

Nzaghachi ndị mmadụ dịrị mma nke ukwuu na Ndịàmà ahụ mere ndokwa ikwu okwu ihu ọha na mbara ezi nke ụlọ onye chiifu ahụ n’ehihie ụbọchị Sunday ahụ. “Ụlọ nzukọ” mbara ezi ahụ jupụtara nnọọ n’ọnụ, e jikwa abụ na ekpere meghee, mechiekwa nzukọ ahụ. E nwetawo ahụmahụ dị otú ahụ ná ndị obi ha ziri ezi n’ógbè ndị ọzọ dị n’ime ime obodo.

Otu onye dị otú ahụ bụ Nathaniel, onye bi n’obodo nta nke Pitsedisulejang nke dị n’otu akụkụ Bophuthatswana, ebe ụkọ mmiri ozuzo na-emekpọ ọnụ. Ọ bụ onye na-arụ ọrụ mmepe ime obodo nke na-elekọta otu usoro ihe omume nke ịkụziri ndị bi n’ime ime obodo ụzọ e si akụ mkpụrụ n’ụzọ dị irè. Ọ na-enwe olileanya ịgbanwe ala nke a ihe na-adịghị ịghọ paradaịs. Ma mgbe ọ nụrụ na a gaje inwe paradaịs zuru ụwa ọnụ n’oge na-adịghị anya, ihu ya gbasapụrụ. O ji ịnụ ọkụ n’obi detuo akụkụ akwụkwọ nsọ ọ bụla ndị nkwusa ahụ gosiri ya. E mere ngwa ime ka Nathaniel malite isonyere ọgbakọ nke kasị dịrị nso, n’ihe dị ka 30 kilomita site n’ebe ahụ.

Iji Ọṅụ Na-enyere Ọtụtụ Ndị Na-achọ Eziokwu Aka

“Jehova gosiri anyị na ịda ogbenye adịghị egbochi onye agụụ ime mmụọ na-agụ ịmụta eziokwu ahụ,” ka Monika kwuru, onye bụ onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye nkwusa Alaeze oge nile. O so n’ìgwè ndị ọsụ ụzọ ndị kwusara ozi ọma site n’otu ubi gaa n’ubi ọzọ gabiga mbara ala nile nke Orange Free State nke dị n’ebe etiti nke mba ahụ. Gịnị bụ mmetụta ndị ọsụ ụzọ ahụ banyere itinye onwe ha n’ọrụ n’iwejere ndị a ozi ọma ahụ? “Ònye pụrụ ikwu ọnụ ahịa nke ahụmahụ ndị anyị nweworo?” ka ha zaghachiri. N’eziokwu, a kwụghachiri ndị ọsụ ụzọ ahụ ụgwọ ọrụ nke ọma n’ụzọ ime mmụọ maka mgbalị ha nile.

Ọbụna amaghị otú e si agụ ihe adịghị egbochi onye agụụ ime mmụọ na-agụ ịmụta eziokwu Akwụkwọ nsọ. Akwụkwọ nta ahụ e sere ihe osise nke ọma, bụ́ Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! bụ nke ndị ahụ na-amaghị akwụkwọ ma ọ bụ ndị na-amachaghị otú e si agụ ihe nabatara nnọọ nke ọma. Ma ụmụntakịrị ma ndị okenye nwere mkpali obi ụtọ n’ihi ọmarịcha ihe osise ndị ahụ nke Paradaịs. Otu onye ọrụ oge nile nke na-enye aka n’ibipụta akwụkwọ ndị dị otú ahụ kwuru, sị: “Akwụkwọ nta nke a na-enyere ndị mmadụ aka ịhụ Paradaịs dị ka ihe dị adị n’ezie, na-akwalitekwa nsọpụrụ na egwu ha dị mbụ nwee n’ebe Bible dị.”

N’ihi otu ihe nke a kwa, akwụkwọ ahụ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible abụwo ihe ọha mmadụ nwere mmasị na ya. N’otu akụkụ ime obodo dịpụrụ adịpụ nke Lebowa, ụmụnna anyị ndị nwanyị abụọ nwere ihe ijuanya ịhụ na otu agadi nwoke na-adịghị ahụcha ụzọ nke ọma na nwunye ya nwere akwụkwọ nke a n’asụsụ Sepedi. Di na nwunye nke a ji ya na-eme ihe dị ka akwụkwọ ha ji akụziri ụmụntakịrị ndị ebe ahụ ihe. N’eziokwu, a mụwo akwụkwọ ahụ nke ọma, kaakwa ya akara nke na ọ malitewo ịdakasị. Lee nnọọ ka ha si nwee obi ụtọ inweta nke ọhụrụ!

Otú ahụ ka o si bụrụ na akwụkwọ ezi ndị Kraịst na-ebipụta na-emeju mkpa dị ukwuu n’inyere ndị a agụụ nke eziokwu na-agụ aka. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na akụkụ dị ukwuu nke akwụkwọ nile e biri ebi n’ọtụtụ asụsụ ndị ebe ndịda Africa bụ Watch Tower Society bipụtara ha. Nanị n’afọ 1990, e kesara 113,529 akwụkwọ ukwu, akwụkwọ nta, na magazin dị iche iche Society bipụtara n’akụkụ ime ime obodo nke South Africa.

Mkpụrụ nke Ịrụsi Ọrụ Ike

Ezi ahụmahụ na akwụkwọ ndị a e tinyeworo hà rụpụtawo mkpụrụ ọ bụla na-adịgide adịgide n’ime ime obodo nke South Africa? N’ezie ha emewo otú ahụ. Kemgbe 1989, e guzobewo ọgbakọ anọ na òtù itoolu dịpụrụ adịpụ dị ka kpọmkwem ihe sitere ná mkpọsa nke ozi ọma ahụ n’ime ime obodo South Africa. Ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ndị na-anọru nwa oge na ndị ọsụ ụzọ oge nile ebutewo ụzọ n’ọrụ nke a.

Ì chetara Doris na ụlọ akwụkwọ Sunday school ya nke dị na ndagwurugwu ahụ dị anya n’ala ndị Zulu? Taa, ọ bụ Onyeàmà Jehova nke raaraworo onwe ya nye, meekwa baptism. Ọzọkwa, ìgwè na-enwe ọganihu nke ndị nkwusa Alaeze itoolu nọgidere na-enwe ọganihu ime mmụọ n’ebe ahụ. Ọtụtụ ndị ọhụrụ na-abịa nzukọ ndị a na-enwe n’ụlọ Doris, mmadụ asaa ndị o duziiri ọmụmụ Bible mekwara baptism ná mgbakọ distrikt ahụ e nwere na Durban na December 1990.

Mkpụrụ dị otú ahụ bụ ihe mkpali na-enye obi ụtọ nye ndị nkwusa Alaeze nọ na South Africa .Ha na-eburu n’obi okwu Pọl onyeozi, bụ́: “Otú anyị nwere oge, ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Ee, ndị ohu Jehova ekpebisiwo ike ijekwuru ndị nile obi ha ziri ezi, gụnyere ndị ahụ bi n’ime ime obodo nke ‘akụkụ nke a dị anya nke ụwa.’—Ọrụ 1:8.

[Map/Foto ndị dị na peeji nke 24]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Lebowa

TRANSVAAL

Soweto

Piet Retief

Bophuthatswana

ORANGE FREE STATE

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya